21 Ọ na-agbanwekwa oge na mgbe a kara aka,+ na-ewepụ ndị eze, na-emekwa ka ndị eze malite ịchị,+ na-enye ndị maara ihe amamihe, na-enyekwa ndị nwere nghọta ihe ọmụma.+
25 Ọ ga-ekwu okwu ọbụna megide Onye Kasị Elu,+ ọ ga na-enyekwa ndị nsọ nke Onye Kasị Elu nsogbu.+ Ọ ga-achọ ịgbanwe oge+ na iwu,+ a ga-enyefekwa ha n’aka ya ruo otu oge, oge abụọ na ọkara otu oge.+
11 Na-emekwanụ otú a, n’ihi na unu maara oge ahụ a kara aka, na oge awa ahụ eruwo ka unu teta n’ụra,+ n’ihi na nzọpụta anyị dị nso ugbu a karịa mgbe anyị ghọrọ ndị kwere ekwe.+