Joshụa
15 Òkè+ nke ebo ụmụ Juda ketara n’ezinụlọ n’ezinụlọ dị ruo n’ókè nke ala Idọm,+ ya bụ, ala ịkpa Zin,+ ruokwa Negeb+ na nsọtụ ebe ndịda ya. 2 Ókè nke ala ha n’ebe ndịda bụ malite na nsọtụ Oké Osimiri Nnu,+ malite n’ọnụ mmiri nke dị n’ebe ndịda. 3 Ọ gbadara n’ebe ndịda ruo n’ebe e si agbago Akrabim+ wee gafere ruo Zin,+ sikwa na ndịda gbagoo Kedesh-bania+ wee gafere ruo Hezrọn, gbagookwa Ada wee gaa gburugburu ruo Kaka. 4 Ọ gafekwara ruo Azmọn,+ ruokwa na ndagwurugwu Ijipt;+ ebe ókè ya jedebere bụ n’oké osimiri. Nke a wee bụrụ ókè ha n’ebe ndịda.
5 Ókè ya n’ebe ọwụwa anyanwụ bụ Oké Osimiri Nnu ruo na nsọtụ Jọdan, ókè ya n’isi isi ebe ugwu kwụsịrị n’ọnụ mmiri nke oké osimiri, na nsọtụ Jọdan.+ 6 Ókè nke ala ahụ gbagokwara Bet-họgla+ ma gafere ebe ugwu Bet-araba,+ ókè ya gbagokwara ruo nkume Bohan,+ nwa Ruben. 7 Ókè ya gbagokwara Diba n’ebe ndagwurugwu Ekọ+ ma chee ihu n’ebe ugwu ruo Gilgal,+ bụ́ nke dị n’ihu ebe e si agbago Adọmịm, nke dị na ndịda iyi ndagwurugwu; ókè ya gafekwara ruo mmiri En-shimesh,+ ebe o jedebere bụ En-rogel.+ 8 Ókè ya gbagokwara ndagwurugwu nwa Hinọm,+ ruo ná mkpọda nke obodo ndị Jibọs+ nke dị na ndịda, ya bụ, Jeruselem;+ ókè ya gbagoro n’elu ugwu nke chere ihu na ndagwurugwu Hinọm n’ebe ọdịda anyanwụ, nke dị na nsọtụ ndagwurugwu Refeyim+ n’ebe ugwu. 9 A kpakwara ókè ya malite n’elu ugwu ahụ ruo n’isi mmiri Neftoa,+ ruokwa n’obodo ndị dị n’Ugwu Ifrọn; a kpakwara ókè ya ruo Beala,+ ya bụ, Kiriat-jierim.+ 10 Ókè ya bidoro na Beala gaa gburugburu n’ebe ọdịda anyanwụ ruo n’Ugwu Sia, gaferekwa ruo ná mkpọda Ugwu Jierim n’ebe ugwu, ya bụ, Kesalọn; o wee gbadaa ruo Bet-shimesh+ ma gafee ruo Timna.+ 11 Ókè ya rukwara ná mkpọda Ekrọn+ n’ebe ugwu, a kpakwara ókè ya ruo Shikerọn, gafee ruo Ugwu Beala, ruokwa Jabniel; ebe ókè ya jedebere bụ n’oké osimiri.
12 Ókè ya n’ebe ọdịda anyanwụ bụ Osimiri Ukwu+ ahụ nakwa ala dị n’akụkụ ya. Ọ bụ nke a bụ ókè ya gbaa gburugburu, ya bụ, ókè nke ala ụmụ Juda, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.
13 O nyekwara Keleb+ nwa Jefọne òkè n’etiti ụmụ Juda dị ka iwu Jehova nyere Jọshụa si dị, ya bụ, Kiriat-aba (Aba nke a bụ nna Enak), ya bụ, Hibrọn.+ 14 Ya mere, Keleb chụpụrụ ụmụ Enak+ atọ n’ebe ahụ, ya bụ, Shishaị+ na Ahaịman na Talmaị,+ ndị Enak mụrụ.+ 15 O wee si n’ebe ahụ gaa buso ndị bi na Diba agha.+ (Aha Diba tupu mgbe ahụ bụ Kiriat-sifa.)+ 16 Keleb wee sị: “Onye ọ bụla nke bibiri Kiriat-sifa wee weghara ya, m ga-akpọnye ya Aksa+ nwa m nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.” 17 Ọtniel+ nwa Kinaz,+ bụ́ nwanne Keleb, wee weghara ya. O wee kpọnye ya Aksa+ nwa ya nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya. 18 O wee ruo na mgbe nwaanyị a na-ala, ọ nọ na-agwa di ya ka ọ rịọta nna ya ala. Nwaanyị a wee kụọ aka mgbe ọ nọ n’elu ịnyịnya ibu. Keleb wee sị ya: “Gịnị ka ị chọrọ?”+ 19 O wee sị: “Biko, nye m ngọzi, n’ihi na ọ bụ otu ibé ala nke dị n’ebe ndịda ka i nyere m, biko, nye m Gọlọt-meyim.” O wee nye ya Gọlọt Mgbago na Gọlọt Ndịda.+
20 Nke a bụ ihe nketa+ nke ebo ụmụ Juda,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ.
21 Obodo ndị dị na nsọtụ ebo ụmụ Juda, n’ebe dị nso n’ókè ha na Idọm,+ n’ebe ndịda, bụ Kabzil+ na Ida na Jegọ, 22 na Kaịna na Dimona na Adeda, 23 na Kidesh na Hezọ na Itnan, 24 Zif na Tilem+ na Bielọt, 25 na Hezọ-hadata na Kiriọt-hezrọn, ya bụ, Hezọ, 26 Emam na Shima na Moleda,+ 27 na Heza-gada na Heshmọn na Bet-pelet,+ 28 na Heza-shual+ na Bia-shiba+ na Biziotaya, 29 Beala+ na Ayịm na Izem,+ 30 na Eltolad na Kisil na Họma,+ 31 na Ziklag+ na Madmana na Sansana, 32 na Lebeọt na Shilhim na Eyin+ na Rimọn;+ obodo ahụ niile dị iri abụọ na itoolu, ha na ógbè ha niile.
33 Na Shefila+ e nwere Eshtaọl+ na Zora+ na Ashna, 34 na Zanoa+ na En-ganim, Tapua na Ịnam, 35 Jamọt+ na Adọlam,+ Soko+ na Azika,+ 36 na Shearem+ na Aditem na Gedira na Gederọtem; obodo iri na anọ na ógbè ha niile.
37 Zinan na Hadasha na Migdal-gad, 38 na Daịlien na Mizpe na Jọktiel, 39 Lekish+ na Bọzkat+ na Eglọn,+ 40 na Kabọn na Lamam na Kitlish, 41 na Gedirọt, Bet-degọn na Neama na Makida;+ obodo iri na isii na ógbè ha niile.
42 Libna+ na Ita+ na Eshan, 43 na Ịfta na Ashna na Nizib, 44 na Kaịla+ na Akzib+ na Marisha;+ obodo itoolu na ógbè ndị dị n’ime ha.
45 Ekrọn+ na obodo nta ya niile, tinyere ógbè ya niile. 46 Malite n’Ekrọn, n’ebe ọdịda anyanwụ, ihe niile dị n’akụkụ Ashdọd na ógbè ha niile.
47 Ashdọd,+ obodo nta ya niile na ógbè ya niile; Geza,+ obodo nta ya niile na ógbè ya niile, gbadaruo ndagwurugwu Ijipt, na Osimiri Ukwu na ógbè dị ya n’akụkụ.+
48 N’ógbè bụ́ ugwu ugwu, Shemia na Jatia+ na Soko, 49 na Dana na Kiriat-sana, ya bụ, Diba, 50 na Enab na Eshtemo+ na Enim, 51 na Goshen+ na Holọn na Gaịlo;+ obodo iri na otu na ógbè ha niile.
52 Arab na Duma na Ishan, 53 na Jenim na Bet-tapua na Afika, 54 na Họmta na Kiriat-aba, ya bụ, Hibrọn,+ na Zayọ; obodo itoolu na ógbè ha niile.
55 Meyọn,+ Kamel na Zif+ na Jọta, 56 na Jezril na Jọkdiam na Zanoa, 57 Keyin, Gibia na Timna;+ obodo iri na ógbè ha niile.
58 Halhọl, Bet-zọọ na Gidọ, 59 na Mearat na Bet-enọt na Eltekọn; obodo isii na ógbè ha niile.
60 Kiriat-bel,+ ya bụ, Kiriat-jierim,+ na Raba; obodo abụọ na ógbè ha niile.
61 N’ala ịkpa, Bet-araba,+ Midin na Sikeka, 62 na Nibshan na Obodo Nnu na En-gidaị;+ obodo isii na ógbè ha niile.
63 Ma ụmụ Juda achụpụlighị+ ndị Jibọs,+ bụ́ ndị biri na Jeruselem;+ ndị Jibọs wee biri na Jeruselem n’etiti ụmụ Juda ruo taa.