2 Ndị Eze
15 N’afọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Jeroboam eze Izrel, Azaraya+ nwa Amazaya+ eze Juda ghọrọ eze. 2 Ọ dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri ise na abụọ na Jeruselem.+ Aha nne ya bụ Jekọlaya onye Jeruselem. 3 O wee na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova, dị ka ihe niile Amazaya nna ya mere si dị.+ 4 Ọ bụ naanị na e bibighị ebe ndị dị elu.+ Ndị mmadụ ka nọ na-achụ àjà ma na-esure ihe nsure ọkụ n’ebe ndị dị elu.+ 5 N’ikpeazụ, Jehova tiri eze ihe otiti,+ o wee bụrụ onye ekpenta+ ruo ụbọchị ọ nwụrụ, o bikwa n’ụlọ ya, e gbochiri ya ịrụ ọrụ,+ ebe Jotam+ nwa eze bụ onyeisi ụlọ ya, na-ekpekwa ndị ala ya ikpe.+ 6 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Azaraya na ihe niile o mere, ọ̀ bụ na e deghị ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Juda? 7 N’ikpeazụ, Azaraya sooro nna nna ya hà dinaa,+ ha wee lie ya n’ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid; Jotam nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.+
8 N’afọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị Azaraya+ eze Juda, Zekaraya+ nwa Jeroboam ghọrọ eze Izrel wee chịa na Sameria ọnwa isii. 9 O wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dị nnọọ ka nna nna ya hà mere.+ Ọ hapụghị mmehie Jeroboam+ nwa Nibat ji mee ka Izrel mehie.+ 10 Shalọm nwa Jebesh wee gbaara ya izu+ ma gbuo+ ya n’Ibliam,+ o wee malite ịchị n’ọnọdụ ya. 11 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Zekaraya, lee, e dere ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Izrel. 12 Ọ bụ okwu+ ahụ Jehova gwara Jihu, sị:+ “Ụmụ gị ndị ikom+ ga-anọkwasịrị gị n’ocheeze Izrel ruo ọgbọ anọ.” O wee dị otú ahụ.+
13 Ma Shalọm nwa Jebesh ghọrọ eze n’afọ nke iri atọ na itoolu nke ọchịchị Ọzaya+ eze Juda, o wee na-achị na Sameria ruo otu ọnwa zuru ezu.+ 14 Menahem+ nwa Gedaị wee si Teza+ gbagote bịa na Sameria gbuo Shalọm+ nwa Jebesh na Sameria; o wee malite ịchị n’ọnọdụ ya. 15 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Shalọm na izu ọjọọ+ ya nke ọ gbara, lee, e dere ha n’akwụkwọ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Izrel. 16 Ọ bụ mgbe ahụ ka Menahem bibiri Tifsa na ihe niile dị n’ime ya na ókèala ya malite na Teza gawa, n’ihi na o megheghị ụzọ, o wee bibie ya. Ọ bọwakwara ndị inyom ya niile dị ime afọ.+
17 N’afọ nke iri atọ na itoolu+ nke ọchịchị Azaraya eze Juda, Menahem nwa Gedaị ghọrọ eze Izrel wee chịa na Sameria afọ iri. 18 O wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.+ Ọ hapụghị mmehie niile Jeroboam+ nwa Nibat ji mee ka Izrel mehie,+ n’ụbọchị ya niile. 19 Pul+ eze Asiria+ batara n’ala ahụ. N’ihi ya, Menahem nyere+ Pul otu puku talent ọlaọcha,+ ka o wee nyere ya aka mee ka alaeze ahụ guzosie ike n’aka ya.+ 20 Menahem wee weta ọlaọcha ahụ n’akpa Izrel, n’akpa ndị dimkpa niile bụ́ dike,+ ka o wee nye eze Asiria shekel ọlaọcha iri ise maka nwoke ọ bụla. Eze Asiria wee laghachi, ọ nọgideghịkwa n’ebe ahụ n’ala ahụ. 21 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Menahem+ na ihe niile o mere, ọ̀ bụ na e deghị ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Izrel? 22 N’ikpeazụ, Menahem sooro nna nna ya hà dinaa, Pekahaya+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.
23 N’afọ nke iri ise nke ọchịchị Azaraya eze Juda, Pekahaya nwa Menahem ghọrọ eze Izrel wee chịa na Sameria afọ abụọ.+ 24 O wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.+ Ọ hapụghị mmehie Jeroboam+ nwa Nibat ji mee ka Izrel mehie.+ 25 Pika+ nwa Remalaya bụ́ osote onyeisi ndị agha ya+ gbaara ya izu+ wee gbuo ya na Sameria, n’ụlọ elu nke dị n’ụlọ eze,+ ya na Agọb na Araye, ndị ikom iri ise n’ime ndị Gilied sokwa ya. O wee gbuo ya ma malite ịchị n’ọnọdụ ya. 26 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Pekahaya na ihe niile o mere, lee, e dere ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Izrel.
27 N’afọ nke iri ise na abụọ nke ọchịchị Azaraya eze Juda, Pika+ nwa Remalaya+ ghọrọ eze Izrel wee chịa na Sameria afọ iri abụọ. 28 O wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.+ Ọ hapụghị mmehie Jeroboam+ nwa Nibat ji mee ka Izrel mehie.+ 29 N’ụbọchị Pika eze Izrel, Tiglat-piliza+ eze Asiria+ batara wee weghara Aịjọn+ na Ebel-bet-meaka+ na Janoa na Kidesh+ na Hezọ+ na Gilied+ na Galili,+ ala Naftalaị+ dum, dọrọkwa ha n’agha laa Asiria.+ 30 N’ikpeazụ, Hoshia+ nwa Ila gbaara Pika nwa Remalaya izu+ wee gbuo ya;+ o wee malite ịchị n’ọnọdụ ya n’afọ nke iri abụọ nke ọchịchị Jotam+ nwa Ọzaya. 31 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Pika na ihe niile o mere, lee, e dere ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Izrel.
32 N’afọ nke abụọ nke ọchịchị Pika nwa Remalaya eze Izrel, Jotam+ nwa Ọzaya+ eze Juda ghọrọ eze. 33 Ọ gbara afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri na isii na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jerusha ada Zedọk.+ 34 O wee na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova.+ O mere dị ka ihe niile si dị nke Ọzaya nna ya mere.+ 35 Ọ bụ naanị na e bibighị ebe ndị dị elu. Ndị mmadụ ka nọ na-achụ àjà ma na-esure ihe nsure ọkụ n’ebe ndị dị elu.+ Ọ bụ ya wuru ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe mgbago n’ụlọ Jehova.+ 36 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Jotam, ihe ndị o mere, ọ̀ bụ na e deghị ha n’akwụkwọ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Juda?+ 37 N’oge ahụ, Jehova malitere izite+ Rizin+ eze Siria na Pika+ nwa Remalaya ka ha buso Juda agha. 38 N’ikpeazụ, Jotam sooro nna nna ya hà dinaa, e wee lie ya n’ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid bụ́ nna nna ya;+ Ehaz+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.