Samuel nke Mbụ
21 Mgbe e mechara, Devid gara Nọb,+ na nke Ahimelek onye nchụàjà. Mgbe Ahimelek hụrụ Devid, ụjọ malitere ịtụ ya, ya asị ya: “Gịnị mere naanị gị ji bịa, n’enweghị onye so gị?”+ 2 Devid asị Ahimelek onye nchụàjà: “O nwere ihe eze gwara m ka m mee. Ma, ọ sịrị m, ‘Ekwela ka onye ọ bụla mara ihe ọ bụla gbasara ozi m na-ezi gị nakwa gbasara ihe m gwara gị mee.’ Mụ na ụmụ okorobịa m kwuru ebe anyị ga-ezute. 3 Ọ bụrụ na i nwere ogbe achịcha ise, nyetụ m ha, ma ọ bụkwanụ gị enye m ihe ọ bụla ọzọ i nwere.” 4 Ma, onye nchụàjà ahụ sịrị Devid: “O nweghị achịcha nkịtị dị ebe a, kama, e nwere achịcha dị nsọ+ m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ụmụ okorobịa gị emetụghị ụmụ nwaanyị aka.”*+ 5 Devid asị onye nchụàjà ahụ: “Anyị emetụghị ụmụ nwaanyị aka otú anyị na-anaghị emetụ ha aka ma m gawa agha.+ Ọ bụrụ na ụmụ okorobịa a na-edowe onwe ha nsọ ma anyị na-aga agha nkịtị, ọ̀ bụzi taa ka ha na-agaghị edowe onwe ha nsọ?” 6 Onye nchụàjà ahụ wee nye ya achịcha ahụ dị nsọ,+ n’ihi na e nweghị achịcha ọzọ dị ebe ahụ ma e wezụga ya. Ma, achịcha a adịghịzi n’ihu Jehova n’ihi na e wepụla ya n’ụbọchị a na-eji ewepụ ya, were nke e mere ọhụrụ dochie ya.
7 Otu n’ime ndị na-ejere Sọl ozi, onye a na-ekweghị ka o si n’ihu Jehova pụọ,* nọ ebe ahụ n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ onye Ịdọm.+ Aha ya bụ Doeg.+ Ọ bụ onyeisi ndị na-azụrụ Sọl atụrụ.
8 Devid wee sị Ahimelek: “È nwere ube ma ọ bụ mma agha dị ebe a? Ejighị m mma agha m, o nweghịkwa ngwá agha m ọ bụla m ji, n’ihi na ozi eze ziri m dị ọkụ ọkụ.” 9 Onye nchụàjà ahụ wee sị: “Mma agha Golayat,+ onye Filistia ahụ i gburu na Ndagwurugwu Ịla,+ dị ebe a. Ọ dị n’azụ efọd.+ E ji ákwà fụchie ya. Ọ bụrụ na ị chọrọ iwere ya, were ya, n’ihi na ọ bụ naanị ya dị ebe a.” Devid wee sị: “O nweghị nke ka ya mma. Nye m ya.”
10 N’ụbọchị ahụ, Devid gbawakwara ọsọ ọ nọ na-agba+ n’ihi Sọl. O mechara gbakwuru Ekish eze Gat.+ 11 Ndị na-ejere Ekish ozi wee sị ya: “Onye a ọ́ bụghị Devid bụ́ eze ala ya? Ọ́ bụghị ya bụ onye ha ji maka ya na-agba egwú, na-agụkwa egwú, sị,
‘Sọl egbuola puku kwuru puku,
Devid egbuokwala iri puku kwuru iri puku’?”+
12 Ihe a ha kwuru malitere inye Devid nsogbu n’obi. Ezigbo ụjọ jidekwara ya+ n’ihi Ekish eze Gat. 13 N’ihi ya, o mewere ka onye isi na-adịghị mma+ n’ihu ha. Ọ nọ na-akakasị ihe n’ibo ọnụ ụzọ ámá, na-agụkwa onwe ya ọnụ mmiri n’afụ ọnụ. 14 N’ikpeazụ, Ekish gwara ndị na-ejere ya ozi, sị: “Unu hụrụ na nwoke a bụ onye ara. Gịnị mere unu ji kpọtara m ya? 15 Ndị ara nọ n’obodo a ó zubeghị, mere unu ji kpọtara m onye ara a? Onye a ò kwesịrị ịbata n’ụlọ m?”