10 Mgbe Sanbalat+ onye Bet-horọn+ na Tobaya+ onye na-ejere ya ozi, bụ́ onye Amọn,+ nụrụ ya, ọ ghọrọ ihe dị oké njọ n’anya ha+ na mmadụ bịara ịchọrọ ụmụ Izrel ihe ọma.
7 O wee ruo na, ozugbo Sanbalat+ na Tobaya+ na ndị Arebia+ na ndị Amọn+ na ndị Ashdọd+ nụrụ na ọrụ ịrụzi mgbidi Jeruselem agawo n’ihu, n’ihi na a malitewo imechi oghere ndị dị na ya, oké iwe were ha.