Ọrụ Kacha Mkpa ná Ndụ Anyị
1. Olee otú Jizọs si gosi na o ji ozi ọma kpọrọ mkpa?
1 Ikwusa ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa ná ndụ Jizọs. Ọ rụsiri ọrụ a ike, jiri ụkwụ gaa ọtụtụ kilomita gburugburu Palestaịn iji hụ na o kwusaara ọtụtụ ndị ozi ọma. Ọ gaghị chụwa akụnụba ka o nwee ike nwekwuo oge maka ozi ọma. (Mat. 8:20) Mgbe ìgwè mmadụ gbalịrị igbochi ya ka ọ ghara isi n’obodo ha pụọ, kama ka ọ nọrọ na-agwọrọ ha ndị ọrịa, ọ sịrị ha: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.”—Luk 4:43.
2. Gịnị mere ikwusa ozi ọma ji dị Jizọs oké mkpa?
2 Gịnị mere ikwusa ozi ọma ji dị Jizọs oké mkpa? Ihe kacha dị Jizọs mkpa bụ ido aha Jehova nsọ. (Mat. 6:9) Ọ hụrụ Nna ya nke eluigwe n’anya, n’ihi ya kwa, ọ chọrọ ime uche Ya ma na-erube isi n’iwu Ya niile. (Jọn 14:31) Ihe ọzọkwa bụ na ihe banyere ụmụ mmadụ na-emetụ ya n’obi, ọ chọkwara inyere ha aka.—Mat. 9:36, 37.
3. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị ji ozi ọma kpọrọ mkpa?
3 Ṅomie Jizọs: Iji ozi ọma kpọrọ mkpa otú Jizọs ji ya kpọrọ nwere ike isiri anyị ike n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe ndị dị n’ụwa a nwere ike ịdọpụ anyị uche ma ọ bụ rie oge anyị. (Mat. 24:37-39; Luk 21:34) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịchọpụta ihe ndị ka mkpa, wepụta oge anyị ga-eji na-akwadebe ozi ọma, ma hụ na anyị na-agachi ya anya. (Fil. 1:10) Anyị ga-agbalịsi ike hụ na anyị anaghị eji oge anyị niile na-achụ akụnụba, si otú ahụ hapụ iji ụwa eme ihe n’uju.—1 Kọr. 7:31.
4. Gịnị mere o ji dị oké mkpa na anyị ga-eme ka ozi ọma bụrụ ọrụ kacha mkpa ná ndụ anyị ugbu a?
4 Onye maara ihe na-ebu ụzọ eme ihe ndị kacha mkpa ma ọ bụrụ na oge o nwere ehighị nne. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ nụ na njinji ga-eji n’ihi oké ifufe ga-efenụ, ihe ga-akacha ya mkpa bụ otú ọ ga-esi chebe ezinụlọ ya nakwa ịgwa ndị agbata obi ya na agwọ nọ n’akịrịka. Ọ ga-ahapụgodị ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Oge fọdụrụ tupu Amagedọn ejie njinji n’ụwa a dị ntakịrị. (Zef. 1:14-16; 1 Kọr. 7:29) Iji zọpụta onwe anyị na ndị ga-anụ olu anyị, anyị ga-ahụrịrị na anyị na-elezi onwe anyị na ozizi anyị anya, ma n’ọgbakọ ma n’ozi ọma. (1 Tim. 4:16) N’eziokwu, ozi ọma bụrụ ọrụ kacha mkpa ná ndụ anyị, ọ ga-eso mee ka a zọpụta anyị!