29 Ọ sịrị Gehezaị+ ozugbo: “Kee ájị̀ n’úkwù,+ werekwa mkpara+ m gawa. Ọ bụrụ na i zute onye ọ bụla, ekelela ya;+ ọ bụrụkwa na onye ọ bụla ekelee gị, ekwela ya ekele. Tụkwasị mkpara m n’ihu nwa okoro ahụ.”+
20 Gehezaị+ bụ́ onye na-ejere Ịlaịsha onye nke ezi Chineke+ ozi wee sị: “Lee, nna m ukwu ahapụwo Neaman+ onye Siria nke a n’anaraghị ya ihe o wetara. Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ m ga-achụwa ya wee nata ya ihe.”+
27 N’ihi ya, ekpenta+ Neaman ga-arapara n’ahụ́ gị na ụmụ gị ruo mgbe ebighị ebi.”+ O si n’ihu ya pụọ ozugbo wee ghọọ onye ekpenta nke na-acha nnọọ ọcha.+