Ezikiel
1 O wee ruo n’afọ nke iri atọ, n’ọnwa nke anọ, n’abalị ise n’ọnwa ahụ, mgbe m nọ n’akụkụ osimiri Kiba+ n’etiti ndị a dọọrọ n’agha,+ na eluigwe meghere,+ m wee hụ ọhụụ Chineke.+ 2 N’abalị ise n’ọnwa ahụ, ya bụ, n’afọ nke ise mgbe a dọrọsịịrị Eze Jehoyakin+ n’agha, 3 okwu Jehova ruru+ Ezikiel+ nwa Buzaị bụ́ onye nchụàjà ntị, n’ala ndị Kaldia,+ n’akụkụ osimiri Kiba, aka Jehova dịkwasịkwara ya n’ebe ahụ.+
4 M wee hụ, ma, lee! oké ifufe+ si n’ebe ugwu fere na-abịa, e nwekwara nnukwu ígwé ojii+ na ọkụ na-enwu enwu,+ ìhè na-enwukwa gburugburu ígwé ojii ahụ, ihe yiri ọla nke na-egbu maramara sikwa n’etiti ya na-egbukepụ, ya bụ, n’etiti ọkụ ahụ.+ 5 Ihe yiri ihe anọ dị ndụ sikwa n’etiti ya pụta,+ otú a ka ha dị: ha yiri mmadụ. 6 Nke ọ bụla nwere ihu anọ,+ nke ọ bụla n’ime ha nwekwara nku anọ.+ 7 Ụkwụ ha kwụụrụ akwụrụ, ọbụ ụkwụ ha yikwara ọbụ ụkwụ nwa ehi;+ ha na-egbukekwa dị ka ọla kọpa nke na-egbu maramara.+ 8 Ha nwere aka mmadụ n’okpuru nku ha, n’akụkụ anọ ha,+ ha anọ nwere ihu, nweekwa nku.+ 9 Nke ọ bụla n’ime nku ha na-emetụ ibe ya. Ha anaghị atụgharị atụgharị mgbe ha na-aga; nke ọ bụla na-aga ihu ihu.+
10 A bịa n’otú ihu ha dị, ha anọ nwere ihu mmadụ,+ nweekwa ihu ọdụm+ n’akụkụ aka nri,+ ha anọ nwekwara ihu ehi+ n’akụkụ aka ekpe;+ ha anọ nwekwara ihu ugo.+ 11 Otú ahụ ka ihu ha dị. Ha gbasapụkwara nku+ ha agbasapụ ma chịlie ha elu. Nke ọ bụla nwere nku abụọ na-emetụ ibe ha, abụọ kpuchikwara ahụ́ ha.+
12 Nke ọ bụla n’ime ha na-aga ihu ihu.+ Ebe ọ bụla mmụọ nsọ chọrọ ka ha gaa, ha agaa.+ Ha anaghị atụgharị atụgharị ma ha na-aga.+ 13 A bịa n’otú ihe anọ ahụ dị ndụ dị, ha yiri icheku ọkụ nke na-ere ere.+ Ihe yiri ọwa ọkụ+ na-aga ihu na azụ n’agbata ihe ndị ahụ dị ndụ, ọkụ ya na-enwukwa enwu, àmụ̀mà sikwa n’ọkụ ahụ na-egbu.+ 14 Ihe ndị ahụ dị ndụ yiri àmụ̀mà ka ha na-apụ ma na-alọghachi.+
15 Ka m nọ na-ele ihe ndị ahụ dị ndụ, lee! e nwere otu wiil dị n’elu ala, n’akụkụ ihe ndị ahụ dị ndụ,+ n’akụkụ ihu anọ nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ dị ndụ.+ 16 A bịa n’otú wiil ndị ahụ dị+ na otú e si mee ha, ha na-egbu maramara dị ka nkume krisolaịt;+ ha anọ yiri ibe ha. Otú ha dị na otú e si mee ha dị nnọọ ka wiil nke dị n’ime wiil ọzọ.+ 17 Ọ bụrụ na ha gawa, ha nwere ike ịga n’akụkụ anọ ha.+ Ha anaghị atụgharị atụgharị ma ọ bụrụ na ha gawa n’ụzọ ọzọ.+ 18 A bịa na gburugburu elu wiil ndị ahụ, ha dị elu nke na ha na-atụ egwu; anya jupụtara gburugburu elu wiil ndị ahụ, gburugburu ha anọ.+ 19 Mgbe ihe ndị ahụ dị ndụ na-aga, wiil ndị ahụ na-aga n’akụkụ ha. Mgbe e si n’ala bulie ihe ndị ahụ dị ndụ elu, a na-ebuli wiil ndị ahụ elu.+ 20 Ebe ọ bụla mmụọ nsọ chọrọ ka ha gaa, ha agaa, ebe ọ bụ na mmụọ nsọ chọrọ ịga ebe ahụ; a na-ebulikwa wiil ndị ahụ elu n’akụkụ ha, n’ihi na mmụọ nsọ nke na-akpa ike n’ahụ́ ihe ndị ahụ dị ndụ dị na wiil ndị ahụ. 21 Ha gawa, wiil ndị ahụ agawa; ha guzoro otu ebe, wiil ndị ahụ eguzorokwa otu ebe; ọ bụrụ na e si n’ala bulie ha elu, a na-ebulikwa wiil ndị ahụ elu n’akụkụ ha, n’ihi na mmụọ nsọ nke na-akpa ike n’ahụ́ ihe ndị ahụ dị ndụ dị na wiil ndị ahụ.+
22 N’elu isi ihe ndị ahụ dị ndụ, e nwere ihe yiri mbara igwe+ nke na-egbu maramara dị ka mkpụrụ mmiri dị egwu, ọ gbasapụrụ n’elu isi ha.+ 23 Ha gbasara nku ha agbasa n’okpuru mbara igwe ahụ, otu na-emetụ ibe ya. Nke ọ bụla n’ime ha nwere nku abụọ nke kpuchiri otu akụkụ ahụ́ ya, nke ọ bụla nwekwara nku abụọ nke kpuchiri akụkụ ahụ́ ya nke ọzọ. 24 M wee nụ ụda nku ha mgbe ha na-aga, bụ́ ụda yiri nke nnukwu mmiri,+ dị ka ụda nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, dị ka mkpọtụ ọgba aghara,+ dị ka mkpọtụ nke ebe a mara ụlọikwuu.+ Mgbe ha guzoro otu ebe, ha na-achịtu nku ha.
25 M wee nụ otu olu n’elu mbara igwe ahụ nke dị n’elu isi ha. (Mgbe ha guzoro otu ebe, ha na-achịtu nku ha.) 26 N’elu mbara igwe ahụ nke dị n’elu isi ha, e nwere ihe yiri nkume safaya,+ ihe yiri ocheeze.+ N’elu ihe ahụ yiri ocheeze, e nwere onye yiri mmadụ nke nọkwasịrị ya,+ n’elu. 27 M wee hụ ihe yiri ọla na-egbu maramara+ dị ka ọkụ gbaa gburugburu n’ime ya,+ malite n’ihe yiri úkwù ya gbagoo; malitekwa n’ihe yiri úkwù ya gbadaa, m hụrụ ihe yiri ọkụ, ìhè na-enwukwa gburugburu ya. 28 E nwere ihe yiri ụta+ nke na-apụta n’ígwé ojii n’ụbọchị mmiri na-ezo. Ọ bụ otú ahụ ka ìhè nke na-enwu gburugburu ya dị. O yiri ebube Jehova.+ Mgbe m hụrụ ya, m gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala,+ m wee malite ịnụ olu onye ahụ nke na-ekwu okwu.