Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/02 p. 3
  • Mgbarịta Ume nke Pụrụ Iche

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbarịta Ume nke Pụrụ Iche
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-agbanụ Ibe Unu Ume Kwa Ụbọchị”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ị̀ Na-eji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe?
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Kpọkọta Ndị Mmadụ
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Mgbakọ—Oge Ịṅụrị Ọṅụ!
    Ozi Alaeze Anyi—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 9/02 p. 3

Mgbarịta Ume nke Pụrụ Iche

1 Ọ dịghị ụbọchị na-agafenụ nke a na-adịghị ele okwukwe nke ndị Jehova ule. N’ịmata na o nwere mkpirikpi oge, Ekwensu na-eme mwakpo nke ikpeazụ iji mebie iguzosi ike n’ezi ihe anyị nye Jehova. (Mkpu. 12:12) Ọ dị mkpa ka anyị ‘nọgide na-enweta ike n’ime Onyenwe anyị nakwa n’ịdị ike nke ume ya’ ka anyị “wee nwee ike iguzogide n’ajọ ụbọchị ahụ nakwa, mgbe [anyị] mezuchaworo ihe nile, iguzosi ike.”—Efe. 6:10, 13.

2 Isoro ndị kwere ekwe ibe anyị na-ezukọta bụ ndokwa sitere n’aka Jehova iji nyere anyị aka inweta ike. Pọl onyeozi ghọtara mkpa nke a dị. Ọ gụsiri ya agụụ ike iso ụmụnna Ndị Kraịst ibe ya na-akpakọrịta ka ha wee “gbarịta” onwe ha ume ma bụrụ ndị e ‘mere ka ha guzosie ike.’ (Rom 1:11, 12) Iji wusie anyị ike ime uche Chineke, Òtù Na-achị Isi ejiriwo ịhụnanya mee ndokwa inye anyị ohere irite uru site n’agbamume anyị ga-agbarịta ibe anyị ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” nke na-abịanụ.

3 Nọrọ Ebe ahụ Iji Rite Uru: Mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ịgazu ụbọchị atọ ahụ. Anyị ‘na-eme ihe na-abara anyị uru’ site n’ịbịarute tupu abụ nke mbụ ma nọgide ruo mgbe anyị ga-eji obi anyị kwuo “Amen” mgbe e kpesịrị ekpere mmechi. (Aịsa. 48:17, 18) Ọ ga-adị ọtụtụ ndị mkpa ịhazi usoro ọrụ ha tupu oge eruo ka ha wee nwee ohere iji gazuo ụbọchị atọ ahụ. N’ezie, o nwere ike ọ gaghị adịrị gị mfe ime ka onye were gị n’ọrụ kweta inye gị oge, ma Jehova mesiri anyị obi ike na ya ga-enyere anyị aka ime uche ya. (1 Jọn 5:14, 15) Ọ bụrụ na anyị emebeghị otú ahụ, ugbu a bụ oge iji mee ndokwa a kapịrị ọnụ maka ime njem na ebe obibi, n’ahapụghị ihe ọ bụla ka ọ bụrụ ma ọ̀ daba. Anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-agọzi mgbalị anyị na-eme iji gazuo ụbọchị atọ ahụ.—Ilu 10:22.

4 Tụọ Anya Agbamume Ahụ: Ọ̀ dịtụwo mgbe i si ná mgbakọ distrikti laa, na-ekwu, sị: “Nke a enweghị atụ!” Gịnị pụrụ imeworị ka i nwee mmetụta dị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ike nwere ike iji nke nta nke nta gwụ anyị, anyị achọpụta na agbamume ime mmụọ dị anyị mkpa. (Aịsa. 40:30) Otu nwanna nwanyị kwuru, sị: “Usoro ihe a na-eme ka ike gwụ m, mgbakọ na-eme ka m na-elekwasị anya ọzọ n’ihe ime mmụọ, na-enye m nkwali ime mmụọ nke dị m mkpa. Ọ na-adị ka agbamume ahụ ọ na-abịa nnọọ n’oge ọ dị m mkpa karịsịa.” Ma eleghị anya, i nwewo mmetụta ndị dị otú ahụ.

5 Anyị na-enweta agbamume dị anyị mkpa ọ bụghị nanị site n’okwu ndị a na-ekwu nakwa ajụjụ ọnụ kamakwa site n’akụkụ ndị ọzọ magburu onwe ha nke mgbakọ anyị. Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “Ihe na-amasị m n’ezie bụ ụzọ doro anya, nke dịkwa irè e si akọwa ụzọ a pụrụ isi tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. N’ezie, ihe nkiri bara oké uru n’igosi otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe atụ ndị gara aga, ma ndị dị mma ma ndị na-adịghị mma. Ihe ndị a na-ewepụta bụ ihe ndị m na-atụ anya ha mgbe nile, ha na-enyekwa m obi ụtọ ruo ogologo oge mgbe m laghachisịrị n’ụlọ.”

6 Mgbakọ bụ ndokwa dị oké mkpa nke sitere n’aka Jehova ‘n’oge a pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Tim. 3:1) Ha na-enyere anyị aka irube isi na ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́: “Mụrụnụ anya, guzosienụ ike n’okwukwe, na-emenụ ka ndị dimkpa, dịnụ ike.” (1 Kọr. 16:13) Ya mere, ka anyị kpebisie ike ịga nnọkọ nke ọ bụla ma nweta obi ụtọ dị ukwuu n’ịgbarịta ibe anyị ume ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” anyị!

Igbe dị na peeji nke 3]

Mee Atụmatụ Ịgazu Ụbọchị Atọ Ahụ

■ Rịọ maka oge ịhapụ ọrụ.

■ Tinye akwụkwọ maka ebe obibi n’obodo ahụ a ga-anọ mee mgbakọ.

■ Mee ndokwa maka ime njem iji gaa mgbakọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya