Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 3/8 p. 26-28
  • Bible Ọ̀ Na-akatọ Agụmakwụkwọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bible Ọ̀ Na-akatọ Agụmakwụkwọ?
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agụmakwụkwọ na Narị Afọ Mbụ
  • Iji Nlezianya Tụlee Okwu Ahụ
  • Ọ Bụ Nhọrọ Onwe Onye
  • Agụmakwụkwọ—Jiri Ya Nye Jehova Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Agụmakwụkwọ nke Nwere Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ụzọ Ndịàmà Jehova Si Ele Agụmakwụkwọ Anya
    Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ
  • Ndị Ntorobịa Ndị Na-echeta Onye Kere Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 3/8 p. 26-28

Bible Ọ̀ Na-akatọ Agụmakwụkwọ?

“Ọ bụ nanị onye na-amaghị nke a na-akọ bụ onye na-elelị agụmakwụkwọ.”—Publilius Syrus, Moral Sayings, narị afọ mbụ T.O.A.

BIBLE na-agba anyị ume ‘ichebe nzube ihe na izuzu.’ (Ilu 3:21) Jehova, bụ́ Chineke nke ihe ọmụma, chọrọ ka ndị na-efe ya bụrụ ndị e ziri ihe. (1 Samuel 2:3; Ilu 1:5, 22) Ma, okwu ụfọdụ dị n’ime Bible pụrụ ịkpali ajụjụ. Dị ka ihe atụ, n’izo aka n’ihe ndị ọ na-achụsobu, gụnyere agụmakwụkwọ ya ka elu, Pọl onyeozi dere, sị: “M na-ewere ha nile dị ka ihe mkpofu nkịtị.” (Ndị Filipaị 3:3-8, Today’s English Version) N’akwụkwọ ozi ọzọ sitere n’ike mmụọ nsọ, o kwuru, sị: “Amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.”—1 Ndị Kọrint 3:19.

Mgbe ahụ, Bible ọ̀ na-akatọ agụmakwụkwọ? Ruo ókè ha aṅaa ka onye Kraịst kwesịrị ịchụsoru agụmakwụkwọ ụwa? Ọ̀tụ̀tụ̀ kasị ala iwu chọrọ ò zuola, ka ò kwesịrị ekwesị ka a gụkwuo akwụkwọ?

Agụmakwụkwọ na Narị Afọ Mbụ

N’etiti ndị Kraịst narị afọ mbụ, e nwere ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ dịgasị iche iche. Ụfọdụ ndị ikom a ma ama lere ndị ozi bụ́ Pita na Jọn bụ́ ndị Galili anya dị ka “ndị na-amaghị ihe na ndị na-amụtaghị akwụkwọ hie nne.” (Ọrụ 4:5, 6, 13) Nke a ọ̀ pụtara na ndị ikom abụọ a bụ iti ma ọ bụ ndị na-agaghị akwụkwọ? Ee e. Nanị ihe ọ pụtara bụ na agụmakwụkwọ ha abụghị n’ụlọ akwụkwọ ndị dị elu nke ndị Hibru dị na Jerusalem. Ihe odide nke mmadụ abụọ a ji anya ike na-akwado Iso Ụzọ Kraịst mesịrị gosipụta eziokwu ahụ bụ́ na ha bụ ndị ikom gụrụ akwụkwọ nke ọma, nwere ọgụgụ isi, ndị nwere ike ịkọwa Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ doro anya. Agụmakwụkwọ ha gụnyererịị ọzụzụ dị irè n’igbo mkpa ihe onwunwe nke ezinụlọ ha. Ha bụ ndị ibe n’ihe doro anya na ọ bụ ọrụ ịkụ azụ̀ nke na-enye ego.—Mak 1:16-21; Luk 5:7, 10.

N’ụzọ dị iche, Luk, bụ́ onye na-eso ụzọ nke dere otu n’ime Oziọma ndị ahụ nakwa akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi, nwetakwuru agụmakwụkwọ ka elu. Ọ bụ dibịa. (Ndị Kọlọsi 4:14) Ọzụzụ ọrụ ahụ ike ọ natara nyere ihe odide ya sitere n’ike mmụọ nsọ ọdịdị dị iche.—Lee Luk 4:38; 5:12; Ọrụ 28:8.

Tupu ọ ghọọ onye Kraịst, e ziri Pọl onyeozi ihe n’iwu ndị Juu, n’okpuru ozizi ihe nke otu n’ime ndị ọkà mmụta kasị mara akwụkwọ nke oge ahụ, bụ́ Gameliel. (Ọrụ 22:3) A pụrụ iji agụmakwụkwọ Pọl tụnyere agụmakwụkwọ mahadum taa. Ọzọkwa, n’etiti ndị Juu e lere ya anya dị ka ihe a na-asọpụrụ bụ́ ndị na-eto eto ịmụta otu aka ọrụ, ọbụna mgbe a ka ga-achụso agụmakwụkwọ ka elu n’afọ ndị dị n’ihu. Dị ka ihe àmà na-egosi, Pọl natara ọzụzụ dị ka onye na-akpa ákwà ụlọikwuu mgbe ọ ka bụ nwa okoro. Nkà ndị dị otú ahụ nyeere ya aka ịkwado onwe ya n’ozi oge nile ya.

Ka o sina dị, Pọl ghọtara na ma e jiri ya tụnyere uru ka ukwuu nke ihe ọmụma Chineke, na agụmakwụkwọ ụwa—ọ bụ ezie na ọ dị mkpa—nwere abamuru a kpaara ókè. Ya mere, Bible na-egosi na inweta ihe ọmụma banyere Chineke na Kraịst bụ ihe kasị mkpa. Ndị Kraịst taa ga-eme nke ọma ịnakwere echiche a ziri ezi banyere agụmakwụkwọ ụwa.—Ilu 2:1-5; Jọn 17:3; Ndị Kọlọsi 2:3.

Iji Nlezianya Tụlee Okwu Ahụ

Ụfọdụ ndị Kraịst achọpụtawo na ịgụkwu akwụkwọ, n’ụdị nke ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ nke ịmụ ọrụ, enyeworo ha aka igbo mkpa ihe onwunwe nke ezinụlọ ha. Mmadụ ilekọta ezinụlọ ya kwesịrị ekwesị, n’ihi na ‘ichere ndị nke ezinụlọ [mmadụ]’ bụ ọrụ dị nsọ. (1 Timoti 5:8) Inweta nkà ndị dị mkpa iji mee nke a chọrọ ezi amamihe.

Otú ọ dị, ndị hụrụ mkpa ọ dị inweta ihe karịrị agụmakwụkwọ bụ́ isi iji mezuo ebumnobi a kwesịrị ịtụle ma uru ma ọghọm ndị dị na ya. Abamuru ndị a pụrụ inweta na-agụnye ịbụ onye a kwadebere inweta ọrụ nke na-eme ka mmadụ nwee ike ilekọta onwe ya na ezinụlọ ya nke ọma ka o ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ndị Kraịst. Tụkwasị na nke a, ọ pụrụ inwe ike inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ihe onwunwe, ‘na-enwe ihe ya na onye nọ ná mkpa ga-eketa.’—Ndị Efesọs 4:28.

Gịnị bụ ụfọdụ ihe ọghọm? Ndị a pụrụ ịgụnye ịbụ onye e kpughere nye ozizi ndị na-emebi okwukwe n’ebe Chineke nọ na n’ebe Bible dị. Pọl dọrọ ndị Kraịst aka ná ntị ka ha kpachara anya maka “ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha” na “ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe.” (1 Timoti 6:20, 21; Ndị Kọlọsi 2:8) N’ụzọ doro anya, inweta ụdị agụmakwụkwọ ụfọdụ pụrụ ibibi okwukwe nke onye Kraịst. Ndị na-eche echiche ịnatakwu ọzụzụ ma ọ bụ ịmụkwu ihe kwesịrị ịmata ihe ize ndụ dị n’ụdị mmetụta ndị ahụ na-emerụ ahụ.

Mosis, bụ́ onye ‘e ziri ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt,’ jigidere okwukwe siri ike n’agbanyeghị inweta agụmakwụkwọ nke obi abụọ na-adịghị na ya na ọ gụnyere nkụzi nke ikwere n’ọtụtụ chi, ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. (Ọrụ 7:22) N’otu aka ahụ, ndị Kraịst taa na-akpachara anya ịghara ịdaba ná mmetụta ndị na-adịghị mma n’ọnọdụ ọ bụla ha nọ.

Ihe ize ndụ ọzọ pụrụ ịdị n’ịgụkwu akwụkwọ bụ na ihe ọmụma na-afụli elu, ma ọ bụ na-arụpụta echiche ịdị mkpa onwe onye. (1 Ndị Kọrint 8:1) Ọtụtụ ndị na-achọ ihe ọmụma site n’agụmakwụkwọ n’ihi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ọbụnakwa nchụso ziri ezi nke ihe ọmụma pụrụ ịrụpụta echiche nke ịka ndị ọzọ mma na ịdị mkpa onwe onye. Omume ndị dị otú ahụ adịghị atọ Chineke ụtọ.—Ilu 8:13.

Tụlee ndị Farisii. Ndị òtù nke ịrọ òtù okpukpe a a ma ama jiri oké mmụta ha na ihe e weere na ọ bụ ezi omume nyaa isi. Ha maara nchịkọta ahụ buru ibu nke ọdịnala ndị rabaị nke ọma, ha ledakwara ndị nkịtị anya, bụ́ ndị nwere agụmakwụkwọ dị nta karị, na-ele ha anya dị ka ndị na-amaghị ihe, ndị a na-asọ oyi, ọbụna ndị a bụrụ ọnụ. (Jọn 7:49) E wezụga nke a, ha hụrụ ego n’anya. (Luk 16:14) Ihe nlereanya ha na-egosi na mgbe a chụsoro ya n’ihi ebumnobi ndị dị njọ, agụmakwụkwọ pụrụ ime ka mmadụ dị nganga ma ọ bụ duga na ya ịbụ onye na-ahụ ego n’anya. N’ihi ya, n’ikpebi ụdị na ókè agụmakwụkwọ a ga-achụso ga-aharu, onye Kraịst ga-eme nke ọma ịjụ onwe ya, sị, ‘Gịnị bụgasị ebumnobi m?’

Ọ Bụ Nhọrọ Onwe Onye

Dị nnọọ ka ọ dị na narị afọ mbụ, e nwere ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ dịgasị iche iche n’etiti ndị Kraịst taa. N’okpuru nduzi nke ndị mụrụ ha, ndị na-eto eto gụsịrị akwụkwọ nke iwu kwuru pụrụ ịhọrọ ịgụkwu akwụkwọ ụwa. N’otu aka ahụ, ndị meworo okenye, ndị nwere mmasị n’ime ka ụzọ ha si akpatara ezinụlọ ha ihe ka mma nwere ike ile ịgụkwu akwụkwọ dị otú ahụ anya dị ka ụzọ dị irè isi mezuo nke ahụ.a Akụkụ ụfọdụ nke mmụta agụmakwụkwọ ọdịnala na emesi ike ịzụlite ikike ọgụgụ isi n’ozuzu ya kama ịbụ nkà a mụrụ amụ ma ọ bụ aka ọrụ. Otú a, mmadụ pụrụ ịchọpụta na ọbụna mgbe o tinyesịrị oge dị ukwuu n’inweta agụmakwụkwọ dị otú ahụ, o nweghị nkà ndị na-aga ahịa. N’ihi nke a, ụfọdụ na-ahọrọ ịchụso ihe ọmụmụ n’usoro ihe ọmụmụ a na-akụzi aka ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ nkà na ụzụ, n’echiche nke inwetakwu ihe ndị a chọrọ iji nweta ọrụ ozugbo.

Ka o sina dị, mkpebi ndị dị otú ahụ bụ nke onwe onye. Ndị Kraịst ekwesịghị ịkatọ ma ọ bụ ikpe ibe ha ikpe n’okwu a. Jemes dere, sị: “Gị onwe gị bụ ònye, gị onye na-ekpe onye agbata obi gị ikpe?” (Jemes 4:12) Ọ bụrụ na onye Kraịst na-eche echiche ịgụkwu akwụkwọ, ọ ga-eme nke ọma inyocha ebumnobi ya iji jide n’aka na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, na nke ịhụ ihe onwunwe n’anya abụghị ihe na-akwali ya.

O doro anya na Bible na-agba ume inwe echiche ziri ezi banyere agụmakwụkwọ. Ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-aghọta uru ka ukwuu nke agụmakwụkwọ ime mmụọ dabeere n’Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee ma na-enye ụmụ ha ndụmọdụ guzoziri eguzozi banyere ịgụkwu akwụkwọ. (2 Timoti 3:16) N’inwe echiche ziri ezi banyere ndụ, ha na-aghọta uru nke agụmakwụkwọ ụwa n’inweta nkà ndị dị mkpa maka ụmụ ha ndị toworo eto iji lekọta onwe ha na ezinụlọ ha n’ọdịnihu. Ya mere, n’ikpebi ma a ga-agụkwu akwụkwọ, na ruo n’ókè ha aṅaa, onye Kraịst ọ bụla pụrụ ime mkpebi onwe onye dị mma na-adabere ná nsọpụrụ Jehova Chineke, nke “bara uru nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndụ, ma nke ndụ ugbu a, ma nke gaje ịbịa.”—1 Timoti 4:8.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka inwetakwu ihe ọmụma sara mbara n’isiokwu a, lee Ụlọ Nche nke November 1, 1992, peji nke 10-21, na broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ, ọ bụ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania bipụtara ha abụọ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

“Chebe nzube ihe na izuzu.” —Ilu 3:21

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]

N’ịtụle ma a ga-achọ ịgụkwu akwụkwọ, onye Kraịst ga-eme nke ọma ịjụ onwe ya, sị, ‘Gịnị bụgasị ebumnobi m?’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya