-
Joshụa 20:7, 8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 N’ihi ya, ha họọrọ Kidesh+ nke dị na Galili n’ala Naftalaị bụ́ ugwu ugwu, họrọkwa Shikem+ nke dị n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, na Kiriat-aba,+ ya bụ, Hebrọn, nke dị n’ala Juda bụ́ ugwu ugwu. 8 Ná mpaghara Osimiri Jọdan, n’ebe ọwụwa anyanwụ Jeriko, ha si n’ebo Ruben họrọ Biza+ nke dị n’ala ịkpa dị larịị, sikwa n’ebo Gad họrọ Remọt+ nke dị na Gilied, sikwa n’ebo Manase+ họrọ Golan+ nke dị na Beshan.
-