22 Unu ga-ewerekwa ùkwù ahịhịa hisop+ bịanye n’ọbara nke dị n’efere wee tee ọbara ahụ dị n’efere ahụ n’elu ọnụ ụzọ unu nakwa n’awara ya abụọ; ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime unu ga-esi n’ọnụ ụzọ ụlọ ya pụta ruo ụtụtụ.
18 Mgbe ahụ, nwoke dị ọcha+ ga-ewere ahịhịa hisop,+ sụnye ya n’ime mmiri ahụ ma fesa ya n’ụlọikwuu ahụ nakwa n’arịa niile ahụ na mkpụrụ obi ndị nọ n’ebe ahụ, fesakwa ya onye ahụ metụrụ ọkpụkpụ ma ọ bụ onye e gburu egbu ma ọ bụ ozu ma ọ bụ ili aka.
33 Ọ na-ekwukwa banyere osisi, malite n’osisi sida dị na Lebanọn+ ruo n’osisi hisop+ na-epu n’ahụ́ ájá; ọ na-ekwu banyere anụ ọhịa+ na banyere anụ ufe+ na banyere ihe ndị na-akpụ akpụ+ nakwa banyere azụ̀.+