Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Ekliziastis 1:1-12:14
  • Ekliziastis

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekliziastis
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ekliziastis

EKLIZIASTIS

1 Okwu onye mkpọkọta,+ nwa Devid, kwuru. Ọ bụ eze na Jeruselem.+

 2 Onye mkpọkọta kwuru, sị: “Ihe niile bụ nnọọ ihe efu!

Ihe niile bụ nnọọ ihe efu! E nweghị ihe nwere isi!”+

 3 Olee uru mmadụ na-erite n’ọrụ niile ọ gbara mbọ rụọ,

N’ọrụ niile ọ rụsiri ike n’ụwa?*+

 4 Otu ọgbọ na-agafe, ọgbọ ọzọ na-abịakwa,

Ma ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi.+

 5 Anyanwụ na-awa, anyanwụ na-adakwa;

Ọ na-emekwa ngwa ngwa laghachi n’ebe o si awa.+

 6 Ifufe na-efega n’ebe ndịda, ọ na-eferekwa gaa n’ebe ugwu;

Ọ na-efegharị otú ahụ n’akwụsịghị akwụsị; ya fere gbadaa, ya efere gbagoo.

 7 Iyi niile na-asọba n’oké osimiri, ma oké osimiri anaghị eju eju.+

Iyi ndị ahụ na-asọrọ laghachi n’ebe ha si ka ha wee sọpụta ọzọ.+

 8 Ihe niile na-agwụ ike.

E nweghịdị onye nwere ike ịkọwa ha.

Ike anaghị agwụ anya ịhụ ihe;

Ike anaghịkwa agwụ ntị ịnụ ihe.

 9 Ihe ndị dịbu adị bụ ihe ndị ga-adị,

Ihe ndị e meburu bụkwa ihe ndị a ga-eme ọzọ.

E nweghị ihe bụ́ ihe ọhụrụ n’ụwa.*+

10 È nwere ihe mmadụ ga-ekwu banyere ya, sị, “Lee ihe a, ọ bụ ihe ọhụrụ”?

Ihe ahụ dịbu adị kemgbe ogologo oge gara aga;

Ọ dị adị tupu oge anyị.

11 E nweghị onye na-echeta ndị oge gboo.

E nweghịkwa onye ga-echeta ndị a ka ga-amụ amụ.

Ndị a ka ga-emecha mụọ agaghịkwa echeta ha.+

12 Mụnwa, bụ́ onye mkpọkọta, bụ eze Izrel nke na-achị na Jeruselem.+ 13 M kpebiri iji amamihe mụọ ihe niile e merela n’ụwa*+ ma nyochaa ha,+ ya bụ, ọrụ ahụhụ Chineke nyere ndị mmadụ ka ha na-arụ.

14 M hụrụ ọrụ niile a na-arụ n’ụwa.*

Ma lee, ihe niile bụ ihe efu. Ha bụ ịchụ ifufe.+

15 A gaghị edozili ihe gbagọrọ agbagọ,

A gaghịkwa agụli ihe na-adịghị adị ọnụ.

16 M kwuziri n’obi m, sị: “Amatala m ihe nke ukwuu karịa onye ọ bụla bu m ụzọ bie na Jeruselem.+ Enwetala m amamihe dị ukwuu. Ihe m mụtara karịkwara akarị.”+ 17 M gbalịrị ka m ghọta ihe bụ́ mmadụ inwe amamihe, ihe bụ́ mmadụ izuzu nzuzu, na ihe bụ́ mmadụ ịdị iberiibe.+ Ma m chọpụtara na nke a bụkwa ịchụ ifufe.

18 N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ ma ihe nke ukwuu, ike ụwa ga-agwụ ya.

N’ihi ya, onye na-amụtakwu ihe na-akpatakwuru onwe ya obi ọjọọ.+

2 M kwuziri n’obi m, sị: “Ka m kporiwe ndụ,* ka m hụgodị ihe ọma ga-esi na ya pụta.” Ma lee, ọ bụkwa ihe efu.

 2 M kwuru banyere ịchị ọchị, sị, “Ọ bụ ara ọgbụgba!”

M kwukwara banyere ikpori ndụ,* sị, “Kedụ uru ọ bara?”

3 M ṅụwara nnukwu mmanya ka m mara ma ọ̀ bara uru.+ N’oge ahụ niile, uche ka kpakọrọ m ọnụ. M zuzudịrị nzuzu ka m wee chọpụta ihe kacha mma mmadụ kwesịrị ime n’ụbọchị ole na ole ọ ga-adị ndụ n’ụwa.* 4 M rụrụ nnukwu ọrụ dị iche iche.+ M rụụrụ onwe m ọtụtụ ụlọ.+ M kọọrọ onwe m ọtụtụ ubi vaịn.+ 5 M kọọrọ onwe m ọtụtụ ubi, rụọkwa ọmarịcha ogige dị iche iche. M kụkwara ụdị osisi niile na-amị mkpụrụ n’ime ha. 6 M rụụrụ onwe m ọdọ mmiri dị iche iche, ka mmiri wee si na ha na-ede ala* osisi dị iche iche juru mmiri. 7 M kpọtara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ka ha na-ejere m ozi.+ M nwekwara ndị na-eje ozi a mụrụ n’ụlọ m. M zụtakwara ọtụtụ anụ ụlọ, ya bụ, ehi na ìgwè ewu na atụrụ,+ karịa onye ọ bụla bu m ụzọ bie na Jeruselem. 8 M kpakọtaara onwe m ọlaọcha na ọlaedo,+ akụ̀ ndị eze na akụ̀ si n’ógbè dị iche iche.+ M kpọtara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ga na-abụrụ m abụ. M kpọkọọrọ onwe m ihe na-eme ụmụ nwoke ezigbo obi ụtọ, ya bụ, nwaanyị, ọtụtụ ụmụ nwaanyị. 9 Aghọrọ m onye ukwu, baakwa ọgaranya karịa onye ọ bụla bu m ụzọ bie na Jeruselem.+ M ka nwekwara amamihe m.

10 E nweghị ihe ọ bụla gụrụ m m na-enwetaghị.+ E nweghị ụdị ihe ọ bụla ga-eme m obi ụtọ m gbochiri onwe m inweta, n’ihi na m* ṅụrịrị ọṅụ maka ọrụ niile m na-arụsi ike. Ọ bụkwa ya bụ ụgwọ ọrụ m* maka ọrụ niile m na-arụsi ike.+ 11 Ma mgbe m chebaara ọrụ niile m rụrụ echiche, chebakwara ọrụ niile m gbalịsiri ike rụọ echiche,+ m hụrụ na ihe niile bụ ihe efu, na ha bụ ịchụ ifufe.+ E nweghị ihe ọ bụla bara ezigbo uru n’ụwa.*+

12 M bidoziri ichebara amamihe na nzuzu na iberiibe echiche.+ (Gịnị ka onye ga-anọchi eze ga-emeli? Ọ bụ naanị ihe e meburu eme.) 13 M wee hụ na amamihe bara uru karịa iberiibe,+ otú ahụ ìhè si baa uru karịa ọchịchịrị.

14 Anya onye ọ bụla nke ma ihe na-ahụ ụzọ nke ọma.*+ Ma onye nzuzu na-ejegharị n’ọchịchịrị.+ Amatakwala m na ọ bụ otu ihe na-eme* ha niile.+ 15 M wee kwuo n’obi m, sị: “Ihe na-eme onye nzuzu ga-emekwa m.”+ Oleezi uru m ritere na m ma ihe nke ukwuu? M sịziri n’obi m: “Ihe a bụkwa ihe efu.” 16 N’ihi na a gaghị echeta onye ma ihe na onye nzuzu ruo mgbe ebighị ebi.+ N’oge na-adịghị anya, a ga-echefu mmadụ niile. Oleekwa otú onye ma ihe ga-esi anwụ? Ọ ga-anwụ otú onye nzuzu si anwụ.+

17 M kpọziri ndụ asị+ maka na ihe niile a na-eme n’ụwa* na-agbawa m obi, n’ihi na ihe niile bụ ihe efu.+ Ha bụ ịchụ ifufe.+ 18 M kpọziri ihe niile m rụtara n’ọrụ m rụsiri ike n’ụwa* asị,+ n’ihi na m ga-ahapụrụ ya onye ga-anọchi m.+ 19 Ònye makwanụ ma ọ̀ ga-abụ onye ma ihe, ka ọ̀ ga-abụ onye nzuzu?+ Ma, ọ ga-eweghara ihe niile m gbasiri mbọ ike nweta, bụ́ ihe ndị m nwetara n’ụwa* maka na m ma ihe. Ihe a bụkwa ihe efu. 20 Obi wee malite ịda m mbà n’ihi ọrụ niile m rụsiri ike n’ụwa.* 21 N’ihi na mmadụ nwere ike iji amamihe na nkà o nwere nakwa ihe ọ mụtara rụsie ọrụ ike, ma ọ ga-enyefe ihe niile ọ rụtara n’aka onye na-arụghị ọrụ ọ bụla.+ Ihe a bụkwa ihe efu, ọ jọgbukwara onwe ya.*

22 Oleedị uru mmadụ na-erite n’ọrụ niile ọ na-arụsi ike nakwa n’ihe ọ na-achọsi ike, nke mere o ji na-arụsi ọrụ ike n’ụwa?*+ 23 N’ihi na ná ndụ ya niile, ọrụ ọ na-arụ na-akpasu ya iwe, na-agbawakwa ya obi.+ Obi anaghịdị ezu ya ike n’abalị.+ Ihe a bụkwa ihe efu.

24 E nweghị ihe dị mma karịa mmadụ iri ihe na ịṅụ mmanya na ikpori ndụ n’ihi ọrụ ọ na-arụsi ike.+ M chọpụtara na ihe a sikwa n’aka ezi Chineke,+ 25 n’ihi na a sị ka e kwuwe, ònye na-eri ihe ma na-aṅụ mmanya karịa m?+

26 Chineke na-enye onye na-eme ihe dị ya mma amamihe, na-emekwa ka ọ na-amụta ihe ma na-enwe obi ụtọ.+ Ma, ọ na-enye onye mmehie ọrụ ịchịkọta ihe na ikpokọta ihe, naanị ka o wee bunye ha onye na-eme ihe dị ezi Chineke mma.+ Ihe a bụkwa ihe efu. Ọ bụ ịchụ ifufe.

3 E nwere oge kwesịrị ekwesị maka ihe ọ bụla,

Ihe ọ bụla a na-eme n’ụwa* nwere oge:

 2 Oge a ga-amụ mmadụ na oge mmadụ ga-anwụ;

Oge ịkụ ihe na oge ifopụ ihe a kụrụ;

 3 Oge igbu egbu na oge ịgwọ agwọ;

Oge ịkwatu ihe na oge ịrụ ihe;

 4 Oge ibe ákwá na oge ịchị ọchị;

Oge ibe ákwá arịrị na oge ịgba egwú;*

 5 Oge ịtụfusị nkume na oge ịtụtụkọta nkume;

Oge ịmakụ mmadụ na oge a na-agaghị amakụ mmadụ;

 6 Oge ịchọ ihe na oge iwere na ihe efuola;

Oge idowe ihe na oge ịtụfu ihe;

 7 Oge ịdọka ihe+ na oge ịdụkọta ihe;

Oge ịgbachi nkịtị+ na oge ikwu okwu;+

 8 Oge ịhụ mmadụ n’anya na oge ịkpọ mmadụ asị;+

Oge agha na oge udo.

9 Olee uru onye ọrụ na-erite ná mbọ niile ọ na-agba?+ 10 Ahụla m ọrụ Chineke nyere ndị mmadụ ka ha na-arụ. 11 O mere ka ihe ọ bụla maa mma n’oge kwesịrị ekwesị.+ O medịrị ka ịdị ndụ ebighị ebi na-agụ ndị mmadụ agụụ.* Ma ha emekataghị chọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ malite n’isi ruo ná ngwụcha.

12 Aghọtala m na e nweghị ihe dị mma ha ga-eme karịa ịna-enwe obi ụtọ na ịna-eme ihe ọma n’oge ha dị ndụ+ 13 nakwa ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ mmanya ma na-enwe obi ụtọ n’ihi ọrụ niile ọ na-arụsi ike. Ọ bụ onyinye Chineke.+

14 Amatala m na ihe niile ezi Chineke na-eme ga-adịru mgbe ebighị ebi. E nweghị ihe mmadụ ga-etinye ma ọ bụ wepụ na ya. Ezi Chineke emeela ka ihe niile dịrị otú a, ka ndị mmadụ wee na-atụ egwu ya.+

15 Ihe ọ bụla merenụ emebuola, ihe ka ga-adị adịbuokwala.+ Ma ezi Chineke ga-eme ihe ndị mmadụ na-agbasi mbọ ike ka ha mee.*

16 Ahụkwala m ihe a n’ụwa:* Ajọ omume anọchiela ikpe ziri ezi, ajọ omume anọchiekwala ezi omume.+ 17 M wee kwuo n’obi m, sị: “Ezi Chineke ga-ekpe ma onye ezi omume ma onye ajọ omume ikpe,+ n’ihi na ihe ọ bụla a na-eme eme na ọrụ ọ bụla a na-arụ arụ nwere oge.”

18 M kwukwara n’obi m banyere ụmụ mmadụ, sị: Ezi Chineke ga-anwale ha, gosikwa ha na ha dị ka anụmanụ. 19 N’ihi na ọ bụ ihe na-eme* mmadụ na-emekwa anụmanụ. Otu ihe ahụ na-eme ha niile.+ Otú anụmanụ si anwụ ka mmadụ si anwụ. Ọ bụ otu ume ndụ ka ha niile na-eku.+ N’ihi ya, e nweghị ihe mmadụ ji kara anụmanụ, n’ihi na ihe niile bụ ihe efu. 20 Ha niile na-aga n’otu ebe.+ Ha niile si n’ájá,+ ha niile na-alaghachikwa n’ájá.+ 21 Ònye ma ma ume ndụ mmadụ ọ̀ na-agbago elu? Ònyekwa ma ma ume ndụ anụmanụ ọ̀ na-agbada n’ala?+ 22 M wee hụ na e nweghị ihe dị mma mmadụ ga-eme karịa inwe obi ụtọ+ n’ihi ọrụ ọ na-arụ maka na ọ bụ ya bụ ụgwọ ọrụ ya;* n’ihi na e nweghị onye nwere ike ime ka ọ hụ ihe ga-eme mgbe ọ na-anọghịzi.+

4 M chebakwaara mmegbu niile a na-emegbu ndị mmadụ n’ụwa* echiche. M hụrụ ka anya mmiri na-agba ndị a na-emegbu emegbu, ma e nweghị onye na-akasi ha obi.+ Ọ bụkwa ndị nọ n’isi na-emegbu ha, ma e nweghị onye na-akasi ha obi. 2 M wee kwuo na ndị nwụrụ anwụ ka ndị dị ndụ mma.+ 3 Ma onye ka ha abụọ mma bụ onye a na-amụbeghị amụ,+ onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ ndị a na-eme n’ụwa.*+

4 Ahụkwala m otú ndị mmadụ si na-agbasi mbọ ike ma jiri nkà na-arụ ọrụ ka ha wee gosi na ha ka ibe ha.+ Ihe a bụkwa ihe efu. Ọ bụ ịchụ ifufe.

5 Onye nzuzu na-anọ otu ebe kụkụwa aka ya, ndụ ya ana-ala n’iyi.*+

6 Mmadụ izurutụ ike dị mma karịa mmadụ ịrụgbu onwe ya n’ọrụ na ịchụ ifufe.+

7 M chebaara ihe ọzọ bụ́ ihe efu n’ụwa* echiche: 8 E nwere otu onye nọ naanị ya. E nweghị onye ya na ya nọ. O nweghị nwa ma ọ bụ nwanne. Ma ọ na-arụsi ọrụ ike mgbe niile. Akụnụba anaghị eju ya eju.+ Ma ọ̀ na-ajụ onwe ya, sị, ‘Ònye ka m na-arụrụ ọrụ a m na-arụsi ike ma ghara ịna-ekpori ndụ’?+ Ihe a bụkwa ihe efu, bụrụkwa ọrụ ahụhụ.+

9 Abụọ dị mma karịa otu+ n’ihi na a ga-akwụ ha ezigbo ụgwọ ọrụ maka ọrụ ha na-arụsi ike. 10 N’ihi na ọ bụrụ na otu onye n’ime ha adaa, onye nke ọzọ ga-enyere ya aka ka o bilie. Ma gịnị ga-eme ma otu onye daa mgbe a na-enweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilie?

11 Ọ bụrụkwa na mmadụ abụọ edinakọta ọnụ, ahụ́ ga-ekporo ha ọkụ. Ma, olee otú ahụ́ ga-esi kporo naanị otu onye ọkụ? 12 Otu onye nwere ike imeri onye nọ naanị ya, ma mmadụ abụọ gbakọrọ aka nwere ike imeri onye ahụ. Ụdọ e ji eriri atọ tụọ, a gaghị adọbili ya ngwa ngwa.

13 Nwata nke ma ihe ma bụrụ ogbenye ka eze nke mere agadi ma dị iberiibe mma,+ bụ́ onye na-anaghị anabata aka ná ntị a na-adọ ya maka na o nweghịzi uche.+ 14 N’ihi na o* si n’ụlọ mkpọrọ pụta ghọọ eze,+ n’agbanyeghị na ọ bụ ogbenye mgbe a mụrụ ya n’oge eze ahụ nke mere agadi na-achị.+ 15 M chebaara ndị niile dị ndụ echiche, bụ́ ndị na-ejegharị n’ụwa,* chebakwara otú ihe si agara nwata ahụ nke nọchiri eze ahụ echiche. 16 Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ndị na-akwado ya, e mechaa, ihe ya agaghị amasị ndị mmadụ.+ Ihe a bụkwa ihe efu. Ọ bụ ịchụ ifufe.

5 Mgbe ọ bụla ị na-aga n’ụlọ ezi Chineke, kpachara anya.+ Ọ ka mma ịga gee ntị n’ihe a na-ekwu,+ kama ịchụ àjà otú ndị nzuzu na-achụ,+ n’ihi na ha amaghị na ihe ha na-eme bụ ihe ọjọọ.

2 Abụla onye ọ na-adị ngwa ngwa ikwu okwu, ekwukwala okwu n’ihu ezi Chineke n’echeghị echiche,+ n’ihi na ezi Chineke nọ n’eluigwe, ma ị nọ n’ụwa. Ọ bụ ya mere na i kwesịghị ikwu ọtụtụ okwu.+ 3 N’ihi na ọ bụ ọtụtụ ihe mmadụ na-eche na-eme ka ọ rọwa nrọ,+ ọ bụkwa ekwurekwu na-eme ka a nụ olu onye nzuzu.+ 4 Mgbe ọ bụla i kwere Chineke nkwa, egbula oge imezu ya,+ n’ihi na ihe ndị nzuzu anaghị amasị ya.+ Mezuo nkwa i kwere.+ 5 Ọ ka mma na i kweghị nkwa kama ị ga-ekwe nkwa ma ghara imezu ya.+ 6 Ekwela ka ọnụ gị mee ka i* mehie,+ ekwukwala n’ihu mmụọ ozi* na i mere ya n’amaghị ụma.+ Gịnị mere ị ga-eji kwuo ihe ga-akpasu ezi Chineke iwe, nke ga-eme ka ọ laa ọrụ aka gị n’iyi?+ 7 N’ihi na otú ahụ ọtụtụ ihe mmadụ na-eche si eme ka ọ rọwa nrọ,+ ka ekwurekwu sikwa eme ka mmadụ na-ekwu ihe na-enweghị isi. Kama, tụọ egwu ezi Chineke.+

