Job
33 “Ma ugbu a, Job, biko nụrụ okwu m.
Gee ntị n’ihe niile m na-ekwu.
2 Biko, m ga-emegherịrị ọnụ m.
Ire m* ga-ekwurịrị okwu.
5 Saa m okwu ma ọ bụrụ na i nwere ike.
Kwuo ihe ndị ị chọrọ ikwu n’ihu m. Jikere ịzara ọnụ gị.
6 Mụ na gị bụ otu ihe n’anya ezi Chineke.
Ọ bụkwa ájá ka e ji kpụọ m.+
7 N’ihi ya, i kwesịghị ịtụ m ụjọ,
Ihe m na-ekwu ekwesịghịkwa ime ka ike gwụ gị.
8 Ma e nwere ihe i kwuru ná ntị m.
Aka m dị ọcha. Anaghị m eme ihe ọjọọ.+
10 Ma Chineke na-achọ ihe ọ ga-akụdo aka mesie m ike.
O weere m ka onye iro ya.+
11 Ọ na-etinye ụkwụ m n’ọtọsị.
Ọ na-enyocha ụzọ m niile.’+
12 Ma i kwuteghị ihe a i kwuru. Ọ bụ ya mere m ga-eji saa gị okwu:
Chineke karịrị nnọọ mmadụ efu.+
13 Gịnị mere i ji ekwu na ihe o mere adịghị mma?+
Ọ̀ bụ maka na ọ saghị gị ihe niile i kwuru?+
14 N’ihi na Chineke na-ekwu okwu ugboro ugboro.*
Ma e nweghị onye na-ege ya ntị.
16 Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ na-emeghe ntị ha,+
Mee ka ndụmọdụ ya ruo ha n’obi,
17 Iji mee ka mmadụ hapụ omume ọjọọ,+
Meekwa ka ọ kwụsị ịdị mpako.+
19 Mmadụ na-amụtakwa ihe mgbe o dina n’àkwà* ya, ahụ́ ana-egbu ya mgbu,
Nakwa mgbe ọkpụkpụ na-afụ ya ụfụ n’akwụsịghị akwụsị,
Ọ naghịdị* ekwe eri nri dị mma.+
21 Ọ taala ahụ́.
A na-ahụzi ọkpụkpụ ya niile anya.
Ọ ga-adaba n’aka ndị na-egbu mmadụ.
23 Ọ bụrụ na e nwere otu onye ozi* n’ime otu puku ndị ozi
Nke ga-ekwuchite ọnụ ya,
Bụ́ onye ga-agwa mmadụ ihe dị mma ọ ga-eme,
24 Mgbe ahụ, Chineke ga-emere ya amara, sị,
Ahụla m ihe mgbapụta.+
25 Ka ahụ́ ya dị ọhụrụ* karịa otú ọ dị mgbe ọ bụ nwata.+
Ka o nweghachi ike o nwere mgbe ọ bụ okorobịa.’+
26 Ọ ga-arịọsi Chineke arịrịọ ike.+ Chineke ga-emere ya amara.
Ọ ga-eti mkpu ọṅụ mgbe ọ ga-ahụ ihu Chineke.
Chineke ga-emekwa ka mmadụ efu bụrụghachi onye ezi omume n’anya ya.
Ma, a taghị m ahụhụ e kwesịrị ịta m.*
28 Ọ napụtala mkpụrụ obi* m ka m ghara ịbanye n’olulu.*+
M ka ga-anọ ndụ na-ahụ ìhè.’
29 N’eziokwu, Chineke na-emere mmadụ ihe niile a
Ugboro ugboro,*
30 Ka o si n’olulu* kpọghachi ya,*
Ka ìhè nke ndụ wee nwuoro ya.+
31 Ṅaa ntị, Job. Gee m ntị.
Gba nkịtị ka m gwakwuo gị okwu.
32 Ọ bụrụ na e nwere ihe ị ga-asa m, saa m ya.
Kwuo okwu, n’ihi na achọrọ m igosi na aka gị dị ọcha.
33 Ọ bụrụ na e nweghị ihe ị ga-ekwu, i kwesịrị ige m ntị.
Gba nkịtị. M ga-akụziri gị amamihe.”