Ọpụpụ
33 Jehova gwakwara Mosis, sị: “Si n’ebe a kwalie, gị na ndị a i dupụtara n’Ijipt. Gawanụ n’ala m ṅụụrụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb iyi, sị, ‘M ga-enye ya ụmụ* gị.’+ 2 M ga-edunye otu mmụọ ozi ka o butere gị ụzọ+ wee chụpụ ndị Kenan, ndị Amọraịt, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus.+ 3 Gawanụ n’ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ Ma agaghị m eso unu gaa n’ihi na unu bụ ndị isi ike,*+ m nwekwara ike ibibi unu n’ụzọ.”+
4 Mgbe ndị Izrel nụrụ okwu a na-agba agba ná ntị, ha malitere iru uju, e nweghịkwa onye ọ bụla n’ime ha yiiri ihe o ji achọ mma. 5 Jehova sịrị Mosis: “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Unu bụ ndị isi ike.*+ M nwere ike ịbịa n’ebe unu mara ụlọikwuu bibie unu n’otu ntabi anya.+ N’ihi ya, unu eyila ihe ndị unu ji achọ mma, ka m chegodị ihe m ga-eme unu.’” 6 Ndị Izrel eyighịzi* ihe ndị ha ji achọ mma malite mgbe ha nọ n’Ugwu Horeb gawa.
7 Mosis sizi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu foro ụlọikwuu ya wee maa ya n’ebe dịpụtụrụ adịpụ ma kpọọ ya ụlọikwuu nzute. Onye ọ bụla chọrọ ịjụ Jehova ase+ na-esi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu pụọ gaa n’ụlọikwuu nzute ahụ. 8 Ọ na-abụ Mosis gawa n’ụlọikwuu ahụ, mmadụ niile na-ebili guzoro n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ha. Ha na-elegidekwa Mosis anya ruo mgbe ọ banyere n’ụlọikwuu ahụ. 9 Ozugbo Mosis banyere n’ụlọikwuu ahụ, ogidi ígwé ojii+ na-agbadata kwụrụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ mgbe Chineke na Mosis na-ekwurịta okwu.+ 10 Mgbe ọ bụla ha niile hụrụ ka ogidi ígwé ojii ahụ kwụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, onye ọ bụla n’ime ha na-anọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya kpọọ isiala. 11 Jehova gwara Mosis okwu ihu na ihu+ otú mmadụ si agwa mmadụ ibe ya okwu. Mgbe ọ bụla Mosis gaghachiri n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, Joshụa+ nwa Nọn, bụ́ onye ozi ya na onye na-enyere ya aka,+ anaghị esi n’ụlọikwuu ahụ apụ.
12 Mosis gwara Jehova, sị: “Lee, ị na-asị m, ‘Duru ndị a gawa,’ ma i mebeghị ka m mara onye ị ga-edunye m ka mụ na ya soro. I kwuokwala, sị, ‘Ama m gị nke ọma,* ihe gị masịkwara m.’ 13 Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, biko, mee ka m mara ụzọ gị,+ ka m wee mara gị, ka ihe m na-adịkwa gị mma. Chetakwa na mba a bụ ndị gị.”+ 14 N’ihi ya, Chineke* sịrị: “Mụnwa* ga-eso gị aga.+ M ga-emekwa ka i zuru ike.”+ 15 Mosis wee sị ya: “Ọ bụrụ na gịnwa* agaghị eso anyị aga, edurula anyị pụọ ebe a. 16 Oleekwanụ otú a ga-esi amata na ihe mụ na ndị gị masịrị gị? Ọ́ bụghị ma i soro anyị gawa,+ ka mụ na ndị gị wee dị iche ná ndị niile ọzọ nọ n’ụwa?”+
17 Jehova wee gwa Mosis, sị: “M ga-emekwa ihe a ị rịọrọ n’ihi na ihe gị masịrị m, amakwa m gị nke ọma.”* 18 Mosis wee sị: “Biko, gosi m ebube gị.” 19 Ma ọ sịrị: “M ga-agafe n’ihu gị ma mee ka ị hụ otú m si dị mma. M ga-akọsakwa aha m bụ́ Jehova n’ihu gị.+ Onye m chọrọ imere amara ka m ga-emere amara. Onye m chọkwara imere ebere ka m ga-emere ebere.”+ 20 Ma ọ sịkwara: “I nweghị ike ịhụ ihu m, n’ihi na e nweghị mmadụ ga-ahụ ihu m ma dị ndụ.”
21 Jehova kwukwara, sị: “Ebe a dị nso n’ebe m nọ. Nọrọ n’oké nkume a. 22 Mgbe ebube m na-agafe, m ga-eme ka ị banye n’ọgba dị n’oké nkume a. M ga-ejikwa aka m kpuchie gị ruo mgbe m gafere. 23 M gafechaa, m ga-ewepụ aka m. Ị ga-ahụkwa azụ m, ma ị gaghị ahụ ihu m.”+