8 Ọ bụghị àjà ndị ị na-achụ mere m ji abara gị mba,
Ọ bụghịkwa n’ihi àjà ị na-esucha ọkụ, bụ́ ndị ị na-edowe n’ihu m mgbe niile.+
9 Agaghị m akpụrụ oké ehi n’ụlọ gị
Ma ọ bụ kpụrụ ewu n’ogige anụ ụlọ gị.+
10 N’ihi na ọ bụ m nwe ma anụ niile bi n’ọhịa+
Ma anụmanụ ndị bi n’ugwu niile.
11 M ma nnụnụ niile bi n’ugwu.+
Ọ bụ m nwe imirikitiimi anụmanụ bi n’ọhịa.
12 Ọ bụrụ na agụụ agụwa m, agaghị m agwa gị,
N’ihi na ọ bụ m nwe ụwa na ihe niile dị na ya.+
13 M̀ ga-eri anụ oké ehi
Ma ṅụọ ọbara ewu?+
14 Na-ekele Chineke. Ọ bụ ya bụ àjà ị ga-achụrụ ya,+
Mezuokwa nkwa i kwere Onye Kacha Elu.+
15 Kpọkuo m n’oge nsogbu.+
M ga-anapụta gị, ị ga-etokwa m.”+