Matiu
10 Ya mere, ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya ma nye ha ikike n’ebe ndị mmụọ na-adịghị ọcha nọ,+ ka ha wee chụpụ ha, ka ha gwọọkwa ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla.
2 Aha ndịozi iri na abụọ+ ahụ bụ:+ Onye nke mbụ bụ Saịmọn, onye a na-akpọ Pita,+ na Andru+ nwanne ya; na Jems nwa Zebedi+ na Jọn nwanne ya; 3 Filip na Batọlọmiu;+ Tọmọs+ na Matiu+ onye ọnaụtụ; Jems nwa Alfiọs,+ na Tadiọs; 4 Saịmọn, onye na-anụ ọkụ n’obi,+ na Judas Iskarịọt, onye mesịrị rara ya nye.+
5 Jizọs zipụrụ mmadụ iri na abụọ a wee nye ha iwu, sị:+ “Unu abanyela n’okporo ụzọ ndị mba ọzọ, unu abanyekwala n’obodo ndị Sameria;+ 6 kama nke ahụ, na-agakwurunụ atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.+ 7 Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze eluigwe eruwo nso.’+ 8 Gwọọnụ ndị ọrịa,+ kpọlitenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ndị ekpenta dị ọcha, chụpụnụ ndị mmụọ ọjọọ. Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.+ 9 Unu ewerela ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ ọla kọpa unu ga-etinye n’obere akpa ego unu na-eke n’úkwù,+ 10 unu ewerela obere akpa nri maka njem unu, unu achịrịla uwe ime abụọ, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ, unu ewerekwala mkpara; n’ihi na onye ọrụ kwesịrị ka e nye ya nri.+
11 “N’obodo ukwu ma ọ bụ n’obodo nta ọ bụla unu banyere, chọpụtanụ onye kwesịrị ekwesị n’ime ya, nọrọkwanụ n’ebe ahụ ruo mgbe unu ga-apụ.+ 12 Mgbe unu na-abanye n’ụlọ, keleenụ ndị ezinụlọ ahụ; 13 ọ bụrụkwa na ụlọ ahụ kwesịrị ekwesị, ka udo unu na-asị ka o nwee dịkwasị ya;+ ma ọ bụrụ na o kwesịghị ekwesị, ka udo nke si n’ebe unu nọ lọghachiri unu. 14 N’ebe ọ bụla ọ na-adịghị onye nabatara unu ma ọ bụ onye gere ntị n’okwu unu, mgbe unu na-apụ n’ụlọ ahụ ma ọ bụ n’obodo ahụ, tichapụnụ ájá dị n’ụkwụ unu.+ 15 N’ezie, ana m asị unu, Ọ ga-adịrị ala Sọdọm+ na Gọmọra mfe n’Ụbọchị Ikpe karịa obodo ahụ.+
16 “Lee! M na-eziga unu dị ka atụrụ n’etiti anụ ọhịa wolf;+ ya mere, bụrụnụ ndị dị akọ dị ka agwọ,+ ndị na-adịghị aghụghọ, dị ka nduru.+ 17 Lezienụ anya maka ụmụ mmadụ;+ n’ihi na ha ga-enyefe unu n’ụlọikpe obodo,+ ha ga-apịakwa unu ihe+ n’ụlọ nzukọ ha.+ 18 N’ezie, a ga-akpụpụta unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze+ n’ihi m, ka ọ bụrụ àmà+ nye ha na ndị mba ọzọ. 19 Otú ọ dị, mgbe ha na-enyefe unu, unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi ekwu okwu ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu; n’ihi na a ga-enye unu ihe unu ga-ekwu n’oge awa ahụ;+ 20 n’ihi na ọ bụghị unu onwe unu na-ekwu okwu, kama ọ bụ mmụọ nke Nna unu si n’ọnụ unu na-ekwu okwu.+ 21 Nwanne+ ga-enyefekwa nwanne ya n’aka ọnwụ, nna ga-enyefekwa nwa ya, ụmụ ga-ebilikwa megide nne na nna ha, ha ga-emekwa ka e gbuo ha.+ 22 Mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m;+ ma onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.+ 23 Mgbe ha kpagburu unu n’otu obodo, gbalaganụ n’obodo ọzọ;+ n’ihi na n’ezie, ana m asị unu, Unu agaghị agazu+ obodo ndị dị n’Izrel ma ọlị ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute.+
24 “Onye na-eso ụzọ mmadụ adịghị aka onye nkụzi ya, ohu adịghịkwa aka onyenwe ya.+ 25 O zuuru onye na-eso ụzọ ịdị ka onye nkụzi ya, o zukwaara ohu ịdị ka onyenwe ya.+ Ọ bụrụ na ndị mmadụ akpọwo onyeisi ezinụlọ Bielzebọb,+ ọ̀ bụ na ha agaghị akpọ ya ndị ezinụlọ ya ọbụna karị? 26 Ya mere, unu atụla ha egwu; n’ihi na ọ dịghị ihe ọ bụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, ọ dịghịkwa ihe nzuzo nke a na-agaghị amata.+ 27 Ihe m na-agwa unu n’ọchịchịrị, kwuonụ ya n’ìhè; ihe unu nụkwara a takwunyere atakwunye, sinụ n’elu ụlọ kwusaa ya.+ 28 Unu atụkwala egwu+ ndị na-egbu ahụ́ ma ha enweghị ike igbu mkpụrụ obi; kama na-atụnụ egwu+ onye ahụ nke pụrụ ibibi ma mkpụrụ obi ma ahụ́ n’ime Gehena.*+ 29 Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụtali naanị ihe dị nta?+ Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala, Nna unu aghara ịma.+ 30 Ma a gụwo ntutu niile dị n’isi unu ọnụ.+ 31 Ya mere, unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.+
32 “Ya mere, onye ọ bụla nke na-ekwupụta na mụ na ya dị n’otu n’ihu ụmụ mmadụ, m ga-ekwupụtakwa na mụ na ya dị n’otu+ n’ihu Nna m nke nọ n’eluigwe; 33 ma onye ọ bụla nke na-agọnahụ m n’ihu mmadụ, m ga-agọnahụkwa+ ya n’ihu Nna m nke nọ n’eluigwe. 34 Unu echela na m bịara iweta udo n’elu ụwa; abịara m iweta, ọ bụghị udo,+ kama mma agha. 35 N’ihi na m bịara ịkpata nkewa, nwoke megide nna ya, na nwa nwaanyị megide nne ya, nakwa nwaanyị a lụrụ ọhụrụ megide nne di ya.+ 36 N’ezie, ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinụlọ ya. 37 Onye hụrụ nna ya ma ọ bụ nne ya n’anya nke ukwuu karịa otú ọ hụrụ m ekwesịghị m; onye hụkwara nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’anya nke ukwuu karịa otú ọ hụrụ m ekwesịghị m.+ 38 Onye ọ bụla nke na-achọghị iburu osisi ịta ahụhụ ya wee na-eso m n’azụ ekwesịghị m.+ 39 Onye chọtara mkpụrụ obi ya ga-atụfu ya, onye tụfukwara mkpụrụ obi ya n’ihi m ga-achọta ya.+
40 “Onye na-anabata unu na-anabatakwa m, onye na-anabatakwa m na-anabatakwa onye ahụ nke zitere m.+ 41 Onye na-anabata onye amụma n’ihi na ọ bụ onye amụma ga-enweta ụgwọ ọrụ nke onye amụma,+ onye na-anabatakwa onye ezi omume n’ihi na ọ bụ onye ezi omume ga-enweta ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume.+ 42 Onye ọ bụla nke nyere otu n’ime ndị a dị nta naanị otu iko mmiri jụrụ oyi ka ọ ṅụọ n’ihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, n’ezie, ana m asị unu, ọ ghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.”+