Ụzọ A Ga-esi Nyere Ndị Dara Mba n’Obi Aka Inwetaghachị Ọṅụ
EPAFRỌDAITỌS, bụ́ onye Kraịst na-eso ụzọ na nari afọ mbụ, dara mba n’obi. E zigawo ya ịga lebara mkpa dị iche iche nke Pọl onye ozi ahụ nọ n’ụlọ mkpọrọ anya, ma ọ dasiri ọrịa ike. Ọ bụ ezie na Epafrọdaitọs agbakeela, ọ dara mba n’obi n’ihi na ọgbakọ nọ n’ụlọ ha, bụ́ ndị zigara ya Rom, “nụrụ na ahụ adịghị ya ike.” (Ndị Filipai 2:25, 26) Ịnọ n’ebe dị anya ma chọọ ime ka obi ruo ha ala banyere ya mere ka ọ daa mba n’obi. O yikwara ka o chere na ha ewerewo ya dị ka onye na-arụzughị ihe eji ziga ya. Olee otu a pụrụ isi nyere ya aka inwetaghachi ọṅụ ya.
E zighachiri Epafrọdaitọs n’ụlọ ya na Filipai, na-eji akwụkwọ ozi sitere n’aka Pọl onye ozi. N’ime ya, Pọl dụrụ ọgbakọ ahụ ọdụ, sị: “Ya mere werenụ ọṅụ nile nara ya nke ọma n’ime Onyenwe anyị; na-asọpụrụkwanụ ndị dị otú a.” (Ndị Filipai 2:27-30) A gbara ndị Kraịst nọ na Filipai ume ime ka Epafrọdaitọs bịa ha nso n’ụzọ nke ga-ekwesị àgwà ahụ pụrụ iche nke imekọ ihe ọnụ bụ́ nke e ji mara ọgbakọ ndị Kraịst. Okwu nkasi obi ha ga-egosi ya na e weere ya dị ka onye bara uru n’ụzọ dị ukwuu, ee, ‘bụrụ onye a na-asọpụrụ.’ Nlebara anya nke a nke ọṅụ ga-enyere ya aka nke ukwuu inwere onwe ya pụọ n’ịda mba nke uche.
Ihe atụ nke a na-egosi na ọ bụ ezie na ndị Kraịst nile “na-aṅụrị ọṅụ n’Onyenwe anyị,” ụfọdụ n’ime ha na-ata ahụhụ n’ụdị dị ịche ịche nke ịda mba n’obị. (Ndị Filipai 4:4) Óké ịda mba n’uche bụ nsogbu uche siri ike nke dugaworo ọbụna n’igbu onwe onye. Mgbe ụfọdụ, ọ na-emetụta ihe ndị mejupụtara ụbụrụ na ihe ndị ọzọ a na-ahụ anya. Ka o sina dị, mgbe nile a pụrụ ibelata ịda mba nke uche site n’enyemaka amamihe dị n’ime ya nke ndị ọzọ na-enye. Otú a, Pọl gbara ume, si: “Na-agụgụnụ ndị dara mba n’obi.” (1 Ndị Tesalọnaika 5:14) Ya mere, ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova kwesịrị iji ọṅụ na-enye mkpụrụ obi ndị dara mba n’obi nkwado. Nzukọ ndị Kraịst nke oge a ghọtara ibu ọrụ nke a laa azụ na 1903, n’ihi na Ụlọ Nche (Bekee) kwuru mgbe ahụ banyere mkpụrụ obi ndị dara mba, ma ọ bụ ndị obi ha dara mba, sị: “Ndị dara mba n’obi na ndị na-adịghị ike ga-achọ enyemaka, nkwado, na agbamume.” Ma olee otú ị pụrụ isi nyere mkpụrụ obị ndị dara mba aka?
Nke mbụ, site ‘n’iwere obi sorịta ibe gị hụkọọ ahụhụ,’ ị ga-enwe ike inyere onye dara mba n’obi aka ikpughe “nchegbu” dị n’obi ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, “okwu ọma” si n’ebe ị nọ bịa pụrụ inyere ya aka inwe ọṅụ. (1 Pita 3:8; Ilu 12:25) Nanị inye ya ohere ka o kwuo ihe dị ya n’obi ma nwee mmetụta nke nchegbu gị pụrụ iweta nnwere onwe dị ukwuu. “Enwere m ndị enyi ụfọdụ m pụrụ ịkọrọ ihe nile dị m n’obi,” ka Meri kọwara, bụ́ onye Kraịst na-alụbeghị di nke ya na ịda mba n’obi gbara mgba. “Onye ga-ege m ntị dị m mkpa.” Inwe onye a ga-eso kerita ihe dị mmadụ n’ime ime obi banyere nsogbu dị iche iche nke ndụ pụrụ ịrụpụta ihe dị ukwuu.
Otú ọ dị, a chọrọ ihe karịrị nanị ige nti na inye oké ndụmọdụ ndị dị ka, “Legide anya n’akụkụ ndị mara mma nke ndụ” ma ọ bụ, “Chee echiche n’ụzọ ziri ezi.” Okwu ndị dị otụ́ ahụ pụrụ igosi ụkọ nke obi ebere, ọ dabaghikwa ma ọlị n’ihe a chọrọ mgbe onye ọzọ nwere ịda mba n’obi, ọbụna dị ka Ilu 25:20 na-egosi n’ikwu, sị: “Dị ka onye na-eyipụ uwe n’ụbọchị oyi, . . . otú a ka onye na-abụrụ obi jọrọ njọ abụ dị.” Okwu olileanya ndị na-enweghị isi pụkwara ime ka onye dara mba n’obi ọbụna nọrọkwuo ná nchekasị. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ịhị na mgbalị ndị dị otú ahụ emetụtaghị ihe ndị kpatara ịda mba n’obị ya.
Jiri Okwu Mee Ka E Nwee Ume
Onye nwere óké ịda mba n’obi abụghị nanị na ọ na-enwe mwute, kama ma eleghị anya na-ewere onwe ya n’onye na-abaghị n’ịhe na onye na-enweghị olileanya. Okwu Grik ahụ a sụgharịrị ịbụ ‘mkpụrụ obi ndị dara mba’ pụtara n’ụzọ nkịtị “mkpụrụ obi ndị dị nta.” Otu onyeọkà mmụta akwụkwọ Grik na-akọwa okwu ahụ n’ụzọ dị otú a, sị: “Onye nọ na-adọgbu onwe ya n’okpuru ọnọdụ dị otú ahụ, nke na obi na-adabanye ya n’afọ.” Otú a, ezi mmetụta ya nile afọdụghịkwa, ùgwù nke onwe ya na-adakwa ada.—Tụlee Ilu 17:22.
Onye nna ochịe ahụ bụ Job kwuru, sị: “M ga-ewere ọnụ m gbaa unu ume.” (Job 16:5) Okwu Hibru maka “ịgba ume” ka a na-ede mgbe ụfọdụ dị ka ‘iwusi ike’ ma ọ bụ ‘inye ume.’ E jiri ya mee ihe iji kọwaa ụzọ e si mee ka ụlọ ukwu ahụ “sie ike” site n’ịrụzịgharị akụkụ ahụ ya dị iche ịche. (Aịsaịa 41:10; Nehum 2:1; 2 Ihe Emere 24:13) Okwu gị aghaghị iji nkà wulịte ùgwù mmadụ nke dara mba, okwute n’elu okwute ibe ya, dị ka a pụrụ ikwu ya. Ime nke a ga-achọ ime ihe dị ka ‘uche ya si dị.’ (Ndị Rom 12:1) Mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke 1903 bụ́ nke anyị kpọtụrụ uche na mbụ kwuru banyere ndị dara mba n’obi, sị: “N’ihi enweghị . . . ùgwù nke onwe onye, ọ dị ha mkpa ịbụ ndị e bulitere elu, iji mee ka onyinye ndị ha nwere n’ezịe pụta ìhè, maka agbamume nke ha nakwa maka ngọzi nke ezinụlọ dum nke okwukwe.”
Ihe atụ nke Bible banyere Elkena na nwunye ya bụ Hana nke dara mba n’obi na-enye ihe atụ nke otú ị pụrụ isi jiri okwu gbaa ume, dị ka Job mere. Elkena nwere ndị nwunye abụọ. Otu n’ime ha, bụ Penina, nwere ọtụtụ ụmụ, ma Hana bụ nwanyị àgà. Ma eleghị anya, Hana weere onwe ya dị ka onye na-abaghị n’ihe. (Tụlee Jenesis 30:1.) Dị ka à ga-asị na ịbu nke a adịghị arọ ruo otú o kwesịrị, Penina kpasuru ya iwe ruo n’ókè nke na ọ kwara ákwá, nweekwa afọ mmachi. O bụ ezie na Elkena amaghị ókè nke ịda mba ya, mgbe ọ hụrụ ọnọdụ ya, ọ jụrụ, sị: “Hana, n’ịhi gịnị ka ị na-akwa ákwá? Ọ̀ bụkwa n’ịhị gịnị ka ị na-erighị ịhe? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịni ka obi jọrọ gị njọ?”—1 Samuel 1:1-8.
Ajụjụ obi ọma ndị ahụ nke Elkena, nke na-abụghịkwa ebubo, mere ka Hana nwee ohere ikwupụta echịche ya. Ma ọ zaghachiri ma ọ bụ na ọ zaghachighị, e nyeworo ya aka inyocha ihe mere o ji na-enwe echiche nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe ma eleghị anya. N’otu aka ahụ kwa, mkpụrụ obi nke dara mba pụrụ ikwu, sị: ‘Abụ m nnọọ onye ọjọọ.’ Ị pụrụ ịjụ, sị: ‘Gịnị mere i ji na-eche otú ahụ?’ Mgbe ahụ gee ntị nke ọma ka ọ na-ebuturu gị ibu ndị ahụ dị n’obi ya.—Tụlee Ilu 20:5.
Mgbe ahụ Elkena jụrụ Hana ajụjụ nke a na-agba ume, sị: “Mụ onwe m ádịghị m mma n’ebe ị nọ karịa ụmụ ndị ikom iri?” O chetaghachiiri Hana ịhụnanya o nwere n’ebe ọ nọ, n’agbanyeghị na ọ bụ nwanyị àgà. O weere ya dị ka onye dị oké ọnụ ahịa, n’ịhị ya ọ pụkwara ikwubi, sị: ‘Ọ dị mma, e kwuwerị abụghị m onye na-abaghị n’ihe. Enwere m n’ezie ịhụnanya dị omịmị nke di m!’ Okwu ya gbara Hana ume, n’ihi na ọ malitere iri ihe, gaakwa n’ụlọ ukwu ahụ.—1 Samuel 1:8, 9.
Dị nnọọ ka Elkena gara kpọmkwem n’ihe okwu ahụ bụ ma dọrọ uche nwunye ya gaa n’ezi ihe mere ọ ga-eji na-enwe echiche ka mma banyere onwe ya, ndị ahụ ga-enwe ọchịchọ nke ịnyere ndị dara mba n’obi aka aghaghị imekwa otú ahụ. Dị ka ihe atụ, otu onye Kraịst aha ya bụ Naomi kwuru nke a banyere ihe nyeere ya aka inwetaghachi ọṅụ ya, sị: “Ụfọdụ ndị enyi m jara m mma n’ụzọ m siworo zụlite nwa m nwoke, ụzọ m si elekọta ụlọ m, na ọbụna otú m siworo na-eji ejiji n’agbanyeghị ịda mba n’obi m. Agbamume nke a rụrụ ọrụ dị ukwuu!” Ee, ịja mmadụ mma n’ezịe n’ihi ihe o mere na-enyere mkpụrụ obị nke dara mba aka ịhụ ezi àgwà ya ma na-ele abamuru nke onwe ya anya n’ụzọ ziri ezi.
Ọ bụrụ na nwunye gị nwere ịda mba n’obị, gịnị mere na ị chọghị ụzọ ị ga-esi wulie ya elu n’ikwekọ n’okwu ndị ahụ dị n’Ilu 31:28, 29? N’ebe ahụ anyị na-agụ, sị: “Di ya kwa, ọ na-etokwa ya, sị: Ọtụtụ ụmụ ndị ịnyom emewo omume kwesịrị ndị ịnyom na-ejide onwe ha nke ọma, ma gị onwe gị kachasị ha nile.” Ma, nwanyị nke nwere ịda mba n’obi nwere ike ọ gaghị anabata ịja mma dị otụ́ ahụ, ebe ọ bụ na ọ pụrụ ịdị na-eche na ya abaghị n’ihe n’ihi enweghị ike nke ilekọta ọrụ ndị dị n’ụlọ n’ụzọ dị mma dị ka ọ na-eche na ya kwesịrị. Otu ọ dị, site n’ichetara ya ụdị nwanyị ọ bụ n’ime, na otu ọ dị tupu o nwee ịda mba n’obi, ị pụrụ ime ka o doo ya anya na otuto ị na-enye ya abụghị nke ịkwa emo. Ị pụkwara ime ka ọ mara na ihe ọ na-eme ugbu a na-egosi oké mgbalị. Ị pụrụ ikwu, sị: ‘Ama m ihe o were gị ime nke a. I kwesịrị ịja mma maka itinye mgbalị dị ukwuu otú a!’ Ịnata ezi nkwado na otuto nke di ma ọ bụ nwunye mmadụ na ụmụ, nke ndị ahụ maara mmadụ nke ọma, dị mkpa maka ịwuliteghachị ùgwù nke onwe onye.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 7:33, 34.
Iji ihe atụ ndị dị na Bible mee ihe pụrụ inyere onye dara mba n’obi aka ịhụ mgbanwe ndị dị mkpa ọ pụrụ ime n’iche echịche. Dị ka ịhe atụ, ma eleghị anya mmadụ pụrụ ịbụ onye na-enwe mmetụta gabiga ókè banyere echịche nke ndị ọzọ. Ị pụrụ ikwu okwu banyere ihe atụ nke Epafrọdaịtọs ma jụọ, sị: ‘Olee ihe ị na-eche mere o ji nwee ịda mba n’obi mgbe ọ matara na ọgbakọ dị n’obodo ya anụwo banyere ọrịa ya? Ọ̀ bụ n’ezie onye na-arụzulighị ihe e ji ziga ya? N’ihi gịnị Pọl jị sị ka a sọpụrụ ya? Ezi abamuru nke Epafrọdaitọs dị ka mmadụ ọ̀ dabeere n’ihe ùgwù ịje ozị nke o ji?’ Ajụjụ ndị dị otú ahụ pụrụ inyere onye Kraịst dara mba n’obi aka ịtụle ọnọdụ nke onwe ya ma ghọta na ya abụghị onye na-abaghị n’ihe.
“Nyerenụ Ndị Na-adịghị Ike Aka”
Bible na-agba ume, sị: “Nyerenụ ndị na-adịghị ike aka.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Inwe ọtụtụ ndị enyi bụ ndị Kraịst bụ́ ndị pụrụ ịnye ezi nlekọta bara uru bụ abamuru ọzọ nke ezi okpukpe. Ezi ndị enyi bụ ndị ahụ ‘a mụrụ maka mgbe ahụhụ,’ ha na-arapagịdesịkwa ịke n’ahụ onye dara mba n’obi. (Ilu 17:17) Mgbe Pọl onye ozi nwere echiche nke ‘ịdị ala,’ nweekwa ‘egwu n’ime ya,’ e “weere ọbịbịa Taịtọs kasịe” ya obi. (2 Ndị Kọrịnt 7:5, 6) N’otu aka ahụ, ma eleghị anya ndị dara mba n’obị ga-enwe ekele dị omimi mgbe e letara ha ma ọ bụ kpọtụrụ ha na telifonu n’oge ndị kwesịrị ekwesị. Ị pụrụ ịjụ ma ọ̀ dị ụzọ ị pụrụ isi nye aka n’ụzọ bara uru, dị ka ije ozi, ịrụ ọrụ dị n’ụlọ, ma ọ bụ ihe ndị yiri ha.a Otu onye Kraịst aha ya bụ Maria na-ekwu, sị: “Mgbe m nwere ịda mba n’obi, otu enyi m deteere m akwụkwọ ọtụtụ mgbe, ma na-etinye akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-agba ume mgbe nile. A gụghachiri m akwụkwọ ozi ahụ ọtụtụ mgbe, n’ebe ákwá ka m na-agụ ya. Akwụkwọ ozi ndị dị otú ahụ dị ka ọlaedo nye m.”
Mgbe ọ gbasịrị ọgbakọ ahụ ume inyere “ndị dara mba n’obi,” aka Pọl kwuru, sị: “Nweenụ ogologo ntachị obi n’ebe mmadụ nile nọ. Leenụ ka onye ọ bụla ghara inyeghachị onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ.” (1 Ndị Tesalọnaika 5:14, 15) Ndidi dị mkpa, n’ihi ihe mgbu nke uche, echiche na-ezighị ezi, na ike ọgwụgwụ n’ihi ehighị ụra, onye dara mba n’obi pụrụ iji ‘okwu sihiere ụzọ’ zaghachi dị ka Job mere. (Job 6:2, 3) Rachelle, bụ́ onye Kraịst nne ya nwere oké ịda n’obị kwupụtara, sị: “Ọtụtụ mgbe mama ga-ekwu nnọọ okwu ọjọọ. Ọtụtụ mgbe n’oge ndị a, m gbaliri ịchetara onwe m ụdị onye mama bụ n’ezie—onye na-ahụ n’anya, nwere obi ọma, na-emesapụ aka. A mụtara m na ndị nwere ịda mba n’obi na-ekwu ọtụtụ ihe ha na-ebughị n’uche n’ezie. Ihe kasị njọ mmadụ pụrụ ime bụ iji okwu ọjọọ ma ọ bụ omume ọjọọ kwụghachị ha ụgwọ.”
Ndị inyom ụfọdụ tozuru òkè bụ ndị Kraịst karịsịa pụrụ ịnọ n’ọnọdụ nke iwetara ndị ịnyom ọzọ na-ata ahụhụ nke nsogbu uche nnwere onwe. (Tụlee 1 Tịmoti 5:9, 10.) Ndị inyom ndị a ruru eru bụ ndị Kraịst pụrụ ịkpọ ya ihe ha ga-eme ịgwa ndị dị otú ahụ okwu nkasị obi n’oge ndị kwesịrị ekwesị. Mgbe ụfọdụ ọ na-aka mma ka ụmụ nna nwanyị bụ ndị Kraịst tozuru òkè gaa n’ihu n’inyere onye bụ nwanyị aka karịa ụmụnna ndị nwoke ime otú ahụ. Site n’ihazi ihe na iduzi ha nke ọma, ndị okenye ndị Kraịst pụrụ ịhụ na mkpụrụ obị ndị nwere ịda mba nwetara enyemaka ha chọrọ.
Ndị Okenye Nwere Ire nke A Zụrụ Azụ
Ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ karịsịa aghaghị inwe ‘ihe ọmụma na ezi uche’ ka ha wee “mara iwere okwu gbaa onye dara mbà ume.” (Jeremaia 3:15; Aisaia 50:4, Beck) Otu ọ dị, ọ bụrụ na onye bụ okenye elezighị anya, ọ pụrụ ime ka ọnọdụ onye dara mba n’obi dị njọ kari n’amaghị ama. Dị ka ihe atụ, a tụrụ anya na ndị enyi atọ Job gara “igosi ebere ha ji n’ahụ ya na ịkasi ya obi.” Ma okwu ha, nke inwe echiche na-ezighị ezi banyere ọnọdụ ọjọọ nke Job kpaliri, mere ihe igwepia ya kama ịkasi ya obi.—Job 2:11; 8:1, 5, 6; 11:1, 13-19; 19:2.
Isiokwu dị iche iche dị n’akwụkwọ dị iche iche ndị Watch Tower na-ebipụta ewepụtawo ụkpụrụ dị iche iche ndị a pụrụ itinye n’ọrụ n’inye ndị mmadụ ndụmọdụ.b Ihe ka n’etiti ndị okenye etinyewo ụkpụrụ ndị dị otú ahụ n’ọrụ. Ma, n’ọnọdụ ụfọdụ okwu ndị amamihe na-adighị n’ime ha site n’aka ndị okenye ma n’okwu ha na-agwa mmadụ ma ọ bụ n’okwu ihu ọha—abụwo nke na-emerụ ahụ nke ukwuu. Ya mere ka ndị okenye ghara ‘ikwu okwu n’echeghi eche dị ka ndụpu nke mma agha’ kama ka ha na-eji ‘ire nke ndị maara ihe nke bụ́ ihe na-agwọ mmadụ’ na-ekwu okwu. (Ilu 12:18) Ọ bụrụ na onye okenye echee echiche banyere ihe ndị pụrụ isi n’ihe o kwuru pụta tupu o kwuo ha, okwu ya pụrụ ịbụ ihe na-agwọ ọrịa. N’ihi ya, ndị okenye, dịrịnụ ngwa ige nti, unu adịkwala ngwa inwe nkwubi okwu mgbe unu na-amabeghi ihe nile merenụ.—Ilu 18:13.
Mgbe ndị okenye nwere mmasị ziri ezi ná ndị dara mba n’obi, ndị dị otú ahụ na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya na ndị e nwere mmasị n’ebe ha nọ. Nlekọta anya dị otú a nke na-enweghị ọchịchọ onwe onye pụrụ ime ka ndị a leghara okwu ọ bụla nke na-adịghi agba ume anya. (Jemes 3:2) Ọtụtụ mgbe, ndị nwere ịda mba n’obi na-abụ ndị echiche nke ikpe ọmụma na-erikpu, ndị okenye pụkwara inyere ha aka inwe echiche ziri ezi banyere okwu dị iche iche. Ọbụna mgbe e meworo mmehie jọkarịrị njọ, nlekọta anya ime mmụọ nke ndị okenye na-enye pụrụ inye aka ‘ime ka ụkwụ nke ndị ngwụrọ dị ike.’—Hibru 12:13.
Mgbe ndị dara mba n’obi na-eche na ekpere ha a dighi arụ ọrụ, ndị okenye pụrụ iso ha kpee ekpere, kpeekwa ekpere maka ha. Site n’isoro ha na-agụ eziokwu ndị metụtara ida mba n’obi bụ́ ndị dabeere na Bible, ndị okenye pụrụ ‘ite’ mmadụ ndị a mmanụ okwu ime mmụọ ndị na-agwọ ọria. (Jemes 5:14, 15) Ndị okenye pụkwara inyere onye dara mba n’obi aka ịgbaso nzọụkwụ ndị Akwụkwọ nsọ kwadoro iji dozie esemokwu ọ bụla ya na onye ọzọ pụrụ inwe, ọ bụrụ na nke a bụ nsogbu ahụ. (Tụlee Matiu 5:23, 24; 18:15-17.) Ọtụtụ mgbe, esemokwu ndị dị otú ahụ, karịsia n’ime ezinụlọ, na-agbanye mkpọrọgwụ n’ịda mba nke obi.
Ghọta na inweta onwe onye na-ewe oge. Ọbụna mgbalị ịhụnanya ndị ahụ nke Elkena emeghi ka Hana nwere onwe ya ozugbo pụọ n’ịda mba n’obi ya. Ekpere nke onwe ya tinyekwara mmesi obi ike nke onyeisi nchụàjà mere ka o nwere onwe ya n’ikpeazụ. (1 Samuel 1: 12-18) Ya mere, nwee ndidi ma ọ bụrụ na e nweghị nzaghachi dị ngwa. Otú ọ dị, ndị okenye n’ozuzu ha abụghị ndị dọkịta, n’ihi ya ha pụrụ ịchọpụta na a kpaara mgbalị ha ókè n’ọnọdụ ụfọdụ. Ha, tinyere ndị òtù ezinụlọ nke onye ahụ nwere ịda mba n’obi, pụrụ ịhụ mkpa ọ dị ịgba onye ahụ ume ịchọ enyemaka nke ndị ọ bụ ọrụ ha. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ndị okenye ma ọ bụ ndị òtù nke ezịnụlọ pụrụ ịkọwara onye ọ bụla ọ bụ ọrụ ya n’ụzọ doro anya mkpa ọ dị ịsọpụrụ ịhe ndị onye ahụ dara mba n’obi kwere n’ụzọ okpukpe.
Tupu e ruo n’ụwa ọhụrụ nke Chineke, ọ dịghị onye ga-enwe ahụ ike zuru okè nke anụ ahụ, nke uche, ma ọ bụ nke mmetụta. Ka ọ dị ugbu a, onye Kraịst ọ bụla nke na-atufu ọṅụ ha n’ihi ịda mba nke obi pụrụ inweta ume ọhụrụ, ọ bụghi site n’ọgbakọ nke ndị Kraist nanị kama kwa site n’aka Nna anyị nke eluigwe, bụ́ “onye na-akasi ndị dara mba obi.”—2 Ndị Kọrint 7:6, New American Standard Bible.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu ahụ bụ “Imeri Ịda Mba nke Obi—Otú Ndị Ọzọ Pụrụ Isi Nye Aka” na Teta! nke November 8, l987 (Bekee), peji 12-16.
b Lee isiokwu ndị bụ “Ire A Zụrụ Azụ—’Iji Gbaa Ndị Dara Mba Ume’” nke dị na n’Ụlọ Nche (Bekee) nke June 1, 1982, na “‘Okwu Ime Mmụọ’ Maka Ndị Nwere Ọria Uche” nke dị ná mbiputa November 15, 1988.
[Igbe dị na peeji nke 29]
ỤZỌ E SI EKWU OKWU NKASI OBI
□ GEE NTỊ NKE ỌMA—Site n’ajụjụ ndị amamihe dị na ha, ‘dọpụta’ echiche nke obi onye ahụ. Dị ngwa ige ntị, adịkwala ngwa irute ná nkwubi okwu tupu ị matachaa ihe nile merenụ.—Ilu 20:5; 18:13.
□ GOSI MMASỊ—I kwesịrị ijikọta ‘mmetụta maka ibe’ na “obi ọmịiko” ka gị na onye ahụ nwere ịda mba n’obi na-achọpụta ihe bụ mmetụta ya. ‘Soro onye na-akwa ákwá n’ịkwa ákwá ya.’—1 Pita 3:8; Ndị Rom 12:15.
□ NWEE OGOLOGO NTACHI OBI—Ọ pụrụ iwe mkparịta ụka ọtụtụ mgbe, ya mere nwee ndidi. Leghara ‘okwu sihiere ụzọ’ anya, bụ́ nke onye dara mba n’obi pụrụ ikwu n’ihi ahụ mgbakasi.—Job 6:3.
□ JIRI OKWU MEE KA E NWEE UME—Nyere onye ahụ nwere ịda mba n’obi aka ịhụ àgwà ọma ndị o nwere. Jaa ya mma n’ụzọ doro anya. Gosi ya na nsogbu dị iche iche, ahụmahụ ọjọọ dị iche iche ndị gara aga, ma ọ bụ mmejọ dị iche iche adịghị eme ka mmadụ ghara ịba uru. Kọwaa ihe mere Chineke ji na-ahụ ya n’anya, na-enwekwa mmasị n’ebe ọ nọ.—Job 16:5.