Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 2/15 p. 12-17
  • Jehova Ekubata Ọtụtụ Ụmụ Ndị Ikom n’Ebube

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Ekubata Ọtụtụ Ụmụ Ndị Ikom n’Ebube
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ikubata n’Ebube
  • “A Mụworo Site na Chineke”
  • Nnwapụta nke Ọmụmụ
  • Àmà nke Mmụọ Nsọ
  • Ndị A Kpọbara n’Ọgbụgba Ndụ Ndị Pụrụ Iche
  • Ndị A Kpọworo, Ndị A Họpụtaworo, na Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi
  • Òle Ndị n’Ezie Nwere Ọkpụkpọ nke Eluigwe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ndịàmà Bụ́ Ndị Kraịst Ala Ha Dị n’Eluigwe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Inwe Onwe Dị Ebube n’Isi Nso Maka Ụmụ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ị̀ Natawo “Mmụọ Nke Eziokwu Ahụ”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 2/15 p. 12-17

Jehova Ekubata Ọtụtụ Ụmụ Ndị Ikom n’Ebube

“O kwesịrị [Chineke], ebe O kubatararịị ọtụtụ ụmụ ndị ikom n’ebube, ka O site n’ahụhụ mee ka Onye na-eduba ha ná nzọpụta ha zuo okè.”—NDỊ HIBRU 2:10.

1. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji ejide n’aka na nzube Jehova maka ihe a kpọrọ mmadụ ga-emezu?

JEHOVA kere ụwa ka ọ bụrụ ebe obibi ebighị ebi nke ezinụlọ mmadụ zuru okè na-ebi ndụ na-enweghị ọgwụgwụ. (Eklisiastis 1:4; Aịsaịa 45:12, 18) N’ezie, nna nna anyị bụ́ Adam mehiere wee si otú ahụ bufeere ụmụ ya mmehie na ọnwụ. Ma nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ ga-emezu site n’aka Mkpụrụ ahụ o kwere ná nkwa, Jisọs Kraịst. (Jenesis 3:15; 22:18; Ndị Rom 5:12-21; Ndị Galetia 3:16) Ịhụnanya maka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ kpaliri Jehova inye “Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ịhụnanya kpalikwara Jisọs ‘iwere ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Matiu 20:28) “Ihe mgbapụta” nke a na-azụtaghachi ikike na olileanya ndị Adam tụfuru ma mee ka ndụ ebighị ebi kwee nnweta.—1 Timoti 2:5, 6; Jọn 17:3.

2. Olee otú e si mee ihe atụ iji àjà mgbapụta Jisọs eme ihe n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie nke Israel a na-eme kwa afọ?

2 E mere ihe atụ iji àjà mgbapụta Jisọs mee ihe n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie a na-eme kwa afọ. N’ụbọchị ahụ, onyeisi nchụàjà Israel na-ebu ụzọ achụ oké ehi dị ka àjà mmehie ma tinye ọbara ya n’Igbe dị nsọ n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọikwuu ahụ, e mesịakwa n’ụlọ nsọ ahụ. E mere nke a maka ya onwe ya, ezinụlọ ya, na ebo Livaị. N’otu aka ahụ, Jisọs Kraịst nyere Chineke uru nke ọbara ya na mbụ iji kpuchie mmehie nke “ụmụnna” ime mmụọ ya. (Ndị Hibru 2:12; 10:19-22; Levitikọs 16:6, 11-14) N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, onyeisi nchụàjà na-achụkwa otu ewu n’àjà dị ka àjà mmehie ma tinye ọbara ya n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile, si otú a na-ekpuchi mmehie nke ebo 12 nke Israel na-abụghị ndị nchụàjà. N’otú aka ahụ, Onyeisi Nchụàjà bụ́ Jisọs Kraịst ga-eji ọbara ndụ ya mee ihe maka ndị nke ihe a kpọrọ mmadụ nwere okwukwe, na-akachapụ mmehie ha.—Levitikọs 16:15.

Ikubata n’Ebube

3. Dị ka Ndị Hibru 2:9, 10 si kwuo, gịnị ka Chineke nọworo na-eme kemgbe afọ 1,900?

3 Kemgbe afọ 1,900, Chineke anọwo na-eme ihe dị ịrịba ama n’ihe metụtara “ụmụnna” Jisọs. Banyere nke a, Pọl onyeozi dere, sị: “Onye ahụ Nke e mere Ya ka ọ dịkarịa ndị mmụọ ozi ala nke nta, bụ́ Jisọs, Ya ka anyị na-ele anya, na e jiwo ebube na nsọpụrụ kpube Ya n’isi dị ka okpueze n’ihi ahụhụ nke ọnwụ, ka O wee site n’amara Chineke detu ọnwụ ire n’ihi mmadụ nile ọ bụla. N’ihi na o kwesịrị [Jehova Chineke], bụ́ Onye ihe nile dị n’ihi Ya, Onye ihe nile sitekwara n’aka Ya dị, ebe O kubatararịị ọtụtụ ụmụ ndị ikom n’ebube, ka O site n’ahụhụ mee ka Onye na-eduba ha ná nzọpụta ha zuo okè.” (Ndị Hibru 2:9, 10) Onye Na-eduba ná nzọpụta bụ Jisọs Kraịst, onye mụtara nrubeisi zuru okè site n’ahụhụ ndị ọ tara mgbe ọ dị ndụ dị ka mmadụ n’elu ala. (Ndị Hibru 5:7-10) Jisọs bụ onye mbụ a mụrụ dị ka nwa ime mmụọ nke Chineke.

4. Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka e si mụta Jisọs dị ka Ọkpara ime mmụọ nke Chineke?

4 Jehova jiri mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ ya, mụta Jisọs dị ka Ọkpara ime mmụọ ya, iji kubata ya n’ebube eluigwe. Ka nanị ya na Jọn Onye Na-eme Baptism nọ, e mikpuru Jisọs na mmiri kpam kpam iji gosipụta mwepụta o wepụtara onwe ya nye Chineke. Ihe ndekọ Oziọma Luk na-asị: “Mgbe e mere ndị Juu nile baptism, o ruo, mgbe e mesịkwara Jisọs baptism, mgbe Ọ na-ekpekwa ekpere, na e meghere eluigwe, Mmụọ Nsọ wee fedakwasị Ya n’oyiyi ahụ, dị ka nduru, olu wee site n’eluigwe, sị, Gị onwe gị bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya; ihe Gị dị m ezi mma.” (Luk 3:21, 22) Jọn hụrụ mmụọ nsọ ka ọ na-efedakwasị Jisọs ma nụ ka Jehova na-ekwu okwu n’ịkwado ya n’ezoghị ọnụ dị ka Ọkpara ya Ọ hụrụ n’anya. N’oge ahụ nakwa site na mmụọ nsọ, Jehova mụrụ Jisọs ịbụ onye mbụ n’ime ‘ọtụtụ ụmụ ndị ikom a ga-ekubata n’ebube.’

5. Ndị ole bụworo ndị mbụ ga-erite uru site n’àjà Jisọs, olekwa ka ha dị?

5 “Ụmụnna” Jisọs abụwo ndị mbụ ga-erite uru site n’àjà ya. (Ndị Hibru 2:12-18) N’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ ha ka ha nọrịị n’ebube n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe ha na Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst a kpọliteworo n’ọnwụ. Jọn kpughekwara ọnụ ọgụgụ ha, na-asị: “M wee hụ, ma lee, Nwa atụrụ ahụ ka Ọ na-eguzo n’ugwu Zaịọn, Ya na [narị puku na iri puku anọ na anọ], bụ́ ndị e deworo aha Ya na aha Nna Ya n’egedege ihu ha. . . . Ndị a ka a gbatara n’etiti mmadụ, ịbụrụ Chineke na Nwa atụrụ ahụ mkpụrụ mbụ. Ọ dịghịkwa ụgha ọ bụla a hụrụ n’ọnụ ha: ha bụ ndị a na-ataghị ụta.” (Mkpughe 14:1-5) Ya mere ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke ‘ọtụtụ ụmụ ndị ikom ahụ e kubatara n’ebube’ n’eluigwe bụ nanị 144,001—Jisọs na ụmụnna ime mmụọ ya.

“A Mụworo Site na Chineke”

6, 7. Ole ndị ka “a mụworo site na Chineke,” gịnịkwa ka nke a pụtaara ha?

6 Ndị Jehova mụtara bụ ndị “a mụworo site na Chineke.” N’ịgwa ndị dị otú ahụ okwu, Jọn onyeozi dere, sị: “Onye ọ bụla nke a mụworo site na Chineke adịghị eme mmehie, n’ihi na mkpụrụ Ya [Jehova] na-adịgide n’ime ya: ọ pụghịkwa imehie, n’ihi na a mụwo ya site na Chineke.” (1 Jọn 3:9) “Mkpụrụ” a bụ mmụọ nsọ Chineke. N’isoro okwu ya arụkọ ọrụ, o nyewo nke ọ bụla n’ime 144,000 ahụ ‘ọmụmụ ọzọ’ gaa n’olileanya eluigwe.—1 Pita 1:3-5, 23.

7 Jisọs bụ Ọkpara Chineke site n’ọmụmụ a mụrụ ya dị ka mmadụ, ọbụna dị ka nwoke ahụ zuru okè bụ́ Adam bụ “nwa Chineke.” (Luk 1:35; 3:38) Otú ọ dị, mgbe e mesịrị Jisọs baptism, ọ dị ịrịba ama na Jehova kwupụtara, sị: “Gị onwe gị bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, ihe Gị dị m ezi mma.” (Mak 1:11) Site ná nkwupụta a na-eso mwụsa nke mmụọ nsọ, o doro anya na mgbe ahụ Chineke mụpụtara Jisọs ịbụ Ọkpara ime mmụọ Ya. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, mgbe ahụ ‘a mụrụ Jisọs ọzọ’ na-enye ya ikike nke inweta ndụ ọzọkwa dị ka Ọkpara Chineke bụ́ mmụọ n’eluigwe. Dị ka ya, ụmụnna 144,000 ime mmụọ ya bụ ndị ‘a mụrụ ọzọ.’ (Jọn 3:1-8; lee Ụlọ Nche, November 15, 1992, peji nke 3-6.) Ọzọkwa dị ka Jisọs, Chineke tere ha mmanụ ma nye ha ọrụ ịkpọsa ozi ọma.—Aịsaịa 61:1, 2; Luk 4:16-21; 1 Jọn 2:20.

Nnwapụta nke Ọmụmụ

8. Nnwapụta dị aṅaa nke iji mmụọ nsọ mụta dị n’ọnọdụ (a) Jisọs (b) ndị na-eso ụzọ ya nke oge mbụ?

8 E nwere ihe nwapụtara na e jiriwo mmụọ nsọ mụta Jisọs. Jọn Baptist hụrụ ka mmụọ nsọ ahụ na-adakwasị Jisọs ma nụ nkwupụta Chineke kwupụtara ịbụ ọkpara ime mmụọ nke Mesaịa ahụ e tere mmanụ ọhụrụ. Ma olee otú ndị na-eso ụzọ Jisọs ga-esi amara na e jiriwo mmụọ nsọ mụta ha? Ọ dị mma, n’ụbọchị ọ rịgooro n’eluigwe, Jisọs sịrị: “Jọn jiri mmiri mee baptism n’ezie, ma a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptism mgbe ọtụtụ ụbọchị na-agaghị agabiga site n’ugbu a.” (Ọrụ 1:5) Ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ ndị ‘e ji Mmụọ Nsọ mee baptism’ n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A. ‘Ụzụ dị ka nke oké ifufe nke na-efesi ike, site n’eluigwe’ na “ire, dị ka nke ọkụ” dịkwasịrị n’isi nke ọ bụla n’ime ndị ahụ na-eso ụzọ so mwụpụ nke mmụọ nsọ ahụ. Ihe kasị dị ịrịba ama bụ ikike ndị ahụ na-eso ụzọ nwere “ikwu okwu n’asụsụ dị iche, dị ka Mmụọ ahụ na-enye ha ike ikwuwa okwu.” Ya mere e nwere ihe nnwapụta a hụrụ anya ma nụ ná ntị na e megheworo ụmụazụ Kraịst ụzọ ịba n’ebube eluigwe dị ka ụmụ ndị ikom nke Chineke.—Ọrụ 2:1-4, 14-21; Joel 2:28, 29.

