Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụ Ọgụgụ 35
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

      • Obodo ndị Livaị (1-8)

      • Obodo mgbaba (9-34)

Ọnụ Ọgụgụ 35:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:1; 36:13

Ọnụ Ọgụgụ 35:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 49:7; Di 18:1; Jos 14:4
  • +Le 25:32-34; Jos 21:3; 2Ih 11:14

Ọnụ Ọgụgụ 35:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.

Ọnụ Ọgụgụ 35:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 20:2, 3, 7, 8; 21:13, 21, 27, 32, 36, 38
  • +Di 4:42

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, p. 1885

Ọnụ Ọgụgụ 35:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 21:3

Ọnụ Ọgụgụ 35:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 49:7
  • +Ọg 26:54; 33:54

Ọnụ Ọgụgụ 35:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 3:8; 23:23; Ọg 34:2

Ọnụ Ọgụgụ 35:11

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 21:12, 13; Di 4:42; 19:4, 5

Ọnụ Ọgụgụ 35:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 35:19; Di 19:6
  • +Di 19:11, 12; Jos 20:5, 9

Ọnụ Ọgụgụ 35:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:41-43
  • +Di 19:8, 9; Jos 20:7

Ọnụ Ọgụgụ 35:15

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 12:49; Le 19:34; Ọg 15:16
  • +Jos 20:2, 3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/15/1995, p. 10-14, 16-17

Ọnụ Ọgụgụ 35:16

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 9:5; Ọp 21:12; Le 24:17; Di 19:11, 12

Ọnụ Ọgụgụ 35:17

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”

Ọnụ Ọgụgụ 35:18

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”

Ọnụ Ọgụgụ 35:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    11/2017, p. 9

    Ụlọ Nche,

    11/15/1995, p. 11

Ọnụ Ọgụgụ 35:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 21:14; Di 19:11, 12

Ọnụ Ọgụgụ 35:21

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”

Ọnụ Ọgụgụ 35:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 21:12, 13; Di 19:4, 5; Jos 20:2, 3

Ọnụ Ọgụgụ 35:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 35:12; Jos 20:4, 5

Ọnụ Ọgụgụ 35:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 29:4, 7

Ọnụ Ọgụgụ 35:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 20:6

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/15/1995, p. 13-14, 18-19

Ọnụ Ọgụgụ 35:30

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 9:6; Ọp 20:13
  • +Di 17:6; 19:15; Hib 10:28

Ọnụ Ọgụgụ 35:31

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 9:5; Ọp 21:14; Di 19:13

Ọnụ Ọgụgụ 35:33

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “n’ihi na ọbara.”

  • *

    Na Hibru, “ịwụfu ọbara onye wụfuru ọbara.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 4:8, 10; Ọm 106:38; Lu 11:50
  • +Je 9:6

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    8/1/2004, p. 27

Ọnụ Ọgụgụ 35:34

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 25:8; Le 26:12

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọnụ Ọgụ. 35:1Ọg 22:1; 36:13
Ọnụ Ọgụ. 35:2Je 49:7; Di 18:1; Jos 14:4
Ọnụ Ọgụ. 35:2Le 25:32-34; Jos 21:3; 2Ih 11:14
Ọnụ Ọgụ. 35:6Jos 20:2, 3, 7, 8; 21:13, 21, 27, 32, 36, 38
Ọnụ Ọgụ. 35:6Di 4:42
Ọnụ Ọgụ. 35:7Jos 21:3
Ọnụ Ọgụ. 35:8Je 49:7
Ọnụ Ọgụ. 35:8Ọg 26:54; 33:54
Ọnụ Ọgụ. 35:10Ọp 3:8; 23:23; Ọg 34:2
Ọnụ Ọgụ. 35:11Ọp 21:12, 13; Di 4:42; 19:4, 5
Ọnụ Ọgụ. 35:12Ọg 35:19; Di 19:6
Ọnụ Ọgụ. 35:12Di 19:11, 12; Jos 20:5, 9
Ọnụ Ọgụ. 35:14Di 4:41-43
Ọnụ Ọgụ. 35:14Di 19:8, 9; Jos 20:7
Ọnụ Ọgụ. 35:15Ọp 12:49; Le 19:34; Ọg 15:16
Ọnụ Ọgụ. 35:15Jos 20:2, 3
Ọnụ Ọgụ. 35:16Je 9:5; Ọp 21:12; Le 24:17; Di 19:11, 12
Ọnụ Ọgụ. 35:20Ọp 21:14; Di 19:11, 12
Ọnụ Ọgụ. 35:22Ọp 21:12, 13; Di 19:4, 5; Jos 20:2, 3
Ọnụ Ọgụ. 35:24Ọg 35:12; Jos 20:4, 5
Ọnụ Ọgụ. 35:25Ọp 29:4, 7
Ọnụ Ọgụ. 35:28Jos 20:6
Ọnụ Ọgụ. 35:30Je 9:6; Ọp 20:13
Ọnụ Ọgụ. 35:30Di 17:6; 19:15; Hib 10:28
Ọnụ Ọgụ. 35:31Je 9:5; Ọp 21:14; Di 19:13
Ọnụ Ọgụ. 35:33Je 4:8, 10; Ọm 106:38; Lu 11:50
Ọnụ Ọgụ. 35:33Je 9:6
Ọnụ Ọgụ. 35:34Ọp 25:8; Le 26:12
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
  • 33
  • 34
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọnụ Ọgụgụ 35:1-34

Ọnụ Ọgụgụ

35 Jehova wee gwa Mosis okwu n’ọzara Moab, n’akụkụ Osimiri Jọdan,+ n’ebe dị nso na Jeriko, sị: 2 “Gwa ndị Izrel ka ha si n’ala ha ga-eketa nye ndị Livaị obodo ndị ha ga-ebi.+ Ha ga-enyekwa ndị Livaị ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa bụ́ ndị ga-agba obodo ndị ahụ gburugburu.+ 3 Ha ga-ebi n’obodo ndị ahụ. Ala ebe anụmanụ na-ata ahịhịa ga-abụ maka anụ ụlọ ha, maka ihe ndị ha ji elekọta ha, nakwa maka anụmanụ ha ndị ọzọ niile. 4 Ala unu ga-enye ndị Livaị ka anụmanụ ha na-ata ahịhịa ga-adị otu puku (1,000) kubit* malite ná mgbidi obodo nke ọ bụla gazuo ya gburugburu. 5 Obodo nke ọ bụla ga-adị n’etiti, unu atụọ ala dị puku kubit abụọ (2,000) n’ebe ọwụwa anyanwụ ya, puku kubit abụọ (2,000) n’ebe ndịda ya, puku kubit abụọ (2,000) n’ebe ọdịda anyanwụ ya, nakwa puku kubit abụọ (2,000) n’ebe ugwu ya. Ala ndị ahụ ga-abụ ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa n’obodo ha dị iche iche.

6 “Obodo ndị unu ga-enye ndị Livaị ga-abụ obodo mgbaba isii,+ ndị unu ga-enye ha ka onye gburu mmadụ gbaga na ha.+ Unu ga-enyekwa ha obodo iri anọ na abụọ ọzọ. 7 Obodo niile unu ga-enye ndị Livaị ga-adị iri anọ na asatọ, ha na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.+ 8 Unu ga-esi n’ala ndị Izrel ga-eketa nye ha obodo ndị ahụ.+ Unu ga-anara ndị dị ọtụtụ ọtụtụ obodo, narakwa ndị dị ole na ole obodo ole na ole.+ Otú ala ebo nke ọ bụla ga-eketa ga-aha ka ha ga-eji mara obodo ole ha ga-enye ndị Livaị.”

9 Jehova gwakwara Mosis, sị: 10 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Unu ga-agafe Osimiri Jọdan ka unu banye n’ala Kenan.+ 11 Họrọnụ obodo ndị ga-adịrị unu mfe iru ka ha bụrụ obodo mgbaba, ebe onye gburu mmadụ* n’amaghị ụma ga-agbaga.+ 12 Obodo ndị ahụ ga-abụrụ unu ebe onye gburu mmadụ ga-agbaga, ka onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ+ ghara igbu onye ahụ ruo mgbe nzukọ unu ga-ekpe ya ikpe.+ 13 Ọ bụ uru obodo mgbaba isii ahụ unu ga-ahọrọ ga-abara unu. 14 Unu ga-ahọrọ obodo atọ n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan,+ họrọkwa obodo atọ n’ala Kenan+ ka ha bụrụ obodo mgbaba. 15 Obodo isii ndị a ga-abụrụ ndị Izrel, onye mbịarambịa,+ na onye binyeere ha ebe mgbaba, ebe onye ọ bụla gburu mmadụ* n’amaghị ụma ga-agbaga.+

16 “‘Ma ọ bụrụ na ọ kụrụ ya ígwè, ya anwụọ, o gburu mmadụ.* A ga-egburịrị onye ahụ gburu mmadụ.+ 17 Ọ bụrụ na ọ tụrụ ya nkume nke nwere ike igbu mmadụ, ya anwụọ, o gburu mmadụ.* A ga-egburịrị onye ahụ gburu mmadụ. 18 Ọ bụrụ osisi nke nwere ike igbu mmadụ ka ọ kụrụ ya, ya anwụọ, o gburu mmadụ.* A ga-egburịrị onye ahụ gburu mmadụ.

19 “‘Ọ bụ onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ga-egbu onye ahụ gburu mmadụ.* Ọ bụ yanwa ga-egbu ya ma o zute ya. 20 Ọ bụrụ na ọ kwara ya aka maka na ọ kpọrọ ya asị ma ọ bụkwanụ tụọ ya ihe maka na o buuru ya iwe n’obi, ya anwụọ,+ 21 ma ọ bụ, ọ bụrụ na o ji aka tigbuo ya maka na ọ kpọrọ ya asị, a ga-egburịrị onye ahụ tigburu ya. O gburu mmadụ.* Onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ga-egbu onye ahụ gburu mmadụ ma o zute ya.

22 “‘Ma ọ bụrụ na ọ kwara ya aka na mberede, ọ bụghịkwa maka na ọ kpọrọ ya asị, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ tụrụ ya ihe n’eburughị ya iwe n’obi,+ 23 ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ hụghị ya mgbe ọ tụrụ nkume, nkume ahụ atụgbuo onye ahụ, ma ọ bụghị na ọ bụ onye iro ya ma ọ bụ na ọ chọrọ imerụ ya ahụ́, 24 nzukọ unu ga-esoro ntụziaka ndị a kpeere onye ahụ gburu mmadụ na onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ikpe.+ 25 Nzukọ unu ga-anapụta onye ahụ gburu mmadụ n’aka onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ma kpọghachi ya n’obodo mgbaba ọ gbagara. Ọ ga-ebi ebe ahụ ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà e tere mmanụ nsọ nwụrụ.+

26 “‘Ma ọ bụrụ na onye ahụ gburu mmadụ agafee ókè obodo mgbaba ọ gbagara, 27 onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ewee hụ onye ahụ gburu mmadụ n’ebe na-esoghị n’obodo ahụ ọ gbagara wee gbuo ya, ikpe ọbara amaghị ya. 28 N’ihi na onye ahụ gburu mmadụ ga-ebirịrị n’obodo ọ gbagara ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà nwụrụ. Ma nnukwu onye nchụàjà nwụọ, o nwere ike ịlaghachi n’ala ya.+ 29 Ọ bụ iwu ndị a ka unu ga-eji na-ekpe ikpe n’ọgbọ unu niile n’ebe niile unu ga-ebi.

30 “‘A ga-egbu onye ọ bụla gburu mmadụ*+ ma ndị akaebe gbaa akaebe na o gburu mmadụ.+ Ma, a gaghị egbu mmadụ* ma ọ bụrụ naanị otu onye gbara akaebe. 31 Unu anarala ihe a ga-eji gbapụta onye gburu mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ kwesịrị ịnwụ, n’ihi na a ga-egburịrị ya.+ 32 Unu anarala ihe a ga-eji gbapụta onye gbagara n’obodo mgbaba, ka e wee hapụ ya ka ọ gaa biri n’ala ya tupu nnukwu onye nchụàjà anwụọ.

33 “‘Unu emerụla ala unu bi na ya n’ihi na igbu mmadụ* na-emerụ ala.+ E wepụ igbu onye gburu mmadụ,* e nweghị otú ọzọ e nwere ike isi mee ka ala e merụrụ dị ọcha.+ 34 Unu emerụla ala unu bi na ya, bụ́ ebe m bi; n’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova, binyeere ndị Izrel.’”+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya