Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/14 p. 7
  • Gaa na Nke Ha Ozugbo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gaa na Nke Ha Ozugbo
  • Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Na-abara ma Anyị ma Ndị Ọzọ Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Biko Gaa Leta Ha Ozugbo
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Mgbe E Kwesịrị Idejupụta Fọm Please Follow Up (S-43)
    Ozi Alaeze Anyi—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2014
km 6/14 p. 7

Gaa na Nke Ha Ozugbo

Kemgbe anyị megharịrị ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ọtụtụ ndị na-ezitere anyị ozi ka anyị bịa mụwara ha Baịbụl. E nweekwala ndị gwara ụmụnna ndị na-ezi ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo ka a bịa mụwara ha ihe. Alaka ụlọ ọrụ anyị nweta ozi ndị a, ha na-ezigara ha ọgbakọ ga-eleba ha anya ozugbo. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ agaa na jw.org, kwuo ka a mụwara ya ihe, n’ime abalị abụọ, alaka ụlọ ọrụ anyị ga-ezigara ndị okenye nọ n’ebe onye ahụ bi ozi. Ma, ozi anyị na-enweta na-egosi na a naghị aga ozugbo na nke ndị na-agwa anyị na ha chọrọ ka a bịa mụwara ha ihe. Olee otú anyị ga-esi nyere ndị ahụ aka tupu mmasị ha nwere anyụọ ka ọkụ?—Mak 4:14, 15.

Ọ bụrụ na onye chọrọ ka a mụwara ya ihe ebighị n’ókèala unu, dejupụta fọm Please Follow Up (S-43) ozugbo, nye ya odeakwụkwọ ọgbakọ unu ozugbo ị gara ọmụmụ ihe. N’ime otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ, odeakwụkwọ ga-eziga fọm ahụ n’ọgbakọ ga-elebara ya anya, ma ọ bụ jiri fọm ahụ dejupụta fọm Follow Up nke dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet ma zigara ya alaka ụlọ ọrụ. Ọ ga-ahụ fọm ahụ ma ọ pịa ebe e dere “Congregation” na jw.org. Ndị okenye kwesịrị ịna-aga jw.org mgbe mgbe ka ha mara ma è ziteere ha ozi. Ọ bụrụ na e ziteere ha ozi na e nwere onye chọrọ ka a mụwara ya ihe, ha kwesịrị ime ndokwa ka a gaa na nke onye ahụ ozugbo. Nwanna ọ bụla a gwara ka ọ gaa hụ onye ahụ kwesịrị ịga ozugbo ozugbo. Ọ bụrụ na onye ahụ anọghị n’ụlọ mgbe nwanna ahụ gara na nke ya, o nwere ike ịhapụrụ ya ozi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya