Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Nehemaya 1:1-13:31
  • Nehemaya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nehemaya
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Nehemaya

NEHEMAYA

1 Ihe a bụ okwu Nehemaya*+ nwa Hakalaya: N’ọnwa Kislev,* n’afọ nke iri abụọ, m nọ na Shushan*+ bụ́ ebe obí eze dị.* 2 N’oge ahụ, Hanenaị,+ otu n’ime ụmụnne m ndị nwoke, na ụmụ nwoke ndị ọzọ si Juda bịa. M wee jụọ ha banyere ndị Juu fọrọ afọ, ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha laa,+ nakwa banyere Jeruselem. 3 Ha zara m, sị: “Ndị ahụ fọrọ n’ógbè* Juda, bụ́ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, nọ n’ọnọdụ ọjọọ, ihere jikwa ha.+ A kwatusịrị mgbidi Jeruselem,+ gbaakwa ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ.”+

4 Ozugbo m nụrụ ihe a ha kwuru, m nọdụrụ ala malite ibe ákwá. M nọkwa na-eru uju, na-ebu ọnụ+ ma na-ekpe ekpere ruo ọtụtụ ụbọchị n’ihu Chineke nke eluigwe. 5 M sịrị: “Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe, Onye ukwu na Chineke e kwesịrị ịtụ egwu, onye na-anaghị emebi ọgbụgba ndụ ya na ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe iwu ya gbara, onye na-egosikwa ha na ọ hụrụ ha n’anya,+ 6 biko, gee ntị. Lee m anya ma nụrụ ekpere ohu gị na-ekpe n’ihu gị taa. Ehihie na abalị,+ m na-ekpe ekpere banyere ndị Izrel bụ́ ndị ohu gị, na-ekwupụta mmehie ndị Izrel mehiere gị. Anyị emehiela, ma mụnwa ma ụlọ nna m.+ 7 N’eziokwu, anyị emeela omume rụrụ arụ, mejọọ gị.+ Anyị erubeghị isi n’iwu, ná ntụziaka, nakwa n’ihe ndị i kpebiri bụ́ ndị i si n’aka Mosis ohu gị nye anyị.+

8 “Biko, cheta na i nyere Mosis ohu gị iwu,* sị: ‘Ọ bụrụ na unu enupụ isi, m ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche.+ 9 Ma ọ bụrụ na unu alọghachikwute m, debe iwu m ma rube isi, ọ bụ eziokwu na e nwere ike ịchụsasị unu ruo na nsọtụ eluigwe, m ga-esi n’ebe ahụ kpọkọta unu+ ma kpọlata unu n’ebe m họọrọ ka a nọrọ na-eto aha m.’+ 10 Ha bụ ndị ohu gị na ndị gị i ji ike gị dị ukwuu na aka gị dị ike gbapụta.+ 11 Ewoo, Jehova, biko, ka ntị gị nụrụ ekpere ohu gị na-ekpe nakwa ekpere ndị ohu gị na-ekpe, bụ́ ndị ọ na-amasị ịtụ egwu aha gị. Biko, mee ka ihe gaziere ohu gị taa, meekwa ka nwoke a metere m ebere.”+

Ọ bụ m na-ebutere eze ihe ọ na-aṅụ.+

2 N’ọnwa Naịsan,* n’afọ nke iri abụọ+ n’ọchịchị Eze Atazaksis,+ a dọsara mmanya n’ihu ya. M wee buru mmanya ahụ otú m na-emebu bunye eze.+ Ma e nwetụbeghị mgbe m gbarụrụ ihu n’ihu ya. 2 Eze wee sị m: “Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ agbarụọ n’agbanyeghị na e nweghị ọrịa ị na-arịa? Ọ ga-abụrịrị na obi adịghị gị mma.” Ezigbo egwu wee jide m.

3 M wee sị eze: “Eze, ị ga-adị ogologo ndụ. Gịnị mere ihu m agaghị agbarụ agbarụ ebe ọ bụ na e bibiri obodo m, bụ́ ebe e liri nna nna m hà, gbaakwa ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ?”+ 4 Eze sịziri m: “Gịnị ka ị chọrọ?” Ozugbo ahụ, m kpere ekpere gwa Chineke nke eluigwe okwu.+ 5 M wee sị eze: “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na i nwere mmasị n’ebe ohu gị nọ, ziga m Juda, n’obodo ebe e liri nna nna m hà, ka m rụghachi ya.”+ 6 N’oge ahụ, nwunye eze nọ ọdụ n’akụkụ eze. Eze wee jụọ m, sị: “Olee mgbe ị ga-anọru? Oleekwa mgbe ị ga-alọta?” O wee masị eze ịhapụ m ka m gaa.+ M gwakwara ya oge ọ ga-abụ.+

7 M wee sị eze: “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka e nye m akwụkwọ ozi ndị m ga-enye ndị gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis,*+ ka ha kwe ka m gafere ruo mgbe m ga-agaru Juda, 8 nakwa akwụkwọ ozi m ga-enye Esaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o bunye m osisi ndị m ga-eji rụọ ọnụ ụzọ ámá Ebe A Rụsiri Ike+ n’Ụlọ Nsọ, rụọ mgbidi obodo ahụ,+ nakwa ụlọ m ga-ebi.” Eze wee nye m ha+ n’ihi na Chineke m nọnyeere m.+

9 M mechara bịakwute ndị gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis ma nye ha akwụkwọ ozi ndị ahụ eze nyere m. Eze kpọnyekwara m ndị ọchịagha na ndị na-agba ịnyịnya. 10 Mgbe Sanbalat+ onye Bet-horọn na Tobaya+ onye Amọn+ na-eje ozi nụrụ ya, obi jọrọ ha ezigbo njọ na e nwere onye bịara imere ndị Izrel ihe ọma.

11 M mechara bịarute Jeruselem, nọọ ụbọchị atọ. 12 M biliri n’abalị, mụ na ụmụ nwoke ole na ole. Agwaghị m onye ọ bụla ihe Chineke m tinyere m n’obi imere Jeruselem. E nweghị anụmanụ m ji ma e wepụ nke m nọ n’elu ya. 13 M wee si n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ndagwurugwu+ pụọ n’abalị, si n’ihu Iyi Nnukwu Agwọ gaa n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ikpo Ntụ.*+ M leruru mgbidi Jeruselem a kwatusịrị akwatusị anya nakwa ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ repịara.+ 14 M gawara ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Iyi,+ ruokwa n’Ọdọ Mmiri Eze, ma e nweghị ebe anụmanụ m nọ n’elu ya ga-esi gafere. 15 Ma m gbagowere na ndagwurugwu ahụ+ n’abalị ahụ, na-eleru mgbidi ahụ anya. M mechara laghachi azụ ma si n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ndagwurugwu banye, lọtazie.

16 Ndị osote onye na-achị achị+ amaghị ebe m gara na ihe m nọ na-eme n’ihi na e nwebeghị ihe m gwara ndị Juu na ndị nchụàjà na ndị a ma ama na ndị osote onye na-achị achị, na ndị ọzọ ga-eso arụ ọrụ ahụ. 17 N’ikpeazụ, m sịrị ha: “Unu na-ahụ ọnọdụ ọjọọ anyị nọ na ya, otú e si bibie Jeruselem, gbaakwa ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ. Bịanụ ka anyị rụghachi mgbidi Jeruselem, ka ihere a kwụsị ime anyị.” 18 M gwaziri ha otú Chineke m si nyere m aka+ nakwa ihe eze gwara m.+ Ha wee sị: “Ka anyị bilie rụọ ya.” Ha wee gbaa ibe ha ume* ịrụ ọrụ ọma ahụ.+

19 Mgbe Sanbalat onye Bet-horọn, Tobaya+ onye Amọn+ na-eje ozi, na Gishem onye Arebia+ nụrụ ya, ha malitere iji anyị eme ihe ọchị+ ma na-akparị anyị, sị: “Gịnịdị ka unu na-eme? Ùnu na-enupụrụ eze isi?”+ 20 Ma m zara ha, sị: “Ọ bụ Chineke nke eluigwe ga-eme ka ihe gaziere anyị.+ Anyị bụ́ ndị ohu ya ga-ebili rụọ mgbidi a. Ma e nweghị ihe jikọrọ unu na Jeruselem. Unu enweghịkwa òkè ma ọ bụ ihe a ga-eji cheta unu na ya.”+

3 Elayashib+ nnukwu onye nchụàjà na ụmụnne ya, bụ́ ndị nchụàjà, malitere ịrụ Ọnụ Ụzọ Ámá Atụrụ.+ Ha doro ya nsọ*+ ma tinye ibo ụzọ ya niile. Ha doro ya nsọ ruo n’Ụlọ Nche Mia,+ ruokwa n’Ụlọ Nche Hananel.+ 2 Ndị Jeriko+ rụzikwara mgbidi n’akụkụ ha. Zakọ nwa Imraị rụzikwara mgbidi n’akụkụ ha.

3 Ụmụ Hasenea rụrụ Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀.+ Ha tinyere ya osisi,+ tinye ibo ụzọ ya, ihe e ji akpọchi ha, na ihe e ji atụchi ha. 4 Meremọt+ nwa Yuraịja nwa Hakọz rụziri mgbidi n’akụkụ ha. Meshọlam+ nwa Berekaya nwa Meshezabel rụzikwara mgbidi n’akụkụ ha. Zedọk nwa Beana rụziri mgbidi n’akụkụ ha. 5 Ndị Tekoa+ rụzikwara mgbidi n’akụkụ ha. Ma ndị a ma ama n’ime ha ewedaghị onwe ha ala rụọrọ ndị nna ha ukwu ọrụ.

6 Joyada nwa Pasia na Meshọlam nwa Besodaya rụziri Ọnụ Ụzọ Ámá Obodo Ochie.+ Ha tinyere ya osisi, tinye ibo ụzọ ya, ihe e ji akpọchi ha, na ihe e ji atụchi ha. 7 Melataya onye Gibiọn+ na Jedọn onye Merọnọt rụziri mgbidi n’akụkụ ha. Ha bụ ndị Gibiọn na ndị Mizpa,+ ndị nọ n’okpuru gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis.*+ 8 Ọziel nwa Hahaya, otu n’ime ndị na-eji ọlaedo akpụ ihe, rụziri mgbidi n’akụkụ ha. Hananaya, onye so ná ndị na-esi mmanụ otite,* rụziri mgbidi n’akụkụ ya. Ha dokwara mbadamba nkume n’okporo ụzọ Jeruselem ruo ná Mgbidi Sara Mbara.+ 9 Refeya nwa Họọ, onyeisi ọkara ógbè Jeruselem, rụziri mgbidi n’akụkụ ha. 10 Jedeya nwa Harumaf rụziri mgbidi n’akụkụ ha n’ihu ụlọ ya. Hatọsh nwa Hashabnaya rụziri mgbidi n’akụkụ ya.

11 Malkaịja nwa Herim+ na Hashọb nwa Pehat-moab+ rụziri mpaghara ọzọ,* nakwa Ụlọ Nche Ekwú.+ 12 Shalọm nwa Halohesh, onyeisi ọkara ógbè Jeruselem, rụziri mgbidi n’akụkụ ha, ya na ụmụ ya ndị nwaanyị.

13 Henọn na ndị bi na Zanoa+ rụziri Ọnụ Ụzọ Ámá Ndagwurugwu.+ Ha rụrụ ya, tinye ibo ụzọ ya, ihe e ji akpọchi ha, na ihe e ji atụchi ha. Ha rụzikwara ebe dị otu puku (1,000) kubit* ná mgbidi ya ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ikpo Ntụ.+ 14 Malkaịja nwa Rikab, onyeisi ógbè Bet-hakirem,+ rụziri Ọnụ Ụzọ Ámá Ikpo Ntụ. Ọ rụrụ ya, tinye ibo ụzọ ya, ihe e ji akpọchi ha, na ihe e ji atụchi ha.

