Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Matiu 4:1-10
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 4 Mmụọ nsọ wee duru Jizọs banye n’ala ịkpa ka Ekwensu+ nwaa ya ọnwụnwa.+ 2 Mgbe o buchara ọnụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị, agụụ gụwara ya. 3 Onye Ọnwụnwa+ ahụ bịakwara sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.” 4 Ma ọ sịrị: “E dere, sị: ‘Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova* pụta.’”+

      5 Ekwensu wee kpọrọ ya banye n’obodo nsọ+ ma mee ka o guzoro n’elu ihe a rụbichiri n’elu ụlọ nsọ+ 6 wee sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si ebe a wụda, n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-eji aka ha ghọrọ gị, ka ị ghara ịkpọ ụkwụ na nkume.’”+ 7 Jizọs wee sị ya: “E dekwara, sị: ‘Anwala Jehova* bụ́ Chineke gị ọnwụnwa.’”+

      8 Ekwensu kpọkwaara ya gaa n’ugwu dị oké elu ma gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.+ 9 O wee sị ya: “Ihe a niile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala fee m ofufe.”* 10 Jizọs wee sị ya: “Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ Jehova* bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe,+ ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi dị nsọ.’”+

  • Luk 4:1-13
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 4 Jizọs wee si n’Osimiri Jọdan pụọ, mmụọ nsọ Chineke nyere ya eduru ya gaa n’ala ịkpa+ 2 ruo ụbọchị iri anọ. Ebe ọ na-erighị ihe ọ bụla n’ụbọchị ndị ahụ, agụụ gụwara ya mgbe ụbọchị ndị ahụ gachara. N’ihi ya, Ekwensu nwara ya,+ 3 sị: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.” 4 Ma Jizọs sịrị ya: “E dere, sị, ‘Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ.’”+

      5 N’ihi ya, Ekwensu kpọọrọ ya gaa n’otu ugwu, gosi ya alaeze niile nke ụwa n’otu ntabi anya.+ 6 Ekwensu wee sị ya: “M ga-enye gị ikike a niile na ebube ha, n’ihi na e nyefeela ha n’aka m,+ ọ bụkwa onye ọ bụla m chọrọ ka m ga-enye ha. 7 N’ihi ya, ọ bụrụ na i fee m ofufe,* ha niile ga-abụ nke gị.” 8 Jizọs asị ya: “E dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova* bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi dị nsọ.’”+

      9 O wee duru ya banye Jeruselem ma mee ka o guzoro n’elu ihe a rụbichiri n’elu ụlọ nsọ, wee sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si ebe a wụda,+ 10 n’ihi na e dere, sị, ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ka ha chebe gị.’ 11 E dekwara, sị: ‘Ha ga-eji aka ha ghọrọ gị, ka ị ghara ịkpọ ụkwụ na nkume.’”+ 12 Jizọs asị ya: “E kwuru, sị, ‘Anwala Jehova* bụ́ Chineke gị ọnwụnwa.’”+ 13 Mgbe Ekwensu nwachara ya ọnwụnwa ahụ niile, o si ebe Jizọs nọ pụọ ka ọ dịwa oge ọzọ ga-adaba adaba.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya