Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụ Ọgụgụ 18
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

      • Ọrụ ndị nchụàjà na ọrụ ndị Livaị (1-7)

      • Òkè a ga na-enye ndị nchụàjà (8-19)

        • Ọgbụgba ndụ ga-adịgide adịgide (19)

      • Ndị Livaị ga na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri, na-enyekwa ya (20-32)

Ọnụ Ọgụgụ 18:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 25:8; Le 21:10-12
  • +Ọp 28:38; Le 22:9; Ọg 18:23

Ọnụ Ọgụgụ 18:2

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ụlọikwuu Ihe Àmà.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 3:6; 8:22; 16:9
  • +Ọg 1:53

Ọnụ Ọgụgụ 18:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 3:25, 26, 30, 31, 36, 37
  • +Ọg 4:15, 20; 16:39, 40

Ọnụ Ọgụgụ 18:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Onye mbịarambịa ọ bụla,” ya bụ, nwoke na-esighị n’ezinụlọ Erọn.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 1:51; 3:10

Ọnụ Ọgụgụ 18:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 24:2, 3; Ọg 3:32
  • +Ọp 30:7
  • +Ọg 16:46

Ọnụ Ọgụgụ 18:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 3:9, 12; 8:15, 16
  • +Ọg 8:19

Ọnụ Ọgụgụ 18:7

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Onye mbịarambịa ọ bụla,” ya bụ, nwoke na-esighị n’ezinụlọ Erọn.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 16:2, 12; Hib 9:3, 7
  • +1Sa 2:28; Hib 5:4
  • +Ọg 3:10; 16:39, 40

Ọnụ Ọgụgụ 18:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 23:19; Le 27:28, 30; Ọg 18:11, 26
  • +Le 7:34; Ọg 5:9

Ọnụ Ọgụgụ 18:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 2:3
  • +Le 5:11, 12; 6:25, 26
  • +Le 7:1, 7

Ọnụ Ọgụgụ 18:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 29:32; Le 6:14, 16; 10:12, 13
  • +Le 6:18; 7:1, 6; 14:13; 21:22

Ọnụ Ọgụgụ 18:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 15:20; Ezi 44:30
  • +Ọp 29:27; Le 7:34
  • +Le 10:14; Di 18:3
  • +Le 22:4-6

Ọnụ Ọgụgụ 18:12

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 2:14; Di 18:4
  • +Ilu 3:9

Ọnụ Ọgụgụ 18:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 23:19

Ọnụ Ọgụgụ 18:14

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, ihe ọ bụla e dooro Chineke nsọ, bụ́ ihe e nyere Chineke nke a na-enweghị ike ịgbara agbara.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 27:21, 28

Ọnụ Ọgụgụ 18:15

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “nke anụ ahụ́ niile.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 13:2; Le 27:26; Ọg 3:13
  • +Ọp 13:13
  • +Ọp 34:20; Le 27:27

Ọnụ Ọgụgụ 18:16

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

  • *

    Ma ọ bụ “e jiri shekel dị nsọ.”

  • *

    Otu gira bụ gram 0.57. Gụọ B14.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 27:6

Ọnụ Ọgụgụ 18:17

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 22:30; Di 15:19
  • +Le 17:11
  • +Le 3:16

Ọnụ Ọgụgụ 18:18

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 29:26; Le 7:31, 34

Ọnụ Ọgụgụ 18:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ọgbụgba ndụ nnu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 23:19; Ọg 15:18, 19; 18:11, 26; 31:28, 29
  • +2Ih 31:4

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Teta!,

    6/8/2002, p. 26

Ọnụ Ọgụgụ 18:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 26:62, 63; Di 10:9; 14:27; Jos 14:3
  • +Di 18:1, 2; Jos 18:7; Ezi 44:28

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    12/15/2011, p. 31

    9/15/2011, p. 7-8

    4/15/1998, p. 20

Ọnụ Ọgụgụ 18:21

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, ụmụ anụmanụ ha nakwa ihe ndị ha nwetara n’ubi.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 27:30; Neh 10:37; 12:44; Hib 7:5

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara, isiokwu 170

Ọnụ Ọgụgụ 18:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 3:6, 7; 18:1
  • +Jos 13:33

Ọnụ Ọgụgụ 18:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 10:9

Ọnụ Ọgụgụ 18:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 18:21; Di 12:19
  • +Neh 10:38