15 Shalọn nwa Kọlhoze, onyeisi ógbè Mizpa,+ rụziri Ọnụ Ụzọ Ámá Iyi.+ Ọ rụrụ ya, kụchie elu ya, tinye ibo ụzọ ya, ihe e ji akpọchi ha, na ihe e ji atụchi ha. Ọ rụkwara mgbidi Ọdọ Mmiri+ nke Ọwa Mmiri dị n’akụkụ Ubi Eze+ ruo na Steepụ+ nke si n’Obodo Devid+ gbadaa.

16 Onye sochiri ya bụ Nehemaya nwa Azbọk, onyeisi ọkara ógbè Bet-zọọ.+ Ọ rụziri mgbidi malite n’ihu Ebe E Liri Devid*+ ruo n’ọdọ mmiri+ a rụrụ arụ, ruokwa n’Ụlọ Ndị Dike.

17 Ndị sochiri ya bụ ndị Livaị ndị rụziri mgbidi: Rihọm nwa Benaị; Hashabaya, onyeisi ọkara ógbè Kaịla,+ rụziri mgbidi n’akụkụ ya. Ọ rụchiteere ógbè ya ọrụ. 18 Ndị sochiri ya bụ ụmụnne ha ndị nwoke ndị rụziri mgbidi: Bavaị nwa Henadad, onyeisi ọkara ógbè Kaịla.

19 Iza nwa Jeshụa,+ onyeisi Mizpa, nọ na-arụzi mpaghara ọzọ n’akụkụ ya, n’ihu ebe e si agbago n’Ụlọ Ngwá Agha nke dị n’Idé Ji Mgbidi.+

20 Onye sochiri ya bụ Barọk nwa Zabaị.+ Ọ rụsiri ọrụ ike ma rụzie mpaghara ọzọ, malite n’Idé Ji Mgbidi ruo n’ọnụ ụzọ ụlọ Elayashib,+ nnukwu onye nchụàjà.

21 Onye sochiri ya bụ Meremọt+ nwa Yuraịja nwa Hakọz. Ọ rụziri mpaghara ọzọ, malite n’ọnụ ụzọ ụlọ Elayashib ruo n’ebe ụlọ Elayashib kwụsịrị.

22 Ndị sochiri ya bụ ndị nchụàjà, ndị si ná mpaghara Osimiri Jọdan.*+ Ha rụziri mgbidi. 23 Ndị sochiri ha bụ Benjamin na Hashọb. Ha rụziri mgbidi n’ihu ụlọ ha. Onye sochiri ha bụ Azaraya nwa Measaya nwa Ananaya. Ọ rụziri mgbidi n’ebe dị nso n’ụlọ ya. 24 Onye sochiri ya bụ Binuai nwa Henadad. Ọ rụziri mpaghara ọzọ, malite n’ụlọ Azaraya ruo n’Idé Ji Mgbidi,+ ruokwa n’ebe mgbidi a na mgbidi ọzọ sụkọtara isi.

25 Onye sochiri ya bụ Pelal nwa Yuzaị. Ọ rụrụ ọrụ n’ihu Idé Ji Mgbidi na ụlọ elu nke sepụtara isi n’Ụlọ Eze,*+ nke dị ná mgbago n’Ogige Ndị Nche.+ Onye sochiri ya bụ Pedaya nwa Perọsh.+

26 Ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,*+ bụ́ ndị bi n’Ofel,+ rụziri mgbidi ruo n’ihu Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri+ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa ụlọ elu nke sepụtara isi ná mgbidi.

27 Ndị sochiri ha bụ ndị Tekoa.+ Ha rụziri mpaghara ọzọ malite n’ihu nnukwu ụlọ elu ahụ sepụtara isi ruo ná mgbidi Ofel.

28 Ndị nchụàjà rụziri mgbidi n’elu Ọnụ Ụzọ Ámá Ịnyịnya,+ onye ọ bụla n’ihu ụlọ ya.

29 Onye sochiri ha bụ Zedọk+ nwa Ịma. Ọ rụziri mgbidi n’ihu ụlọ ya.

Onye sochiri ya bụ Shemaya nwa Shekanaya, onye na-eche nche n’Ọnụ Ụzọ Ámá Dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ.+ Ọ rụziri mgbidi.

30 Ndị sochiri ya bụ Hananaya nwa Shelemaya na Henọn nwa nwoke nke isii Zelaf mụrụ. Ha rụziri mpaghara ọzọ.

Onye sochiri ya bụ Meshọlam+ nwa Berekaya. Ọ rụziri mgbidi n’ihu ụlọ* nke ya.

31 Onye sochiri ya bụ Malkaịja, onye so ná ndị na-eji ọlaedo akpụ ihe. Ọ rụziri mgbidi ruo n’ụlọ ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ*+ na ndị ahịa, n’ihu Ọnụ Ụzọ Ámá Nnyocha, ruokwa n’ọnụ ụlọ dị n’elu ebe mgbidi a na mgbidi ọzọ sụkọtara isi.

32 Ndị na-eji ọlaedo akpụ ihe na ndị ahịa rụzikwara mgbidi n’agbata ọnụ ụlọ dị n’elu ebe mgbidi a na mgbidi ọzọ sụkọtara isi na Ọnụ Ụzọ Ámá Atụrụ.+

4 Ozugbo Sanbalat+ nụrụ na anyị na-arụghachi mgbidi ahụ, iwe were ya, ọnụma jukwara ya obi. O wee jiri ndị Juu na-eme ihe ọchị. 2 O kwuru n’ihu ụmụnne ya na ndị agha Sameria, sị: “Gịnị ka ndị Juu a na-enweghị ume na-eme? Hà ga-arụ ihe a n’onwe ha? Hà ga-achụ àjà? Hà ga-arụcha ya n’otu ụbọchị? Hà ga-esili n’ikpo ntụ ahụ nweta nkume ndị dị mma?”+

3 Tobaya+ onye Amọn,+ onye guzo n’akụkụ ya, wee sị: “Nkịta ọhịa nwedịrị ike ịkwatu mgbidi ahụ ha ji nkume na-arụ ma ọ magoro n’elu ya.”

4 M wee kpee ekpere, sị: “Chineke anyị, nụrụ, n’ihi na a na-elelị anyị.+ Mee ka ha taa ahụhụ maka mkparị ha na-akparị anyị,+ meekwa ka ha dị ka ihe a kwatara n’agha, ka a dọrọkwa ha n’agha laa mba ọzọ. 5 Ekpuchikwala ihe ọjọọ ha mere ma ọ bụ kwe ka e hichapụ mmehie ha n’ihu gị+ n’ihi na ha akparịala ndị na-arụ mgbidi a.”

6 Anyị wee na-arụ mgbidi ahụ, rụzuo ya gburugburu, rụruokwa ya ọkara otú ọ ga-aha n’ịdị elu. Ndị obodo anyị jikwa obi ha na-arụ ọrụ ahụ.

7 Ozugbo Sanbalat, Tobaya,+ ndị Arebia,+ ndị Amọn, na ndị Ashdọd+ nụrụ na mgbidi Jeruselem anyị na-arụzi na-aga n’ihu nakwa na e mechiwela ebe ndị ghere oghe na ya, ezigbo iwe were ha. 8 Ha wee gbaa izu ka ha bịa lụso Jeruselem agha ma kpata ọgba aghara na ya. 9 Ma anyị kpere ekpere rịọ Chineke anyị ka o nyere anyị aka, dowekwa ndị nche ka ha na-eche nche ehihie na abalị ka ha ghara ime anyị ihe ọ bụla.

10 Ma, ndị Juda nọ na-asị: “Ike agwụla ndị ọrụ,* ihe ndị a ga-ekpofu ekpofu karịkwara akarị. Anyị agaghị arụchali mgbidi a.”

11 Ndị iro anyị nọ na-asị: “Ha agaghị amata, ha agaghịkwa ahụ anyị ruo mgbe anyị batara n’etiti ha gbuo ha ma kwụsị ọrụ ahụ.”

12 Mgbe ọ bụla ndị Juu bi ha nso batara, ha na-agwa anyị ugboro ugboro,* sị: “Ha ga-esi n’ebe dị iche iche lụso anyị agha.”

13 M wee dowe ụmụ nwoke n’azụ mgbidi ahụ, n’ebe ndị kacha ala ndị iro nwere ike isi bata. M dowere ha n’ebe ahụ n’ezinụlọ n’ezinụlọ, ha jikwa mma agha ha, ube ha, na ụta ha. 14 Mgbe m hụrụ na ụjọ na-atụ ha, m biliri ozugbo gwa ndị a ma ama+ na ndị osote onye na-achị achị na ndị ọzọ niile, sị: “Unu atụla ha egwu.+ Chetanụ Jehova, bụ́ onye ukwu na onye e kwesịrị ịtụ egwu.+ Lụọrọnụ ụmụnne unu ọgụ, ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwaanyị, ndị nwunye unu na ụlọ unu.”

15 Mgbe ndị iro anyị nụrụ na anyị amatala ihe ha na-eme nakwa na ezi Chineke aghasaala ihe ha gbara izu ime anyị, anyị niile gaghachiri ná mgbidi ahụ maliteghachi ọrụ. 16 Malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu, ọkara n’ụmụ nwoke m na-arụ ọrụ,+ ọkara nke ọzọ ejiri ube, ọta, na ụta, yirikwa uwe agha. Ndị isi+ na-akwadokwa ụlọ Juda niile,* 17 bụ́ ndị na-arụ mgbidi ahụ. Ndị na-ebu ihe ji otu aka na-arụ ọrụ ma jiri aka nke ọzọ jide ngwá agha. 18 Onye ọ bụla n’ime ndị na-arụ mgbidi ahụ kere mma agha n’úkwù na-arụ ọrụ. Onye ga-afụ opi+ kwụkwa m n’akụkụ.

19 M wee gwa ndị a ma ama na ndị osote onye na-achị achị na ndị ọzọ niile, sị: “Ọrụ a buru ezigbo ibu, anyị nọkwa ibe anyị n’ebe dị anya ná mgbidi a. 20 Mgbe unu nụrụ ụda opi, zukọtanụ n’ebe anyị nọ. Chineke anyị ga-alụrụ anyị agha.”+

21 Anyị wee na-arụ ọrụ. Ma ọkara ndị nke ọzọ ji ube, malite mgbe chi bọrọ ruo mgbe kpakpando pụtara. 22 N’oge ahụ, m gwara ndị obodo anyị, sị: “Ka nwoke ọ bụla na onye na-ejere ya ozi nọbọọ chi n’ime Jeruselem. Ha ga-eche anyị nche n’abalị ma rụọ ọrụ mgbe chi bọrọ.” 23 N’ihi ya, mụ na ụmụnne m, ndị na-ejere m ozi,+ na ndị na-eche nche, bụ́ ndị na-eso m, eyipụghị uwe anyị. Onye ọ bụla n’ime anyị jikwa ngwá agha ya n’aka nri.

5 Ma, ndị obodo anyị na ndị nwunye ha besiwere ákwá ike n’ihi ihe ụmụnne ha ndị Juu na-eme ha.+ 2 Ụfọdụ nọ na-asị: “Anyị na ụmụ anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị dị ọtụtụ. Anyị ga-enwetarịrị ọka* anyị ga-eri ka anyị wee dịrị ndụ.” 3 Ndị ọzọ nọ na-asị: “Anyị na-enye ugbo anyị na ubi vaịn anyị na ụlọ anyị ka ha bụrụ ihe ibé ka anyị nwee ike inweta ọka* n’oge ụkọ nri.” 4 Ndị ọzọ nọkwa na-asị: “Anyị ejirila ugbo anyị na ubi vaịn anyị gbaziri ego anyị ji tụọ ụtụ eze.+ 5 Anyị na ụmụnne anyị bụ otu anụ ahụ́ na otu ọbara, ụmụ anyị dịkwa ka ụmụ ha. N’agbanyeghị ya, anyị na-eme ka ụmụ anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị bụrụ ndị ohu. Ụfọdụ ụmụ anyị ndị nwaanyị abụrụdịla ndị ohu.+ Ma, e nweghị ihe anyị ga-emeli n’ihi na ugbo anyị na ubi vaịn anyị bụzi nke ndị ọzọ.”

6 Mgbe m nụrụ ákwá a ha na-ebe na ihe ndị a ha kwuru, ezigbo iwe were m. 7 M wee chebara ihe ndị a echiche ma baara ndị a ma ama na ndị osote onye na-achị achị mba, sị ha: “Onye ọ bụla n’ime unu na-anara nwanne ya ọmụrụ nwa.”+

M kpọkọkwara ndị mmadụ ka e nwee nnukwu nzukọ n’ihi ha. 8 M wee sị ha: “Anyị ejisiela ike gbapụta ụmụnne anyị ndị Juu e resịrị ndị mba ọzọ. Ma ùnu ga-erezi ụmụnne unu?+ Ànyị ga-azụrụzi ha n’aka unu?” Ha amaghị ihe ha ga-ekwu, o nyeghịkwa ha ọnụ okwu. 9 M sịziri: “Ihe unu na-eme adịghị mma. Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị ịtụ egwu Chineke* anyị,+ ka ndị mba ọzọ, bụ́ ndị iro anyị, ghara ịkọcha anyị? 10 Mụ na ụmụnne m na ndị na-ejere m ozi na-agbazinyekwa ha ego na ọka* n’anaghị ha ọmụrụ nwa. Biko, ka anyị kwụsịnụ ịnara ha ọmụrụ nwa ma anyị gbazinye ha ihe.+ 11 Biko, nyeghachinụ ha taa ugbo ha,+ ubi vaịn ha, ubi oliv ha, na ụlọ ha. Nyeghachikwanụ ha ọmụrụ nwa* unu naara ha maka ego, ọka,* mmanya ọhụrụ, na mmanụ unu gbazinyere ha.”

12 Ha wee sị: “Anyị ga-enyeghachi ha ihe a niile, anyị agaghịkwa ana ha ihe ọ bụla. Anyị ga-eme nnọọ ihe i kwuru.” M wee kpọọ ndị nchụàjà ma mee ka ụmụ nwoke ndị ahụ ṅụọ iyi na ha ga-emezu nkwa a ha kwere. 13 M fechakwara uwe m* wee sị: “Ka ezi Chineke si otú a fechapụ onye ọ bụla na-emezughị nkwa a n’ụlọ ya nakwa n’ihe o nwere. Ka e sikwa otú a fechapụ ya ma mee ka ọ gbara aka.” Ọgbakọ ahụ niile wee sị: “Amen!”* Ha wee too Jehova, mmadụ niile mezukwara nkwa ha kwere.

14 Malite n’ụbọchị eze mere m gọvanọ ha+ na Juda, malite n’afọ nke iri abụọ+ ruo n’afọ nke iri atọ na abụọ+ n’ọchịchị Eze Atazaksis,+ ya bụ, afọ iri na abụọ, mụ na ụmụnne m erighị nri e kwesịrị ịna-enye gọvanọ.+ 15 Ma ndị bụ́ gọvanọ tupu mụnwa boro ndị obodo anyị ibu arọ. Ha na-anara ha shekel* ọlaọcha iri anọ kwa ụbọchị maka nri na mmanya. Ndị na-ejere ha ozi megbukwara ndị obodo anyị. Ma emeghị m otú ahụ+ n’ihi na m na-atụ egwu Chineke.+

16 M sokwa na-arụ mgbidi a, e nweghịkwa ala anyị nwetaara onwe anyị.+ Ndị niile na-ejere m ozi zukọtakwara n’ebe ahụ maka ọrụ ahụ. 17 Ndị Juu na ndị osote onye na-achị achị bụ́ ndị na-eri ihe na tebụl m dị otu narị na iri ise (150), ha na ndị ọzọ si mba ọzọ. 18 Kwa ụbọchị, a na-akwadebere m* otu oké ehi, atụrụ isii kacha mma, na nnụnụ. Otu ugboro n’ụbọchị iri, a na-ebutekwara m ụdị mmanya dị iche iche n’ụba. N’agbanyeghị ihe a niile, agwaghị m ndị obodo anyị ka ha nye m nri e kwesịrị ịna-enye gọvanọ n’ihi na ibu ha bu karịrị akarị. 19 Chineke m, biko, cheta m ma gọzie m n’ihi ihe niile m meere ndị a.+

6 Ozugbo a kọọrọ Sanbalat, Tobaya,+ Gishem onye Arebia,+ na ndị iro anyị ndị ọzọ na m rụghachila mgbidi ahụ+ nakwa na e nweghịzi oghere ọ bụla na ya (ọ bụ eziokwu na etinyebeghị m ibo ụzọ n’ọnụ ụzọ ámá ya dị iche iche n’oge ahụ),+ 2 Sanbalat na Gishem ziteere m ozi a ozugbo: “Bịa ka anyị yie oge anyị ga-ahụ n’otu n’ime obodo nta ndị dị na Ndagwurugwu Ono.”+ Ma ha nọ na-akpa nkata imerụ m ahụ́. 3 M wee zigara ha ndị ozi, sị: “Eji m nnukwu ọrụ n’aka. Agaghị m agbadatali. Gịnị mere m ga-eji kwụsị ọrụ a bịakwutewe unu?” 4 Ha ziteere m otu ozi a ugboro anọ, ma m zakwara otu ihe ahụ na ha niile.

5 Sanbalat ziteziiri m onye na-ejere ya ozi, kwuo otu ihe ahụ nke ugboro ise. Onye ozi ahụ jikwa akwụkwọ ozi a na-emechighị emechi. 6 E dere na ya, sị: “A nụla ya ná mba niile, Gishem+ na-ekwukwa ya, na gị na ndị Juu na-akpa nkata inupụ isi.+ Ọ bụ ya mere i ji na-arụ mgbidi ahụ. Ihe a niile a na-ekwu gosiri na ị chọrọ ịbụrụ ha eze. 7 Ị họpụtakwala ndị amụma ka ha kọsaa banyere gị na Jeruselem niile, sị, ‘E nweela eze na Juda!’ Eze ga-anụ ihe ndị a. N’ihi ya, bịa ka anyị kpaa ihe a.”

8 Ma, ozi m zigaara ya bụ: “Ihe niile a ị na-ekwu enweghị nke mere eme. Ọ bụ gịnwa na-echepụta ha.”* 9 Ha niile na-agba mbọ ka ha menye anyị ụjọ, na-asị: “Ike ga-agwụ ha n’ọrụ ahụ, ha aghara ịrụcha ya.”+ Ma, m na-arịọ Chineke ka o mee ka obi sie m ike.*+

10 M wee gaa n’ụlọ Shemaya nwa Deleya nwa Mehetabel mgbe ọ na-ekweghị apụta èzí. Ọ sịrị: “Ka anyị yie oge anyị ga-aga n’ụlọ ezi Chineke, n’ime ụlọ nsọ, ka anyị mechiekwa ọnụ ụzọ ụlọ nsọ, n’ihi na ha na-abịa igbu gị. Ha na-abịa igbu gị n’abalị.” 11 Ma m sịrị: “Nwoke dị ka m ò kwesịrị ịgba ọsọ? Onye dị ka m ọ̀ ga-abanye n’ụlọ nsọ, a ghara igbu ya?+ Agaghị m abanye.” 12 M wee ghọta na ọ bụghị Chineke zitere onye amụma a, kama ọ bụ Tobaya na Sanbalat+ goro ya ka o duhie m. 13 Ha goro ya ka o menye m ụjọ ma mee ka m mehie, ka ha nweta ihe ha ga-eji mebie aha m ma kọchaa m.

14 Chineke m, biko, cheta Tobaya+ na Sanbalat na ihe ndị a ha mere. Chetakwa Noadaya, onye amụma nwaanyị, na ndị amụma ndị ọzọ nọ na-agba mbọ imenye m ụjọ.

15 E wee rụchaa mgbidi ahụ n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Ilọl,* n’ime ụbọchị iri ise na abụọ.

16 Ozugbo ndị iro anyị niile nụrụ ya, mba niile gbara anyị gburugburu ahụkwa ya, ezigbo ihere mere ha.*+ Ha ghọtakwara na ọ bụ Chineke anyị nyeere anyị aka ịrụcha ọrụ a. 17 N’ụbọchị ndị ahụ, ndị a ma ama+ na Juda nọ na-ezigara Tobaya ọtụtụ akwụkwọ ozi, Tobaya ana-azaghachikwa ha. 18 Ọtụtụ ndị bi na Juda ṅụrụ iyi na ha ga na-akwado ya n’ihi na ọ bụ ya lụrụ nwa Shekanaya nwa Era.+ Jehohenan nwa ya nwoke lụkwara nwa Meshọlam+ nwa Berekaya. 19 Ha na-akọkwara m akụkọ ọma banyere ya mgbe niile, na-agwakwa ya ihe m kwuru. Tobaya na-eziteziri m akwụkwọ ozi ka o menye m ụjọ.+

7 Ozugbo a rụghachiri mgbidi ahụ,+ m tinyere ibo ụzọ ya niile.+ M wee họpụta ndị ga na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá,+ ndị na-abụ abụ,+ na ndị Livaị.+ 2 M họpụtaziri Hanenaị+ nwanne m ka o lekọtawa Jeruselem, ya na Hananaya onyeisi Ebe A Rụsiri Ike,+ n’ihi na Hananaya bụ nwoke a kacha tụkwasị obi. Ọ na-atụkwa egwu ezi Chineke+ karịa ọtụtụ ndị ọzọ. 3 M wee sị ha: “A gaghị emeghe ọnụ ụzọ ámá Jeruselem ruo mgbe anyanwụ chasiwara ike. Mgbe ndị nche ka guzo na-eche nche, ha ga-emechi ọnụ ụzọ niile ma kpọchie ha. Kenyekwanụ ndị bi na Jeruselem ebe ha ga na-eche nche, ka ụfọdụ na-eche nche n’ebe e kenyere ha, ụfọdụ ana-eche nche n’ihu ụlọ ha.” 4 Jeruselem buru ibu. Ala ya sara mbara, ndị bi n’ime ya dịkwa ole na ole.+ A rụghachibeghị ụlọ ndị dị na ya.

5 Ma Chineke m tinyere n’obi m ka m kpọkọta ndị a ma ama na ndị osote onye na-achị achị na mmadụ niile ka ha deba aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ M wee hụ akwụkwọ e debara aha ndị bu ụzọ lọta n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ihe a bụ ihe m hụrụ e dere na ya:

6 Ndị a bụ ndị Juu si n’ógbè* ahụ, ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, ya bụ, ndị Eze Nebukadneza+ nke Babịlọn dọọrọ n’agha.+ Ha mechara lọta Jeruselem na Juda, onye nke ọ bụla alaa n’obodo nke ya.+ 7 Ha so Zerubabel,+ Jeshụa,+ Nehemaya, Azaraya, Ramaya, Nehamanaị, Mọdekaị, Bilshan, Misperet, Bigvaị, Nihọm, na Beana lọta.

Ihe a bụ ole ụmụ nwoke Izrel ahụ dị:+ 8 ụmụ Perọsh dị puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172); 9 ụmụ Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372); 10 ụmụ Era,+ narị isii na iri ise na abụọ (652); 11 ụmụ Pehat-moab,+ ndị bụ́ ụmụ Jeshụa na Joab,+ puku abụọ, narị asatọ na iri na asatọ (2,818); 12 ụmụ Ịlam,+ otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254); 13 ụmụ Zatu, narị asatọ na iri anọ na ise (845); 14 ụmụ Zakaị, narị asaa na iri isii (760); 15 ụmụ Binuaị, narị isii na iri anọ na asatọ (648); 16 ụmụ Bibaị, narị isii na iri abụọ na asatọ (628); 17 ụmụ Azgad, puku abụọ, narị atọ na iri abụọ na abụọ (2,322); 18 ụmụ Adọnaịkam, narị isii na iri isii na asaa (667); 19 ụmụ Bigvaị, puku abụọ na iri isii na asaa (2,067); 20 ụmụ Edin, narị isii na iri ise na ise (655); 21 ụmụ Eta, ndị si n’ezinụlọ Hezekaya, iri itoolu na asatọ; 22 ụmụ Heshọm, narị atọ na iri abụọ na asatọ (328); 23 ụmụ Bizaị, narị atọ na iri abụọ na anọ (324); 24 ụmụ Herif, otu narị na iri na abụọ (112); 25 ụmụ Gibiọn,+ iri itoolu na ise; 26 ndị Betlehem na Netofa, otu narị na iri asatọ na asatọ (188); 27 ndị Anatọt,+ otu narị na iri abụọ na asatọ (128); 28 ndị Bet-azmavet, iri anọ na abụọ; 29 ndị Kiriat-jierim,+ Kefaịra, na Bierọt,+ narị asaa na iri anọ na atọ (743); 30 ndị Rema na Giba,+ narị isii na iri abụọ na otu (621); 31 ndị Mikmas,+ otu narị na iri abụọ na abụọ (122); 32 ndị Betel+ na E-aị,+ otu narị na iri abụọ na atọ (123); 33 ndị Nibo nke ọzọ, iri ise na abụọ; 34 ụmụ Ịlam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254); 35 ụmụ Herim, narị atọ na iri abụọ (320); 36 ụmụ Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise (345); 37 ụmụ Lọd, Hedid, na Ono,+ narị asaa na iri abụọ na otu (721); 38 ụmụ Senea, puku atọ, narị itoolu na iri atọ (3,930).

39 Ndị nchụàjà:+ ụmụ Jedeya ndị si n’ezinụlọ Jeshụa, narị itoolu na iri asaa na atọ (973); 40 ụmụ Ịma, otu puku na iri ise na abụọ (1,052); 41 ụmụ Pash-họ,+ otu puku, narị abụọ na iri anọ na asaa (1,247); 42 ụmụ Herim,+ otu puku na iri na asaa (1,017).

43 Ndị Livaị:+ ụmụ Jeshụa, ndị si n’ezinụlọ Kadmiel,+ bụ́ ụmụ Hodeva, iri asaa na anọ. 44 Ndị na-abụ abụ:+ ụmụ Esaf,+ otu narị na iri anọ na asatọ (148). 45 Ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá:+ ụmụ Shalọm, ụmụ Eta, ụmụ Talmọn, ụmụ Akọb,+ ụmụ Hataịta, ụmụ Shobaị, otu narị na iri atọ na asatọ (138).

46 Ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ:*+ ụmụ Zaịha, ụmụ Hasufa, ụmụ Tabeọt, 47 ụmụ Kirọs, ụmụ Saya, ụmụ Pedọn, 48 ụmụ Lebena, ụmụ Hagaba, ụmụ Salmaị, 49 ụmụ Henan, ụmụ Gidel, ụmụ Geha, 50 ụmụ Reeya, ụmụ Rizin, ụmụ Nekoda, 51 ụmụ Gazam, ụmụ Ọza, ụmụ Pasia, 52 ụmụ Bisaị, ụmụ Meyunim, ụmụ Nefọshesim, 53 ụmụ Bakbọk, ụmụ Hakufa, ụmụ Hahọ, 54 ụmụ Bazlit, ụmụ Mehaịda, ụmụ Hasha, 55 ụmụ Bakọs, ụmụ Sisera, ụmụ Tima, 56 ụmụ Nezaya, ụmụ Hataịfa.

57 Ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi:+ ụmụ Sotaị, ụmụ Sofiret, ụmụ Peraịda, 58 ụmụ Jeala, ụmụ Dakọn, ụmụ Gidel, 59 ụmụ Shefataya, ụmụ Hatil, ụmụ Pokeret-hazebem, ụmụ Emọn. 60 Ndị niile na-eje ozi n’ụlọ nsọ*+ na ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi dị narị atọ na iri itoolu na abụọ (392).

61 Ndị a bụ ndị si Tel-mila, Tel-hasha, Kirọb, Adọn, na Ịma lọta. Ma ha enweghị ihe ha ga-eji gosi ezinụlọ bụ́ ezinụlọ nna ha nakwa ebe ha si, ka a mata ma hà bụkwa ndị Izrel:+ 62 ụmụ Deleya, ụmụ Tobaya, ụmụ Nekoda, narị isii na iri anọ na abụọ (642). 63 Ndị a bụ ndị si n’ezinụlọ ndị nchụàjà: ụmụ Habaya, ụmụ Hakọz,+ ụmụ Bazilaị, onye lụrụ otu n’ime ụmụ ndị nwaanyị Bazilaị+ onye Gilied ma zawa aha ya.* 64 Ha chọrọ akwụkwọ e dere aha ndị ezinụlọ ha, ma ha ahụghị aha ha. N’ihi ya, e kwuru na ha erughị eru ịbụ ndị nchụàjà.*+ 65 Gọvanọ*+ gwara ha ka ha ghara iso na-eri ihe ndị kacha nsọ+ ruo mgbe a ga-enwe onye nchụàjà nke ga-eji Yurim na Tọmịm*+ jụta Chineke ase.

66 Ọgbakọ ahụ niile dị puku mmadụ iri anọ na abụọ, narị atọ na iri isii (42,360),+ 67 e wepụ ndị ohu ha ndị nwoke na ndị nwaanyị,+ ndị dị puku asaa, narị atọ na iri atọ na asaa (7,337). Ha nwekwara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-abụ abụ.+ Ha dị narị abụọ na iri anọ na ise (245). 68 Ịnyịnya ha dị narị asaa na iri atọ na isii (736), nnukwu jakị* ha adịrị narị abụọ na iri anọ na ise (245). 69 Kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise (435), obere jakị ha adịrị puku isii, narị asaa na iri abụọ (6,720).

70 Ụfọdụ ndị isi ọnụmara ha dị iche iche nyere onyinye maka ọrụ ahụ.+ Gọvanọ* nyere otu puku (1,000) mkpụrụ ego drakma ọlaedo* a ga-etinye n’ebe a na-edosa akụ̀, efere iri ise, na uwe mwụda ndị nchụàjà+ dị narị ise na iri atọ (530). 71 Ụfọdụ ndị isi ọnụmara ha dị iche iche nyekwara puku mkpụrụ ego drakma ọlaedo iri abụọ (20,000) na puku maịna* ọlaọcha abụọ na narị abụọ (2,200) a ga-etinye n’ebe a na-edosa akụ̀. 72 Ndị ọzọ nyere puku mkpụrụ ego drakma ọlaedo iri abụọ (20,000), puku maịna ọlaọcha abụọ (2,000), na uwe mwụda ndị nchụàjà dị iri isii na asaa.

73 Ndị nchụàjà, ndị Livaị, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ndị na-abụ abụ,+ ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,* na ndị Izrel ndị ọzọ wee biri n’obodo ha dị iche iche.+ N’ọnwa nke asaa,+ ndị Izrel ebirila n’obodo ha dị iche iche.+

8 Mmadụ niile wee jiri otu obi zukọta n’ámá dị n’ihu Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri.+ Ha gwara Ezra+ bụ́ odeakwụkwọ* ka o weta akwụkwọ Iwu Mosis,+ bụ́ iwu Jehova nyere Izrel.+ 2 Ezra onye nchụàjà wee weta Iwu ahụ n’ebe ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ndị niile nwere ike ige ntị ma ghọta ihe gbakọtara,+ n’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa.+ 3 O wee nọrọ n’ámá dị n’ihu Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri gụpụta ya+ n’ihu ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ndị niile nwere ike ịghọta ihe, malite n’ụtụtụ ruo n’etiti ehihie. Mmadụ niile gere ntị nke ọma+ n’ihe a na-agụpụta n’akwụkwọ Iwu ahụ. 4 Ezra bụ́ odeakwụkwọ* guzo n’ihe dị elu e ji osisi rụọ maka nnọkọ a. Matitaya, Shima, Anaya, Yuraya, Hilkaya, na Measaya guzo n’aka nri ya. Pedaya, Mishel, Malkaịja,+ Heshọm, Hash-badana, Zekaraya, na Meshọlam guzo n’aka ekpe ya.

5 Ezra meghere akwụkwọ ahụ, mmadụ niile ana-ahụ ya n’ihi na ebe o guzo dị elu karịa ebe mmadụ niile nọ. Mgbe o meghere ya, mmadụ niile biliri ọtọ. 6 Ezra wee too Jehova bụ́ ezi Chineke, onye bụ́ Onye ukwu. Mmadụ niile wee chịlie aka elu, sị, “Amen!* Amen!”+ Ha hulataziri kpọọrọ Jehova isiala. 7 Ndị Livaị bụ́ Jeshụa, Benaị, Sherebaya,+ Jemin, Akọb, Shabetaị, Hodaya, Measaya, Kelaịta, Azaraya, Jozabad,+ Henan, Peleya, nọ na-akọwara ndị mmadụ Iwu ahụ+ mgbe ndị mmadụ guzo ọtọ. 8 Ha wee na-agụpụta ihe dị n’akwụkwọ ahụ, ya bụ, ihe dị n’Iwu ezi Chineke. Ha nọ na-akọwa ya nke ọma, na-emekwa ka o doo anya. Ha wee nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe a na-agụpụta.+

9 Nehemaya, onye bụ́ gọvanọ* n’oge ahụ, Ezra,+ onye bụ́ onye nchụàjà na odeakwụkwọ,* nakwa ndị Livaị ndị nọ na-akụziri ndị mmadụ ihe wee gwa mmadụ niile, sị: “Taa bụ ụbọchị dị nsọ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu.+ Unu erula uju, unu ebekwala ákwá.” N’ihi na mmadụ niile nọ na-ebe ákwá mgbe ha nụrụ ihe dị n’Iwu ahụ. 10 Ọ sịrị ha: “Laanụ, rienụ ihe kacha mma,* ṅụọkwanụ mmanya na-atọ ụtọ, zigakwaranụ onye na-enweghị ihe ọ bụla nri.+ N’ihi na taa dị nsọ n’anya Onyenwe anyị, obi ajọkwala unu njọ n’ihi na ọṅụ Jehova bụ ebe unu a rụsiri ike.”* 11 Ndị Livaị nọkwa na-agụgụ mmadụ niile, na-asị ha: “Kwụsịnụ ibe ákwá n’ihi na taa dị nsọ, obi ajọkwala unu njọ.” 12 Mmadụ niile wee lawa ka ha gaa rie ihe, ṅụọ mmanya ma zigara ndị ọzọ nri. Ha ṅụrịkwara nnukwu ọṅụ+ n’ihi na ha ghọtara okwu ndị a kọwaara ha.+

13 N’ụbọchị nke abụọ, ndị isi ọnụmara dị iche iche, ndị nchụàjà, na ndị Livaị zukọtara n’ebe Ezra bụ́ odeakwụkwọ* nọ ka ha ghọtakwuo ihe dị n’Iwu* ahụ. 14 Ha wee chọpụta na e dere n’Iwu ahụ Jehova si n’aka Mosis nye ndị Izrel na ha ga-ebi n’ụlọ ndò n’oge ememme ha na-eme n’ọnwa nke asaa,+ 15 nakwa na ha ga-akọsa+ ma kwusaa n’obodo ha niile nakwa na Jeruselem niile, sị: “Gaanụ n’ebe bụ́ ugwu ugwu gbute akwụkwọ osisi oliv, akwụkwọ osisi paịn,* akwụkwọ osisi metụl* na igu nkwụ, nakwa akwụkwọ osisi ndị ọzọ nwere alaka a ga-eji rụọ ụlọ ndò, otú e dere ya.”

16 Ndị mmadụ gara gbute ihe ndị ahụ ka ha jiri ha rụọrọ onwe ha ụlọ ndò n’elu ụlọ ha, n’ogige ha, n’ogige dị n’ụlọ ezi Chineke,+ n’ámá Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri,+ nakwa n’ámá Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem.+ 17 Ọgbakọ ahụ niile, bụ́ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, wee rụọ ụlọ ndò ma biri n’ụlọ ndò ndị ahụ n’ihi na ndị Izrel emetụbeghị ememme a otú a malite n’oge Joshụa+ nwa Nọn ruo n’ụbọchị ahụ. Ha wee ṅụrịa nnukwu ọṅụ.+ 18 Kwa ụbọchị, a na-agụpụta ihe dị n’akwụkwọ Iwu ezi Chineke+ malite n’ụbọchị mbụ ruo n’ụbọchị ikpeazụ. Ha mere ememme ahụ ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, e nwere nzukọ pụrụ iche otú e kwuru ka a na-enwe.+

9 N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa a, ndị Izrel gbakọtara. Ha yiiri ákwà iru uju, wụkwasịkwa onwe ha ájá n’isi, na-ebu ọnụ.+ 2 Ndị bụ́ ụmụ afọ Izrel wee kwụsị iso ndị niile bụ́ ndị mba ọzọ emekọ ihe.+ Ha guzokwara ọtọ kwupụta mmehie ha na mmehie ndị nna nna ha.+ 3 Ha wee guzoro n’ebe ahụ ha guzo na-agụpụta akwụkwọ Iwu+ Jehova bụ́ Chineke ha ruo awa atọ. Ha nọkwa na-ekwupụta mmehie ha ma na-akpọrọ Jehova bụ́ Chineke ha isiala ruo awa atọ ọzọ.

4 Jeshụa, Benaị, Kadmiel, Shebanaya, Bọnaị, Sherebaya,+ Benaị, na Kenenaị guzooro ọtọ n’elu ihe dị elu ndị Livai na-eguzo ekwu okwu+ ma jiri oké olu kpọkuo Jehova bụ́ Chineke ha. 5 Ndị Livaị bụ́ Jeshụa, Kadmiel, Benaị, Hashabnaya, Sherebaya, Hodaya, Shebanaya, na Petahaya wee sị: “Bilienụ too Jehova bụ́ Chineke unu ruo mgbe ebighị ebi.*+ Chineke, ka ha tookwa aha gị dị ebube, nke karịrị ngọzi niile na otuto niile.

6 “Naanị gị bụ Jehova.+ Ọ bụ gị kere eluigwe, ya bụ, eluigwe niile na ndị mmụọ ozi niile,* ụwa na ihe niile dị na ya, oké osimiri na ihe niile dị n’ime ya. Ị na-echebe ha niile ndụ. Ndị mmụọ ozi niile na-akpọkwara gị isiala. 7 Ị bụ Jehova bụ́ ezi Chineke, onye họọrọ Ebram,+ kpọpụta ya n’obodo Ọọ+ nke ndị Kaldia ma gụọ ya Ebreham.+ 8 Ị chọpụtara na ọ tụkwasịrị gị obi,+ gị na ya wee gbaa ndụ na ị ga-enye ya ala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọraịt, ndị Perizaịt, ndị Jebus, na ndị Gegash, nakwa na ị ga-enye ụmụ* ya ala ndị ahụ.+ I mezuru nkwa gị n’ihi na ị bụ onye ezi omume.

9 “Ị hụrụ ahụhụ nna nna anyị hà tara n’Ijipt,+ ị nụkwara mkpu ákwá ha n’Oké Osimiri Uhie. 10 I wee mee ihe àmà dị iche iche, rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche iji mesie Fero na ndị niile na-ejere ya ozi nakwa ndị ala ya niile ike,+ n’ihi na ị ma na ha mekpara ndị gị ahụ́.+ I meere onwe gị aha nke dị ruo taa.+ 11 I kewara oké osimiri n’ihu ha, ha wee si n’ala nkịtị n’etiti oké osimiri gafee.+ Ị tụbakwara ndị na-achụ ha n’ala ala oké osimiri ka nkume a tụbara n’osimiri ifufe na-enugharị.+ 12 I ji ogidi ígwé ojii duo ha n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ duo ha n’abalị ka ọ na-enye ha ìhè n’ụzọ ha kwesịrị iso.+ 13 Ị gbadatara n’Ugwu Saịnaị+ wee si n’eluigwe gwa ha okwu+ ma mee ka ha mara ihe ndị dị mma i kpebiri, nyekwa ha iwu eziokwu,* ntụziaka dị mma nakwa iwu.+ 14 I mere ka ha mara Ụbọchị Izu Ike gị dị nsọ.+ I si n’aka Mosis ohu gị nye ha ntụziaka na iwu. 15 I sikwa n’eluigwe nye ha achịcha mgbe agụụ na-agụ ha.+ I mere ka mmiri si n’oké nkume gbapụta mgbe mmiri na-agụ ha.+ Ị gwakwara ha ka ha banye ma weghara ala ahụ ị ṅụrụ iyi* na ị ga-enye ha.

16 “Ma hanwa, bụ́ ndị nna nna anyị, buliri onwe ha elu+ ma mee isi ike,*+ ha egeghịkwa ntị n’iwu gị. 17 Ha ekweghị ege ntị,+ ha echetaghịkwa ọrụ ebube gị ndị ị rụụrụ ha. Kama, ha mere isi ike* ma họpụta onyeisi ka ha wee laghachi n’Ijipt gaa gbawakwa ohu.+ Ma ị bụ Chineke dị njikere ịgbaghara mmehie,* onye nwere ọmịiko* ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ na onye ịhụnanya ya* dị ukwuu.+ Ị hapụghịkwa ha.+ 18 Mgbe ha meere onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ ma na-asị, ‘Ihe a bụ Chi unu nke dupụtara unu n’Ijipt,’+ ha kpakwara àgwà ọjọọ ndị gosiri na ha ejighị gị kpọrọ ihe. 19 Ma ị hapụghị ha n’ala ịkpa n’ihi na ebere gị dị ukwuu.+ Ogidi ígwé ojii nke na-edu ha n’ụzọ esighị n’ebe ha nọ pụọ n’ehihie. Ogidi ọkụ ahapụghịkwa inye ha ìhè n’abalị n’ụzọ ha kwesịrị iso.+ 20 I nyere ha mmụọ gị* ka o mee ka ha mara ihe.+ I meghị ka mana gị kwụsị ịdara ha,+ i nyekwara ha mmiri mgbe mmiri na-agụ ha.+ 21 I nyere ha nri n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ.+ E nweghị ihe kọrọ ha. Uwe ha akaghị nká,+ ụkwụ ha azaghịkwa aza.

22 “I nyere ha alaeze dị iche iche na ndị dị iche iche, keere ha ala ndị ahụ ná mpaghara ná mpaghara.+ Ha wee weghara ala Saịhọn,+ ya bụ, ala eze Heshbọn,+ nakwa ala Ọg+ nke eze Beshan. 23 I mere ka ụmụ ha dị ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe.+ I wee kpọbata ha n’ala ahụ i kwere ndị nna nna ha nkwa na ha ga-abanye ma biri.+ 24 Ụmụ ha wee banye weghara ala ahụ.+ I meriiri ha ndị Kenan, bụ́ ndị bi n’ala ahụ.+ I nyefere ndị Kenan n’aka ha, ma ndị eze ha ma ndị ala ahụ, ka ha mee ha ihe masịrị ha. 25 Ha weghaara obodo ndị a rụsiri ike+ na ala na-eme nri.+ Ha weghakwaara ụlọ ndị ihe ọma dị iche iche jupụtara, olulu mmiri e gwuru egwu, ubi vaịn, ubi oliv,+ na ọtụtụ osisi na-amị mkpụrụ. Ha wee rie ihe, rijuo afọ, buo ibu ma nwee obi ụtọ n’ihi otú i si dị mma.

26 “Ma, ha nupụụrụ gị isi, meere gị isi ike+ ma leghara Iwu gị anya.* Ha gburu ndị amụma gị ndị dọrọ ha aka ná ntị ka ha laghachikwute gị. Ha kpakwara àgwà ọjọọ ndị gosiri na ha ejighị gị kpọrọ ihe.+ 27 N’ihi ya, i nyefere ha n’aka ndị iro ha,+ bụ́ ndị nọ na-emesi ha ike.+ Ma ha na-akpọku gị n’oge ha na-ata ahụhụ, gị anọrọ n’eluigwe nụ. Ị na-enye ha ndị ga-azọpụta ha n’aka ndị iro ha n’ihi ebere gị nke dị ukwuu.+

28 “Ma ozugbo ha nweere onwe ha, ha na-ebidokwa mewe ihe na-adịghị gị mma.+ Ị na-ahapụ ha ka ndị iro ha kpara ha aka, ha na-emegbukwa ha.*+ Ha na-alọghachi kpọkuo gị ka i nyere ha aka.+ Ị na-anọ n’eluigwe nụ ma napụta ha ugboro ugboro n’ihi ebere gị nke dị ukwuu.+ 29 N’agbanyeghị na ị na-adọ ha aka ná ntị ka i wee mee ka ha bidokwa idebe Iwu gị, ha buliri onwe ha elu ma jụ ige ntị n’iwu gị.+ Ha mebikwara ntụziaka i nyere ha, bụ́ nke na-eme ka onye na-edebe ya dị ndụ.+ Ma, ha nọ na-eme isi ike ma na-agba isi akwara,* ha ekweghịkwa ege ntị. 30 I nweere ha ndidi+ ruo ọtụtụ afọ, sikwa n’ọnụ ndị amụma gị i nyere mmụọ gị na-adọ ha aka ná ntị. Ma ha ekweghị ege ntị. N’ikpeazụ, i nyefere ha n’aka ndị bi n’ala ndị gbara ha gburugburu.+ 31 N’ihi ebere gị nke dị ukwuu, i kpochapụghị ha,+ ị hapụghịkwa ha n’ihi na ị bụ Chineke nwere ọmịiko* ma na-eme ebere.+

32 “Ugbu a, Chineke anyị, Onye ukwu na Chineke e kwesịrị ịtụ egwu, onye na-emebighị ọgbụgba ndụ ya, onye hụrụ ndị ya n’anya,+ echefula nsogbu niile bịaara anyị, ndị eze anyị, ndị isi anyị,+ ndị nchụàjà anyị,+ ndị amụma anyị,+ nna nna anyị hà, na ndị gị niile malite n’oge ndị eze Asiria+ ruo taa. 33 N’agbanyeghị ihe niile merela anyị, ị bụ onye ezi omume n’ihi na i mere ihe ziri ezi. Ma, ọ bụ anyịnwa mere ihe ọjọọ.+ 34 Ndị eze anyị, ndị isi anyị, ndị nchụàjà anyị, na nna nna anyị hà edebeghị Iwu gị. Ha egeghịkwa ntị ná ntụziaka gị ma ọ bụ n’aka ná ntị ị dọrọ ha.* 35 Mgbe ha nọ n’alaeze ha na-eri uru ọtụtụ ihe ọma i nyere ha, nọrọkwa n’ala sara mbara i nyere ha nke na-eme nri, ha efeghị gị,+ ha ahapụghịkwa omume ọjọọ ha. 36 Taa, anyị bụzi ndị ohu.+ N’eziokwu, anyị bụzi ndị ohu n’ala i nyere nna nna anyị hà ka ha rie mkpụrụ ya na ihe ọma ndị dị na ya. 37 Mmehie anyị emeela ka ọtụtụ ihe ala anyị na-emepụta na-alara ndị eze i mere ka ha chịwa anyị.+ Ha na-achị anyị* na anụ ụlọ anyị otú ha si chọọ. Anyị atagbuola onwe anyị n’ahụhụ.

38 “N’ihi ihe a niile, anyị na-ede ihe anyị kwekọrịtara ime+ n’akwụkwọ. Ndị isi anyị, ndị Livaị anyị, na ndị nchụàjà anyị na-abịanyekwa aka na ya.”+

10 Ndị bịanyere aka na ya+ bụ:

Nehemaya onye bụ́ gọvanọ,* nwa Hakalaya,

Na Zedekaya, 2 Seraya, Azaraya, Jeremaya, 3 Pash-họ, Amaraya, Malkaịja, 4 Hatọsh, Shebanaya, Malọk, 5 Herim,+ Meremọt, Obedaya, 6 Daniel,+ Ginetọn, Barọk, 7 Meshọlam, Abaịja, Mijamin, 8 Meazaya, Bilgaị, na Shemaya. Ha bụ ndị nchụàjà.

9 Ndị Livaị bịanyere aka na ya bụ: Jeshụa nwa Azanaya, Binuaị bụ́ otu n’ime ụmụ Henadad, Kadmiel,+ 10 na ụmụnne ha ndị nwoke bụ́ Shebanaya, Hodaya, Kelaịta, Peleya, Henan, 11 Maịka, Rihọb, Hashabaya, 12 Zakọ, Sherebaya,+ Shebanaya, 13 Hodaya, Benaị, na Benaịnu.

14 Ndị isi ndị bịanyere aka na ya bụ: Perọsh, Pehat-moab,+ Ịlam, Zatu, Benaị, 15 Bọnaị, Azgad, Bibaị, 16 Adọnaịja, Bigvaị, Edin, 17 Eta, Hezekaya, Azọ, 18 Hodaya, Heshọm, Bizaị, 19 Herif, Anatọt, Nibaị, 20 Magpiash, Meshọlam, Hiza, 21 Meshezabel, Zedọk, Jadua, 22 Pelataya, Henan, Anaya, 23 Hoshia, Hananaya, Hashọb, 24 Halohesh, Pilha, Shobek, 25 Rihọm, Hashabna, Measaya, 26 Ahaịja, Henan, Enan, 27 Malọk, Herim, na Beana.

28 Ndị ọzọ kwetakwara ihe ahụ e kpebiri. Ha bụ ndị nchụàjà, ndị Livaị, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ndị na-abụ abụ, ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,* ndị niile kwụsịrị iso ndị bi n’ala ndị a emekọ ihe ka ha wee na-edebe Iwu ezi Chineke,+ ha na ndị nwunye ha, ụmụ ha ndị nwoke, na ụmụ ha ndị nwaanyị, na ndị niile ọzọ ma ihe ma na-aghọta ihe.* 29 Ha so ụmụnne ha, bụ́ ndị a ma ama, ṅụọ iyi ka ihe ọjọọ mee ha ma ọ bụrụ na ha edebeghị Iwu Jehova Onyenwe anyị, bụ́ ezi Chineke, nke o si n’aka Mosis ohu ezi Chineke nye ndị Izrel nakwa ma ọ bụrụ na ha erubeghị isi n’iwu ya niile, n’ihe ndị o kpebiri, nakwa ná ntụziaka ya. 30 Anyị agaghị akpọnye ndị bi n’ala a ụmụ anyị ndị nwaanyị, anyị agaghịkwa alụtara ụmụ anyị ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị.+

31 Ọ bụrụ na ndị bi n’ala a ebute ngwá ahịa ha na ụdị ọka ọ bụla ka ha ree n’Ụbọchị Izu Ike, anyị agaghị azụ ha ihe ọ bụla n’Ụbọchị Izu Ike+ ma ọ bụ n’ụbọchị ọzọ dị nsọ.+ Anyị agaghị ewe ihe ubi n’afọ nke asaa,+ anyị ga-akagbukwa ụgwọ ọ bụla e ji anyị.+

32 Anyị kpebikwara na onye ọ bụla n’ime anyị ga na-enye otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu shekel* kwa afọ maka ozi a na-eje n’ụlọ* Chineke anyị,+ 33 maka achịcha a na-enye Chineke,+ maka àjà ọka a na-achụ mgbe niile,+ maka àjà a na-esu ọkụ mgbe niile n’Ụbọchị Izu Ike+ nakwa n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ maka oriri a na-eme n’oge a kara aka,+ maka ihe ndị dị nsọ, maka àjà mmehie+ e ji ekpuchiri Izrel mmehie, nakwa maka ọrụ niile a na-arụ n’ụlọ Chineke anyị.

34 Anyị fekwara nza ka a mata mgbe ezinụlọ nke ọ bụla ná ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ndị ọzọ ga na-ebute nkụ n’ụlọ Chineke anyị n’oge a kara aka, kwa afọ, ka e jiri ha na-esonye ọkụ n’ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke anyị otú e dere ya n’Iwu.*+ 35 Kwa afọ, anyị ga na-ewetakwa mkpụrụ mbụ kara aka ala anyị mepụtara nakwa mkpụrụ mbụ chara acha nke ụdị osisi ọ bụla mịrị n’ụlọ Jehova.+ 36 Anyị ga na-akpọtakwa ọkpara anyị ma na-eweta anụ e bu ụzọ mụọ n’anụ ụlọ anyị,+ otú e dere ya n’Iwu,* nakwa anụ e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi anyị na ìgwè ewu na atụrụ anyị. Anyị ga-eweta ha n’ụlọ Chineke anyị, nye ha ndị nchụàjà na-eje ozi n’ụlọ Chineke anyị.+ 37 Anyị ga-ebutekwara ndị nchụàjà ntụ ọka si ná mkpụrụ mbụ anyị,+ butekwa onyinye anyị, mkpụrụ ụdị osisi ọ bụla mịrị,+ mmanya ọhụrụ, na mmanụ+ n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe* n’ụlọ Chineke anyị,+ nyekwa ndị Livaị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ala anyị mepụtara+ n’ihi na ọ bụ ndị Livaị na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri n’ebe niile a na-akọ ugbo n’obodo anyị.

38 Onye nchụàjà, bụ́ nwa Erọn, na ndị Livaị ga-anọ mgbe ndị Livaị ga-anata otu ụzọ n’ụzọ iri. Ndị Livaị ga-ewepụtakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ụzọ n’ụzọ iri ha natara+ ma weta ha n’ụlọ Chineke anyị, n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe.* 39 N’ihi na ọ bụ n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe* ka ndị Izrel na ndị Livaị ga-eweta onyinye+ ọka,* mmanya ọhụrụ, na mmanụ.+ Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka arịa ndị e ji arụ ọrụ n’ebe nsọ dị, bụrụkwa ebe ndị nchụàjà ndị na-eje ozi, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, na ndị na-abụ abụ na-anọ. Anyị agaghị eleghara ụlọ Chineke anyị anya.+

11 Ọ bụ ndị isi ndị Izrel bi na Jeruselem.+ Ma ndị Izrel ndị ọzọ fere nza+ ka ha họpụta otu ezinụlọ n’ime ezinụlọ iri ọ bụla ga-ebi na Jeruselem bụ́ obodo nsọ, ezinụlọ itoolu ndị ọzọ ebiri n’obodo ndị ọzọ. 2 Ndị Izrel gọzikwara ndị niile wepụtara onwe ha ibi na Jeruselem.

3 Ndị a bụ ndị isi ógbè* Juda, bụ́ ndị bi na Jeruselem. (Ndị Izrel ndị ọzọ, ndị nchụàjà, ndị Livaị, ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,*+ na ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi+ bi n’obodo ndị ọzọ dị na Juda. Onye nke ọ bụla bi n’ala ya nke dị n’obodo ya.+

4 E nwekwara ụfọdụ ndị ebo Juda na ụfọdụ ndị ebo Benjamin bi na Jeruselem.) Ndị Juda bi na ya bụ Ataya nwa Ọzaya nwa Zekaraya nwa Amaraya nwa Shefataya nwa Mahalalel onye si n’ezinụlọ Pirez,+ 5 na Measaya nwa Barọk nwa Kọlhoze nwa Hazaya nwa Adaya nwa Joyarib nwa Zekaraya onye si n’ezinụlọ Shila. 6 Ụmụ nwoke niile Pirez mụrụ, bụ́ ndị bi na Jeruselem, dị narị anọ na iri isii na asatọ (468). Ha bụ ndị dike.

7 Ndị ebo Benjamin bụ: Salu+ nwa Meshọlam nwa Joed nwa Pedaya nwa Kolaya nwa Measaya nwa Itiel nwa Jesheya. 8 Ndị na-eso ya bụ Gabaị na Salaị. Ha dị narị ụmụ nwoke itoolu na iri abụọ na asatọ (928). 9 Joel nwa Zikraị bụ onye na-elekọta ha, Juda nwa Hasenua abụrụ onye nke abụọ na-elekọta obodo ahụ.

10 Ndị si n’ezinụlọ ndị nchụàjà bụ: Jedeya nwa Joyarib, Jekin,+ 11 Seraya nwa Hilkaya nwa Meshọlam nwa Zedọk nwa Mereyọt nwa Ahaịtọb,+ onyeisi n’ụlọ* ezi Chineke, 12 na ụmụnne ha ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ahụ, narị asatọ na iri abụọ na abụọ (822); nakwa Adaya nwa Jeroham nwa Pelalaya nwa Amzaị nwa Zekaraya nwa Pash-họ+ nwa Malkaịja, 13 na ụmụnne ya, ndị isi ọnụmara dị iche iche, narị abụọ na iri anọ na abụọ (242); na Amashsaị nwa Azarel nwa Azaị nwa Meshilemọt nwa Ịma, 14 na ụmụnne ha bụ́ ndị dike obi siri ike, otu narị na iri abụọ na asatọ (128). Onye na-elekọta ha bụ Zabdiel, onye si n’ezinụlọ a ma ama.

15 Ndị si n’ezinụlọ ndị Livaị bụ: Shemaya+ nwa Hashọb nwa Azraịkam nwa Hashabaya nwa Bọnaị, 16 na Shabetaị+ na Jozabad,+ bụ́ ndị so ná ndị isi ndị Livaị, ndị na-elekọta ọrụ ndị ọzọ gbasara ụlọ ezi Chineke ndị a na-anaghị anọ n’ime ụlọ ahụ arụ; 17 na Matanaya,+ nwa Maịka nwa Zabdaị nwa Esaf,+ onye na-eduzi abụ ma na-edu ndị na-abụ abụ otuto ma e kpewe ekpere,+ na Bakbọkaya, onye nke abụọ n’ime ụmụnne ya, nakwa Abda nwa Shamua nwa Gelal nwa Jedutọn.+ 18 Ndị Livaị niile ndị bi n’obodo nsọ ahụ dị narị abụọ na iri asatọ na anọ (284).

19 Ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá bụ Akọb, Talmọn,+ na ụmụnne ha ndị so ha eche nche. Ha dị otu narị na iri asaa na abụọ (172).

20 Ndị Izrel ndị ọzọ, ndị nchụàjà, na ndị Livaị bi n’obodo ndị ọzọ niile dị na Juda, onye nke ọ bụla n’ala o ketara.* 21 Ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ*+ bi n’Ofel.+ Ọ bụ Zaịha na Gishpa na-elekọta ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ.*

22 Onye na-elekọta ndị Livaị ndị bi na Jeruselem bụ Ọzaị nwa Benaị nwa Hashabaya nwa Matanaya+ nwa Maịka, onye si n’ezinụlọ Esaf, bụ́ ndị na-abụ abụ. Ọ bụ ya na-elekọta ọrụ a na-arụ n’ụlọ ezi Chineke. 23 E nwere iwu eze nyere maka ha,+ nweekwa ihe e kpebiri a ga na-enye ndị na-abụ abụ nke ga na-ezuru ha kwa ụbọchị. 24 Ọ bụ Petahaya nwa Meshezabel nwa Zira nwa Juda na-enye eze ndụmọdụ* n’okwu ọ bụla gbasara ndị anyị.

25 Ógbè ndị a dị iche iche bụ ala ebe ha bi: Ụfọdụ n’ime ndị ebo Juda bi na Kiriat-aba+ na ime obodo ndị dị ya nso,* na Daịbọn na ime obodo ndị dị ya nso, na Jekabziel+ na ógbè ya niile, 26 na Jeshụa, na Moleda,+ na Bet-pelet,+ 27 na Heza-shual,+ na Bia-shiba na ime obodo ndị dị ya nso,* 28 na Ziklag,+ na Mekona na ime obodo ndị dị ya nso,* 29 n’En-rimọn,+ na Zora,+ nakwa na Jamọt, 30 na Zanoa,+ n’Adọlam na ógbè ha niile, na Lekish+ na ala ndị dị na ya, nakwa n’Azika+ na ime obodo ndị dị ya nso.* Ha bi* malite na Bia-shiba ruo na Ndagwurugwu Hinọm.+

31 Ndị Benjamin bi na Giba,+ Mikmash, Aịja, Betel+ na ime obodo ndị dị ya nso,* 32 Anatọt,+ Nọb,+ Ananaya, 33 Hezọ, Rema,+ Giteyịm, 34 Hedid, Zeboyim, Nebalat, 35 Lọd, na Ono,+ ndagwurugwu ndị omenkà. 36 E kenyere ụfọdụ n’ime ndị Livaị bibu na Juda ka ha biri na Benjamin.

12 Ndị a bụ ndị nchụàjà na ndị Livaị so Zerubabel+ nwa Shieltiel,+ na Jeshụa+ lọta: Seraya, Jeremaya, Ezra, 2 Amaraya, Malọk, Hatọsh, 3 Shekanaya, Rihọm, Meremọt, 4 Ido, Ginetọị, Abaịja, 5 Mijamin, Meadaya, Bilga, 6 Shemaya, Joyarib, Jedeya, 7 Salu, Emọk, Hilkaya, Jedeya. Ọ bụ ha bụ ndị isi ndị nchụàjà na ụmụnne ha n’oge Jeshụa.

8 Ndị Livaị bụ Jeshụa, Binuaị, Kadmiel,+ Sherebaya, Juda, na Matanaya.+ Matanaya na ụmụnne ya na-edu ndị na-abụ abụ ekele. 9 Bakbọkaya na Ọnaị bụ́ ụmụnne ha chere ha ihu ka ha guzo n’ebe ha na-eche nche.* 10 Jeshụa mụrụ Joyakim, Joyakim amụọ Elayashib,+ Elayashib amụọ Joyada.+ 11 Joyada mụrụ Jonatan, Jonatan amụọ Jadua.

12 N’oge Joyakim, ndị a bụ ndị nchụàjà, ndị bụ́ ndị isi ọnụmara dị iche iche: onye na-anọchite anya ọnụmara Seraya+ bụ Meraya; nke Jeremaya bụ Hananaya; 13 nke Ezra+ bụ Meshọlam; nke Amaraya bụ Jehohenan; 14 nke Malọkaị bụ Jonatan; nke Shebanaya bụ Josef; 15 nke Herim+ bụ Adna; nke Mereyọt bụ Helkaị; 16 nke Ido bụ Zekaraya; nke Ginetọn bụ Meshọlam; 17 nke Abaịja+ bụ Zikraị; nke Minayamin bụ . . . ;* nke Moadaya bụ Piltaị; 18 nke Bilga+ bụ Shamua; nke Shemaya bụ Jehonatan; 19 nke Joyarib bụ Matinaị; nke Jedeya+ bụ Ọzaị; 20 nke Salaị bụ Kalaị; nke Emọk bụ Iba; 21 nke Hilkaya bụ Hashabaya; nke Jedeya bụ Netanel.

22 E dere aha ndị isi ọnụmara ndị Livaị nakwa nke ndị nchụàjà n’oge Elayashib, Joyada, Johenan, na Jadua+ ruo n’oge Darayọs onye Peshia chịwara.

23 E dere aha ndị isi ọnụmara ndị Livaị n’akwụkwọ ihe ndị mere n’oge ahụ ruo n’oge Johenan nwa Elayashib. 24 Ndị isi ndị Livaị bụ Hashabaya, Sherebaya, na Jeshụa+ nwa Kadmiel.+ Ụmụnne ha, bụ́ ndị nche, guzo n’ìgwè n’ìgwè chee ha ihu iji na-eto Chineke ma na-ekele ya otú Devid onye nke ezi Chineke kwuru ka a na-eme.+ 25 Matanaya,+ Bakbọkaya, Obedaya, Meshọlam, Talmọn, na Akọb+ guzo na-eche ọnụ ụzọ ámá nche.+ Ha na-eche nche n’ọnụ ụlọ a na-akwasa ihe, bụ́ ndị dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá. 26 Ha jere ozi n’oge Joyakim nwa Jeshụa+ nwa Jozadak nakwa n’oge Nehemaya bụ́ gọvanọ na Ezra+ onye nchụàjà, bụ́ odeakwụkwọ.*

27 Mgbe a na-enyefe Chineke mgbidi Jeruselem, ha chọrọ ndị Livaị ma si n’ebe niile ha bi kpọta ha Jeruselem ka ha jiri ọṅụ, abụ ekele,+ ájà, ụbọ akwara, na une nyefee Chineke mgbidi ahụ. 28 Ụmụ ndị na-abụ abụ* wee si n’ógbè ndị dị nso,* si gburugburu Jeruselem, si n’ógbè niile nke ndị Netofa+ zukọta. 29 Ha sikwa Bet-gilgal,+ nakwa ala ndị dị na Giba+ na Azmavet+ zukọta n’ihi na ndị na-abụ abụ rụụrụ onwe ha ógbè dị iche iche gburugburu Jeruselem. 30 Ndị nchụàjà na ndị Livaị wee mee onwe ha ka ha dị ọcha, meekwa ka ndị Izrel, ọnụ ụzọ ámá,+ na mgbidi+ ahụ dị ọcha.+

31 M wee kpọgote ndị isi Juda n’elu mgbidi ahụ. M họpụtakwara nnukwu ìgwè abụọ na-ekwe ukwe ekele na ndị ga na-eso ha n’azụ. Otu ìgwè nọ na-aga n’aka nri n’elu mgbidi nke gara n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ikpo Ntụ.+ 32 Hoshaya na ọkara ndị isi Juda sooro ha n’azụ na-aga, 33 ha na Azaraya, Ezra, Meshọlam, 34 Juda, Benjamin, Shemaya, na Jeremaya. 35 E nwere ụmụ ndị nchụàjà ji opi soro ha.+ Ụfọdụ n’ime ha bụ: Zekaraya nwa Jonatan nwa Shemaya nwa Matanaya nwa Mịkaya nwa Zakọ nwa Esaf,+ 36 na ụmụnne ya bụ́ Shemaya, Azarel, Milalaị, Gilalaị, Meaị, Netanel, Juda, na Hanenaị. Ha ji ngwá egwú Devid+ onye nke ezi Chineke. Ezra+ bụ́ odeakwụkwọ* nọkwa na-aga n’ihu ha. 37 N’Ọnụ Ụzọ Ámá Isi Iyi,+ ha si n’ebe e si agbago mgbidi dị n’elu Ụlọ Devid gafere Steepụ+ E Si Aga n’Obodo Devid+ ma gawa ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri,+ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ.

38 Ìgwè nke ọzọ na-ekwe ukwe ekele nọ na-aga n’aka ekpe.* Mụ na ọkara ndị nke ọzọ sooro ha n’elu mgbidi gafere Ụlọ Nche Ekwú+ ruo n’elu Mgbidi Sara Mbara,+ 39 gaferekwa Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem+ ma na-aga ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Obodo Ochie,+ ruokwa n’Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀,+ n’Ụlọ Nche Hananel,+ n’Ụlọ Nche Mia, ruokwa n’Ọnụ Ụzọ Ámá Atụrụ.+ Ha wee kwụsị n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ndị Nche.

40 Ìgwè abụọ ahụ na-ekwe ukwe ekele mechara kwụrụ n’ihu ụlọ ezi Chineke. M kwụkwaara, mụ na ọkara ndị osote onye na-achị achị mụ na ha so, 41 na ndị nchụàjà bụ́ Elayakim, Measaya, Minayamin, Mịkaya, Elio-inaị, Zekaraya, na Hananaya, bụ́ ndị ji opi, 42 nakwa Measaya, Shemaya, Elieza, Ọzaị, Jehohenan, Malkaịja, Ịlam, na Iza. Ndị na-abụ abụ, bụ́ ndị Izrahaya na-eduzi, nọkwa na-abụsi abụ ike.

43 Ha chụrụ nnukwu àjà n’ụbọchị ahụ, ṅụrịakwa ọṅụ+ n’ihi na ezi Chineke mere ka ha nwee nnukwu obi ụtọ. Ụmụ nwaanyị na ụmụntakịrị ṅụrịkwara ọṅụ,+ nke mere na a nọ n’ebe dị anya na-anụ ọṅụ a na-aṅụrị na Jeruselem.+

44 N’ụbọchị ahụ, a họpụtara ụmụ nwoke ga na-elekọta ụlọ ebe a na-edowe ihe+ ndị e nyere n’onyinye,+ mkpụrụ mbụ,+ na otu ụzọ n’ụzọ iri.+ Ọ bụ n’ime ụlọ ndị ahụ ka ha ga-akwasa ihe ndị e si n’ubi ndị dị n’obodo dị iche iche weta maka ndị nchụàjà na ndị Livaị+ otú Iwu* kwuru,+ n’ihi na a ṅụrịrị ọṅụ na Juda maka na ndị nchụàjà na ndị Livaị nọ na-eje ozi. 45 Ha wee malite ịrụ ọrụ Chineke ha na ọrụ ime ka ihe niile dị ọcha. Ndị na-abụ abụ na ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá malitekwara ịrụ ọrụ nke ha otú Devid na Solomọn nwa ya kwuru ka a na-eme. 46 N’ihi na n’oge gara aga, n’oge Devid na Esaf, e nwere ndị na-eduzi* ndị na-abụ abụ, nweekwa abụ otuto na abụ e ji ekele Chineke.+ 47 N’oge Zerubabel+ nakwa n’oge Nehemaya, Izrel niile na-enye ndị na-abụ abụ+ na ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá+ ihe ga-ezuru ha kwa ụbọchị. Ha na-ewepụtakwara ndị Livaị òkè ha,+ ndị Livaị ewepụtara ụmụ Erọn òkè nke ha.

13 N’ụbọchị ahụ, a gụụrụ mmadụ niile akwụkwọ Mosis.+ E wee chọpụta na e dere na ya na e nweghị onye Amọn ma ọ bụ onye Moab+ ga-abata n’ọgbakọ ezi Chineke,+ 2 n’ihi na ha enyeghị ndị Izrel achịcha na mmiri, kama ha goro Belam ka ọ bụọ ha ọnụ.+ Ma, Chineke anyị mere ka ọnụ ọ gaara abụ ha bụrụzie ngọzi.+ 3 Ozugbo ha nụrụ Iwu ahụ, ha si ná ndị Izrel kpọpụwa ndị niile bụ́ ndị mba ọzọ.+

4 Tupu oge a, ọ bụ Elayashib,+ onye ikwu Tobaya,+ bụ onye nchụàjà na-ahụ maka ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe* n’ụlọ* Chineke anyị.+ 5 O doziiri Tobaya otu nnukwu ọnụ ụlọ a na-akwasa ihe,* bụ́ ebe ha na-edowebu ọka e ji achụ àjà, frankinsens, na arịa dị iche iche nakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọka,* nke mmanya ọhụrụ, na nke mmanụ+ e kwesịrị ịna-enye ndị Livaị,+ ndị na-abụ abụ, na ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, nakwa onyinye a na-enye maka ndị nchụàjà.+

6 N’oge a niile, anọghị m na Jeruselem n’ihi na m gakwuuru Eze Atazaksis+ nke Babịlọn n’afọ nke iri atọ na abụọ n’ọchịchị ya.+ Mgbe oge ụfọdụ gachara, m rịọrọ eze ka ọ hapụ m ka m laghachi. 7 M wee bịarute Jeruselem hụ ihe ọjọọ Elayashib+ mere n’ihi Tobaya.+ O doziiri ya otu ọnụ ụlọ a na-akwasa ihe n’ogige ụlọ ezi Chineke. 8 Ihe a were m ezigbo iwe, m wee si n’ọnụ ụlọ ahụ a na-akwasa ihe* tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile. 9 M nyeziri iwu, ha wee mee ka ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe* dị ọcha. M bughachiri arịa dị iche iche na-adị n’ụlọ ezi Chineke+ n’ebe ahụ, ha na ọka e ji achụ àjà na frankinsens.+

10 M chọpụtakwara na a naghịzi enye ndị Livaị+ òkè ha,+ nke mere na onye nke ọ bụla ná ndị Livaị na ndị na-abụ abụ, bụ́ ndị na-eje ozi, gawara ịrụ ọrụ n’ala nke ya.+ 11 M wee baara ndị osote onye na-achị achị mba,+ sị: “Gịnị mere e ji leghara ụlọ ezi Chineke anya?”+ M kpọkọtaziri ndị Livaị ma mee ka ha laghachi n’ebe e kenyere ha ọrụ. 12 Juda niile webatakwara otu ụzọ n’ụzọ iri+ nke ọka,* nke mmanya ọhụrụ, na nke mmanụ n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe.+ 13 M wee nye Shelemaya bụ́ onye nchụàjà, Zedọk bụ́ odeakwụkwọ,* na Pedaya onye Livaị ọrụ ilekọta ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe. Henan nwa Zakọ nwa Matanaya na-enyekwara ha aka n’ihi na e weere ụmụ nwoke ahụ ka ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọrụ ha bụ ikesara ụmụnne ha ihe.

14 Chineke m, biko, cheta m+ n’ihi ihe a. Echefula ihe ndị m mere maka na m hụrụ ụlọ gị na ozi ndị a na-eje na ya n’anya.+

15 N’ụbọchị ndị ahụ, m hụrụ ndị bi na Juda ka ha na-azọchapụta mmanya n’Ụbọchị Izu Ike.+ Ha na-ebubata ikpo ọka,* na-ebukwasị ha n’elu jakị, na-ebutekwa mmanya, mkpụrụ vaịn, mkpụrụ fig, na ụdị ibu ọ bụla na Jeruselem n’Ụbọchị Izu Ike.+ M wee dọọ ha aka ná ntị ka ha kwụsị ire ihe n’ụbọchị ahụ.* 16 Ndị Taya ndị bi n’obodo ahụ na-ebubata azụ̀ na ụdị ngwá ahịa ọ bụla, na-eresị ha ndị Juda n’Ụbọchị Izu Ike n’ime Jeruselem.+ 17 M wee baara ndị a ma ama na Juda mba ma sị ha: “Gịnị bụ ihe ọjọọ a unu na-eme? Unu na-emerụ Ụbọchị Izu Ike. 18 Ọ́ bụghị ihe a ka nna nna unu hà mere, Chineke anyị wee mee ka ọdachi a niile dakwasị anyị, dakwasịkwa obodo a? Ugbu a, unu na-emerụ Ụbọchị Izu Ike,+ na-eme ka iwe dị ọkụ ọ na-ewesa Izrel dịkwuo ọkụ.”

19 Ozugbo ọchịchịrị gbawara n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem tupu Ụbọchị Izu Ike eruo, m nyere iwu ka e mechie ibo ụzọ ya niile. M kwukwara ka ha ghara imeghe ha ruo mgbe Ụbọchị Izu Ike gachara. M dowekwara ụfọdụ n’ime ndị na-ejere m ozi n’ọnụ ụzọ ámá ka a ghara ibubata ibu ọ bụla n’Ụbọchị Izu Ike. 20 Ndị ahịa ahụ na ndị na-ere ụdị ngwá ahịa ọ bụla wee rahụ n’ihu mgbidi Jeruselem otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ. 21 M wee dọọ ha aka ná ntị ma gwa ha, sị: “Gịnị mere unu ji arahụ n’ihu mgbidi a? Unu mee ya ọzọ, m ga-achụpụ unu n’ike.” Malite n’oge ahụ gawa, ha abịakwaghị n’Ụbọchị Izu Ike.

22 M gwara ndị Livaị ka ha na-eme onwe ha ka ha dị ọcha mgbe niile ma na-abata na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá iji doo Ụbọchị Izu Ike nsọ.+ Chineke m, biko, chetakwa ihe a ma meere m ebere maka na ịhụnanya gị dị ukwuu.+

23 N’oge ahụ, m hụkwara ndị Juu lụrụ* ụmụ nwaanyị+ Ashdọd,+ Amọn, na Moab.+ 24 Ọkara ụmụ ha na-asụ asụsụ ndị Ashdọd, ọkara ana-asụ asụsụ ndị obodo ọzọ dị iche iche. Ma e nweghị otu n’ime ha ma otú e si asụ asụsụ ndị Juu. 25 M wee baara ha mba, bụọ ha ọnụ, tie ụfọdụ n’ime ụmụ nwoke ahụ ihe,+ fopụkwa ntutu isi ha ma mee ka ha jiri aha Chineke ṅụọ iyi. M sịrị ha: “Unu akpọnyela ụmụ ha ndị nwoke ụmụ unu ndị nwaanyị. Unu alụtakwarala ụmụ unu ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị. Unu alụkwala ụmụ ha ndị nwaanyị.+ 26 Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe ndị a mere ka Eze Solomọn nke Izrel mehie? E nweghị eze dị ka ya n’ọtụtụ mba.+ Chineke ya hụrụ ya n’anya+ wee mee ya eze Izrel niile. Ma ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ ọ lụrụ mere ka o mehie.+ 27 Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe jọgburu onwe ya na unu kpọchiri ntị na-emebi iwu Chineke anyị wee na-alụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ?”+

28 Otu n’ime ụmụ nwoke Joyada+ nwa Elayashib,+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà, alụọla nwa Sanbalat+ onye Bet-horọn. N’ihi ya, m chụpụrụ ya.

29 Chineke m, biko, cheta na ha emerụọla ọrụ ndị nchụàjà na ọgbụgba ndụ ndị nchụàjà+ na ndị Livaị.+

30 M wee mee ka ha dị ọcha ka a ghara inwekwa ihe ọ bụla si mba ọzọ ga-eme ka ha rụọ arụọ. M kenyekwara ndị nchụàjà na ndị Livaị ọrụ, onye ọ bụla n’ọrụ nke ya,+ 31 meekwa ndokwa ka a na-ebute nkụ+ n’oge kwesịrị ekwesị nakwa ka a na-eweta mkpụrụ mbụ kara aka.

Chineke m, biko, cheta m ma gọzie m.+

Nehemaya pụtara “Jaa Na-akasi Obi.”

Gụọ B15.

Ma ọ bụ “Susa.”

Ma ọ bụ “ebe a rụsiri ike.”

Ma ọ bụ “ná mpaghara.”

Ma ọ bụ “ị dọrọ Mosis onye na-ejere gị ozi aka ná ntị.”

Gụọ B15.

Ma ọ bụ “ógbè dị n’Ofe Osimiri.”

Ma ọ bụ “Ọnụ Ụzọ Ámá Ikpofu Ahịhịa.”

Na Hibru, “mee ka aka ha sie ike.”

Ma ọ bụ “nyefere ya Chineke.”

Ma ọ bụ “ógbè dị n’Ofe Osimiri.”

Ma ọ bụ “ndị na-emepụta ihe na-esi ísì ọma.”

Ma ọ bụ “mpaghara a tụrụ atụ̀.”

Ihe dị ka mita 445 (amaụkwụ 1,460). Gụọ B14.

Ọ ga-abụ ebe e liri Devid na ndị ọzọ mechara chịa Juda.

O nwere ike ịbụ, “n’ógbè dị nso.”

Ma ọ bụ “n’Obí Eze.”

Ma ọ bụ “Ndị Netinim.” Na Hibru, “Ndị e nyere n’onyinye.”

Ma ọ bụ “ọnụ ụlọ.”

Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”

Ma ọ bụ “ndị na-ebu ibu arọ.”

Na Hibru, “ugboro iri.”

Na Hibru, “kwụ ụlọ Juda niile n’azụ.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Na Hibru, “ije ije n’egwu Chineke.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Na Hibru, “otu ụzọ n’ụzọ otu narị,” ya bụ, ọmụrụ nwa ha na-akwụ kwa ọnwa.

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Na Hibru, “M fechapụrụ obi m,” ya bụ, akpa na-adị n’ebe elu elu n’uwe ndị oge ochie.

Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ!”

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “a na-esi n’ego akpa m akwadebe.”

Na Hibru, “ha si gị n’obi.”

Na Hibru, “mee ka aka m dị ike.”

Gụọ B15.

Na Hibru, “ha dara ezigbo ọdịda n’anya onwe ha.”

Ma ọ bụ “ná mpaghara.” O nwere ike ịbụ mpaghara Babịlọn ma ọ bụkwanụ mpaghara Juda ka a na-ekwu.

Ma ọ bụ “Ndị Netinim.” Na Hibru, “Ndị e nyere n’onyinye.”

Ma ọ bụ “Ndị Netinim.” Na Hibru, “Ndị e nyere n’onyinye.”

Ya bụ, aha ọgọ ya nwoke.

Ma ọ bụ “e wepụrụ aha ha ná ndị nchụàjà n’ihi na e weere ha ka ndị na-adịghị ọcha.”

Ma ọ bụ “Tesheta.” Ọ bụ aha ndị Peshia na-akpọ gọvanọ na-achị ógbè.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Okwu Hibru a sụgharịrị nnukwu jakị pụtara jakị nke nne ịnyịnya na oké jakị mụtara.

Ma ọ bụ “Tesheta.” Ọ bụ aha ndị Peshia na-akpọ gọvanọ na-achị ógbè.

Drakma a hà ka mkpụrụ ego darik ndị Peshia e ji ọlaedo kpụọ, nke bụ́ gram 8.4. Ma, ọ bụghị drakma e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ Grik. Gụọ B14.

Maịna e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ gram 570. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”

Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”

Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”

Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ!”

Ma ọ bụ “Tesheta.” Ọ bụ aha ndị Peshia na-akpọ gọvanọ na-achị ógbè.

Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”

Na Hibru, “ihe abụba juru.”

Ma ọ bụ “ike unu.”

Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, osisi nwere mmanụ.

Ọ bụ obere osisi akwụkwọ ya na-egbuke egbuke, okooko ya na-acha ọcha, na-esikwa ísì ọma.

Ma ọ bụ “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”

O nwekwara ike ịbụ na anyanwụ, ọnwa, na kpakpando so n’ihe ndị Chineke kere a na-ekwu ebe a.

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “iwu ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi.”

Na Hibru, “i weliri aka gị.”

Na Hibru, “kwesie olu ike.”

Na Hibru, “kwesiri olu ike.”

Ma ọ bụ “Chineke nke na-agbaghara mmehie.”

Ma ọ bụ “na-eme amara.”

Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”

Na Hibru, “mmụọ gị dị mma.”

Na Hibru, “tụfee Iwu gị n’azụ ha.”

Ma ọ bụ “na-egweri ha.”

Na Hibru, “kwesie olu ike.”

Ma ọ bụ “na-eme amara.”

Ma ọ bụ “n’ihe ncheta i ji dọọ ha aka ná ntị.”

Na Hibru, “ahụ́ anyị.”

Ma ọ bụ “Tesheta.” Ọ bụ aha ndị Peshia na-akpọ gọvanọ na-achị ógbè.

Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”

O nwere ike ịbụ, “ndị niile toruru ịghọta ihe.”

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “n’ụlọ nsọ.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

 Ma ọ bụ “n’ebe ndị a na-anọ eri nri.”

Ma ọ bụ “ebe ndị a na-anọ eri nri.”

Ma ọ bụ “ebe ndị a na-anọ eri nri.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ma ọ bụ “ná mpaghara.”

Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”

Ma ọ bụ “n’ụlọ nsọ.”

Ma ọ bụ “n’ihe o ketara.”

Ma ọ bụ “Ndị Netinim.” Na Hibru, “Ndị e nyere n’onyinye.”

Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”

Na Hibru, “na-anọ n’aka eze.”

Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”

Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”

Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”

Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”

Ma ọ bụ “mara ụlọikwuu.”

Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”

O nwere ike ịbụ, “n’oge ha na-eje ozi.”

Ọ ga-abụ na e nwere aha na-adịghị n’ebe a n’Akwụkwọ Nsọ Hibru e si sụgharịa amaokwu a.

Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”

Ma ọ bụ “Ndị a zụrụ azụ na-abụ abụ.”

Ya bụ, ógbè ndị dị gburugburu Osimiri Jọdan.

Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”

Ma ọ bụ “nọ na-aga n’ihu.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Na Hibru, “ndị isi.”

Ma ọ bụ “ebe ndị a na-anọ eri nri.”

Ma ọ bụ “n’ụlọ nsọ.”

Ma ọ bụ “ebe a na-anọ eri nri.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ma ọ bụ “ebe a na-anọ eri nri.”

 Ma ọ bụ “ebe ndị a na-anọ eri nri.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

O nwere ike ịbụ, “dọọ ha aka ná ntị n’ụbọchị ahụ ka ha ghara ire ihe.”

Ma ọ bụ “kpọbatara n’ụlọ ha.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya