Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Levitikọs 4:27
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 27 “‘Ọ bụrụ na mkpụrụ obi ọ bụla n’etiti ndị bi n’ala a emehie n’amaghị ama site n’ime otu n’ime ihe Jehova nyere iwu ka a ghara ime wee bụrụ onye ikpe mara,+

  • Aịzaya 53:10
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 10 Ma ọ tọrọ Jehova ụtọ igwepịa ya.+ O mere ka ọ rịa ọrịa.+ Ọ bụrụ na ị ga-eme ka mkpụrụ obi ya bụrụ àjà ikpe ọmụma,+ ọ ga-ahụ ụmụ ya,+ ọ ga-emekwa ka ụbọchị ya dị ogologo.+ Ihe na-atọ Jehova ụtọ+ ga-aga nke ọma+ n’aka ya.

  • Jọn 1:29
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 29 N’echi ya, ọ hụrụ Jizọs ka ọ na-abịakwute ya, o wee sị: “Lee Nwa Atụrụ+ Chineke nke na-ewepụ mmehie+ nke ụwa!+

  • 1 Ndị Kọrịnt 15:3
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 3 N’ihi na enyefere m unu, n’ime ihe ndị mbụ, ihe ahụ m natakwara,+ na Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo;+

  • 2 Ndị Kọrịnt 5:21
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 21 Onye ahụ nke na-enweghị mmehie+ ka o mere ka ọ bụrụ mmehie+ n’ihi anyị, ka anyị wee si n’aka ya bụrụ ndị ezi omume+ n’anya Chineke.

  • Ndị Galeshia 1:4
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 4 O nyere onwe ya maka mmehie anyị+ ka o wee napụta anyị n’ajọ usoro ihe dị ugbu a+ dị ka uche+ Chineke bụ́ Nna anyị si dị,

  • Ndị Efesọs 5:2
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 2 na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya,+ dị nnọọ ka Kraịst hụkwara unu n’anya+ ma nyefee onwe ya maka unu dị ka onyinye+ na àjà, ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ+ nye Chineke.

  • Taịtọs 2:14
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 14 onye nyere onwe ya+ n’ihi anyị ka o wee napụta+ anyị n’ụdị mmebi iwu niile, wee sachaara+ onwe ya ndị bụ́ ndị nke ya pụrụ iche,+ ndị na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ.+

  • Ndị Hibru 2:17
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 17 N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ọ dị ka “ụmụnna” ya n’ụzọ niile,+ ka o wee ghọọ nnukwu onye nchụàjà na-eme ebere, nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ijere Chineke ozi,+ ka o wee chụọ àjà ime udo+ maka mmehie nke ndị mmadụ.+

  • 1 Pita 2:24
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 24 Ya onwe ya buuru mmehie anyị+ n’ahụ́ ya n’elu osisi ahụ,+ ka anyị wee sepụ aka ná mmehie+ ma bie ndụ n’ezi omume. Ọ bụkwa “site n’ọnyá ya ka a gwọrọ unu.”+

  • 1 Jọn 2:2
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 2 Ọ bụ àjà+ ime udo+ maka mmehie anyị,+ ma ọ bụghị naanị maka mmehie anyị,+ kama, ọ bụkwa maka mmehie nke ụwa dum.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya