AKWỤKWỌ OZI MBỤ E DEGAARA NDỊ KỌRỊNT
1 Ọ bụ Pọl, onye Kraịst Jizọs kpọrọ ka ọ bụrụ onyeozi+ otú Chineke si chọọ, na Sọstenis nwanna anyị, 2 na-edetara ọgbakọ Chineke dị na Kọrịnt akwụkwọ ozi a.+ Chineke doro unu nsọ ka unu bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs.+ Chineke kpọrọ unu ka unu bụrụ ndị dị nsọ, unu na ndị niile nọ ebe ọ bụla na-akpọ aha Onyenwe anyị niile, bụ́ Jizọs Kraịst.+
3 Ka Chineke Nna anyị nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.
4 Ana m ekele Chineke maka unu mgbe niile n’ihi amara o si n’aka Kraịst Jizọs meere unu. 5 Ọ bụ maka na unu na Jizọs dị ná mma mere unu ji nweta ihe niile. Ọ bụ ya mere unu ji nwee ike ịma okwu Chineke nke ọma, nweekwa ike ikwusa ya nke ọma.+ 6 Ozi ọma unu na-ezi banyere Kraịst+ emeela ka unu sie ezigbo ike, 7 nke na unu nwere onyinye niile, ka unu na-echesi ike ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst gosi ike ya.+ 8 Chineke ga-emekwa ka unu nọsie ike ruo ọgwụgwụ, ka a ghara inwe ihe onye ọ bụla ga-eji maka ya bo unu ebubo n’ụbọchị Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ga-abịa.+ 9 Chineke na-emezu ihe o kwuru.+ Ọ bụ ya kpọrọ unu ka unu na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst Onyenwe anyị dịrị ná mma.*
10 Ụmụnna m, m ji aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na-agba unu ume ka unu niile na-ekwu otu ihe, ka unu gharakwa ịna-akpa iche iche,+ kama ka unu nwee otu obi, ka ihe unu na-eche bụrụkwa otu.+ 11 Ụmụnna m, ndị ụlọ Kloi gwara m banyere unu. Ha kwuru na unu na-ese okwu. 12 Ihe m na-ekwu bụ na olu unu na-ada iche iche. Otu onye na-asị: “Ana m eso ụzọ Pọl,” onye ọzọ ana-asị, “Ana m eso ụzọ Apọlọs,”+ onye ọzọ ana-asị, “Ana m eso ụzọ Sifas,”* onye ọzọ ana-asịkwa, “Ana m eso ụzọ Kraịst.” 13 È kewara Kraịst ekewa? Ọ̀ bụ Pọl ka e gburu n’elu osisi n’ihi unu? Ka è mere unu baptizim n’aha Pọl? 14 Ana m ekele Chineke na o nweghị onye n’ime unu m mere baptizim ma e wezụga Krispọs+ na Gayọs.+ 15 N’ihi ya, o nweghị onye ga-asị na unu mere baptizim n’aha m. 16 Emekwara m ezinụlọ Stefanas baptizim.+ E wezụga ndị a, echetaghị m onye ọzọ m mere baptizim. 17 N’ihi na Kraịst zipụrụ m ka m na-ezisa ozi ọma,+ ọ bụghị ka m na-eme ndị mmadụ baptizim. O zipụghịkwa m ka m na-ekwu okwu ka onye gụrụ oké akwụkwọ,* ka ọnwụ Kraịst nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ* ghara ifu ọhịa.
18 N’ihi na okwu gbasara ọnwụ Kraịst nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ* bụ okwu nzuzu n’anya ndị a na-aga ibibi ebibi,+ ma n’anya anyịnwa bụ́ ndị a na-aga ịzọpụta, ọ na-egosi ike Chineke.+ 19 N’ihi na e dere, sị: “M ga-eme ka amamihe nke ndị ma ihe laa n’iyi, agaghịkwa m eji amamihe ndị ọkachamara mee ihe ọ bụla.”+ 20 N’oge a,* olee ebe onye amamihe, odeakwụkwọ,* na ọ̀rụ́ ụka nọ? Ọ̀ bụ na Chineke emebeghị ka amamihe ụwa bụrụ ihe nzuzu? 21 Ndị ụwa amaghị Chineke+ n’ihi na ha tụkwasịrị amamihe ha obi.+ Ha weere na ihe anyị na-ekwusa abaghị uru. Ma, Chineke ji ozi a azọpụta ndị nabatara ya.+ E sikwa otú a na-egosi amamihe Chineke.
22 Ndị Juu na-achọ ka a rụọrọ ha ọrụ ebube,+ ndị Grik na-achọkwa amamihe. 23 Ma anyị na-ekwusa gbasara Kraịst, onye e gburu n’elu osisi. Ihe a anyị na-ekwusa na-esiri ndị Juu ike ịnabata. Ndị mba ọzọ wekwaara ya ka ihe nzuzu.+ 24 Ma, ndị Chineke kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Grik, weere Kraịst ka onye e si n’aka ya egosi ike Chineke na amamihe Chineke.+ 25 N’ihi na ihe si n’aka Chineke, nke ụmụ mmadụ weere na ọ maghị ihe, ma ihe karịa ha. Ihe sikwa n’aka Chineke, nke ụmụ mmadụ weere na o sighị ike, siri ike karịa ha.+
26 Ụmụnna m, mgbe Chineke kpọrọ unu, ndị mmadụ anaghị ele ọtụtụ n’ime unu anya ka ndị ma ihe ma ọ bụ ndị siri ike.+ Ọtụtụ n’ime unu esighịkwa n’ezinụlọ ndị ukwu.+ 27 Ma, Chineke họọrọ ndị ụwa weere na ha amaghị ihe iji menye ndị amamihe ihere. Chineke họkwaara ndị ụwa weere na ha esighị ike iji menye ndị siri ike ihere.+ 28 Chineke họkwaara ndị ụwa weere na ha abaghị uru, ndị ha na-eleda anya, na ndị ha weere na ha adịghị adị. Ọ họọrọ ha iji gosi na ndị ụwa weere na ha bara uru abaghị uru ọ bụla,+ 29 ka onye* ọ bụla wee ghara ịnya isi n’ihu Chineke. 30 Ma, ọ bụ n’ihi ya ka unu na Kraịst Jizọs ji dị n’otu. Ọ bụ Jizọs mere ka anyị mata amamihe na ezi omume Chineke.+ Ọ bụkwa ya mere ka anyị dịrị nsọ.+ Ọnwụ ọ nwụrụ iji gbapụta anyị ga-emekwa ka anyị gharazie ịbụ ndị mmehie.+ 31 Ọ bụ ya mere ihe a e dere ji kwesị ekwesị: “Onye na-anya isi, ya jiri Jehova* nyaa isi.”+
2 Ụmụnna m, mgbe m bịara izisara unu ihe nzuzo dị nsọ+ gbasara Chineke, agwaghị m unu okwu ka onye oké amamihe+ ma ọ bụ otú ga-eme ka unu towe m. 2 N’ihi na m kpebiri na naanị ihe m ga-agwa unu bụ okwu gbasara Jizọs Kraịst, nakwa gbasara ogbugbu e gburu ya n’elu osisi.+ 3 Mgbe m bịakwutere unu, esighị m ike. Ụjọ nọ na-atụ m, m nọkwa na-ama jijiji. 4 Mgbe m na-agwa unu okwu, na-akụzikwara unu ihe, ejighị m ire ụtọ gwa unu okwu otú ndị oké amamihe na-eme, kama m gwara unu okwu otú gosiri na mmụọ nsọ na-akpa ike,+ 5 ka okwukwe unu nwere bụrụ n’ihi ike Chineke, ọ bụghị n’ihi amamihe mmadụ.
6 Anyị na-agwa ndị siri ike n’okwukwe banyere amamihe,+ ma, ọ bụghị amamihe nke oge a,* ọ bụghịkwa nke ndị na-achị ụwa a, n’ihi na ha agaghịzi adị.+ 7 Kama, anyị na-ekwu gbasara amamihe Chineke. Amamihe a bụ ihe nzuzo dị nsọ.+ Tupu ụwa ọjọọ a adịwa, Chineke bu n’obi ime ihe otú ga-adaba n’amamihe a, ka anyị nwee ike dị ebube. 8 O nweghị onye ọ bụla n’ime ndị niile na-achị ụwa a* ma gbasara amamihe a,+ n’ihi na ọ bụrụ na ha ma ya, ha agaraghị egbu Onyenwe anyị dị ebube.* 9 Ọ dabara n’ihe a e dere: “Ihe ndị anya na-ahụtụbeghị, nke ntị na-anụtụbeghịkwa, nke na-abatatụbeghịkwa ndị mmadụ n’obi, ka Chineke kwadebeere ndị hụrụ ya n’anya.”+ 10 Ma, Chineke ji mmụọ ya+ mee ka anyị mara ha,+ n’ihi na mmụọ ya na-eme ka a mata ihe niile, ọbụnadị amamihe Chineke nke dị omimi.+
11 Mmadụ ò nwere ike ịma ihe dị onye ọzọ n’obi? Mbanụ. Ọ bụ naanị onye ahụ ma ihe dị ya n’obi. Ọ bụkwa otú ahụ ka a na-enweghị onye ma ihe dị Chineke n’obi, ma e wezụga mmụọ nsọ Chineke. 12 Ma, ọ bụ mmụọ nsọ Chineke na-achị anyị,+ ọ bụghị mmụọ nke ụwa, ka anyị wee mata ihe niile Chineke ji obiọma nye anyị. 13 Anyị na-ekwukwa gbasara ihe ndị a. Ma, ọ bụghị ihe mmadụ ji amamihe ya kụzie ka anyị na-ekwu,+ kama ọ bụ ihe mmụọ nsọ kụziiri anyị.+ Anyị jikwa ihe mmụọ nsọ mere ka anyị ghọta na-akọwa ihe ndị gbasara Chineke.
14 Ma onye anụ ahụ́ na-achị anaghị anabata ihe ndị gbasara mmụọ nsọ Chineke, n’ihi na ha bụ ihe nzuzu n’anya ya. Ọ gaghịkwa amatali ha, n’ihi na mmadụ ga-enwerịrị mmụọ nsọ tupu ya enwee ike inyocha ha. 15 Ma, onye mmụọ nsọ na-edu na-enyocha ihe niile,+ ma o nweghị mmadụ ọ bụla na-enyocha yanwa. 16 N’ihi na Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: “Ònye ma uche Jehova,* nke na ọ ga-akụziri ya ihe?”+ Ma, anyị ma uche Kraịst.+
3 Ụmụnna m, anaghị m agwa unu okwu ka m̀ na-agwa ndị mmụọ nsọ na-edu,+ kama m na-agwa unu okwu ka m̀ na-agwa ndị na-ebi ndụ otú anụ ahụ́ chọrọ, ndị bụ́ ụmụ ọhụrụ+ n’ihe gbasara Kraịst. 2 Enyere m unu mmiri ara, ọ bụghị nri siri ike, n’ihi na unu esichabeghị ike. N’eziokwu, unu esichabeghịkwa ike ugbu a,+ 3 n’ihi na unu ka na-eche echiche otú ụwa si eche.*+ Unu na-enwere ibe unu anyaụfụ, na-esekwa okwu. N’ihi ya, unu na-eche echiche otú ụwa si eche,+ na-akpakwa àgwà otú mmadụ nkịtị si akpa. 4 N’ihi na otu onye n’ime unu na-asị, “Ana m eso ụzọ Pọl,” onye ọzọ ana-asị, “Ana m eso ụzọ Apọlọs.”+ Ọ̀ bụ na unu anaghị eme ka ụmụ mmadụ nkịtị?
5 Ònyekwanụ bụ Apọlọs? Ònyekwa bụ Pọl? Anyị bụ ndị ozi nkịtị+ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị gwara anyị rụọ. Naanị ihe anyị mere bụ inyere unu aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. 6 Akụrụ m mkpụrụ,+ Apọlọs agbaa ya mmiri.+ Ma, ọ bụ Chineke na-eme ka o too. 7 N’ihi ya, e kwesịghị ito onye na-akụ mkpụrụ na onye na-agba ya mmiri. Kama, onye e kwesịrị ito bụ Chineke, onye na-eme ka o too.+ 8 Onye na-akụ mkpụrụ na onye na-agba ya mmiri bụ otu.* Ma, a ga-akwụ onye ọ bụla n’ime ha ụgwọ ihe ọ rụrụ.+ 9 N’ihi na anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ. Ununwa bụ ubi Chineke na-arụ ọrụ na ya, bụrụkwa ụlọ Chineke na-arụ.+
10 Chineke meere m amara. Ọ bụ ya mere m ji nwee ike ịtọ ntọala+ ka onye bụ́ aka ochie n’ịrụ ụlọ,* ma onye ọzọ na-arụ ụlọ n’elu ya. Ma, ka onye ọ bụla lezie anya n’otú o si arụ ụlọ n’elu ya. 11 N’ihi na o nweghị onye ga-atọli ntọala ọzọ karịa nke a tọrọla, ya bụ, Jizọs Kraịst.+ 12 Mmadụ nwere ike jiri ọlaedo, ọlaọcha, na nkume dị oké ọnụ* rụọ ụlọ n’elu ntọala ahụ. Onye ọzọ nwekwara ike jiri osisi, ahịhịa, na okporo ọka rụọ ụlọ n’elu ntọala ahụ. 13 Ma, a ga-eme ka a mata ọrụ onye ọ bụla* n’ụbọchị ule. N’ụbọchị ahụ, a ga-eji ọkụ mee ka a mata ụdị ọrụ onye ọ bụla rụrụ.+ 14 Ọ bụrụ na ọkụ agbaghị ihe mmadụ rụrụ n’elu ntọala ahụ, a ga-agọzi onye ahụ. 15 Ma, ọ bụrụ na ihe mmadụ rụrụ agbaa ọkụ, ezigbo ihe funahụrụ onye ahụ, ma a ga-azọpụta ya. Ọ bụrụgodị na a zọpụta ya, ọ ga-adị ka è si n’ọkụ zọpụta ya.
16 Ọ̀ bụ na unu amaghị na unu bụ ụlọ nsọ Chineke+ nakwa na mmụọ Chineke bi n’ime unu?+ 17 Ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie ụlọ nsọ Chineke, Chineke ga-ebibi onye ahụ, n’ihi na ụlọ nsọ Chineke dị nsọ. Unu bụkwa ụlọ nsọ ahụ.+
18 Ka onye ọ bụla ghara iduhie onwe ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu chere na ya ma ihe n’anya ndị mmadụ n’ụwa a,* ya ghọọ onye nzuzu, ka o wee bụrụ onye ma ihe. 19 N’ihi na amamihe ụwa a bụ ihe nzuzu n’anya Chineke, maka na e dere, sị: “Ọ na-eme ka ọnyà ndị ma ihe siri ma ha.”+ 20 E dekwara, sị: “Jehova* ma na ihe ndị ma ihe na-atụgharị n’uche bụ ihe efu.”+ 21 N’ihi ya, unu ejila ndị mmadụ na-anya isi. Ihe niile bụ nke unu, 22 ma Pọl ma Apọlọs ma Sifas*+ ma ụwa ma ndụ ma ọnwụ ma ihe ndị dị ebe a ugbu a ma ihe ndị ga-emecha dị. Ihe niile bụ nke unu. 23 Ununwa bụ nke Kraịst,+ ma Kraịst bụ nke Chineke.
4 Anyị chọrọ ka ndị mmadụ were anyị ka ndị na-ejere Kraịst ozi* na ndị na-elekọta ihe nzuzo dị nsọ gbasara Chineke.+ 2 Ma, onye na-elekọta ụlọ kwesịrị ịna-arụ ọrụ ya nke ọma. 3 Ọ bụrụ na unu, ma ọ bụ ndị ụlọikpe, ga-ekpe m ikpe, o nweghị ihe m ji ya kpọrọ. Anaghịdị m ekpe onwe m ikpe. 4 N’ihi na o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla m ma m mere. Ma, anaghị m ekwu na m bụ onye ezi omume. Kama, ọ bụ naanị Jehova* na-ekpebi ma ihe m na-eme ọ̀ bụ ihe ọma ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ.+ 5 N’ihi ya, unu ekpela onye ọ bụla ikpe+ tupu oge a kara aka eruo, kama, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị bịara. Ọ bụ ya ga-eme ka ihe ndị e zoro n’ọchịchịrị pụta ìhè, meekwa ka a mata ihe onye ọ bụla bu n’obi. Mgbe ahụkwa ka Chineke ga-aja onye ọ bụla mma otú kwesịịrị onye ahụ.+
6 Ụmụnna m, n’ihe ndị a niile m kwuru, unu kwesịrị iṅomi mụ na Apọlọs+ maka ọdịmma unu, ka unu wee mụta ihe a: “Na-emenụ naanị ihe e dere ede,” ka unu ghara ịdị mpako,+ gharakwa ịna-eche na otu onye ka ibe ya mma. 7 Gịnị ka i nwere mere ị ga-eji chewe na ị ka onye ọzọ mma? Ọ́ bụghị Chineke nyere gị ihe niile i nwere?+ Ọ bụrụ na o nyere gị ihe niile, gịnị mere i ji na-anya isi ka à ga-asị na i ji ike gị nweta ha?
8 Afọ ò jula unu eju ugbu a? Ùnu abaala ọgaranya? Ùnu bụzi ndị eze+ hapụ anyị? Ọ dị m ka ya bụrụ na unu bụzi ndị eze, ka anyị wee soro unu bụrụ ndị eze.+ 9 N’ihi na ọ dị m ka Chineke emeela ka anyị bụ́ ndịozi bụrụ ndị ikpeazụ batara n’ámá egwuregwu ka mmadụ niile kiriwe anyị, maka na a mara anyị ikpe ọnwụ.+ Ụwa niile na ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ na-ekirikwa anyị.+ 10 E weere na anyị bụ ndị nzuzu+ maka na anyị na-eso ụzọ Kraịst, ma unu chere na unu ma ihe maka na unu na-eso ụzọ Kraịst. Anyị esighị ike, ma unu siri ike. A na-asọpụrụ unu, ma a naghị asọpụrụ anyị. 11 Ruo ugbu a, anyị na-anọ agụụ,+ akpịrị na-akpọkwa anyị nkụ.+ Anyị na-eyi ákwà na-adịghị mma n’anya,* a na-akụkwa anyị ihe.*+ E nweghị ebe anyị bi, 12 anyị jikwa aka anyị na-arụsi ọrụ ike.+ Mgbe ndị mmadụ na-akparị anyị, anyị na-agọzi ha.+ Mgbe ha na-akpagbu anyị, anyị na-enwe ndidi, na-atachikwa obi.+ 13 Mgbe ndị mmadụ na-ekwutọ anyị, anyị na-emeda obi agwa ha okwu.*+ Ruokwa ugbu a, ndị ụwa na-ewere anyị ka ihe e kpofuru ekpofu, nakwa ka ndị a jụrụ ajụ.
14 Ihe mere m ji na-ede ihe ndị a abụghị iji menye unu ihere, kama ọ bụ iji dụọ unu ọdụ maka na unu bụ ụmụ m m hụrụ n’anya. 15 Ọ bụrụgodị na unu nwere puku ndị nkụzi iri (10,000) na-akụziri unu otú unu ga na-esi eso ụzọ Kraịst, unu enweghị ọtụtụ nna. Ma, aghọọla m nna unu maka na m ziri unu ozi ọma+ gbasara Kraịst Jizọs. 16 N’ihi ya, gbalịanụ na-eme ka m.+ 17 M na-ezitere unu Timoti n’ihi na ọ bụ nwa m m hụrụ n’anya, o jikwa obi ya niile na-ejere Onyenwe anyị ozi. Ọ ga-echetara unu otú m si ejere Kraịst Jizọs ozi,+ dị ka m si na-akụziri ọgbakọ niile.
18 Ụfọdụ n’ime unu na-ebuli onwe ha elu maka na ha chere na m gaghị abịa ịhụ unu. 19 Ma, ọ bụrụ uche Jehova,* m ga-abịa ịhụ unu n’oge na-adịghị anya. M chọrọ ịhụ ndị ahụ na-ebuli onwe ha elu, ma ọ bụghị ka m nụ ihe ha na-ekwu, kama ka m mara ma ọ̀ bụ ike Chineke na-edu ha. 20 N’ihi na ihe e ji ama na Alaeze Chineke na-achị anyị bụ ịkpa àgwà na-egosi na ike Chineke na-edu anyị, ọ bụghị ihe anyị kwuru n’ọnụ. 21 Ùnu chọrọ ka m jiri ụtarị bịa hụ unu,+ ka ùnu chọrọ ka m jiri ịhụnanya na obi umeala?
5 Anụrụ m na e nwere otu nwoke n’ime unu kpọọrọ nwunye nna ya, ya na ya ebiri.+ Ụdị ịkwa iko* a jọgburu onwe ya. Ọ kadị nke ndị mba ọzọ na-akwa njọ. 2 Ùnu ji ụdị mmehie a na-anya isi? Ó kwesịghị ịna-ewute unu?+ Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị ikewapụ nwoke mere ihe a n’ọgbakọ?+ 3 N’agbanyeghị na mụ na unu anọghị, obi m dị ebe unu nọ.* Ekpeekwala m nwoke mere ihe a ikpe dị ka à ga-asị na mụ na unu nọ. 4 Mgbe unu zukọtara n’aha Onyenwe anyị Jizọs, marakwa na Onyenwe anyị Jizọs nyere m ike, nakwa na obi m dị ebe unu nọ,* 5 nyefeenụ nwoke ahụ n’aka Setan+ ka e bibie ihe nwere ike ime ka ọgbakọ na-eme mmehie,* ka a gharakwa inwe ihe ga-emebi adịm ná mma ọgbakọ na Chineke n’ụbọchị Onyenwe anyị.+
6 Isi unu na-anya adịghị mma. Ọ̀ bụ na unu amaghị na ntakịrị ihe na-eko achịcha na-eme ka ntụ ọka niile a gwakọtara agwakọta koo?+ 7 Wepụnụ ihe ahụ na-eko achịcha, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta, n’ihi na unu dị ka ntụ ọka a na-etinyeghị ihe na-eko achịcha. N’eziokwu, Kraịst ejirila ndụ ya chụọ àjà,+ si otú ahụ bụrụ nwa atụrụ anyị ji mee Ememme Ngabiga.+ 8 N’ihi ya, anyị mewe ememme ọzọ,+ ka anyị ghara iji achịcha ochie koro eko, gharakwa iji ihe na-eko achịcha nke nọchiri anya ime mmehie na ime ihe ọjọọ. Kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko, nke nọchiri anya ịkwụwa aka ọtọ na ikwu eziokwu.
9 N’akwụkwọ ozi m detaara unu, m gwara unu ka unu na ndị na-akwa iko* kwụsị ịna-emekọrịta ihe.* 10 Anaghị m ekwu gbasara ndị niile na-akwa iko* n’ụwa a+ ma ọ bụ ndị anyaukwu ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị. N’ihi na ọ bụrụ ihe m na-ekwu, ọ pụtara na unu ga-esi n’ụwa pụọ.+ 11 Ma, akwụkwọ m na-edetara unu ugbu a bụ ka unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna, bụ́ onye na-akwa iko,* ma ọ bụ onye anyaukwu,+ ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị, ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ,* ma ọ bụ onye aṅụrụma,+ ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe,+ kwụsị ịna-emekọrịta ihe.*+ Unu na onye dị otú a erikọkwala ihe. 12 Gịnị jikọrọ mụ na ndị na-anọghị n’ọgbakọ, nke m ga-eji kpewe ha ikpe? Ọ bụ ndị nọ n’ọgbakọ ka unu kwesịrị ikpe ikpe, 13 ebe Chineke ga-ekpe ndị na-anọghị n’ọgbakọ ikpe.+ “Kewapụnụ onye ọjọọ ahụ n’ọgbakọ.”+
6 Gịnị mere o ji abụ unu na ibe unu see okwu,+ unu ewega okwu unu n’ụlọikpe ka ndị na-amaghị Chineke kpeere unu ikpe? Ọ́ bụghị ndị nsọ ka unu kwesịrị ịga kpesara ya? 2 Ka ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị nsọ ga-ekpe ụwa ikpe?+ Ọ bụrụkwa na ọ bụ unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ̀ bụzi ụmụ obere ihe ndị na-esere unu ka unu na-agaghị edozili? 3 Ọ̀ bụ na unu amaghị na anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe?+ Gịnịzi mere na anyị agaghị edozili ụmụ obere ihe ndị na-esere anyị ugbu a? 4 N’ihi ya, ọ bụrụ na unu nwere obere okwu ndị e kwesịrị idozi,+ gịnị mere o ji bụrụ ndị ọgbakọ weere na ha erughị eru na-ekpere unu ikpe? 5 M na-ekwu ihe a ka ihere mee unu. Ọ̀ bụ na e nweghị onye ọ bụla ma ihe n’ime unu ga-ekpeziliri nwanna na nwanna ibe ya? 6 Ma, nwanna na nwanna na-aga n’ụlọikpe, ndị na-amaghị Chineke ana-ekpere ha ikpe.
7 Ọ bụrụ na unu na-akpụpụ ibe unu ụlọikpe, unu na-emenye onwe unu ihere. Gịnị mere unu enweghị ike idi ihe ọjọọ ụmụnna unu mere unu?+ Ọ́ kaghị mma ka unu hapụ ha ka ha rigbuo unu? 8 Ma, unu na-eme ụmụnna unu ihe ọjọọ, na-erigbukwa ha.
9 Ka ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị ajọ omume agaghị eketa Alaeze Chineke?+ Unu ekwela ka e duhie unu. Ndị na-akwa iko,*+ ndị na-ekpere arụsị,+ ndị di ma ọ bụ ndị nwunye na-akwa iko,+ ndị na-ekwe ka ụmụ nwoke ibe ha dinaa ha,+ ndị na-edina ụmụ nwoke ibe ha,*+ 10 ndị ohi, ndị anyaukwu,+ ndị aṅụrụma,+ ndị na-ekwujọ mmadụ,* nakwa ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa Alaeze Chineke.+ 11 Ụfọdụ n’ime unu na-akpabu àgwà ndị a. Ma, Chineke asachaala unu,+ doo unu nsọ,+ kpọọkwa unu ndị ezi omume+ n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa n’ike mmụọ nsọ.
12 Enwere m ike ime ihe niile iwu na-egbochighị m ime, ma ọ bụghị ha niile bara uru.+ Enwere m ike ime ihe niile iwu na-egbochighị m ime, ma agaghị m ekwe ka ihe ọ bụla na-achị m. 13 Nri bụ maka afọ, afọ bụkwa maka nri, ma Chineke ga-ebibi ma afọ ma nri.+ Ahụ́ anyị abụghị maka ịkwa iko,* kama ọ bụ maka iji rụọrọ Onyenwe anyị ọrụ.+ Onyenwe anyị na-elekọtakwa ahụ́ anyị. 14 Ma Chineke kpọlitere Onyenwe anyị n’ọnwụ.+ Ọ ga-ejikwa ike ya+ kpọlite anyị n’ọnwụ.+
15 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ahụ́ unu na ahụ́ Kraịst bụ otu?+ Ùnu chere na m ga-esi n’ahụ́ unu wepụ ahụ́ Kraịst ma mee ka ahụ́ unu na ahụ́ nwaanyị akwụna bụrụ otu? Tụfịakwa! 16 Ọ̀ bụ na unu amaghị na onye ya na nwaanyị akwụna kwara iko, ya na ya bụzi otu ahụ́? N’ihi na Chineke sịrị, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́.”+ 17 Ma onye ya na Onyenwe anyị dị n’otu, ya na ya bụ otu mmụọ.+ 18 Gbaaranụ ịkwa iko* ọsọ.+ Mmadụ mee mmehie ọ bụla ọzọ, onye ahụ emehieghị ahụ́ ya, ma onye na-akwa iko na-emehie ahụ́ ya.+ 19 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ahụ́ unu bụ ụlọ nsọ,+ nakwa na mmụọ nsọ Chineke nyere unu bi na ya?+ Ọ bụghịzi unu nwe onwe unu,+ 20 n’ihi na Chineke ji ihe dị oké ọnụ zụta unu.+ N’ihi ya, jirinụ ahụ́ unu+ na-eto Chineke.+
7 A bịa n’ihe unu nọ na-ajụ m gbasara ya n’akwụkwọ ozi unu detaara m, ọ ka mma ka nwoke ghara ibitụ nwaanyị aka.* 2 Ma, ebe ọ bụ na ịkwa iko* zuru ebe niile, ka nwoke ọ bụla nwee nwunye nke ya,+ ka nwaanyị ọ bụla nweekwa di nke ya.+ 3 Ka di na-enye nwunye ya ihe ruuru ya, ka nwunye na-emekwara di ya otú ahụ.+ 4 Ọ bụghị nwunye na-achị ahụ́ ya, kama ọ bụ di ya. Ọ bụghịkwa di na-achị ahụ́ ya, kama ọ bụ nwunye ya. 5 Onye ajụla inye ibe ya ihe ruuru ya. Ma, ọ bụrụ na di na nwunye ekwekọrịta na ha ga-enwe oge ha ga-ahapụ inye ya ibe ha, ka ha wee jiri oge ahụ kpee ekpere, ọ dị mma otú ahụ. E mechaa, onye ọ bụla enyekwa ibe ya ihe ruuru ya, ka Setan wee ghara ịnọ na-anwa ha ọnwụnwa maka na ha ejidelighị onwe ha. 6 Ma, ọ bụghị iwu ka m na-enye unu, kama ọ bụ ihe unu nwere ike ime. 7 Ma, ọ dị m ka ya bụrụ na mmadụ niile dị otú a m dị. Otú o sina dị, Chineke nyere onye ọ bụla onyinye nke ya.+ Ọ bụ ya mere e ji nwee ndị lụrụ di na ndị lụrụ nwunye, nweekwa ndị na-alụghị.
8 M na-agwa ndị na-alụghị di na ndị na-alụghị nwunye na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, na ọ kaara ha mma ịnọ otú a m nọ.+ 9 Ma ọ bụrụ na ha agaghị ejideli onwe ha, ka ha lụọ di ma ọ bụ nwunye, n’ihi na ọ ka mma ka mmadụ lụọ di ma ọ bụ nwunye karịa ịhapụ ịlụ, agụụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị ana-agụgbu ya.+
10 Ana m agwa ndị di na nwunye na nwaanyị ekwesịghị ịhapụ di ya. Ma ọ bụghị m na-agwa ha ihe a, kama ọ bụ Onyenwe anyị.+ 11 Ma ọ bụrụ na ọ hapụ ya, ya nọrọ n’alụghị di. Ma ọ́ gaghị anọli, ya gaa ka ya na di ya kpezie. Di ekwesịghịkwa ịhapụ nwunye ya.+
12 Ma ana m agwa ndị ọzọ, sị: Ọ bụrụ na e nwere nwanna nwunye ya na-ekweghị n’Onyenwe anyị, ma nwunye ya ahụ ekweta ka ya na ya biri, ka ọ ghara ịhapụ ya. Ọ bụ mụnwa na-ekwu ihe a, ọ bụghị Onyenwe anyị.+ 13 Ọ bụrụkwa na e nwere nwanna nwaanyị di ya na-ekweghị n’Onyenwe anyị, ma di ya ahụ ekweta ka ya na ya biri, ka ọ ghara ịhapụ di ya. 14 N’ihi na e nwere ike ịsị na di ahụ na-ekweghị n’Onyenwe anyị dị nsọ n’ihi mmekọrịta ya na nwunye ya. E nwekwara ike ịsị na nwunye ahụ na-ekweghị n’Onyenwe anyị dị nsọ n’ihi mmekọrịta ya na nwanna ahụ. Ma ọ bụrụ na ha ebighị, ụmụ ha ga-abụ ndị na-adịghị ọcha. Ma ugbu a, ha dị nsọ. 15 Ma ọ bụrụ na onye nke na-ekweghị n’Onyenwe anyị chọrọ ịhapụ nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị, ya hapụ ya. Iwu ejighịzi nwanna ahụ ịnọrọ onwe ya. Chineke emeela ka anyị nọrọ n’udo.+ 16 Gịnwa bụ́ nwunye, ọ bụrụ na gị na di gị ebiri, i nwere ike ịzọpụta ya.+ Gịnwa bụ́ di, ọ bụrụ na gị na nwunye gị ebiri, i nwekwara ike ịzọpụta ya.
17 Ka onye ọ bụla nọrọ otú ọ nọ Jehova* akpọọ ya ka o sowe ụzọ Jizọs, ka ọ na-ebikwa ndụ otú ahụ Chineke hapụrụ ya ka ọ nọrọ.+ Ihe a ka m na-agwa ọgbakọ niile ka ha mee. 18 E nwee onye Chineke kpọrọ mgbe e bicharala ya úgwù,+ ya nọrọ otú ahụ. E nweekwa onye ọ kpọrọ mgbe a na-ebibeghị ya úgwù, ya agakwala ka e bie ya úgwù.+ 19 Ihe dị mkpa bụ ka mmadụ na-edebe iwu Chineke,+ ọ bụghị ma è biri ya úgwù ma ọ bụ na e bighị ya.+ 20 Otú ọ bụla onye ọ bụla dị mgbe a kpọrọ ya, ya dịgide otú ahụ.+ 21 À kpọrọ gị mgbe ị bụ ohu? Echegbula onwe gị maka ya.+ Ma ọ bụrụ na i nwere ike inwere onwe gị, nwere onwe gị. 22 N’ihi na e meela ka onye ọ bụla na-eso ụzọ Onyenwe anyị, nke a kpọrọ mgbe ọ bụ ohu, nwere onwe ya ma bụrụ nke Onyenwe anyị.+ Onye a kpọkwara mgbe o nweere onwe ya bụ ohu Kraịst. 23 Chineke ji ihe dị oké ọnụ zụta unu.+ Kwụsịnụ ịgbara mmadụ ohu. 24 Ụmụnna m, otú ọ bụla onye ọ bụla dị mgbe a kpọrọ ya, ya dịgide otú ahụ, na-emekwa ka ya na Chineke na-adị ná mma.
25 E nweghị iwu ọ bụla Onyenwe anyị sị ka m nye ndị na-amaghị nwoke na ndị na-amaghị nwaanyị.* Ihe m na-ekwu bụ uche m,+ unu kwesịkwara ịnabata ya n’ihi ebere Onyenwe anyị meere m. 26 Ebe ọ bụ na anyị bi n’oge ihe siri ike, echere m na ọ kacha mma ka mmadụ nọrọ otú ọ nọ. 27 Ọ bụrụ na ị lụọla nwaanyị, echela echiche ịhapụ ya.+ Ọ bụrụkwa na ị lụbeghị,* achọla nwaanyị ị ga-alụ. 28 Ma a sịgodị na ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, i mehieghị. Ọ bụrụkwa na onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ onye na-amaghị nwaanyị alụọ di ma ọ bụ nwunye, o mehieghị. Ma, ndị lụrụ ga-enwe ọtụtụ nsogbu. Ma m na-achọ ịzọ unu.
29 Ụmụnna m, burunụ n’uche na oge fọdụrụ dị ntakịrị.+ Si ugbu a gawa, ka ndị lụrụ nwaanyị dịrị ka ndị na-alụghị nwaanyị. 30 Ka ndị na-ebe ákwá dịrị ka ndị na-anaghị ebe ákwá. Ka ndị na-aṅụrị ọṅụ dịrị ka ndị na-anaghị aṅụrị ọṅụ. Ka ndị na-azụ ihe dịrị ka ndị zụcharanụ gbara aka. 31 Ka ndị na-erite uru n’ụwa a dịrịkwa ka ndị na-anaghị eritecha uru niile dị na ya, n’ihi na ihe ndị na-eme n’ụwa a na-agbanwe agbanwe. 32 N’eziokwu, achọrọ m ka unu ghara ịna-echegbu onwe unu. Onye na-alụghị nwaanyị na-eche naanị gbasara ọrụ Onyenwe anyị, n’ihi na ọ na-achọ ime ihe dị Onyenwe anyị mma. 33 Ma onye lụrụ nwaanyị na-echegbu onwe ya maka ihe ụwa a,+ n’ihi na ọ na-achọ ime ihe dị nwunye ya mma. 34 N’ihi ya kwa, obi ya anaghị adị otu ebe. Ma, nwaanyị na-alụghị di na nwaanyị na-amaghị nwoke na-eche naanị ihe gbasara Onyenwe anyị,+ n’ihi na ha na-achọ ka ahụ́ ha na uche ha dị nsọ. Ma, nwaanyị lụrụ di na-echegbu onwe ya maka ihe ụwa a, n’ihi na ọ na-achọ ime ihe dị di ya mma. 35 Ma ana m ekwu ihe a maka ọdịmma unu, ọ bụghị iji gbochie unu ime ihe unu chọrọ ime,* kama ọ bụ iji mee ka unu na-eme ihe kwesịrị ekwesị, meekwa ka a ghara inwe ihe ga-eme ka uche unu ghara ịdị n’ozi unu ji obi unu niile na-ejere Onyenwe anyị.
36 Ma, ọ bụrụ na onye na-alụbeghị di ma ọ bụ onye na-alụbeghị nwunye* echee na ya anaghị ejideli onwe ya ma agụụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị gụwa ya, ya abụrụkwa na ọ bụghịzi nwata,* ya chọọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ya lụọ,+ o mehieghị. 37 Ma, ọ bụrụ na mmadụ ekpebie na ya agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye,* n’ihi na ọ naghị agụ ya, ya abụrụkwa na ọ kwụsiri ike n’ihe o kpebiri, nakwa na ọ na-ejideli onwe ya, ọ ga-abara ya uru.+ 38 N’ihi ya, onye lụrụ di ma ọ bụ onye lụrụ nwunye ga-erite uru. Ma, onye na-alụghị ga-aka erite uru.+
39 Nwaanyị enweghị ikike ịlụ di ọzọ mgbe di ya dị ndụ.+ Ma di ya nwụọ, o nwere ike ịlụ onye ọ chọrọ. Ma, ọ ga-alụ naanị onye na-eso ụzọ Onyenwe anyị.+ 40 Ma n’uche m, obi ga-aka adị ya ụtọ ma ọ nọrọ otú ọ nọ. Obi sikwara m ike na m nwere mmụọ Chineke.
8 Ihe m na-edere unu ugbu a bụ gbasara nri e ji chụọrọ arụsị àjà.+ Anyị ma na anyị niile ma gbasara ihe a.+ Ma, mmadụ ịma ọtụtụ ihe na-eme ka ọ dị mpako. Ma, ịhụnanya na-eme ka mmadụ sikwuo ike.+ 2 Ọ bụrụ na e nwere ihe mmadụ chere na ọ ma, n’eziokwu, ọ mabeghị ihe niile gbasara ihe ahụ. 3 Ma ọ bụrụ na mmadụ hụrụ Chineke n’anya, Chineke ma onye ahụ.
4 A bịa n’okwu gbasara iri nri e ji chụọrọ arụsị àjà, anyị ma na o nweghị ihe arụsị bụ,+ marakwa na e nwere naanị otu Chineke.+ 5 Ọ bụ eziokwu na e nwere chi dị iche iche, ma ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa,+ nweekwa ọtụtụ ndị e weere na ha bụ chi nakwa ọtụtụ ndị e weere na ha bụ ndị nwe mmadụ, 6 ma naanị otu Chineke ka anyị nwere.+ Ọ bụ Nna,+ onye kere ihe niile, ndụ anyị dị bụkwa maka ya.+ Otu Onyenwe anyị dịkwa, ya bụ, Jizọs Kraịst, onye Chineke si n’aka ya mee ka ihe niile dịrị,+ anyị sikwa n’aka ya dịwa ndụ.
7 Ma, ọ bụghị mmadụ niile ma ihe a.+ Ma ebe ụfọdụ ndị na-efebu arụsị, ọ na-abụ ha na-eri ihe ma na-ele nri ahụ anya ka ihe e ji chụọrọ arụsị àjà,+ akọnuche ha na-esighị ike ana-enye ha nsogbu.*+ 8 Ma nri agaghị eme ka anyị bịaruo Chineke nso.+ Ọ bụrụ na anyị erighị ihe, o nweghị ihe kọrọ anyị. Ọ bụrụkwa na anyị erie ihe, o nweghị uru anyị ritere.+ 9 Ma, kpacharanụ anya ka a ghara inwe otú ọ bụla ikike unu nwere ime ihe unu chọrọ ime ga-esi mee ka ndị na-esighị ike zọhie ụkwụ.+ 10 N’ihi na ọ bụrụ na nwanna akọnuche ya na-esighị ike ahụ gịnwa, bụ́ onye ma ihe ndị a nke ọma, ka ị nọ n’ụlọ arụsị na-eri nri, ọ̀ bụ na akọnuche ya agaghị eme ka obi kaa ya iri nri e ji chụọrọ arụsị àjà? 11 Ihe a mee, ọ pụtara na i jirila ihe ị ma mee ka nwanna gị na-esighị ike, onye Kraịst ji maka ya nwụọ, zọhie ụkwụ.+ 12 Ọ bụrụ na unu si otú a na-emehie ụmụnna unu, na-emekwa ka ha na-eme ihe akọnuche ha na-esighị ike sị ha emela,+ unu na-emehie Kraịst. 13 N’ihi ya, ọ bụrụ na ihe m na-eri ga-eme ka nwanna m zọhie ụkwụ, m gaghị atakwa anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m zọhie ụkwụ.+
9 Ọ̀ bụ na mụ enweghị ike ime ihe m chọrọ ime? Ọ̀ bụ na mụ abụghị onyeozi? Ọ̀ bụ na mụ ahụghị Jizọs Onyenwe anyị?+ Ọ̀ bụ na unu abụghị ihe m rụpụtara n’ọrụ Onyenwe anyị? 2 Ọ bụrụgodị na abụghị m onyeozi maka ndị ọzọ, n’eziokwu, abụ m onyeozi maka unu. N’ihi na unu bụ ihe akaebe na-egosi na abụ m onyeozi nke Onyenwe anyị.
3 Ihe m na-agwa ndị na-akatọ m bụ: 4 Ọ̀ bụ na anyị enweghị ike isi n’aka ndị ọzọ na-enweta ihe anyị ga na-eri na ihe anyị ga na-aṅụ? 5 Ọ̀ bụ na anyị enweghị ike ịlụ nwanna nwaanyị,+ ya esoro anyị na-agagharị, otú ahụ ndịozi ndị ọzọ na ụmụnne Onyenwe anyị+ na Sifas*+ mere? 6 Ka ọ̀ bụ naanị mụ na Banabas+ bụ ndị na-enweghị ike ịkwụsị ịrụ ọrụ anyị ji akpa afọ anyị? 7 È nwere onye agha na-esi n’akpa ya egbo mkpa ya niile mgbe ọ bụ onye agha? È nwere onye na-akọ ubi vaịn nke na-anaghị eri mkpụrụ ya?+ Ka è nwere onye na-akpa anụ nke na-anaghị aṅụ mmiri ara nke si n’anụ ahụ?
8 Ihe ndị a m na-ekwu abụghị naanị uche mmadụ. Iwu Mosis kwukwara ha. 9 N’ihi na e dere n’Iwu Mosis, sị: “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha ọka.”+ Chineke ò kwuru ihe a maka na ọ na-eche gbasara ehi? 10 Ọ́ bụghị maka anyị ka o ji kwuo ya? N’eziokwu, ọ bụ maka anyị ka e ji dee ya, n’ihi na onye na-akọ ubi ọka na onye na-azọcha ọka kwesịrị inwe olileanya mgbe ha na-arụ ọrụ na ha ga-enweta ọka.
11 Ọ bụrụ na anyị akụọla ihe ndị si n’aka Chineke n’ime unu, ọ̀ bụ ihe ọjọọ ma anyị si n’aka unu nweta ihe ụfọdụ anyị ga-eji na-egbo mkpa anyị?+ 12 Ọ bụrụ na ndị ọzọ nwere ikike isi n’aka unu nweta ihe, ọ̀ bụ na anyị akaghị ha nwee ikike a? N’agbanyeghị na anyị nwere ikike a, o nweghị ihe ọ bụla anyị si n’aka unu nweta.+ Kama anyị na-edi ihe niile, ka anyị wee ghara isi ụzọ ọ bụla mee ka ozi ọma gbasara Kraịst ghara ịna-aga aga.+ 13 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-arụ ọrụ dị nsọ na-eri ihe ndị dị n’ụlọ nsọ, nakwa na ndị na-arụ ọrụ mgbe niile n’ebe a na-achụ àjà na-eketa ihe ụfọdụ e ji chụọ àjà?+ 14 Ọ bụkwa otú ahụ ka Onyenwe anyị si kwuo ka e si n’ozi ọma ndị na-ezi ozi ọma na-ezisa nyejuo ha afọ.+
15 Ma, agwabeghị m unu ka unu nye m ihe ọ bụla.+ N’eziokwu, ihe mere m ji ede ihe ndị a abụghị ka unu nye m ihe. Ọ kaara m mma ịnwụ kama ikwe ka mmadụ ọ bụla mee ka m kwụsị ịnya isi na o nweghị onye na-akwụ m ụgwọ maka ozi ọma m na-ezisa.+ 16 Ọ bụrụkwa na m na-ezisa ozi ọma, ọ bụghị ihe mere m ga-eji na-anya isi, n’ihi na ọ bụ ihe m kwesịrị ime. N’eziokwu, m ga-ata ahụhụ ma ọ bụrụ na anaghị m ezisa ozi ọma.+ 17 Ọ bụrụ na m ji obi m niile na-ezisa ya, a ga-akwụ m ụgwọ. Ọ bụrụgodị na ọ bụghị ihe m chọrọ ime, m ga-emerịrị ya n’ihi na ọ bụ ọrụ Chineke họpụtara m ka m na-arụ.+ 18 Gịnịzi bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ịna-ezisa ozi ọma n’anaraghị ihe ọ bụla. Ọ bụrụ na m si otú ahụ na-ezisa ya, agaghị m asị ka e nye m ihe e kwesịrị inye m maka ozi ọma m na-ezisa.
19 Ọ bụ eziokwu na o nweghị mmadụ ọ bụla m bụ ohu ya, emeela m onwe m ohu mmadụ niile, ka m wee nyere ọtụtụ ndị aka ka ha sowe ụzọ Jizọs. 20 N’ihi ya, m gakwuru ndị Juu, mụ emewe ka onye Juu iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs.+ M gakwuru ndị na-edebe Iwu Mosis, mụ emewe ka onye na-edebe Iwu Mosis iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs, ọ bụ eziokwu na iwu ejighị m idebe Iwu Mosis.+ 21 M gakwuru ndị na-anaghị edebe Iwu Mosis, mụ emewe ka onye na-anaghị edebe Iwu Mosis iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs, ọ bụ eziokwu na m na-edebe Iwu Chineke na nke Kraịst.+ 22 M gakwuru ndị na-esighị ike, mụ emewe ka onye na-esighị ike iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs.+ Emeela m ihe niile iji nyere ụdị mmadụ niile aka, ka m wee si otú ọ bụla m nwere ike zọpụta ụfọdụ n’ime ha. 23 Ana m eme ihe niile n’ihi ozi ọma, ka m wee na-ezisara ya ndị ọzọ.+
24 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị niile na-agba ọsọ n’ọsọ ịsọ mpi na-agba ọsọ, ma naanị otu onye na-enweta ihe a na-enye onye meriri? Na-agbanụ ọsọ otú ga-eme ka unu merie.+ 25 Ndị niile so n’asọmpi na-ejide onwe ha n’ihe niile. Ha na-eme ya iji nweta ihe nrite* nwere ike imebi emebi,+ ma anyịnwa na-eme ya iji nweta ihe nrite na-enweghị ike imebi emebi.+ 26 N’ihi ya, m na-agba ọsọ maka na ama m ebe m gba na-aga,+ m na-etikwa ọkpọ otú ọ na-agaghị abụ ikuku ka m na-eti ya. 27 Ma, m na-ejidesi onwe m ike,* na-eme ka ahụ́ m bụrụ ohu m,+ ka ọ ghara ịbụ m kwusachaara ndị ọzọ ozi ọma, Chineke ajụ m.
10 Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mara na nna nna anyị hà so onyinyo ígwé ojii na-aga ebe ha na-aga,+ ha niile sikwa n’oké osimiri gafee.+ 2 E jikwa ígwé ojii ahụ na oké osimiri ahụ mee ha niile baptizim ka ha na-eso Mosis. 3 Ha niile rikwara nri Chineke nyere ha.+ 4 Ha niile ṅụkwara mmiri Chineke nyere ha.+ Ha na-aṅụbu mmiri si n’oké nkume dị ha nso. Oké nkume ahụ nọchikwara anya Kraịst.+ 5 Ma, Chineke anabataghị ọtụtụ n’ime ha. Ọ bụ ya mere e ji bibie ha n’ala ịkpa.+
6 Anyị kwesịrị ịmụta ihe n’ihe a, ka ihe ọjọọ ghara ịna-agụ anyị agụụ otú ọ gụrụ ha.+ 7 Unu ekperela arụsị otú ụfọdụ n’ime ha kpeere. E dere gbasara ha, sị: “Ndị Izrel nọdụrụ ala riwe ihe ma ṅụwa mmanya. Ha biliziri kporiwe ndụ.”+ 8 Ka anyị gharakwa ịkwa iko* otú ụfọdụ n’ime ha kwara, nke mere ka puku iri abụọ na puku atọ (23,000) n’ime ha nwụọ n’otu ụbọchị.+ 9 Ka anyị gharakwa ịnwa Jehova*+ otú ụfọdụ n’ime ha nwara ya, nke mere ka agwọ tagbusịa ha.+ 10 Unu atamukwala ntamu otú ụfọdụ n’ime ha tamuru,+ mmụọ ozi* alaa ha n’iyi.+ 11 E dekwara ihe ndị a mere ha n’akwụkwọ ka e jiri ya kụziere anyị ihe,+ ka anyịnwa ndị bi n’ọgwụgwụ oge a ghara ime ka ha.
12 N’ihi ya, ka onye chere na ya kwụ chịm lezie anya ka ọ ghara ịda.+ 13 Ọnwụnwa na-abịara unu na-abịakwara mmadụ niile.+ Ma, Chineke na-emezu ihe o kwuru, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu karịa otú unu ga-edili.+ N’ihi ya, ọnwụnwa bịara unu, ọ ga-enyere unu aka idi ya.+
14 N’ihi ya, ndị m hụrụ n’anya, gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ.+ 15 Unu na-aghọta ihe. N’ihi ya, leenụ ma ihe a m na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu. 16 Iko mmanya anyị na-ekele Chineke maka ya, ọ́ bụghị ọbara Kraịst ka ọ nọchiri anya ya?+ Achịcha ahụ anyị na-anyawa, ọ́ bụghịkwa ahụ́ Kraịst ka ọ nọchiri anya ya?+ 17 Ihe e nwere bụ otu achịcha. N’ihi ya, n’agbanyeghị na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ́,+ ebe anyị niile so na-ata otu achịcha ahụ.
18 Chetanụ ndị Izrel. Mgbe ha na-eri ihe ndị a chụrụ n’àjà n’ebe ịchụàjà, ọ́ naghị adị ka ọ̀ bụ ha na Chineke na-erikọ ihe?+ 19 Ihe a m kwuru ọ̀ pụtara na arụsị na ihe ndị e ji chụọrọ arụsị àjà bara uru? 20 Mba. Kama ihe m na-ekwu bụ na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ka ndị mba ọzọ na-achụrụ àjà, ọ bụghị Chineke.+ Achọghịkwa m ka unu na ndị mmụọ ọjọọ na-emekọ ihe.+ 21 Unu ekwesịghị ịna-aṅụ ihe dị n’iko Jehova* na-aṅụkwa ihe dị n’iko ndị mmụọ ọjọọ. Unu ekwesịghịkwa ịna-eri ihe dị na “tebụl Jehova”*+ na-erikwa ihe dị na tebụl ndị mmụọ ọjọọ. 22 Ka ‘ànyị na-akpasu Jehova* iwe’?+ Ànyị ka ya ike?
23 Anyị nwere ike ime ihe niile iwu na-egbochighị anyị ime, ma ọ bụghị ha niile bara uru. Anyị nwere ike ime ihe niile iwu na-egbochighị anyị ime, ma ọ bụghị ha niile ga-agba anyị ume.+ 24 Ka onye ọ bụla na-achọ ihe ga-abara onye ọzọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara naanị yanwa uru.+
25 Na-erinụ ihe niile a na-ere n’ọdụ anụ, n’ajụghị ase ọ bụla n’ihi akọnuche unu, 26 n’ihi na “ọ bụ Jehova* nwe ụwa na ihe niile dị n’ime ya.”+ 27 Ọ bụrụ na onye na-abụghị nwanna akpọọ unu òkù, unu achọọkwa ije, rienụ ihe ọ bụla o bupụtaara unu, n’ajụghị ase ọ bụla maka akọnuche unu. 28 Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, “E ji anụ a chụọrọ arụsị àjà,” unu erila ya ka unu ghara ime ka onye ahụ gwara unu ya mehie, gharakwa ime ka akọnuche onye ọ bụla nyewe ya nsogbu.+ 29 Akọnuche m na-ekwu abụghị nke unu, kama nke ndị ọzọ. N’ihi na m gaghị eme ihe m nweere onwe m ime, ma ọ bụrụ na akọnuche onye ọzọ ga-ama m ikpe.+ 30 Ọ bụrụgodị na m riri ihe, keleekwa Chineke maka ya, m̀ kwesịrị iri ihe ahụ ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ndị ọzọ katọwa m?+
31 N’ihi ya, ma ùnu na-eri ihe ma ùnu na-aṅụ ihe ma ùnu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe niile otú ga-eme ka e too Chineke.+ 32 Unu emela ihe ga-ewute ndị Juu na ndị Grik nakwa ọgbakọ Chineke.+ 33 M na-agba mbọ eme ihe ga-abara ndị ọzọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara m uru.+ M na-eme ihe niile otú ọ ga-adị mmadụ niile mma, ka e nwee ike ịzọpụta ha.+
11 Na-emenụ ka m,* otú mụnwa si eme ka Kraịst.+
2 Ụmụnna m, unu emeela maka otú unu si echeta m n’ihe niile, nakwa maka otú unu si eme ihe niile m kụziiri unu. 3 Ma, achọrọ m ka unu mara na Kraịst bụ onyeisi nwoke ọ bụla.+ Nwoke bụ onyeisi nwaanyị,+ Chineke bụkwa onyeisi Kraịst.+ 4 Nwoke ọ bụla nke kpuchiri isi ya na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ebu amụma na-emenye onyeisi ya ihere. 5 Ma, nwaanyị ọ bụla na-ekpuchighị isi ya na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ebu amụma+ na-emenye onyeisi ya ihere, n’ihi na ya na nwaanyị kpụrụ isi ya akpụ bụ otu. 6 N’ihi ya, ọ bụrụ na nwaanyị anaghị ekpuchi isi ya, ya kpụọ isi ya. Ma, ọ bụrụ na ihere na-eme nwaanyị ma ọ kpụọ isi ya ma ọ bụ kpachapụ ntutu isi ya, ya kpuchie isi ya.
7 Nwoke ekwesịghị ikpuchi isi ya, n’ihi na Chineke kere ya n’oyiyi ya+ nakwa n’ebube ya. Ma nwaanyị bụ ebube nwoke. 8 N’ihi na Chineke esighị n’ahụ́ nwaanyị kee nwoke, ma, o si n’ahụ́ nwoke kee nwaanyị.+ 9 Chineke ekeghịkwa nwoke n’ihi nwaanyị, ma, o kere nwaanyị n’ihi nwoke.+ 10 N’ihi ihe a nakwa n’ihi ndị mmụọ ozi,+ nwaanyị kwesịrị ikpuchi isi ya, ka o gosi na ọ nọ n’okpuru nwoke.
11 N’ọgbakọ Onyenwe anyị, nwaanyị enweghị ike ịdị ma nwoke adịghị, nwoke enweghịkwa ike ịdị ma nwaanyị adịghị. 12 N’ihi na otú ahụ o si bụrụ na e si n’ahụ́ nwoke kee nwaanyị,+ ka o sikwa bụrụ na nwaanyị na-amụ nwoke. Ma, ọ bụ Chineke kere ihe niile.+ 13 Chegodịnụ ma ò kwesịrị ekwesị ka nwaanyị ghara ikpuchi isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere. 14 Otú e si kee mmadụ ọ́ naghị akụziri unu na nwoke na-emenye onwe ya ihere ma ọ hapụ ntutu isi ya ka o too ogologo? 15 Ma, ọ bụrụ na nwaanyị ahapụ ntutu isi ya ka o too ogologo, ọ́ naghị eme ka a na-aja ya mma? N’ihi na Chineke nyere nwaanyị ogologo ntutu isi kama inye ya ákwà isi. 16 Ma, ọ bụrụ na e nwere onye na-ekwetaghị ihe a, gwanụ ya na o nweghị otú ọzọ ọgbakọ Chineke si eme ya.
17 Ma, ọ bụ eziokwu na m na-agwa unu ihe ndị unu kwesịrị ịna-eme, anaghị m aja unu mma, maka na nzukọ unu na-enwe na-aghọ unu ahịa kama ịbara unu uru. 18 N’ihi na ana m anụ na unu na-akpa iche iche n’ọgbakọ unu ma unu zukọọ. Ọ dịkwa m ka ọ̀ bụ eziokwu. 19 Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụrịrị na òtù dị iche iche dịzi n’ọgbakọ unu,+ ka e si otú ahụ mata ndị omume ha dị Chineke mma n’ime unu.
20 Ọ na-abụ unu zukọọ otu ebe maka iri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị,+ unu anaghị eri ya otú kwesịrị ekwesị. 21 N’ihi na ọ na-abụ tupu oge unu ga-eri ya eruo, ụfọdụ n’ime unu na-ebu ụzọ rie nri anyasị nke ha, nke mere na agụụ na-agụ ụfọdụ, mmanya ana-egbu ụfọdụ. 22 Ọ̀ bụ na unu enweghị ụlọ unu ga-anọ rie ihe ma ṅụọ mmanya? Ka ùnu na-eleda ọgbakọ Chineke anya ma na-eme ka ihere mee ndị na-enweghị ihe ọ bụla? Gịnị ka m ga-agwa unu? Ọ̀ bụ m jawa unu mma? Mbanụ. Agaghị m aja unu mma n’ihe a unu na-eme.
23 N’ihi na ọ bụ ihe Onyenwe anyị kụziiri m ka m na-akụziri unu. N’abalị ahụ+ a ga-arara Onyenwe anyị Jizọs nye n’aka ndị iro ya, o weere otu ogbe achịcha. 24 Mgbe o kelechara Chineke, ọ nyawara ya, sị: “Nke a pụtara ahụ́ m,+ nke m ga-enye n’ihi unu. Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”+ 25 Mgbe ha richara nri anyasị,* o buuru iko, meekwa otu ihe ahụ.+ Ọ sịrị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ+ nke ga-enwe isi mgbe m wụpụrụ ọbara m.+ N’oge niile unu na-aṅụ ihe dị n’ime iko a, na-emenụ ya iji na-echeta m.”+ 26 N’ihi na n’oge niile unu na-ata achịcha a ma na-aṅụ mmanya dị n’iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịa.
27 N’ihi ya, onye ọ bụla na-erughị eru taa achịcha ahụ ma ọ bụ ṅụọ mmanya dị n’iko Onyenwe anyị emehiela ahụ́ na ọbara Onyenwe anyị. 28 Ka mmadụ buru ụzọ nyochaa onwe ya.+ Ọ bụrụ na ọ chọpụtakwa na ya ruru eru, ya taa achịcha ahụ ma ṅụọ mmanya dị n’iko ahụ. 29 N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ na-ata achịcha a ma na-aṅụ mmanya dị n’iko a, ma ọ maghị na ha nọchiri anya ahụ́ Onyenwe anyị, ọ na-ama onwe ya ikpe. 30 Ọ bụ ya mere na ọtụtụ n’ime unu adịghị ike, ọtụtụ na-arịa ọrịa, ọtụtụ anwụọkwala.*+ 31 Ma ọ bụrụ na anyị nyochara onwe anyị nke ọma, a gaghị ekpe anyị ikpe. 32 Ma, ọ bụrụ na anyị enyochaghị onwe anyị, a na-ekpe anyị ikpe, Jehova* na-esikwa otú ahụ gbazie anyị,+ ka a ghara ịmakọ anyị na ụwa ikpe.+ 33 N’ihi ya, ụmụnna m, mgbe unu zukọtara iri ya, cherenụ ibe unu. 34 Ọ bụrụ na e nwere onye agụụ na-agụ, ya rie ihe n’ụlọ, ka ọ ga-abụ unu zukọta, a gaghị ekpe ya ikpe.+ Ma, m ga-edozi okwu ndị fọdụrụ mgbe m rutere ebe ahụ.
12 Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mara nke a na-akọ gbasara onyinye dị iche iche Chineke na-enye.+ 2 Unu ma na tupu unu aghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs,* e duhiere unu, unu ana-efe arụsị dị iche iche na-anaghị ekwu okwu,+ ha eduru unu na-aga ebe ọ bụla dị ha mma. 3 Ma, achọrọ m ka unu mara na o nweghị onye mmụọ Chineke na-edu na-asị: “A bụrụ Jizọs ọnụ.” O nweghịkwa onye nwere ike ịsị: “Jizọs bụ Onyenwe anyị,” ọ gwụkwala ma mmụọ nsọ ọ̀ na-edu ya.+
4 E nwere onyinye dị iche iche, ma, ọ bụ mmụọ nsọ na-eme ka mmadụ nwee nke ọ bụla.+ 5 E nwekwara ozi dị iche iche a na-eje iji nyere ndị ọzọ aka,+ ma, ha niile bụ maka otu Onyenwe anyị. 6 E nwere ọtụtụ ụzọ Chineke si eji ndị mmadụ arụ ọrụ dị iche iche, ma, ọ bụ otu Chineke na-eme ka ha na-arụ ha niile.+ 7 Ma, a na-ahụ otú mmụọ nsọ si enyere onye ọ bụla aka, ọ bụkwa Chineke na-enye mmụọ nsọ ka ọ baara mmadụ niile uru.+ 8 Mmụọ nsọ na-enyere otu onye aka iji amamihe ekwu okwu, otu mmụọ nsọ a na-enyekwara onye ọzọ aka ikwu ihe ndị ọzọ na-amaghị. 9 Mmụọ nsọ a na-eme ka otu onye nwee okwukwe,+ na-emekwa ka onye ọzọ nwee ike ịna-agwọ ọrịa.+ 10 Ọ na-enyere onye ọzọ aka ịrụ ọrụ ebube,+ na-eme ka onye ọzọ na-ebu amụma, na-enyere onye ọzọ aka ịghọta ma ihe e kwuru ò si n’ike mmụọ nsọ ka ọ̀ bụ na o sighị,+ na-eme ka onye ọzọ na-asụ asụsụ dị iche iche,+ na-enyekwara onye ọzọ aka ịsụgharị asụsụ dị iche iche.+ 11 Ma ihe ndị a niile ka otu mmụọ nsọ ahụ na-eme ka ndị mmadụ mee. Ọ na-enye onye ọ bụla ike ime ihe ọ bụla Chineke chọrọ ka o mee.
12 E nwere ọtụtụ ihe dị n’ahụ́. N’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ihe dị n’ahụ́, ọ bụ otu ahụ́.+ Otú ahụkwa ka ahụ́ Kraịst dị. 13 E ji otu mmụọ nsọ mee anyị niile baptizim, anyị abụrụ otu ahụ́, ma ànyị bụ ndị Juu ma ànyị bụ ndị Grik, ma ànyị bụ ndị ohu ma ànyị bụ ndị nweere onwe ha. Anyị niile nwekwara otu mmụọ nsọ.
14 N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe dị n’ahụ́, ọ bụghị otu ihe.+ 15 Ọ bụrụ na ụkwụ asị, “Ebe m na-abụghị aka, esoghị m n’ahụ́,” ọ gaghị eme ka ọ ghara iso n’ahụ́. 16 Ọ bụrụkwa na ntị asị, “Ebe m na-abụghị anya, esoghị m n’ahụ́,” ọ gaghị eme ka ọ ghara iso n’ahụ́. 17 Ọ bụrụ na ahụ́ niile bụ anya, olee ihe a ga-eji na-anụ ihe? Ọ bụrụ na ahụ́ niile bụ ntị, olee ihe a ga-eji na-anụ ísì ihe? 18 Ma, Chineke tinyere ihe ọ bụla dị n’ahụ́ otú ọ chọrọ.
19 A sị na ihe niile dị n’ahụ́ bụ otu ihe, olee otú ahụ́ gaara adị? 20 Ma, e nwere ọtụtụ ihe dị n’ahụ́, ma, ha niile bụ otu ahụ́. 21 Anya enweghị ike ịgwa aka, sị, “O nweghị ihe m ji gị eme.” Isi enweghịkwa ike ịgwa ụkwụ, sị, “O nweghị ihe m ji gị eme.” 22 Ma, ihe ndị dị n’ahụ́, ndị anyị na-ewere na ha abaghị uru, bakwara uru nke ha. 23 Ihe ndị dị n’ahụ́, ndị anyị chere na ha adịchaghị mma n’anya, ka anyị na-ekpuchi nke ọma.+ Ọ bụkwa ndị nke na-eme anyị ihere ka anyị na-edozi nke ọma. 24 Anyị anaghị edozi ndị nke dị mma n’anya otú ahụ. Ma, Chineke jikọtara ahụ́ ọnụ, meekwa ka a na-edozi ndị nke na-adịchaghị mma n’anya karịa otú e si edozi ndị ọzọ. 25 O mere ya otú a ka ihe dị iche iche dị n’ahụ́ ghara ịna-emegide ibe ha, kama ka ha niile na-enyerịtara ibe ha aka.+ 26 Ọ bụrụ na otu n’ime ihe ndị dị n’ahụ́ na-ata ahụhụ, ndị nke ọzọ niile na-eso ya ata ahụhụ.+ Ọ bụrụkwa na e too otu n’ime ihe ndị dị n’ahụ́, ndị nke ọzọ niile na-eso ya aṅụrị ọṅụ.+
27 Unu bụ ahụ́ Kraịst,+ onye ọ bụla n’ime unu sokwa bụrụ ahụ́ ya.+ 28 Chineke enyekwala ndị dị iche iche ọrụ ha ga na-arụ n’ọgbakọ. Nke mbụ, e nwere ndịozi.+ E nwekwara ndị amụma,+ nwee ndị na-akụzi ihe,+ nwee ndị na-arụ ọrụ ebube,+ nwee ndị na-agwọ ọrịa,+ nwee ndị na-enyere ndị ọzọ aka, nwee ndị na-eduzi ihe,+ nweekwa ndị na-asụ asụsụ dị iche iche.+ 29 Ọ̀ bụ ha niile bụ ndịozi? Ọ̀ bụ ha niile bụ ndị amụma? Ọ̀ bụ ha niile na-akụzi ihe? Ọ̀ bụ ha niile na-arụ ọrụ ebube? 30 Ọ̀ bụ ha niile nwere ike ịgwọ ọrịa? Ọ̀ bụ ha niile na-asụ asụsụ dị iche iche?+ Ọ̀ bụ ha niile bụ ndị nsụgharị?+ 31 Ma na-agbasinụ mbọ ike* ka unu nweta onyinye ka mma.+ Ma, m ga-egosi unu ihe kacha ihe ndị ọzọ niile mma.+
13 Ọ bụrụ na m na-asụ asụsụ dị iche iche ụmụ mmadụ na-asụ nakwa nke ndị mmụọ ozi na-asụ, ma ahụghị m ndị ọzọ n’anya, adị m ka ogele na-adachisị ndị mmadụ ntị ma ọ bụ ájà na-eme mkpọtụ. 2 Ọ bụrụkwa na m nwere ike ibu amụma, mara ihe nzuzo niile dị nsọ, e nyekwa m ike ịma ihe niile,+ mụ enweekwa okwukwe siri ezigbo ike nke na m nwere ike ibupụ ugwu, ma ahụghị m ndị ọzọ n’anya, o nweghị ihe m bụ.*+ 3 Ọ bụrụ na m na-enye ihe niile m nwere ka e jiri ha zụọ ndị ọzọ,+ ọ bụrụkwa na mụ ejiri ndụ m chụọ àjà, ka m wee na-anya isi, ma ahụghị m ndị ọzọ n’anya,+ o nweghị uru ọ bụla m ritere.
4 Ịhụnanya+ na-enwe ndidi,*+ dịrịkwa obiọma.+ Ọ naghị ekwo ekworo.+ Ọ naghị etu ọnụ, ọ naghịkwa ebuli onwe ya elu.+ 5 Ọ naghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị.*+ Ọ naghị achọ ihe ga-abara naanị ya uru.+ A naghị akpasu ya iwe ngwa ngwa.+ Ọ naghị agụkọ ihe ọjọọ e mere ya.+ 6 Ọ naghị aṅụrị ọṅụ n’ihe ọjọọ,+ kama ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ. 7 Ọ na-edi ihe niile,+ na-ekwere ihe niile,+ na-enwe olileanya ihe niile,+ na-atachi obi n’ihe niile.+
8 Ịhụnanya anaghị akwụsị akwụsị.* Ma, ike Chineke na-enye ndị mmadụ ibu amụma, na ịsụ asụsụ dị iche iche,* na ịmata ihe, ga-emecha ghara ịdị. 9 N’ihi na ihe anyị ma ezughị ezu,+ amụma anyị na-ebukwa ezughị ezu. 10 Ma, mgbe ihe anyị ma zuru ezu, amụma anyị na-ebu ezuokwa, ndị nke ahụ na-ezughị ezu agaghịzi adị. 11 Mgbe m bụ nwatakịrị, m na-ekwu okwu ka nwatakịrị, na-eche echiche ka nwatakịrị, na-elekwa ihe anya ka nwatakịrị. Ma ugbu a m bụzi dimkpa, anaghịzi m eme ka nwatakịrị. 12 Ka ọ dị ugbu a, ihe anyị ji ahụ ihe bụ enyo na-ahụ ihe inyoghi inyoghi. Ma mgbe ahụ, anyị ga na-ahụ ihe ihu na ihu. Ugbu a, ihe m ma gbasara Chineke ezughị ezu. Ma mgbe ahụ, m ga-ama ihe gbasara ya nke ọma, otú yanwa sikwa mara m nke ọma. 13 Ma, ihe atọ ndị a ga-afọdụ: okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nke kacha ha niile bụ ịhụnanya.+
14 Hụnụ ndị ọzọ n’anya. Na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu nweta* onyinye dị iche iche Chineke na-enye, karịchaa ka unu na-ebu amụma.+ 2 O nweghị onye na-aghọta ihe onye na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche na-ekwu.+ Naanị Chineke na-aghọta ya. Ọ bụ eziokwu na o ji ike mmụọ nsọ na-ekwu ihe nzuzo ndị dị nsọ,+ o nweghị onye na-aghọta ihe ọ na-ekwu. 3 Ma, onye na-ebu amụma na-ekwu ihe ga-abara ndị mmadụ uru, na-agbakwa ha ume ma na-agụgụ ha obi. 4 Onye na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche na-eme ihe ga-abara onwe ya uru, ma onye na-ebu amụma na-eme ihe ga-abara ọgbakọ uru. 5 N’ihi ya, achọrọ m ka unu niile na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche,+ ma ihe m chọrọ ka unu na-emekwu bụ ibu amụma.+ N’eziokwu, onye na-ebu amụma ka onye na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche, ọ gwụla ma ọ̀ na-asụgharị ihe ọ na-ekwu, ka ọ baara ọgbakọ uru. 6 Ma ugbu a, ụmụnna m, ọ bụrụ na mụ abịa na-agwa unu okwu n’asụsụ dị iche iche, olee uru ọ ga-abara unu? Ọ bụrụ na m chọrọ inyere unu aka, m ga-agwa unu ihe Chineke gwara m+ ma ọ bụ gwa unu ihe m ma+ ma ọ bụ buoro unu amụma ma ọ bụkwanụ kụziere unu ihe.
7 Ọ dị ka ngwá egwú, dị ka ọjà ma ọ bụ ụbọ akwara. Ọ bụrụ na mmadụ na-egbu ọjà ma ọ bụ na-akpọ ụbọ akwara, ya abụrụkwa na a naghị anụcha ụda ya nke ọma, olee otú a ga-esi mara nke bụ́ ọjà na nke bụ́ ụbọ akwara? 8 Ọ bụrụ na onye na-egbu opi e ji akpọ ndị agha òkù egbuo ihe na-edochaghị anya, ònye ga-ejikere agha? 9 Ọ bụrụkwa na unu ekwughị ihe dị mfe nghọta, olee otú a ga-esi mata ihe unu na-ekwu? N’eziokwu, ọ ga-adị ka ùnu na-agwa ikuku okwu. 10 E nwere ọtụtụ asụsụ n’ụwa, ma, a na-aghọtacha ha niile. 11 Ọ bụrụ na aghọtaghị m ihe onye na-agwa m okwu n’asụsụ ọzọ na-ekwu, m ga-adị ka onye mba ọzọ n’anya ya. 12 Otú ahụkwa ka ọ dị ununwa. Ebe unu na-agbasi mbọ ike ka unu na-eme ihe dị iche iche mmụọ nsọ na-eme ka mmadụ nwee ike ime, na-agbanụ mbọ ka unu na-eme ha nke ọma ka ọ baara ọgbakọ uru.+
13 N’ihi ya, ka onye na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche kpee ekpere ka o nwee ike ịsụgharị ya.+ 14 Ọ bụrụ na m na-ekpe ekpere n’asụsụ ọzọ, ọ bụghị m na-ekpe ya, kama ọ bụ mmụọ nsọ mere ka m nwee ike ikpe ya. N’ihi ya, aghọtaghị m ihe ahụ m na-ekpe n’ekpere. 15 Gịnịzi ka m ga-eme? M kpewe ekpere, m ga-eme ihe mmụọ nsọ mere ka m nwee ike ime, ma, m ga-ekpe ihe m ga-aghọta. M bụwa abụ m ji eto Chineke, m ga-eme ihe mmụọ nsọ mere ka m nwee ike ime, ma, m ga-abụ ihe m ga-aghọta. 16 Ma ọ́ bụghị ya, ọ bụrụ na mmụọ nsọ mere ka i nwee ike ito Chineke, olee otú onye nkịtị ga-esi asị “Amen” mgbe i kelechara Chineke, ebe ọ na-amaghị ihe i kwuru? 17 N’eziokwu, ị na-ekele Chineke otú dị mma, ma ọ gaghị abara onye ọzọ uru. 18 Ana m ekele Chineke na m na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche karịa unu niile. 19 Ma n’ọgbakọ, m ga-ekwu mkpụrụ okwu ise a ga-aghọta, ka m wee kụziere ndị ọzọ ihe, kama ikwu puku mkpụrụ okwu iri n’asụsụ ọzọ.+
20 Ụmụnna m, unu echela echiche ka ụmụaka,+ kama bụrụnụ ụmụaka n’ihe gbasara ihe ọjọọ.+ Ma, unu kwesịrị ịna-eche echiche ka dimkpa.+ 21 E dere n’Iwu Mosis, sị: “Jehova* sịrị, ‘M ga-eji ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na ndị mba ọzọ gwa ndị a okwu. Ma, ha agaghị achọ ige m ntị.’”+ 22 N’ihi ya, a na-asụ asụsụ dị iche iche ka e jiri ya mee ka ndị na-ekweghị na Jizọs kwere na ya,+ a naghị asụ ha maka ndị kweere na ya. Ma, amụma a na-ebu bụ maka ndị kweere na Jizọs, ọ bụghị maka ndị na-ekweghị na ya. 23 N’ihi ya, ọ bụrụ na ọgbakọ unu abịakọta ọnụ, onye ọ bụla ana-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche, ma, ndị nkịtị ma ọ bụ ndị na-ekweghị na Jizọs abata, ọ̀ bụ na ha agaghị asị na isi adịghị unu mma? 24 Ma, ọ bụrụ na unu niile na-ebu amụma, onye na-ekweghị na Jizọs ma ọ bụ onye nkịtị abata, unu ga-eji ihe unu niile kwuru dọọ ya aka ná ntị, ọ ga-emekwa ka o lezie onwe ya anya nke ọma. 25 Ọ ga-amata ihe zoro ezo dị n’obi ya, nke na ọ ga-egbu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, kpọọrọ Chineke isiala, sị: “N’eziokwu, Chineke nọnyeere unu.”+
26 Ụmụnna m, gịnịzi ka unu ga-eme? Mgbe unu zukọtara, otu onye na-eji abụ eto Chineke, onye ọzọ na-akụzi ihe, onye ọzọ na-ekwu ihe Chineke gwara ya, onye ọzọ na-asụ asụsụ ọzọ, onye ọzọ ana-asụgharị ya, na-akọwakwa ya.+ Ka e mee ihe niile otú ọ ga-abara mmadụ niile uru. 27 Ọ bụrụkwa na ndị mmadụ na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche, ka ọ bụrụ mmadụ abụọ, ma ha akarịla mmadụ atọ, onye kwuchaa, ibe ya ekwuo. Ka otu onye na-asụgharịkwa ihe ha na-ekwu.+ 28 Ma ọ bụrụ na e nweghị onye nsụgharị, ha gbachi nkịtị n’ọgbakọ ma na-agwa Chineke okwu n’obi ha. 29 Ka ndị amụma+ abụọ ma ọ bụ atọ kwuo okwu, ka ndị ọzọ chọpụtakwa ihe ihe ha na-ekwu pụtara. 30 Ma ọ bụrụ na e nwere onye nọ ọdụ ebe ahụ, Chineke agwa ya okwu, ka onye nke na-ekwu okwu mgbe ahụ gbachi nkịtị ka o kwuo. 31 Ka ndị niile na-ebu amụma na-eme ya otú a, otu onye buchaa, ibe ya ebuo, ka mmadụ niile wee mụta ihe, a gbaakwa ha niile ume.+ 32 Ndị mmụọ nsọ mere ka ha na-ebu amụma kwesịrị ịna-ebu amụma n’usoro. 33 N’ihi na Chineke abụghị Chineke aghara, kama nke udo.+
Dị ka ọ dị n’ọgbakọ niile nke ndị nsọ, 34 ka ụmụ nwaanyị na-agbachi nkịtị n’ọgbakọ, n’ihi na e nyeghị ha ike ikwu okwu.+ Kama, ka ha nọrọ n’okpuru ụmụ nwoke,+ otú Iwu Chineke kwuru. 35 Ọ bụrụ na ha chọrọ ịmụta ihe, ha jụọ di ha n’ụlọ, n’ihi na nwaanyị ịgwa ọgbakọ okwu bụ ihe ihere.
36 Okwu Chineke ọ̀ malitere n’aka unu, ka ọ̀ bụ naanị unu ka e nyere ya?
37 Ọ bụrụ na e nwere onye chere na ya bụ onye amụma ma ọ bụ na e nwere ihe mmụọ nsọ nyere ya ike ime, o kwesịrị ikweta na ihe m na-edetara unu bụ ihe Onyenwe anyị nyere n’iwu. 38 Ma ọ bụrụ na e nwere onye na-ejighị ihe a kpọrọ ihe, Chineke agaghịkwa eji onye ahụ kpọrọ ihe.* 39 N’ihi ya, ụmụnna m, na-agbanụ mbọ ka unu na-ebu amụma,+ ma unu egbochikwala onye ọ bụla ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.+ 40 Ma, na-emenụ ihe niile otú kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.+
15 Ụmụnna m, m na-echetara unu ozi ọma m ziri unu,+ nke unu nabatara, nke unu jidesikwara ike. 2 A ga-azọpụta unu ma unu jidesie ozi ọma m ziri unu ike. Ma ọ bụrụ na unu ejisighị ya ike, n’eziokwu, o nweghị uru ọ bara na unu bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.
3 Ihe kacha mkpa a kụziiri m ka m kụziiri unu, ya bụ, na Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị otú Akwụkwọ Nsọ kwuru.+ 4 E likwara ya+ ma kpọlite ya+ n’ụbọchị nke atọ+ otú Akwụkwọ Nsọ kwuru.+ 5 Ọ pụtakwara n’ihu Sifas,*+ mechaakwa pụta n’ihu ndịozi ya iri na abụọ.+ 6 Mgbe e mechakwara, ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise (500) n’otu mgbe.+ Anyị na ọtụtụ n’ime ha ka nọkwa, ma ụfọdụ anwụọla.* 7 O mechara pụta n’ihu Jems,+ mechaakwa, pụta n’ihu ndịozi niile.+ 8 Mụnwa bụkwa onye ikpeazụ ọ pụtara n’ihu ya,+ dị ka à ga-asị na m bụ nwa a mụkworo amụkwo.
9 N’ihi na n’ime ndịozi niile, ọ bụ m kacha nta, e kwesịghịkwa ịkpọ m onyeozi, maka na akpagburu m ọgbakọ Chineke.+ 10 Ma, ọ bụ amara Chineke meere m ka m ji nwee ike ịna-arụ ọrụ a. Amara a o meere m efughịkwa ọhịa, n’ihi na m gbara mbọ karịa ndịozi ndị ọzọ niile. Ma, agbaghị m mbọ a n’ike m, kama ọ bụ amara Chineke meere m. 11 Ma ọ̀ bụ m ma ọ̀ bụ ha na-ezi ozi ọma, otu ihe ka anyị na-ezisa, unu kwekwaara na ya.
12 Ma ọ bụrụ na anyị na-ekwusa na a kpọlitere Kraịst n’ọnwụ,+ olee ihe mere ụfọdụ n’ime unu ji ekwu na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ? 13 Ọ bụrụ n’eziokwu na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ọ pụtara na a kpọliteghị Kraịst. 14 Ma ọ bụrụ na a kpọliteghị Kraịst, ọ pụtara na ozi ọma anyị na-ezisa enweghị isi, okwukwe unu enweghịkwa ebe o hiwere isi. 15 Ọ bụrụkwa n’eziokwu na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ọ pụtara na Chineke akpọliteghị Kraịst.+ Ya bụrụ otú ahụ, anyị na-agha ụgha na Chineke kpọlitere ya.+ 16 N’ihi na ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, a kpọliteghịkwa Kraịst. 17 Ọ bụrụkwa na a kpọliteghị Kraịst, okwukwe unu abaghị uru. A gbagharabeghị unu mmehie unu.+ 18 Ya bụrụ otú ahụ, ndị nwụrụ anwụ,* bụ́ Ndị Kraịst, agaghịkwa adị ndụ ọzọ.+ 19 Ọ bụrụ naanị ná ndụ a ka anyị nwere olileanya na Kraịst, e kwesịrị imetere anyị ebere karịa onye ọ bụla ọzọ.
20 Ma, n’eziokwu, o doro anyị anya na a kpọlitela Kraịst n’ọnwụ. Ọ bụ ya bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ, dị ka mkpụrụ mbụ.+ 21 Otú ahụ ọnwụ si n’aka otu onye+ ka ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ ga-esikwa n’aka otu onye.+ 22 Otú ahụ mmadụ niile na-anwụ n’ihi Adam+ ka a ga-ejikwa maka Kraịst kpọlite ndị niile nwụrụ anwụ.+ 23 Ma a na-akpọlite ha n’usoro: onye mbụ a kpọlitere bụ Kraịst, dị ka mkpụrụ mbụ,+ e mechaakwa, n’oge ọnụnọ ya, a ga-akpọlite ndị nke Kraịst.+ 24 N’ikpeazụ, mgbe o mechara ka ọchịchị niile na ndị niile nwere ikike inye iwu ghara ịdị, ọ ga-enyefe Alaeze Chineke n’aka Chineke bụ́ Nna ya.+ 25 N’ihi na ọ ga-achịgide ruo mgbe Chineke merichara ndị iro ya niile.+ 26 Ọnwụ bụ onye iro ikpeazụ a ga-emeri.+ 27 N’ihi na Chineke “edowela ihe niile n’okpuru ya.”*+ Ma mgbe e kwuru na ‘e dowela ihe niile n’okpuru ya,’+ o doro anya na Chineke, onye dowere ihe niile n’okpuru ya, esoghị nọrọ n’okpuru ya.+ 28 Ma mgbe Chineke dowechara ihe niile n’okpuru Ọkpara ya, Ọkpara ya ga-edowekwa onwe ya n’okpuru Chineke, onye dowere ihe niile n’okpuru ya.+ Naanị Chineke ga na-achịzi ihe niile.+
29 Ma ọ́ bụghị ya, olee uru ndị a na-eme baptizim ka ha nwụọ ga-erite?+ Ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, gịnị mere e ji na-eme ndị ahụ baptizim ka ha nwụọ? 30 Gịnịkwa mere na n’oge ọ bụla, anyị na-eme ihe e nwere ike iji maka ya gbuo anyị?+ 31 Ụmụnna m, n’ihi isi m ji unu bụ́ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs Onyenwe anyị na-anya, ana m ekwusi ike na a na-enwe ihe nwere ike igbu m n’ụbọchị niile. 32 Ọ bụrụ na mụ na anụ ọhịa lụrụ ọgụ n’Efesọs otú ndị ọzọ na-eme,+ olee uru ọ baara m? Ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, “ka anyị na-eri, na-aṅụ n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.”+ 33 Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.+ 34 Na-echenụ echiche nke ọma, na-emekwanụ ihe dị mma. Unu anọkwala na-eme mmehie. Ụfọdụ n’ime unu amaghị Chineke. Ana m ekwu ihe a ka ihere mee unu.
35 Ma, mmadụ nwere ike ịsị: “Olee otú a ga-esi kpọlite ndị nwụrụ anwụ? Oleekwa ụdị ahụ́ ha ga-ebu pụta?”+ 36 Onye na-enweghị uche, ọ̀ bụ na mkpụrụ ị kụrụ anaghị ebu ụzọ nwụọ tupu ya epulite?* 37 Ọ bụghị mkpụrụ pulitere epulite ka ị na-akụ, kama ọ bụ mkpụrụ nkịtị. O nwere ike bụrụ nke ọka wit ma ọ bụ mkpụrụ ọ bụla ọzọ. 38 Ma Chineke na-eme ka o too otú dị ya mma, mkpụrụ nke ọ bụla na-etokwa n’ụdị nke ya. 39 Anụ ahụ́ niile abụghị otu. Mmadụ nwere nke ya. Anụ ụlọ nwere nke ya. Nnụnụ nwere nke ya, azụ̀ enweekwa nke ya. 40 Ụdị ahụ́ ihe ndị dị n’eluigwe nwere+ dị iche n’ụdị ahụ́ ihe ndị dị n’ụwa nwere.+ Otú ihe ndị dị n’eluigwe si maa mma dịkwa iche n’otú ihe ndị dị n’ụwa si maa mma. 41 Otú anyanwụ si maa mma dị iche n’otú ọnwa si maa mma.+ Otú kpakpando si maa mma dịkwa iche. N’eziokwu, otú otu kpakpando si maa mma dị iche n’otú kpakpando ọzọ si maa mma.
42 Otú ahụkwa ka ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-adị. Ahụ́ onye nwụrụ anwụ na-ere ure, ma ahụ́ onye a kpọlitere n’ọnwụ anaghị ere ure.+ 43 E lie onye nwụrụ anwụ, e leda ya anya, ma, a kpọlite ya, a kwanyewere ya ùgwù.+ Onye e liri eli enweghị ike, ma, a kpọlite ya, ya enwee ike.+ 44 A na-eli ahụ́ nkịtị nke onye nwụrụ anwụ, ma, a na-akpọlite ya, ya enwee ahụ́ mmụọ. Ọ bụrụ na e nwere ahụ́ nkịtị, e nwekwara ahụ́ mmụọ. 45 E dere, sị: “Nwoke mbụ bụ́ Adam ghọrọ onye* dị ndụ.”+ Adam ikpeazụ ghọrọ mmụọ na-enye ndụ.+ 46 Ma, ahụ́ nke mbụ abụghị ahụ́ mmụọ, kama ọ bụ ahụ́ nkịtị, e mechaa, ahụ́ mmụọ esochie. 47 Nwoke mbụ si n’ụwa, e jikwa ájá kpụọ ya.+ Nwoke nke abụọ si n’eluigwe.+ 48 Ndị nọ n’ụwa a dị otú onye ahụ e ji ájá kpụọ dị. Ndị nọ n’eluigwe dịkwa otú onye ahụ si n’eluigwe dị.+ 49 Otú ahụ anyị yiri onye ahụ e ji ájá kpụọ+ ka anyị ga-eyikwa onye ahụ si n’eluigwe.+
50 Ụmụnna m, ihe m na-ekwu bụ na anụ ahụ́ na ọbara enweghị ike iketa Alaeze Chineke, ihe na-ere ure enweghịkwa ike ịghọ ihe na-anaghị ere ure. 51 Ka m gwa unu otu ihe nzuzo dị nsọ: Ọ bụghị anyị niile ga-anwụ* ma nọtee aka tupu a kpọlite anyị. Ma a ga-agbanwe anyị niile+ 52 ozugbo, n’otu ntabi anya, n’oge a ga-afụ opi ikpeazụ. A fụọ opi ahụ,+ a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha enwee ahụ́ na-anaghị ere ure, a ga-agbanwekwa anyị. 53 N’ihi na onye nwere ahụ́ nke nwere ike ire ure ga-enwezi ahụ́ nke na-enweghị ike ire ure,+ onye nwekwara ahụ́ nke nwere ike ịnwụ anwụ ga-enwezi ahụ́ nke na-enweghị ike ịnwụ anwụ.+ 54 Ma mgbe onye nwere ahụ́ nke nwere ike ire ure nweziri ahụ́ nke na-enweghị ike ire ure, onye nwere ahụ́ nke nwere ike ịnwụ anwụ enweekwa ahụ́ nke na-enweghị ike ịnwụ anwụ, mgbe ahụ ka ihe a e dere ga-emezu: “E loola ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.”+ 55 “Ọnwụ, olee ebe ike gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị?”+ 56 Ihe ọnwụ ji agba mmadụ bụ mmehie,+ ma ihe mmehie ji akpa ike bụ Iwu Mosis.+ 57 Ma ekele dịrị Chineke, n’ihi na o ji Onyenwe anyị Jizọs Kraịst enyere anyị aka imeri.+
58 N’ihi ya, ụmụnna m m hụrụ n’anya, guzosienụ ike,+ kwụrụnụ chịm, nweekwanụ ọtụtụ ihe unu na-arụ mgbe niile+ n’ọrụ Onyenwe anyị, ebe unu ma na ọrụ Onyenwe anyị unu na-arụsi ike abụghị na nkịtị.+
16 N’okwu gbasara ịnakọta onyinye a ga-enye ndị nsọ,+ na-emenụ ya otú ahụ m gwara ọgbakọ ndị dị na Galeshia ka ha na-eme. 2 N’ụbọchị mbụ n’izu ọ bụla,* ka onye ọ bụla wepụta ihe ọ ga-enye otú aka hà ya, ka unu ghara ịnakọta onyinye mgbe m rutere. 3 Ma mgbe m rutere, m ga-agwa ụfọdụ ndị ka ha gaa Jeruselem wega onyinye unu ji obi unu niile weta. Ndị m ga-eziga bụ ndị unu dere n’akwụkwọ ozi unu+ na unu tụkwasịrị obi. 4 Ma, ọ bụrụ na m kwesịkwara ịga ebe ahụ, mụ na ha ga-eso gaa.
5 Ma m ga-abịa hụ unu ma m gachaa Masedonia, n’ihi na m chọrọ isi Masedonia bịa.+ 6 M bịa, mụ na unu nwere ike ịnọtụ. M nwedịrị ike ịnọ oge oyi agafee, ka unu wee dupụ m ma m gawa ebe ọzọ m ga-aga. 7 N’ihi na achọghị m ịhụ unu ugbu a m na-agafe agafe, ebe ọ bụ na m nwere olileanya na m ga-abịa ka mụ na unu nọtụ,+ ma Jehova* kwe. 8 Ma m ga-anọ n’Efesọs ebe a+ ruo ụbọchị Ememme Pentikọst, 9 n’ihi na e meela ka m nwee nnukwu ohere ịrụ ọrụ Onyenwe anyị.*+ Ma ọtụtụ ndị na-emegide m.
10 Ọ bụrụ na Timoti+ erute, gbaanụ mbọ mee ka ahụ́ ruo ya ala, n’ihi na ọ na-arụ ọrụ Jehova*+ otú m na-arụ. 11 N’ihi ya, ka onye ọ bụla ghara ileda ya anya. Dupụnụ ya n’udo, ka ọ bịakwute m, n’ihi na mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-eche ya.
12 Agbasiri m Apọlọs+ nwanna anyị ume ike ka o soro ụmụnna ndị ga-abịakwute unu. Ma ọ chọghị ịbịa ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe o nwere ohere.
13 Mụrụnụ anya.+ Meenụ ka okwukwe unu sie ike.+ Nweenụ obi ike,+ siekwanụ ezigbo ike.+ 14 Jirinụ ịhụnanya+ na-eme ihe niile unu na-eme.
15 Unu ma na ezinụlọ Stefanas bụ ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs* n’Akeya, ha wepụtakwara onwe ha na-ejere ndị nsọ ozi. N’ihi ya, ụmụnna m, m na-agba unu ume ka unu na-eme ihe a: 16 Na-edonụ onwe unu n’okpuru ndị dị otú ahụ nakwa n’okpuru ndị niile so anyị na-arụ ọrụ ma na-arụsi ya ike.+ 17 Ma m na-aṅụrị ọṅụ na Stefanas+ na Fọtunetọs na Akeikọs nọ ebe a, n’ihi na ha enyerela m ezigbo aka unu gaara enyere m. 18 Ha agbaala mụ na unu ume. N’ihi ya, na-akwanyerenụ ndị dị otú ahụ ùgwù.
19 Ọgbakọ ndị dị n’Eshia na-ekele unu. Akwịla na Priska nakwa ọgbakọ dị n’ụlọ ha+ ji obi ha niile na-ekele unu, unu ndị ha na ha na-eso ụzọ Onyenwe anyị. 20 Ụmụnna niile na-ekele unu. Susuonụ ibe unu ọnụ mgbe unu na-ekele ibe unu.*
21 Mụnwa bụ́ Pọl na-ekele unu. Ọ bụ m ji aka m na-ede ekele a.
22 Ọ bụrụ na ọ dị onye na-ahụghị Onyenwe anyị n’anya, a ga-abụ ya ọnụ. Onyenwe anyị, biko, bịa. 23 Ka Onyenwe anyị Jizọs meere unu amara. 24 M hụrụ unu niile n’anya, unu ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu.
Ma ọ bụ “na-arụkọ ọrụ.”
Aha ya ọzọ bụ Pita.
Ma ọ bụ “onye oké amamihe.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Ya bụ, onye ma Iwu Mosis nke ọma.
Na Grik, “anụ ahụ́.”
Gụọ A5.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “oge a.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ha agaraghị egbu Onyenwe anyị dị ebube n’elu osisi.”
Gụọ A5.
Na Grik, “ka ndị anụ ahụ́ na-achị.”
Ma ọ bụ “na-arụ otu ihe.”
Ma ọ bụ “onye na-ahazi ọrụ, nke ma ihe.”
Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ka ọrụ onye ọ bụla pụta ìhè.”
Ma ọ bụ “n’oge a.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Gụọ A5.
Aha ya ọzọ bụ Pita.
Ma ọ bụ “ndị nọ n’okpuru Kraịst.”
Gụọ A5.
Na Grik, “Anyị gba ọtọ.”
Ma ọ bụ “a na-akụkwa anyị ọkpọ.”
Na Grik, “anyị na-arịọsi ha arịrịọ ike.”
Gụọ A5.
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “m nọnyeere unu n’ime mmụọ.”
Ma ọ bụ “m nọnyeere unu n’ime mmụọ.”
Na Grik, “ka e bibie anụ ahụ́.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Ma ọ bụ “ịna-akpakọrịta.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Ma ọ bụ “onye na-akparị mmadụ.”
Ma ọ bụ “ịna-akpakọrịta.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Ma ọ bụ “ụmụ nwoke ndị ha na ụmụ nwoke na-enwe mmekọahụ.”
Ma ọ bụ “ndị na-akparị mmadụ.”
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, ka nwoke na nwaanyị ghara inwe mmekọahụ.
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “ndị na-alụtụbeghị di ma ọ bụ nwunye.”
O nwekwara ike ịbụ onye nwunye ya nwụrụla.
Na Grik, “iji kee unu agbụ.”
Ma ọ bụ “onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ onye na-amaghị nwaanyị.”
Onye a na-ekwu okwu ya ebe a bụ onye toferela oge mmekọ nwoke na nwaanyị na-akacha agụ ndị na-eto eto.
Ma ọ bụ “agaghị ama nwoke ma ọ bụ nwaanyị.”
Na Grik, “e merụọ akọnuche ha na-esighị ike.”
Aha ya ọzọ bụ Pita.
Na Grik, “okpueze.”
Ma ọ bụ “na-ata onwe m ahụhụ.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A5.
Na Grik, “onye mbibi.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “Na-eṅominụ m.”
Ya bụ, nke Ememme Ngabiga.
Ọnwụ a abụghị ọnwụ nkịtị. Kama ọ pụtara na ndị ahụ na Chineke adịghịzi ná mma.
Gụọ A5.
Na Grik, “Unu ma na mgbe unu bụ ndị mba ọzọ.”
Ma ọ bụ “jirinụ ịnụ ọkụ n’obi na-achọ.”
Ma ọ bụ “abaghị m uru ọ bụla.”
Ma ọ bụ “ogologo ntachi obi.”
Ma ọ bụ “Ọ naghị akparị mmadụ.”
Ma ọ bụ “ada ada.”
Ya bụ, mmụọ nsọ ime ka mmadụ nwee ike ịna-asụ asụsụ dị iche iche.
Ma ọ bụ “Jirinụ ịnụ ọkụ n’obi na-achọ.”
Gụọ A5.
O nwere ike ịbụ, “Ma ọ bụrụ na e nwere onye na-achọghị ịghọta ihe a, o mekataghị ghọta ya.”
Aha ya ọzọ bụ Pita.
Na Grik, “ehiela ụra ọnwụ.”
Na Grik, “ndị hiri ụra ọnwụ.”
Na Grik, “n’okpuru ụkwụ ya.”
Na Grik, “ya adị ndụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Grik, “ga-ehi ụra ọnwụ.”
Ihe a na-akpọ ụbọchị a ugbu a bụ Sọnde. Ọ bụ ya bụ ụbọchị mbụ n’izu ndị Juu.
Gụọ A5.
Na Grik, “e megheerela m ọnụ ụzọ buru ibu nke m ga-abanye rụọ ọrụ.”
Gụọ A5.
Na Grik, “mkpụrụ mbụ.”
Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.