Emọs
3 “Ndị Izrel, nụrụnụ ihe a Jehova kwuru gbasara unu, gbasara ezinụlọ niile o si n’Ijipt kpọpụta. Ọ sịrị:
2 ‘Naanị unu ka m ma n’ezinụlọ niile dị n’ụwa.+
Ọ bụ ya mere m ga-eji kpọọ unu ka unu zaa ajụjụ maka mmehie niile unu mere.+
3 Mmadụ abụọ hà ga-eso gaa ihe ma ọ bụrụ na ha ebughị ụzọ kpaa ebe ha ga-ezukọ?*
4 Ọdụm ọ̀ ga-agbọ ụja n’oké ọhịa ma ọ bụrụ na ọ hụghị anụ ọ ga-eri?
Ọdụm ọ̀ ga-aba mba n’ebe o zoro ma ọ bụrụ na ọ nwụdeghị ihe ọ bụla?
5 Nnụnụ ọ̀ ga-ama n’ọnyà dị n’ala ma ọ bụrụ na e siirighị ya ọnyà?*
Ọnyà ọ̀ ga-akụchi ma ọ bụrụ na ọ mataghị ihe ọ bụla?
6 Ọ bụrụ na a fụọ opi n’obodo, ọ̀ bụ na ndị mmadụ anaghị ama jijiji?
Ọ bụrụ na e nwee ọdachi n’obodo, ọ́ bụghị Jehova kpatara ya?
7 N’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe ọ bụla
Ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mee ka ndị amụma ya mara ihe ọ na-achọghị ka ndị ọzọ mara.+
8 Ọdụm agbọọla ụja,+ olee onye na-agaghị atụ egwu?
Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ekwuola okwu, olee onye na-agaghị ebu amụma?’+
9 ‘Kwusaanụ ya n’ụlọ elu niile dị n’Ashdọd
Nakwa n’ụlọ elu niile dị n’Ijipt.
Sịnụ: “Zukọtanụ n’elu ugwu niile dị na Sameria.+
Hụnụ ọgba aghara juru na ya,
Hụkwanụ otú e si na-erigbu ndị mmadụ na ya.+
10 N’ihi na ha amaghị otú e si eme ihe ziri ezi.” Ihe a ka Jehova kwuru.
“Ha na-eji ihe ndị mmadụ ha bukọọrọ n’ike akwaju ụlọ elu ha.”’
Ọ ga-emekwa ka ike gwụ gị.
A ga-ebukọrọkwa ihe ndị dị n’ụlọ elu gị niile.’+
12 Jehova kwuru, sị,
‘Otú ahụ onye ọzụzụ atụrụ na-anapụta ụkwụ abụọ ma ọ bụ otu ibe ntị atụrụ ya n’ọnụ ọdụm,
Otú ahụ ka a ga-anapụta ụmụ Izrel,
Ya bụ, ndị nọ ọdụ ugbu a na Sameria n’elu oche mara mma nakwa n’elu àkwà* mara mma.’*+
13 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha, kwuru, sị, ‘Nụrụnụ, dọọkwanụ ụlọ Jekọb aka ná ntị.’*
14 ‘N’ihi na n’ụbọchị m ga-akpọ Izrel ka ha zaa ajụjụ maka isi ha nupụrụ,*+
M ga-ebibikwa ebe ịchụàjà ndị dị na Betel.+
M ga-egbujipụ mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà ahụ, ha adaa n’ala.+
15 M ga-akwatu ụlọ a na-anọ n’oge oyi nakwa ụlọ a na-anọ n’oge okpomọkụ.’
‘Ụlọ ndị e ji ọdụ́ rụọ ga-ala n’iyi.+
A ga-ebibikwa nnukwu ụlọ dị iche iche.’*+ Ihe a ka Jehova kwuru.”