Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 30
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • Ndị Izrel ga-alọghachikwute Jehova (1-10)

      • Iwu Jehova esighị oké ike (11-14)

      • Ndị Izrel ga-ahọrọ ndụ ma ọ bụ ọnwụ (15-20)

Diuterọnọmi 30:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 11:26-28; 28:2, 15
  • +1Ez 8:47; Neh 1:9; Ezi 18:28; Joe 2:13
  • +2Ez 17:6; 2Ih 36:20

Diuterọnọmi 30:2

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:29
  • +Aịz 55:7; 1Jn 1:9

Diuterọnọmi 30:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jer 29:14
  • +Ákw 3:22
  • +Ezr 1:2, 3; Ọm 147:2; Jer 32:37; Ezi 34:13

Diuterọnọmi 30:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 28:64; Zef 3:20

Diuterọnọmi 30:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Neh 1:9

Diuterọnọmi 30:6

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ga-ebi obi unu na obi ụmụ unu úgwù.”

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jer 32:37, 39
  • +Di 6:5

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/1/2007, p. 13

Diuterọnọmi 30:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 12:2, 3; Jer 25:12; Ákw 3:64; Ro 12:19

Diuterọnọmi 30:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 65:21, 22; Mal 3:10
  • +Jer 32:37, 41

Diuterọnọmi 30:10

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Neh 1:9; Ọrụ 3:19

Diuterọnọmi 30:11

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ọ dịghịkwa n’ebe dị anya.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 45:19

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/1/2009, p. 31

Diuterọnọmi 30:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ro 10:6

Diuterọnọmi 30:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ro 10:8
  • +Mt 7:21; Jes 1:25

Diuterọnọmi 30:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 11:26

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/1/2009, p. 31

Diuterọnọmi 30:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 6:5
  • +Le 18:5
  • +Le 25:18; Di 30:5

Diuterọnọmi 30:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 29:18; Hib 3:12
  • +Di 4:19

Diuterọnọmi 30:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 8:19; Jos 23:15; 1Sa 12:25

Diuterọnọmi 30:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 11:26; 27:26; 28:2, 15
  • +Di 32:47
  • +Jos 24:15

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara, isiokwu 44

    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze),

    nke 2 2018, p. 14-15

    Ụlọ Nche,

    2/15/2010, p. 28

    6/1/2006, p. 27

    7/15/1999, p. 11-12

    6/15/1996, p. 12-17

    Teta!,

    4/2009, p. 11

Diuterọnọmi 30:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 10:12
  • +Di 4:4
  • +Je 12:7; 15:18

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara, isiokwu 44

    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze),

    nke 2 2018, p. 14-15

    Ụlọ Nche,

    2/15/2010, p. 28

    11/1/2009, p. 31

    6/1/2006, p. 28-29

    7/15/1999, p. 11-12

    Teta!,

    4/2009, p. 11

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 30:1Di 11:26-28; 28:2, 15
Diut. 30:11Ez 8:47; Neh 1:9; Ezi 18:28; Joe 2:13
Diut. 30:12Ez 17:6; 2Ih 36:20
Diut. 30:2Di 4:29
Diut. 30:2Aịz 55:7; 1Jn 1:9
Diut. 30:3Jer 29:14
Diut. 30:3Ákw 3:22
Diut. 30:3Ezr 1:2, 3; Ọm 147:2; Jer 32:37; Ezi 34:13
Diut. 30:4Di 28:64; Zef 3:20
Diut. 30:5Neh 1:9
Diut. 30:6Jer 32:37, 39
Diut. 30:6Di 6:5
Diut. 30:7Je 12:2, 3; Jer 25:12; Ákw 3:64; Ro 12:19
Diut. 30:9Aịz 65:21, 22; Mal 3:10
Diut. 30:9Jer 32:37, 41
Diut. 30:10Neh 1:9; Ọrụ 3:19
Diut. 30:11Aịz 45:19
Diut. 30:12Ro 10:6
Diut. 30:14Ro 10:8
Diut. 30:14Mt 7:21; Jes 1:25
Diut. 30:15Di 11:26
Diut. 30:16Di 6:5
Diut. 30:16Le 18:5
Diut. 30:16Le 25:18; Di 30:5
Diut. 30:17Di 29:18; Hib 3:12
Diut. 30:17Di 4:19
Diut. 30:18Di 8:19; Jos 23:15; 1Sa 12:25
Diut. 30:19Di 11:26; 27:26; 28:2, 15
Diut. 30:19Di 32:47
Diut. 30:19Jos 24:15
Diut. 30:20Di 10:12
Diut. 30:20Di 4:4
Diut. 30:20Je 12:7; 15:18
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 30:1-20

Diuterọnọmi

30 “Mgbe okwu a niile ga-emezu n’isi unu, ya bụ, ngọzi na ọbụbụ ọnụ nke m gwara unu ka unu họrọ otu n’ime ha,+ unu echetazie ha+ mgbe unu nọ ná mba niile Jehova bụ́ Chineke unu chụgara unu,+ 2 unu na ụmụ unu ewee jiri obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile+ lọghachikwute Jehova bụ́ Chineke unu+ ma gewe ntị n’olu ya, mewekwa ihe niile m na-enye unu n’iwu taa, 3 Jehova bụ́ Chineke unu ga-esi n’ebe a dọọrọ unu n’agha kpọlata unu,+ meere unu ebere+ ma si n’ebe niile Jehova bụ́ Chineke unu chụsasịrị unu kpọghachite unu.+ 4 Ọ bụrụgodị na ọ bụ na nsọtụ ụwa ka a chụgara unu, Jehova bụ́ Chineke unu ga-esi n’ebe ahụ kpọkọta unu ma kpọlata unu.+ 5 Jehova bụ́ Chineke unu ga-akpọbata unu n’ala nna unu hà biri na ya. Unu ga-ebirikwa na ya. Ọ ga-eme ka ihe gaziere unu, meekwa ka unu mụbaa karịa nna unu hà.+ 6 Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka obi unu na obi ụmụ unu dị ọcha,*+ ka unu wee jiri obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya, unu adịkwa ndụ.+ 7 Jehova bụ́ Chineke unu ga-emezi ka ihe ọjọọ a niile mee ndị iro unu bụ́ ndị kpọrọ unu asị ma na-akpagbu unu.+

8 “Unu ga-alaghachi gee ntị n’olu Jehova ma debe iwu ya niile m na-enye unu taa. 9 Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka ihe niile unu na-arụ na-agara unu nke ọma nke ọma,+ mee ka ụmụ unu na anụ ụlọ unu na ihe ala unu na-emepụta dị ọtụtụ, n’ihi na ọ ga-amasị Jehova ọzọ ime ka ihe na-agaziri unu, otú ọ masịrị ya ime ka ihe gaziere nna nna unu hà.+ 10 Unu ga-egezi ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma debe ihe ndị o nyere n’iwu, sorokwa ntụziaka ya ndị e dere n’akwụkwọ Iwu a. Unu ga-ejikwa obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile lọghachikwute Jehova bụ́ Chineke unu.+

11 “Iwu a m na-enye unu taa esighịrị unu oké ike, ọ dịghịkwa n’ebe aka unu na-agaghị eru.*+ 12 Ọ dịghị n’eluigwe, nke ga-eme ka unu sị, ‘Ònye ga-arịgo n’eluigwe wetara anyị ya, ka anyị wee nụ ya ma mee ya?’+ 13 Ọ dịghịkwa n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri, nke ga-eme ka unu sị, ‘Ònye ga-aga n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri wetara anyị ya, ka anyị wee nụ ya ma mee ya?’ 14 N’ihi na okwu ahụ dị unu ezigbo nso, n’ọnụ unu nakwa n’obi unu,+ ka unu wee mee ya.+

15 “Taa, e nwere ihe abụọ m chọrọ ka unu họrọ otu n’ime ha. Otu bụ ndụ na ihe ọma, nke ọzọ abụrụ ọnwụ na ihe ọjọọ.+ 16 Ọ bụrụ na unu egee ntị n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu, nke m na-enye unu taa, unu ewee hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya,+ na-eme uche ya, na-edebe ihe o nyere n’iwu, na-eso ntụziaka ya, na-emekwa ihe ndị o kpebiri, unu ga-adị ndụ+ ma mụbaa, Jehova bụ́ Chineke unu ga-agọzikwa unu n’ala ahụ unu na-aga iweghara.+

17 “Ma, ọ bụrụ na obi unu apụọ n’ebe Chineke nọ,+ unu aghara ige ya ntị, e wee rafuo unu, unu akpọọrọ chi ọzọ dị iche iche isiala, feekwa ha ofufe,+ 18 ana m agwa unu taa na a ga-ebibirịrị unu.+ Unu agaghị ebite aka n’ala ahụ unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu gaa biri. 19 Eluigwe na ụwa bụụrụ m ndị akaebe taa na agwala m unu ihe abụọ unu ga-ahọrọ otu n’ime ha. Ha bụ ndụ na ọnwụ, ka a gọzie unu ma ọ bụ ka a bụọ unu ọnụ.+ Unu ga-ahọrọ ndụ ka unu wee dịrị ndụ,+ unu na ụmụ unu.+ 20 Otú unu ga-esi eme ya bụ na unu ga-ahụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya,+ na-ege ntị n’olu ya, gharakwa ịhapụ ya,+ n’ihi na ọ bụ ya na-enye unu ndụ, ọ bụkwa ya ga-eme ka unu bitee aka n’ala ahụ Jehova ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu hà, bụ́ Ebreham, Aịzik, na Jekọb.”+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya