Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2023 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
MACH 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 16-17
“Jehova, Ihe Ọma Niile Na-emere M Si n’Aka Gị”
Ndị Na-eto Eto, Unu Nwere Ike Ibi Ndụ Na-enye Obi Ụtọ
META EZIGBO NDỊ ENYI
11 Gụọ Abụ Ọma 16:3. Devid ma ihe ga-eme ka mmadụ nweta ezigbo ndị enyi. O “nwere mmasị” n’ebe ndị hụrụ Jehova n’anya nọ. Ebe a kpọrọ ha “ndị nsọ,” ha bụ ndị na-eme omume dị ọcha, na-akwụwakwa aka ha ọtọ. Ọbụ abụ ọzọ kwukwara ihe yiri ihe ahụ Devid kwuru gbasara ụdị ndị ọ na-emeta enyi. Ọ sịrị: “Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, bụrụkwa enyi ndị na-edebe iwu gị.” (Ọma 119:63) Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, i nwere ike inweta ọtụtụ ezigbo ndị enyi n’etiti ndị na-atụ egwu Jehova ma na-edebe iwu ya. Ha nwere ike ịbụ ndị nọ n’afọ ndụ dị iche iche.
“Na-ahụ Ịdị Mma Jehova”
Devid bụrụ abụ, sị, “Jehova bụ òkè e kenyere m nakwa iko e nyere m. Ị na-ejidesiri m òkè m ike. Ihe ị tụrụ atụ̀ inye m ka ọ bụrụ ihe nketa m dị mma.” (Ọma 16:5, 6) Obi dị Devid ụtọ maka “òkè” e kenyere ya, nke pụtara na obi dị ya ụtọ na ya na Jehova dị ná mma, ya enweekwa ihe ùgwù ịna-ejere ya ozi. Ihe nwere ike isiri anyị ike otú ahụ o siiri Devid. Ma, e nwere ọtụtụ ụzọ Jehova sirila gọzie anyị. N’ihi ya, ka ife Jehova na-atọ anyị ụtọ. Ka anyị jiri obi ụtọ na-ele ụlọ nsọ ihe atụ ya anya.
Debe Jehova n’Ihu Gị Mgbe Niile
2 Anyị niile nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl banyere ọtụtụ ndị a maara nke ọma, ndị dị ka, Ebreham, Sera, Mozis, Rut, Devid, Esta, na Pọl onyeozi, na ndị ọzọ. Ma, akụkọ banyere ọtụtụ ndị ọzọ a na-amachaghị nke ọma pụkwara ịbara anyị uru. Ịtụgharị uche n’akụkọ ndị dị na Baịbụl pụrụ inyere anyị aka ime ihe ọbụ abụ ahụ kwuru mgbe ọ sịrị: “Emewo m ka Jehova nọrọ n’ihu m mgbe niile. N’ihi na ọ nọ m n’aka nri, a gaghị eme ka m maa jijiji.” (Ọma 16:8) Gịnị ka okwu ndị a pụtara?
3 Onye agha na-ejikarị mma agha ya n’aka nri, nke pụtara na ọta o ji n’aka ekpe agaghị echebe akụkụ aka nri ya. Ma, o nweghị ihe ga-eme akụkụ aka nri ya ma ọ bụrụ na enyi ya nọ n’akụkụ aka nri ya na-alụ agha. Ọ bụrụ na anyị eburu Jehova n’uche mgbe niile ma na-eme uche ya, ọ ga-echebe anyị. Ugbu a, ka anyị hụ otú ịtụle akụkọ ndị e dere na Baịbụl pụrụ isi wusie okwukwe anyị ike ka anyị wee nwee ike ‘idebe Jehova n’ihu anyị mgbe niile.’—Bible Nsọ nke Union Version.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 714
Mkpụrụ Anya
Ọ bụrụ na e dekọta okwu Hibru bụ́ ʼi·shohnʹ (Diut. 32:10; Ilu 7:2) na ʽaʹyin ọnụ, ihe a ga-asụgharị ha ma e soro otú ndị Hibru si ekwu okwu bụ “obere nwoke dị n’anya.” Ọ bụrụkwa na e si otu ụzọ ahụ sụgharịa okwu Hibru bụ́ bath (nke pụtara nwa nwaanyị) n’Abụ Ákwá 2:18, ihe ọ ga-abụ bụ “nwa nwaanyị dị n’anya.” Ihe okwu abụọ ahụ pụtara bụ mkpụrụ anya. E dekọrọ okwu abụọ ahụ ọnụ n’Abụ Ọma 17:8 (ʼi·shohnʹ bath-ʽaʹyin). E soro otú ndị Hibru si ekwu okwu sụgharịa ha, ha ga-abụ “obere nwoke, nwa nwaanyị dị n’anya” (“mkpụrụ anya,” NW). Ọ ga-abụ na ihe mere e ji ekwu ya otú ahụ n’asụsụ Hibru bụ n’ihi otú mmadụ si adị obere ma ọ hụ onwe ya ná mkpụrụ anya onye ọzọ.
Anya bụ ihe na-esighị ike, obere ihe nwekwara ike ịkpatara ya nsogbu. Ọ bụrụgodị obere ntutu ma ọ bụ ájá banyere mmadụ n’anya, onye ahụ na-amata ozugbo. Mmadụ kwesịrị ịkpachara anya ka ihe ọ bụla ghara ime ya n’anya ojii ya n’ihi na ọ bụrụ na ihe e mee ya n’ebe ahụ ma ọ bụ na ọrịa emee ka ebe ahụ dịzie inyoghị inyoghị, onye ahụ agaghịzi na-ahụ ụzọ nke ọma, o nwekwara ike ikpu ìsì. Mgbe Baịbụl kwuru “mkpụrụ anya,” ihe ọ na-ekwu gbasara ya bụ ihe e ji kpọrọ ihe na ihe e kwesịrị ịkpachapụrụ ezigbo anya. Otú ahụ ka e kwesịrị isi jiri iwu Chineke kpọrọ ihe. (Ilu 7:2) Mgbe a na-ekwu otú Jehova si lekọta ndị Izrel otú nna si elekọta nwa ya, e kwuru na Diuterọnọmi 32:10 na o chebere ha “ka mkpụrụ anya ya.” Devid rịọrọ Chineke n’ekpere ka o chebe ya ma lekọta ya ka “mkpụrụ anya” ya. (Ọma 17:8) Ọ chọrọ ka Jehova gbatara ya ọsọ enyemaka ngwa ngwa ma ndị iro lụsowa ya ọgụ. (I nwere ike ịtụle Zek. 2:8. N’amaokwu a, e dere okwu Hibru bụ́ ba·vathʹ ʽaʹyin, ya bụ, “mkpụrụ anya.”)
MACH 11-17
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 18
“Jehova Bụ . . . Onye Na-anapụta M”
Ihe Atụ Ndị Dị na Baịbụl—Ị̀ Na-aghọta Ha?
Baịbụl jikwa Jehova tụnyere ihe ndị na-adịghị ndụ. A kpọrọ ya “Oké Nkume Izrel,” ‘nkume dị elu,’ nakwa ‘ebe e wusiri ike.’ (2 Samuel 23:3; Abụ Ọma 18:2; Diuterọnọmi 32:4) Olee ebe ihe ndị a na Jehova yiri? Otú ahụ oké nkume na-akwụrụ chịm, n’enweghị onye nwere ike ibupụ ya, ọ bụ otú ahụ ka Jehova Chineke nwere ike ịbụrụ gị ebe nchebe siri ike.
5 E nwere ọtụtụ ihe atụ n’akwụkwọ Abụ Ọma bụ́ ndị na-egosi àgwà dị iche iche Jehova nwere. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 84:11 kwuru na Jehova bụ “anyanwụ na ọta” n’ihi na ọ bụ ya na-enye anyị ìhè, ndụ, ume, ọ bụkwa ya na-echebe anyị. Ma, Abụ Ọma 121:5 kwuru na “Jehova bụ ndò gị n’aka nri gị.” Otú ahụ ndò si ekpuchi gị mgbe anwụ na-achasi ike, ọ bụkwa otú ahụ ka Jehova nwere ike ichebe ndị na-ejere ya ozi n’oge ọdachi, jiri “aka” ya ma ọ bụ “nku” ya kpuchie ha otú ahụ ndò si ekpuchi mmadụ.”—Aịzaya 51:16; Abụ Ọma 17:8; 36:7.
it-2 1161 ¶7
Olu
Chineke na-anụ olu ndị na-efe ya. Ndị na-efe Chineke n’ime mmụọ na n’eziokwu nwere ike ịkpọku ya, obi esie ha ike na ọ na-anụ olu ha n’agbanyeghị asụsụ ha ji kpọkuo ya. Ọ bụrụgodị na anyị ekwupụtaghị ihe anyị na-arịọ ekwupụta maka na anyị kwuru ya n’ime obi anyị, Chineke bụ́ onye na-enyocha obi mmadụ niile, “na-anụ” ma ọ bụ na-ege ntị n’ekpere anyị. (Ọma 66:19; 86:6; 116:1; 1 Sam. 1:13; Nehe. 2:4) Chineke na-anụ ákwá ndị na-ata ahụhụ na-ebe ka o nyere ha aka. Ọ na-anụkwa olu ndị na-emegide ya na ndị na-akpara ndị ohu ya nkata ọjọọ, marakwa ihe ha bu n’obi.—Jen. 21:17; Ọma 55:18, 19; 69:33; 94:9-11; Jere. 23:25.
Ihe Ga-enyere Gị Aka ma Ị Na-echegbu Onwe Gị
2. Chee otú Jehova si nyere gị aka n’oge gara aga. Ọ bụrụ na i chee ihe mere n’oge gara aga, ị̀ na-echeta ọnwụnwa ndị i diri ị na-agaraghị edili ma a sị na Jehova enyereghị gị aka? Ọ bụrụ na anyị echee gbasara otú Jehova si anọnyere anyị na otú o si nyere ndị fere ya n’oge gara aga aka, obi ga-erukwu anyị ala, anyị ana-atụkwasịkwu ya obi. (Ọma 18:17-19) Otu okenye aha ya bụ Joshua sịrị: “E nwere ebe m deturu ekpere ndị Jehova zara m. Ọ na-enyere m aka icheta oge ndị m rịọrọ Jehova otu ihe, ya emeekwara m ya otú ahụ m si rịọ ya.” N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe ndị Jehova meere anyị n’oge gara aga, ọ ga-enyere anyị aka ma anyị chegbuwe onwe anyị.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 432 ¶2
Ndị Cherob
Ndị cherob a abụghị ihe ụfọdụ ndị na-ekwu na ha bụ. Ha na-ekwu na ha bụ ihe ndị a kpụrụ akpụ na-emenye ụjọ, ndị e leere anya ná nnukwu arụsị ndị nwere nku mba ndị gbara ndị Izrel gburugburu na-efe kpụọ. Ndị omenala ndị Juu oge ochie doro anya kwekọrịtara na ndị cherob a yiri mmadụ (Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla n’okwu a). E leziri anya kpụọ ndị cherob a. A kpụrụ ha ka ha yie ndị mmụọ ozi mara ezigbo mma, kpụọkwa ihe niile gbasara ha ka ha “dị nnọọ ka ihe atụ” Jehova gosiri Mosis. (Ọpụ. 25:9) Pọl onyeozi kwuru na ha bụ “ndị cherob dị ebube, ndị ji nku ha sachie okwuchi igbe” ọgbụgba ndụ. (Hib. 9:5) A na-ekwukarị gbasara ndị cherob a ma e kwuwe gbasara ebe Jehova nọ. Jehova gwara Mosis, sị: “M ga-apụta n’ihu gị n’ebe ahụ wee si n’elu okwuchi igbe ahụ gwa gị okwu. M ga-esi n’agbata cherob abụọ ahụ dị n’elu igbe ọgbụgba ndụ ahụ mee ka ị mara ihe niile.” (Ọpụ. 25:22; Ọnụ Ọgụ. 7:89) Ọ bụ ya mere e ji kwuo na Jehova “nọ n’ocheeze dị n’elu [ma ọ bụ, n’etiti] ndị cherob.” (1 Sam. 4:4; 2 Sam. 6:2; 2 Eze 19:15; 1 Ihe 13:6; Ọma 80:1; 99:1; Aịza. 37:16) Ndị cherob ahụ “na-anọchi anya ụgbọ ịnyịnya” Jehova na-agba (1 Ihe 28:18). Nku ndị cherob ahụ na-egosi otú Jehova si echebe ndị ya na otú o si eme ya ngwa ngwa. Ọ bụ ya mere na mgbe Devid na-ede abụ gbasara otú Jehova si bịa nyere ya aka, o kwuru na Jehova “nọ n’elu cherob, fere efe bịa” nakwa na “ọ nọ n’elu nku otu mmụọ ozi.”—2 Sam. 22:11; Ọma 18:10.
MACH 18-24
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 19-21
“Eluigwe Na-akọsa Ebube Chineke”
Ka Mmadụ Nile Kpọsaa Ebube Jehova
DEVID, nwa Jesi, tolitere dị ka nwata nwoke na-azụ atụrụ n’ógbè Betlehem. Lee ka ọ na-aghaghị isiwo kirie ọtụtụ mgbe eluigwe sara mbara nke kpakpando jupụtara n’abalị dị jụụ mgbe ọ na-elekọta ìgwè atụrụ nna ya n’ebe ndị ahụ dara owu atụrụ na-ata nri! Obi abụọ adịghị ya na ihe ndị ahụ ọ hụrụ gbatara ya n’uche mgbe o ji ike mmụọ nsọ Chineke rọọ ma bụọ abụ ahụ mara mma dị n’Abụ Ọma nke 19, sị: “Eluigwe na-akpọsa ebube Chineke; mbara ígwé na-akọkwa banyere ọrụ aka ya. Eriri ha ji atụ ihe agazuwo n’ime ụwa dum, olu okwu ha eruwokwa ná nsọtụ elu ala.”—Abụ Ọma 19:1, 4, NW.
2 N’ejighị okwu ọnụ, n’ekwughị okwu, n’ejighị olu, eluigwe dị ebube Jehova kere eke na-akpọsa ebube ya, site n’otu ụbọchị ruo ụbọchị ọzọ, site n’otu abalị ruo abalị ọzọ. Ihe e kere eke na-akpọsa ebube Chineke n’akwụsịghị akwụsị, ịtụle ihe akaebe a na-adịghị ekwu okwu nke ndị nile bi n’ime “ụwa dum” na-ahụ na-eme ka anyị dị umeala n’obi. Otú ọ dị, àmà ihe e kere eke na-agba n’ekwughị okwu ezughị. A gbara ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ume ka ha jiri olu na-ada ụda sonye. Otu ọbụ abụ a na-akpọghị aha gwara ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ofufe okwu ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ, sị: “Kwuonụ na Jehova dị ebube, dịkwa ike. Nyenụ Jehova otuto dịịrị aha Ya.” (Abụ Ọma 96:7, 8, NW) Ndị ha na Jehova nwere mmekọrịta chiri anya na-enwe obi ụtọ imeghachi omume n’agbamume ahụ. Otú ọ dị, gịnị ka inye Chineke otuto gụnyere?
Ihe E Kere Eke Na-akpọsa Ebube Chineke!
8 Devid na-akọwazi ịdị ebube ọzọ nke ihe Jehova kere eke, sị: “O doworo anyanwụ ụlọikwuu n’ime ha [eluigwe a na-ahụ anya]. Anyanwụ ahụ dịkwa ka nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ nke na-esi n’ụlọ ndina ya pụta, obi na-atọ ya ụtọ dị ka nwoke dị ike ịgbaso ụzọ ya. Site n’otu nsọtụ eluigwe ka mpụta ya dị, ịgba gburugburu ya dịrukwara nsọtụ ya nile: ọ dịghịkwa ihe e zonarịworo okpomọkụ ya.”—Abụ Ọma 19:4-6.
9 E jiri anyanwụ tụnyere kpakpando ndị ọzọ, ọ bụ nnọọ kpakpando na-ebuchaghị ibu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ kpakpando dị ịrịba àmà, na-eme ka mbara ala ndị na-agba ya gburugburu pee nnọọ mpe. Otu akwụkwọ na-ekwu na ọ dị “otu ijeri ijeri tọn ụzọ abụọ n’ibu—pasent 99.9 nke ibu usoro mbara igwe anyị! Ike ndọda ya na-eme ka ụwa na-agba ya gburugburu n’ebe ịdị anya ya dị nde kilomita 150 n’apụghị n’ọnọdụ ya ma ọ bụ bụrụ nke a dọtakwuru nso n’anyanwụ. Ọ bụ nanị ihe dị ka otu ụzọ n’ime ijeri abụọ nke ikike anyanwụ na-erute na mbara ala anyị, ma nke ahụ zuru ime ka ndụ dịgide.
10 Ọbụ abụ ahụ na-ekwu banyere anyanwụ n’ụzọ ihe atụ, na-eji ya atụnyere “nwoke dị ike” nke na-esi n’otu nsọtụ mbara igwe agbaga ná nsọtụ nke ọzọ n’ehihie ma na-alakpu ‘n’ụlọikwuu’ n’abalị. Mgbe kpakpando ahụ dị ike na-abami ná nsọtụ nke mbara igwe, site n’ebe anyị nọ na-ahụ ya n’ụwa, ọ na-eyi ka ọ̀ na-aba ‘n’ụlọikwuu,’ dị ka à ga-asị na ọ na-aga izu ike. N’ụtụtụ, ọ na-eyi ka ọ̀ na-etiwapụta, na-egbukepụ nnọọ ‘dị ka nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ nke na-esi n’ụlọ ndina ya pụta.’ Dị ka onye ọzụzụ atụrụ, Devid maara banyere oké oyi na-atụ n’abalị. (Jenesis 31:40) O chetara otú anyanwụ na-esi eme ka ahụ́ ya na ala dị ya gburugburu kporo ọkụ ngwa ngwa. N’ụzọ doro anya, ike adịghị agwụ anyanwụ na “njem” ya site n’ọwụwa anyanwụ ruo ọdịda anyanwụ kama ọ dị ka “nwoke dị ike,” na-adị njikere imeghachi njem ahụ.
Ihe Ndị E Kere Eke Na-egosi na Chineke Dị
Leruo Ihe Ndị Jehova Kere Eke Anya: Jizọs gwara anyị ka anyị ‘leruo anụ ufe nke eluigwe anya’ ma ‘mụta ihe site n’okooko lili dị n’ọhịa.’ (Mat. 6:26, 28) Anyị mee otú ahụ, okwukwe anyị ga-esikwu ike, anyị agaghịkwa enwe obi abụọ ma è nwere onye kere ha. Ihe ọzọkwa bụ na ọ ga-eme ka anyị ghọtakwuo amamihe dị egwu Jehova nwere, meekwa ka obi sie anyị ike na ọ hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ ga-anapụta anyị ma anyị nwee nsogbu. Ekwela ka mere nke a na nke ọzọ juru n’ụwa megharịa gị anya. Wepụta oge leruo ihe ndị Jehova kere eke anya ma hụ otú ha si dị egwu. Ka ị na-ele ha, gbalịa ka ị ghọta ihe ha na-akọrọ gị gbasara Chineke.—Ọma 19:1.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị Ga-eyipụli “Àgwà Ochie”
Ka obi sie gị ike na ihe ọ bụla Jehova chọrọ ka i mee kacha mma. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ọ bụla Jehova sịrị anyị mee, ọ ga-abara anyị uru. Ndị na-eme ihe Jehova chọrọ na-enwe obi ụtọ, ndụ ha na-enwe isi, obi na-esikwa ha ike na ha bara uru. (Ọma 19:7-11) Ma ndị na-achọghị ime ihe Jehova kwuru na-ata ahụhụ n’ihi na ha na-eme ihe na-agụ ahụ́ ha agụụ. Ka anyị lee ihe otu nwoke aha ya bụ Elie kwuru gbasara mmadụ ịkwụsị ime ihe Jehova chọrọ. Ndị mụrụ ya kụziiri ya ịhụ Jehova n’anya. Ma mgbe Elie na-eto eto, ọ malitere iso ndị ọjọọ. Ha mere ka ọ ṅụwa ọgwụ ọjọọ, na-eme omume rụrụ arụ, na-ezukwa ohi. Elie chọpụtara na ọ na-ewezi iwe ọkụ, na-emekwa tigbuo zọgbuo. O kwuru, sị: “M bidoro ịna-eme ihe niile a kụziiri m na Onye Kraịst ekwesịghị ime.” Ma Elie echefughị ihe a kụziiri ya mgbe ọ ka na-eto eto. O mechara malite ịmụ Baịbụl ọzọ. Ọ gbasiri mbọ ike kwụsị àgwà ọjọọ ndị ọ na-akpa ma mechaa mee baptizim n’afọ 2000. Olee otú ibi ndụ otú Jehova chọrọ si baara ya uru? Elie kwuru, sị: “Obi na-eruzi m ala ugbu a. Akọnụche m anaghịkwa ama m ikpe.” Akụkọ a kụziiri anyị na ndị jụrụ ime ihe Jehova chọrọ na-akpatara onwe ha nsogbu. Ma, Jehova dịkwa njikere inyere ha aka ịgbanwe.
