Job
29 Job kwukwara, sị:
2 “Ọ dị m ka ya bụrụ na ihe a bụ ọnwa ndị garala aga,
N’oge Chineke na-eche m nche,
3 Mgbe o mere ka ọkụ* ya na-acha m n’isi,
Mgbe m na-eji ìhè ya agafe n’ọchịchịrị,+
4 Mgbe m ka bụ okorobịa,
Mgbe mụ na Chineke dị n’ezigbo mma,+
5 Mgbe Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka nọnyeere m,
Mgbe ụmụ m* gbara m gburugburu,
6 Mgbe mmiri ara ehi juru n’ebe m na-azọ ụkwụ,
Oké nkume ana-agbapụtara m mmanụ ka mmiri.+
Ndị agadi na-ebilidị guzoro ọtọ.+
9 Ndị isi anaghị ekwu okwu.
Ha na-ekpuchi aka n’ọnụ ha.
10 Ndị a ma ama gbachiri nkịtị.
Ire ha tapaara n’okpo ọnụ ha.
11 Onye ọ bụla nụrụ ihe m kwuru ga-ekwu okwu ọma banyere m,
Ndị hụkwara m ga-agbara m akaebe.
12 N’ihi na m na-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka,+
Na-anapụtakwa nwa na-enweghị nna na onye ọ bụla nke na-enweghị onye na-enyere ya aka.+
14 M yi ezi omume ka uwe.
Ikpe ziri ezi bụụrụ m uwe elu* na ákwà m na-eke n’isi.
15 Abụ m anya ndị ìsì ji ahụ ụzọ,
Bụrụkwa ụkwụ ndị ngwọrọ ji aga ije.
M na-eleba anya n’ikpe gbasara ndị m na-amaghị.+
17 M na-akụwa onye na-eme ihe ọjọọ agba, onye dị ka anụ ọhịa nke jidere anụ ọ ga-eri.+
M na-anapụtakwa ndị o ji eji.
19 M ga-adị ka osisi mgbọrọgwụ ya ga-agbasa banye na mmiri,
Nke igirigi ga-adịkwa n’alaka ya chi abọọ.
20 E nweghị mgbe a ga-akwụsị ịkwanyere m ùgwù,
M ga na-agbakwa ụta m ji n’aka n’akwụsịghị akwụsị.’
21 Ndị mmadụ ga-ege ntị ka ha nụ ihe m ga-ekwu.
Ha ga-anọ jụụ na-eche ka m dụọ ha ọdụ.+
22 M kwuchaa okwu, e nweghị ihe ọzọ ha na-ekwu.
Okwu m na-eru ha n’ahụ́.
23 Ha na-atụ anya m otú e si atụ anya mmiri ozuzo.
Ha na-atụsi anya ike ịnụ ihe m ga-ekwu otú mmadụ si atụsi anya ụla mmiri ike.+
24 M mụmụọrọ ha ọnụ ọchị, ọ na-eju ha anya.
Otú m si agbasapụ ihu m na-eme ka obi sie ha ike.
25 M na-enye ha ntụziaka ka onyeisi ha.