Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lmd ihe ọmụmụ 10
  • Kpebisie Ike Inyere Ha Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpebisie Ike Inyere Ha Aka
  • Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jizọs Mere
  • Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?
  • Na-eme Ka Jizọs
  • Mụta Ihe Site n’Ihe Mere Nikọdimọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Jizọs Akụziere Nikọdimọs Ihe n’Abalị
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ka Ha Kpebie Ife Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Izi Nikọdimọs Ihe
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
lmd ihe ọmụmụ 10

IME KA HA BỤRỤ NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS

Ebe Jizọs na Nikọdimọs nọ na mbara èzí na-akparịta ụka n’abalị.

Jọn 3:1, 2

IHE ỌMỤMỤ NKE 10

Kpebisie Ike Inyere Ha Aka

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Anyị kpebisiri ike na ihe anyị ga-eme abụghị naanị izi unu ozi ọma Chineke, kama na anyị ga-enye unu onwe anyị maka na anyị hụrụ unu n’anya.”​—1 Tesa. 2:8.

Ihe Jizọs Mere

Ebe Jizọs na Nikọdimọs nọ na mbara èzí na-akparịta ụka n’abalị.

VIDIO: Jizọs Kụziiri Nikọdimọs Ihe

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Jọn 3:1, 2. Zazie ajụjụ ndị a:

  1. Olee ihe i chere mere Nikọdimọs ji bịakwute Jizọs n’abalị?​—I nwere ike ịgụ Jọn 12:42, 43.

  2. Olee otú ozi ọma ahụ Jizọs ziri Nikọdimọs n’abalị si gosi na o kpebisiri ike ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?

2. Otú anyị si egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya bụ ikpebisi ike inyere ha aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Na-eme Ka Jizọs

3. Na-amụrụ mmadụ ihe n’oge dị ya mma nakwa n’ebe masịrị ya. E nwere ike inwe otu ụbọchị ga-akara ya mma n’izu ma ọ bụ oge ga-akara ya mma n’ụbọchị. Ahụ́ ọ̀ ga-aka eru ya ala ịmụ ihe n’ebe ọ na-arụ ọrụ, n’ụlọ ya, ma ọ bụ n’ebe ọhaneze na-anọ? O kwe omume, gbanwee ihe ụfọdụ ka i nwee ike ịmụrụ ya ihe n’oge kaara ya mma nakwa n’ebe masịrị ya.

4. Na-amụchiri ya ihe anya. Ọ bụrụ na ị gaghị anọ ya, akagbula ọmụmụ ihe unu. Kama, lee ma:

  1. a. Ị̀ ga-enwe ike ịmụrụ ya ihe n’oge ọzọ n’izu ahụ?

  2. b. Ị̀ ga-esili n’ekwentị ma ọ bụ n’Ịntanet mụọrọ ya ihe?

  3. ch. Ị̀ ga-agwali onye nkwusa ọzọ ka ọ mụọrọ ya ihe?

5. Rịọ Jehova ka o mee ka ị na-ele ịmụrụ onye ahụ ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ike onye ahụ ghara ịgwụ gị, ọ bụrụgodị na ọ naghị amụchi ihe anya ma ọ bụ na ọ na-egbu oge ime ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl. (Fil. 2:13) O nwere ike ịbụ na onye ahụ ị na-amụrụ ihe nwere ọtụtụ àgwà ndị magburu onwe ha. Rịọ Jehova ka o mee ka i lekwasị anya n’àgwà ndị ahụ.

I NWEKWARA IKE ỊGỤ

Ilu 3:27; Ọrụ 20:35; 2 Kọr. 12:15

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya