18 ka anyị, bụ́ ndị gbagaworo n’ebe mgbaba ahụ wee nwee agbamume siri ike iji jigide olileanya ahụ+ e debere n’ihu anyị, site n’ihe abụọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe, bụ́ ndị ọ na-agaghị ekwe omume na Chineke ga-agha ụgha na ha.+
7 Mgbe Chineke dọsịrị Noa+ aka ná ntị banyere ihe ndị a na-ahụbeghị anya,+ ọ bụ okwukwe ka o ji gosi egwu Chineke ma rụọ ụgbọ+ maka ịzọpụta ezinụlọ ya; o sitekwara n’okwukwe a maa ụwa ikpe,+ o wee ghọọ onye nketa nke ezi omume ahụ+ nke dị dị ka okwukwe si dị.