Joshụa
9 O wee ruo na ngwa ngwa ndị eze+ niile bụ́ ndị bi n’ofe Jọdan nke dị n’ógbè bụ́ ugwu ugwu nakwa na Shefila nakwa n’akụkụ dum nke Osimiri Ukwu+ nakwa n’ihu Lebanọn,+ ndị Het+ na ndị Amọraịt, ndị Kenan,+ ndị Perizaịt,+ ndị Haịvaịt na ndị Jibọs,+ nụrụ ya, 2 ha malitere izukọta iji gbakọọ aka buso Jọshụa na Izrel agha.+
3 Ndị bi na Gibiọn+ wee nụ ihe Jọshụa mere Jeriko+ na E-aị.+ 4 N’ihi ya, ha ji akọ+ mee ihe n’onwe ha wee buru ihe oriri, werekwa akpa kara nká maka ịnyịnya ibu ha, na karama akpụkpọ mmanya kara nká, ndị gbawara agbawa a dụkọtara adụkọta,+ 5 yirikwa akpụkpọ ụkwụ a dụkọtara adụkọta, nakwa uwe kara nká. Achịcha niile ha ji kpọkwara nkụ, gbariekwa agbari. 6 Ha wee gakwuru Jọshụa n’ebe ha mara ụlọikwuu na Gilgal+ ma gwa ya na ndị Izrel, sị: “Ọ bụ n’ala dị anya ka anyị si bịa. Ma ugbu a, ka anyị na unu gbaa ndụ.”+ 7 Ndị Izrel wee sị ndị Haịvaịt:+ “Ma eleghị anya, ọ bụ gburugburu ebe a ka unu bi. Oleekwanụ otú anyị na unu ga-esi agba ndụ?”+ 8 Ha wee sị Jọshụa: “Anyị bụ ndị ohu gị.”+
Jọshụa wee sị ha: “Ùnu bụ ole ndị, oleekwa ebe unu si bịa?” 9 Ha wee sị ya: “Ọ bụ n’ala dị nnọọ anya+ ka ndị ohu gị si bịa n’ihi aha+ Jehova bụ́ Chineke gị, n’ihi na anyị anụwo ude ya na ihe niile o mere n’Ijipt,+ 10 nakwa ihe niile o mere eze abụọ nke ndị Amọraịt bụ́ ndị bi n’ofe Jọdan, ya bụ, Saịhọn+ eze Heshbọn na Ọg+ eze Beshan, onye nọ n’Ashtarọt.+ 11 Ọ bụ ya mere ndị okenye anyị na ndị niile bi n’ala anyị ji sị anyị,+ ‘Werenụ ihe oriri maka njem a ma gakwuru ha, sịkwanụ ha: “Anyị bụ ndị ohu unu.+ Ka anyị na unu gbaa ndụ.”’+ 12 Achịcha a anyị ji dị ọkụ mgbe anyị weere ya ka ọ bụrụ ihe oriri anyị wee si n’ụlọ anyị pụtawa n’ụbọchị anyị pụtawara ịbịakwute unu n’ebe a, ma ugbu a, lee! ọ kpọọla nkụ, gbariekwa agbari.+ 13 Karama akpụkpọ mmanya ndị a dị ọhụrụ mgbe anyị gbajuru ha, ma, lee! ha agbawaala,+ uwe anyị ndị a na akpụkpọ ụkwụ anyị ndị a akawo nká n’ihi njem dị oké anya anyị mere.”
14 Ndị ikom ahụ wee nata ha ụfọdụ n’ime ihe oriri ha, ha ajụghịkwa Jehova ase.+ 15 Ha na Jọshụa wee mee udo,+ gbaakwa ndụ ka ọ hapụ ha ndụ, ndị isi+ nke nzukọ ahụ wee ṅụọrọ ha iyi.+
16 O wee ruo na mgbe ụbọchị atọ gasịrị, mgbe ha na ha gbasịrị ndụ, ha nụrụ na ha bi ha nso nakwa na ọ bụ gburugburu ebe ahụ ka ha bi. 17 Ụmụ Izrel wee kwalie rute n’obodo ha n’ụbọchị nke atọ, obodo ha bụ Gibiọn+ na Kefaịra+ na Bierọt+ na Kiriat-jierim.+ 18 Ụmụ Izrel ebusoghịkwa ha agha, n’ihi na ndị isi nke nzukọ ha ji Jehova bụ́ Chineke Izrel+ ṅụọrọ ha iyi.+ Nzukọ ahụ dum wee malite ịtamu ntamu megide ndị isi ahụ.+ 19 Ndị isi ahụ niile wee gwa nzukọ ahụ dum, sị: “Anyị onwe anyị ejiriwo Jehova bụ́ Chineke Izrel ṅụọrọ ha iyi, ugbu a kwa, a gaghị achọ ka anyị merụọ ha ahụ́.+ 20 Nke a bụ ihe anyị ga-eme ha ma hapụ ha ndụ, ka a ghara iweso anyị iwe n’ihi iyi anyị ṅụụrụ ha.”+ 21 Ndị isi ahụ wee sị ha: “Hapụnụ ha ka ha dịrị ndụ, ka ha ghọọkwa ndị na-akpatara nzukọ a dum+ nkụ na ndị na-esetara ha mmiri, dị nnọọ ka ndị isi kwere ha ná nkwa.”+
22 Jọshụa wee kpọọ ha ma gwa ha okwu, sị: “Gịnị mere unu ji ghọọ anyị aghụghọ, sị, ‘Anyị bi unu ebe dị nnọọ anya,’+ ma unu bi n’etiti anyị?+ 23 Ugbu a, unu bụ ndị a bụrụ ọnụ,+ ọ dịghị mgbe unu ga-akwụsị ịbụ ndị ohu+ na ndị na-akpata nkụ na ndị na-eseta mmiri maka ụlọ Chineke m.”+ 24 Ha wee zaa Jọshụa, sị: “Ọ bụ n’ihi na a gwara ndị ohu gị hoo haa na Jehova bụ́ Chineke gị nyere Mozis ohu ya iwu ka o nye unu ala a dum nakwa ka ọ laa ndị niile bi n’ala a n’iyi n’ihu unu,+ anyị wee tụọ egwu nke ukwuu maka mkpụrụ obi anyị n’ihi unu.+ Ọ bụ ya mere anyị ji mee ihe a.+ 25 Ugbu a, lee, anyị nọ gị n’aka. Mee anyị ihe ọ bụla dị mma ma zie ezie n’anya gị.”+ 26 O wee mee ha otú ahụ, napụtakwa ha n’aka ụmụ Izrel, ha egbughịkwa ha.+ 27 N’ụbọchị ahụ, Jọshụa mere+ ha ndị na-akpatara nzukọ ahụ nkụ na ndị na-esetara ha mmiri.+ O mekwara ha ndị na-akpata nkụ na ndị na-eseta mmiri maka ebe ịchụàjà Jehova, ruo taa, n’ebe ọ bụla ọ họọrọ.+