11 Ndị niile nọ n’ọnụ ụzọ ámá na ndị okenye wee sị: “Anyị bụ ndị akaebe! Ka Jehova mee ka nwunye gị nke na-abata n’ụlọ gị dịrị ka Rechel+ na Lia,+ bụ́ ndị wuru ụlọ Izrel;+ gosipụtakwa àgwà ọma gị n’Efrata+ ma mee ka aha gị dee ude na Betlehem.+
19 Ya mere, Bat-shiba gakwuuru Eze Sọlọmọn ịgwa ya okwu n’aha Adọnaịja.+ Eze biliri+ ozugbo izute ya wee kpọọrọ ya isiala.+ O wee nọdụ n’ocheeze ya, meekwa ka e debere nne eze ocheeze, ka o wee nọdụ n’aka nri ya.+
5 N’ihi na m na-echeta okwukwe+ ahụ nke dị n’ime gị, nke na-abụghị nke ihu abụọ ọ bụla,+ nke bukwa ụzọ dịrị n’ime nne gị ochie bụ́ Lọịs na nne gị bụ́ Yunis, nke m nwere obi ike na ọ dịkwa n’ime gị.