Gaa na Nke Ha Ozugbo
Kemgbe anyị megharịrị ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ọtụtụ ndị na-ezitere anyị ozi ka anyị bịa mụwara ha Baịbụl. E nweekwala ndị gwara ụmụnna ndị na-ezi ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo ka a bịa mụwara ha ihe. Alaka ụlọ ọrụ anyị nweta ozi ndị a, ha na-ezigara ha ọgbakọ ga-eleba ha anya ozugbo. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ agaa na jw.org, kwuo ka a mụwara ya ihe, n’ime abalị abụọ, alaka ụlọ ọrụ anyị ga-ezigara ndị okenye nọ n’ebe onye ahụ bi ozi. Ma, ozi anyị na-enweta na-egosi na a naghị aga ozugbo na nke ndị na-agwa anyị na ha chọrọ ka a bịa mụwara ha ihe. Olee otú anyị ga-esi nyere ndị ahụ aka tupu mmasị ha nwere anyụọ ka ọkụ?—Mak 4:14, 15.
Ọ bụrụ na onye chọrọ ka a mụwara ya ihe ebighị n’ókèala unu, dejupụta fọm Please Follow Up (S-43) ozugbo, nye ya odeakwụkwọ ọgbakọ unu ozugbo ị gara ọmụmụ ihe. N’ime otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ, odeakwụkwọ ga-eziga fọm ahụ n’ọgbakọ ga-elebara ya anya, ma ọ bụ jiri fọm ahụ dejupụta fọm Follow Up nke dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet ma zigara ya alaka ụlọ ọrụ. Ọ ga-ahụ fọm ahụ ma ọ pịa ebe e dere “Congregation” na jw.org. Ndị okenye kwesịrị ịna-aga jw.org mgbe mgbe ka ha mara ma è ziteere ha ozi. Ọ bụrụ na e ziteere ha ozi na e nwere onye chọrọ ka a mụwara ya ihe, ha kwesịrị ime ndokwa ka a gaa na nke onye ahụ ozugbo. Nwanna ọ bụla a gwara ka ọ gaa hụ onye ahụ kwesịrị ịga ozugbo ozugbo. Ọ bụrụ na onye ahụ anọghị n’ụlọ mgbe nwanna ahụ gara na nke ya, o nwere ike ịhapụrụ ya ozi.