4 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova enyewo m ire nke ndị a kụziiri ihe,+ ka m wee mata otú m ga-esi zaa onye ike gwụrụ okwu.+ Ọ na-akpọte m kwa ụtụtụ; ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị a kụziiri ihe.+
11 Ma mgbe ha du unu na-aga ka ha nyefee unu, unu ebula ụzọ na-echegbu onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu;+ kama ihe ọ bụla e nyere unu n’oge awa ahụ, kwuonụ ya, n’ihi na ọ bụghị unu na-ekwu, kama ọ bụ mmụọ nsọ na-ekwu.+