EZRA
1 N’afọ nke mbụ n’ọchịchị Saịrọs+ eze Peshia, ka ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo+ wee mezuo, Jehova mere ka Saịrọs eze Peshia nye iwu* ka a maa ọkwa n’alaeze ya niile, deekwa ya n’akwụkwọ,+ sị:
2 “Ihe a bụ ihe Saịrọs eze Peshia kwuru, ‘Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe enyela m alaeze niile dị n’ụwa.+ Ọ họpụtakwala m ka m rụọrọ ya ụlọ na Jeruselem,+ nke dị na Juda. 3 Onye ọ bụla n’ime unu niile nke so ná ndị ya, ka Chineke ya nọnyere ya. Ya lawa Jeruselem, nke dị na Juda, rụghachi ụlọ Jehova bụ́ Chineke Izrel (ọ bụ ya bụ ezi Chineke), onye ụlọ ya dị na Jeruselem.* 4 Onye ọ bụla bụ́ ọbịa,+ ebe ọ sọkwara ya nọrọ, ka ndị agbata obi ya* nyere ya aka. Ka ha nye ya ọlaọcha na ọlaedo, ngwongwo ndị ọzọ na anụ ụlọ, nakwa onyinye si ha n’obi ha ga-enye maka ụlọ ezi Chineke,+ nke dị na Jeruselem.’”
5 Ndị isi ọnụmara ebo Juda na ebo Benjamin nakwa ndị nchụàjà na ndị Livaị, onye ọ bụla ezi Chineke metụrụ aka n’obi,* wee kwadebe ịla ka ha gaa rụghachi ụlọ Jehova, nke dị na Jeruselem. 6 Ndị agbata obi ha niile wee nyere ha aka.* Ha nyere ha arịa ọlaọcha na arịa ọlaedo, ngwongwo ndị ọzọ, anụ ụlọ, na ihe ndị ọzọ bara ezigbo uru, nakwa onyinye niile si ha n’obi ha nyere maka ụlọ ezi Chineke.
7 Eze Saịrọs bupụtakwara arịa ndị dịbu n’ụlọ Jehova, ndị Nebukadneza bukọọrọ na Jeruselem ma busa n’ụlọ chi ya.+ 8 Eze Saịrọs nke Peshia gwara Mitridat onye na-elekọta akụ̀, ya ebupụta ha, gụọ ha ọnụ ma nyefee ha n’aka Sheshbaza*+ onyeisi Juda.
9 Ọ bụ ihe ndị a ka a gụrụ ọnụ: arịa ọlaedo iri atọ ndị yiri nkata, otu puku (1,000) arịa ọlaọcha ndị yiri nkata, arịa iri abụọ na itoolu ndị yiri ha, 10 obere efere ọlaedo iri atọ, narị obere efere ọlaọcha anọ na iri (410), otu puku (1,000) arịa ndị ọzọ. 11 Arịa ọlaedo na arịa ọlaọcha niile dị puku ise na narị anọ (5,400). Sheshbaza bu ha niile mgbe e si na Babịlọn kpọpụta ndị a dọọrọ n’agha+ kpọlata ha Jeruselem.
2 Ndị a bụ ndị Juu si n’ógbè* ahụ, ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta,+ ya bụ, ndị Eze Nebukadneza nke Babịlọn dọọrọ n’agha laa Babịlọn.+ Ha mechara lọta Jeruselem na Juda, onye nke ọ bụla alaa n’obodo nke ya.+ 2 Ha so Zerubabel,+ Jeshụa,+ Nehemaya, Seraya, Rilaya, Mọdekaị, Bilshan, Mispa, Bigvaị, Rihọm, na Beana lọta.
Ihe a bụ ole ụmụ nwoke Izrel ahụ dị:+ 3 Ụmụ Perọsh dị puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172); 4 ụmụ Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372); 5 ụmụ Era,+ narị asaa na iri asaa na ise (775); 6 ụmụ Pehat-moab,+ ndị bụ́ ụmụ Jeshụa na Joab, puku abụọ, narị asatọ na iri na abụọ (2,812); 7 ụmụ Ịlam,+ otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254); 8 ụmụ Zatu,+ narị itoolu na iri anọ na ise (945); 9 ụmụ Zakaị, narị asaa na iri isii (760); 10 ụmụ Benaị, narị isii na iri anọ na abụọ (642); 11 ụmụ Bibaị, narị isii na iri abụọ na atọ (623); 12 ụmụ Azgad, otu puku, narị abụọ na iri abụọ na abụọ (1,222); 13 ụmụ Adọnaịkam, narị isii na iri isii na isii (666); 14 ụmụ Bigvaị, puku abụọ na iri ise na isii (2,056); 15 ụmụ Edin, narị anọ na iri ise na anọ (454); 16 ụmụ Eta, ndị si n’ezinụlọ Hezekaya, iri itoolu na asatọ; 17 ụmụ Bizaị, narị atọ na iri abụọ na atọ (323); 18 ụmụ Jora, otu narị na iri na abụọ (112); 19 ụmụ Heshọm,+ narị abụọ na iri abụọ na atọ (223); 20 ụmụ Gịba, iri itoolu na ise; 21 ụmụ Betlehem, otu narị na iri abụọ na atọ (123); 22 ndị Netofa, iri ise na isii; 23 ndị Anatọt,+ otu narị na iri abụọ na asatọ (128); 24 ụmụ Azmavet, iri anọ na abụọ; 25 ụmụ Kiriat-jierim, Kefaịra, na Bierọt, narị asaa na iri anọ na atọ (743); 26 ụmụ Rema+ na Giba,+ narị isii na iri abụọ na otu (621); 27 ndị Mikmas, otu narị na iri abụọ na abụọ (122); 28 ndị Betel na E-aị,+ narị abụọ na iri abụọ na atọ (223); 29 ụmụ Nibo,+ iri ise na abụọ; 30 ụmụ Mag-bish, otu narị na iri ise na isii (156); 31 ụmụ Ịlam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254); 32 ụmụ Herim, narị atọ na iri abụọ (320); 33 ụmụ Lọd, Hedid, na Ono, narị asaa na iri abụọ na ise (725); 34 ụmụ Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise (345); 35 ụmụ Senea, puku atọ, narị isii na iri atọ (3,630).
36 Ndị nchụàjà:+ ụmụ Jedeya+ ndị si n’ezinụlọ Jeshụa,+ narị itoolu na iri asaa na atọ (973); 37 ụmụ Ịma,+ otu puku na iri ise na abụọ (1,052); 38 ụmụ Pash-họ,+ otu puku, narị abụọ na iri anọ na asaa (1,247); 39 ụmụ Herim,+ otu puku na iri na asaa (1,017).
40 Ndị Livaị:+ ụmụ Jeshụa na Kadmiel,+ bụ́ ụmụ Họdavaya, iri asaa na anọ. 41 Ndị na-abụ abụ:+ ụmụ Esaf,+ otu narị na iri abụọ na asatọ (128). 42 Ụmụ ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá:+ ụmụ Shalọm, ụmụ Eta, ụmụ Talmọn,+ ụmụ Akọb,+ ụmụ Hataịta, ụmụ Shobaị, ha niile dị otu narị na iri atọ na itoolu (139).
43 Ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ:*+ ụmụ Zaịha, ụmụ Hasufa, ụmụ Tabeọt, 44 ụmụ Kirọs, ụmụ Sayaha, ụmụ Pedọn, 45 ụmụ Lebena, ụmụ Hagaba, ụmụ Akọb, 46 ụmụ Hegab, ụmụ Salmaị, ụmụ Henan, 47 ụmụ Gidel, ụmụ Geha, ụmụ Reeya, 48 ụmụ Rizin, ụmụ Nekoda, ụmụ Gazam, 49 ụmụ Ọza, ụmụ Pasia, ụmụ Bisaị, 50 ụmụ Asna, ụmụ Meyunim, ụmụ Nefusim, 51 ụmụ Bakbọk, ụmụ Hakufa, ụmụ Hahọ, 52 ụmụ Bazlọt, ụmụ Mehaịda, ụmụ Hasha, 53 ụmụ Bakọs, ụmụ Sisera, ụmụ Tima, 54 ụmụ Nezaya, ụmụ Hataịfa.
55 Ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi: ụmụ Sotaị, ụmụ Sofiret, ụmụ Peruda,+ 56 ụmụ Jeala, ụmụ Dakọn, ụmụ Gidel, 57 ụmụ Shefataya, ụmụ Hatil, ụmụ Pokeret-hazebem, ụmụ Emaị.
58 Ndị niile na-eje ozi n’ụlọ nsọ* na ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi dị narị atọ na iri itoolu na abụọ (392).
59 Ndị a bụ ndị si Tel-mila, Tel-hasha, Kirọb, Adọn, na Ịma lọta. Ma ha enweghị ihe ha ga-eji gosi ezinụlọ bụ́ ezinụlọ nna ha nakwa ebe ha si, ka a mata ma hà bụkwa ndị Izrel:+ 60 ụmụ Deleya, ụmụ Tobaya, ụmụ Nekoda, narị isii na iri ise na abụọ (652). 61 Ndị a bụ ụmụ ndị nchụàjà: ụmụ Habaya, ụmụ Hakọz,+ ụmụ Bazilaị, onye lụrụ otu n’ime ụmụ ndị nwaanyị Bazilaị+ onye Gilied ma zawa aha ya.* 62 Ha chọrọ aha ndị ezinụlọ ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ dị iche iche, ma ha ahụghị aha ha. N’ihi ya, e kwuru na ha erughị eru ịbụ ndị nchụàjà.* + 63 Gọvanọ* gwara ha na ha agaghị eso na-eri ihe ndị kacha nsọ+ ruo mgbe a ga-enwe onye nchụàjà nke ga-eji Yurim na Tọmịm*+ jụta Chineke ase.
64 Ọgbakọ ahụ niile dị puku mmadụ iri anọ na abụọ, narị atọ na iri isii (42,360),+ 65 e wepụ ndị ohu ha ndị nwoke na ndị nwaanyị, ndị dị puku asaa, narị atọ na iri atọ na asaa (7,337). Ha nwekwara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-abụ abụ. Ha dị narị abụọ (200). 66 Ịnyịnya ha dị narị asaa na iri atọ na isii (736), nnukwu jakị* ha adịrị narị abụọ na iri anọ na ise (245). 67 Kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise (435), obere jakị ha adịrị puku isii, narị asaa na iri abụọ (6,720).
68 Mgbe ụfọdụ ndị isi ọnụmara ha dị iche iche rutere n’ebe ụlọ Jehova dịbu na Jeruselem, ha nyere onyinye si ha n’obi+ maka ụlọ ezi Chineke, ka e jiri ha rụghachi ụlọ ahụ n’ebe ọ dịbu.+ 69 Onye nke ọ bụla nyere otú aka ruru ya. Ha niile nyere mkpụrụ ego drakma ọlaedo* dị puku iri isii na otu puku (61,000), na mkpụrụ ego maịna* ọlaọcha+ dị puku ise (5,000) a ga-etinye n’ebe a na-edowe akụ̀, nakwa otu narị (100) uwe mwụda maka ndị nchụàjà. 70 Ndị nchụàjà, ndị Livaị, ndị na-abụ abụ, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,* na ndị Izrel ndị ọzọ wee biri n’obodo ha dị iche iche. Izrel niile wee biri n’obodo ha dị iche iche.+
3 N’ọnwa nke asaa,+ mgbe ndị Izrel biirila n’obodo ha dị iche iche, ha ji otu obi zukọta na Jeruselem. 2 Jeshụa+ nwa Jehozadak na ndị nchụàjà ibe ya nakwa Zerubabel+ nwa Shieltiel+ na ụmụnne ya biliri rụọ ebe ịchụàjà nke Chineke Izrel, ka ha nwee ike ịna-achụ àjà a na-esu ọkụ na ya, otú e dere n’Iwu Mosis,+ onye nke ezi Chineke.
3 Ha wee rụọ ebe ịchụàjà ahụ n’ebe ọ dịbu n’agbanyeghị na ha na-atụ ndị bi n’ala ndị gbara ha gburugburu egwu.+ Ha malitere ịchụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ n’elu ya, ya bụ, àjà a na-esu ọkụ n’ụtụtụ na nke a na-esu ọkụ ná mgbede.+ 4 Ha wee mee Ememme Ụlọ Ndò otú e dere ya n’Iwu.*+ Kwa ụbọchị, ha na-achụ àjà a na-esu ọkụ ole e kwesịrị ịchụ n’ụbọchị ọ bụla.+ 5 Mgbe e mechara, ha chụrụ àjà a na-esu ọkụ nke a na-achụ mgbe niile+ na ndị nke a na-achụ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ+ nakwa ndị nke a na-achụ n’oge ememme niile e doro nsọ+ maka Jehova. Ihe ọzọ ha chụrụ n’àjà bụ onyinye ndị mmadụ ji obi ha nye+ Jehova. 6 Malite n’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa,+ ha bidoro ịchụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ, n’agbanyeghị na a tọbeghị ntọala ụlọ nsọ Jehova.
7 Ha nyere ndị na-awa nkume+ na ndị omenkà+ ego, nyekwa ndị Saịdọn na ndị Taya ihe oriri na mmanya na mmanụ maka na ha na-esi na Lebanọn eburu osisi sida, si n’oké osimiri bute ha na Jọpa,+ otú Eze Saịrọs nke Peshia nyere ha ikike ka ha mee.+
8 N’afọ nke abụọ ha rutechara n’ụlọ ezi Chineke dị na Jeruselem, n’ọnwa nke abụọ, Zerubabel nwa Shieltiel, Jeshụa nwa Jehozadak na ụmụnne ha ndị ọzọ, bụ́ ndị nchụàjà na ndị Livaị, na ndị niile si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta Jeruselem+ malitere ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livaị dị afọ iri abụọ gbagowe ka ha lekọtawa ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova. 9 Jeshụa na ụmụ ya na ụmụnne ya nakwa Kadmiel na ụmụ ya, bụ́ ụmụ Juda, gbakọtara aka na-elekọta ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ezi Chineke. Ụmụ Henadad+ na ụmụ ha na ụmụnne ha, bụ́ ndị Livaị, sokwa ha na-elekọta ndị ọrụ ahụ.
10 Mgbe ndị ọrụ ahụ tọrọ ntọala ụlọ nsọ Jehova,+ ndị nchụàjà, bụ́ ndị yi uwe ndị nchụàjà ma jiri opi,+ nakwa ndị Livaị bụ́ ụmụ Esaf, ndị ji ájà, biliri ka ha too Jehova otú Eze Devid nke Izrel kwuru ka a na-eme.+ 11 Ha wee malite ịbụ abụ iji too Jehova ma kelee ya. Otu ìgwè na-abụ abụ, ìgwè nke ọzọ ana-ekwe ekwe,+ sị, “n’ihi na ọ dị mma. Ịhụnanya o nwere n’ebe Izrel nọ na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ Ndị Izrel niile wee jiri oké olu too Jehova maka na a tọọla ntọala ụlọ Jehova. 12 Ọtụtụ n’ime ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ndị isi ọnụmara dị iche iche, ya bụ, ndị agadi hụrụ ụlọ nke mbụ ahụ,+ bere ákwá n’oké olu mgbe ha hụrụ ka a na-atọ ntọala ụlọ a. Ma, ọtụtụ ndị ọzọ ji oké olu na-eti mkpu ọṅụ.+ 13 N’ihi ya, ndị mmadụ amataghịzi nke bụ́ mkpu ọṅụ na nke bụ́ mkpu ákwá maka na ndị mmadụ nọ na-etisi mkpu ike nke na a na-anụ ya n’ebe dị ezigbo anya.
4 Mgbe ndị iro Juda na Benjamin+ nụrụ na ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta+ na-arụrụ Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ nsọ, 2 ha bịakwutere Zerubabel na ndị isi ọnụmara dị iche iche ozugbo ma sị ha: “Ka anyị soro unu rụọ ụlọ a n’ihi na anyị so unu efe* Chineke unu.+ Anyị na-achụkwara ya àjà kemgbe oge Eze Isa-hadọn+ nke Asiria, bụ́ onye kpọtara anyị n’ebe a.”+ 3 Ma, Zerubabel na Jeshụa na ndị ọzọ bụ́ ndị isi ọnụmara n’Izrel sịrị ha: “E nweghị ihe jikọrọ anyị na unu n’ụlọ a anyị na-arụrụ Chineke anyị+ n’ihi na ọ bụ naanị anyị ga-arụrụ ya Jehova bụ́ Chineke Izrel, otú Eze Saịrọs bụ́ eze Peshia nyere anyị n’iwu.”+
4 Ndị ala ahụ wee na-eme ka obi ghara isi ndị Juda ike,* na-emekwa ka ike ịrụ ụlọ ahụ gwụ ha.+ 5 Ha goro ndị ndụmọdụ ka ha ghasaa atụmatụ ha+ n’oge niile Eze Saịrọs nke Peshia na-achị ruo n’oge Eze Darayọs+ chịwara Peshia. 6 Mgbe Ahazuirọs malitere ịchị, ha dere akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ha boro ndị bi na Juda na Jeruselem ebubo. 7 N’oge ọchịchị Eze Atazaksis nke Peshia, Bishlam, Mitridat, Tabiel, na ndị òtù ya ndị ọzọ, degaara Atazaksis bụ́ eze akwụkwọ ozi. Ha sụgharịrị ya n’asụsụ Arameik,+ jiri mkpụrụ akwụkwọ Arameik dee ya.*
8 * Rihọm, onye ọkwá ya gbagotere n’ọchịchị, na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ degaara Eze Atazaksis akwụkwọ ozi ma bo ndị bi na Jeruselem ebubo, sị: 9 (O si n’aka Rihọm, onye ọkwá ya gbagotere n’ọchịchị, na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ọzọ ha na ha na-arụkọ ọrụ, ndị ikpe na ndị osote gọvanọ, ndị odeakwụkwọ, ndị Irek,+ ndị Babịlọn, ndị bi na Susa,+ ya bụ, ndị Ịlam,+ 10 na mba ndị ọzọ Asenapa onye ukwu a na-akwanyere ùgwù dọọrọ n’agha ma kpọta n’obodo ndị dị na Sameria,+ nakwa ndị ọzọ bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis.* Ugbu a, 11 ihe a bụ ihe e dere n’akwụkwọ ozi ha zigaara ya.)
“Eze Atazaksis, ndị na-ejere gị ozi, ndị bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis, na-edetara gị akwụkwọ ozi: Ugbu a, 12 ka eze mara na ndị Juu si n’ebe ị nọ bịakwute anyị erutela Jeruselem. Ha na-arụghachi obodo ọjọọ ahụ na-enupụ isi, ha na-achọkwa ịrụcha mgbidi ya+ na ịrụzi ntọala ya. 13 Ugbu a, ka eze mara na ọ bụrụ na a rụghachi obodo a, rụchaakwa mgbidi ya, ha agaghị atụ ụtụ isi, ụtụ ahịa,+ ma ọ bụ ụtụ ụzọ. Ọ ga-eme ka ndị eze ghara inweta ego ole ha kwesịrị ịna-enweta. 14 Ebe ọ bụ na anyị na-eri nnu si n’obí eze,* ọ dịghị mma ka anyị kwe ka e mebiere eze ihe. Ọ bụ ya mere anyị ji zite akwụkwọ ozi a ka anyị kọọrọ ya eze, 15 ka e wee nyochaa n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge nna nna gị hà.+ Ị ga-ahụ n’akwụkwọ ahụ, matakwa na obodo a bụ obodo na-enupụ isi ma na-akpatara ndị eze na ógbè* dị iche iche nsogbu. Malite n’oge gboo, e nwere ụfọdụ n’ime ha na-emegide ndị ọchịchị. Ọ bụ ya mere e ji bibie obodo a.+ 16 Anyị na-eme ka eze mara na ọ bụrụ na a rụghachi obodo a ma rụchaa mgbidi ya, ị gakwaghị na-achị ógbè* dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis.”+
17 Eze wee zigara Rihọm, onye ọkwá ya gbagotere n’ọchịchị, ozi, ya na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ọzọ ha na ha na-arụkọ ọrụ, bụ́ ndị bi na Sameria na ndị ọzọ bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis. Ọ sịrị ha:
“Ana m ekele unu! Ugbu a, 18 a gụọrọla m* akwụkwọ ozi unu ziteere anyị nke ọma. 19 M nyere iwu, e mee nchọnchọ ma chọpụta na malite n’oge gboo, obodo ahụ na-emegide ndị eze. Ha na-enupụkwa isi ma na-akpata ọgba aghara.+ 20 E nwekwara ndị eze dị ike chịrị Jeruselem, ndị chịkwara ndị niile bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis. A kwụkwara ha ụtụ isi, ụtụ ahịa, na ụtụ ụzọ. 21 Nyenụ iwu ka ụmụ nwoke ndị a kwụsị ọrụ, ka a ghara ịrụghachi obodo ahụ ruo mgbe m nyere iwu. 22 Hụnụ na unu mere ihe a, ka a ghara imebikwuru eze ihe.”+
23 Mgbe a gụchaara Rihọm na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ akwụkwọ ozi Eze Atazaksis, ha gawara Jeruselem ozugbo, gakwuru ndị Juu ma manye ha ka ha kwụsị ọrụ ahụ. 24 Ọ bụ mgbe ahụ ka ọrụ a na-arụ n’ụlọ Chineke dị na Jeruselem kwụsịrị. Ọrụ ahụ kwụsịrị ruo n’afọ nke abụọ n’ọchịchị Eze Darayọs nke Peshia.+
5 Ndị amụma bụ́ Hagaị+ na Zekaraya+ nwa nwa Ido+ wee buoro ndị Juu nọ na Juda na Jeruselem amụma n’aha Chineke Izrel, onye nọnyeere ha. 2 Ọ bụ mgbe ahụ ka Zerubabel+ nwa Shieltiel na Jeshụa+ nwa Jehozadak malitere ịrụghachi ụlọ Chineke+ dị na Jeruselem. Ndị amụma Chineke nọnyeere ha ma na-enyere ha aka.+ 3 N’oge ahụ, Tatenaị bụ́ gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis* na Shita-bọzenaị na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ bịakwutere ha ma jụọ ha, sị: “Ònye nyere unu iwu ka unu rụọ ụlọ a ma gwunyechaa ogidi ndị a?” 4 Ha jụkwara ha, sị: “Gịnị bụ aha ụmụ nwoke na-arụ ụlọ a?” 5 Ma Chineke nọ na-echebe* ndị okenye ndị Juu.+ Ha akwụsịghịkwa ha ịrụ ọrụ ahụ ruo mgbe e zigaara Darayọs ozi, ya ezitekwa akwụkwọ ozi banyere okwu a.
6 Ihe a bụ ihe e dere n’akwụkwọ ozi ahụ Tatenaị bụ́ gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis na Shita-bọzenaị na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ, ndị osote gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis, zigaara Eze Darayọs. 7 Ha zigaara ya ozi. Ihe a ka ha dere:
“Eze Darayọs:
“Udo dịrị gị! 8 Ka eze mara na anyị gara n’ógbè* Juda, n’ụlọ Chineke ukwu. E ji nnukwu nkume na-arụ ahụ́ ụlọ ahụ, a na-adọnyekwa nnukwu osisi na ya. Ndị ahụ ji obi ha niile na-arụ ọrụ ahụ, ọ na-agakwa n’ihu n’ihu n’ihi mbọ ha na-agba. 9 Anyị wee jụọ ndị okenye ha ajụjụ, sị ha: ‘Ònye nyere unu iwu ka unu rụọ ụlọ a ma gwunyechaa ogidi ndị a?’+ 10 Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị nwee ike ide aha ụmụ nwoke bụ́ ndị isi ha, ka anyị wee mee ka ị mara ndị ha bụ.
11 “Ihe a ka ha zara anyị: ‘Anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa. Anyị na-arụghachi ụlọ a rụrụ ọtụtụ afọ gara aga, nke otu eze ukwu Izrel rụrụ ma rụchaa.+ 12 Ma, ebe ọ bụ na ndị nna nna anyị kpasuru Chineke nke eluigwe iwe,+ o nyefere ha n’aka Eze Nebukadneza+ nke Babịlọn onye Kaldia, bụ́ onye kwadara ụlọ a+ ma dọrọ ndị anyị n’agha laa Babịlọn.+ 13 Ma n’afọ nke mbụ n’ọchịchị Eze Saịrọs nke Babịlọn, Eze Saịrọs nyere iwu ka a rụghachi ụlọ Chineke a.+ 14 Eze Saịrọs sikwa n’ụlọ chi ndị Babịlọn bupụta arịa ọlaedo na nke ọlaọcha ndị dịbu n’ụlọ Chineke, bụ́ ndị Nebukadneza bukọọrọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem ma bute ha n’ụlọ chi ndị Babịlọn.+ O bunyere ha otu nwoke aha ya bụ Sheshbaza,*+ onye Saịrọs mere gọvanọ.+ 15 Saịrọs sịrị ya: “Buru arịa ndị a. Gaa busa ha n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ka a rụghachikwa ụlọ Chineke n’ebe ọ dịbu.”+ 16 Sheshbaza wee bịa, tọọ ntọala ụlọ Chineke+ dị na Jeruselem. A na-arụ ya kemgbe ahụ ruo ugbu a, ma a rụchabeghị ya.’+
17 “Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka a chọọ n’akwụkwọ ndị dị n’ebe a na-edowe akụ̀ eze na Babịlọn iji mata ma Eze Saịrọs ò nyere iwu ka a rụghachi ụlọ Chineke dị na Jeruselem.+ Ka eze zitekwara anyị ihe o kpebiri n’okwu a.”
6 Ọ bụ mgbe ahụ ka Eze Darayọs nyere iwu, ha wee gaa chọọ n’ụlọ ebe a na-edowe akwụkwọ dị iche iche, bụ́ ebe ndị a na-edowe akụ̀ na Babịlọn. 2 E wee hụ otu akwụkwọ mpịakọta n’ụlọ a rụsiri ike dị n’obodo Ekbatana, nke dị n’ógbè* Midia. Ihe e dere na ya bụ:
3 “N’afọ nke mbụ n’ọchịchị Eze Saịrọs, Eze Saịrọs nyere iwu banyere ụlọ Chineke dị na Jeruselem, sị:+ ‘Ka a rụghachi ụlọ ahụ ka ọ bụrụ ebe ha ga na-achụ àjà. A ga-atọkwa ntọala ya. Ọ ga-adị kubit iri isii* n’ịdị elu, dịrịkwa kubit iri isii n’obosara.+ 4 Ọ ga-enwe ahịrị nnukwu nkume atọ na otu ahịrị osisi.+ Ka e sikwa n’akụ̀ eze kwụọ ụgwọ ihe niile a ga-emefu.+ 5 Ka e bughachikwa arịa ọlaedo na arịa ọlaọcha ndị dịbu n’ụlọ Chineke, bụ́ ndị Nebukadneza bupụtara n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem ma bute ha na Babịlọn,+ ka e wee doghachi ha n’ebe ha na-adị n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, ka e dosakwa ha n’ụlọ Chineke.’+
6 “Ugbu a, Tatenaị bụ́ gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis,* Shita-bọzenaị, na ndị unu na ha na-arụkọ ọrụ, ndị osote gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis,+ unu agakwala ebe ahụ. 7 Unu akwụsịla ọrụ ahụ a na-arụ n’ụlọ Chineke. Gọvanọ ndị Juu na ndị okenye ndị Juu ga-arụghachi ụlọ Chineke n’ebe ọ dịbu. 8 Ana m enyekwa unu iwu banyere ihe unu ga-emere ndị okenye ndị Juu a maka ụlọ Chineke ha na-arụghachi: Sinụ n’akụ̀ eze,+ n’ụtụ a na-anakọta n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis, na-akwụ ụmụ nwoke ndị a ụgwọ ihe ọ bụla ha mefuru n’egbughị oge, ka ọrụ ha ghara ịkwụsị.+ 9 Ka a na-enyekwa ha ihe ọ bụla dị ha mkpa kwa ụbọchị n’akwụsịghị akwụsị, ya bụ, oké ehi,+ ebule,+ na ụmụ atụrụ+ maka àjà a na-esu ọkụ a ga-achụrụ Chineke nke eluigwe, ọka wit,+ nnu,+ mmanya,+ na mmanụ,+ otú ndị nchụàjà nọ na Jeruselem kwuru, 10 ka ha wee na-achụ àjà dị Chineke nke eluigwe mma ma na-ekpe ekpere ka ihe gaziere* eze na ụmụ ya.+ 11 M nyekwala iwu na onye ọ bụla dara iwu a, a ga-efopụta otu nnukwu osisi n’ụlọ ya, bulie onye ahụ elu ma kwụwa ya n’elu osisi ahụ. A ga-ejikwa ụlọ ya mere ebe ọhaneze ga na-aga mposi* maka na ọ dara iwu a. 12 Ka Chineke, onye họọrọ ka a nọrọ ebe ahụ na-eto aha ya,+ kwatuo eze ọ bụla na ndị ọ bụla nwara ịda iwu a na ibibi ụlọ Chineke ahụ dị na Jeruselem. Ọ bụ m, Darayọs, na-enye iwu a. Ka e mee ya ozugbo.”
13 Tatenaị bụ́ gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis, Shita-bọzenaị,+ na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ wee mee ihe niile Eze Darayọs nyere ha n’iwu. 14 Ndị okenye ndị Juu wee na-arụ ụlọ ahụ. Ọrụ ahụ nọkwa na-aga nke ọma+ n’ihi na amụma Hagaị+ onye amụma na Zekaraya+ nwa nwa Ido nọ na-ebu gbara ha ume. Ha rụchara ya n’ihi iwu Chineke Izrel nyere ha+ nakwa nke Saịrọs+ na Darayọs+ na Eze Atazaksis+ nke Peshia nyere ha. 15 Ha rụchara ụlọ a n’abalị atọ n’ọnwa Eda,* n’afọ nke isii n’ọchịchị Eze Darayọs.
16 Ndị Izrel, ma ndị nchụàjà ma ndị Livaị+ ma ndị ọzọ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, wee jiri ọṅụ nyefee Chineke ụlọ a. 17 Ha chụrụ otu narị ehi (100), narị ebule abụọ (200), narị ụmụ atụrụ anọ (400) n’àjà maka inyefe Chineke ụlọ a. Ha chụkwara mkpi iri na abụọ n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie maka Izrel niile, bụ́ ole ebo Izrel dị.+ 18 Ha họpụtara ndị nchụàjà n’ìgwè n’ìgwè, họpụtakwa ndị Livaị n’ìgwè n’ìgwè maka ozi ha ga na-ejere Chineke na Jeruselem,+ otú e dere ya n’akwụkwọ Mosis.+
19 Ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta mere Ememme Ngabiga n’abalị iri na anọ n’ọnwa mbụ.+ 20 Ndị nchụàjà na ndị Livaị niile mere onwe ha ka ha dị ọcha, ha niile wee dị ọcha.+ Ha gburu anụ e ji eme Ememme Ngabiga maka ndị niile si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, maka ndị nchụàjà ibe ha, nakwa maka onwe ha. 21 Ndị Izrel ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta wee rie ya, ha na ndị niile sonyeere ha, bụ́ ndị sepụrụla aka n’ihe rụrụ arụ mba ndị dị n’ala ahụ na-eme, ka ha fewe* Jehova bụ́ Chineke Izrel.+ 22 Ha jikwa ọṅụ mee Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko ụbọchị+ asaa n’ihi na Jehova mere ka ha ṅụrịa ọṅụ. O mekwara ka eze Asiria* nwee mmasị n’ebe ha nọ,+ nke mere na o nyeere ha aka* n’ọrụ ha na-arụ n’ụlọ ezi Chineke, bụ́ Chineke Izrel.
7 Mgbe ihe ndị a gachara, n’oge Eze Atazaksis+ nke Peshia na-achị, Ezra*+ lọtara. Ọ bụ nwa Seraya,+ nwa Azaraya, nwa Hilkaya,+ 2 nwa Shalọm, nwa Zedọk, nwa Ahaịtọb, 3 nwa Amaraya, nwa Azaraya,+ nwa Mereyọt, 4 nwa Zerahaya, nwa Ọzaị, nwa Bọkaị, 5 nwa Abishua, nwa Finihas,+ nwa Elieza,+ nwa Erọn+ onyeisi nchụàjà. 6 Ezra a hapụrụ Babịlọn. Ọ bụ odeakwụkwọ.* Ọ makwa Iwu Mosis nke ọma,*+ nke Jehova bụ́ Chineke Izrel nyere. Eze nyere Ezra ihe niile ọ rịọrọ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke ya nọnyeere ya.
7 Ụfọdụ n’ime ndị Izrel, ndị nchụàjà, ndị Livaị,+ ndị na-abụ abụ,+ ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá,+ na ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ*+ lawara Jeruselem n’afọ nke asaa n’ọchịchị Eze Atazaksis. 8 Ezra rutere Jeruselem n’ọnwa nke ise, n’afọ nke asaa n’ọchịchị eze. 9 N’abalị mbụ n’ọnwa mbụ, ọ hapụrụ Babịlọn. O rutekwara Jeruselem n’abalị mbụ n’ọnwa nke ise n’ihi na Chineke ya nọnyeere ya.+ 10 Ezra kwadebere obi ya* ịmụ Iwu Jehova na ime ihe dị na ya,+ nakwa ịkụzi ntụziaka ndị dị na ya na ịkụzi ikpe ziri ezi n’Izrel.+
11 Ihe a bụ ihe e dere n’akwụkwọ ozi Eze Atazaksis nyere Ezra, bụ́ onye nchụàjà na odeakwụkwọ,* onye bụ́kwa ọkà n’ịmụ iwu* Jehova na ntụziaka ndị o nyere Izrel:
12 * “Atazaksis,+ bụ́ eze ndị eze, na-asị gị, Ezra onye nchụàjà, onye na-edepụta ihe dị n’Iwu Chineke nke eluigwe: Udo dịrị gị. Ugbu a, 13 enyela m iwu ka onye ọ bụla nọ n’alaeze m bụ́ onye Izrel nke chọrọ iso gị laa Jeruselem lawa,+ ma ndị nchụàjà ha ma ndị Livaị. 14 N’ihi na eze na ndị ndụmọdụ asaa ya na-edunye gị ka ị gaa chọpụta ma ndị bi na Juda nakwa na Jeruselem hà na-eme ihe e dere n’Iwu Chineke gị nke i ji,* 15 nakwa ka i buru ọlaọcha na ọlaedo eze na ndị ndụmọdụ ya ji obi ha nye Chineke Izrel, onye bi na Jeruselem, 16 na ọlaọcha na ọlaedo niile ị na-enweta* n’ógbè niile dị na Babịlọn, na onyinye ndị gị na ndị nchụàjà ji obi ha nye maka ụlọ Chineke ha dị na Jeruselem.+ 17 Ị ga-eji ego a zụọ oké ehi,+ ebule,+ na ụmụ atụrụ+ ozugbo, zụọkwa ihe ndị ị ga-eji chụọ àjà ọka+ na àjà mmanya+ ha na ha na-agakọ. Ị ga-achụkwa ha n’àjà n’elu ebe ịchụàjà dị n’ụlọ Chineke unu na Jeruselem.
18 “Ihe ọ bụla dị gị na ụmụnne gị mma iji ọlaọcha na ọlaedo ndị fọrọ mee otú Chineke unu chọrọ, meenụ ya. 19 Arịa niile e bunyere gị maka ije ozi n’ụlọ Chineke gị, buga ha niile na Jeruselem n’ihu Chineke.+ 20 Ihe ndị ọzọ dị mkpa maka ụlọ Chineke gị, bụ́ ndị i kwesịrị inye, ị ga-esikwa n’akụ̀ eze were ha.+
21 “Mụnwa bụ́ Eze Atazaksis enyela ndị niile na-echekwa akụ̀ eze n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis* iwu na ihe niile Ezra+ onye nchụàjà, onye na-edepụta Iwu Chineke nke eluigwe, rịọrọ unu, meenụ ya n’egbughị oge, 22 ọ bụrụgodị na o ruru otu narị (100) talent* ọlaọcha, otu narị (100) kọọ* ọka wit, otu narị (100) bat* mmanya,+ otu narị (100) bat mmanụ,+ na nnu+ hiri ezigbo nne. 23 Ka e jiri ịnụ ọkụ n’obi mee ihe ọ bụla Chineke nke eluigwe nyere n’iwu maka ụlọ ya,+ ka Chineke nke eluigwe ghara iwesa alaeze eze na ụmụ ya iwe.+ 24 Ana m agwakwa unu na a gaghị ana ndị nchụàjà na ndị Livaị, ndị na-abụ abụ na ndị na-akụ egwú,+ ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ, ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,*+ na ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ụlọ Chineke a, ụtụ isi, ụtụ ahịa,+ ma ọ bụ ụtụ ụzọ.
25 “Ma gịnwa, Ezra, jiri amamihe Chineke gị nyere gị họpụta ndị na-enyere ndị ikpe aka na ndị ikpe ka ha na-ekpe ndị niile nọ n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis ikpe, bụ́ ndị niile ma iwu Chineke gị. Kụziekwara ya onye ọ bụla na-amaghị ya.+ 26 Onye ọ bụla na-anaghị edebe Iwu Chineke gị na iwu eze, ka e mee ya ihe iwu kwuru n’egbughị oge, ma ọ̀ bụ igbu ya egbu, ma ọ̀ bụ ịchụpụ ya n’obodo, ma ọ̀ bụ iri ya iwu, ma ọ̀ bụ ịtụ ya mkpọrọ.”
27 Ka otuto dịrị Jehova bụ́ Chineke nna nna anyị hà, onye mere ka eze nwee mmasị ịchọ ụlọ Jehova dị na Jeruselem mma.+ 28 O gosiri m na ọ hụrụ m n’anya* ma mee ka eze na ndị ndụmọdụ ya+ na ndị dike niile eze mere ndị isi meere m amara.+ Obi wee sie m ike n’ihi na Jehova bụ́ Chineke m nọnyeere m. M wee si ná ndị Izrel kpọkọta ndị isi ka ha soro m lawa Jeruselem.
8 Ndị a bụ ndị isi ọnụmara dị iche iche na ndị e debara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ dị iche iche, bụ́ ndị so m hapụ Babịlọn lawa n’oge Eze Atazaksis na-achị:+ 2 n’ime ụmụ Finihas,+ Geshọm; n’ime ụmụ Ịtama,+ Daniel; n’ime ụmụ Devid, Hatọsh; 3 n’ime ụmụ Shekanaya, bụ́ ụmụ Perọsh, Zekaraya, ya na otu narị ụmụ nwoke na iri ise (150) e debara aha ha n’akwụkwọ; 4 n’ime ụmụ Pehat-moab,+ Elaịho-inaị nwa Zerahaya, ya na narị ụmụ nwoke abụọ (200); 5 n’ime ụmụ Zatu,+ Shekanaya nwa Jahazayel, ya na narị ụmụ nwoke atọ (300); 6 n’ime ụmụ Edin,+ Ibed nwa Jonatan, ya na ụmụ nwoke iri ise; 7 n’ime ụmụ Ịlam,+ Jesheya nwa Atalaya, ya na ụmụ nwoke iri asaa; 8 n’ime ụmụ Shefataya,+ Zebadaya nwa Maịkel, ya na ụmụ nwoke iri asatọ; 9 n’ime ụmụ Joab, Obadaya nwa Jehayel, ya na narị ụmụ nwoke abụọ na iri na asatọ (218); 10 n’ime ụmụ Benaị, Shelomit nwa Josifaya, ya na otu narị ụmụ nwoke na iri isii (160); 11 n’ime ụmụ Bibaị,+ Zekaraya nwa Bibaị, ya na ụmụ nwoke iri abụọ na asatọ; 12 n’ime ụmụ Azgad,+ Johenan nwa Hakatan, ya na otu narị ụmụ nwoke na iri (110); 13 n’ime ụmụ Adọnaịkam,+ ndị bụ́ ndị ikpeazụ, aha ha bụ: Elifelet, Jeayel, na Shemaya, ha na ụmụ nwoke iri isii; 14 n’ime ụmụ Bigvaị,+ Yutaị na Zabọd, ha na ụmụ nwoke iri asaa.
15 M kpọkọtara ha n’akụkụ osimiri nke na-asọba n’Aheva.+ Anyị wee maa ụlọikwuu ma nọrọ n’ebe ahụ ruo ụbọchị atọ. Ma mgbe m leruru ìgwè mmadụ ahụ na ndị nchụàjà anya, e nweghị onye Livaị m hụrụ. 16 N’ihi ya, m ziri ozi ka a kpọọ Eliiza, Ariel, Shemaya, Elnetan, Jerib, Elnetan, Netan, Zekaraya, na Meshọlam, bụ́ ndị isi, nakwa Joyarib na Elnetan, ndị na-ezi ihe. 17 M wee nye ha iwu ka ha gakwuru Ido bụ́ onyeisi n’ebe a na-akpọ Kasifaya. M gwara ha ka ha gwa Ido na ụmụnne ya nọ na Kasifaya, bụ́ ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,* ka ha kpọtara anyị ndị ga na-eje ozi n’ụlọ Chineke anyị. 18 Ebe ọ bụ na Chineke anyị nọnyeere anyị, ha kpọtaara anyị otu nwoke nwere ezi uche, onye bụ́ otu n’ime ụmụ Malaị,+ nwa nwa Livaị nwa Izrel, ya bụ, Sherebaya+ na ụmụ ya na ụmụnne ya, ụmụ nwoke iri na asatọ; 19 nakwa Hashabaya, ya na Jesheya bụ́ ụmụ Meraraị,+ ụmụnne ya na ụmụ ha, ụmụ nwoke iri abụọ. 20 E nwere narị ụmụ nwoke abụọ na iri abụọ (220) na-eje ozi n’ụlọ nsọ,* bụ́ ndị Devid na ndị isi nyere ka ha na-ejere ndị Livaị ozi. E debara aha ha niile n’akwụkwọ n’otu n’otu.
21 M wee kwuo ka onye ọ bụla buo ọnụ n’ebe ahụ n’osimiri Aheva, ka anyị wee wetuo onwe anyị ala n’ihu Chineke anyị, iji rịọ ya ka o duo anyị na njem anyị ma chebe anyị na ụmụaka anyị na ngwongwo anyị niile. 22 Ihere mere m ịrịọ eze ka o nye anyị ndị agha na ndị na-agba ịnyịnya ndị ga-echebe anyị n’ụzọ ka ndị iro ghara inweta anyị n’ihi na anyị gwara eze, sị: “Chineke anyị na-anọnyere ndị niile na-achọ ya.+ Ma ọ na-eji ike ya na iwe ya emegide ndị niile na-ahapụ ya.”+ 23 Anyị wee buo ọnụ, rịọkwa Chineke anyị arịrịọ ka o duo anyị. Ọ nụrụ arịrịọ anyị.+
24 M kpọpụtaziri mmadụ iri na abụọ iche n’ime ndị isi ndị nchụàjà, ya bụ, Sherebaya, Hashabaya,+ na mmadụ iri n’ime ụmụnne ha. 25 M wee jiri ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ọlaọcha na ọlaedo na arịa dị iche iche ma bunye ha, ya bụ, onyinye eze na ndị ndụmọdụ ya na ndị o mere ndị isi na ndị Izrel niile nọ n’ebe ahụ nyere maka ụlọ Chineke anyị.+ 26 M bunyere ha ọlaọcha dị narị talent* isii na iri ise (650), otu narị (100) arịa ọlaọcha dị talent abụọ, ọlaedo dị otu narị (100) talent, 27 obere efere ọlaedo iri abụọ ndị ọnụ ahịa ha bụ otu puku (1,000) mkpụrụ ego darik,* na arịa abụọ e ji ezigbo ọla kọpa mee. Arịa abụọ a na-acha ọbara ọbara. Ha bara ezigbo uru ka ọlaedo.
28 M wee sị ha: “Unu bụ ndị Jehova doro nsọ,+ arịa ndị a dịkwa nsọ. Ọlaọcha na ọlaedo ndị a bụ onyinye si ndị mmadụ n’obi ha nyere Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà. 29 Chekwaanụ ha nke ọma ruo mgbe unu ji ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ha ma bunye ha ndị isi ndị nchụàjà na ndị Livaị na ndị isi ọnụmara dị iche iche nke Izrel, na Jeruselem,+ n’ọnụ ụlọ ndị dị* n’ụlọ Jehova.” 30 Ndị nchụàjà na ndị Livaị ahụ wee buru ọlaọcha na ọlaedo na arịa ndị ahụ e ji ihe e ji atụ̀ ihe tụọ, ka ha wee buga ha na Jeruselem n’ụlọ Chineke anyị.
31 N’ikpeazụ, anyị hapụrụ osimiri Aheva+ n’abalị iri na abụọ n’ọnwa mbụ+ ma lawa Jeruselem. Chineke anyị nọnyeere anyị, ọ napụtakwara anyị n’aka ndị iro na ndị chechiri anyị n’ụzọ. 32 Anyị wee rute Jeruselem+ ma nọọ ụbọchị atọ. 33 N’ụbọchị nke anọ, anyị ji ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ọlaọcha na ọlaedo na arịa ndị ahụ n’ụlọ Chineke anyị+ ma bunye ha Meremọt+ nwa Yuraịja onye nchụàjà na Elieza nwa Finihas, ha na ndị Livaị aha ha bụ Jozabad+ nwa Jeshụa na Noadaya nwa Binuaị.+ 34 A gụrụ ihe niile ọnụ, jirikwa ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ha ma dee otú ha niile dịruru n’arọ n’akwụkwọ. 35 Ndị ahụ si mba ọzọ lọta, ya bụ, ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, chụụrụ Chineke Izrel àjà a na-esu ọkụ. Ha chụrụ oké ehi+ iri na abụọ n’àjà maka Izrel niile, ebule+ iri itoolu na isii, ụmụ ebule iri asaa na asaa, nakwa mkpi+ iri na abụọ ka ha bụrụ àjà mmehie. Ha niile bụ àjà a na-esu ọkụ a chụụrụ Jehova.+
36 Anyị nyeziri ndị setrap* eze na ndị gọvanọ nọ n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis*+ iwu eze nyere.+ Ha wee kwado ndị anyị na ụlọ ezi Chineke.+
9 Ozugbo e mechara ihe ndị a, ndị isi bịakwutere m, sị: “Ndị Izrel na ndị nchụàjà na ndị Livaị ka so ndị bi n’ala ndị a na-emekọ ihe, sorokwa ha na-eme omume rụrụ arụ ndị ha na-eme,+ ya bụ, ndị Kenan, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Jebus, ndị Amọn, ndị Moab, ndị Ijipt,+ na ndị Amọraịt.+ 2 Ha alụrụla ụfọdụ n’ime ụmụ nwaanyị ha, lụtakwara ụmụ ha ndị nwoke.+ Hanwa, bụ́ ụmụ* dị nsọ,+ na ndị ala a agwakọtala onwe ha.+ Ndị bu omume ọjọọ a n’isi bụ ndị isi na ndị osote onye na-achị achị.”
3 Ozugbo m nụrụ ihe a, m dọwara uwe m na uwe elu m na-enweghị aka, fopụkwa ụfọdụ ntutu isi m na afụ ọnụ m. M wee nọrọ ọdụ n’ihi na ihe a riri m ọnụ. 4 Ndị niile ji okwu Chineke Izrel kpọrọ ihe* zukọtara n’ebe m nọ n’ihi ihe ọjọọ ahụ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta nọ na-eme. M nọ ọdụ ebe ahụ ruo oge e ji achụ àjà ọka ná mgbede+ n’ihi na ihe a riri m ọnụ.
5 N’oge ahụ e ji achụ àjà ọka ná mgbede,+ eyi m uwe m na uwe elu m na-enweghị aka m dọwara adọwa ma si n’ebe ahụ m nọ na-eru uju bilie. M gburu ikpere n’ala ma gbasaara Jehova bụ́ Chineke m aka m. 6 M wee sị: “Chineke m, ihere na-eme m, enweghịkwa m ike iwelite ihu m, Chineke m, n’ihi na mmehie anyị adịla ọtụtụ,* omume ọjọọ anyị eruokwala n’eluigwe.+ 7 Malite n’oge nna nna anyị hà ruo taa, mmehie anyị dị nnọọ ọtụtụ.+ Ọ bụkwa mmehie anyị mere e ji nyefee anyị, ndị eze anyị, na ndị nchụàjà anyị n’aka ndị eze na-achị ala ndị a. E jikwa mma agha gbuo anyị,+ dọrọ anyị n’agha,+ bukọrọ ihe anyị,+ menyekwa anyị ihere, otú ọ dị taa.+ 8 Ma Jehova bụ́ Chineke anyị, i metụụrụ anyị amara kwe ka e nwee ndị fọrọ ndụ n’ime anyị ma mee ka anyị nọrọ n’ebe obi ruru anyị ala* n’ụlọ nsọ gị,+ ka anyị wee na-enwe ezigbo obi ụtọ* ma nweretụ onwe anyị n’ohu anyị na-agba, Chineke anyị. 9 N’ihi na n’agbanyeghị na anyị bụ ndị ohu,+ ị hapụghị anyị, Chineke anyị, ka anyị nọrọ na-agba ohu. Kama, i gosiri anyị na ị hụrụ anyị n’anya* wee mee ka ndị eze Peshia meere anyị amara,+ ka anyị wee nweta ume ma rụghachiri gị, Chineke anyị, ụlọ gị+ n’ebe ọ dịbu, ka anyị wee nwee mgbidi e ji nkume rụọ* na Juda nakwa na Jeruselem.
10 “Ma ugbu a, Chineke anyị, gịnị ka anyị ga-ekwu n’ihe a merenụ? N’ihi na anyị ahapụla iwu gị, 11 nke i si n’ọnụ ndị amụma gị na-ejere gị ozi nye anyị, sị: ‘Ala unu na-aga iweghara bụ ala rụrụ arụ n’ihi na ndị bi na ya adịghị ọcha. Ha emeela ka omume rụrụ arụ ndị ha na-eme jupụta ebe niile n’ala ahụ.+ 12 N’ihi ya, ya enwela mgbe unu ga-akpọrọ ụmụ unu ndị nwaanyị kpọnye ụmụ ha ndị nwoke. Unu alụtakwarala ụmụ unu ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị.+ Unu emekwala ihe ga-eme ka udo dịrị ha ma ọ bụ ihe ga-eme ka ihe gaziere ha,+ ka unu wee dị ike ma rie ihe ọma dị n’ala ahụ ma hapụkwara ya ụmụ unu ka ọ bụrụ ihe ha ga-eketa ruo mgbe ebighị ebi.’ 13 Mgbe ihe a niile mecharala anyị n’ihi omume ọjọọ anyị na ọtụtụ mmehie anyị, (n’ihi na gị bụ́ Chineke anyị emesoghị anyị otú mmehie anyị hà,+ i kwekwara ka anyị ndị nọ n’ebe a fọ ndụ)+ 14 ànyị ga-emebi iwu gị ọzọ, anyị na ndị a na-eme omume rụrụ arụ ana-agọ ọgọ?+ Ọ̀ bụ na ị gaghị ewesa anyị oké iwe nke na ị ga-ebibi anyị kpamkpam, a ghara inwe onye ga-afọ ma ọ bụ onye ga-alanahụ? 15 Jehova bụ́ Chineke Izrel, ị bụ onye ezi omume+ ebe ọ bụ na anyị fọrọ ndụ ruo taa. Lee, anyị bu mmehie anyị nọrọ n’ihu gị, ọ bụ eziokwu na anyị ekwesịghị iguzo n’ihu gị n’ihi ihe a anyị mere.”+
10 Ka Ezra nọ na-ekpe ekpere+ ma na-ekwupụta mmehie ndị ya, na-ebe ákwá ma gbatịa onwe ya n’ala n’ihu ụlọ ezi Chineke, ọtụtụ ụmụ nwoke Izrel, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka zukọtara n’ìgwè n’ebe ọ nọ n’ihi na ha nọ na-ebesi ákwá ike. 2 Shekanaya nwa Jehayel,+ bụ́ otu n’ime ụmụ Ịlam,+ wee sị Ezra: “Anyị mehiere Chineke anyị mgbe anyị gara lụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ ndị bi n’ala a.*+ N’agbanyeghị ya, olileanya ka dịịrị Izrel. 3 Ugbu a, ka anyị na Chineke anyị gbaa ndụ+ na anyị ga-achụla ụmụ nwaanyị niile ahụ na ụmụ ha mụtara, otú Jehova gwara anyị nakwa otú ndị ji iwu Chineke anyị kpọrọ ihe*+ gwara anyị. Ka anyị mee ihe Iwu* kwuru. 4 Bilie, n’ihi na ọ bụ gị ga-ahụ na e doziri okwu a, anyị kwụkwa gị n’azụ. Dị ike, meekwa ihe.”
5 Ezra wee bilie mee ka ndị isi ndị nchụàjà, ndị Livaị, na Izrel niile ṅụọ iyi na ha ga-eme ihe e kwuru.+ Ha wee ṅụọ iyi. 6 Ezra si n’ihu ụlọ ezi Chineke bilie ma gaa n’ọnụ ụlọ* Jehohenan nwa Elayashib, nke dị n’ụlọ nsọ ahụ. N’agbanyeghị na ọ gara n’ebe ahụ, o righị ihe ọ bụla, ọ ṅụghịkwa mmiri ọ bụla, n’ihi na ọ na-eru uju maka ihe ọjọọ ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta mere.+
7 Ha wee zisaa ozi na Juda niile nakwa na Jeruselem niile ka ndị niile si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta zukọta na Jeruselem, 8 nakwa na ndị isi na ndị okenye ekpebiela na onye ọ bụla na-abịaghị n’ime ụbọchị atọ, a ga-akwakọrọ* ngwongwo ya niile. A ga-achụpụkwa ya n’ọgbakọ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta.+ 9 Ụmụ nwoke niile bụ́ ndị Juda na ndị Benjamin wee zukọta na Jeruselem n’ime ụbọchị atọ, ya bụ, n’ọnwa nke itoolu, n’abalị iri abụọ n’ọnwa ahụ. Ha niile nọ ọdụ na mbara èzí ụlọ ezi Chineke, na-ama jijiji n’ihi okwu ahụ a kpụ n’ọnụ nakwa n’ihi nnukwu mmiri na-ezonụ.
10 Ezra onye nchụàjà wee bilie sị ha: “Unu mere ihe ọjọọ mgbe unu gara lụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ.+ Unu emeela ka mmehie ụmụ Izrel bukwuo ibu. 11 Ugbu a, kwupụtaranụ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà mmehie unu, meekwanụ uche ya. Unu na ndị ala a na ụmụ nwaanyị mba ọzọ emekọzila ihe.”+ 12 Ọgbakọ ahụ niile wee jiri oké olu kwuo, sị: “Anyị ga-eme ihe i kwuru. 13 Ma, ndị mehierenụ n’ime anyị dị ọtụtụ, ihe a bụkwa oge udu mmiri. Anyị agaghị eguzoli n’èzí. Okwu a agaghịkwa ebi n’otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ n’ihi na anyị emeela nnukwu mmehie. 14 N’ihi ya, biko, ka ndị isi anyị nọchite anya ọgbakọ a niile.+ Ka ndị niile nọ n’obodo anyị dị iche iche, bụ́ ndị lụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ, bịa n’oge a kara aka, onye nke ọ bụla na ndị okenye na ndị ikpe obodo ya, ruo mgbe anyị mere ka iwe dị ọkụ Chineke anyị na-ewesa anyị n’ihi ihe a dajụọ.”
15 Ma, Jonatan nwa Asahel na Jazaya nwa Tikva ekwetaghị ka e mee ya otú ahụ. Ndị Livaị aha ha bụ Meshọlam na Shabetaị+ kwadokwara ha. 16 Ma ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta mere ihe ahụ e kpebiri. Ezra onye nchụàjà na ndị isi ọnụmara ha dị iche iche, bụ́ ndị niile aha ha dị n’akwụkwọ, zukọtara naanị ha n’abalị mbụ n’ọnwa nke iri ka ha leba anya n’okwu ahụ. 17 Mgbe ọ na-erula n’abalị mbụ n’ọnwa mbụ, ha elebachaala anya n’okwu ụmụ nwoke niile ahụ lụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ. 18 A chọpụtara na ụfọdụ ụmụ ndị nchụàjà lụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ:+ n’ime ụmụ Jeshụa+ nwa Jehozadak na ụmụnne ya, Measaya, Eliiza, Jerib, na Gedalaya. 19 Ma ha kwere nkwa na ha ga-achụla ndị nwunye ha. Ebe ọ bụ na ikpe mara ha, onye nke ọ bụla n’ime ha ga-eweta ebule maka mmehie ya.+
20 Ndị a bụ ndị ọzọ mere mmehie n’ime ndị nchụàjà: n’ime ụmụ Ịma,+ Hanenaị na Zebadaya; 21 n’ime ụmụ Herim,+ Measaya, Ịlaịja, Shemaya, Jehayel, na Ọzaya; 22 n’ime ụmụ Pash-họ,+ Elio-inaị, Measaya, Ishmel, Netanel, Jozabad na Eliesa. 23 N’ime ndị Livaị, Jozabad, Shimiaị, Kelaya (ya bụ, Kelaịta), Petahaya, Juda, na Eliiza; 24 n’ime ndị na-abụ abụ, Elayashib; n’ime ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, Shalọm, Tilem, na Yuraị.
25 Ndị a bụ ndị mere mmehie n’ime ndị Izrel: n’ime ụmụ Perọsh,+ Ramaya, Izaya, Malkaịja, Mijamin, Elieza, Malkaịja, na Benaya; 26 n’ime ụmụ Ịlam,+ Matanaya, Zekaraya, Jehayel,+ Abdaị, Jeremọt, na Ịlaịja; 27 n’ime ụmụ Zatu,+ Elio-inaị, Elayashib, Matanaya, Jeremọt, Zebad, na Azaịza; 28 n’ime ụmụ Bibaị,+ Jehohenan, Hananaya, Zabaị, na Atlaị; 29 n’ime ụmụ Benaị, Meshọlam, Malọk, Adaya, Jeshọb, Shiel, na Jeremọt; 30 n’ime ụmụ Pehat-moab,+ Adna, Kilal, Benaya, Measaya, Matanaya, Bezalel, Binuaị, na Manase; 31 n’ime ụmụ Herim,+ Eliiza, Ishaịja, Malkaịja,+ Shemaya, Shimiọn, 32 Benjamin, Malọk, na Shemaraya; 33 n’ime ụmụ Heshọm,+ Matinaị, Matata, Zebad, Elifelet, Jeremaị, Manase, na Shimiaị; 34 n’ime ụmụ Benaị, Meadaị, Amram, Yuel, 35 Benaya, Bedaya, Keluhaị, 36 Vanaya, Meremọt, Elayashib, 37 Matanaya, Matinaị, na Jeasu; 38 n’ime ụmụ Binuaị, Shimiaị, 39 Shelemaya, Netan, Adaya, 40 Maknadebaị, Sheshaị, Sheraị, 41 Azarel, Shelemaya, Shemaraya, 42 Shalọm, Amaraya, na Josef; 43 n’ime ụmụ Nibo, Jeayel, Matitaya, Zebad, Zebaịna, Jadaị, Joel, na Benaya. 44 Ndị a niile lụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ.+ Ha chụlara ndị nwunye ha ahụ na ụmụ ha mụtaara ha.+
Na Hibru, “kpaliri mmụọ Saịrọs eze Peshia.”
O nwere ike ịbụ, “onye nọ na Jeruselem.”
Na Hibru, “ndị obodo ya.”
Na Hibru, “kpaliri mmụọ ya.”
Na Hibru, “mee ka aka ha sie ike.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.” O nwere ike ịbụ mpaghara Babịlọn ma ọ bụkwanụ mpaghara Juda ka a na-ekwu.
Ma ọ bụ “Ndị Netinim.” Na Hibru, “Ndị e nyere n’onyinye.”
Ma ọ bụ “Ndị Netinim.” Na Hibru, “Ndị e nyere n’onyinye.”
Ya bụ, aha ọgọ ya nwoke.
Ma ọ bụ “e wepụrụ aha ha ná ndị nchụàjà n’ihi na e weere ha ka ndị na-adịghị ọcha.”
Ma ọ bụ “Tesheta.” Ọ bụ aha ndị Peshia na-akpọ gọvanọ na-achị ógbè.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Okwu Hibru a sụgharịrị nnukwu jakị n’ebe a pụtara jakị nke nne ịnyịnya na oké jakị mụtara.
Drakma a hà ka mkpụrụ ego darik ndị Peshia e ji ọlaedo kpụọ, nke bụ́ gram 8.4. Ma, ọ bụghị drakma e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ Grik. Gụọ B14.
Maịna e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ gram 570. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Na Hibru, “achọ.”
Na Hibru, “na-eme ka aka ndị Juda ghara isi ike.”
O nwere ike ịbụ, “E dere ya n’asụsụ Arameik ma sụgharịa ya.”
Ọ bụ asụsụ Arameik ka e ji dee Ezra 4:8 ruo 6:18.
Ma ọ bụ “n’ógbè dị n’Ofe Osimiri.”
Ma ọ bụ “e si n’obí eze akwụ anyị ụgwọ ọnwa.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
N’Arameik, “enwe òkè n’ógbè.”
O nwere ike ịbụ, “a sụgharịala ma gụọrọ m.”
Ma ọ bụ “ógbè dị n’Ofe Osimiri.”
N’Arameik, “Anya Chineke ha dịkwa n’ahụ́.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ihe dị ka mita 26.7 (amaụkwụ 87.6). Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ógbè dị n’Ofe Osimiri.”
N’Arameik, “maka ndụ.”
O nwere ike ịbụ, “ebe a na-ekpofu ahịhịa; ikpo nsị.”
Gụọ B15.
Na Hibru, “chọọ.”
Ihe a bụ aha a na-etu Eze Darayọs nke Mbụ nke Peshia. N’oge ahụ, ọ bụ ya na-achị ebe Alaeze Asiria chịburu.
Na Hibru, “mere ka aka ha dị ike.”
Ezra pụtara “Enyemaka.”
Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Ma ọ bụ “Ọ bụ aka ochie n’idepụta Iwu Mosis.”
Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”
Ma ọ bụ “kpebiri n’obi ya.”
Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Ma ọ bụ “aka ochie n’idepụta okwu ndị dị n’iwu.”
Ọ bụ asụsụ Arameik ka e ji dee Ezra 7:12 ruo 7:26.
N’Arameik, “dị n’aka gị.”
N’Arameik, “ị na-ahụ.”
Ma ọ bụ “n’ógbè dị n’Ofe Osimiri.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Kọọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu kọọ bụ lita 220. Gụọ B14.
Bat bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu bat bụ lita 22 (galọn 5.81). Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ndị Netinim.” N’Arameik, “ndị e nyere n’onyinye.”
Ma ọ bụ “gosiri m ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”
Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Darik bụ mkpụrụ ego ndị Peshia e ji ọlaedo kpụọ. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “n’ebe ndị a na-anọ eri nri.”
Setrap pụtara “onye na-echebe ógbè.” N’amaokwu a, ndị a na-ekwu okwu ha bụ ndị gọvanọ ógbè dị iche iche Alaeze Peshia na-achị.
Ma ọ bụ “n’ógbè dị n’Ofe Osimiri.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “Ndị na-ama jijiji n’ihi okwu Chineke Izrel.”
Na Hibru, “amụbaala n’elu isi anyị.”
Na Hibru, “ma nye anyị mkpọ́.”
Na Hibru, “ka anya anyị na-enwu gbaa.”
Ma ọ bụ “gosiri anyị ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “mgbidi ga-echebe anyị.”
Ma ọ bụ “kpọbatara ụmụ nwaanyị mba ọzọ ndị bi n’ala a n’ụlọ anyị.”
Na Hibru, “ndị na-ama jijiji n’ihi iwu Chineke.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “n’ebe a na-eri ihe.”
Ma ọ bụ “ga-ejichi.”