8 A kpụụrụ ya pụọ n’ihi na e gbochiri ikpe ziri ezi,+ kpeekwa ya ikpe mkpegbu; ònyekwa ga-echegbu onwe ya banyere ihe niile mere n’ọgbọ ya?+ N’ihi na e bipụrụ ya+ n’ala ndị dị ndụ.+ E tiri ya ihe+ n’ihi mmebi iwu nke ndị m.+
26 “Mgbe izu iri isii na abụọ ahụ gasịrị, a ga-ebipụ Mesaya,+ ya agbara aka.+
“Ndị nke onye ndú ahụ na-abịanụ ga-ebibi+ obodo ahụ na ebe nsọ ahụ.+ Ọ bụkwa idei mmiri ka a ga-eji bibie ya. A ga na-alụ agha ruo ná ngwụsị; ihe e kpebiri bụ mbibi.+