Ọnụ Ọgụgụ 18:27

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 15:20

Ọnụ Ọgụgụ 18:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 18:8, 12

Ọnụ Ọgụgụ 18:31

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Kọ 9:13

Ọnụ Ọgụgụ 18:32

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 22:2, 15

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọnụ Ọgụ. 18:1Ọp 25:8; Le 21:10-12
Ọnụ Ọgụ. 18:1Ọp 28:38; Le 22:9; Ọg 18:23
Ọnụ Ọgụ. 18:2Ọg 3:6; 8:22; 16:9
Ọnụ Ọgụ. 18:2Ọg 1:53
Ọnụ Ọgụ. 18:3Ọg 3:25, 26, 30, 31, 36, 37
Ọnụ Ọgụ. 18:3Ọg 4:15, 20; 16:39, 40
Ọnụ Ọgụ. 18:4Ọg 1:51; 3:10
Ọnụ Ọgụ. 18:5Le 24:2, 3; Ọg 3:32
Ọnụ Ọgụ. 18:5Ọp 30:7
Ọnụ Ọgụ. 18:5Ọg 16:46
Ọnụ Ọgụ. 18:6Ọg 3:9, 12; 8:15, 16
Ọnụ Ọgụ. 18:6Ọg 8:19
Ọnụ Ọgụ. 18:7Le 16:2, 12; Hib 9:3, 7
Ọnụ Ọgụ. 18:71Sa 2:28; Hib 5:4
Ọnụ Ọgụ. 18:7Ọg 3:10; 16:39, 40
Ọnụ Ọgụ. 18:8Ọp 23:19; Le 27:28, 30; Ọg 18:11, 26
Ọnụ Ọgụ. 18:8Le 7:34; Ọg 5:9
Ọnụ Ọgụ. 18:9Le 2:3
Ọnụ Ọgụ. 18:9Le 5:11, 12; 6:25, 26
Ọnụ Ọgụ. 18:9Le 7:1, 7
Ọnụ Ọgụ. 18:10Ọp 29:32; Le 6:14, 16; 10:12, 13
Ọnụ Ọgụ. 18:10Le 6:18; 7:1, 6; 14:13; 21:22
Ọnụ Ọgụ. 18:11Ọg 15:20; Ezi 44:30
Ọnụ Ọgụ. 18:11Ọp 29:27; Le 7:34
Ọnụ Ọgụ. 18:11Le 10:14; Di 18:3
Ọnụ Ọgụ. 18:11Le 22:4-6
Ọnụ Ọgụ. 18:12Le 2:14; Di 18:4
Ọnụ Ọgụ. 18:12Ilu 3:9
Ọnụ Ọgụ. 18:13Ọp 23:19
Ọnụ Ọgụ. 18:14Le 27:21, 28
Ọnụ Ọgụ. 18:15Ọp 13:2; Le 27:26; Ọg 3:13
Ọnụ Ọgụ. 18:15Ọp 13:13
Ọnụ Ọgụ. 18:15Ọp 34:20; Le 27:27
Ọnụ Ọgụ. 18:16Le 27:6
Ọnụ Ọgụ. 18:17Ọp 22:30; Di 15:19
Ọnụ Ọgụ. 18:17Le 17:11
Ọnụ Ọgụ. 18:17Le 3:16
Ọnụ Ọgụ. 18:18Ọp 29:26; Le 7:31, 34
Ọnụ Ọgụ. 18:19Ọp 23:19; Ọg 15:18, 19; 18:11, 26; 31:28, 29
Ọnụ Ọgụ. 18:192Ih 31:4
Ọnụ Ọgụ. 18:20Ọg 26:62, 63; Di 10:9; 14:27; Jos 14:3
Ọnụ Ọgụ. 18:20Di 18:1, 2; Jos 18:7; Ezi 44:28
Ọnụ Ọgụ. 18:21Le 27:30; Neh 10:37; 12:44; Hib 7:5
Ọnụ Ọgụ. 18:23Ọg 3:6, 7; 18:1
Ọnụ Ọgụ. 18:23Jos 13:33
Ọnụ Ọgụ. 18:24Di 10:9
Ọnụ Ọgụ. 18:26Ọg 18:21; Di 12:19
Ọnụ Ọgụ. 18:26Neh 10:38
Ọnụ Ọgụ. 18:27Ọg 15:20
Ọnụ Ọgụ. 18:29Ọg 18:8, 12
Ọnụ Ọgụ. 18:311Kọ 9:13
Ọnụ Ọgụ. 18:32Le 22:2, 15
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọnụ Ọgụgụ 18:1-32

Ọnụ Ọgụgụ

18 Jehova wee gwa Erọn, sị: “Gị na ụmụ gị ndị nwoke na ndị si n’ọnụmara gị ga-aza ajụjụ mgbe ọ bụla e mebiri iwu na-achị ebe nsọ.+ Gị na ụmụ gị ndị nwoke ga-azakwa ajụjụ mgbe ọ bụla e mebiri iwu na-achị ndị nchụàjà.+ 2 Kpọtakwa ụmụnne gị ndị si n’ebo Livaị, bụ́ ebo nna gị, nso, ka ha soro gị na-ejere gị na ụmụ gị ndị nwoke ozi+ n’ihu ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya.*+ 3 Ha ga na-arụ ọrụ i nyere ha na ọrụ niile gbasara ụlọikwuu ahụ.+ Ma, ha agaghị abịa arịa ndị dị n’ebe nsọ ahụ nakwa ebe ịchụàjà ahụ nso, ka hanwa ma ọ bụ ununwa ghara ịnwụ.+ 4 Ha ga-esoro gị na-arụ ọrụ niile gbasara ụlọikwuu nzute, na-ejekwa ozi niile ha kwesịrị ije n’ụlọikwuu. Onye na-abụghị onye nchụàjà* agaghị abịa unu nso.+ 5 Unu ga na-arụ ọrụ unu kwesịrị ịrụ n’ebe nsọ+ nakwa n’ebe ịchụàjà+ ka m ghara iwesa ndị Izrel iwe ọzọ.+ 6 M si ná ndị Izrel kpọrọ ụmụnne unu, bụ́ ndị Livaị, kpọnye unu ka ha bụrụ onyinye m nyere unu.+ Ha bụ ndị e nyere Jehova ka ha na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute.+ 7 Ọ bụ gị na ụmụ gị ndị nwoke ga na-arụ ọrụ nchụàjà n’ebe ịchụàjà nakwa n’ime ebe ahụ e gebichiri ákwà mgbochi.+ Ọ bụ unu ga na-eje ozi a.+ Enyela m unu ọrụ nchụàjà ka ọ bụrụ onyinye m nyere unu. Onye ọ bụla na-abụghị onye nchụàjà* bịara nso, a ga-egbu ya.”+

8 Jehova gwakwara Erọn, sị: “M meela gị onye na-ahụ maka onyinye ndị a na-enye m.+ Enyela m gị na ụmụ gị ndị nwoke ụfọdụ n’ime ihe niile dị nsọ ndị Izrel na-enye n’onyinye ka ha bụrụ òkè a ga na-enye unu mgbe niile.+ 9 Ihe ndị a ga-abụ nke gị n’ime àjà ndị kacha nsọ a na-esu ọkụ: àjà ọ bụla ha na-achụ, ma àjà ọka ha+ ma àjà mmehie ha+ ma àjà ikpe ọmụma ha,+ bụ́ ndị ha na-ewetara m. Ọ ga-abụrụ gị na ụmụ gị ndị nwoke ihe kacha nsọ. 10 Ị ga-anọ n’ebe dị ezigbo nsọ rie ya.+ Onye ọ bụla bụ́ nwoke nwere ike iri ya. Ọ ga-abụrụ gị ihe dị nsọ.+ 11 Ihe ndị a ga-abụkwa nke gị: onyinye ndị ha na-enye+ nakwa àjà niile a na-efegharị efegharị+ ndị Izrel na-eweta. Ewerela m ha nye gị na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị ka ha bụrụ òkè unu mgbe niile.+ Onye ọ bụla dị ọcha nọ n’ụlọ gị nwere ike iri ya.+

12 “M na-enye gị+ mmanụ niile kacha mma na mmanya ọhụrụ niile kacha mma nakwa ọka,* bụ́ mkpụrụ mbụ ha,+ ndị ha na-enye Jehova. 13 Mkpụrụ mbụ kara aka n’ime ihe niile si n’ala ha, bụ́ ndị ha ga na-ewetara Jehova, ga-abụ nke gị.+ Onye ọ bụla dị ọcha nọ n’ụlọ gị nwere ike iri ha.

14 “Ihe ọ bụla e wepụtara iche n’Izrel ka ọ bụrụ nke Chineke* ga-abụ nke gị.+

15 “Nwa mbụ nke ihe niile dị ndụ*+ ha ga-ewetara Jehova, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụmanụ, ga-abụ nke gị. Ma, ị ga-agbara nwa mbụ mmadụ mụrụ.+ Ị ga-agbarakwa nwa mbụ anụmanụ na-adịghị ọcha mụrụ.+ 16 Ị ga-eji ego ole e ji agbara ya gbara ya mgbe ọ dị otu ọnwa ma ọ bụ karịa, ya bụ, shekel* ọlaọcha ise e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya,+ ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya. Ọ bụ gira* iri abụọ. 17 Ọ bụ naanị oké ehi e bu ụzọ mụọ ma ọ bụ ebule e bu ụzọ mụọ ma ọ bụ ewu e bu ụzọ mụọ ka ị na-agaghị agbara agbara.+ Ha bụ ihe dị nsọ. Ị ga-efesa ọbara ha n’ebe ịchụàjà.+ Ị ga-esukwa abụba ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ. Ha bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.+ 18 Anụ ha ga-abụ nke gị. Ha ga-abụ nke gị otú ahụ okpuru afọ* anụ e ji achụ àjà a na-efegharị efegharị nakwa ụkwụ aka nri ya bụ nke gị.+ 19 Enyela m gị na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị onyinye niile dị nsọ ndị Izrel ga na-enye Jehova+ ka ọ bụrụ òkè unu mgbe niile.+ Ọ ga-abụrụ gị na ụmụ gị ọgbụgba ndụ ga-adịte aka* n’ihu Jehova.”

20 Jehova wee sị Erọn: “Ị gaghị eketa ala n’ala Izrel, e nweghịkwa ala ha ga-abụ nke gị.+ Abụ m òkè gị, bụrụkwa ihe ị ga-eketa n’etiti ndị Izrel.+

21 “Lee, enyela m ụmụ Livaị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ọ bụla+ ndị Izrel rụtara* ka ọ bụrụ ihe ha ketara maka ozi ha na-eje, ya bụ, ozi ha na-eje n’ụlọikwuu nzute. 22 Ndị Izrel agaghịzi na-abịa nso n’ụlọikwuu nzute, ka ha ghara ibutere onwe ha mmehie ma nwụọ. 23 Ọ bụ ndị Livaị ga na-eje ozi ndị gbasara ụlọikwuu nzute, ọ bụkwa ha ga na-aza ajụjụ maka mmehie ndị Izrel.+ Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide n’ọgbọ unu niile na ha agaghị eketa ala ọ bụla n’etiti ndị Izrel.+ 24 N’ihi na enyela m ndị Livaị otu ụzọ n’ụzọ iri ndị Izrel ga na-eweta, nke ha ga na-enye Jehova, ka ọ bụrụ ihe ha ketara. Ọ bụ ya mere m ji sị ha, ‘Ha agaghị eso ndị Izrel keta ala ọ bụla.’”+

25 Jehova gwaziri Mosis, sị: 26 “Gwa ndị Livaị, sị, ‘Unu ga-anara ndị Izrel otu ụzọ n’ụzọ iri m si n’aka ha nye unu ka ọ bụrụ ihe unu ketara.+ Unu ga-esikwa n’otu ụzọ n’ụzọ iri ahụ nye Jehova otu ụzọ n’ụzọ iri.+ 27 A ga-ewere ya na ọ bụ onyinye unu, ka à ga-asị na ọ bụ ọka* nke si n’ebe unu na-azọcha ọka+ ma ọ bụ mmanya buru ibu nke si n’ebe unu na-azọchapụta mmanya ma ọ bụ mmanụ buru ibu nke si n’ebe unu na-azọchapụta mmanụ. 28 Unu ga-esi otú a si n’otu ụzọ n’ụzọ iri niile unu na-anata ndị Izrel na-enye Jehova onyinye. Unu ga-esikwa na ha na-enye Erọn onye nchụàjà onyinye Jehova. 29 Unu ga-esi n’onyinye niile kacha mma a na-enye unu nye Jehova ụdị onyinye ọ bụla,+ ka ọ bụrụ ihe dị nsọ.

30 “Ị ga-agwakwa ha, sị, ‘Mgbe unu ndị Livaị si na ha nye ihe kacha mma n’onyinye, a ga-ewere ya ka à ga-asị na ọ bụ ọka si n’ebe unu na-azọcha ọka na mmanya si n’ebe unu na-azọchapụta mmanya ma ọ bụ mmanụ si n’ebe unu na-azọchapụta mmanụ. 31 Unu na ndị ezinụlọ unu nwere ike ịnọ n’ebe ọ bụla rie ya n’ihi na ọ bụ ụgwọ ọrụ unu maka ozi unu na-eje n’ụlọikwuu nzute.+ 32 Unu agaghị ebutere onwe unu mmehie n’ihe a ma ọ bụrụhaala na unu na-enye ihe kacha mma n’ime ha n’onyinye. Unu emerụkwala ihe ndị dị nsọ ndị Izrel na-eweta, ka unu ghara ịnwụ.’”+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya