Pita Nke Mbụ
4 Ebe Kraịst tara ahụhụ mgbe ọ bụ mmadụ,+ jikerekwanụ ịna-eche echiche otú Kraịst si eche, n’ihi na onye tarala ahụhụ ewepụla aka ná mmehie.+ 2 Ọ ga-eme ka onye ahụ na-eme uche Chineke+ mgbe ọ dị ndụ, ma kwụsị ịna-eme ihe na-agụ mmadụ agụụ.+ 3 N’ihi na n’oge gara aga, unu ji nnukwu oge bie ndụ otú ndị mba ọzọ na-achọ.+ Mgbe ahụ, ihe ọjọọ na-agụ unu agụụ, unu ana-eme ihe ọjọọ n’asọghị anya,* na-aṅụ oké mmanya, na-eme oriri oké mkpọtụ, unu na ibe unu ana-ama aka onye ga-aṅụkarị ibe ya ná mmanya, unu ana-ekpekwara arụsị.+ 4 Ugbu a, ọ na-eju ha anya na unu esoghịzi ha na-ebi ụdị ndụ ọjọọ a, ọ bụ ya mere ha ji ekwutọ unu.+ 5 Ma, ha ga-aza Kraịst ajụjụ n’ihi na ọ bụ ya ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.+ 6 N’eziokwu, ọ bụ ihe a mere e ji zisaara ndị nwụrụ anwụ ozi ọma.+ N’agbanyeghị na e kpere ha ikpe otú ụmụ mmadụ si ekpe ikpe,* ha ga-adị ndụ ma mmụọ Chineke na-edu ha.
7 Ma ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. N’ihi ya, na-elenụ ihe anya otú dị mma,+ na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile.*+ 8 Nke ka nke, jirinụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya,+ n’ihi na onye hụrụ ndị ọzọ n’anya na-adị njikere mgbe niile ịgbaghara ha ma ha mejọọ ya.+ 9 Na-elenụ ibe unu ọbịa n’atamughị ntamu.+ 10 Ka onye ọ bụla n’ime unu jiri onyinye Chineke nyere ya na-ejere ibe ya ozi, ebe unu bụ ezigbo ndị ohu Chineke ji ihe akpọrọ ihe,* ndị Chineke meere amara n’ụzọ dị iche iche.+ 11 Onye na-ekwu okwu, ya kwuo ihe Chineke kwuru. Onye na-ejere ndị ọzọ ozi, ya jiri ike Chineke na-eje ya,+ ka ọ ga-abụ na n’ihe niile, a ga-esi n’aka Jizọs Kraịst too Chineke.+ Ọ dị ebube, dịrịkwa ike ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
12 Ndị m hụrụ n’anya, ka ọnwụnwa ndị dị ka ọkụ na-abịara unu+ ghara iju unu anya, dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe unu na-ahụtụbeghị na-abịara unu. 13 Kama, na-aṅụrịnụ ọṅụ,+ ebe ọ bụ na ihe mere unu ji ata ahụhụ bụkwa ihe mere Kraịst ji taa ahụhụ,+ ka obi wee bụrụ unu sọ aṅụrị mgbe a ga-eme ka a hụ ebube ya.+ 14 Ọ bụrụ na a na-akọcha* unu n’ihi aha Kraịst, unu ga na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na mmụọ dị ebube, ya bụ, mmụọ Chineke, dị n’ime unu.
15 Ma, achọghị m ka onye ọ bụla n’ime unu taa ahụhụ maka na o gburu mmadụ ma ọ bụ na o zuru ohi ma ọ bụ na ọ bụ onye ọjọọ, ma ọ bụkwanụ na ọ na-etinye anya n’ihe na-agbasaghị ya.+ 16 Ma ọ bụrụ na mmadụ na-ata ahụhụ maka na ọ bụ Onye Kraịst, ka ihere ghara ime ya,+ kama ka ọ na-ebi ndụ ka Onye Kraịst, si otú ahụ na-eto Chineke. 17 N’ihi na oge a kara aka eruola ka e si n’ụlọ Chineke+ malite ikpe ikpe. Ma ọ bụrụ na ọ ga-eji anyị malite,+ gịnịzi ga-eme ndị na-anaghị erube isi n’ozi ọma Chineke?+ 18 “Ọ bụrụkwa na onye ezi omume ga-agbasi mbọ ike tupu Chineke azọpụta ya, gịnịzi ga-eme onye na-anaghị asọpụrụ Chineke na onye mmehie?”+ 19 N’ihi ya, ka ndị na-ata ahụhụ maka na ha na-eme ihe dị Chineke mma mere ihe dị mma+ na-aga. Ka ha nyefeekwa Chineke onwe ha.* Ọ bụ ya kere anyị, anyị kwesịkwara ịtụkwasị ya obi.