MACH 25-31
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 22
Amụma Ndị E Buru Gbasara Ọnwụ Jizọs
Ha Hụrụ Mesaya Ahụ!
16 Ọ ga-adị ka Chineke ọ̀ gbahapụrụ Mesaya ahụ. (Gụọ Abụ Ọma 22:1.) Dị ka e buru n’amụma, “n’oge awa nke itoolu kwa [ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie], Jizọs tiri mkpu n’oké olu, sị: ‘Eli, Eli, lama sabaktani?’ nke pụtara, ma a sụgharịa ya: ‘Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji gbahapụ m?’” (Mak 15:34) Nke a apụtaghị na Jizọs atụkwasịghịzi Nna ya nke eluigwe obi. Otú Chineke si gbahapụ Jizọs bụ na ọ gbara nkịtị ka ndị iro Kraịst gbuo ya. O si otú ahụ nye ohere ka Jizọs gosi ma ọ̀ ga-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. Mkpu ahụ Jizọs tiri mezuru ihe e dere n’Abụ Ọma 22:1.
Ha Hụrụ Mesaya Ahụ!
13 Devid buru amụma na ndị mmadụ ga-ekwujọ Mesaya ahụ. (Gụọ Abụ Ọma 22:7, 8.) E kwujọrọ Jizọs mgbe ọ na-ahụsi anya n’osisi ịta ahụhụ. Matiu dere, sị: “Ndị na-agafe agafe malitere ikwujọ ya, na-efufe isi ha, na-asị: ‘Gị onye ga-akwatu ụlọ nsọ, onye ga-ewukwa ya n’ụbọchị atọ, zọpụta onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si n’osisi ịta ahụhụ ahụ rịdata!’” Ndị isi nchụàjà, na ndị odeakwụkwọ, na ndị okenye jikwa ya na-eme ihe ọchị, sị: “Ọ zọpụtara ndị ọzọ; ọ pụghị ịzọpụta onwe ya! Ọ bụ Eze Izrel; ya si n’osisi ịta ahụhụ rịdata, anyị ga-ekwerekwa na ya. Ọ tụkwasịrị Chineke obi; Ya napụta ya ugbu a ma ọ bụrụ na ihe ya masịrị Ya, n’ihi na ọ sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke.’” (Mat. 27:39-43) N’agbanyeghị ihe ndị a niile, Jizọs ekwutọgwaraghị ha. Nke a bụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya.
Ha Hụrụ Mesaya Ahụ!
14 A ga-efe nza maka uwe Mesaya ahụ. Devid dere, sị: “Ha kere uwe m n’etiti onwe ha, ha fekwara nza maka uwe m.” (Ọma 22:18) Ihe a o kwuru mezuru n’ihi na “mgbe [ndị agha Rom] kpọgidere [Jizọs] n’osisi, ha kere uwe elu ya site n’ife nza.”—Mat. 27:35; gụọ Jọn 19:23, 24.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ịkwanyere Nnọkọ Anyị Ndị Dị Nsọ Ùgwù
7 E nwere ụzọ ndị gbara ọkpụrụkpụ anyị pụrụ isi gosi na anyị na-akwanyere nnọkọ anyị ùgwù. Otu n’ime ha bụ ịnọ ya mgbe a na-abụ abụ Alaeze. Ụfọdụ n’ime abụ ndị a dị n’ụdị ekpere, e kwesịkwara iji nsọpụrụ bụọ ha. Mgbe Pọl onyeozi na-ede banyere Jizọs, o hotara ihe e dere n’Abụ Ọma nke 22, sị: “M ga-akpọsara ụmụnna m aha gị; n’etiti ọgbakọ ka m ga-eji abụ na-eto gị.” (Ndị Hibru 2:12) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhụ na anyị na-anọ n’oche anyị tupu a kpọpụta abụ a ga-abụ ma soro bụọ ya ma na-echebara okwu ndị e ji dee ha echiche. Ka anyị gosipụta site n’iso na-abụ abụ na anyị nwere echiche yiri nke ọbụ abụ ahụ bụ́ onye dere, sị: “M ga-ewere obi m nile kelee Jehova, n’izu nzuzo nke ndị ziri ezi, na n’ime nzukọ Izrel.” (Abụ Ọma 111:1) Ee, otu ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-abịa nzukọ anyị n’oge ma nọrọ ya ruo mgbe ọmụmụ ihe gbasara bụ iji soro bụkuo Jehova abụ otuto.
Too Jehova ‘n’Etiti Mkpọkọta Ya’
Taa, dịkwa ka ọ dị n’oge ochie, e mewo ndokwa ka ndị kwere ekwe n’otu n’otu na-ekwupụta okwukwe ha ‘n’etiti mkpọkọta Jehova.’ Otu ohere mmadụ nile nwere bụ ịza ajụjụ ndị a na-ajụ ndị na-ege ntị ná nzukọ ọgbakọ. Ya adịla mgbe ị ga-eleda ezi ihe nke a pụrụ ịrụpụta anya. Dị ka ihe atụ, azịza ndị na-egosi otú e si emeri ma ọ bụ otú e si ezere nsogbu dị iche iche na-eme ka mkpebi ụmụnna anyị ịgbaso ụkpụrụ Bible sikwuo ike. Azịza ndị na-akọwa akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha a na-ehotaghị ehota, ma ọ bụ ndị na-agụnye echiche ndị e nwetara mgbe a na-eme nchọpụta onwe onye pụrụ inyere ndị ọzọ aka ịzụlite àgwà ọmụmụ ihe ka mma.