9. Nnwapụta dị aṅaa ka e nwere na e jiriwo mmụọ nsọ mụta ndị Sameria, Kọniliọs, na ndị ọzọ nke narị afọ mbụ?

9 Oge ụfọdụ mgbe nke ahụ gasịrị, Filip onye na-ezisa ozi ọma mere nkwusa na Sameria. Ọ bụ ezie na ndị Sameria nabatara ozi ya, e meekwa ha baptism, ha enweghị ihe nnwapụta na Chineke amụwo ha dị ka ụmụ ya ndị ikom. Mgbe ndị ozi bụ́ Pita na Jọn kpere ekpere ma bikwasị ndị ahụ kwere ekwe aka n’isi, “ha wee nata Mmụọ Nsọ” n’ụzọ pụtara ìhè nye ndị na-ahụ ihe na-emenụ. (Ọrụ 8:4-25) Nke a bụ ihe na-anwapụta na e jiwo mmụọ nsọ mụta ndị Sameria ahụ kwere ekwe ịbụ ụmụ ndị ikom nke Chineke. N’otu aka ahụ, na 36 O.A., Kọniliọs na ndị Jentaịl ndị ọzọ nabatara eziokwu Chineke. Pita na ndị Juu kwere ekwe bụ́ ndị so ya bụ ndị ‘ibobo nwụrụ n’ahụ, n’ihi na a wụsawo onyinye nke bụ Mmụọ Nsọ n’isi ndị mba ọzọ. N’ihi na ha na-anụ ka ha na-ekwu okwu n’asụsụ ọzọ dị iche iche, na-emekwa ka Chineke dị ukwuu.’ (Ọrụ 10:44-48) Ọtụtụ ndị Kraịst narị afọ mbụ natara “onyinye nile nke Mmụọ Nsọ,” dị ka ịsụ asụsụ dị iche iche. (1 Ndị Kọrint 14:12, 32) Ndị a si otú a nwee ihe àmà doro anya na e jiriwo mmụọ nsọ mụta ha. Ma olee otú ndị Kraịst n’ọdịnihu ga-esi ama ma e jiriwo mmụọ nsọ mụta ha ma ọ bụ na e mebeghị otú ahụ?

Àmà nke Mmụọ Nsọ

10, 11. Ná ndabere nke Ndị Rom 8:15-17, olee otú ị ga-esi akọwa na mmụọ ahụ sooro ndị ahụ ha na Kraịst na-eketakọ ihe na-agba àmà?

10 Narị puku na iri puku anọ na anọ ndị Kraịst nile e tere mmanụ enwewo ihe àmà doro anya na ha nwere mmụọ Chineke. Banyere nke a, Pọl dere, sị: “Unu natara Mmụọ nke ido ka nwa nwoke, Nke anyị na-eti mkpu n’ime Ya, sị, Aba, Nna. Mmụọ Nsọ onwe ya sooro mmụọ anyị na-agba àmà, na anyị bụ ụmụ Chineke: ma ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa; ndị nketa nke Chineke, na ndị ha na Kraịst na-ekekọ; ma ọ bụrụ na ọ bụ ezie na anyị na Ya na-ahụkọ ahụhụ, ka e wee nyekọọkwa anyị na Ya otuto.” (Ndị Rom 8:15-17) Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere mmụọ ịbụ nwa nye Nna ha nke eluigwe, echiche bụ isi nke ịbụ nwa. (Ndị Galetia 4:6, 7) Ha ji nnọọ n’aka na Chineke amụwo ha ịghọ ụmụ ime mmụọ dị ka ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe n’Alaeze eluigwe. Na nke a, mmụọ nsọ Jehova na-ekere òkè doro anya.

11 N’okpuru ike nke mmụọ nsọ Chineke, mmụọ ahụ, ma ọ bụ àgwà bụ isi, nke ndị e tere mmanụ na-akpali ha ịzaghachi n’ụzọ kwesịrị ekwesị nye ihe Okwu Chineke na-ekwu banyere olileanya eluigwe. Dị ka ihe atụ, mgbe ha gụrụ ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ụmụ ime mmụọ nke Jehova, ha na-amata ozugbo na okwu ndị ahụ metụtara ha. (1 Jọn 3:2) Ha maara na ‘e mewo ha baptism baa na Kraịst Jisọs’ nakwa baa n’ọnwụ ya. (Ndị Rom 6:3) Nkwenyesi ike ha bụ na ha bụ ụmụ ime mmụọ nke Chineke, ndị ga-anwụ, a kpọlitekwa ha n’ọnwụ gaa n’ebube eluigwe, dị ka e mere Jisọs.

12. Gịnị ka mmụọ Chineke kpaliworo n’ime ndị Kraịst e tere mmanụ?

12 Ịbụ ndị a mụrụ ịghọ ụmụ ime mmụọ abụghị ọchịchọ a zụlitere azụlite. Ndị e ji mmụọ nsọ mụta achọghị ịga eluigwe n’ihi ahụhụ site n’ihe isi ike dị ugbu a n’elu ala. (Job 14:1) Kama nke ahụ, mmụọ Jehova akpaliwo n’ime ndị bụ n’ezie ndị e tere mmanụ olileanya na ọchịchọ nke ụmụ mmadụ n’ozuzu ha na-adịghị enwekebe. Ndị dị otú ahụ a mụtara amụta maara na ndụ ebighị ebi n’izu okè mmadụ n’elu ala bụ́ paradaịs nke ezinụlọ obi ụtọ na ndị enyi gbara gburugburu ga-amagbu onwe ya. Otú ọ dị, ụdị ndụ ahụ abụghị ọchịchọ bụ isi nke obi ha. Ndị e tere mmanụ nwere olileanya eluigwe siri ike nke na ha na-eji obi ha na-achụ atụmanya elu ala na mmekọrịta nile n’àjà.—2 Pita 1:13, 14.

13. Dị ka 2 Ndị Kọrint 5:1-5 si kwuo, gịnị ‘na-agụ’ Pọl, gịnịkwa ka nke a na-egosi banyere ndị e ji mmụọ nsọ mụta?

13 Olileanya ndụ eluigwe nke Chineke na-enye siri nnọọ ike n’ime ndị dị otú ahụ nke na echiche ha yiri nke Pọl, onye dere, sị: “Anyị matara na a sị na a kwaturu ụlọ nke ụwa, bụ́ ụlọikwuu anyị, anyị nwere ụlọ e wuru nke sitere na Chineke, ụlọ a na-ejighị aka wuo, dị ebighị ebi, n’eluigwe. N’ihi na anyị na-asụ ude n’ime ụlọ nke a ezie, ebe ọ na-agụsi anyị ike ka e were ebe obibi anyị nke sitere n’eluigwe yikwasị anyị n’elu ya: ebe ọ bụ na a ga-ahụ anyị ndị e yiworo ihe, ndị na-agbaghị ọtọ. N’ihi na anyị, bụ́ ndị nọ n’ụlọikwuu a, anyị na-asụ ude ezie, ebe ọ na-anyịgbu anyị; n’ihi na anyị achọghị ka e yipụ anyị ya, kama ka e yikwasị anyị ihe n’elu ya, ka ndụ wee loda ihe pụrụ ịnwụ anwụ. Ma Onye rụpụtara anyị ka e wee mee otu ihe a bụ Chineke, Onye nyere anyị Mmụọ Nsọ, bụ́ ihe anyị ji mara na a ga-emezuru anyị ya.” (2 Ndị Kọrint 5:1-5) ‘Ihe na-agụ’ Pọl bụ ka a kpọlite ya n’ọnwụ gaa n’eluigwe dị ka mmụọ e kere eke na-adịghị anwụ anwụ. N’izo aka n’ahụ mmadụ, o jiri ihe ntụnyere nke ụlọikwuu na-ada ada mee ihe, bụ́ ebe obibi na-esighị ike ma na-adịrukwa nwa mgbe nta ma e jiri ya tụnyere ụlọ. Ọ bụ ezie na ha bi n’ụwa n’anụ ahụ, nke na-anwụ anwụ, ndị Kraịst nwere mmụọ ahụ dị ka ihe ngosipụta nke ndụ eluigwe na-abịanụ na-elepụ anya n’ihu maka “ụlọ e wuru nke sitere na Chineke,” ahụ mmụọ na-adịghị anwụ anwụ, nke na-enweghị mmerụ. (1 Ndị Kọrint 15:50-53) Dị ka Pọl, ha pụrụ ikwusi ike, sị: “Anyị na-enwe obi ike, . . . ọ dịkwa anyị ezi mma karị ka anyị ghara ịnọ n’ụlọ n’ahụ [mmadụ], ka anyị nọọkwa n’ụlọ [n’eluigwe] n’ebe Onyenwe anyị nọ.”—2 Ndị Kọrint 5:8.

Ndị A Kpọbara n’Ọgbụgba Ndụ Ndị Pụrụ Iche

14. Mgbe ọ na-eguzobe Ememe Ncheta ahụ, olee ọgbụgba ndụ Jisọs bu ụzọ hota, òkè dịkwa aṅaa ka ọ na-ekere n’ihe metụtara ndị Israel ime mmụọ?

14 Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta ji n’aka na a kpọbawo ha n’ọgbụgba ndụ abụọ pụrụ iche. Jisọs kwuru banyere otu n’ime ndị a mgbe o jiri achịcha na-ekoghị eko na mmanya guzobe Ememe Ncheta nke ọnwụ ya na-abịanụ ma kwuo banyere iko mmanya ahụ, sị: “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m, bụ́ nke a na-awụsị n’ihi unu.” (Luk 22:20; 1 Ndị Kọrint 11:25) Olee ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? Jehova Chineke na ndị òtù nke Israel ime mmụọ—ndị Jehova zubere ikubata n’ebube eluigwe. (Jeremaịa 31:31-34; Ndị Galetia 6:15, 16; Ndị Hibru 12:22-24) Ebe ọbara Jisọs a wụsịrị mere ka ọ dị irè, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-esite ná mba dum akpọpụta ndị mmadụ maka aha Jehova ma mee ndị Kraịst a e ji mmụọ nsọ mụta akụkụ nke “mkpụrụ” Abraham. (Ndị Galetia 3:26-29; Ọrụ 15:14) Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-eme ka ndị Israel ime mmụọ nile bụrụ ndị e kubatara n’ebube site n’ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. N’ịbụ “ọgbụgba ndụ ebighị ebi,” uru ya ga-adịru ebighị ebi. A ka ga-ahụ ma ọgbụgba ndụ a ọ̀ ga-ekerekwa òkè n’ụzọ ndị ọzọ n’oge Narị Afọ Iri ahụ nakwa ma ọ gasịa.—Ndị Hibru 13:20.

15. N’ikwekọ na Luk 22:28-30, olee ọgbụgba ndụ ọzọ a malitere ịkpọba ụmụazụ Jisọs e tere mmanụ na ya, olee mgbe kwa?

15 A kpọbatawokwa “ọtụtụ ụmụ ndị ikom” Jehova zubere ‘ikubata n’ebube’ n’otu n’otu n’ọgbụgba ndụ maka Alaeze eluigwe. Banyere ọgbụgba ndụ a dị n’etiti ya onwe ya na ndị na-eso nzọụkwụ ya, Jisọs sịrị: “Unu onwe unu bụ ndị sowooro m n’ọnwụnwa m nile; Mụ onwe m na-agbakwa ndụ inye unu alaeze, dị ka Nna m gbara ndụ inye m, ka unu wee rie ṅụọkwa na table nke m n’alaeze m; unu ga-anọkwasịkwa n’ocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.” (Luk 22:28-30) E hiwere ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ mgbe e ji mmụọ nsọ tee ndị na-eso ụzọ Jisọs mmanụ na Pentikọst 33 O.A. Ọgbụgba ndụ ahụ ka ga-anọgide na-arụ ọrụ n’etiti Kraịst na ndị ha na ya ga-abụkọ eze ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 22:5) Ya mere, o were ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta anya na ha nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nakwa n’ọgbụgba ndụ maka Alaeze. Ya mere, n’ememe nile nke Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, nanị ole na ole dị nta nke ndị e tere mmanụ fọdụrụnụ bụ́ ndị ka nọ n’ụwa na-ekere òkè n’achịcha ahụ, na-anọchite anya ahụ mmadụ na-enweghị mmehie nke Jisọs, na mmanya ahụ, na-anọchi anya ọbara ya zuru okè nke a wụsịrị n’ọnwụ ma na-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dịrị irè.—1 Ndị Kọrint 11:23-26; lee Ụlọ Nche, February 1, 1989, peji nke 17-20.

Ndị A Kpọworo, Ndị A Họpụtaworo, na Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi

16, 17. (a) Iji bụrụ ndị e kubatara n’ebube, gịnị ga-abụrịrị eziokwu banyere 144,000 ahụ nile? (b) Olee ndị bụ “eze iri” ahụ, oleekwa otú ha si na-emeso ihe fọdụrụ n’elu ala nke “ụmụnna” Kraịst?

16 Nke mbụ e ji àjà mgbapụta Jisọs mee ihe mere ka o kwe omume ịkpọ 144,000 gaa ná ndụ eluigwe ma họrọ ha site n’ịbụ ndị Chineke ji mmụọ nsọ mụta. Otú ọ dị, iji bụrụ ndị e kubara n’ebube, ha aghaghị ịdị ‘na-anụ ọkụ n’obi karị ime ka ọkpụkpọ ha na nhọpụta ha bụrụ ihe na-eguzosi ike,’ ha aghaghịkwa ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. (2 Pita 1:10; Ndị Efesọs 1:3-7; Mkpughe 2:10) Ntakịrị ihe fọdụrụnụ nke ndị ahụ e tere mmanụ ka nọ n’elu ala anọgidewo na-eguzosi ike n’ezi ihe ọ bụ ezie na “eze iri” nke na-anọchi anya ike ọchịchị nile na-emegide ha. “Ndị a ga-ebu agha megide Nwa atụrụ ahụ,” ka otu mmụọ ozi kwuru, “Nwa atụrụ ahụ ga-emerikwa ha, n’ihi na Ọ bụ Onyenwenụ kachasi ndị nwenụ nile, na Eze kachasị ndị eze nile; ndị sooro Ya ga-emerikwa, bụ́ ndị a kpọworo, ndị a họpụtawokwara, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi.”—Mkpughe 17:12-14.

17 Ndị ọchịchị bụ́ mmadụ apụghị ime ihe ọ bụla megide Jisọs, bụ́ “Eze kachasị ndị eze nile,” n’ihi na ọ nọ n’eluigwe. Ma ha na-egosipụta ibu iro n’ebe ihe fọdụrụ nke “ụmụnna” ya ka nọ n’elu ala nọ. (Mkpughe 12:17) Nke ahụ ga-akwụsị n’agha Chineke bụ́ Amagedọn, ebe “Eze kachasị ndị eze nile” na “ụmụnna” ya—“ndị a kpọworo, ndị a họpụtawokwara, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi”—ga-enwerịrị mmeri. (Mkpughe 16:14, 16) Ka ọ dịgodị ugbu a, ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta ji nnọọ ọrụ n’aka. Gịnị ka ha na-eme ugbu a, tupu Jehova ekuba ha n’ebube?

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ Ole ndị ka Chineke ‘na-ekubata n’ebube eluigwe’?

◻ Gịnị ka ịbụ onye “a mụworo site na Chineke” pụtara?

◻ Olee otú ‘mmụọ nsọ na-esi agbara’ ụfọdụ ndị Kraịst ‘àmà’?

◻ A kpọbawo ndị e ji mmụọ nsọ mụta n’ọgbụgba ndụ ndị dị aṅaa?

[Foto dị na peeji nke 15]

Na Pentikọst 33 O.A., e nyere ihe àmà na e meghewo ụzọ ịbanye n’ebube eluigwe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya