Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt 1 Ihe E Mere 1:1-29:30
  • 1 Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 1 Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
1 Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze

IHE E MERE N’ỤBỌCHỊ NDỊ EZE NKE MBỤ

1 Adam,

Set,+

Ịnọsh,

2 Kinan,

Mahalalel,+

Jered,+

3 Ịnọk,+

Metusela,

Lemek,+

4 Noa,+

Shem,+ Ham, na Jefet.+

5 Ụmụ Jefet bụ Goma, Megọg, Medaị, Jevan, Tubal,+ Mishek,+ na Taịras.+

6 Ụmụ Goma bụ Ashkenaz, Raịfat, na Togama.+

7 Ụmụ Jevan bụ Elaịsha, Tashish, Kitim, na Rodenim.

8 Ụmụ Ham bụ Kush,+ Mizrem, Pọt, na Kenan.+

9 Ụmụ Kush bụ Siba,+ Havila, Sabta, Reama,+ na Sabteka.

Ụmụ Reama bụ Shiba na Didan.+

10 Kush mụrụ Nimrọd.+ Nimrọd bụ onye mbụ bụ dike n’ụwa.

11 Mizrem mụrụ Ludim,+ Anamim, Lehebim, Naftuhim,+ 12 Patrusim,+ Kasluhim (onye ndị Filistia+ si n’agbụrụ ya), na Kaftorim.+

13 Kenan mụrụ Saịdọn+ na Het.+ Saịdọn bụ ọkpara ya. 14 Ọ mụkwara ndị Jebus,+ ndị Amọraịt,+ ndị Gegash,+ 15 ndị Haịvaịt,+ ndị Akaịt, ndị Saịnaịt, 16 ndị Avad,+ ndị Zemaraịt, na ndị Hemat.

17 Ụmụ Shem bụ Ịlam,+ Ashọ,+ Apakshad, Lọd, Eram,

nakwa* Ọz, Họl, Gita, na Mash.+

18 Apakshad mụrụ Shila,+ Shila amụọ Iba.

19 A mụụrụ Iba ụmụ nwoke abụọ. Aha otu bụ Pileg,*+ n’ihi na ọ bụ n’oge ọ nọ ndụ ka ndị mmadụ gara biri n’ebe dị iche iche n’ụwa.* Aha nwanne ya nwoke bụ Jọktan.

20 Jọktan mụrụ Almodad, Shilef, Hazamevet, Jira,+ 21 Hedoram, Yuzal, Dikla, 22 Obal, Abimel, Shiba, 23 Ofa,+ Havila,+ na Jobab. Ha niile bụ ụmụ Jọktan.

24 Shem,

Apakshad,

Shila,

25 Iba,

Pileg,+

Riyu,+

26 Sirọg,+

Nehọ,+

Tira,+

27 Ebram, ya bụ, Ebreham.+

28 Ụmụ Ebreham bụ Aịzik+ na Ishmel.+

29 Ndị a bụ ụmụ ha n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ọkpara Ishmel bụ Nebeyọt.+ Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Kida,+ Adbiel, Mibsam,+ 30 Mishma, Duma, Masa, Hedad, Tima, 31 Jitọ, Nefish, na Kedema. Ọ bụ ha bụ ụmụ Ishmel.

32 Ketura,+ bụ́ iko Ebreham, mụrụ Zimran, Jọkshan, Midan, Midian,+ Ishbak, na Shua.+

Ụmụ Jọkshan bụ Shiba na Didan.+

33 Ụmụ Midian bụ Ifa,+ Ife, Henọk, Abaịda, na Eldea.

Ha niile bụ ụmụ Ketura.

34 Ebreham mụrụ Aịzik.+ Ụmụ Aịzik bụ Ịsọ+ na Izrel.+

35 Ụmụ Ịsọ bụ Elifaz, Ruel, Jiọsh, Jelam, na Kora.+

36 Ụmụ Elifaz bụ Timan,+ Oma, Zifo, Getam, Kinaz, Timna, na Amalek.+

37 Ụmụ Ruel bụ Nehat, Zira, Shama, na Miza.+

38 Ụmụ Sia+ bụ Lotan, Shobal, Zibiọn, Ena, Daịshọn, Iza, na Daịshan.+

39 Ụmụ Lotan bụ Horaị na Homam. Lotan nwere nwanne nwaanyị. Aha ya bụ Timna.+

40 Ụmụ Shobal bụ Alvan, Manahat, Ịbal, Shifo, na Onam.

Ụmụ Zibiọn bụ Eya na Ena.+

41 Nwa* Ena bụ Daịshọn.

Ụmụ Daịshọn bụ Hemdan, Eshban, Itran, na Kiran.+

42 Ụmụ Iza+ bụ Bilhan, Zeavan, na Ekan.

Ụmụ Daịshan bụ Ọz na Eran.+

43 Ndị a bụ ndị eze chịrị ndị Ịdọm+ tupu eze ọ bụla achịa ndị Izrel:*+ Bila nwa Biọ. Aha obodo ya bụ Dinhaba. 44 Mgbe Bila nwụrụ, Jobab nwa Zira onye Bọzra+ nọchiri ya, malite ịchị. 45 Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye Timan nọchiri ya, malite ịchị. 46 Mgbe Husham nwụrụ, Hedad nwa Bidad, onye meriri ndị Midian n’ala Moab, nọchiri ya, malite ịchị. Aha obodo ya bụ Evit. 47 Mgbe Hedad nwụrụ, Samla onye Masrika, nọchiri ya, malite ịchị. 48 Mgbe Samla nwụrụ, Sheọl onye Rehobọt, nke dị n’akụkụ Osimiri Yufretis, nọchiri ya, malite ịchị. 49 Mgbe Sheọl nwụrụ, Bel-henan nwa Akbọ nọchiri ya, malite ịchị. 50 Mgbe Bel-henan nwụrụ, Hedad nọchiri ya, malite ịchị. Aha obodo ya bụ Peyu. Aha nwunye ya bụ Mehetabel. Mehetabel bụ nwa Metred, Metred abụrụ nwa Mizahab. 51 Hedad mechakwara nwụọ.

Ndị isi Ịdọm bụ Timna, Alva, Jitet,+ 52 Oholibema, Ila, Paịnọn, 53 Kinaz, Timan, Mibza, 54 Magdiel, Aịram. Ndị a bụ ndị isi Ịdọm.

2 Ndị a bụ ụmụ Izrel+ ndị nwoke: Ruben,+ Simiọn,+ Livaị,+ Juda,+ Ịsaka,+ Zebulọn,+ 2 Dan,+ Josef,+ Benjamin,+ Naftalaị,+ Gad,+ na Asha.+

3 Ụmụ Juda ndị nwoke bụ Ea, Onan, na Shila. Ọ bụ nwa Shua, nwaanyị Kenan,+ mụụrụ ya ụmụ atọ a. Ma, Jehova gburu Ea bụ́ ọkpara Juda maka na ọ bụ onye ọjọọ n’anya ya.+ 4 Tema+ bụ nwunye nwa Juda. Ọ mụụrụ Juda Pirez+ na Zira. Ụmụ Juda ndị nwoke niile dị ise.

5 Ụmụ Pirez bụ Hezrọn na Hemọl.+

6 Ụmụ Zira bụ Zimraị, Itan, Himan, Kalkọl, na Dera. Ha niile dị ise.

7 Nwa* Kamaị bụ Eka,* onye kpataara ndị Izrel ọdachi,*+ onye na-erubeghịkwa isi n’okwu gbasara ihe a ga-ebibi ebibi.+

8 Nwa* Itan bụ Azaraya.

9 Ụmụ a mụụrụ Hezrọn bụ Jeramiel,+ Ram,+ na Kelubaị.*

10 Ram mụrụ Aminadab,+ Aminadab amụọ Nashọn+ onyeisi ndị ebo Juda. 11 Nashọn mụrụ Salma,+ Salma amụọ Boaz,+ 12 Boaz amụọ Obed, Obed amụọ Jesi,+ 13 Jesi amụọ Elayab bụ́ ọkpara ya, na Abinadab+ nwa ya nke abụọ, Shimia nwa ya nke atọ,+ 14 Netanel nwa ya nke anọ, Radaị nwa ya nke ise, 15 Ozem nwa ya nke isii, na Devid+ nwa ya nke asaa. 16 Ụmụnne ha ndị nwaanyị bụ Zeruya na Abigel.+ Ụmụ Zeruya dị atọ. Ha bụ, Abishaị,+ Joab,+ na Asahel.+ 17 Abigel mụrụ Amesa.+ Nna Amesa bụ Jita onye Ishmel.

18 Ụmụ ndị nwoke Keleb* nwa Hezrọn mụrụ bụ Jisha, Shobab, na Adọn. Ọ bụ Azuba nwunye ya na Jeriọt mụụrụ ya ụmụ ndị ahụ. 19 Mgbe Azuba nwụrụ, Keleb lụrụ Efrat,+ ya amụọrọ ya Họọ,+ 20 Họọ amụọ Yuraị, Yuraị amụọ Bezalel.+

21 Hezrọn lụrụ nwa Mekia+ bụ́ nna Gilied.+ Ọ dị afọ iri isii lụọ ya. Ọ bụkwa ya mụtaara ya Sigọb, 22 Sigọb amụọ Jeya.+ Jeya a nwere obodo iri abụọ na atọ na Gilied.+ 23 Ndị Geshọ+ na ndị Siria+ mechara napụ ha Havọt-jeya+ na Kinat+ na ime obodo ndị dị Kinat nso.* Ha niile dị obodo iri isii. Ndị a niile bụ ụmụ Mekia bụ́ nna Gilied.

24 Mgbe Hezrọn+ nwụchara na Keleb-efrata, Abaịja nwunye ya mụụrụ ya Ash-họ+ bụ́ nna Tekoa.+

25 Ụmụ Jeramiel, ọkpara Hezrọn, bụ Ram, Buna, Oren, Ozem, na Ahaịja. Ram bụ ọkpara ya. 26 Jeramiel lụrụ nwaanyị ọzọ aha ya bụ Atara. Ọ bụ ya bụ nne Onam. 27 Ụmụ Ram, ọkpara Jeramiel, bụ Meaz, Jemin, na Ika. 28 Ụmụ Onam bụ Shamaị na Jeda. Ụmụ Shamaị bụ Nedab na Abaịshọ. 29 Aha nwunye Abaịshọ bụ Abihel. Ọ mụụrụ ya Aban na Molid. 30 Ụmụ Nedab bụ Siled na Apayim. Ma Siled nwụrụ n’amụtaghị nwa. 31 Nwa* Apayim bụ Ịshaị. Nwa* Ịshaị bụ Shishan. Nwa* Shishan bụ Alaị. 32 Ụmụ Jeda nwanne Shamaị bụ Jita na Jonatan. Ma Jita nwụrụ n’amụtaghị nwa. 33 Ụmụ Jonatan bụ Pilet na Zeza. Ọ bụ ndị a bụ ụmụ Jeramiel.

34 Shishan amụtaghị nwoke. Naanị ụmụ nwaanyị ka ọ mụrụ. O nwekwara otu onye Ijipt na-ejere ya ozi. Aha ya bụ Jaha. 35 Shishan kpọọrọ nwa ya nwaanyị kpọnye Jaha bụ́ onye na-ejere ya ozi ka ọ lụwa. Ọ mụkwaara ya Ataị. 36 Ataị mụrụ Netan, Netan amụọ Zebad, 37 Zebad amụọ Eflal, Eflal amụọ Obed, 38 Obed amụọ Jihu, Jihu amụọ Azaraya, 39 Azaraya amụọ Hilez, Hilez amụọ Eliesa, 40 Eliesa amụọ Sismaị, Sismaị amụọ Shalọm, 41 Shalọm amụọ Jekamaya, Jekamaya amụọ Elishama.

42 Ụmụ Keleb*+ nwanne Jeramiel bụ Misha ọkpara ya, bụ́ nna Zif, nakwa ụmụ Marisha bụ́ nna Hebrọn. 43 Ụmụ Hebrọn bụ Kora, Tapua, Rikem, na Shima. 44 Shima mụrụ Reham bụ́ nna Jọkiam. Rikem amụọ Shamaị. 45 Nwa Shamaị bụ Meyọn. Meyọn bụ nna Bet-zọọ.+ 46 Ifa bụ́ iko Keleb mụrụ Heran, Moza, na Gezez. Heran amụo Gezez. 47 Ụmụ Jadaị bụ Rigem, Jotam, Gishan, Pelet, Ifa, na Sheef. 48 Iko Keleb bụ́ Meaka mụrụ Shiba na Tiahana. 49 Ka oge na-aga, ọ mụrụ Sheef nna Madmana+ nakwa Shiva nna Makbina na Gibia.+ Keleb+ mụkwara nwa nwaanyị aha ya bụ Aksa.+ 50 Ndị a niile bụ ụmụ Keleb.

Ụmụ Họọ+ bụ́ ọkpara Efrata+ bụ Shobal nna Kiriat-jierim,+ 51 Salma nna Betlehem,+ na Heref nna Bet-geda. 52 Ụmụ Shobal nna Kiriat-jierim bụ Haroe na ọkara ndị Menuhọt. 53 Ezinụlọ ndị bi na Kiriat-jierim bụ ndị Itraịt,+ ndị Putaịt, ndị Shumataịt, na ndị Mishraịt. Ọ bụkwa ebe ndị a ka ndị Zora+ na ndị Eshtaọl+ si. 54 Ụmụ Salma bụ Betlehem,+ ndị Netofa, Atrọt-bet-joab, ọkara ndị Manahat nakwa ndị Zora. 55 Ezinụlọ ndị odeakwụkwọ ndị bi na Jebez bụ ndị Taịrataịt, ndị Shimiataịt, na ndị Sukataịt. Ọ bụ ha bụ ndị Kenaịt.+ Ọ bụkwa Hamat, nna ndị Rikab,+ mụrụ ha.

3 Ụmụ ndị a ka a mụụrụ Devid mgbe ọ nọ na Hebrọn:+ ọkpara ya bụ Amnọn.+ Nne Amnọn bụ Ahịnoam+ onye Jezril. Nke abụọ bụ Daniel. Nne ya bụ Abigel+ onye Kamel. 2 Nke atọ bụ Absalọm.+ Nne ya bụ Meaka, nwa Talmaị eze Geshọ. Nke anọ bụ Adọnaịja+ nwa Hagit. 3 Nke ise bụ Shefataya nwa Abaịtal. Nke isii bụ Itriam. Nne ya bụ Egla, nwunye Devid. 4 Ụmụ isii a ka a mụụrụ ya na Hebrọn. Ọ nọ ebe ahụ chịa afọ asaa na ọnwa isii, nọrọkwa na Jeruselem chịa afọ iri atọ na atọ.+

5 Ndị a ka a nọ na Jeruselem mụọrọ ya:+ Shimia, Shobab, Netan,+ na Solomọn.+ Ọ bụ Bat-shiba+ nwa Amiel mụrụ ha anọ. 6 Ụmụ nwoke itoolu ọzọ Devid mụrụ bụ: Ịbha, Elishama, Elifelet, 7 Noga, Nifeg, Jefaya, 8 Elishama, Elayada, na Elifelet. 9 Ndị a niile bụ ụmụ nwoke Devid mụrụ, n’agụnyeghị ndị nke ndị iko ya mụụrụ ya. Nwanne ha nwaanyị bụ Tema.+

10 Solomọn mụrụ Rehoboam,+ Rehoboam amụọ Abaịja,+ Abaịja amụọ Esa,+ Esa amụọ Jehoshafat,+ 11 Jehoshafat amụọ Jehoram,+ Jehoram amụọ Ehazaya,+ Ehazaya amụọ Jehoash,+ 12 Jehoash amụọ Amazaya,+ Amazaya amụọ Azaraya,+ Azaraya amụọ Jotam,+ 13 Jotam amụọ Ehaz,+ Ehaz amụọ Hezekaya,+ Hezekaya amụọ Manase,+ 14 Manase amụọ Emọn,+ Emọn amụọ Josaya.+ 15 Ụmụ Josaya bụ Johenan, ọkpara ya, Jehoyakim,+ nwa ya nke abụọ, Zedekaya,+ nwa ya nke atọ, Shalọm, nwa ya nke anọ. 16 Jehoyakim mụrụ Jekonaya,+ Jekonaya amụọ Zedekaya. 17 Ụmụ Jekonaya, bụ́ onye mkpọrọ, bụ Shieltiel, 18 Malkaịram, Pedaya, Shenaza, Jekamaya, Họshama, na Nedabaya. 19 Ụmụ Pedaya bụ Zerubabel+ na Shimiaị. Ụmụ Zerubabel bụ Meshọlam na Hananaya (Shelomit bụ nwanne ha nwaanyị). 20 Ụmụ Zerubabel ise ọzọ bụ Hashuba, Ohel, Berekaya, Hasadaya, na Jushab-hised. 21 Ụmụ Hananaya bụ Pelataya na Jesheya. Nwa* Jesheya bụ Refeya. Nwa* Refeya bụ Anan. Nwa* Anan bụ Obedaya. Nwa* Obedaya bụ Shekanaya. 22 Shekanaya mụrụ otu nwa, nweekwa ụmụ ụmụ. Ha niile dị mmadụ isii. Aha nwa ya bụ Shemaya. Ụmụ Shemaya bụ Hatọsh, Aịgal, Beraya, Nearaya, na Shefat. 23 Ụmụ Nearaya bụ Elio-inaị na Hizkaya na Azraịkam. Ha dị atọ. 24 Ụmụ Elio-inaị bụ Họdavaya, Elayashib, Peleya, Akọb, Johenan, Deleya, na Anenaị. Ha dị asaa.

4 Ụmụ Juda bụ Pirez,+ Hezrọn,+ Kamaị, Họọ,+ na Shobal.+ 2 Reeya nwa Shobal mụrụ Jehat. Jehat amụọ Ahumaị na Lehad. Ndị Zora si n’ezinụlọ ha.+ 3 Nna ndị Itam+ mụrụ ndị a: Jezril, Ishma, na Idbash, (aha nwanne ha nwaanyị bụ Hazelelponaị). 4 Penuel bụ nna Gidọ. Iza bụ nna Husha. Ndị a bụ ụmụ Họọ,+ ọkpara Efrata na nna Betlehem.+ 5 Ash-họ+ nna Tekoa+ lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. Aha ha bụ Hila na Neara. 6 Neara mụụrụ ya Ahọzam, Hifa, Timenaị, na Haahashtaraị. Ndị a bụ ụmụ Neara. 7 Ụmụ Hila bụ Ziret, Izha, na Etnan. 8 Kọz mụrụ Enọb na Zọbiba. Ọ bụkwa nna ochie ndị si n’ezinụlọ Ahahel nwa Herọm.

9 A na-akwanyere Jebez ùgwù karịa ụmụnne ya. Ọ bụ nne ya gụrụ ya Jebez,* sị: “Atara m ahụhụ mgbe m na-amụ ya.” 10 Jebez rịọrọ Chineke Izrel, sị: “Biko gọzie m, meekwa ka ala m hikwuo nne. Biko, na-anọnyere m mgbe niile. Ekwekwala ka ọdachi dakwasị m, ka ihe ọjọọ ọ bụla ghara ime m.” Chineke mekwaara ya ihe a ọ rịọrọ.

11 Kilọb nwanne Shuha mụrụ Miha, nna Eshtọn. 12 Eshtọn mụrụ Betrefa, Pasia, na Tehina, nna Iye-nehash. Ọ bụ ndị a bụ ndị Rika. 13 Ụmụ Kinaz bụ Ọtniel+ na Seraya. Nwa* Ọtniel bụ Hetat. 14 Meonotaị mụrụ Ọfra, Seraya amụọ Joab nna ndị Ge-harashim.* A na-akpọ ha ndị Ge-harashim n’ihi na ha bụ ndị omenkà.

15 Ụmụ Keleb+ nwa Jefune bụ Aịru, Ịla, na Neem. Nwa* Ịla bụ Kinaz. 16 Ụmụ Jehalelel bụ Zif, Zaịfa, Tiria, na Asarel. 17 Ụmụ Ezra bụ Jita, Mired, Ife, na Jelọn. Otu n’ime ndị nwunye Mired* mụrụ Miriam, Shamaị, na Ishba nna Eshtemoa. 18 (Nwunye Mired, bụ́ onye Juu, mụrụ Jired nna Gidọ, Hiba nna Soko, na Jekutiel nna Zanoa.) Ndị a* bụ ụmụ Bitaya, nwa Fero, nwunye Mired.

19 Ụmụ nwunye Hodaya, nwanne Neham, bụ ndị nna Kaịla onye Gerem na ndị nna Eshtemoa onye Meakat. 20 Ụmụ Shaịmọn bụ Amnọn, Rina, Ben-henan, na Taịlọn. Ụmụ Ịshaị bụ Zohet na Ben-zohet.

21 Ụmụ Shila+ nwa Juda bụ Ea nna Lika na Leada nna Marisha. Ụmụ ụmụ ya bụ ndị si n’ezinụlọ Ashbia, ndị na-akpa ákwà ọma. 22 Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Jokim, ndị Koziba, Joash, na Seraf. Ha lụrụ ụmụ nwaanyị Moab. Nwa ya ọzọ bụ Jashubi-lihem. E dekọrọ ihe ndị a n’oge ochie.* 23 Ha bụ ndị ọkpụite bi na Neteyim nakwa na Gedira. Ha bi ebe ahụ na-arụrụ eze ọrụ.

24 Ụmụ Simiọn+ bụ Nemuel, Jemin, Jerib, Zira, Sheọl.+ 25 Sheọl mụrụ Shalọm, Shalọm amụọ Mibsam, Mibsam amụọ Mishma. 26 Mishma mụrụ Hamuel, Hamuel amụọ Zakọ, Zakọ amụọ Shimiaị. 27 Shimiaị mụrụ ụmụ nwoke iri na isii na ụmụ nwaanyị isii. Ma, ụmụnne ya amụghị ọtụtụ ụmụ. O nweghịkwanụ onye ọ bụla ná ndị ezinụlọ ha nke mụrụ ọtụtụ ụmụ ka ndị ebo Juda.+ 28 Ha biri na Bia-shiba,+ Moleda,+ Heza-shual,+ 29 Bilha, Izem,+ Tolad, 30 Betuel,+ Họma,+ Ziklag,+ 31 Bet-makabọt, Heza-susim,+ Bet-biraị, na Shearem. Obodo ndị a bụ obodo ha ruo mgbe Devid malitere ịchị.

32 Ime obodo ha bụ Itam, Eyin, Rimọn, Token, na Eshan.+ Ha niile dị obodo ise. 33 Ha nwekwara ime obodo ndị ọzọ dị ime obodo ise a nso ruo Bel. Ndị a bụ aha ndị ezinụlọ ha dị iche iche e debara n’akwụkwọ nakwa aha ebe ndị ha biri. 34 Ụmụ ụmụ Simiọn ndị ọzọ bụ Meshobab, Jamlek, Josha nwa Amazaya, 35 Joel, Jihu nwa Joshibaya, nwa Seraya, nwa Asiel, 36 Elio-inaị, Jaakoba, Jeshohaya, Asaya, Adiel, Jesimiel, Benaya, 37 Zaịza nwa Shaịfaị, nwa Alọn, nwa Jedeya, nwa Shimraị, nwa Shemaya. 38 Ndị a a kpọrọ aha bụ ndị isi n’ọnụmara ha. Ọnụmara ndị nna nna ha bịakwara hikwuo nne. 39 Ha gara n’ụzọ e si abanye Gido, n’ebe ọwụwa anyanwụ otu ndagwurugwu, ka ha chọta ebe anụmanụ ha ga na-ata ahịhịa. 40 Ha mechakwara chọta ala dị mma, nke dara jụụ, bụrụ ahịhịa ahịhịa, saakwa mbara, e nweghịkwa nsogbu na ya. Ọ bụ ụmụ Ham bibu ebe ahụ.+ 41 Mgbe Hezekaya+ bụ eze Juda, ndị a a kpọrọ aha gara bibie ụlọikwuu ụmụ Ham, gbuo ndị Meyunim bi ebe ahụ, bibiekwa ha ruo taa. Ha bichiziri ebe ahụ n’ihi na e nwere ebe anụmanụ ha ga na-ata ahịhịa.

42 Ụfọdụ n’ime ụmụ Simiọn gbagoro n’Ugwu Sia.+ Ha dị narị ụmụ nwoke ise (500). Ndị du ha gbagoo bụ Pelataya, Nearaya, Refeya, na Ọziel, bụ́ ụmụ Ịshaị. 43 Ha gbukwara ndị Amalek fọrọnụ,+ birizie ebe ahụ ruo taa.

5 Ruben+ bụ ọkpara Izrel. Ọ bụ ya bụ ọkpara. Ma, ọ gakwuuru iko nna ya, ya na ya edinaa,*+ e nyezie ụmụ Josef nwa Izrel ihe ruuru ọkpara.+ Ọ bụ ya mere na e deghị na Ruben bụ ọkpara n’akwụkwọ e dere aha ndị ezinụlọ ha n’usoro. 2 Ọ bụ eziokwu na Juda+ kacha ụmụnne ya niile, nakwa na ọ bụ onye si n’ezinụlọ ya ga-abụ onye ndú,+ ọ bụ Josef ka e nyere ihe ruuru ọkpara. 3 Ụmụ Ruben bụ́ ọkpara Izrel bụ Henọk, Palu, Hezrọn, na Kamaị.+ 4 Joel mụrụ Shemaya, Shemaya amụọ Gọg, Gọg amụọ Shimiaị, 5 Shimiaị amụọ Maịka, Maịka amụọ Reeya, Reeya amụọ Bel, 6 Bel amụọ Beera, onye Tilgat-pilniza,+ eze Asiria, dọọrọ n’agha. Ọ bụ onyeisi ụmụ Ruben. 7 A bịa n’usoro e si dee aha ụmụnne ya n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ dị iche iche, Jeayel bụ onyeisi ha. Ndị ọzọ bụ Zekaraya, 8 Bila nwa Ezaz, nwa Shima, nwa Joel. Ndị ezinụlọ Bila biri malite n’Aroa+ ruo Nibo na Bel-miọn.+ 9 N’ebe ọwụwa anyanwụ, ha biri ruo ebe e si abanye n’ala ịkpa, n’akụkụ Osimiri Yufretis,+ n’ihi na anụ ụlọ ha dị nnọọ ọtụtụ n’ala Gilied.+ 10 Mgbe Sọl na-achị, ha lụsoro ndị Hega agha, meriekwa ha. Mgbe ha merichara ha, ha gaziri biri n’ụlọikwuu ha n’ala niile dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Gilied.

11 Ma ụmụ Gad biri malite na Beshan ruo Saleka.+ Ha na ụmụ Ruben gbara agbata obi. 12 Na Beshan, Joel bụ onyeisi. Shefam bụ onye nke abụọ. Jenaị na Shefat sokwa ná ndị isi. 13 Ụmụnne ha, ndị ha na ha si n’otu ọnụmara, bụ Maịkel, Meshọlam, Shiba, Joraị, Jekan, Zaya, na Iba. Ha niile dị mmadụ asaa. 14 Ndị a bụ ụmụ Abihel nwa Huraị, nwa Jeroa, nwa Gilied, nwa Maịkel, nwa Jeshishaị, nwa Jado, nwa Bọz. 15 Ehaị nwa Abdiel, nwa Gunaị, bụ onyeisi ezinụlọ ndị nna nna ha. 16 Ha biri na Gilied,+ nke dị na Beshan,+ nakwa n’ime obodo ndị dị ya nso,* nakwa n’ala niile anụmanụ ha na-ata ahịhịa na Sharọn. 17 N’oge Eze Jotam+ na-achị Juda nakwa n’oge Eze Jeroboam*+ na-achị Izrel, e debara aha ha niile n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ dị iche iche.

18 N’ebo Ruben, n’ebo Gad, nakwa n’ọkara ebo Manase, e nwere puku mmadụ iri anọ na anọ na narị asaa na iri isii (44,760) ndị bụ́ dike n’agha. Ha na-eji ọta na mma agha, na-ejikwa ụta.* Ha bụkwa ndị agha a zụrụ azụ. 19 Ha lụsoro ndị Hega,+ ụmụ Jitọ, ụmụ Nefish,+ na ụmụ Nodab agha. 20 Chineke nyeere ha aka n’agha ahụ, nyefeekwa ndị Hega na ndị niile ha na ha so n’aka ha. Ha rịọrọ Chineke ka o nyere ha aka n’agha ahụ, ya anụkwa arịrịọ ha maka na ha tụkwasịrị ya obi.+ 21 Ha kpụụrụ anụ ụlọ ha. Ha kpụụrụ puku kamel iri ise (50,000), narị puku atụrụ abụọ na puku iri ise (250,000), nakwa puku jakị abụọ (2,000). Ha dọkwaara otu narị puku (100,000) mmadụ* n’agha. 22 Ha gburu ọtụtụ ndị n’ihi na ezi Chineke lụụrụ ha agha.+ Ha bichiziri n’ala ha ruo mgbe a dọọrọ hanwa n’agha.+

23 Ọkara ebo Manase+ biri n’ala ahụ malite na Beshan ruo Bel-hemọn na Sina nakwa n’Ugwu Hemọn.+ Ha dị nnọọ ọtụtụ. 24 Ndị a bụ ndị isi n’ọnụmara ha dị iche iche: Ife, Ịshaị, Iliel, Azriel, Jeremaya, Họdavaya, na Jadiel. Ha bụ ndị dike n’agha, ndị a ma ama, na ndị isi ezinụlọ ndị nna nna ha. 25 Ma, ha nupụụrụ Chineke ndị nna nna ha isi. Ha kpara àgwà ka ndị akwụna, hapụ Chineke, fewe chi ndị ala ahụ,+ ndị Chineke lara n’iyi n’ihu ha. 26 N’ihi ya, Chineke Izrel mere ka Pul, eze Asiria,+ (ya bụ, Tilgat-pilniza,+ eze Asiria), gaa dọrọ ebo Ruben, ebo Gad, na ọkara ebo Manase n’agha ma kpọga ha Hela, Hebọ, Hera, nakwa n’akụkụ osimiri Gozan,+ ha ebiri ebe ahụ ruo taa.

6 Ụmụ Livaị+ ndị nwoke bụ Geshọn, Kohat+ na Meraraị.+ 2 Ụmụ Kohat bụ Amram, Izha,+ Hebrọn, na Ọziel.+ 3 Ụmụ Amram+ bụ Erọn,+ Mosis,+ na Miriam.+ Ụmụ Erọn bụ Nedab, Abaịhu,+ Elieza,+ na Ịtama.+ 4 Elieza mụrụ Finihas,+ Finihas amụọ Abishua, 5 Abishua amụọ Bọkaị, Bọkaị amụọ Ọzaị, 6 Ọzaị amụọ Zerahaya, Zerahaya amụọ Mereyọt, 7 Mereyọt amụọ Amaraya, Amaraya amụọ Ahaịtọb,+ 8 Ahaịtọb amụọ Zedọk,+ Zedọk amụọ Ahimaz,+ 9 Ahimaz amụọ Azaraya, Azaraya amụọ Johenan, 10 Johenan amụọ Azaraya. Azaraya bụ onye nchụàjà n’ụlọ Solomọn rụrụ na Jeruselem.

11 Azaraya mụrụ Amaraya, Amaraya amụọ Ahaịtọb, 12 Ahaịtọb amụọ Zedọk,+ Zedọk amụọ Shalọm, 13 Shalọm amụọ Hilkaya,+ Hilkaya amụọ Azaraya, 14 Azaraya amụọ Seraya,+ Seraya amụọ Jehozadak.+ 15 A dọọrọ Jehozadak n’agha mgbe Jehova mere ka Nebukadneza dọrọ Juda na Jeruselem n’agha.

16 Ụmụ Livaị bụ Geshọm,* Kohat na Meraraị. 17 Ndị a bụ aha ụmụ Geshọm: Libnaị na Shimiaị.+ 18 Ụmụ Kohat bụ Amram, Izha, Hebrọn, na Ọziel.+ 19 Ụmụ Meraraị bụ Malaị na Mushaị.

Ndị a bụ aha ndị isi ezinụlọ ndị Livaị:+ 20 Geshọm+ mụrụ Libnaị, Libnaị amụọ Jehat, Jehat amụọ Zima, 21 Zima amụọ Joa, Joa amụọ Ido, Ido amụọ Zira, Zira amụọ Jeateraị. 22 Kohat mụrụ Aminadab, Aminadab amụọ Kora,+ Kora amụọ Asia, 23 Asia amụọ Elkena, Elkena amụọ Ebayasaf,+ Ebayasaf amụọ Asia, 24 Asia amụọ Tehat, Tehat amụọ Yurayel, Yurayel amụọ Ọzaya, Ọzaya amụọ Sheọl. 25 Ụmụ Elkena bụ Amesaị na Ahaịmọt. 26 Onye ọzọ aha ya bụkwa Elkena mụrụ Zofaị, Zofaị amụọ Nehat, 27 Nehat amụọ Elayab, Elayab amụọ Jeroham, Jeroham amụọ Elkena.+ 28 Samuel+ mụrụ Joel bụ́ ọkpara ya na Abaịja bụ́ nwa ya nke abụọ.+ 29 Meraraị mụrụ Malaị,+ Malaị amụọ Libnaị, Libnaị amụọ Shimiaị, Shimiaị amụọ Ọza, 30 Ọza amụọ Shimia, Shimia amụọ Hagaya, Hagaya amụọ Asaya.

31 E nwere ndị Devid họpụtara ka ha na-eduzi ndị na-abụ abụ n’ụlọ Jehova mgbe a dọsachara Igbe Chineke n’ụlọ ahụ.+ 32 Tupu Solomọn arụọ ụlọ Jehova na Jeruselem,+ ọ bụ ha na-ahụ maka abụ a na-abụ n’ụlọikwuu, ya bụ, n’ụlọikwuu nzute. Ha nọkwa na-arụ ọrụ a otú a gwara ha ka ha si na-arụ ya.+ 33 Ndị a bụ ndị ha na ụmụ ha na-arụ ọrụ a: A bịa n’ụmụ Kohat, e nwere Himan+ onye ọbụ abụ, nwa Joel+ nwa Samuel 34 nwa Elkena+ nwa Jeroham nwa Iliel nwa Toa 35 nwa Zọf nwa Elkena nwa Mehat nwa Amesaị 36 nwa Elkena nwa Joel nwa Azaraya nwa Zefanaya 37 nwa Tehat nwa Asia nwa Ebayasaf nwa Kora 38 nwa Izha nwa Kohat nwa Livaị nwa Izrel.

39 Esaf+ nwanne Himan na-anọ n’aka nri ya. Esaf bụ nwa Berekaya nwa Shimia 40 nwa Maịkel nwa Baasiya nwa Malkaịja 41 nwa Etnaị nwa Zira nwa Adaya 42 nwa Itan nwa Zima nwa Shimiaị 43 nwa Jehat nwa Geshọm nwa Livaị.

44 Itan, onye so n’ụmụ ụmụ Meraraị,+ bụ́ ụmụnne Himan na Esaf, na-anọ n’aka ekpe Himan. Itan+ bụ nwa Kishaị nwa Abdaị nwa Malọk 45 nwa Hashabaya nwa Amazaya nwa Hilkaya 46 nwa Amzaị nwa Benaị nwa Shima 47 nwa Malaị nwa Mushaị nwa Meraraị nwa Livaị.

48 A họpụtara ụmụnne ha, bụ́ ndị Livaị ndị ọzọ, ka ha na-eje ozi niile a na-eje n’ụlọikwuu, ya bụ, n’ụlọ ezi Chineke.+ 49 Erọn na ụmụ ya+ na-esu àjà ọkụ n’elu ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ,+ na-achụkwa insens n’àjà n’elu ebe ịchụàjà insens.+ Ha na-arụkwa ọrụ niile ha kwesịrị ịrụ gbasara ihe ndị kacha nsọ. Ha na-arụ ya iji na-ekpuchiri ndị Izrel mmehie ha+ otú Mosis ohu Chineke kwuru ka a na-eme. 50 Ndị a bụ ụmụ Erọn:+ Ọ mụrụ Elieza,+ Elieza amụọ Finihas, Finihas amụọ Abishua, 51 Abishua amụọ Bọkaị, Bọkaị amụọ Ọzaị, Ọzaị amụọ Zerahaya, 52 Zerahaya amụọ Mereyọt, Mereyọt amụọ Amaraya, Amaraya amụọ Ahaịtọb,+ 53 Ahaịtọb amụọ Zedọk,+ Zedọk amụọ Ahimaz.

54 Ebe ndị a ka ha mara ụlọikwuu,* birikwa na ha: mgbe e fere nza nke mbụ, e nyere ụmụ Erọn, ndị si n’ezinụlọ Kohat, 55 Hebrọn+ nke dị na Juda, ya na ala niile gbara ya gburugburu ebe anụmanụ ha ga na-ata ahịhịa. 56 Ma, ha nyere Keleb+ nwa Jefune ala obodo ahụ na ógbè ya niile. 57 E nyekwara ụmụ Erọn obodo mgbaba dị iche iche.*+ E nyere ha Hebrọn,+ nakwa Libna+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. E nyekwara ha Jatia,+ Eshtemoa na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.+ 58 E nyekwara ha Haịlen na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, na Diba+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 59 na Eshan+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Bet-shimesh+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. 60 Ndị ebo Benjamin nyere ha Giba+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, na Alemet na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Anatọt+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Obodo niile e nyere ezinụlọ ha dị iche iche dị iri na atọ.+

61 Mgbe e fere nza, e nyere ụmụ Kohat fọrọnụ obodo iri. E si n’ezinụlọ ebo ndị ọzọ nakwa n’ọkara ebo Manase nye ha obodo ndị ahụ.+

62 E si n’ebo Ịsaka, n’ebo Asha, n’ebo Naftalaị nakwa n’ebo Manase ndị bi na Beshan nye ụmụ Geshọm obodo iri na atọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+

63 E fere nza, si n’ebo Ruben, n’ebo Gad nakwa n’ebo Zebulọn nye ụmụ Meraraị obodo iri na abụọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+

64 Otú a ka ndị Izrel si nye ndị Livaị obodo ndị a na ala ebe anụmanụ ha ga na-ata ahịhịa.+ 65 Ha fekwara nza, si n’ebo Juda, n’ebo Simiọn nakwa n’ebo Benjamin nye ha obodo ndị a kpọrọ aha ha.

66 Ndị ebo Ifrem nyere ụfọdụ n’ime ezinụlọ ụmụ Kohat obodo ụfọdụ.+ 67 Ha nyere ha obodo mgbaba dị iche iche.* Obodo ndị ahụ bụ Shikem+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nke dị n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, Giza+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 68 na Jọkmiam na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, na Bet-horọn+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 69 na Aịjalọn+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Gat-rimọn+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. 70 E sikwa n’ọkara ebo Manase nye ndị ezinụlọ ụmụ Kohat fọrọnụ Ena na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa nakwa Biliem na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.

71 Ha si n’ezinụlọ ọkara ebo Manase nye ụmụ Geshọm obodo ndị a: Golan,+ nke dị na Beshan, na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa nakwa Ashtarọt na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.+ 72 Ha sikwa n’ebo Ịsaka nye ha Kidesh na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, na Daberat+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa,+ 73 na Remọt na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Enem na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. 74 Ha sikwa n’ebo Asha nye ha Meshal na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, na Abdọn na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa,+ 75 na Hukọk na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Rihọb+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. 76 Ha sikwa n’ebo Naftalaị nye ha Kidesh+ nke dị na Galili+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, na Hamọn na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Kiriateyim na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.

77 Ha si n’ebo Zebulọn+ nye ụmụ Meraraị fọrọnụ Rimọno na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa nakwa Tebọ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. 78 Ha sikwa n’ebo Ruben, ná mpaghara Osimiri Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko, n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, nye ha Biza nke dị n’ala ịkpa, ya na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, na Jehaz+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 79 na Kedemọt+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Mefat na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. 80 Ha sikwa n’ebo Gad nye ha Remọt, nke dị na Gilied, na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, na Mahaneyim+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 81 na Heshbọn+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Jeza+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.

7 Ụmụ Ịsaka bụ Tola, Pua, Jeshọb, na Shimrọn.+ Ha dị anọ. 2 Ụmụ Tola bụ Ọzaị, Refeya, Jiriel, Jamaị, Ibsam, na Shemuel. Ha bụ ndị isi n’ọnụmara ha dị iche iche. Ndị si n’ezinụlọ Tola bụ ndị dike n’agha. Ha dị puku mmadụ iri abụọ na abụọ na narị isii (22,600) n’oge Devid na-achị. 3 Izrahaya bụ nwa Ọzaị. Ụmụ Izrahaya bụ Maịkel, Obedaya, Joel, na Ịs-shaya. Ha ise bụ ndị isi. 4 Ha na ụmụ ha lụrụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị, mụọkwa ọtụtụ ụmụ. Ọ bụ ya mere na a bịa ná ndị si n’ọnụmara ha, e nwere puku mmadụ iri atọ na puku isii (36,000) ndị na-aga agha. 5 Ụmụnne ha ndị si n’ezinụlọ Ịsaka bụ ndị dike n’agha. E debara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche. Ha dị puku iri asatọ na puku asaa (87,000).+

6 Ụmụ Benjamin+ bụ Bila,+ Bika,+ na Jedayel.+ Ha dị atọ. 7 Ụmụ Bila bụ Ezbọn, Ọzaị, Ọziel, Jerimọt, na Aịraị. Ha dị ise. Ha bụ ndị isi n’ọnụmara ha dị iche iche, bụrụkwa ndị dike n’agha. E debara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ dị iche iche. Ha dị puku mmadụ iri abụọ na abụọ na mmadụ iri atọ na anọ (22,034).+ 8 Ụmụ Bika bụ Zemaịra, Joash, Eliiza, Elio-inaị, Ọmraị, Jeremọt, Abaịja, Anatọt, na Alemet. Ha niile bụ ụmụ Bika. 9 Ndị isi ọnụmara ha, ndị bụ́ dike n’agha, ndị e debara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche, dị puku mmadụ iri abụọ na narị abụọ (20,200). 10 Bilhan bụ nwa Jedayel.+ Ụmụ Bilhan bụ Jiọsh, Benjamin, Ehud, Keneana, Zitan, Tashish, na Ahishaha. 11 Ndị a niile bụ ụmụ Jedayel. Ha bụ ndị isi ezinụlọ ndị nna nna ha. Ha nwere puku mmadụ iri na asaa na narị abụọ (17,200) ndị na-aga agha, ndị bụ́kwa dike n’agha.

12 Ụmụ Iye bụ Shọpim na Họpim.+ Ndị Hushim bụ ụmụ Eha.

13 Ụmụ Naftalaị+ ndị nwoke bụ Jaziel, Gunaị, Jiza, na Shalọm. Ha bụ ụmụ ụmụ Bilha.+

14 Ụmụ Manase bụ:+ Asriel, onye iko ya bụ́ nwaanyị Siria, mụụrụ ya. (Ọ bụ nwaanyị ahụ mụrụ Mekia+ nna Gilied. 15 Mekia lụụrụ Họpim nwaanyị, lụọkwara Shọpim. Aha nwanne ya nwaanyị bụ Meaka.) Aha nwa Manase nke abụọ bụ Zelofehad.+ Ma, ọ bụ ụmụ nwaanyị ka Zelofehad mụrụ.+ 16 Meaka, nwunye Mekia, mụrụ nwa nwoke, gụọ ya Piresh. Aha nwanne ya nwoke bụ Shiresh. Ụmụ ya bụ Yulam na Rikem. 17 Nwa* Yulam bụ Bidan. Ndị a bụ ụmụ Gilied nwa Mekia nwa Manase. 18 Hamoleket bụ nwanne nwaanyị Gilied. Ọ bụ ya mụrụ Ish-họd, Abi-iza, na Mala. 19 Ụmụ Shemaịda bụ Ahayan, Shikem, Likhaị, na Anayam.

20 Ifrem+ mụrụ Shutela,+ Shutela amụọ Bired, Bired amụọ Tehat, Tehat amụọ Elieda, Elieda amụọ Tehat, 21 Tehat amụọ Zebad, Zebad amụọ Shutela. Ifrem mụkwara Iza na Iliad. Ndị Gat+ gburu ha n’ihi na ha gara ịchịrị anụ ụlọ ha. 22 Ifrem nna ha ruuru ha uju ọtụtụ ụbọchị, ụmụnne ya nọkwa na-abịa akasi ya obi. 23 Ya na nwunye ya mechara nwee mmekọahụ, nwunye ya atụrụ ime mụọ nwa nwoke. Ma, ọ gụrụ ya Beraya* n’ihi na nwunye ya mụrụ ya n’oge ọdachi dakwasịrị ezinụlọ ya. 24 Nwa ya nwaanyị bụ Shiera. Ọ bụ ya rụrụ Bet-horọn Ndịda+ na nke Mgbago,+ rụọkwa Ọzen-shiera. 25 Rifa na Rishef si n’agbụrụ Ifrem. Rishef mụrụ Tila, Tila amụọ Tehan. 26 Tehan amụọ Ledan, Ledan amụọ Amaịhọd, Amaịhọd amụọ Elishama, 27 Elishama amụọ Nọn, Nọn amụọ Joshụa.*+

28 Ebe ụmụ Ifrem bi bụ Betel+ na ime obodo ndị dị ya nso,* na Neeran nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, na Giza nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ na ime obodo niile dị ya nso, na Shikem na ime obodo niile dị ya nso, ruokwa Aya* na ime obodo niile dị ya nso. 29 Obodo ndị dị nso n’ala ụmụ Manase bụ Bet-shian+ na ime obodo niile dị ya nso, Teanak+ na ime obodo niile dị ya nso, Megido+ na ime obodo niile dị ya nso, na Dọọ+ na ime obodo niile dị ya nso. Ebe ndị a ka ụmụ Josef nwa Izrel biri.

30 Ụmụ Asha ndị nwoke bụ Imna, Ishva, Ishvaị, na Beraya.+ Aha nwanne ha nwaanyị bụ Sira.+ 31 Ụmụ Beraya bụ Hiba na Malkiel. Malkiel bụ nna Biezeit. 32 Hiba mụrụ Jaflet, Shoma, Hotam, nakwa Shua nwanne ha nwaanyị. 33 Ụmụ Jaflet bụ Pesak, Bimhal, na Ashvat. Ọ bụ ha bụ ụmụ Jaflet. 34 Ụmụ Shima* bụ Ehaị, Roga, Jehọba, na Eram. 35 Ụmụ Hilem* nwanne ya bụ Zofa, Imna, Shilesh, na Emal. 36 Ụmụ Zofa bụ Sua, Hanifa, Shual, Biraị, Imra, 37 Biza, Họd, Shama, Shilsha, Itran, na Beira. 38 Ụmụ Jita bụ Jefune, Pispa, na Era. 39 Ụmụ Ọla bụ Era, Haniel, na Rizaya. 40 Ndị a niile bụ ụmụ Asha. Ha bụ ndị isi n’ọnụmara ha dị iche iche. A họrọ ha ahọ. Ha bụkwa ndị dike n’agha nakwa ndị isi kacha nwee agba. Ha na-aga agha. E debakwara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche.+ Ha dị puku iri abụọ na puku isii (26,000).+

8 Benjamin+ mụrụ Bila+ bụ́ ọkpara ya, Ashbel+ nwa ya nke abụọ, Ahara nwa ya nke atọ, 2 Noha nwa ya nke anọ, na Refa nwa ya nke ise. 3 Bila mụrụ Ada, Gira,+ Abaịhọd, 4 Abishua, Neeman, Ahoa, 5 Gira, Shefufan, na Huram. 6 E nwekwara ụmụ Ehud, ndị bụ́ ndị isi ọnụmara ndị bi na Giba,+ ndị a dọọrọ n’agha laa Manahat. Ha bụ: 7 Neeman, Ahaịja, na Gira. Ọ bụ Gira nọ na-edu ha mgbe a dọọrọ ha n’agha. Ọ bụkwa ya mụrụ Ọza na Ahaịhọd. 8 Shahareyim mụrụ ụmụ na Moab mgbe ọ chụpụchara ndị nwunye ya. Hushim na Beara bụ ndị nwunye ya.* 9 Hodesh nwunye ya mụkwaara ya Jobab, Zibia, Misha, Malkam, 10 Jiọz, Sakaya, na Mema. Ọ bụ ha bụ ụmụ ya. Ha bụkwa ndị isi ọnụmara dị iche iche.

11 Hushim mụụrụ ya Abaịtọb na Elpel. 12 Ụmụ Elpel bụ Iba, Maịsham, na Shimed, (onye rụrụ Ono,+ Lọd+ na ime obodo ndị dị ya nso),* 13 Beraya, na Shima. Ha bụ ndị isi ọnụmara ndị bi n’Aịjalọn.+ Ọ bụkwa ha chụpụrụ ndị bi na Gat. 14 Ndị ọzọkwa bụ Ahayo, Sheshak, Jeremọt, 15 Zebadaya, Erad, Ịda, 16 Maịkel, Ishpa, na Joha, ụmụ Beraya. 17 Ndị ọzọkwa bụ Zebadaya, Meshọlam, Hizkaị, Hiba, 18 Ishmeraị, Izlaya, na Jobab, ụmụ Elpel. 19 Ndị ọzọkwa bụ Jekim, Zikraị, Zabdaị, 20 Eliinaị, Ziletaị, Iliel, 21 Adaya, Bereya, na Shimrat, ụmụ Shimiaị. 22 Ndị ọzọkwa bụ Ishpan, Iba, Iliel, 23 Abdọn, Zikraị, Henan, 24 Hananaya, Ịlam, Antọtaịja, 25 Ifdiya, na Penuel, ụmụ Sheshak. 26 Ndị ọzọkwa bụ Shamsheraị, Sheharaya, Atalaya, 27 Jeareshaya, Ịlaịja, na Zikraị, ụmụ Jeroham. 28 Ọ bụ ndị a bụ ndị isi ọnụmara dị iche iche n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ha biri na Jeruselem.

29 Jeayel biri na Gibiọn.+ Ọ bụ ya bụ nna ndị Gibiọn. Aha nwunye ya bụ Meaka.+ 30 Ọkpara ya bụ Abdọn. Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Zọọ, Kish, Bel, Nedab, 31 Gidọ, Ahayo, na Zika. 32 Miklọt mụrụ Shimea. Ha niile bikwa ụmụnne ha* nso na Jeruselem, ha na ụmụnne ha ndị nke ọzọ.

33 Nee+ mụrụ Kish, Kish amụọ Sọl,+ Sọl amụọ Jonatan,+ Malkaị-shua,+ Abinadab,+ na Eshbel.*+ 34 Jonatan mụrụ Merib-bel.*+ Merib-bel amụọ Maịka.+ 35 Ụmụ Maịka bụ Paịtọn, Melek, Taria, na Ehaz. 36 Ehaz mụrụ Jehoada, Jehoada amụọ Alemet, Azmavet, na Zimraị. Zimraị mụrụ Moza, 37 Moza amụọ Binia, Binia amụọ Refa, Refa amụọ Eliesa, Eliesa amụọ Ezel. 38 Ezel mụrụ ụmụ isii. Aha ha bụ Azraịkam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Obedaya, na Henan. Ha niile bụ ụmụ Ezel. 39 Ụmụ Ishek nwanne ya bụ Yulam bụ́ ọkpara ya, Jiọsh nwa ya nke abụọ, na Elifelet nwa ya nke atọ. 40 Ụmụ Yulam bụ ndị dike n’agha. Ha ma otú e si agba ụta. Ha nwekwara ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ, ndị dị otu narị mmadụ na iri ise (150). Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Benjamin.

9 E debara aha ndị Izrel niile n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. E dere ha n’akwụkwọ e dere gbasara ndị eze Izrel. A dọọrọ ndị Juda n’agha laa Babịlọn maka na ha erubereghị Chineke isi.+ 2 Ndị mbụ laghachiri n’ala ha ketara bụ ụfọdụ ndị Izrel, ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ.*+ 3 Ụfọdụ ndị Juda,+ ụfọdụ ndị Benjamin,+ ụfọdụ ndị Ifrem, na ụfọdụ ndị Manase gara biri na Jeruselem. Ha bụ: 4 Yutaị nwa Amaịhọd nwa Ọmraị nwa Imraị nwa Benaị, onye si n’agbụrụ Pirez+ nwa Juda. 5 Ụmụ ụmụ Shila ndị bi ebe ahụ bụ Asaya bụ́ ọkpara na ụmụ ya. 6 Ụmụ Zira+ ndị bi ebe ahụ bụ Jeyuel na ụmụnne ya dị narị isii na iri itoolu (690).

7 Ụmụ ụmụ Benjamin ndị bi ebe ahụ bụ Salu nwa Meshọlam nwa Họdavaya nwa Hasenua, 8 na Ibniya nwa Jeroham, na Ila nwa Ọzaị nwa Mikraị, nakwa Meshọlam nwa Shefataya nwa Ruel nwa Ibnaịja. 9 Ụmụnne ha ndị e dere aha ha n’ezinụlọ n’ezinụlọ dị narị itoolu na iri ise na isii (956). Ndị a niile bụ ndị isi ọnụmara ha.

10 Ndị nchụàjà ndị bi ebe ahụ bụ Jedeya, Jehoyarib, Jekin,+ 11 na Azaraya nwa Hilkaya nwa Meshọlam nwa Zedọk nwa Mereyọt nwa Ahaịtọb, onyeisi n’ụlọ* ezi Chineke. 12 Ndị ọzọkwa bụ Adaya nwa Jeroham nwa Pash-họ nwa Malkaịja, na Measaị nwa Adiel nwa Jazera nwa Meshọlam nwa Meshilemit nwa Ịma, 13 nakwa ụmụnne ha, bụ́ ndị isi ọnụmara ha. Ha niile dị otu puku na narị asaa na iri isii (1,760). Ha bụ ụmụ nwoke gbasiri ike, ndị na-adị njikere ịrụ ọrụ a na-arụ n’ụlọ ezi Chineke.

14 Ndị Livaị ndị bi ebe ahụ bụ Shemaya+ nwa Hashọb nwa Azraịkam nwa Hashabaya, onye si n’agbụrụ Meraraị, 15 na Bakbaka, Hiresh, Gelal, Matanaya nwa Maịka nwa Zikraị nwa Esaf, 16 Obedaya nwa Shemaya nwa Gelal nwa Jedutọn, nakwa Berekaya nwa Esa nwa Elkena. Berekaya biri n’ime obodo ndị Netofa.+

17 Ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá+ bụ Shalọm, Akọb, Talmọn, na Ahaịman. Shalọm nwanne ha bụ onyeisi ha. 18 Ọ na-anọbu n’ọnụ ụzọ ámá eze n’ebe ọwụwa anyanwụ.+ Ọ bụ ndị a bụ ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá nke ebe ụmụ Livaị mara ụlọikwuu. 19 Ọ bụkwa Shalọm nwa Kore nwa Ebayasaf nwa Kora, na ụmụnne ya ndị si n’ezinụlọ ndị nna nna ya, bụ́ ụmụ Kora, bụ ndị na-ahụ maka iche ọnụ ụzọ ụlọikwuu nche. Ọrụ ndị nna nna ha nọ na-arụ bụkwa iche ọnụ ụzọ ụlọikwuu Jehova nche. 20 Finihas+ nwa Elieza+ bụ onye ndú ha n’oge gara aga. Jehova nọnyekwaara ya. 21 Zekaraya+ nwa Meshelemaya na-eche ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute nche.

22 Ndị niile a họọrọ ka ha na-eche ọnụ ụzọ dị iche iche nche dị narị mmadụ abụọ na iri na abụọ (212). Ha biri n’ime obodo ha dị iche iche n’usoro e si dee aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ Devid na Samuel onye ọhụ ụzọ+ họpụtara ha ịrụ ọrụ a a na-enye ndị a tụkwasịrị obi. 23 Ha na ụmụ ha na-ahụ maka iche ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ Jehova nche,+ ya bụ, n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọikwuu. 24 Ndị na-eche ọnụ ụzọ ámá nche na-anọ n’akụkụ anọ ya, ya bụ, n’ebe ọwụwa anyanwụ, n’ebe ọdịda anyanwụ, n’ebe ugwu, nakwa n’ebe ndịda.+ 25 Ọ na-abụ ụmụnne ha gụrụ gụrụ, ha esi n’ime obodo ha dị iche iche bịa nyere ha aka abalị asaa. 26 E nwere ndị isi* anọ n’ime ndị na-eche ọnụ ụzọ ámá nche, ndị e nyere ọrụ a na-enye ndị a tụkwasịrị obi. Ha bụ ndị Livaị. Ha na-ahụ maka ọnụ ụlọ ndị dị* n’ụlọ ezi Chineke nakwa akụ̀ ndị dị na ya.+ 27 Ha na-eche nche gburugburu ụlọ ezi Chineke chi abọọ. Ọ bụ ha na-ahụ maka iche nche, na-ahụkwa maka mkpịsị ugodi. Ọ bụkwa ha na-emeghe ụzọ n’ụtụtụ ọ bụla.

28 Ụfọdụ n’ime ha na-ahụ maka arịa+ ndị e ji ejere Chineke ozi. Ha na-agụ ha ọnụ mgbe ọ bụla a na-ebubata ha nakwa mgbe ọ bụla a na-ebupụ ha. 29 A họpụtakwara ụfọdụ n’ime ha ka ha na-ahụ maka arịa dị iche iche, na-ahụkwa maka arịa niile dị nsọ,+ ntụ ọka e gwere nke ọma,+ mmanya,+ mmanụ,+ frankinsens,+ nakwa mmanụ balsam.+ 30 Ụfọdụ ụmụ ndị nchụàjà na-esikwa mmanụ balsam. 31 Ọ bụkwa Matitaya, onye Livaị, ọkpara Shalọm, onye si n’agbụrụ Kora, na-ahụ maka ime keeki ndị dị mbadamba. Ihe a bụ ọrụ a na-enye onye a tụkwasịrị obi.+ 32 Ụfọdụ ụmụ Kohat, bụ́ ụmụnne ha, na-ahụ maka achịcha a na-enye Chineke.+ Ha na-eme achịcha a n’ụbọchị izu ike ọ bụla.+

33 O nweghị ọrụ ọzọ e nyere ndị na-abụ abụ, ndị isi ezinụlọ ndị Livaị, ndị na-anọ n’ọnụ ụlọ ndị dị n’ụlọ nsọ,* n’ihi na ha na-arụ ọrụ ha ma n’ehihie ma n’abalị. 34 Ọ bụ ndị a bụ ndị isi ezinụlọ ndị Livaị n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ha biri na Jeruselem.

35 Jeayel biri na Gibiọn.+ Ọ bụ ya bụ nna ndị Gibiọn. Aha nwunye ya bụ Meaka. 36 Ọkpara ya bụ Abdọn. Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Zọọ, Kish, Bel, Nee, Nedab, 37 Gidọ, Ahayo, Zekaraya, na Miklọt. 38 Miklọt mụrụ Shimea.* Ha niile bikwa ụmụnne ha* nso na Jeruselem, ha na ụmụnne ha ndị nke ọzọ. 39 Nee+ mụrụ Kish, Kish amụọ Sọl,+ Sọl amụọ Jonatan,+ Malkaị-shua,+ Abinadab,+ na Eshbel. 40 Jonatan mụrụ Merib-bel,+ Merib-bel amụọ Maịka.+ 41 Ụmụ Maịka bụ Paịtọn, Melek, Taria, na Ehaz. 42 Ehaz mụrụ Jera, Jera amụọ Alemet, Azmavet, na Zimraị. Zimraị mụrụ Moza, 43 Moza amụọ Binia na Refeya, Refeya amụọ Eliesa, Eliesa amụọ Ezel. 44 Ezel mụrụ ụmụ isii. Aha ha bụ Azraịkam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Obedaya, na Henan. Ha niile bụ ụmụ Ezel.

10 Ndị Filistia nọ na-alụso ndị Izrel agha, gbuokwa ọtụtụ n’ime ha n’Ugwu Gilboa. Ndị Izrel fọrọnụ gbara ọsọ.+ 2 Ndị Filistia wee chụsie Sọl na ụmụ ya ọsọ ike, chụkwute ha, gbuokwa Jonatan, Abinadab, na Malkaị-shua,+ ụmụ Sọl. 3 Agha ahụ wee siere Sọl ike, ndị na-agba ụta emechaakwa hụ ya ma gbaa ya ụta merụrụ ya ahụ́.+ 4 Sọl wee sị onye na-eburu ya ngwá agha: “Mịrị mma agha gị maa m, ka ndị a a na-ebighị úgwù ghara ịbịa mesie m ike.”+ Ma obi ekweghị onye na-eburu ya ngwá agha ime ihe a ọ gwara ya, n’ihi na ezigbo ụjọ ji ya. Sọl wee mịrị mma agha dakwasị na ya.+ 5 Mgbe onye na-eburu ya ngwá agha hụrụ na ọ nwụọla, yanwa dakwasịkwara ná mma agha nke ya, nwụọkwa. 6 Otú a ka Sọl na ụmụ ya atọ si nwụọ. Ndị ụlọ ya niile nwụkwara.+ 7 Mgbe ndị Izrel niile nọ na ndagwurugwu hụrụ na ndị agha Izrel agbaala ọsọ, nakwa na Sọl na ụmụ ya anwụọla, ha malitere ịhapụ obodo ha gbaa ọsọ. Ndị Filistia mechakwara bịa bichie ebe ndị ahụ.

8 N’echi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụsị ndị e gburu egbu ihe ha yi, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ka ha tọgbọ n’Ugwu Gilboa.+ 9 Ha wee yipụ ya ihe o yi, gbupụ ya isi, chịrị ngwá agha ya, ziekwa ozi ka a gaa n’ala ndị Filistia niile nakwa n’ụlọ arụsị ha+ gwa ndị obodo ha ihe merenụ. 10 Ha dowekwara ngwá agha ya n’ụlọ arụsị ha, kedokwa okpokoro isi ya n’ụlọ Degọn.+

11 Mgbe ndị niile bi na Jebesh+ nke dị na Gilied nụrụ ihe niile ndị Filistia mere Sọl,+ 12 ndị agha ha niile gara buru ozu Sọl na ozu ụmụ ya. Ha butere ha Jebesh ma lie ọkpụkpụ ha n’okpuru nnukwu osisi dị na Jebesh.+ Ha bukwara ọnụ ụbọchị asaa.

13 Otú a ka Sọl si nwụọ n’ihi isi o nupụụrụ Jehova. O meghị ihe Jehova gwara ya.+ Ọ gakwukwaara onye na-agba afa ka ọ jụọrọ ya ase+ 14 kama ịjụ Jehova ase. Ọ bụ ya mere o* ji mee ka ọ nwụọ ma nyefee Devid nwa Jesi ọchịchị.+

11 Ka oge na-aga, ndị Izrel niile zukọrọ bịakwute Devid na Hebrọn,+ sị ya: “Anyị na gị bụ otu ọbara.*+ 2 N’oge gara aga, mgbe Sọl bụ eze, ọ bụ gị na-edu ndị Izrel aga agha.*+ Jehova bụ́ Chineke gị gwakwara gị, sị: ‘Ọ bụ gị ga-azụ ndị m Izrel dị ka atụrụ. Ọ bụkwa gị ga-abụ onye ndú ndị m Izrel.’”+ 3 Ndị okenye niile n’Izrel wee bịakwute eze Devid na Hebrọn. Ha na ya anọrọ ebe ahụ gbaa ndụ n’ihu Jehova. Ha tekwara Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze Izrel+ otú Jehova si n’ọnụ Samuel kwuo.+

4 E mechaa, Devid na ndị Izrel niile gara Jeruselem, ya bụ, Jebus,+ ebe ndị Jebus+ bi. 5 Ndị bi na Jebus mara Devid aka, sị ya: “I mekataghị bata ebe a.”+ Ma, Devid weghaara Zayọn, bụ́ obodo a rụsiri ike,+ nke a na-akpọzi Obodo Devid+ ugbu a. 6 Devid sịkwara: “Onye ọ bụla ga-ebu ụzọ lụso ndị Jebus agha ga-abụ onyeisi ndị agha.” Joab+ nwa Zeruya bukwa ụzọ gaa lụso ha agha. Ọ ghọkwara onyeisi ndị agha. 7 Devid wee biri n’ebe a rụsiri ike. Ọ bụ ya mere ha ji kpọọ ebe ahụ Obodo Devid. 8 O bidokwara ịrụ mgbidi na ihe ndị ọzọ n’obodo ahụ, ma na Milo* ma n’ebe ndị dị ya nso. Joab rụzikwara ebe ndị fọrọnụ n’obodo ahụ. 9 Devid nọkwa na-esikwu ike.+ Jehova nke ụsụụ ndị agha nọnyekwaara ya.

10 E nwere ndị bụ́ ndị isi ndị dike bụ́ ndị agha Devid. Ha na ndị Izrel niile kwadoro ya mgbe ọ na-achị. Ha nyere aka chie ya eze otú Jehova gwara ndị Izrel.+ 11 Ndị a bụ aha ndị dike bụ́ ndị agha Devid: Jashobiam,+ onye si n’agbụrụ Hakmọnaị, onyeisi ndị dike atọ.+ E nwere mgbe o ji ube ya gbuo narị mmadụ atọ (300) otu mgbe.+ 12 Onye na-esote ya bụ Elieza+ nwa Dodo nwa Ahohaị.+ Ọ bụ otu n’ime ndị dike atọ bụ́ ndị agha Devid. 13 Ya na Devid nọ na Pas-damim+ mgbe ha na ndị Filistia lụrụ agha. E nwere ala ọka bali juru na ya, ma ndị Izrel gbara ọsọ n’ihi ndị Filistia. 14 Ma ọ kwụụrụ n’etiti ala ahụ na-egbu ndị Filistia, napụtakwa ha ala ahụ. Otú a ka Jehova si mee ka ndị Izrel merie n’agha ahụ.*+

15 Mmadụ atọ n’ime mmadụ iri atọ bụ́ ndị isi gakwuuru Devid n’ọgba Adọlam+ dị n’otu ugwu. Ma, ndị agha Filistia mara ụlọikwuu na Ndagwurugwu Refeyim.+ 16 N’oge ahụ, Devid nọ ebe a rụsiri ike. Ebe ndị agha Filistia na-anọ eche nche dịkwa na Betlehem. 17 Devid sịrị: “Obi ga-adị m ụtọ ma m ṅụọ mmiri si n’olulu mmiri dị nso n’ọnụ ụzọ ámá Betlehem.”+ 18 Mgbe o kwuchara ihe a, mmadụ atọ ahụ banyere ebe ndị Filistia mara ụlọikwuu, sere mmiri n’olulu mmiri ahụ dị nso n’ọnụ ụzọ ámá Betlehem, butekwara ya Devid. Ma o kweghị aṅụ ya, kama ọ wụsaara ya Jehova n’ala. 19 Ọ sịkwara: “Tụfịakwa! Agaghị m aṅụ mmiri a n’ihi na m na-atụ egwu Chineke m. Olee ihe mere m ga-eji ṅụọ ọbara ụmụ nwoke a gaara anwụ+ ebe ha gara iseta mmiri? Ha gaara anwụ n’ihi ihe a ha mere.” N’ihi ya, o kweghị aṅụ ya. Ihe a ka ndị dike atọ ahụ so ná ndị agha ya mere.

20 Abishaị+ nwanne Joab+ bụ onyeisi ndị dike atọ ọzọ. E nwere mgbe o ji ube ya gbuo narị mmadụ atọ (300). Aha ya na-edekwa ude ka nke ndị dike atọ mbụ ahụ.+ 21 A bịa ná ndị dike atọ nke ọzọ ahụ, a na-akwanyere ya ùgwù karịa mmadụ abụọ n’ime ha. Ọ bụkwa onyeisi ha, ma ọ harughị ka ndị dike atọ mbụ ahụ.

22 Benaya,+ nwa Jehoyada, bụ nwoke obi kara.* O mere ọtụtụ ihe na Kabzil.+ O gburu ụmụ nwoke abụọ Ariel onye Moab mụrụ. Ọ bụkwa ya banyere n’olulu mmiri gbuo ọdụm n’otu ụbọchị snoo na-ada.+ 23 Ọ bụkwa ya gburu otu nwoke Ijipt gbara ajọ dimkpa. Nwoke ahụ dị kubit ise n’ogologo.*+ N’agbanyeghị na nwoke Ijipt ahụ ji ube yiri okporo osisi ndị na-ekwe ákwà,+ yanwa ji mkpara gakwuru ya, napụta ya ube ya ahụ, jirikwa ya gbuo ya.+ 24 Ihe ndị a ka Benaya nwa Jehoyada mere. Aha ya na-edekwa ude ka nke mmadụ atọ ahụ bụ́ dike n’agha. 25 Ọ bụ eziokwu na a na-akwanyere ya ùgwù karịa ndị agha iri atọ ahụ bụ́ ndị isi, ọ harughị ka ndị dike atọ ahụ.+ Ma, Devid họpụtara ya ka ọ bụrụ onye nche ya.

26 Ndị a bụ ndị dike bụ́ ndị agha Devid: Asahel+ nwanne Joab, Elhenan nwa Dodo onye Betlehem,+ 27 Shamọt onye Herọraịt, Hilez onye Pelọnaịt, 28 Aịra+ nwa Ikesh onye Tekoa, Abi-iza+ onye Anatọt, 29 Sibekaị+ onye Husha, Aịlaị onye Ahohaị, 30 Meharaị+ onye Netofa, Hiled+ nwa Beana onye Netofa, 31 Aịtaị nwa Raịbaị onye Gibia nke dị n’ebo Benjamin,+ Benaya onye Piratọn, 32 Huraị onye si na ndagwurugwu* Geash,+ Abayel onye Bet-araba, 33 Azmavet onye Bahurim, Elayaba onye Shealbim, 34 ụmụ Heshem onye Gimzo, Jonatan nwa Shegi onye Hararaịt, 35 Ahayam nwa Seka onye Hararaịt, Elaịfal nwa Ọọ, 36 Hifa onye Mekira, Ahaịja onye Pelọnaịt, 37 Hezro onye Kamel, Nearaị nwa Ezbaị, 38 Joel nwanne Netan, Mibha nwa Hagraị, 39 Zilek onye Amọn, Neharaị onye Bierọt, bụ́ onye na-eburu Joab nwa Zeruya ngwá agha, 40 Aịra onye Itraịt, Gereb onye Itraịt, 41 Yuraya+ onye Het, Zebad nwa Alaị, 42 Adina nwa Shaịza onye si n’ebo Ruben. Ọ bụ ya bụ onyeisi ụmụ Ruben. Mmadụ iri atọ nọ n’okpuru ya. 43 Ndị ọzọkwa bụ Henan nwa Meaka, Joshafat onye Mitnaịt, 44 Ọzaya onye Ashtarọt, Shema na Jeayel, ụmụ Hotam onye Aroa. 45 Ndị ọzọkwa bụ Jedayel nwa Shimraị, nakwa Joha nwanne ya bụ́ onye Taịzaịt, 46 Iliel onye Mehavaịt, Jeribaị na Jọshavaya bụ́ ụmụ Elneam, Itma onye Moab, 47 Iliel, Obed, na Jaasayel onye Zoba.

12 E nwere ndị bịakwutere Devid na Ziklag+ mgbe ọ na-ezogharị n’ihi Sọl+ nwa Kish. Ha so ná ndị bụ́ dike n’agha. Ha na-esokwa ya aga agha.+ 2 Ha na-eji ụta aga agha. Ha nwekwara ike iji aka nri ma ọ bụ aka ekpe+ gbapụ nkume+ ma ọ bụ jiri ụta gbapụ akụ́. Ha bụ ụmụnne Sọl. Ha si n’ebo Benjamin.+ 3 Ahayiza na Joash, bụ́ ụmụ Shemea onye Gibia,+ bụ ndị isi ha. Ndị ọzọ bụ Jiziel na Pelet bụ́ ụmụ Azmavet,+ Beraka, Jihu onye Anatọt, 4 nakwa Ishmeya onye Gibiọn.+ Ishmeya bụ onyeisi ndị isi iri atọ,+ bụrụkwa dike n’agha. Ndị ọzọkwa bụ Jeremaya, Jahazayel, Johenan, Jozabad onye Gedira, 5 Eluzaị, Jerimọt, Bealaya, Shemaraya, Shefataya onye Harif, 6 nakwa Elkena, Ịs-shaya, Azarel, Joiza, na Jashobiam, ndị si n’agbụrụ Kora.+ 7 Ndị ọzọkwa bụ Joila na Zebadaya, ụmụ Jeroham onye Gidọ.

8 Ụfọdụ ndị ebo Gad gakwuuru Devid n’ebe a rụsiri ike n’ala ịkpa.+ Ha bụ ndị dike n’agha, ndị agha a zụrụ azụ, na ndị aka ochie n’ibu ọta nakwa n’ịma ube. Ihu ha dị ka ihu ọdụm. Ha na-awụkwa ọsọ n’ugwu ka mgbada. 9 Iza bụ onyeisi ha. Obedaya bụ onye nke abụọ, Elayab onye nke atọ, 10 Mishmana onye nke anọ, Jeremaya onye nke ise, 11 Ataị onye nke isii, Iliel onye nke asaa, 12 Johenan onye nke asatọ, Elzebad onye nke itoolu, 13 Jeremaya onye nke iri, Makbanaị onye nke iri na otu. 14 Ndị a si n’ebo Gad,+ bụrụkwa ndị isi ndị agha. Onye na-esighị ike n’ime ha na-emerili otu narị (100) ndị agha, onye kacha ike n’ime ha na-emerilikwa otu puku (1,000) ndị agha.+ 15 Mgbe Osimiri Jọdan tojuru n’ọnụ n’ọnwa mbụ, ndị a gafere ya chụpụ ndị niile bi na ndagwurugwu, chụga ha n’ebe ọwụwa anyanwụ na n’ebe ọdịda anyanwụ.

16 Ụfọdụ ndị si n’ebo Benjamin nakwa n’ebo Juda gakwukwaara Devid ebe ahụ ọ nọ a rụsiri ike.+ 17 Devid pụtakwara ịhụ ha ma sị ha: “Ọ bụrụ na unu bu ihe ọma n’obi bịa ka unu nyere m aka, obi mụ na unu ga-abụ otu. Ma, ọ bụrụ na unu bịara ka unu rara m nye n’aka ndị iro m n’agbanyeghị na aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hà hụ ya ma kpee ikpe mụ na unu.”+ 18 Mmụọ nsọ wee dakwasị Amesaị,+ onyeisi mmadụ iri atọ ahụ, ya asị:

“Devid, anyị bụ nke gị. Anyị nọnyekwaara gị, nwa Jesi.+

Udo, udo dịrị gị, udo dịkwara onye na-enyere gị aka,

N’ihi na Chineke gị na-enyere gị aka.”+

Devid wee nabata ha, họpụtakwa ha ka ha soro ná ndị isi ndị agha ya.

19 Ụfọdụ n’ime ndị ebo Manase hapụrụ ndị agha Sọl ma gbakwuru Devid mgbe ya na ndị Filistia bịara ịlụso Sọl agha. Ma, Devid enyereghị ndị Filistia aka, n’ihi na mgbe ndị isi ndị Filistia+ gbachara izu, ha gwara ya ka ọ lawa. Ha sịrị: “Ọ bụrụ na o soro anyị, ọ ga-ahapụ anyị, gbakwuru Sọl onyenwe ya. Ihe a ga-atakwa isi anyị.”+ 20 Mgbe ọ gara Ziklag,+ ndị si n’ebo Manase gbakwuru ya bụ: Adna, Jozabad, Jedayel, Maịkel, Jozabad, Elaịhu, na Ziletaị. Ha bụ ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha n’ebo Manase.+ 21 Ha nyeere Devid aka ịlụso otu ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ọgụ, n’ihi na ha niile bụ ndị dike obi kara.+ Ha ghọkwara ndị isi ndị agha ya. 22 Ndị mmadụ na-abịa enyere Devid+ aka kwa ụbọchị. Ha nọ na-abịa ruo mgbe ha ghọrọ ìgwè ndị agha há ka ìgwè ndị agha Chineke.+

23 Ndị a bụ ndị agha ole jikeere ịlụ agha, ndị bịakwutere Devid na Hebrọn+ iji chie ya eze, ka ọ nọchie Sọl otú Jehova kwuru ka e mee.+ 24 Ndị Juda, ndị jikeere ịlụ agha, ndị na-ebu ọta ukwu na ube, dị puku mmadụ isii na narị asatọ (6,800). 25 Ndị Simiọn, ndị dike obi kara, ndị so ná ndị agha, dị puku mmadụ asaa na otu narị (7,100).

26 Ndị Livaị dị puku mmadụ anọ na narị isii (4,600). 27 Jehoyada+ bụ onye ndú ụmụ Erọn,+ puku mmadụ atọ na narị asaa (3,700) sokwa ya. 28 E nwekwara nwa okorobịa bụ́ dike obi kara, aha ya bụ Zedọk,+ nakwa ndị isi iri abụọ na abụọ si n’ezinụlọ ndị nna nna ya.

29 Ndị Benjamin, bụ́ ụmụnne Sọl,+ dị puku mmadụ atọ (3,000). Ọtụtụ n’ime ha nọbu na-eche ụlọ Sọl nche. 30 Ndị Ifrem dị puku mmadụ iri abụọ na narị asatọ (20,800). Ha bụ ndị dike obi kara, ndị a ma ama n’ọnụmara ha dị iche iche.

31 Ndị si n’ọkara ebo Manase dị puku mmadụ iri na asatọ (18,000). Ọ bụ ha ka a họpụtara ịga chie Devid eze. 32 Ndị Ịsaka dị narị ndị isi abụọ (200). Ha ma ihe na-aga n’obodo nakwa ihe ndị Izrel kwesịrị ime. Ọ bụkwa ha na-agwa ụmụnne ha niile ihe ha ga-eme. 33 Ndị Zebulọn, ndị na-aga agha, dị puku iri ise (50,000). Ha na-ebu ụdị ngwá agha niile aga agha. Ha jikwa obi ha niile soro Devid. 34 Ndị Naftalaị dị otu puku (1,000) ndị isi. Puku mmadụ iri atọ na puku asaa (37,000), ndị na-ebu ọta ukwu na ube, sokwa ha. 35 Ndị ebo Dan, ndị na-aga agha, dị puku iri abụọ na asatọ na narị isii (28,600). 36 Ndị nke Asha, ndị na-aga agha, dị puku iri anọ (40,000).

37 Ndị nke si n’ofe nke ọzọ nke Osimiri Jọdan,+ ya bụ, ndị Ruben, ndị Gad, na ndị si n’ọkara ebo Manase, dị otu narị puku ndị agha na puku iri abụọ (120,000). Ha na-ebu ụdị ngwá agha niile. 38 Ndị a niile bụ ndị agha. Ha niile na-eso aga agha. Ha jikwa obi ha niile bịa Hebrọn ka ha chie Devid eze Izrel niile. Ndị ọzọ niile n’Izrel jikwa otu obi chọọ ka e chie Devid eze.+ 39 Ha nọnyekwaara Devid ụbọchị atọ, na-eri, na-aṅụkwa ihe ụmụnne ha bupụtaara ha. 40 Ma ndị bi ha nso ma ndị Ịsaka, ndị Zebulọn, na ndị Naftalaị, ndị si ebe dị anya, ji obere jakị, kamel, nnukwu jakị,* na ehi na-ebute ihe oriri ndị e ji ntụ ọka mee, keeki e ji naanị mkpụrụ fig mee, keeki mkpụrụ vaịn kpọrọ nkụ, mmanya, na mmanụ. Ha kpụtakwara ọtụtụ ehi na atụrụ. Ha wetara ihe ndị a niile n’ihi aṅụrị a na-enwe n’Izrel.

13 Devid na ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha nakwa onye ọ bụla bụ́ onye ndú nwere nnọkọ.+ 2 Devid wee gwa ndị Izrel niile zukọrọnụ, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, dịkwa Jehova bụ́ Chineke anyị mma, ka anyị zigara ụmụnne anyị fọdụrụ n’Izrel niile ozi, ha na ndị nchụàjà na ndị Livaị nọ n’obodo ha dị iche iche+ nakwa ndị nke nọ n’ala ebe anụmanụ ha na-ata ahịhịa, ka ha bịakwute anyị. 3 Ka anyị gaakwa bute Igbe+ Chineke anyị.” Devid chọrọ ka e bute ya maka na ndị Izrel leghaara ya anya n’oge Sọl na-achị.+ 4 Ha niile nabatara ihe a o kwuru, n’ihi na ọ dị ha mma. 5 Devid wee kpọkọta ndị Izrel niile, malite n’osimiri Ijipt* ruo Libo-hemat,*+ ka ha gaa Kiriat-jierim+ bute Igbe ezi Chineke.

6 Devid na ndị Izrel niile gawaziri Beala,+ si ya ruo Kiriat-jierim, nke dị na Juda, ka ha si ebe ahụ bute Igbe ezi Chineke, onye nọ n’ocheeze dị n’elu* ndị cherob.+ Ndị mmadụ na-aga ebe Igbe ahụ dị na-akpọ aha Jehova. 7 Ma, ha gara n’ụlọ Abinadab jiri ụgbọala ọhụrụ+ anụmanụ na-adọkpụ buru Igbe ezi Chineke. Ọza na Ahayo nọkwa na-edu ụgbọala ahụ.+ 8 Devid na ndị Izrel niile jikwa obi ha niile na-aṅụrị ọṅụ, na-abụkwa abụ n’ihu ezi Chineke. Ha ji ma une ma ụbọ akwara ma obere ịgbà+ ma ájà+ ma opi+ ma ngwá egwú ndị ọzọ, na-eti egwú. 9 Ma, mgbe ha ruru ebe a na-akpọ Kaịdọn, bụ́ ebe a na-azọcha ọka, Ọza matịrị aka jide Igbe ahụ, n’ihi na ọ fọrọ obere ka ehi ndị kpụ ụgbọala ahụ kwatuo Igbe ahụ. 10 Jehova wee wesa Ọza ezigbo iwe, gbuokwa ya ebe ahụ n’ihi na ọ matịrị aka jide Igbe ahụ.+ Ọ nwụkwara ebe ahụ n’ihu Chineke.+ 11 Ma iwe were Devid maka na Jehova wesara Ọza ezigbo iwe. A na-akpọkwa ebe ahụ Pirez-ọza* ruo taa.

12 Ihe a mere ka Devid tụọ ezi Chineke egwu n’ụbọchị ahụ, ya asị: “Olee otú m ga-esi bute Igbe ezi Chineke n’ụlọ m?”+ 13 Devid hapụziri ibute Igbe ahụ n’ụlọ ya dị n’Obodo Devid. Kama ibute ya ebe ahụ, o kwuru ka e buga ya n’ụlọ Obed-ịdọm onye Gat. 14 Igbe ezi Chineke wee dịrị n’ụlọ Obed-ịdọm ruo ọnwa atọ. Jehova nọkwa na-agọzi ezinụlọ Obed-ịdọm na ihe niile o nwere.+

14 Haịram+ eze Taya ziri ndị ozi ka ha gakwuru Devid, ka ha hazie otú a ga-esi bute osisi sida, o zigakwara ndị na-eji nkume arụ mgbidi na ndị ọkwá nkà ka ha rụọrọ Devid ụlọ.*+ 2 Ihe a mere ka o doo Devid anya na Jehova emeela ka ọchịchị ya sie ezigbo ike n’Izrel,+ n’ihi na o jirila maka ndị ya bụ́ Izrel mee ka alaeze ya na-aga nke ọma.+

3 Devid lụkwuru ụmụ nwaanyị+ na Jeruselem, mụtakwuokwa ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.+ 4 Aha ụmụ a mụụrụ ya na Jeruselem bụ:+ Shamua, Shobab, Netan,+ Solomọn,+ 5 Ịbha, Elaịshua, Elpelet, 6 Noga, Nifeg, Jefaya, 7 Elishama, Beelayada, na Elifelet.

8 Mgbe ndị Filistia nụrụ na e teela Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze Izrel niile,+ ha niile pụtara na-achọ Devid.+ Mgbe Devid nụrụ ya, ọ gara ka ọ lụso ha agha. 9 Ma, ndị Filistia bịara na-alụso ndị bi na Ndagwurugwu Refeyim agha.+ 10 Devid wee jụọ Chineke, sị: “Ọ̀ bụ m gaa lụso ndị Filistia agha? Ị̀ ga-enyefe ha n’aka m?” Jehova asị ya: “Gawa, m ga-enyeferịrị ha n’aka gị.”+ 11 Devid wee gaa Bel-perezim,+ gbuo ha ebe ahụ. Mgbe o gbuchara ha, ya asị: “Ezi Chineke esila n’aka m kwada ndị iro m ka ebe mmiri kwadara mgbidi.” Ọ bụ ya mere ha ji kpọọ ebe ahụ Bel-perezim.* 12 Ndị Filistia hapụrụ chi ha dị iche iche ebe ahụ, Devid ekwuo ka a gbaa chi ndị ahụ ọkụ, a gbaa ha ọkụ.+

13 Mgbe e mechara, ndị Filistia bịara ọzọ lụso ndị bi na ndagwurugwu ahụ agha.+ 14 Devid wee jụọ Chineke ọzọ ma ọ̀ bụ ya gakwuru ha. Ma, ezi Chineke sịrị ya: “Agakwurula ha ihu na ihu. Kama, gaa nkọnkọ nkọnkọ ruo n’azụ ha, lụsokwa ha agha n’ihu ebe ahụ osisi beka juru.+ 15 Ị nụ ihe na-ada ka ụda ụkwụ ndị mmadụ n’elu osisi beka ndị ahụ, gaa lụso ha agha, n’ihi na ọ pụtara na ezi Chineke eburularị gị ụzọ pụta igbu ndị agha ndị Filistia.”+ 16 Devid mere nnọọ ihe ezi Chineke gwara ya mee.+ Ha gbukwara ndị agha ndị Filistia malite na Gibiọn ruo Giza.+ 17 Aha Devid dewekwara ude n’ala niile. Jehova mekwara ka mba niile na-atụ Devid ụjọ.+

15 Devid nọkwa na-arụgasịrị onwe ya ụlọ n’Obodo Devid. Ọ rụkwara ebe a ga-adọsa Igbe ezi Chineke, maakwa ụlọikwuu maka ya.+ 2 Devid wee sị: “O nweghị onye ọzọ ga-ebu Igbe ezi Chineke ma e wezụga ndị Livaị, n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị Jehova họọrọ ka ha na-ebu Igbe Jehova ma na-ejere ya ozi mgbe niile.”+ 3 Devid kpọkọtakwara ndị Izrel niile na Jeruselem ka ha bute Igbe Jehova ebe ọ rụrụ maka ya.+

4 Ụmụ Erọn+ na ndị Livaị+ Devid kpọkọtara bụ: 5 N’ụmụ Kohat, ọ kpọrọ Yurayel bụ́ onyeisi na ụmụnne ya dị otu narị na iri abụọ (120). 6 N’ụmụ Meraraị, ọ kpọrọ Asaya+ bụ́ onyeisi na ụmụnne ya dị narị abụọ na iri abụọ (220). 7 N’ụmụ Geshọm, ọ kpọrọ Joel+ bụ́ onyeisi na ụmụnne ya dị otu narị na iri atọ (130). 8 N’ụmụ Elizefan,+ ọ kpọrọ Shemaya bụ́ onyeisi na ụmụnne ya dị narị abụọ (200). 9 N’ụmụ Hebrọn, ọ kpọrọ Iliel bụ́ onyeisi na ụmụnne ya iri asatọ. 10 N’ụmụ Ọziel,+ ọ kpọrọ Aminadab bụ́ onyeisi na ụmụnne ya dị otu narị na iri na abụọ (112). 11 Devid kpọkwara Zedọk+ na Abayata+ bụ́ ndị nchụàjà, nakwa Yurayel, Asaya, Joel, Shemaya, Iliel, na Aminadab, bụ́ ndị Livaị. 12 Ọ gwakwara ha, sị: “Unu bụ ndị isi ezinụlọ ndị Livaị. Unu na ụmụnne unu doo onwe unu nsọ. Butekwanụ Igbe Jehova bụ́ Chineke Izrel ebe m rụrụ maka ya. 13 N’oge mbụ, ọ bụghị unu butere Igbe ahụ,+ Jehova bụ́ Chineke anyị ejiri maka ya wesa anyị iwe,+ n’ihi na anyị emeghị ihe otú ọ gwara anyị ka anyị si mee ya.”+ 14 N’ihi ya, ndị nchụàjà na ndị Livaị doro onwe ha nsọ maka ịga bute Igbe Jehova bụ́ Chineke Izrel.

15 Ndị Livaị wee jiri okporo osisi+ buru Igbe ezi Chineke n’ubu ha, otú Jehova gwara Mosis ka ha na-eme. 16 Devid gwakwara ndị isi ndị Livaị ka ha họpụta ụmụnne ha ndị na-abụ abụ ka ha jiri ọṅụ na-abụ abụ mgbe ngwá egwú ndị a ga na-ada: ụbọ akwara,+ une, na ájà.+

17 Ndị Livaị si n’ebo ha họpụta Himan+ nwa Joel na Esaf+ nwa Berekaya. Ha họpụtakwara Itan+ nwa Kọsheya, onye si n’ezinụlọ Meraraị. 18 E nwekwara ụmụnne ha ndị nọ n’ìgwè nke abụọ.+ Ha bụ: Zekaraya, Ben, Jaeziel, Shemiramọt, Jehayel, Ọnaị, Elayab, Benaya, Measaya, Matitaya, Elifelehu, Mikniya, nakwa Obed-ịdọm na Jeayel bụ́ ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá. 19 A bịa ná ndị na-abụ abụ, Himan,+ Esaf,+ na Itan ga na-akụ ájà+ e ji ọla kọpa rụọ. 20 Zekaraya, Eziel, Shemiramọt, Jehayel, Ọnaị, Elayab, Measaya, na Benaya ga na-akpọ ụbọ akwara n’ụda Alamọt,*+ 21 Matitaya,+ Elifelehu, Mikniya, Obed-ịdọm, Jeayel, na Azazaya ga na-edu ndị na-akpọ ụbọ akwara n’ụda Sheminit.*+ 22 Kenanaya,+ bụ́ onyeisi ndị Livaị, hụrụ maka ibulata Igbe ahụ, n’ihi na ọ bụ aka ochie n’ụdị ihe a. 23 Berekaya na Elkena na-eche Igbe ahụ nche. 24 Shebanaya, Joshafat, Netanel, Amesaị, Zekaraya, Benaya, na Eliiza bụ́ ndị nchụàjà nọkwa na-aga n’ihu ndị bu Igbe ezi Chineke+ na-afụsi opi ike. Obed-ịdọm na Jehaya sokwa ná ndị na-eche Igbe ahụ nche.

25 Devid na ndị okenye Izrel na ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha nọkwa na-aṅụrị ọṅụ+ ka ha na-aga n’ụlọ Obed-ịdọm+ ka ha bupụta igbe ọgbụgba ndụ Jehova. 26 Ha chụrụ oké ehi asaa na ebule asaa n’àjà maka na ezi Chineke nyeere ndị Livaị aka ka ha bu igbe ọgbụgba ndụ Jehova na-alọta.+ 27 Devid yi uwe elu na-enweghị aka nke e ji ezigbo ákwà kwaa. Ndị ọzọ yi ụdị uwe ahụ bụ ndị Livaị niile bu Igbe ahụ, ndị na-abụ abụ, na Kenanaya bụ́ onyeisi ndị na-abụ abụ, onye hụkwara maka ibute Igbe ahụ. Devid yikwa efọd e ji ákwà linin kwaa.+ 28 Ka ndị Izrel niile bu igbe ọgbụgba ndụ Jehova na-alọta, ha nọ na-eti mkpu, na-aṅụrị ọṅụ,+ na-afụ opi dị iche iche,+ na-akụ ájà, na-akpọsikwa ụbọ akwara na une ike.+

29 Ma, mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ Jehova n’Obodo Devid,+ Maịkal+ nwa Sọl si na windo lepụ anya hụ Eze Devid ka ọ na-awụli elu na-enwe aṅụrị, ya ebido ileda ya anya n’obi ya.+

16 Otú ahụ ka ha si bubata Igbe ezi Chineke ma dọsa ya n’ụlọikwuu ahụ Devid mara maka ya.+ Ha chụkwaara ezi Chineke àjà a na-esu ọkụ na àjà udo.+ 2 Mgbe Devid chụchara àjà a na-esu ọkụ+ na àjà udo,+ ọ gọziri ndị Izrel n’aha Jehova. 3 O nyekwara onye Izrel ọ bụla, ma nwoke ma nwaanyị, otu achịcha, otu keeki mkpụrụ osisi det, na otu keeki mkpụrụ vaịn kpọrọ nkụ. 4 Ọ họpụtakwara ụfọdụ ndị Livaị ka ha na-eje ozi ebe ahụ a dọsara Igbe Jehova+ nakwa ka ha na-asọpụrụ* Jehova bụ́ Chineke Izrel, na-ekele ya ma na-eto ya. 5 Esaf+ bụ onyeisi ha. Zekaraya na-esote ya. Jeayel, Shemiramọt, Jehayel, Matitaya, Elayab, Benaya, Obed-ịdọm, na Jeayel+ na-akpọ ụbọ akwara na une.+ Esaf na-akụ ájà.+ 6 Benaya na Jahazayel bụ́ ndị nchụàjà na-afụkwa opi mgbe niile n’ihu igbe ọgbụgba ndụ ezi Chineke.

7 Ụbọchị ahụ bụ nke mbụ Devid rọrọ abụ e ji ekele Jehova. Ọ gwakwara Esaf+ na ụmụnne ya ka ha bụọ ya. Abụ ahụ bụ:

8 “Keleenụ Jehova.+ Kpọkuonụ aha ya.

Kọọrọnụ mba dị iche iche ihe ndị ọ na-eme.+

9 Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto.+

Chebaranụ ọrụ niile dị ebube ọ na-arụ echiche.*+

10 Jirinụ aha nsọ ya na-eme ọnụ.+

Ka obi ndị na-achọ Jehova ṅụrịa ọṅụ.+

11 Chọọnụ Jehova,+ rịọkwanụ ya ka o nye unu ike.

Na-arịọnụ ya mgbe niile ka o meere unu amara.+

12 Chetanụ ihe ndị dị ebube o mere,+

Ọrụ ebube ndị ọ rụrụ nakwa ikpe ndị o kpere,

13 Unu ụmụ* Izrel bụ́ ndị ohu ya,+

Unu ụmụ Jekọb, bụ́ ndị ọ họọrọ.+

14 Ọ bụ ya bụ Jehova Chineke anyị.+

Ọ na-ekpe ụwa niile ikpe.+

15 Na-echetanụ ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

Na-echetanụ nkwa o kwere* ruo otu puku ọgbọ.+

16 Ọ bụ ya na Ebreham gbara ndụ ahụ.+

Ọ ṅụkwaara Aịzik iyi.+

17 Ọ ṅụrụ iyi ahụ iji mee ka obi sie Jekọb ike+

Nakwa ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ga-adịte aka ya na Izrel gbara.

18 Ọ sịrị, ‘M ga-enye unu ala Kenan+

Ka ọ bụrụ ihe unu ketara.’+

19 Ha dị ole na ole mgbe ahụ.

N’eziokwu, ha ehighị nne, ha bụkwa ndị mbịarambịa.+

20 Ha nọ na-aga si n’otu mba ruo mba ọzọ,

Sikwa n’otu alaeze ruo alaeze ọzọ.+

21 O kweghị ka onye ọ bụla megbuo ha,+

Kama ọ baara ndị eze mba n’ihi ha.+

22 Ọ sịrị, ‘Unu akpala ndị m tere mmanụ aka.

Unu emekwala ndị amụma m ihe ọjọọ ọ bụla.’+

23 Ndị niile bi n’ụwa, bụkuonụ Jehova abụ.

Kwa ụbọchị, na-akọnụ otú o si azọpụta ndị mmadụ.+

24 Kọọrọnụ mba dị iche iche na ọ dị ebube.

Kọọkwaranụ mmadụ niile ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụ.

25 N’ihi na Jehova bụ onye ukwu, onye ọ bụla kwesịkwara ịna-eto ya.

E kwesịrị ịna-atụ egwu ya karịa chi ọ bụla ọzọ.+

26 Chi ọzọ niile ndị mmadụ na-efe abaghị uru.+

Ma, ọ bụ Jehova kere eluigwe.+

27 Ebube na ịma mma gbara ya gburugburu.+

Ike na ọṅụ dịkwa n’ebe o bi.+

28 Ezinụlọ dị iche iche, toonụ Jehova.

Toonụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa ike.+

29 Toonụ aha Jehova dị ebube.+

Jirinụ onyinye bịa ebe ọ nọ.+

Yirinụ ọmarịcha uwe dị nsọ kpọọrọ Jehova isiala.*+

30 Ndị niile bi n’ụwa, maanụ jijiji n’ihu ya.

E kesiri ụwa* ike. A gaghị ebupụli ya ebupụ.*+

31 Ka eluigwe ṅụrịa ọṅụ, ka ụwa nweekwa aṅụrị.+

Kọsaanụ ná mba dị iche iche, sị: ‘Jehova abụrụla Eze.’+

32 Ka oké osimiri na ihe niile dị n’ime ya mee mkpọtụ.

Ka ọhịa na ihe niile dị n’ime ya ṅụrịa ọṅụ.

33 Ka osisi ndị dị n’oké ọhịa tiekwa mkpu ọṅụ n’ihi Jehova,

N’ihi na ọ na-abịa* ikpe ụwa ikpe.

34 Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+

Ịhụnanya ya* na-adịru mgbe ebighị ebi.+

35 Sịkwanụ, ‘Chineke, onye nzọpụta anyị, biko, zọpụta anyị,+

Sikwa ná mba dị iche iche kpọkọta anyị ma napụta anyị n’aka ha,

Ka anyị wee too aha nsọ gị,+

Jirikwa ọṅụ na-eto gị.+

36 Ka a na-eto Jehova bụ́ Chineke Izrel

Ruo mgbe ebighị ebi.’”*

Mmadụ niile sịkwara, “Amen!”* Ha tokwara Jehova.

37 Devid hapụziri Esaf+ na ndị Livaị ndị ọzọ ka ha na-eje ozi mgbe niile n’ebe ahụ a dọsara igbe ọgbụgba ndụ Jehova.+ Ha na-ejekwa ozi ọ bụla e kwesịrị ije kwa ụbọchị.+ 38 Ọ hapụkwara Obed-ịdọm na ụmụnne ya iri isii na asatọ, nakwa Obed-ịdọm nwa Jedutọn, na Hosa ka ha na-eche ọnụ ụzọ ámá nche. 39 Ọ hapụkwara Zedọk+ bụ́ onye nchụàjà na ndị nchụàjà ibe ya ka ha nọrọ n’ụlọikwuu Jehova dị n’ebe dị elu na Gibiọn+ 40 na-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ n’ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ, ma n’ụtụtụ ma ná mgbede. Ha na-emekwa ihe niile e dere n’Iwu Jehova otú ọ gwara ndị Izrel ka ha na-eme.+ 41 Ndị ọzọ so ha bụ Himan, Jedutọn,+ na ndị ọzọ a họọrọ ka ha na-ekele Jehova,+ n’ihi na “ịhụnanya ya* na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ 42 Himan+ na Jedutọn so ha ka ha nwee ike ịna-afụ opi, na-akụkwa ájà na ihe ndị ọzọ e ji eto ezi Chineke. Ọ bụkwa ụmụ Jedutọn+ na-eche ọnụ ụzọ ámá nche. 43 Mgbe ha mechara, onye ọ bụla lara n’ụlọ ya. Devid lakwara ka ọ gọzie ndị ezinụlọ ya.

17 Ozugbo Devid kwabachara n’ụlọ* ya, ọ gwara Netan+ onye amụma, sị: “Ugbu a, ebi m n’ụlọ e ji osisi sida+ rụọ, ma, a ka na-adọsa igbe ọgbụgba ndụ Jehova n’ụlọikwuu.”+ 2 Netan asị ya: “Mee ihe ọ bụla dị gị n’obi ime, n’ihi na ezi Chineke nọnyeere gị.”

3 Ma n’abalị ụbọchị ahụ, Chineke gwara Netan, sị: 4 “Gaa gwa Devid ohu m, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Ọ bụghị gị ga-arụrụ m ụlọ m ga-ebi.+ 5 Ebitụbeghị m n’ụlọ malite n’ụbọchị m si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel ruokwa taa. Kama, m na-esi n’otu ụlọ ndò aga n’ụlọ ndò ọzọ, na-esikwa n’otu ụlọikwuu aga n’ụlọikwuu ọzọ.+ 6 M so ndị Izrel na-agagharị kemgbe. Ọ bụ m na-ahọpụtara Izrel ndị m ndị ikpe ka ha na-azụ ha ka atụrụ. È nwetụla mgbe ị nụrụ na m gwara otu n’ime ha ka o jiri osisi sida rụọrọ m ụlọ?”’

7 “Gwakwa Devid ohu m, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “Ị nọ na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ ka ha na-ata ahịhịa, mụ abịa kpọrọ gị ka ị bụrụ onye ndú ndị m Izrel.+ 8 M ga-anọnyere gị ebe ọ bụla ị na-aga.+ M ga-egbu ndị iro gị niile.+ M ga-emekwa ka aha gị na-ede ude ka aha ndị ukwu bi n’ụwa.+ 9 M ga-enye Izrel ndị m otu ebe, ha ga-ebikwa ebe ahụ. A gaghị enwe onye ga-enye ha nsogbu. Ndị ọjọọ agaghịkwa emekpa ha ahụ́ ọzọ otú ha mere na mbụ,+ 10 malite n’oge m na-ahọpụta ndị ikpe ka ha bụrụ ndị isi Izrel ndị m.+ M ga-emekwa ka i merie ndị iro gị niile.+ M na-asịkwa gị, ‘Jehova ga-arụrụ gị ụlọ.’*

11 “‘“Mgbe ị nwụrụ, e liekwa gị otú e liri nna nna gị hà, m ga-echi otu n’ime ụmụ* gị, onye ị mụtara, eze, ka ọ nọchie gị.+ M ga-emekwa ka alaeze ya sie ezigbo ike.+ 12 Ọ bụ ya ga-arụrụ m ụlọ.+ M ga-emekwa ka ocheeze ya sie ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi.+ 13 M ga-abụ nna ya, yanwa ga-abụkwa nwa m.+ Agaghị m akwụsị ịhụ ya n’anya+ otú m kwụsịrị ịhụ onye ị nọchiri.+ 14 M ga-eme ka ọ nọrọ n’ocheeze m ruo mgbe ebighị ebi.+ Ọ ga na-achịkwa n’alaeze ya ruo mgbe ebighị ebi.”’”+

15 Netan gwara Devid ihe a niile a gwara ya n’ọhụụ.

16 Eze Devid wee nọdụ ala n’ihu Jehova, sị: “Jehova Chineke, ònye ka m bụ? Gịnịkwa ka ezinụlọ m bụ mere i ji meere m ihe a niile?+ 17 Chineke, a ka na-ekwu ihe a niile i meere m, gị ana-agwakwa m ugbu a na ezinụlọ ohu gị ga-adịte aka.+ Jehova Chineke, ị na-elekwa m anya ka onye ukwu. 18 Olee ihe ọzọ mụnwa bụ́ ohu gị Devid ga-agwa gị gbasara ùgwù niile ị kwanyeere m maka na ị ma ohu gị nke ọma?+ 19 Jehova, i mere ihe a niile dị egwu, nke gosiri na ị bụ onye ukwu, n’ihi ohu gị nakwa n’ihi na ọ bụ ihe ị chọrọ ime.+ 20 Jehova, o nweghị onye dị ka gị.+ Ọ bụ eziokwu na anyị anụla gbasara ọtụtụ chi ndị ọzọ, naanị gị bụ Chineke.+ 21 Oleekwa mba dị n’ụwa nke dị ka ndị gị Izrel?+ Ezi Chineke, ị gara gbapụta ha ka ha bụrụ ndị gị.+ I mere oké ihe na ihe ndị dị egwu iji mee ka aha gị na-ede ude.+ Ị chụpụrụ mba dị iche iche n’ihi ndị gị+ i si n’Ijipt gbapụta. 22 I meela ka ndị Izrel bụrụ ndị gị ruo mgbe ebighị ebi.+ Jehova, ị bụrụkwala Chineke ha.+ 23 Ugbu a, Jehova, ka nkwa i kwere gbasara mụnwa bụ́ ohu gị nakwa gbasara ezinụlọ m ghara ịgbanwe ruo mgbe ebighị ebi. Biko, meekwa ihe i kwere ná nkwa.+ 24 Ka aha gị dịruo mgbe ebighị ebi. Ka a na-etokwa aha gị+ ruo mgbe ebighị ebi. Ka ndị mmadụ, sị: ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha, Chineke Izrel, ị bụ Chineke ndị Izrel n’eziokwu.’ Ka ezinụlọ Devid ohu gị siekwa ezigbo ike n’anya gị.+ 25 N’ihi na gịnwa, bụ́ Chineke m, agwala ohu gị na i zubere ịrụrụ ya ụlọ.* Ọ bụ ya mere obi ji sie ohu gị ike ịgwa gị ihe ndị a n’ekpere. 26 Ugbu a, Jehova, ọ bụ gị bụ ezi Chineke. I kwekwala ohu gị nkwa imere ya ihe ọma ndị a. 27 Biko, gọzie ezinụlọ ohu gị ka ọ dịgide ruo mgbe ebighị ebi. Jehova, ị gọziela ezinụlọ ohu gị. Ọ ga-abụkwa ezinụlọ a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”

18 Ka oge na-aga, Devid lụsoro ndị Filistia agha ma merie ha. Ọ nakwaara ha+ Gat+ na ime obodo ndị dị ya nso.* 2 O merikwara ndị Moab,+ ha aghọọ ndị ohu ya, na-atụkwara ya ụtụ.+

3 Ka Hadadiza+ eze Zoba+ nọ na-aga ka o nwetaghachi Osimiri Yufretis,+ Devid nọ ebe dị nso na Hemat+ lụso ya agha, meriekwa ya. 4 Devid jidekwara otu puku (1,000) ụgbọ ịnyịnya Hadadiza, na puku ndị agha ya asaa (7,000) na-agba ịnyịnya nakwa puku ndị agha ya iri abụọ (20,000) ji ụkwụ aga.+ O sekwara ịnyịnya niile na-adọkpụ ụgbọala ha akwara ma e wezụga otu narị (100) n’ime ha ọ hapụrụ.+ 5 Mgbe ndị Siria nọ na Damaskọs bịara inyere Hadadiza eze Zoba aka, Devid gburu puku mmadụ iri abụọ na puku abụọ (22,000) n’ime ha.+ 6 Devid dowekwara ndị agha na-eche nche na Siria, nke Damaskọs bụ isi obodo ya. Ndị Siria ghọkwara ndị ohu Devid, na-atụkwara ya ụtụ. Jehova mekwara ka Devid na-emeri n’agha ọ bụla ọ gara.+ 7 Devid bukọkwaara ọta ndị na-ejere Hadadiza ozi, bute ha Jeruselem. Ọta ndị ahụ dị okirikiri, e jikwa ọlaedo mee ha. 8 Devid gakwara Tibhat na Kọn, bụ́ obodo ndị Hadadiza na-achị, buru ọtụtụ ọla kọpa. Ọ bụ ọla kọpa ndị ahụ ka Solomọn ji rụọ otu nnukwu ite mmiri e ji ọla kọpa rụọ a na-akpọ Oké Osimiri.+ O jikwa ha rụọ ogidi nakwa arịa ndị e ji ọla kọpa mee.+

9 Mgbe Tou* eze Hemat nụrụ na Devid emeriela ndị agha niile na-alụrụ Hadadiza+ eze Zoba+ agha, 10 o ziri Hedoram* nwa ya ozugbo ka ọ gakwuru Eze Devid kelee ya, jaakwa ya ike maka na ọ lụsoro Hadadiza agha, meriekwa ya, (n’ihi na Hadadiza na-agakarị alụso Tou agha). Hedoram wetakwaara Devid ụdị ihe niile e ji ọlaedo, ọlaọcha, na ọla kọpa mee. 11 Eze Devid nyefere Jehova ihe ndị a,+ ma ọlaọcha ma ọlaedo ndị ọ natara mba niile o meriri, ya bụ, ndị Ịdọm, ndị Moab, ndị Amọn,+ ndị Filistia,+ na ndị Amalek.+

12 Abishaị+ nwa Zeruya+ gburu puku ndị Ịdọm iri na asatọ (18,000) na Ndagwurugwu Nnu.+ 13 O dowekwara ndị agha na-eche nche n’Ịdọm. Ndị Ịdọm niile ghọkwara ndị ohu Devid.+ Jehova mekwara ka Devid na-emeri n’agha ọ bụla ọ gara.+ 14 Devid nọkwa na-achị Izrel niile,+ na-ekpere ndị ya niile ikpe ziri ezi, na-emekwara ha ihe ọma.+ 15 Joab nwa Zeruya bụ onyeisi ndị agha.+ Jehoshafat+ nwa Ahaịlọd bụ onye na-edekọ ihe. 16 Zedọk nwa Ahaịtọb na Ahimelek nwa Abayata bụ ndị nchụàjà. Shavsha bụ odeakwụkwọ. 17 Benaya nwa Jehoyada bụ onyeisi ndị Keretaịt+ na ndị Peletaịt.+ Ụmụ Devid ndị nwoke bụkwa ndị isi na-esote eze.

19 Ka oge na-aga, Nehash eze ndị Amọn nwụrụ, nwa ya anọchie ya, malite ịchị.+ 2 Devid wee sị: “M ga-egosi Henọn nwa Nehash na m hụrụ ya n’anya+ n’ihi na nna ya gosiri m na ọ hụrụ m n’anya.” N’ihi ya, Devid ziri ndị na-ejere ya ozi ka ha gaa kasie ya obi maka nna ya nwụrụnụ. Ma, mgbe ndị na-ejere Devid ozi batara n’ala ndị Amọn+ ka ha kasie Henọn obi, 3 ndị isi ndị Amọn gwara Henọn, sị: “Ì chere na ihe mere Devid ji zite ndị ga-akasi gị obi bụ maka na ọ na-akwanyere nna gị ùgwù? Ihe mere o ji zite ha ọ́ bụghị ka ha nyopụta otú ala a dị ma weghara ya?” 4 N’ihi ya, Henọn kpọọrọ ndị na-ejere Devid ozi kpụọ afụ ọnụ ha,+ chawaakwa uwe mwụda ha ruo n’ikè, hapụzie ha ka ha lawa. 5 Mgbe a kọọrọ Devid ihe e mere ndị ahụ o ziri ozi, o ziri ndị mmadụ ozugbo ka ha gaa hụ ha, n’ihi na e menyere ha ezigbo ihere. Eze gwakwara ha, sị: “Nọrọnụ na Jeriko,+ afụ ọnụ unu rujuo, unu alọta.”

6 Ka oge na-aga, ndị Amọn hụrụ na ihe ha adịghịzi Devid mma. N’ihi ya, Henọn na ndị Amọn ji otu puku (1,000) talent* ọlaọcha gaa gbazite ụgbọ ịnyịnya, gookwa ndị na-agba ịnyịnya n’aka ndị Mesopotemia,* ndị Eram-meaka, na ndị Zoba.+ 7 Ha gbazitere puku ụgbọ ịnyịnya iri atọ na puku abụọ (32,000), gookwa eze ndị Meaka na ndị ya. Ha bịakwara maa ụlọikwuu n’ebe chere Medeba ihu.+ Ndị Amọn sikwa n’obodo ha dị iche iche zukọta ịlụ agha.

8 Mgbe Devid nụrụ ya, ọ gwara Joab+ na ndị agha ya niile, ma ndị nke kacha bụrụ dike n’agha,+ ka ha gaa agha. 9 Ndị Amọn pụtakwara n’ọnụ ụzọ ámá obodo ha, hazie onwe ha n’usoro ka ha lụọ agha. Ma ndị eze ahụ ha goro ego gara nọrọ n’ọhịa osisi na-adịghị, haziekwa onwe ha.

10 Mgbe Joab hụrụ na e si ihu na azụ na-abịa ịlụso ya agha, ọ họọrọ ụfọdụ n’ime ndị Izrel bụ́ ọkà n’ịlụ agha, hazie ha n’usoro ịga lụso ndị Siria agha.+ 11 Ọ hapụkwaara Abishaị nwanne ya+ ndị fọrọnụ, ka ọ hazie ha n’usoro ịga lụso ndị Amọn agha. 12 Ọ gwakwara Abishaị, sị: “Ndị Siria+ karịa m ike, gị abịa nyere m aka. Ma ndị Amọn karịa gị ike, mụ abịa nyere gị aka. 13 Ka anyị jisie ike, katakwa obi+ n’ihi ndị ala anyị nakwa n’ihi obodo niile nke Chineke anyị. Jehova ga-emekwa uche ya.”

14 Joab na ndị ya na ha so gaziri lụso ndị Siria agha, merie ha, ha agbaa ọsọ.+ 15 Mgbe ndị Amọn hụrụ na ndị Siria agbaala ọsọ, hanwa gbakwara ọsọ n’ihi Abishaị nwanne Joab, laghachi n’obodo ha. Mgbe agha ahụ biri, Joab lọtara Jeruselem.

16 Mgbe ndị Siria hụrụ na ndị Izrel emeriela ha, ha ziri ụfọdụ ndị ka ha gaa gwa ndị Siria nọ ná mpaghara Osimiri Yufretis+ ka ha bịa. Shofak,* bụ́ onyeisi ndị agha Hadadiza, dukwa ha gaa.+

17 Mgbe a kọọrọ ya Devid, ọ kpọkọtara ndị Izrel niile ozugbo, ha esi n’Osimiri Jọdan gafee chọrọ ndị Siria gaa ma hazie onwe ha n’usoro ịlụso ha agha. Mgbe Devid pụtara ịlụso ha agha, ha malitere ịlụso ya agha.+ 18 Ma ndị Izrel meriri ndị Siria, ha agbaa ọsọ. Devid gbukwara puku ndị Siria asaa (7,000) na-agba ụgbọ ịnyịnya na puku mmadụ iri anọ (40,000) ndị nke ji ụkwụ aga. O gbukwara Shofak onyeisi ndị agha ha. 19 Mgbe ndị na-ejere Hadadiza ozi hụrụ na ndị Izrel emeriela ha,+ ha gakwuuru Devid, ya na ha emee udo, ha aghọọ ndị ohu ya.+ Ndị Siria agaghịkwa nyere ndị Amọn aka ọzọ.

20 Ná mmalite afọ, n’oge ndị eze na-eji aga agha, Joab+ duuru ndị agha ya gaa bibie ala ndị Amọn. Ọ gakwara nọchibido Raba,+ ma Devid nọ na Jeruselem.+ Joab mechakwara bibie Raba.+ 2 Devid kpupụrụ okpueze dị n’isi Malkam,* chọpụtakwa na e ji ọlaedo na nkume dị oké ọnụ* kpụọ okpueze ahụ, nakwa na ọlaedo e ji kpụọ ya dị otu talent* n’arọ. E kpunyekwara Devid okpueze ahụ n’isi. Ihe ndị ọ kwatara n’obodo ahụ karịkwara akarị.+ 3 Devid kpụkwaara ndị bi n’obodo ahụ, gwa ha ka ha na-awa nkume nakwa ka ha jiri ngwá ọrụ ndị na-aghọ nkọ e ji ígwè rụọ nakwa anyụike na-arụ ọrụ.+ Otú a ka o mekwara obodo ndị Amọn niile. N’ikpeazụ, Devid na ndị agha ya niile laghachiri Jeruselem.

4 Mgbe ihe a mechara, ndị Izrel na ndị Filistia lụrụ agha ọzọ na Giza. Ọ bụ mgbe ahụ ka Sibekaị+ onye Husha gburu Sipaị, bụ́ otu n’ime ụmụ ndị Refeyim.+ E merikwara ndị Filistia.

5 Ndị Izrel na ndị Filistia lụkwara agha ọzọ, Elhenan nwa Jeya egbuo Lamaị nwanne Golayat+ onye Gat. Okporo ube Lamaị dị ka okporo osisi nke ndị na-ekwe ákwà.+

6 Ha lụkwara agha ọzọ na Gat.+ N’ebe ahụ, e nwere otu nwoke gbara ajọ dimkpa,+ nke nwere mkpịsị aka isii n’aka ya nke ọ bụla, nweekwa mkpịsị ụkwụ isii n’ụkwụ ya nke ọ bụla. Ha niile dị iri abụọ na anọ. Ọ bụkwa otu n’ime ụmụ ndị Refeyim.+ 7 Ọ nọkwa na-echere ndị Izrel aka mgba.+ N’ihi ya, Jonatan nwa Shimia,+ bụ́ nwanne Devid, gburu ya.

8 Ndị a bụ ụmụ ndị Refeyim+ bi na Gat.+ Devid na ndị na-ejere ya ozi gbukwara ha.

21 N’otu oge, Setan* kpebiri imesi ndị Izrel ike. O mere ka Devid chọọ ịgụ ndị Izrel ọnụ.+ 2 Ọ bụ ya mere Devid ji gwa Joab+ na ndị isi ndị Izrel, sị: “Gaanụ gụọ ndị Izrel ọnụ, malite na Bia-shiba ruo Dan.+ Unu gụchaa, unu abịa gwa m, ka m mara ole ha dị.” 3 Ma Joab sịrị: “Ka Jehova mee ka ndị ya hikwuo nne otu narị (100) okpukpu. Onyenwe m eze, ọ̀ bụ na ha niile abụghị ndị na-ejere gịnwa bụ́ onyenwe m ozi? Olee ihe mere onyenwe m ji chọọ ime ihe a? Gịnị mere ị ga-eji mee ka ndị Izrel mehie?”

4 Ma, eze siri ọnwụ ka Joab mee ihe o kwuru. N’ihi ya, Joab pụrụ gaa ebe niile n’Izrel, mechaakwa lọghachi Jeruselem.+ 5 Joab wee gwa Devid mmadụ ole e debara aha ha n’akwụkwọ. Ndị Izrel niile, ndị ga-agali agha, dị otu nde na otu narị puku (1,100,000), ndị Juda adịrị narị puku anọ na puku iri asaa (470,000).+ 6 Ma e debaghị aha ndị ebo Livaị na Benjamin n’akwụkwọ,+ n’ihi na ihe a eze kwuru ka e mee adịghị Joab mma.+

7 Ihe a merenụ were ezi Chineke ezigbote iwe, ya ataa ndị Izrel ahụhụ. 8 Devid gwaziri ezi Chineke, sị: “Emeela m ezigbote mmehie.+ Ma ugbu a, biko, gbaghara ohu gị mmehie ya,+ n’ihi na ezuzuola m nnọọ nzuzu.”+ 9 Jehova gwaziri Gad,+ bụ́ onye na-ahụrụ Devid ọhụụ, sị: 10 “Gaa sị Devid, ‘Jehova kwuru, sị: “Họrọ nke m ga-eme gị n’ime ihe atọ a.”’” 11 Gad wee gakwuru Devid sị ya: “Jehova kwuru, sị, ‘Họrọ nke ị chọrọ n’ihe ndị a. 12 Ị̀ chọrọ ka ụnwụ daa afọ atọ?+ Ka ị̀ chọrọ ka ndị iro gị na-emeri gị n’agha, jirikwa mma agha na-egbu unu ruo ọnwa atọ?+ Ka ị̀ chọrọ ka e jiri mma agha Jehova taa unu ahụhụ, ya bụ, ka unu na-arịa ọrịa na-efe efe,+ mmụọ ozi Jehova ana-egbukwa ndị mmadụ+ n’ebe niile n’Izrel ruo ụbọchị atọ.’ Chebara ya echiche gwa m nke ị chọrọ ka m gaa gwa Chineke, onye ziri m ozi a.” 13 Devid asị Gad: “Ihe a na-agbawa m obi. Biko, ka m daba n’aka Jehova, n’ihi na ọ na-eme ebere nke ukwuu.+ Ma, ka m ghara ịdaba n’aka mmadụ.”+

14 Jehova wee mee ka e nwee ọrịa na-efe efe+ n’Izrel, puku mmadụ iri asaa (70,000) nwụkwara n’Izrel.+ 15 Ezi Chineke zigakwara otu mmụọ ozi ka o gbuchapụ ndị bi na Jeruselem. Ma, ozugbo Jehova hụrụ na mmụọ ozi ahụ ebidola igbu ha, o meteere ndị ya ebere.+ Ọ gwaziri mmụọ ozi ahụ chọrọ igbuchapụ ha, sị: “O zuola!+ Wetuo aka gị.” Mmụọ ozi Jehova nọ nso n’ebe Ọnan+ onye Jebus+ na-azọcha ọka.

16 Mgbe Devid leliri anya, ọ hụrụ mmụọ ozi Jehova n’elu ka o ji mma agha*+ matịa aka ka o gbuchapụ ndị bi na Jeruselem. Devid na ndị okenye gburu ikpere n’ala ozugbo, kpudo ihu n’ala.+ Ha yikwa ákwà iru uju.+ 17 Devid gwakwara ezi Chineke, sị: “Ọ bụ m kwuru ka a gụọ ndị mmadụ ọnụ. Ọ bụ m mehiere. Ọ bụkwa m mejọrọ ihe.+ Gịnị ka atụrụ ndị a mere? Jehova bụ́ Chineke m, biko, bịa gbuo mụ na ndị ezinụlọ nna m. Atazila ndị gị ahụhụ a ị na-ata ha.”+

18 Mmụọ ozi Jehova gwaziri Gad+ ka ọ gwa Devid ka ọ gaa rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà n’ebe Ọnan onye Jebus+ na-azọcha ọka. 19 Devid gawakwara ka o mee ihe Jehova si n’ọnụ Gad gwa ya. 20 Ka Ọnan nọ na-azọcha ọka wit, ọ tụgharịrị hụ mmụọ ozi ahụ. Ụmụ ya anọ, ndị ya na ha nọ, gakwara zoo. 21 Mgbe Devid ruru ebe Ọnan nọ, Ọnan lepụrụ anya hụ ya, si ebe ahụ ọ na-azọcha ọka pụta ozugbo gbuo ikpere n’ala, kpọọrọ Devid isiala. 22 Devid asị Ọnan: “Resị* m ebe a a na-azọcha ọka, ka m rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà na ya. Resị m ya, m ga-akwụzu gị ego ya, ka e wee kwụsị ịta ndị Izrel ahụhụ.”+ 23 Ma Ọnan sịrị Devid: “Onyenwe m eze, were ya mee ihe dị gị mma. Lee ehi ị ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ nakwa ihe e ji eticha ọka,+ nke ị ga-eji mere nkụ, nakwa ọka wit ị ga-eji chụọ àjà ọka. M na-enye gị ha niile.”

24 Ma, Eze Devid sịrị Ọnan: “Mba, m ga-azụrịrị ya azụ, kwụzuokwa gị ụgwọ ya, n’ihi na agaghị m ewere ihe gị nye Jehova ma ọ bụ chụọ àjà a na-esu ọkụ n’emefughị ihe ọ bụla.”+ 25 Devid kwụziri Ọnan ọlaedo dị narị shekel* isii (600) n’arọ maka ebe ahụ. 26 Devid wee rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà+ n’ebe ahụ, chụọkwa àjà a na-esu ọkụ na àjà udo. Ọ kpọkukwara Jehova, ya aza ya. Otú o si za ya bụ na ọkụ+ si n’eluigwe bịa rechapụ àjà ahụ a na-esu ọkụ nke dị n’elu ebe ịchụàjà ahụ. 27 Jehova gwaziri mmụọ ozi ahụ+ ka ọ mịghachi mma agha ya n’ọbọ. 28 Mgbe Devid hụrụ na Jehova zara ya n’ebe ahụ Ọnan onye Jebus na-azọcha ọka, ọ nọgidere na-aga achụ àjà ebe ahụ. 29 Ma n’oge ahụ, ụlọikwuu Jehova nke Mosis nọ n’ala ịkpa rụọ nakwa ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ dị n’ebe dị elu na Gibiọn.+ 30 Ma, Devid enwebeghị ike ịga ebe ahụ jụọ Chineke ase, maka na ụjọ mma agha ahụ mmụọ ozi Jehova ji na-atụ ya.

22 Devid wee sị: “Ebe a ka a ga-arụrụ Jehova bụ́ ezi Chineke ụlọ. Ọ ga-abụkwa ebe ịchụàjà ndị Izrel ga-anọ na-achụ àjà a na-esu ọkụ.”+

2 Devid kwukwara ka a kpọkọta ndị mbịarambịa+ bi n’Izrel. Mgbe a kpọkọtara ha, ya agwa ha ka ha na-awa nkume, na-awapụtakwa ndị nke ga-adị mma iji rụọrọ ezi Chineke ụlọ.+ 3 Devid kwakọtakwara ọtụtụ ígwè a ga-eji mere ntu a ga-eji kụọ ibo ọnụ ụzọ ámá dị iche iche nakwa ihe a ga-eji akpagide otu ihe na ibe ya. Ọ kwakọtakwara ọtụtụ ọla kọpa nke na a tụlighị otú ọ hà atụ̀.+ 4 Ndị Saịdọn+ na ndị Taya+ butekwaara Devid osisi sida+ karịrị akarị, nke na a gụtalighị osisi sida ndị ahụ ọnụ. 5 Devid sịkwara: “Solomọn nwa m bụ obere nwa, o nwebeghịkwa ihe ọ ma.*+ Ma ụlọ a ga-arụrụ Jehova ga-adị ebube, maakwa+ mma na-enweghị atụ,+ nke na akụkọ ya ga-agbasaru ebe niile.+ N’ihi ya, m ga-akwakọtara ya ihe.” Ọ bụ ya mere tupu Devid anwụọ, ọ kwakọtara ọtụtụ ihe a ga-eji rụọ ụlọ ahụ.

6 Devid kpọkwara Solomọn nwa ya, gwa ya ka ọ rụọrọ Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ. 7 Ọ gwara Solomọn nwa ya, sị: “Ọ dị m n’obi ịrụrụ Jehova bụ́ Chineke m ụlọ a ga-anọ na-eto aha ya.+ 8 Ma, Jehova gwara m, sị, ‘I gbuola ọtụtụ mmadụ* n’ọtụtụ agha ị lụrụ. Ị gaghị arụrụ m ụlọ a ga-anọ na-eto aha m,+ n’ihi na i gbuola ọtụtụ mmadụ* n’ụwa. 9 Ị ga-amụ nwa+ ga-abụ onye udo.* M ga-emekwa ka o zuoro ndị iro niile gbara ya gburugburu ike,+ n’ihi na aha ya ga-abụ Solomọn.*+ Ya chịwa, m ga-eme ka ebe niile n’Izrel daa jụụ, udo adịrịkwa na ya.+ 10 Ọ bụ ya ga-arụ ụlọ a ga-anọ na-eto aha m.+ Ọ ga-abụ nwa m, mụnwa ga-abụkwa nna ya.+ M ga-eme ka ocheeze ya sie ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi.’+

11 “Nwa m, ka Jehova nọnyere gị. Ka ị na-arụ ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị, ka ihe gaziere gị otú o kwuru banyere gị.+ 12 Ka Jehova mee ka ị dị akọ, na-aghọtakwa ihe+ mgbe ọ ga-eme ka ị na-edu ndị Izrel, ka i nwee ike ịna-edebe iwu Jehova bụ́ Chineke gị.+ 13 Ihe ga-agaziri gị ma i lezie anya na-eme ihe otú Jehova gwara Mosis ka ndị Izrel na-eme,+ na-emekwa ihe ndị o kpebiri.+ Nwee obi ike, dịkwa ike. Atụla egwu, atụkwala ụjọ.+ 14 Agbaala m ezigbo mbọ kpakọta otu narị puku (100,000) talent* ọlaedo na otu nde (1,000,000) talent ọlaọcha maka ụlọ Jehova. E nweghịkwa ike ịtụ ọla kọpa na ígwè+ m kwakọtara atụ̀ n’ihi na ha karịrị akarị. M nwetakwala ọtụtụ osisi na nkume.+ Ma ị ga-etinyekwu ihe na ha. 15 I nwekwara ọtụtụ ndị ọrụ, ma ndị na-awa nkume ma ndị na-edo nkume+ ma ndị ọkwá nkà ma ndị niile nwere nkà n’ụdị ọrụ ọ bụla.+ 16 Ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa, na ígwè dịnụ karịrị akarị.+ Gaa bido ọrụ, ka Jehova nọnyekwara gị.”+

17 Devid gwaziri ndị isi ndị Izrel niile ka ha nyere Solomọn nwa ya aka. Ọ sịrị: 18 “Jehova bụ́ Chineke unu nọnyeere unu. O meekwala ka unu zuru ike n’ebe niile unu nọ. N’ihi na o nyefeela ndị bi n’ala a n’aka m. Ha nọzi n’okpuru Jehova na ndị ya. 19 Ugbu a, jirinụ obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile chọọ Jehova bụ́ Chineke unu.+ Rụọkwanụ ụlọ nsọ Jehova bụ́ ezi Chineke,+ ka e wee bubata igbe ọgbụgba ndụ Jehova na arịa ndị dị nsọ e ji ejere ezi Chineke ozi+ n’ụlọ a rụrụ maka ịnọ na-eto aha Jehova.”+

23 Mgbe Devid mere agadi, ya afọkwa obere oge ka ọ nwụọ, o mere Solomọn nwa ya eze Izrel.+ 2 Ọ kpọkọtakwara ndị isi ndị Izrel niile, ndị nchụàjà,+ na ndị Livaị.+ 3 A gụkwara ndị Livaị ọnụ malite ná ndị gbara afọ iri atọ gbagowe.+ Ụmụ nwoke niile dị puku iri atọ na puku asatọ (38,000). 4 Puku iri abụọ na puku anọ (24,000) n’ime ha na-elekọta ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova, puku isii (6,000) bụkwa ndị isi na ndị ikpe.+ 5 Ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá dị puku mmadụ anọ (4,000).+ E nwekwara puku mmadụ anọ (4,000) ndị na-eji ngwá egwú eto+ Jehova. Ngwá egwú ha bụ ndị ahụ Devid kwuru banyere ha, sị, “Emere m ha ka e jiri ha na-eto Chineke.”

6 Devid wee hazie* ụmụ Livaị n’ìgwè n’ìgwè,+ ya bụ, Geshọn, Kohat, na Meraraị.+ 7 Ụmụ Geshọn bụ Ledan na Shimiaị. 8 Ụmụ Ledan bụ Jehayel, bụ́ onyeisi, Zitam, na Joel.+ Ha dị atọ. 9 Ụmụ Shimiaị bụ Shelomọt, Heziel, na Heran. Ha dị atọ. Ọ bụ ha bụ ndị isi ezinụlọ Ledan. 10 Ụmụ Shimiaị bụ Jehat, Zaịna,* Jiọsh, na Beraya. Mmadụ anọ a bụ ụmụ Shimiaị. 11 Jehat bụ onyeisi ha, Zaịza abụrụ onye nke abụọ. Ma, ebe ọ bụ na Jiọsh na Beraya amụghị ọtụtụ ụmụ, a gụkọtara ha abụọ ka otu ọnụmara. Ha na-arụkwa otu ọrụ.

12 Ụmụ Kohat bụ Amram, Izha,+ Hebrọn na Ọziel.+ Ha dị anọ. 13 Ụmụ Amram bụ Erọn+ na Mosis.+ Ma, e doro Erọn na ụmụ ya ndị nwoke iche+ ka ha na-edo Ebe Kacha Nsọ nsọ. Ọ bụkwa ha ga na-achụrụ Jehova àjà, na-ejere ya ozi, na-agọzikwa ndị mmadụ n’aha ya mgbe niile.+ 14 Ma a na-agụnye ụmụ Mosis bụ́ onye nke ezi Chineke n’ebo Livaị. 15 Ụmụ Mosis bụ Geshọm+ na Eliiza.+ 16 N’ụmụ Geshọm, Shebuel+ bụ onyeisi. 17 N’ụmụ Eliiza, Rehabaya+ bụ onyeisi. Eliiza amụghị ụmụ ọzọ, ma ụmụ Rehabaya dị nnọọ ọtụtụ. 18 N’ụmụ Izha,+ Shelomit+ bụ onyeisi. 19 N’ụmụ Hebrọn, Jeraya bụ onyeisi. Amaraya bụ onye nke abụọ. Jahazayel bụ onye nke atọ. Jekamiam+ bụ onye nke anọ. 20 N’ụmụ Ọziel,+ Maịka bụ onyeisi, Ịs-shaya abụrụ onye nke abụọ.

21 Ụmụ Meraraị bụ Malaị na Mushaị.+ Ụmụ Malaị bụ Elieza na Kish. 22 Elieza nwụrụ n’amụtaghị nwoke ọ bụla. Naanị ụmụ nwaanyị ka ọ mụrụ. Ụmụ Kish bụ́ ndị ikwu* ha wee lụrụ ha. 23 Ụmụ Mushaị bụ Malaị, Ịda, na Jeremọt. Ha dị atọ.

24 Ọ bụ ndị a bụ ụmụ Livaị ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara, ha na ndị isi ha. A gụrụ ndị Livaị ọnụ, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe, deekwa aha ha ka ọ bụrụ ha ga na-eje ozi a na-eje n’ụlọ Jehova. 25 Devid sịrị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel emeela ka ndị ya zuru ike.+ Ọ ga-ebikwa na Jeruselem ruo mgbe ebighị ebi.+ 26 Ndị Livaị agaghịkwa na-ebugharị ụlọikwuu ahụ ma ọ bụ arịa ndị dị na ya e ji ejere Chineke ozi.”+ 27 A gụrụ ndị Livaị ọnụ, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe. Ihe a so n’ihe ikpeazụ Devid kwuru ka e mee. 28 Ọrụ ha bụ inyere ụmụ Erọn aka+ n’ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova, ma n’ogige ya+ ma n’ebe a na-anọ eri ihe ma n’ido ihe ọ bụla dị nsọ ọcha, nakwa n’ọrụ ọ bụla gbasara ozi a na-eje n’ụlọ ezi Chineke. 29 Ha na-enyekwara ha aka na-ahụ maka achịcha a na-enye Chineke,+ ntụ ọka e gwere nke ọma maka ịchụ àjà ọka, achịcha na-ekoghị eko dị fere fere,+ keeki e mere n’ite dị mbadamba, na ntụ ọka a gwọrọ agwọ.+ Ha na-enyekwa aka atụ̀ ihe niile a na-atụ atụ̀ iji mata ole ha dị na otú ha hà. 30 Ha na-anọkwa ebe ahụ n’ụtụtụ ọ bụla+ nakwa ná mgbede ọ bụla na-ekele Jehova, na-etokwa ya.+ 31 Ha na-enyekwa aka mgbe ọ bụla a na-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ n’Ụbọchị Izu Ike,+ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ nakwa n’oge ememme dị iche iche.+ Ha na-enye aka mgbe niile a na-achụrụ Jehova àjà a otú iwu kwuru ka e si na-eme ya. 32 Ha na-arụkwa ọrụ n’ụlọikwuu nzute nakwa n’ebe nsọ. Ha na-enyekwara ụmụ Erọn, bụ́ ụmụnne ha, aka n’ozi a na-eje n’ụlọ Jehova.

24 Otú a ka Devid si kee ụmụ Erọn n’ìgwè n’ìgwè: Ụmụ Erọn bụ Nedab, Abaịhu,+ Elieza, na Ịtama.+ 2 Ma, Nedab na Abaịhu bu nna ha ụzọ nwụọ.+ Ha amụtaghịkwa nwoke ọ bụla. Ma, Elieza+ na Ịtama akwụsịghị ịbụ ndị nchụàjà. 3 Devid na Zedọk+ onye si n’agbụrụ Elieza nakwa Ahimelek onye si n’agbụrụ Ịtama kere ụmụ Erọn n’ìgwè n’ìgwè maka ọrụ ha ga na-arụ. 4 Ebe ọ bụ na ụmụ Elieza nwere ndị isi karịa ụmụ Ịtama, otú a ka e si kee ha: E kenyere ụmụ Elieza mmadụ iri na isii ka ha bụrụ ndị isi ọnụmara ha, kenyezie ụmụ Ịtama mmadụ asatọ ka ha bụrụ ndị isi ọnụmara ha.

5 Ha fekwara nza+ iji mara ndị a ga-ekenye ọrụ ụfọdụ n’ime ha, ma ndị nke mbụ ma ndị nke abụọ, n’ihi na e nwere ụmụ Elieza na ụmụ Ịtama ndị bụ́ ndị isi n’ebe nsọ na ndị isi ga na-ejere ezi Chineke ozi. 6 Shemaya nwa Netanel bụ́ odeakwụkwọ ndị Livaị wee dee aha ha n’akwụkwọ. Ndị nọ ya mgbe o dere ya bụ eze, ndị isi, Zedọk+ bụ́ onye nchụàjà, Ahimelek+ nwa Abayata,+ na ndị isi ezinụlọ ndị nchụàjà na nke ndị Livaị. A họọrọ otu ọnụmara maka Elieza, họrọkwa otu ọnụmara maka Ịtama.

7 Nza nke mbụ dabaara Jehoyarib, nke abụọ adabara Jedeya, 8 nke atọ adabara Herim, nke anọ adabara Seorim, 9 nke ise adabara Malkaịja, nke isii adabara Mijamin, 10 nke asaa adabara Hakọz, nke asatọ adabara Abaịja,+ 11 nke itoolu adabara Jeshụa, nke iri adabara Shekanaya, 12 nke iri na otu adabara Elayashib, nke iri na abụọ adabara Jekim, 13 nke iri na atọ adabara Họpa, nke iri na anọ adabara Jeshebiab, 14 nke iri na ise adabara Bilga, nke iri na isii adabara Ịma, 15 nke iri na asaa adabara Hiza, nke iri na asatọ adabara Hapizez, 16 nke iri na itoolu adabara Petahaya, nke iri abụọ adabara Jehezkel, 17 nke iri abụọ na otu adabara Jekin, nke iri abụọ na abụọ adabara Gemọl, 18 nke iri abụọ na atọ adabara Deleya, nke iri abụọ na anọ adabara Meazaya.

19 Otú a ka e si hazie ọrụ ha ga na-arụ+ mgbe ọ bụla ha batara n’ụlọ Jehova. Erọn nna nna ha haziri ya otú a dị ka Jehova bụ́ Chineke Izrel nyere ya n’iwu.

20 Ndị a bụ ndị fọrọ n’ụmụ Livaị: A bịa n’ụmụ Amram,+ Shubael+ so na ha. A bịa n’ụmụ Shubael, Jediya so na ha. 21 A bịa n’ụmụ Rehabaya,+ Ịs-shaya bụ onyeisi ha. 22 A bịa n’ụmụ Izha, Shelomọt+ so na ha. A bịa n’ụmụ Shelomọt, Jehat so na ha. 23 A bịa n’ụmụ Hebrọn, Jeraya+ bụ onyeisi. Amaraya bụ onye nke abụọ. Jahazayel bụ onye nke atọ. Jekamiam bụ onye nke anọ. 24 A bịa n’ụmụ Ọziel, Maịka so na ha. A bịa n’ụmụ Maịka, Shemia so na ha. 25 Nwanne Maịka bụ Ịs-shaya. A bịa n’ụmụ Ịs-shaya, Zekaraya so na ha.

26 Ụmụ Meraraị+ bụ Malaị na Mushaị. A bịa n’ụmụ Jaazaya, Bino so na ha. 27 Ndị a bụ ụmụ Meraraị: Ụmụ Jaazaya bụ Bino, Shoham, Zakọ, na Ibraị. 28 A bịa n’ụmụ Malaị, Elieza so na ha. Ma ọ mụtaghị nwoke ọ bụla.+ 29 A bịa n’ụmụ Kish, Jeramiel so na ha. 30 Ụmụ Mushaị bụ Malaị, Ịda, na Jerimọt.

Ọ bụ ndị a bụ ụmụ Livaị, n’ọnụmara n’ọnụmara. 31 Ha fekwara nza+ otú ụmụnne ha, bụ́ ụmụ Erọn, mere n’ihu Eze Devid, Zedọk, Ahimelek, na ndị isi ọnụmara ndị nchụàjà na ndị nke Livaị. Otú e si mesoo ọnụmara nke onyeisi bụ́ okenye ka e sikwa mesoo ọnụmara nke onyeisi ọ tọrọ.

25 Devid na ndị isi ìgwè dị iche iche na-eje ozi họpụtara ụfọdụ n’ime ụmụ Esaf, ụmụ Himan, na ụmụ Jedutọn+ ka ha na-eji une,+ ụbọ akwara, na ájà+ na-eto Chineke ma na-ebu amụma. Ndị a họpụtara maka ọrụ a bụ: 2 A bịa n’ụmụ Esaf, a họpụtara Zakọ, Josef, Netanaya, na Asharila. Ọ bụ Esaf na-eduzi ha. Ha na-ebukwa amụma otú eze haziri ka ha si na-ebu ya. 3 A bịa n’ụmụ Jedutọn,+ a họpụtara Gedalaya, Ziraị, Jesheya, Shimiaị, Hashabaya, na Matitaya.+ Ha dị isii. Ọ bụ Jedutọn nna ha na-eduzi ha. Ha na-eji ụbọ akwara ekele Jehova, na-eto ya ma na-ebu amụma.+ 4 A bịa n’ụmụ Himan,+ a họpụtara Bọkaya, Matanaya, Ọziel, Shebuel, Jerimọt, Hananaya, Hanenaị, Elayata, Gidaltaị, Romamtaị-iza, Joshbekasha, Malotaị, Hotia, na Maheziọt. 5 Ndị a niile bụ ụmụ Himan, onye na-ahụrụ eze ọhụụ, na-agwa ya ihe ezi Chineke kwuru nke na-eme ka e too Chineke. Ọ bụ ya mere ezi Chineke ji nye Himan ụmụ nwoke iri na anọ na ụmụ nwaanyị atọ. 6 Ọ bụ nna ha na-eduzi ha ka ha ji ájà, ụbọ akwara,+ na une na-abụ abụ n’ụlọ Jehova, nke bụ́ ozi ha na-eje n’ụlọ ezi Chineke.

Ọ bụkwa eze na-agwa Esaf, Jedutọn, na Himan ihe ha na-eme.

7 Ha na ụmụnne ha dị narị abụọ na iri asatọ na asatọ (288). Ha niile bụ ndị ọkà n’ịbụrụ Jehova abụ. A zụkwara ha azụ maka ya. 8 Ha fekwara nza+ ka a mata ndị ga-arụ ihe ha ga-arụ, ma onye ukwu ma onye nta, ma onye bụ́ aka ochie ma onye ka na-amụ amụ.

9 Nza nke mbụ dabaara Josef nwa Esaf,+ nke abụọ adabara Gedalaya+ (ya na ụmụnne ya na ụmụ ya dị mmadụ iri na abụọ). 10 Nke atọ dabaara Zakọ,+ ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 11 Nke anọ dabaara Izraị, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 12 Nke ise dabaara Netanaya,+ ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 13 Nke isii dabaara Bọkaya, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 14 Nke asaa dabaara Jesharila, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 15 Nke asatọ dabaara Jesheya, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 16 Nke itoolu dabaara Matanaya, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 17 Nke iri dabaara Shimiaị, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 18 Nke iri na otu dabaara Azarel, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 19 Nke iri na abụọ dabaara Hashabaya, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 20 Nke iri na atọ dabaara Shubael,+ ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 21 Nke iri na anọ dabaara Matitaya, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 22 Nke iri na ise dabaara Jeremọt, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 23 Nke iri na isii dabaara Hananaya, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 24 Nke iri na asaa dabaara Joshbekasha, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 25 Nke iri na asatọ dabaara Hanenaị, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 26 Nke iri na itoolu dabaara Malotaị, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 27 Nke iri abụọ dabaara Elayata, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 28 Nke iri abụọ na otu dabaara Hotia, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 29 Nke iri abụọ na abụọ dabaara Gidaltaị,+ ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 30 Nke iri abụọ na atọ dabaara Maheziọt,+ ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 31 Nke iri abụọ na anọ dabaara Romamtaị-iza,+ ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ.

26 Otú a ka e si kee ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá+ n’ìgwè n’ìgwè: a bịa ná ndị si n’agbụrụ Kora, Meshelemaya+ so na ha. Ọ bụ nwa Kore, onye si n’agbụrụ Esaf. 2 Meshelemaya mụrụ ụmụ nwoke ndị a: Zekaraya bụ ọkpara ya. Jedayel bụ nwa ya nke abụọ. Zebadaya bụ nwa ya nke atọ. Jatniel bụ nwa ya nke anọ. 3 Ịlam bụ nwa ya nke ise. Jehohenan bụ nwa ya nke isii. Elaịho-inaị bụ nwa ya nke asaa. 4 Obed-ịdọm mụrụ ụmụ nwoke ndị a: Shemaya bụ ọkpara ya. Jehozabad bụ nwa ya nke abụọ. Joa bụ nwa ya nke atọ. Seka bụ nwa ya nke anọ. Netanel bụ nwa ya nke ise. 5 Amiel bụ nwa ya nke isii. Ịsaka bụ nwa ya nke asaa. Piuletaị bụ nwa ya nke asatọ. Otú a ka Chineke si gọzie Obed-ịdọm.

6 A mụụrụ Shemaya nwa ya ụmụ nwoke ndị dike gbasiri ike. Ha bụkwa ndị isi ọnụmara ha. 7 Ụmụ Shemaya bụ Ọtnaị, Refael, Obed, na Elzebad. Ụmụnne ya bụ Elaịhu na Semakaya, ha bụkwa ndị gbasiri ike. 8 Ndị a niile bụ ụmụ Obed-ịdọm. Ha na ụmụ ha na ụmụnne ha bụ ndị nwoke gbasiri ike, ndị rukwara eru ịrụ ọrụ e nyere ha. Ha dị mmadụ iri isii na abụọ si n’ezinụlọ Obed-ịdọm. 9 Meshelemaya+ mụrụ ụmụ nwoke, nweekwa ụmụnne ndị nwoke. Ha gbasiri ike. Ha dị mmadụ iri na asatọ. 10 Hosa, onye si n’agbụrụ Meraraị, mụrụ ụmụ nwoke. Shimraị bụ onyeisi ha. N’agbanyeghị na ọ bụghị ya bụ ọkpara, nna ya mere ya onyeisi. 11 Hilkaya bụ onye nke abụọ, Tebalaya bụ onye nke atọ, Zekaraya bụ onye nke anọ. Ụmụ Hosa niile na ụmụnne ya ndị nwoke dị iri na atọ.

12 N’ime ìgwè ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ọrụ ndị isi ha na-arụ ka ụmụnne ha na-arụ, ya bụ, ije ozi n’ụlọ Jehova. 13 Ha fekwara nza+ n’ọnụmara n’ọnụmara, n’isi onye ukwu na onye nta, ka a mara onye ga-anọ n’ọnụ ụzọ ámá nke ọ ga-anọ. 14 Mgbe ha fere nza maka ebe ọwụwa anyanwụ, ọ dabaara Shelemaya. Mgbe ha fere nza maka Zekaraya nwa ya, bụ́ onye ndụmọdụ ma ihe, nke dabaara ya bụ nke dị n’ebe ugwu. 15 Nke dabaara Obed-ịdọm bụ nke dị n’ebe ndịda. E kenyekwara ụmụ ya+ ụlọ ndị a na-akwasa ihe. 16 Nke dabaara Shọpim na Hosa+ bụ nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ, nke dị nso n’Ọnụ Ụzọ Ámá Shaleket, n’akụkụ okporo ụzọ dị ebe mgbago. Otu ìgwè ndị nche na-anọ n’akụkụ ìgwè ndị nche ọzọ. 17 Ndị Livaị isii na-anọ n’ebe ọwụwa anyanwụ. Anọ na-anọ n’ebe ugwu n’otu ụbọchị, anọ ọzọ na-anọ n’ebe ndịda n’otu ụbọchị. Ndị nche anọ na-anọkwa abụọ abụọ n’ụlọ ndị a na-akwasa ihe.+ 18 A bịa n’ebe e si abanye n’ebe ọdịda anyanwụ ụlọ nsọ, mmadụ anọ na-anọ n’okporo ụzọ,+ mmadụ abụọ ana-anọ n’ebe ahụ e si abanye. 19 Otú a ka e si kee ndị si n’agbụrụ Kora na ndị si n’agbụrụ Meraraị, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, n’ìgwè n’ìgwè.

20 A bịa n’ụmụ Livaị, Ahaịja na-elekọta akụ̀ ndị dị n’ụlọ ezi Chineke, na-elekọtakwa akụ̀ ndị e doro nsọ.+ 21 A bịa n’ụmụ Ledan, ndị si n’agbụrụ Geshọn, ndị Ledan mụrụ, Jehayelaị+ so ná ndị isi n’ọnụmara dị iche iche n’ezinụlọ Ledan, onye agbụrụ Geshọn. 22 Jehayelaị na ụmụ ya bụ́ Zitam na Joel nwanne ya na-elekọta akụ̀ ndị dị n’ụlọ Jehova.+ 23 A bịa n’ụmụ Amram, ụmụ Izha, ụmụ Hebrọn, na ụmụ Ọziel,+ 24 Shebuel nwa Geshọm nwa Mosis bụ onye ndú na-elekọta ụlọ ndị a na-akwasa ihe. 25 Ụmụnne Shebuel, bụ́ ụmụ ụmụ Eliiza,+ bụ Rehabaya,+ Jesheya, Zikraị, Joram, na Shelomọt. 26 Shelomọt a na ụmụnne ya na-elekọta akụ̀ niile e doro nsọ.+ Ndị doro akụ̀ ndị a nsọ bụ Eze Devid,+ ndị isi ọnụmara dị iche iche,+ ndị isi otu puku otu puku ndị agha na ndị nke otu narị otu narị ndị agha, nakwa ndị isi ìgwè ndị agha. 27 Ha doro ụfọdụ n’ime ihe ndị a kwatara n’agha+ nsọ ka e jiri ha na-elekọta ụlọ Jehova. 28 Shelomit na ụmụnne ya na-elekọtakwa ihe niile Samuel onye ọhụ ụzọ,+ Sọl nwa Kish, Abna+ nwa Nee, na Joab+ nwa Zeruya+ doro nsọ. Ọ bụ ha na-ahụ maka ihe onye ọ bụla doro nsọ.

29 A bịa n’ụmụ Izha,+ Kenanaya na ụmụ ya na-ahụ maka ọrụ ndị a na-anaghị anọ n’ụlọ nsọ arụ, ndị dị ka ịbụ ndị isi ọrụ na ndị na-ekpere Izrel ikpe.+

30 A bịa n’ụmụ Hebrọn,+ Hashabaya na ụmụnne ya, bụ́ ndị nwoke gbasiri ike, ndị dị otu puku mmadụ na narị asaa (1,700), na-elekọta ndị Izrel bi n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan, n’ihe gbasara ọrụ niile a na-arụrụ Jehova nakwa ozi a na-ejere eze. 31 A bịa n’ụmụ Hebrọn, Jeraịja+ bụ onyeisi ọnụmara ha. N’afọ nke iri anọ n’ọchịchị Devid,+ a nọ na-achọ ndị dike gbasiri ike, mechaa nweta ha na Jeza+ nke dị na Gilied. 32 Ụmụnne Jeraịja, ndị gbasiri ike, dị puku mmadụ abụọ na narị asaa (2,700). Ha bụ ndị isi ọnụmara dị iche iche. Eze Devid họpụtakwara ha ka ha na-elekọta ebo Ruben, ebo Gad, na ọkara ebo Manase, ka ha na-ahụkwa maka okwu ọ bụla gbasara ezi Chineke na okwu ọ bụla gbasara eze.

27 Ndị a bụ ndị Izrel e kere n’ìgwè n’ìgwè, ndị so ná ndị agha eze. N’ìgwè ndị a, e nwere ndị isi ọnụmara, ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị nke otu narị otu narị ndị agha.+ E nwekwara ndị isi ọrụ ha bụ ilekọtara eze ìgwè ndị ahụ.+ Ìgwè nke ọ bụla dị puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000). N’afọ ọ bụla, ọ na-abụ, otu ìgwè jee ozi n’ọnwa nke a, ìgwè ọzọ ejee n’ọnwa nke ọzọ.

2 E kenyere ìgwè nke mbụ ije ozi n’ọnwa nke mbụ. Onyeisi ha bụ Jashobiam+ nwa Zabdiel. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọ n’ìgwè ya. 3 Jashobiam a bụ nwa nwa Pirez,+ bụrụkwa onyeisi nke ndị niile bụ́ ndị isi n’ìgwè ahụ e kenyere ije ozi n’ọnwa nke mbụ. 4 Ọ bụ Dodaị,+ onye Ahohaị,+ bụ onyeisi ìgwè e kenyere ije ozi n’ọnwa nke abụọ. Miklọt bụkwa osote ya. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè nke ya. 5 Onyeisi ìgwè nke atọ bụ Benaya+ nwa Jehoyada,+ onyeisi nchụàjà. E kenyere ha ije ozi n’ọnwa nke atọ. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 6 Benaya a bụ otu n’ime mmadụ iri atọ bụ́ dike n’agha, bụrụkwa onyeisi ha. Ọ bụkwa Amịzabad nwa ya ka e mere onyeisi ìgwè ya. 7 Onyeisi nke anọ bụ Asahel+ nwanne Joab.+ E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke anọ. Zebadaya nwa ya na-esote ya. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 8 Onyeisi nke ise bụ Shamhọt onye si n’ezinụlọ Izra. E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke ise. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 9 Onyeisi nke isii bụ Aịra+ nwa Ikesh, onye Tekoa.+ E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke isii. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 10 Onyeisi nke asaa bụ Hilez+ onye Pelọnaịt si n’ebo Ifrem. E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke asaa. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 11 Onyeisi nke asatọ bụ Sibekaị+ onye Husha. O si n’ezinụlọ Zira.+ E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke asatọ. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 12 Onyeisi nke itoolu bụ Abi-iza+ onye Anatọt+ nke dị n’ebo Benjamin. E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke itoolu. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 13 Onyeisi nke iri bụ Meharaị+ onye Netofa si n’agbụrụ Zira.+ E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke iri. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 14 Onyeisi nke iri na otu bụ Benaya+ onye Piratọn nke dị n’ebo Ifrem. E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke iri na otu. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 15 Onyeisi nke iri na abụọ bụ Heldaị onye Netofa si n’agbụrụ Ọtniel. E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke iri na abụọ. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya.

16 Ndị a bụ ndị ndú ebo dị iche iche n’Izrel: Eliiza nwa Zikraị bụ nke ebo Ruben, Shefataya nwa Meaka abụrụ nke ebo Simiọn. 17 Hashabaya nwa Kemuel bụ nke ebo Livaị, Zedọk abụrụ nke ụmụ Erọn. 18 Elaịhu,+ otu n’ime ụmụnne Devid, bụ nke ebo Juda, Ọmraị nwa Maịkel abụrụ nke ebo Ịsaka. 19 Ishmeya nwa Obedaya bụ nke ebo Zebulọn, Jerimọt nwa Azriel abụrụ nke ebo Naftalaị. 20 Hoshia nwa Azazaya bụ nke ebo Ifrem, Joel nwa Pedaya abụrụ nke ọkara ebo Manase. 21 Ido nwa Zekaraya bụ nke ọkara ebo Manase, bụ́ ndị bi na Gilied. Jaasayel nwa Abna+ abụrụ nke ebo Benjamin. 22 Azarel nwa Jeroham bụ nke ebo Dan. Ọ bụ ndị a bụ ndị isi ebo dị iche iche n’Izrel.

23 Devid agụghị ndị gbara afọ iri abụọ gbadawa ọnụ, n’ihi na Jehova kwere nkwa ime ka ndị Izrel dị ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe.+ 24 Joab nwa Zeruya malitere ịgụ ha ọnụ, ma ọ gụchaghị ha. Chineke wesakwara ndị Izrel iwe n’ihi ọnụ ahụ a gụrụ ha.+ E denyeghịkwa mmadụ ole a gụtara n’ebe e denyere ihe ndị mere n’oge Eze Devid na-achị.

25 Onye na-elekọta akụ̀ eze+ bụ Azmavet nwa Adiel. Ma, Jonatan nwa Ọzaya na-elekọta akụ̀ ndị dị n’ubi nakwa ndị dị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta dị iche iche nakwa n’ụlọ elu dị iche iche. 26 Ezraị nwa Kilọb bụ onyeisi ndị na-akọ ihe n’ubi. 27 Onye na-ahụ maka ubi vaịn bụ Shimiaị onye Rema. Onye na-ahụ maka ebe a na-adọwa mmanya e mepụtara ná mkpụrụ a ghọtara n’ubi vaịn bụ Zabdaị onye Sifmọt. 28 Onye na-elekọta ubi oliv na osisi sịkamọ+ ndị dị na Shefila*+ bụ Belhenan onye Gida. Onye na-ahụ maka ebe mmanụ na-adị bụ Joash. 29 Onye na-elekọta ehi ndị na-ata ahịhịa na Sharọn+ bụ Shitraị onye Sharọn. Onye na-elekọta ehi ndị na-anọ na ndagwurugwu bụ Shefat nwa Adlaị. 30 Onye na-elekọta kamel bụ Obil onye Ishmel. Onye na-elekọta jakị* bụ Jediya onye Merọnọt. 31 Onye na-elekọta ìgwè ewu na atụrụ bụ Jeziz onye Hega. Ọ bụ ndị a niile bụ ndị isi na-elekọta ihe ndị Eze Devid nwere.

32 Jonatan+ nwa nwanne Devid bụ onye ndụmọdụ, bụrụkwa odeakwụkwọ. Ọ bụ nwoke na-aghọta ihe nke ọma. Jehayel nwa Hakmọnaị na-ahụ maka ihe gbasara ụmụ eze.+ 33 Ahitofel+ bụ onye ndụmọdụ eze. Hushaị+ onye Akaịt bụ enyi eze.* 34 Ndị na-esote Ahitofel bụ Jehoyada nwa Benaya+ na Abayata.+ Joab+ bụ onyeisi ndị agha eze.

28 Devid wee kpọkọta ndị isi ndị Izrel niile na Jeruselem. Ndị isi ndị a bụ ndị isi ebo dị iche iche, ndị isi ìgwè dị iche iche+ na-ejere eze ozi, ndị isi otu puku otu puku ndị agha, ndị isi otu narị otu narị ndị agha,+ ndị isi ndị na-elekọta ngwongwo niile na anụ ụlọ niile eze+ na ụmụ ya nwe,+ nakwa ndị na-eje ozi n’obí eze na ndị dike gbasiri ike.+ 2 Mgbe ha zukọrọ, Eze Devid biliri, sị:

“Ụmụnne m na ndị nke m, nụrụnụ ihe m chọrọ ikwu. Ọ dị m n’obi ịrụ ebe a ga-adọsa igbe ọgbụgba ndụ Jehova nakwa ebe Chineke anyị ga na-agbakwasị ụkwụ.+ M kwakọtakwara ihe ndị a ga-eji arụ ya.+ 3 Ma, ezi Chineke sịrị m, ‘Ị gaghị arụrụ m ụlọ a ga-anọ na-eto aha m+ n’ihi na ị lụọla ọtụtụ agha, gbuokwa ọtụtụ mmadụ* n’agha ndị ahụ.’+ 4 Ma, ọ bụ mụnwa ka Jehova bụ́ Chineke Izrel họọrọ n’ezinụlọ nna m ka m bụrụ eze Izrel ruo mgbe ebighị ebi.+ Ọ họọrọ Juda ka ọ bụrụ onye ndú,+ sikwa n’ụlọ Juda họrọ ezinụlọ nna m.+ A bịakwa ná ndị nna m mụrụ, ọ masịrị Chineke ka ọ bụrụ m ka a ga-echi eze Izrel niile.+ 5 Jehova enyekwala m ọtụtụ ụmụ.+ N’ime ha niile, ọ họọrọ Solomọn nwa m+ ka ọ bụrụ ya ga-anọ n’ocheeze Jehova na-achị Izrel.+

6 “Ọ sịkwara m, ‘Ọ bụ Solomọn nwa gị ga-arụ ụlọ m na ogige m, n’ihi na ahọrọla m ya ka ọ bụrụ nwa m. Mụnwa ga-abụkwa nna ya.+ 7 Ọ bụrụ na ọ na-edebe iwu m, na-emekwa ihe m chọrọ,+ otú ọ na-eme ugbu a, m ga-eme ka ọchịchị ya sie ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi.’+ 8 Ọ bụ ya mere m ji nọrọ n’ihu ndị Izrel niile, bụ́ ọgbakọ Jehova, nakwa n’ihu Chineke anyị na-agwa unu, sị: Gbaanụ mbọ ka unu mata iwu niile Jehova bụ́ Chineke unu nyere, na-edebekwanụ ha, ka unu nwee ike biri n’ọmarịcha ala a,+ hapụkwara ya ụmụ unu ga-anọchi unu ka ọ bụrụ ihe ha ga-eketa ruo mgbe ebighị ebi.

9 “Solomọn nwa m, mara Chineke nna gị na-efe, jiri obi gị niile+ na-ejere ya ozi, na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ozi ị na-ejere ya, n’ihi na Jehova na-enyocha obi niile,+ na-amatakwa ihe niile dị mmadụ n’obi.+ Ị chọọ ya, ị ga-achọta ya.+ Ma, ị hapụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo mgbe ebighị ebi.+ 10 Ugbu a, Jehova ahọrọla gị ka ị rụọrọ ya ụlọ nsọ. Nwee obi ike, bidokwa ọrụ.”

11 Devid gwaziri Solomọn nwa ya otú ebe a ga-esi na-abanye n’ụlọ nsọ ahụ ga-adị,+ otú ọnụ ụlọ dị iche iche ga-adị, ma ọnụ ụlọ ndị a ga na-akwasa ihe, ma ọnụ ụlọ ndị ga-adị n’elu, ma ọnụ ụlọ ndị ga-adị n’ime, ma ụlọ ebe a na-ekpuchi mmehie.+ 12 Ọ gwara ya ihe ndị e si n’ike mmụọ nsọ gwa ya gbasara otú a ga-esi arụ ihe niile banyere ogige+ ụlọ Jehova, ụlọ ndị a ga-anọ na-eri ihe, ebe a ga na-edowe akụ̀ ndị ga-adị n’ụlọ ezi Chineke, na ụlọ a ga na-edowe akụ̀ ndị e doro nsọ.+ 13 Ọ gwakwara ya otú a ga-esi hazie ndị nchụàjà na ndị Livaị n’ìgwè n’ìgwè+ maka ozi ha na-eje n’ụlọ Jehova, gwakwa ya banyere arịa niile a ga-eji na-eje ozi n’ụlọ Jehova. 14 Ọ gwakwara ya otú ọlaedo a ga-eji mee arịa niile a ga-eji na-arụ ọrụ dị iche iche ga-aha n’arọ, nakwa otú ọlaọcha a ga-eji mee arịa niile a ga-eji na-arụ ọrụ dị iche iche ga-aha n’arọ. 15 Ọ gwakwara ya otú ihe ndị e ji adọsa ọkụ+ a ga-eji ọlaedo rụọ nakwa ọkụ* ha ndị a ga-eji ọlaedo rụọ ga-aha n’arọ, gwakwa ya otú ihe ndị e ji adọsa ọkụ a ga-eji ọlaọcha rụọ nakwa ọkụ* ha ndị a ga-eji ọlaọcha rụọ ga-aha n’arọ. 16 Ọ gwakwara ya otú ọlaedo a ga-eji rụọ tebụl a ga na-edosa achịcha a na-enye Chineke+ ga-aha n’arọ. Ihe ọzọ ọ gwara ya bụ otú tebụl nke ọ bụla na ọlaọcha a ga-eji rụọ tebụl ọlaọcha ga-aha n’arọ. 17 Ọ gwakwara ya otú ọlaedo a na-agwaghị agwa a ga-eji kpụọ ndụdụ, efere, na nnukwu iko ga-aha n’arọ. Ihe ọzọ ọ gwara ya bụ otú obere efere ọlaedo+ nke ọ bụla ga-aha n’arọ nakwa otú obere efere ọlaọcha nke ọ bụla ga-aha n’arọ. 18 Ọ gwakwara ya otú ọlaedo a nụchara anụcha nke a ga-eji rụọ ebe ịchụàjà insens+ ga-aha n’arọ nakwa otú ihe na-anọchi anya ụgbọ ịnyịnya,+ ya bụ, cherob+ ndị e ji ọlaedo kpụọ ga-aha n’arọ. Nku cherob ndị ahụ ga-agbasa agbasa kpuchie igbe ọgbụgba ndụ Jehova. 19 Devid sịrị: “Jehova duziri m, nyekwa m amamihe, mụ aghọta otú a ga-esi arụ ihe a niile,+ deekwa ha edee.”+

20 Devid gwakwara Solomọn nwa ya, sị: “Nwee obi ike, dị ike, bidokwa ọrụ. Atụla egwu, atụkwala ụjọ, n’ihi na Jehova Chineke, bụ́ Chineke m, nọnyeere gị.+ Ọ gaghị ahapụ gị, ọ gaghịkwa agbakụta gị azụ.+ Kama, ọ ga-anọnyere gị ruo mgbe a rụchara ụlọ Jehova. 21 Lekwa ìgwè ndị nchụàjà dị iche iche+ na ndị Livaị+ ga na-eje ozi niile a ga-eje n’ụlọ ezi Chineke. I nwekwara ndị dị njikere ịrụ ọrụ, ndị nwere nkà n’ụdị ọrụ ọ bụla a ga-arụ,+ nakwa ndị isi na mmadụ niile,+ ndị ga-eme ihe niile ị gwara ha.”

29 Eze Devid gwaziri ndị Izrel niile, sị: “Solomọn nwa m, onye Chineke họọrọ,+ bụ obere nwa, o nwebeghịkwa ihe ọ ma.*+ Ma ọrụ a ga-arụ abụghị obere ọrụ, n’ihi na ụlọ nsọ* a na-aga ịrụ abụghị nke mmadụ, kama ọ bụ nke Jehova Chineke.+ 2 Agbakwaala m mbọ otú ike m hà kwakọta ọlaedo maka ihe ndị a ga-eji ọlaedo arụ n’ụlọ Chineke, kwakọtakwa ọlaọcha maka ihe ndị a ga-eji ọlaọcha arụ, nakwa ọla kọpa maka ihe ndị a ga-eji ọla kọpa arụ. Akwakọtakwala m ígwè maka ihe ndị a ga-eji ígwè arụ,+ nakwa osisi+ maka ihe ndị a ga-eji osisi arụ. Ihe ndị ọzọ m kwakọtara bụ nkume ọnịks, nkume a ga-eji ụrọ doo, obere okwute ndị tụrụ àgwà, ụdị nkume ọ bụla dị oké ọnụ,* nakwa nkume alabasta karịrị akarị. 3 Enyekwala m ọlaedo m na ọlaọcha m+ maka ụlọ Chineke m,+ n’ihi na ihe gbasara ụlọ Chineke m masịrị m. Enyekwala m ọtụtụ ihe ndị ọzọ maka ụlọ ahụ dị nsọ. 4 Ụfọdụ n’ime ihe ndị m nyere bụ puku talent* ọlaedo atọ (3,000) si Ofa,+ puku talent ọlaọcha asaa (7,000) a nụchara anụcha a ga-eji machie ahụ́ ụlọ dị iche iche, 5 ọlaedo maka ihe ndị a ga-eji ọlaedo arụ na ọlaọcha maka ihe ndị a ga-eji ọlaọcha arụ nakwa maka ọrụ niile ndị omenkà ga-arụ. Ò nwere onye n’ime unu chọrọ inye Jehova onyinye taa?”+

6 Ndị isi ọnụmara dị iche iche, ndị isi ebo dị iche iche n’Izrel, ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha,+ nakwa ndị isi na-ahụ maka ọrụ eze+ wee bido inye onyinye. 7 Ha nyere puku talent ọlaedo ise (5,000), puku mkpụrụ ego darik* iri (10,000), puku talent ọlaọcha iri (10,000), puku talent ọla kọpa iri na asatọ (18,000), nakwa ígwè dị otu narị puku (100,000) talent maka ịrụ ụlọ ezi Chineke. 8 Ndị nwere nkume ndị dị oké ọnụ* nyekwara ha ka e dowe ha ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ Jehova. Ọ bụ Jehayel+ onye si n’agbụrụ Geshọn+ na-elekọta ebe ahụ. 9 Ha ṅụrịkwara ọṅụ n’ihi onyinye ndị a ha nyere, n’ihi na ha ji obi ha niile nye ha Jehova.+ Obi bụkwa Eze Devid sọ aṅụrị.

10 Devid nọkwa n’ihu mmadụ niile too Jehova. Ọ sịrị: “Ka a na-eto gị, Jehova bụ́ Chineke Izrel bụ́ nna anyị, ruo mgbe ebighị ebi.* 11 Jehova, ị bụ onye ukwu.+ Ị dịkwa ike.+ Ị bụ onye ọma, dịrịkwa ebube.+ E kwesịrị ịna-asọpụrụ gị n’ihi na ihe niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa bụ nke gị.+ Jehova, ọ bụ gị bụ eze.+ Ị na-egosikwa na ọ bụ gị bụ Ọkaakaa. 12 Akụnụba na ebube na-esi n’aka gị.+ Ọ bụkwa gị na-achị ihe niile.+ I siri ezigbo ike,+ bụrụkwa onye ukwu.+ I nwere ike ime ka mmadụ bụrụ onye ukwu,+ nweekwa ike inye mmadụ niile ike.+ 13 Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-ekele gị, na-etokwa aha ọma gị.

14 “Ma, ònye ka m bụ, ole ndị ka ndị m bụkwa, nke na anyị nwere ike iji obi anyị niile nye ụdị onyinye a? N’ihi na ihe niile si n’aka gị, ihe anyị nyere gị sikwa n’aka gị. 15 Ị ma na anyị bụ ndị mbịarambịa na ndị ọbịa dị ka ndị nna nna anyị niile.+ N’ihi na ụbọchị ndụ anyị n’elu ụwa dị ka onyinyo.+ E wezụgakwa gị, anyị enweghị olileanya. 16 Jehova bụ́ Chineke anyị, ihe a niile anyị kwadebere iji rụọrọ gị ụlọ a ga-anọ na-eto aha nsọ gị si n’aka gị. Ha niile bụkwa nke gị. 17 Chineke m, ama m nke ọma na ị na-enyocha obi,+ nakwa na ihe onye na-akwụwa aka ọtọ*+ na-atọ gị ụtọ. M ji obi ọcha m nye ihe ndị a niile. Obi dịkwa m ụtọ ịhụ ka ndị gị bịara ebe a ji obi ha niile na-enye gị onyinye. 18 Jehova bụ́ Chineke Ebreham, Aịzik, na Izrel, bụ́ ndị nna nna anyị, biko, mee ka ndị gị na-enwe obi inye ihe otú a ruo mgbe ebighị ebi, meekwa ka obi ha dịrị n’ebe ị nọ.+ 19 Nyekwara Solomọn nwa m aka ka obi ya niile dịrị n’ebe ị nọ+ ka o nwee ike na-edebe iwu gị,+ na-eme ihe i kwuru, na-esokwa ntụziaka gị. Nyere ya aka ka o mee ihe a niile, rụọkwa nnukwu ụlọ nsọ a m kwakọtara ihe a ga-eji arụ ya.”+

20 Devid gwaziri ndị Izrel niile, sị: “Toonụ Jehova bụ́ Chineke unu.” Ha niile wee too Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha, hulatakwa kpọọrọ Jehova isiala, kpọọkwara eze. 21 Ha wee na-achụrụ Jehova àjà. Ruokwa echi ya, ha nọ na-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ.+ Ihe ndị ha ji chụọ àjà bụ otu puku (1,000) oké ehi, otu puku (1,000) ebule na otu puku (1,000) ụmụ ebule. Ha chụkwara àjà mmanya,+ chụọkwa ọtụtụ àjà maka ndị Izrel niile.+ 22 Ha nọkwa n’ihu Jehova n’ụbọchị ahụ na-enwe aṅụrị, na-eri, na-aṅụkwa.+ Ha chikwara Solomọn nwa Devid eze nke ugboro abụọ, teekwa ya mmanụ n’ihu Jehova ka ọ bụrụ onye ndú.+ Ha họpụtakwara Zedọk ka ọ bụrụ onye nchụàjà.+ 23 Solomọn nọchiri Devid nna ya, nọrọ n’ocheeze Jehova+ na-achị. Ihe nọkwa na-agaziri ya, ndị Izrel niile ana-erubekwara ya isi. 24 Ndị isi niile,+ ndị niile bụ́ dike n’agha,+ nakwa ụmụ Eze Devid niile+ nọ na-erubere Eze Solomọn isi. 25 Jehova mekwara ka Solomọn bụrụ nnukwu mmadụ n’anya ndị Izrel niile, meekwa ka ọ dị ebube karịa eze ọ bụla chịrị Izrel tupu yanwa achịwa.+

26 Otú a ka Devid nwa Jesi si chịa Izrel niile. 27 Ọ chịrị Izrel afọ iri anọ. Ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn,+ chịakwa afọ iri atọ na atọ na Jeruselem.+ 28 Ọ nwụrụ mgbe o mere ezigbo agadi.+ Ogologo ndụ ọ dịrị, akụnụba o nwere, na otú o si dị ebube jukwara ya afọ. Solomọn nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.+ 29 E dere akụkọ ndụ Eze Devid, malite ná mbido ruo ná ngwụcha, n’akwụkwọ. Ọ bụ Samuel onye ọhụ ụzọ, Netan+ onye amụma, na Gad+ onye ọhụụ dere ya. 30 Ha dekwara ihe ndị mere mgbe ọ bụ eze, ike ọ kpara, ihe ndị mere n’oge ọ nọ ndụ, ihe ndị mere n’Izrel, nakwa n’alaeze ndị gbara ha gburugburu.

Ụmụ Eram bụ. Gụọ Jen. 10:23.

Pileg pụtara “Nkewa.”

Na Hibru, “ka e kewara ụwa.”

Na Hibru, “Ụmụ.”

Na Hibru, “ụmụ Izrel.”

Na Hibru, “Ụmụ.”

Eka pụtara “Onye Na-akpata Ọdachi; Onye Na-akpata Nnukwu Nsogbu.” Na Joshụa 7:1, a kpọrọ ya Ekan.

Ma ọ bụ “nnukwu nsogbu.”

Na Hibru, “Ụmụ.”

A kpọrọ ya Keleb n’amaokwu nke 18, 19, na nke 42.

A kpọrọ ya Kelubaị n’amaokwu nke 9.

Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”

Na Hibru, “Ụmụ.”

Na Hibru, “Ụmụ.”

Na Hibru, “Ụmụ.”

A kpọrọ ya Kelubaị n’amaokwu nke 9.

Na Hibru, “Ụmụ.”

Na Hibru, “Ụmụ.”

Na Hibru, “Ụmụ.”

Na Hibru, “Ụmụ.”

Ọ ga-abụ na aha a bụ nwanne okwu Hibru nke pụtara “ịta ahụhụ.”

Na Hibru, “Ụmụ.”

Ge-harashim pụtara “Ndagwurugwu Ndị Omenkà.”

Na Hibru, “Ụmụ.”

O nwere ike ịbụ Bitaya a kpọrọ aha n’amaokwu nke 18.

O nwere ike ịbụ ndị nke a kpọrọ aha ná ngwụcha amaokwu nke 17.

Ma ọ bụ “Okwu ndị a bụ okwu oge ochie.”

Na Hibru, “o merụrụ àkwà nna ya.”

Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”

Ya bụ, Jeroboam nke Abụọ.

Na Hibru, “na-ekwekwa ụta.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

A kpọrọ ya Geshọn n’amaokwu nke mbụ.

Ma ọ bụ “ụlọikwuu ndị e ji mgbidi gbaa gburugburu.”

O nwere ike ịbụ, “otu obodo mgbaba,” otú dabara n’ihe e kwuru na Joshụa 21:13.

O nwere ike ịbụ, “otu obodo mgbaba,” otú dabara n’ihe e kwuru na Joshụa 21:21.

Na Hibru, “Ụmụ.”

Beraya pụtara “Oge Ọdachi.”

Ma ọ bụ “Jehoshụa,” nke pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.”

Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”

O nwere ike ịbụ, “Gaza,” ma, ọ bụghị Gaza nke dị na Filistia.

A kpọrọ ya Shoma n’amaokwu nke 32.

O nwere ike ịbụ ya ka a kpọrọ “Hotam” n’amaokwu nke 32.

O nwere ike ịbụ, “Shahareyim mụrụ ụmụ na Moab mgbe ọ chụpụchara ha bụ́ Hushim na Beara.”

Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”

Ya bụ, ndị ebo Benjamin ibe ha.

A na-akpọkwa ya Ish-boshet.

A na-akpọkwa ya Mefiboshet.

Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”

Ma ọ bụ “n’ụlọ nsọ.”

Ma ọ bụ “dike.”

Ma ọ bụ “maka ebe ndị a na-anọ eri nri.”

Ma ọ bụ “ebe ndị a na-anọ eri nri.”

Na Hibru, “Shimiam.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.

Ya bụ, ndị ebo Benjamin ibe ha.

Ya bụ, Jehova.

Ma ọ bụ “otu ọkpụkpụ na otu anụ ahụ́.”

Na Hibru, “ọ bụ gị na-edu Izrel apụ ma na-edu ha alọta.”

Hibru, “mil·loh.” Ọ pụtara “ebe e kpojuru ájá, ya adị mkputamkpu.”

Ma ọ bụ “si zọpụta ndị Izrel.”

Na Hibru, “nwa otu nwoke obi kara.”

Ọ dị ihe dị ka mita 2.23 n’ogologo (amaụkwụ 7.3). Gụọ B14.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Okwu Hibru a sụgharịrị nnukwu jakị n’ebe a pụtara jakị nke nne ịnyịnya na oké jakị mụtara.

Ma ọ bụ “malite na Shaịhọ,” ya bụ, otu mpaghara Osimiri Naịl.

Ma ọ bụ “ebe e si abanye Hemat.”

O nwere ike ịbụ, “n’etiti.”

Pirez-ọza pụtara “Iwe E Wesara Ọza.”

Ma ọ bụ “obí eze.”

Bel-perezim pụtara “Onyeisi Ndị Na-akwada Ihe.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “na-echeta.”

O nwere ike ịbụ, “Kwuonụ gbasara ọrụ niile dị ebube ọ na-arụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “iwu o nyere.”

O nwere ike ịbụ, “Feenụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa nsọ.”

Ma ọ bụ “ala.”

Ma ọ bụ “eme ka ọ maa jijiji.”

Ma ọ bụ “ọ bịala.”

Ma ọ bụ “Ịhụnanya ya pụrụ iche.”

Ma ọ bụ “Malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”

Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ.”

Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”

Ma ọ bụ “n’obí.”

Ma ọ bụ “alaeze.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “alaeze.”

Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”

Na 2 Samuel 8:9, 10, a kpọrọ ya Toaị.

Na 2 Samuel 8:10, a kpọrọ ya Joram.

Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.

Na Hibru, “Eram-nehareyim.”

Na 2 Samuel 10:16, a kpọrọ ya Shobak.

Malkam nwere ike ịbụ arụsị ndị Amọn. E nwere ebe a kpọrọ ya Molek ma ọ bụ Milkọm.

Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”

Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.

O nwere ike ịbụ, “onye mmegide.”

Na Hibru, “ka o guzo n’agbata eluigwe na ụwa, jiri mma agha.”

Na Hibru, “Nye.”

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “isi akabeghịkwa ya.”

Na Hibru, “Ị wụfuola nnukwu ọbara.”

Na Hibru, “ị wụfuola nnukwu ọbara.”

Na Hibru, “ga-enwe ezumike.”

Aha a bụ́ Solomọn si n’okwu Hibru pụtara “Udo.”

Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “kee.”

A kpọrọ ya “Zaịza” n’amaokwu nke iri na otu.

Na Hibru, “ụmụnne.”

Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”

Na Hibru, “nne jakị.”

Ma ọ bụ “onye eze na-akọrọ ihe dị ya n’obi.”

Na Hibru, “wụfuokwa nnukwu ọbara.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “isi akabeghịkwa ya.”

Ma ọ bụ “obí eze.”

Ma ọ bụ “ụdị nkume ọ bụla pụrụ iche.”

Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.

Darik bụ mkpụrụ ego ndị Peshia e ji ọlaedo kpụọ. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”

Ma ọ bụ “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”

Ma ọ bụ “na-eme ihe ziri ezi.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya