Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Aịzaya 7:14
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 14 Ya mere, Jehova ga-enye unu ihe ịrịba ama: Lee! Nwa agbọghọ ahụ+ ga-atụrụ ime,+ ọ ga-amụkwa nwa nwoke,+ ọ ga-agụ ya Ịmanuel.

  • Aịzaya 9:6
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 6 N’ihi na a mụworo anyị otu nwa,+ e nyewokwa anyị otu nwa nwoke;+ ịchịisi ga-adị n’ubu ya.+ A ga-akpọ ya Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,+ Chineke nke bụ́ Dike,+ Nna Mgbe Ebighị Ebi,+ Onyeisi Udo.+

  • Jeremaya 23:5
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 5 “Lee! Oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe m ga-eme ka ome ezi omume puoro Devid.+ Otu eze ga na-achị+ ma jiri ezi uche na-eme ihe, na-ekpekwa ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume n’ala a.+

  • Ezikiel 34:23
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 23 M ga-enyekwa ha otu onye ọzụzụ atụrụ,+ bụ́ ohu m Devid,+ ọ ga-azụkwa ha. Ya onwe ya ga-azụ ha, ya onwe ya ga-abụkwa onye na-azụ ha.+

  • Daniel 9:24
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 24 “E kpebiwo na izu iri asaa ga-agabiga n’isi ndị gị+ nakwa n’isi obodo nsọ unu,+ iji mee ka mmebi iwu kwụsị+ nakwa iji kpochapụ mmehie+ nakwa iji kpuchie mmehie+ nakwa iji webata ezi omume ruo mgbe ebighị ebi+ nakwa iji kachie ọhụụ+ na onye amụma akara, nakwa iji tee Ebe Nsọ Kasị Nsọ mmanụ.+

  • Maịka 5:2
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 2 “Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata,+ obodo kachasị nta n’obodo ndị dị na Juda,+ ọ bụ n’ime gị+ ka onye ga-aghọ onye ọchịchị n’Izrel ga-esi pụta wee bịakwute m,+ onye malitere n’oge ochie, n’oge a na-amaghị ama gara aga.+

  • Malakaị 3:1
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 3 “Lee! M na-ezite onye ozi m,+ ọ ga-edozikwa ụzọ n’ihu m.+ Na mberede, ezi Onyenwe unu,+ bụ́ onye unu na-achọ, ga-abịa n’ụlọ nsọ Ya,+ ya na onye ozi+ nke ọgbụgba ndụ ahụ,+ onye unu nwere mmasị na ya.+ Lee! Ọ ga-abịa,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.+

  • Jọn 1:45
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 45 Filip hụrụ Nataniel+ wee sị ya: “Anyị ahụwo onye ahụ Mozis dere banyere ya n’Iwu ahụ,+ onye Ndị Amụma+ dekwara banyere ya, ya bụ, Jizọs, nwa Josef,+ onye Nazaret.”

  • Ọrụ Ndịozi 10:43
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 43 Ọ bụ ya ka ndị amụma niile na-agba àmà+ banyere ya, na onye ọ bụla nke nwere okwukwe n’ebe ọ nọ na-enweta mgbaghara nke mmehie site n’aha ya.”+

  • Ọrụ Ndịozi 26:22
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 22 Otú ọ dị, n’ihi na m nwetara enyemaka+ si n’ebe Chineke nọ, anọ m na-agbara ma ndị nta ma ndị ukwu àmà ruo taa, ma adịghị m ekwu ihe ọ bụla ma e wezụga ihe Ndị Amụma+ na Mozis+ kwuru na ọ bụ ihe ga-eme,

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya