Ezikiel
13 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị: 2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma ihe ga-eme ndị amụma nọ n’Izrel,+ gwakwa ndị na-eji aka ha echepụta ihe ha na-ebu n’amụma* okwu.+ Sị ha, ‘Nụrụnụ ihe Jehova kwuru. 3 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ndị amụma iberiibe ga-ata ahụhụ, ndị na-ebu ihe dị ha n’obi n’amụma, mgbe ha na-ahụghị ọhụụ ọ bụla.+ 4 Ndị Izrel, ndị amụma unu dị ka nkịta ọhịa ndị nọ n’ebe bụ́ sọ ikpo nkume. 5 Ha agaghị aga ebe mgbidi e ji nkume rụọ dara ma rụzie ya iji chebe ndị Izrel,+ ka ndị Izrel wee kwụsie ike n’agha n’ụbọchị Jehova.”+ 6 “Ha na-ahụ ọhụụ ụgha. Ha na-ebukwa amụma ụgha, na-asị, ‘Jehova sịrị,’ mgbe Jehova na-agwaghị ha ihe ọ bụla. Ma, ha nọkwa na-eche na ọ ga-eme ka ihe ha kwuru mezuo.+ 7 Unu na-ahụ ọhụụ ụgha. Unu na-ebukwa amụma ụgha, na-asị, ‘Jehova sịrị,’ mgbe m na-ekwughị ihe ọ bụla.”’
8 “‘N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “‘Ebe ọ bụ na unu na-agha ụgha, na-ahụkwa ọhụụ ụgha, m ga-eme unu ihe.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”+ 9 M ga-eji ike m mee ndị amụma ha ihe, ndị na-ahụ ọhụụ ụgha, ndị na-ebukwa amụma ụgha.+ Ha agaghị eso ná ndị enyi m. A gaghịkwa edenye aha ha n’akwụkwọ e dere aha ndị Izrel. Ha agaghị alọta n’Izrel. Unu ga-amarakwa na m bụ Ọkaakaa Onyenwe unu bụ́ Jehova.+ 10 Ihe a niile ga-eme ha n’ihi na ha eduhiela ndị m, na-asị, “Udo dị!” mgbe udo na-adịghị.+ Ọ bụrụ na e jiri ihe na-esighị ike rụọ ahụ́ ụlọ, ndị na-ete ya nzu na-ete ya na nkịtị.’*+
11 “Gwa ndị na-ete ya nzu na ọ ga-ada. Ezigbo mmiri ga-ezo. Akụ́ mmiri ígwé ga-ada,* oké ifufe ga-efekwa, kwatuo ya.+ 12 Ahụ́ ụlọ ahụ daa, a ga-ajụ unu, sị, ‘Olee uru ihe ahụ unu tere ya bara?’+
13 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘M ga-eji iwe mee ka oké ifufe fee, jirikwa iwe mee ka ezigbo mmiri zoo, jirikwa ezigbo iwe mee ka akụ́ mmiri ígwé daa bibie unu. 14 M ga-akwatu mgbidi ahụ unu tere nzu, meekwa ka ọ daruo ala. A ga na-ahụkwa ntọala ya. Mgbe obodo a ga-ada, unu ga-anọ na ya laa n’iyi. Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.’
15 “‘M ga-eji iwe mee mgbidi ahụ na ndị tere ya nzu ihe. M ga-asịkwa unu: “Mgbidi ahụ adịghịzi. Ndị tere ya nzu anọghịzi.+ 16 Ndị amụma Izrel anọghịzi, ya bụ, ndị na-eburu ndị bi na Jeruselem amụma nakwa ndị na-ahụrụ ha ọhụụ, na-agwa ha na udo dị mgbe udo na-adịghị.”’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.
17 “Gịnwa, bụ́ nwa nke mmadụ, chee ụmụ nwaanyị ndị gị ihu, ndị ji aka ha echepụta ihe ha na-ebu n’amụma. Buo amụma ihe a ga-eme ha. 18 Sị ha, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ụmụ nwaanyị ndị na-adụrụ mmadụ niile ihe ha na-ekpunye n’aka,* ndị na-adụkwa ákwà e ji ekpuchi isi maka otú ọ bụla isi mmadụ hà iji gbuo ndị mmadụ,* unu ga-ata ahụhụ. Ùnu na-achọ igbu ndị m* ma na-agba mbọ ịzọ onwe unu ndụ?* 19 Unu ji maka inweta ọka bali juru ọbụ aka ole na ole nakwa ibé achịcha ole na ole na-eme ka m bụrụ onye rụrụ arụ n’anya ndị m,+ na-egbukwa ndị* na-ekwesịghị ịnwụ, na-ahapụ ndị* na-ekwesịghị ịdị ndụ. Otú unu si eme ihe a bụ ịghara ndị m ụgha, ha ana-aṅa ntị n’ụgha unu na-agha.”’+
20 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘Ụmụ nwaanyị, m ga-emebisị ihe unu gba n’aka, nke unu ji na-achọ igbu ndị mmadụ* ka à ga-asị na ha bụ nnụnụ. M ga-adọkapụkwa ha n’aka unu ma hapụ ndị ahụ unu na-achọ igbu otú e si egbu nnụnụ. 21 M ga-adọkapụkwa ákwà unu ji kpuchie isi ma napụta ndị m n’aka unu. Ha agaghịzi anọ n’aka unu ka ndị unu chọrọ igbu egbu. Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.+ 22 Unu ji ụgha unu na-agha mee ka onye ezi omume chịrị obi n’aka+ mgbe m na-ebughị n’obi ịta ya ahụhụ. Unu emeekwala ka obi kaa onye ajọ omume,+ nke mere na ọ kwụsịghị àgwà ọjọọ ọ na-akpa ma nwee ike dịrị ndụ.+ 23 N’ihi ya, unu ụmụ nwaanyị, unu agaghịzi na-ahụ ọhụụ ụgha, na-agbakwa afa.+ M ga-anapụta ndị m n’aka unu. Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.’”