Abụ Ọma
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ụmụ Kora.+
49 Unu ndị niile, nụrụnụ ihe a.
4 M ga-aṅa ntị ka m nụrụ ilu.
M ga-akọwa ilu m mgbe m na-akpọ ụbọ akwara.
5 Gịnị mere m ga-eji tụọ egwu n’oge nsogbu,+
Mgbe ndị chọrọ ịgba m mgba okpuru ji ihe ọjọọ ha na-eme gbaa m gburugburu?
6 Ndị tụkwasịrị obi n’ihe ha nwere,+
Ndị jikwa nnukwu akụnụba ha nwere anya isi,+
7 E nweghị onye ọ bụla n’ime ha nwere ike ịgbapụta nwanne ya
Ma ọ bụ nye Chineke ihe a ga-eji gbapụta ya.+
9 Ha enweghị ike ịgbapụta nwanne ha ka o wee dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma ghara ịbanye n’olulu.*+
10 Onye ọ bụla na-ahụ na ndị ma ihe na-anwụdị anwụ.
11 Ihe ha chọrọ bụ ka ụlọ ha dịruo mgbe ebighị ebi,
Ka ụlọikwuu ha dịrị n’ọgbọ niile.
Ha agụọla ala ha aha ha.
12 Ma n’agbanyeghị na a na-akwanyere mmadụ ùgwù, ọ gaghị adịrị ndụ gawa.+
Ọ kaghị anụmanụ na-anwụ anwụ mma.+
14 Ha dị ka atụrụ a ga-egbu egbu. Ha ga-aga n’ili.*
Ọnwụ ga-edu ha otú onye na-azụ atụrụ si edu atụrụ ya.
Ndị ezi omume ga-achị ha+ n’ụtụtụ.
Ha agaghịzi anọ.+
Ha ga-ebizi n’ili*+ kama ibi n’obí eze.+
15 Ma Chineke ga-anapụta m* n’ili.*+
Ọ ga-adọpụta m. (Sila)
16 Egwu atụla gị maka na mmadụ bara ọgaranya,
Maka na ọ na-akpatakwu akụ̀ n’ụlọ ya.
17 N’ihi na e nweghị otu mkpụrụ ihe ọ ga-ewere ma ọ nwụọ.+
Akụnụba ya agaghị eso ya banye n’ili.+
18 Ọ na-aja onwe ya* ike n’oge ọ nọ ndụ.+
(Ndị mmadụ na-eto mmadụ mgbe ihe na-agaziri ya.)+
19 Ma n’ikpeazụ, ọ na-anwụ otú nna nna ya hà nwụrụ.
Ha agaghịzi ahụ ìhè ọzọ.