17 N’ógbè niile dị iche iche na obodo niile dị iche iche ebe okwu eze na iwu ya ruru, ndị Juu nwere ọṅụ na obi ụtọ, ọ bụkwa ụbọchị oriri+ na ikpori ndụ; ọtụtụ n’ime ndị obodo+ ahụ na-ekwukwa na ha bụ ndị Juu,+ n’ihi na ụjọ+ ndị Juu jidere ha.
2 Ndị dị iche iche ga-akpọrọ ha kpọbata n’obodo nke ha, ụlọ Izrel ga-akpọrọkwa ha ịbụ ihe nketa ha n’ala Jehova ka ha wee bụrụ ndị ikom na-eje ozi na ndị inyom na-eje ozi;+ ndị dọọrọ ha n’agha ka ha ga-adọrọkwa n’agha,+ ndị na-amanyebu ha ịrụ ọrụ ga-anọzi n’okpuru ha.+