EPREL 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 23-25
“Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”
“Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”
Jehova na-edu atụrụ ya. Ọ bụrụ na atụrụ enweghị onye na-azụ ya, ọ ga-efu ụzọ. Otú ahụkwa ka anyị ga-efu ụzọ ma ọ bụrụ na anyị enweghị onye ga-enyere anyị aka ịma ezigbo ụzọ anyị ga-eso ná ndụ. (Jeremaya 10:23) Devid kwuru na Jehova na-eduga ndị ya “n’ebe ịta nri nke ahịhịa jupụtara” nakwa “n’ebe izu ike nke mmiri jupụtara.” Ọ na-edu ha “n’ụzọ ezi omume.” (Amaokwu nke 2, 3) Ihe ndị a e kwuru banyere ịzụ atụrụ na-eme ka obi sie anyị ike na anyị nwere ike ịtụkwasị Chineke obi. Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Chineke gwara anyị na Baịbụl, anyị ga-enwe obi ụtọ ná ndụ, ahụ́ ga-erukwa anyị ala.
“Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”
Jehova na-echebe atụrụ ya. Ọ bụrụ na onye ọzụzụ atụrụ anọghị, ụjọ na-ejide atụrụ, ha anaghịkwa ama ihe ha ga-eme eme. Jehova gwara ndị ya na ha ekwesịghị ịtụ egwu, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ha na-eje “ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị,” ya bụ, oge o yiri ka ihe ọ̀ kacha siere ha ike ná ndụ. (Amaokwu nke 4) Jehova na-elekọta ha, ọ dịkwa njikere inyere ha aka mgbe ọ bụla. Ọ na-enye ndị na-efe ya amamihe na ike ha ga-eji die ọnwụnwa ndị na-abịara ha.—Ndị Filipaị 4:13; Jems 1:2-5.
“Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”
Jehova na-enye atụrụ ya nri. Atụrụ anaghị eji aka ha achọtara onwe ha nri. Ọ bụ onye na-azụ ha na-achọtara ha nri. Nri ime mmụọ dị anyị mkpa, ọ bụkwa naanị Chineke ga-enyere anyị aka inweta ya. (Matiu 5:3) Obi dị anyị ụtọ na Jehova na-emesapụ aka, ọ na-edozi tebụl ọtụtụ ihe oriri jupụtara n’ihu ndị ohu ya. (Amaokwu nke 5) Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, dị ka magazin a ị na-agụ, socha ná nri ime mmụọ ndị na-enyere anyị aka ịma ihe mere anyị ji dị ndụ na ihe Chineke zubere imere anyị.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Jiri Obi Gị Dum Hụ Ezi Omume n’Anya
JEHOVA ji Okwu ya na mmụọ nsọ ya na-edu ndị ya “n’ụzọ ezi omume.” (Ọma 23:3) Ma ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị na-akwụsị ije ije n’ụzọ ezi omume mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na nke a emee, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị wee maliteghachi ime ihe ziri ezi. Gịnị ga-enyere anyị aka ịmaliteghachi ime ihe ziri ezi? Anyị ga-ahụrịrị ezi omume n’anya otú ahụ Jizọs si hụ ya n’anya.—Gụọ Abụ Ọma 45:7.
2 Gịnị bụ ‘ụzọ ezi omume’? Ihe e ji ama ụzọ ezi omume bụ iwu Jehova nyere banyere ihe ziri ezi. N’asụsụ Hibru na nke Grik, “ezi omume” pụtara “ihe ziri ezi,” ya bụ, omume ọma. Ebe ọ bụ na Jehova bụ “ebe obibi nke ezi omume,” ndị ohu ya na-eji obi ụtọ atụkwasị ya obi ka ọ gwa ha ụzọ dị mma ha ga-eso.—Jere. 50:7.
3 Ọ bụ naanị mgbe anyị ji obi anyị niile na-agbasi mbọ ike ime ihe ziri ezi n’anya Chineke ka a ga-ekwu na anyị na-eme nnọọ ihe ọ chọrọ. (Diut. 32:4) Ihe mbụ anyị ga-eme ka anyị wee mee nke a bụ ịma ihe niile anyị ga-amatali banyere Jehova Chineke n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị ana-amụkwu banyere Chineke, na-abịarukwu ya nso kwa ụbọchị, anyị ga-ahụkwu ezi omume ya n’anya. (Jems 4:8) Anyị kwesịkwara ịtụle ihe e kwuru n’Okwu Chineke nke e dere n’ike mmụọ nsọ mgbe anyị chọrọ ime mkpebi ndị dị mkpa ná ndụ.
EPREL 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 26-28
Ihe Devid Mere Ka O Nwee Ike Ijidesi Jehova Aka Ike
Na-eje Ije n’Ụzọ nke Iguzosi Ike n’Ezi Ihe
8 Devid kpere ekpere, sị: “Nwaa m, Jehova, nwapụtakwa m; nụchaa akụrụ m abụọ na obi m.” (Abụ Ọma 26:2) Akụrụ dị n’ime ime ahụ́. N’ụzọ ihe atụ, akụrụ na-anọchi anya echiche na mmetụta ndị kasị mie emie nke mmadụ. Obi ihe atụ bụ mmadụ ime n’ozuzu—mkpali, mmetụta, na ọgụgụ isi ya. Mgbe Devid rịọrọ Jehova ka ọ nwaa ya, ihe o kpere ekpere ya n’ezie bụ ka o nyochaa echiche na mmetụta ya ndị kasị mie emie.
9 Devid rịọrọ ka a nụchaa akụrụ na obi ya. Olee otú Jehova si anụcha ihe anyị bụ n’ime? Devid bụrụ, sị: “M ga-agọzi Jehova, Onye dụworo m ọdụ: ọzọ, akụrụ m abụọ na-adọ m aka ná ntị n’abalị nile.” (Abụ Ọma 16:7) Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ọ pụtara na ndụmọdụ Chineke ruru n’akụkụ ndị kasị mie emie nke ahụ́ Devid ma dịgide n’ebe ndị ahụ, na-agbazi echiche na mmetụta ya ndị kasị mie emie. Otú ahụkwa ka ọ pụrụ imere anyị ma ọ bụrụ na anyị ejiri ekele na-atụgharị uche na ndụmọdụ anyị na-enweta site n’Okwu Chineke, n’aka ndị nnọchianya ya, na site ná nzukọ ya ma kwe ka ọ dịgide n’ime anyị. Ikpegara Jehova ekpere mgbe nile ka o si otú a nụchaa anyị ga-enyere anyị aka ije ije n’iguzosi ike n’ezi ihe.
Na-eje Ije n’Ụzọ nke Iguzosi Ike n’Ezi Ihe
12 N’izo aka n’ihe ọzọ mere ka ọ nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, Devid kwuru, sị: “Mụ na mmadụ efu anọkọghị; mụ na ndị ihu abụọ adịghị abakọkwa. Akpọwo m mkpọkọta ndị na-eme ihe ọjọọ asị, mụ na ndị na-emebi iwu adịghị anọkọkwa.” (Abụ Ọma 26:4, 5) Devid agaghị anwa anwa soro ndị na-emebi iwu nọkọọ. Ọ kpọrọ mkpakọrịta ọjọọ asị.
13 Gịnị banyere anyị? Ànyị na-ajụ iso mmadụ efu anọkọ site n’ihe omume telivishọn, ihe nkiri vidio, sinima, ógbè Intanet, ma ọ bụ site n’ụzọ ndị ọzọ? Ànyị na-agbara ndị ihu abụọ ọsọ? Ụfọdụ ndị n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọrụ anyị pụrụ ime ka hà bụ ndị enyi anyị iji mezuo nzube ọjọọ ha. Ànyị chọrọ n’ezie iso ndị na-adịghị eje ije n’eziokwu nke Chineke na-akpachi anya? Ọ bụ ezie na ha ga na-eme ka hà bu ezi ihe n’obi, ndị si n’ezi ofufe dapụ pụkwara izochi ebumnobi ha bụ́ ịdọpụ anyị n’ijere Jehova ozi. Gịnị ma ọ bụrụ na e nwere ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-ebi ụdị ndụ abụọ? Ha onwe ha kwa na-ezochi ihe ha bụ n’ezie. Jayson, bụ́ onye na-eje ozi ugbu a dị ka ohu na-eje ozi, nwere ndị enyi dị otú ahụ mgbe ọ na-eto eto. Ọ na-ekwu banyere ha, sị: “Otu ụbọchị, otu n’ime ha gwara m, sị: ‘Ihe anyị na-eme ugbu a adịghị ihe o mere n’ihi na mgbe usoro ihe ọhụrụ ga-abịa, anyị ga-abụ ndị nwụrụ anwụ. Anyị agaghị ama na ọ dị ihe na-efunahụ anyị.’ Okwu dị otú ahụ meghere m anya. Achọghị m ịbụ onye nwụrụ anwụ mgbe usoro ihe ọhụrụ ga-abịa.” Jayson ji amamihe gbubie mkpakọrịta ya na ndị dị otú ahụ. “Ka a ghara iduhie unu,” ka Pọl onyeozi na-adọ aka ná ntị. “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Lee ka o si dị oké mkpa ka anyị zere mkpakọrịta ọjọọ!
Na-eje Ije n’Ụzọ nke Iguzosi Ike n’Ezi Ihe
17 Ụlọikwuu ahụ, ya na ebe ịchụàjà ya, bụ ebe a nọ fee Jehova n’Izrel. N’igosipụta obi ụtọ o nwere ịnọ n’ebe ahụ, Devid kpere ekpere, sị: “Jehova, ahụwo m ebe obibi nke ụlọ Gị n’anya, ya na ọnọdụ nke ebe obibi nke ebube Gị.”—Abụ Ọma 26:8.
18 Ọ̀ na-amasị anyị izukọ n’ebe ndị anyị na-anọ amụ ihe banyere Jehova? Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla na usoro ihe omume ime mmụọ ya chiri anya na-eje ozi dị ka ebe ezi ofufe hiwere isi n’obodo. Tụkwasị na nke ahụ, kwa afọ, anyị na-enwe mgbakọ distrikti, mgbakọ sekit, na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche. A na-atụle “ihe àmà” Jehova ná nzukọ ndị dị otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị amụta ‘ịhụ ha n’anya nke ukwuu,’ ọ ga na-agụsi anyị agụụ ike ịga nzukọ, anyị ga na-egekwa ntị mgbe anyị nọ n’ebe ndị ahụ. (Abụ Ọma 119:167) Lee ka o si bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ iso ndị kwere ekwe ibe anyị na-anọkọ bụ́ ndị nwere mmasị n’ọdịmma anyị na ndị na-enyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe!—Ndị Hibru 10:24, 25.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Jehova Na-anapụta Onye E Wedara n’Ala
15 Ọbụ abụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmara na ịhụnanya Jehova karịrị nke nne ma ọ bụ nna ọ bụla bụ́ mmadụ! Ọ bụ ezie na nne ma ọ bụ nna gị imegbu ma ọ bụ ịgbahapụ gị pụrụ iwute gị nke ukwuu, ọ gaghị emetụta otú Jehova hụruru gị n’anya. (Ndị Rom 8:38, 39) Cheta na Chineke na-adọta ndị ọ hụrụ n’anya n’ebe ọ nọ. (Jọn 3:16; 6:44) N’agbanyeghị otú ụmụ mmadụ siworo kpasoo gị àgwà, Nna gị nke eluigwe hụrụ gị n’anya!
EPREL 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 29-31
Chineke Na-adọ Anyị Aka ná Ntị Maka na Ọ Hụrụ Anyị n’Anya
it-1 802 ¶3
Ihu
E nwere ihe dị iche iche ‘izo ihu’ pụtara. Ọ dabeere n’ihe a na-ekwu. E kwuo na Jehova Chineke zoro ihu ya, ọ na-apụtakarị na ọ kwụsịrị ime amara ma ọ bụ na ọ kwụsịrị inye mmadụ ike ya. O nwere ike ime ya ma otu onye ma ọ bụ ìgwè mmadụ nupụrụ ya isi, otú ahụ mba Izrel mere. (Job 34:29; Ọma 30:5-8; Aịza. 54:8; 59:2) Mgbe ụfọdụ, o nwekwara ike ịpụta na Jehova gbachigodịrị nkịtị, ọ chọbeghịkwa ime ihe a na-arịọ ya n’ihi na ọ na-eche ka oge ya ruo. (Ọma 13:1-3) Mgbe Devid rịọrọ Jehova, sị, “Elezila mmehie m anya,” ihe ọ na-ekwu bụ ka Jehova gbaghara ya mmehie ndị o mere.—Ọma 51:9; i nwere ike ịtụle Ọma 10:11.
Inwe Obi Ụtọ Ichere Jehova
A pụrụ iji uru anyị na-erite site n’ịdọ aka ná ntị na-esite n’aka Chineke tụnyere ụzọ mkpụrụ osisi si eji nke nta nke nta ebu ruo mgbe ọ chara. Bible kwuru banyere ịdọ aka ná ntị na-esite n’aka Chineke, sị: “Nye ndị e jiworo ya zụọ, ọ na-amịrị ha mkpụrụ udo, ya bụ, ezi omume.” (Ndị Hibru 12:11) Dị nnọọ ka mkpụrụ osisi si ewe oge tupu ya achaa, anyị chọrọ oge iji gbanwee àgwà anyị, iji gosi na ọzụzụ Chineke na-enye anyị na-eru anyị n’ahụ́. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a napụ anyị ihe ùgwù ije ozi ụfọdụ anyị nwere n’ọgbakọ n’ihi àgwà ọjọọ anyị kpara, anyị ịdị njikere ichere Chineke ga-eme ka anyị ghara ịda mbà ma kwụsị ijere Jehova ozi. N’ọnọdụ ndị dị otú a, okwu Devid e dere n’ike mmụọ nsọ na-agba anyị ume: “Nanị otu ntabi anya na-agabiga n’iwe [Chineke]; ogologo ndụ nile na-agabiga na mgbe ihe anyị na-atọ Ya ụtọ: N’anyasị ịkwa ákwá ga-abịa ịnọ ọnọdụ abalị, ma n’ụtụtụ iti mkpu ọṅụ ga-adị.” (Abụ Ọma 30:5) Oge anyị ‘ga-eti mkpu ọṅụ’ na-abịa ma ọ bụrụ na anyị amụta ichere Jehova ma na-etinye ndụmọdụ ndị anyị na-enweta n’Okwu Chineke na nzukọ ya n’ọrụ.
Gịnị Bụ Ezigbo Nchegharị?
18 Onye a chụrụ n’ọgbakọ kwesịrị ịna-abịachi ọmụmụ ihe anya, na-emekwa ihe ndị okenye gwara ya nke bụ́ ikpechi ekpere anya na ịmụchi ihe anya iji gosi na o ji obi ya niile chegharịa. O kwesịkwara ịgbalịsi ike zere ihe ndị ahụ mere o ji mee mmehie. Ọ bụrụ na ọ gbalịsie ike mee ka ya na Jehova dịghachi ná mma, obi ga-esi ya ike na Jehova ga-agbaghara ya kpamkpam. Ndị okenye ga-anabatakwa ya n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ndị okenye elebawa okwu onye mere mmehie anya, ha na-eburu n’obi na okwu nke ọ bụla dị iche n’ibe ya. N’ihi ya, ha na-asa anya ná mmiri eleba okwu nke ọ bụla anya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi Mbụ nke Akwụkwọ Abụ Ọma
31:23—Olee otú e si akwụghachibịga onye mpako ókè? Ụgwọ ọrụ a na-ekwu okwu ya n’ebe a bụ ntaramahụhụ. Onye ezi omume na-enweta ụgwọ ọrụ nke mmejọ ọ na-elezighị anya mee n’ụdị ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Jehova. Ebe ọ bụ na onye mpako adịghị echegharị n’ihe ọjọọ ya, a na-eji ntaramahụhụ siri ike akwụghachibiga ya ụgwọ ókè.—Ilu 11:31; 1 Pita 4:18.
EPREL 22-28
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 32-33
Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ikwupụta Mmehie Dị Oké Njọ?
Ebere Jehova Na-azọpụta Anyị Pụọ N’obi Nkoropụ
7 Ọ bụrụ na ikpe ajọ mmebi nke iwu Chineke ama anyị, ọ pụrụ isiri anyị ike ikwupụta mmehie anyị, ọbụna nye Jehova. Gịnị pụrụ ime n’ọnọdụ ndị ahụ? N’Abụ Ọma nke 32, Devid kwetara, sị: “Mgbe m gbara nkịtị [kama ikwupụta mmehie], ọkpụkpụ m nile kara nká site n’ọgbụgbọ ụja m ogologo ụbọchị nile. N’ihi na ehihie na abalị aka gị [Jehova] dị arọ n’ahụ m: ume m gbanwere n’ihe ịkpọ nkụ nke ụgụrụ.” (Amaokwu nke 3, 4) Ịnwa ikpuchi mmehie ya na ịbịada akọ na uche nọ n’ikpe ọmụma mere ka ike gwụ Devid na-agahie agahie. Oké ahụhụ belatara ume ya nke ukwuu nke na o yiri ka osisi ụkọ mmiri ji nke na-enweghị mmiri na-enye ndụ. N’ezie, ọ pụrụ nnọọ inwewo mmetụta ọjọọ n’uche na n’elu ahụ. Ka o sina dị, ọ tụfuru ọṅụ ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị achọta onwe anyị n’ọnọdụ yiri ya, gịnị ka anyị kwesịrị ime?
Chineke nke “Dị Njikere Ịgbaghara Mmehie”
8 Devid, bụ́ onye nwere nchegharị kwuru, sị: “Ana m emerị ka Ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m: . . . Gị onwe gị [gbaghaara, NW] ajọ omume nke mmehie m.” (Abụ Ọma 32:5, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Okwu bụ́ “gbaghaara” na-asụgharị okwu Hibru nke pụtara n’ụzọ bụ́ isi “bulie” ma ọ bụ “buru.” Otú e si jiri ya mee ihe n’ebe a na-egosi iwezụga “obi amamikpe, mmehie, njehie.” Ya mere, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Jehova buuru mmehie Devid bupụ ha. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a belatara obi amamikpe nke Devid nọworo na-enwe. (Abụ Ọma 32:3) Anyị onwe anyị kwa pụrụ inwe obi ike zuru ezu n’ebe Chineke nọ, bụ́ onye na-ebupụ mmehie nke ndị na-achọ mgbaghara ya ná ndabere nke okwukwe ha nwere n’àjà mgbapụta Jizọs.—Matiu 20:28.
Nkwupụta Mmehie nke Na-eduga n’Ọgwụgwọ
Mgbe Devid kwupụtasịrị mmehie ya, ọ dabaghị n’inwe mmetụta na-ezighị ezi nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe. Ihe ndị o kwuru n’Abụ Ọma ndị o dere banyere nkwupụta mmehie na-egosipụta ahụ efe o nwetara na mkpebi ya siri ike ijere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Lee, dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma nke 32. N’amaokwu nke 1, anyị na-agụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ onye e bupụworo njehie ya, onye e kpuchiworo mmehie ya.” N’agbanyeghị otú mmehie jọruru ná njọ, ọ bụrụ na mmadụ ejiri ezi obi nwee ncheghari, o kwere omume ịrụpụta obi ụtọ. Otu ụzọ isi gosipụta ezi obi a bụ site n’ịnabata ihe nile si n’ihe mmadụ mere pụta, dị ka Devid mere. (2 Samuel 12:13) Ọ nwaghị igosi Jehova na ihe o mere ziri ezi ma ọ bụ nwaa ịta ndị ọzọ ụta. Amaokwu nke 5 na-ekwu, sị: “Ana m emerị ka Ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m: m sịrị, M ga-ekwupụtara Jehova njehie m nile; Gị onwe gị bupụkwara ajọ omume nke mmehie m.” Ezi nkwupụta mmehie na-eweta ahụ efe, nke na ọ dịghịzi mmadụ mkpa inwe akọ na uche na-ama ikpe n’ihi mmehie ndị gara aga o mere.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi Mbụ nke Akwụkwọ Abụ Ọma
33:6—Gịnị bụ “iku ume” nke ọnụ Jehova? Iku ume ahụ bụ ike Chineke nke nọ n’ọrụ, ma ọ bụ mmụọ nsọ ya, bụ́ nke o ji kee eluigwe nkịtị. (Jenesis 1:1, 2) A kpọrọ ya iku ume nke ọnụ ya n’ihi na, dị ka nku ume siri ike, a pụrụ izipụ ya ịrụ ọrụ n’ebe dị anya.
EPREL 29–MEE 5
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE| ABỤ ỌMA 34-35
“Na-eto Jehova Mgbe Niile”
Ka Anyị Bulie Aha Jehova Elu n’Otu
11 “M ga-agọzi Jehova na mgbe nile: mgbe nile ka otuto Ya ga-adị n’ọnụ m.” (Abụ Ọma 34:1) Mgbe Devid na-awagharị dị ka onye a jụrụ ajụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na o nwere ọtụtụ mkpa, ma dị ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ a gosiri, o kweghị ka mkpa ya ndị a gbochie ya ịnọgide na-eto Jehova. Nke a bụụrụ anyị ezi ihe nlereanya mgbe ihe na-esiri anyị ike! Ma anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ, mgbe anyị na Onye Kraịst ibe anyị nwere nghọtahie, ma ọ bụ mgbe anyị na-enwe ihe isi ike n’ozi ubi, ihe mbụ anyị kwesịrị ibute ụzọ bụ ito Jehova. Anyị nwere nnọọ ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-eto Jehova. Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ ihe ndị magburu onwe ha Jehova kere bụ́ ndị pụrụ ime ka anyị nwee obi ụtọ ma anyị mata banyere ha. Chegodị nnọọ ihe o jiworo ndị ohu ya nọ n’ụwa rụzuo! Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ezughị okè, Jehova ejiwo ha rụọ ọrụ dị egwu n’oge anyị a. Ọ̀ dị otú ọ bụla a pụrụ isi jiri ihe ndị Chineke rụzuworo tụnyere nke ụmụ mmadụ ndị a na-efe ka chi n’ụwa? Ì kweghị na Devid kwuru eziokwu mgbe o dere, sị: “Ọ dịghị onye dị ka Gị n’etiti chi nile, Onyenwe anyị; ọ dịghịkwa ọrụ dị ka ọrụ Gị nile”?—Abụ Ọma 86:8.
Ka Anyị Bulie Aha Jehova Elu n’Otu
13 “Jehova ka mkpụrụ obi m ga-eji nyaa isi: ndị dị umeala n’obi ga-anụ ya, wee ṅụrịa ọṅụ.” (Abụ Ọma 34:2) Ọ bụghị ihe Devid rụzuru ka o ji na-anya isi n’ebe a. Dị ka ihe atụ, o jighị otú o si megharịa eze Gat anya nyaa isi. Ọ ghọtara na ọ bụ Jehova chebere ya mgbe ọ nọ na Gat, ma ọ́ bụghị ya, ọ gaara eri isi ya. (Ilu 21:1) N’ihi ya, Devid ji Jehova nyaa isi, ọ bụghị onwe ya. Otuto a Devid nyere Jehova dọtara ndị dị umeala n’obi n’ebe Jehova nọ. Jizọs tokwara aha Jehova, nke a mekwara ka ndị dị umeala n’obi a pụrụ ịkụziri ihe bịakwute Jehova. Taa, a na-adọta ndị dị umeala n’obi sitere ná mba dị iche iche n’ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị Jizọs bụ Onyeisi ha. (Ndị Kọlọsi 1:18) Ọ na-emetụ ndị dị otú a n’ahụ́ mgbe ha nụrụ ka ndị ohu Chineke dị umeala n’obi na-eto aha ya nakwa mgbe ha nụrụ ozi ndị dị na Bible bụ́ ndị mmụọ nsọ na-enyere ha aka ịghọta.—Jọn 6:44; Ọrụ 16:14.
Ka Anyị Bulie Aha Jehova Elu n’Otu
15 “Achọrọ m Jehova, Ọ zakwara m, wee napụta m n’ụjọ m nile.” (Abụ Ọma 34:4) Ahụmahụ a Devid nwere metụrụ ya nnọọ n’ahụ́. N’ihi ya, ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Onye a e wedara n’ala kpọrọ oku, Jehova wee nụrụ ya, wee si ná mkpagbu ya nile zọpụta ya.” (Abụ Ọma 34:6) Mgbe anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị nọ, anyị nwere ọtụtụ ohere ịkọrọ ha ahụmahụ ndị na-ewuli elu banyere otú Jehova si nyere anyị aka ịnagide ihe isi ike ndị anyị nwere. Nke a na-eme ka okwukwe ndị kwere ekwe ibe anyị sie ike, dị nnọọ ka ihe ndị Devid kọọrọ ndị ya na ha so si mee ka okwukwe ha sie ike. Na nke Devid, ndị ya na ha so “legidere [Jehova] anya, wee nwuo enwuo: ka ihere ghara imekwa ha n’ihu.” (Abụ Ọma 34:5) Ọ bụ ezie na ha nọ na-agba ọsọ ndụ ka Eze Sọl ghara igbu ha, ihere emeghị ha. Obi siri ha ike na Chineke na-akwado Devid, nke a mekwara ka ihu ha nwuo enwuo. Dị ka Devid na ndị òtù ya, ndị nwere mmasị ọhụrụ na ndị bụworo ezi Ndị Kraịst ruo ogologo oge na-elegara Jehova anya maka enyemaka. Ebe ọ bụ na Jehova enyeworo ha onwe ha aka, ihu ha nke na-enwu enwu na-egosi na ha ekpebisiela ike ịnọgide na-efe Jehova.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi Mbụ nke Akwụkwọ Abụ Ọma
35:19—Gịnị ka arịrịọ ahụ Devid rịọrọ ka Jehova ghara ikwe ka ndị kpọrọ ya asị gbuo iku anya ha pụtara? Ndị iro Devid igbu iku anya ha ga-apụta na ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na atụmatụ ọjọọ ndị ha tụrụ megide Devid na-aga nke ọma. Devid rịọrọ ka Chineke ghara ikwe ka nke ahụ mee.