Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ndị Eze 17:13
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 13 Jehova wee na-adọ Izrel+ na Juda+ aka ná ntị+ site n’ọnụ ndị amụma+ ya niile na ndị ọhụụ+ niile, sị: “Hapụnụ ụzọ ọjọọ+ unu ma debe ihe m nyere n’iwu+ na ụkpụrụ+ m, dị ka iwu+ dum m nyere nna nna unu hà+ si dị, nke m ziteere unu site n’ọnụ ndị ohu m bụ́ ndị amụma”;+

  • Aịzaya 55:7
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 7 Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya,+ ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya.+ Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere,+ ya laghachikwuru Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.+

  • Jeremaya 18:11
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 11 “Ugbu a, biko, gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m na-akwadebere unu ọdachi, na-echekwa echiche ime unu ihe.+ Biko, onye ọ bụla n’ime unu hapụ ụzọ ọjọọ ya, meekwanụ ka ụzọ unu na omume unu dị mma.”’”+

  • Jeremaya 35:15
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 15 Anọgidere m na-ezitere unu ndị ohu m niile, bụ́ ndị amụma,+ na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezite ha, na-asị, ‘Biko, onye ọ bụla hapụ ụzọ ọjọọ ya,+ meenụ ka omume unu dị mma,+ unu esokwala chi ọzọ dị iche iche wee fee ha ofufe.+ Birikwanụ n’ala m nyere unu na nna nna unu hà.’+ Ma unu atọghị ntị n’ala, unu egeghịkwa m ntị.+

  • Ezikiel 18:30
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 30 “‘Ya mere, ọ bụ dị ka ụzọ onye ọ bụla si dị ka m ga-ekpe unu ikpe,+ ụlọ Izrel,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+ ‘Chigharịanụ, ee, hapụnụ mmebi iwu unu niile,+ ka ihe ọ bụla gharakwa ịbụrụ unu ihe ịsụ ngọngọ nke na-akpata njehie.+

  • Ezikiel 33:11
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 11 Sị ha, ‘“Dị nnọọ ka m dị ndụ,” ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ọnwụ onye ajọ omume adịghị atọ m ụtọ,+ kama ihe na-atọ m ụtọ bụ ka onye ajọ omume hapụ+ ụzọ ya ma dịrị ndụ.+ Chigharịanụ, hapụnụ ụzọ ọjọọ unu.+ Gịnị mere unu ga-eji nwụọ, unu ụlọ Izrel?”’+

  • Jona 3:8
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 8 Ka ha yiri ákwà iru uju, ma mmadụ ma anụ ụlọ; ka ha kpọkusie Chineke ike, ka onye ọ bụla hapụkwa+ ụzọ ọjọọ ya na ihe ike ọ na-eme.

  • Zekaraya 1:4
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 4 “‘Unu adịla ka ndị nna unu+ bụ́ ndị ndị amụma oge mbụ ji olu dara ụda gwa,+ sị: “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Biko, sinụ n’ụzọ ọjọọ unu nakwa n’omume ọjọọ unu lọghachi.’’”+

      “‘Ma ha egeghị ntị, ha aṅaghịkwa m ntị,’+ ka Jehova kwuru.

  • Malakaị 3:7
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 7 Malite n’ụbọchị ndị nna nna unu, unu agbakụtawo ụkpụrụ m azụ, unu adịghịkwa edebe ha.+ Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.

      Unu asịwokwa: “Olee otú anyị ga-esi lọghachi?”

  • 2 Pita 3:9
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 9 Jehova adịghị egbu oge n’imezu nkwa ya,+ dị ka ụfọdụ ndị si ewere igbu oge, kama ọ na-enwere unu ndidi n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya