13 “‘Ọ bụrụ na onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ adị ọcha, wee bụrụ onye ihe kwụsịrị ịgbapụta n’ahụ́, ọ ga-agụpụtara onwe ya ụbọchị asaa iji mee onwe ya ka ọ dị ọcha,+ ọ ga-asụ uwe ya wee saa ahụ́ ya na mmiri e si n’iyi kute;+ ọ ga-aghọkwa onye dị ọcha.
14 N’ụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere nduru abụọ+ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-abịa n’ihu Jehova, n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, wee were ha nye onye nchụàjà.
14 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Ọ bụrụ na nna ya agbụọ ya ọnụ mmiri+ n’ihu, ọ̀ bụ na ọ gaghị ebu ihere ruo ụbọchị asaa? Kpọpụnụ ya iche+ ná mpụga ebe unu mara ụlọikwuu+ ruo ụbọchị asaa, e mesịakwa, na-abatanụ ya.”+