14 “E debewo ihe Jehọnadab nwa Rikab kwuru,+ bụ́ iwu o nyere ụmụ ya ka ha ghara ịṅụ mmanya, ha aṅụbeghịkwa mmanya ọ bụla ruo taa, n’ihi na ha na-erube isi n’iwu nna nna ha nyere ha.+ Ma mụ onwe m agwawo unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-agwa unu okwu,+ ma unu adịghị erube isi.+