11 Boaz wee zaa ya, sị: “A kọworo m+ ihe niile i meere nne di gị mgbe di gị nwụsịrị,+ na otú i si hapụ nna gị na nne gị nakwa ala ndị ikwu gị wee bịakwute ndị ị na-amabughị.+
17 N’ógbè niile dị iche iche na obodo niile dị iche iche ebe okwu eze na iwu ya ruru, ndị Juu nwere ọṅụ na obi ụtọ, ọ bụkwa ụbọchị oriri+ na ikpori ndụ; ọtụtụ n’ime ndị obodo+ ahụ na-ekwukwa na ha bụ ndị Juu,+ n’ihi na ụjọ+ ndị Juu jidere ha.
14N’ihi na Jehova ga-emere Jekọb ebere,+ ọ ga-ahọrọ Izrel ọzọ.+ Ọ ga-emekwa ka ha zuru ike n’ala ha.+ Ndị mbịarambịa ga-esonyere ha, ha ga-araparakwa n’ụlọ Jekọb.+