Abụ Ọma
Maka onye nduzi. Abụ ọma Devid. Abụ olu ụtọ.
139 Jehova, i nyochawo m, ị makwaara m.+
3 Ị tụwo ihe niile m na-eme atụ̀, ma mgbe m na-eme njem ma mgbe m na-edina ala,+
Ị makwaara ọbụna ụzọ m niile.+
5 Ị nọchibidowo m ihu na azụ;
Ị na-atụkwasị m aka gị.
8 Ọ bụrụ na mụ agbagoo n’eluigwe, ị ga-anọ n’ebe ahụ;+
Ọ bụrụkwa na mụ agbasaa ihe ndina m na Shiol, lee! ị ga-anọ n’ebe ahụ.+
9 Ọ bụrụ na mụ epuo nku+ nke chi ọbụbọ,
Ka m wee biri n’oké osimiri kasị dị anya,+
10 Aka gị ga na-edukwa m n’ebe ahụ,+
Aka nri gị ga-ejidekwa m.+
11 Ọ bụrụkwa na mụ asị: “N’ezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ngwa ngwa!”+
Abalị ga-aghọzi ìhè gburugburu m.+
12 Ọbụna ọchịchịrị agaghị agbara gị oké ọchịchịrị,+
Kama abalị ga na-enwu gbaa dị nnọọ ka ehihie;+
Ọchịchịrị ga-abụkwa ìhè.+
14 M ga-eto gị n’ihi na i kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube.+
Ọrụ gị dị ebube,+
Dị ka mkpụrụ obi m maara nke ọma.+
16 Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ,+
E dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị,
Bụ́ ụbọchị a kpụrụ ha,+
Mgbe a na-enwebeghị ọbụna otu n’ime ha.
17 Ya mere, lee ka echiche gị si dị oké ọnụ ahịa n’anya m!+
Chineke, lee ka ha si dị ọtụtụ ma a gụkọta ha!+
19 Chineke, a sị nnọọ na ị ga-egbu onye ajọ omume!+
Mgbe ahụ ọbụna ndị ikpe ọbara mara+ ga-esi n’ebe m nọ pụọ,