Ọpụpụ 14:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Jehova n’onwe ya ga-eburu unu agha,+ unu onwe unu ga-agba nkịtị.” Diuterọnọmi 1:30 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 30 Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-ebutere unu ụzọ. Ọ ga-eburu unu agha+ dị ka ihe niile o meere unu n’Ijipt si dị, bụ́ ndị unu ji anya unu hụ,+ Diuterọnọmi 3:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Unu atụkwala ha egwu, n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-eburu unu agha.’+ Joshụa 23:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ma unu onwe unu ahụwo ihe niile Jehova bụ́ Chineke unu mere mba ndị a niile n’ihi unu,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ onye na-eburu unu agha.+ Abụ Ọma 33:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Mkpụrụ obi anyị anọwo na-atụ anya Jehova.+Ọ bụ onye na-enyere anyị aka na ọta anyị.+ Aịzaya 42:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Jehova ga-apụta dị ka dike.+ Ọ ga-akpọte ekworo dị ka onye agha.+ Ọ ga-eti mkpu, ee, ọ ga-eti mkpu agha;+ ọ ga-egosi na ya ka ndị iro ya ike.+ Zekaraya 14:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 “Jehova ga-aga buso mba ndị ahụ agha+ dị ka ọ na-eme n’ụbọchị ọ na-ebu agha, n’ụbọchị ọgụ.+
30 Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-ebutere unu ụzọ. Ọ ga-eburu unu agha+ dị ka ihe niile o meere unu n’Ijipt si dị, bụ́ ndị unu ji anya unu hụ,+
3 Ma unu onwe unu ahụwo ihe niile Jehova bụ́ Chineke unu mere mba ndị a niile n’ihi unu,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ onye na-eburu unu agha.+
13 Jehova ga-apụta dị ka dike.+ Ọ ga-akpọte ekworo dị ka onye agha.+ Ọ ga-eti mkpu, ee, ọ ga-eti mkpu agha;+ ọ ga-egosi na ya ka ndị iro ya ike.+