8 Ọ bụrụ na ị hụ ka a na-emegbu ogbenye, hụkwa ka a na-ekpe ikpe na-ezighị ezi ma na-eme ihe ọjọọ n’ógbè unu, ya ejula gị anya.+ N’ihi na onye ka onyeisi ahụ na-ahụ ihe onyeisi ahụ na-eme, e nwekwara ndị ọzọ ka ha elu.

9 A na-ekere ha niile ihe ala na-emepụta. Ọ bụkwa n’ubi ka e si enweta ihe a na-enye eze.+

10 Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, akụ̀ agaghịkwa eju onye hụrụ akụnụba n’anya afọ.+ Ihe a bụkwa ihe efu.+

11 Akụnụba hikwuo nne, ndị na-eri ya na-adịkwu ọtụtụ.+ Olee uru ọ baara onye nwe ya, ma ọ́ bụghị naanị ịnọ na-ele ya anya?+

12 Ụra onye na-eje ozi na-atọ ya ụtọ, ma ihe ọ na-eri ò buru ibu ma ò pere mpe. Ma ọtụtụ ihe ọgaranya nwere anaghị ekwe ya rahụ ụra.

13 E nwere ihe jọgburu onwe ya* m hụrụla n’ụwa:* akụnụba mmadụ kpakọtara dowe kpataara ya nsogbu. 14 Akụnụba ahụ lara n’iyi maka na ahịa ọ zụrụ ghọrọ ya ahịa. Mgbe onye ahụ mụtaziri nwa, e nweghịzi ihe o nwere.+

15 Otú ahụ mmadụ na-agba aka* si n’afọ nne ya pụta, ka ọ ga-agba aka laa.+ E nweghịkwa ihe ọ bụla ọ ga-ewere laa n’agbanyeghị ọrụ niile ọ rụsiri ike.+

16 Ihe a jọgbukwara onwe ya:* Otú mmadụ dị mgbe a mụrụ ya ka ọ ga-adị laa. Oleekwanụ uru onye nọ na-agbasi mbọ ike na-achụ ifufe ritere?+ 17 Kwa ụbọchị, obi anaghị adị ya mma,* ike ụwa na-agwụkwa ya. Ọ na-arịa ọrịa, iwe na-ejukwa ya obi.+

18 Ahụrụ m na ihe a kwesịrị ekwesị ma dị mma: na mmadụ kwesịrị iri ihe, ṅụọ mmanya ma na-enwe obi ụtọ maka ọrụ niile ọ na-arụsi ike+ n’ụwa* n’ụbọchị ole na ole ezi Chineke nyere ya ka o bie ndụ, n’ihi na ọ bụ ya bụ ụgwọ ọrụ ya.*+ 19 Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na ezi Chineke enye mmadụ akụnụba+ ma mee ka onye ahụ nwee ike iri ya, onye ahụ kwesịrị ịnara ụgwọ ọrụ ya* ma na-enwe obi ụtọ n’ihi ọrụ ọ na-arụsi ike. Ihe a bụ onyinye Chineke.+ 20 N’ihi na ọ gaghịdị ama* na ụbọchị ndụ ya na-agwụ n’ike n’ike, maka na ezi Chineke na-eme ka aṅụrị ju ya obi.+

6 E nwere ihe ọzọ dị njọ* m hụrụla n’ụwa,* ọ na-emekarịkwa ndị mmadụ: 2 Ezi Chineke na-enye mmadụ akụnụba, meekwa ka a na-akwanyere ya ùgwù, nke mere na onye ahụ na-enweta ihe ọ bụla gụrụ ya. Ma ezi Chineke anaghị eme ka o nwee ike iri ya, kama onye ọzọ nwere ike iri ya. Ihe a bụ ihe efu, ọ jọgbukwara onwe ya. 3 Ọ bụrụ na mmadụ amụọ otu narị ụmụ, bie ndụ ọtụtụ afọ, kaakwa nká, ma o kporighị ndụ tupu ya abanye n’ili, m ga-asị na nwa nwụrụ n’ime afọ nne ya ka ya mma.+ 4 Ọmụmụ a mụrụ nwa ahụ bụ n’efu. Ọ dịkwa ka à ga-asị na ọ nwụrụ n’ọchịchịrị, o nweghịkwa aha. 5 Ọ bụ eziokwu na ọ hụghị anyanwụ, e nweghịkwa ihe ọ ma, ma ọ ka onye nke ọzọ mma.*+ 6 Olee uru ọ baara mmadụ na ọ dị ndụ ruo puku afọ abụọ (2,000), ma o kporighị ndụ? Ọ̀ bụ na ọ bụghị otu ebe ka mmadụ niile na-aga?+

7 Ọrụ niile mmadụ na-arụsi ike bụ ka ọ kpata ihe afọ ga-eri;+ ma afọ anaghị eju ya eju. 8 N’ihi na olee ihe onye ma ihe ji kara onye nzuzu mma?+ Ma ọ bụ, olee uru ọ bara na ogbenye ma otú ọ ga-esi na-edi nsogbu ndị na-abịara ya? 9 Ọ ka mma na mmadụ ji ihe ndị ọ na-ahụ anya na-eme onwe ya obi ụtọ kama ịchọgharịwa ihe na-agụ ya agụụ ọ na-enweghị ike inweta. Ihe a bụkwa ihe efu. Ọ bụ ịchụ ifufe.

10 A kpọbuola ihe ọ bụla dị adị aha. A matakwala ihe mmadụ bụ. Mmadụ enweghị ike ịrụ onye ka ya ike ụka. 11 Ekwurekwu na-eme ka mmadụ na-ekwu ihe na-enweghị isi.* Oleekwanụ uru ọ baara mmadụ? 12 Ònye ma ihe kacha mma mmadụ ga-eme n’ime ụbọchị ole na ole ọ ga-adị ndụ ya na-enweghị isi, nke na-agafe ngwa ngwa ka onyinyo?+ N’ihi na e nweghị onye nwere ike ịgwa mmadụ ihe ga-eme n’ụwa* mgbe ọ na-anọghịzi.

7 Ezigbo aha ka ezigbo mmanụ mma,+ ụbọchị mmadụ nwụrụ kakwa ụbọchị a mụrụ ya mma. 2 Ọ dị mma ịga n’ebe a na-eru uju karịa ịga n’ebe a na-eri oriri,+ n’ihi na mmadụ niile na-anwụ anwụ, ndị dị ndụ kwesịkwara iburu ya n’obi. 3 Ọ ka mma na obi adịghị mmadụ mma karịa na mmadụ na-achị ọchị,+ n’ihi na ihe iwute mmadụ na-eme ka mmadụ mezie ndụ ya.+ 4 Obi ndị ma ihe na-adị n’ebe a na-eru uju, ma obi ndị nzuzu na-adị n’ebe a na-aṅụrị ọṅụ.*+

5 Ọ kaara mmadụ mma ige ntị ná mba onye ma ihe na-abara ya+ kama ige ntị n’abụ ndị nzuzu na-abụ. 6 N’ihi na ọchị onye nzuzu na-ada ụda ka ogwu nke na-ere ọkụ n’okpuru ite.+ Ihe a bụkwa ihe efu. 7 Ma mmegbu nwere ike ime ka onye ma ihe mewe ara ara, aka azụ* na-emebikwa obi mmadụ.+

8 Njedebe okwu dị mma karịa mmalite ya. Ọ ka mma inwe ndidi kama ịdị mpako.+ 9 Ekwela ka iwe na-ewe gị ọsọ ọsọ,+ n’ihi na ọ bụ ndị nzuzu na-ewe iwe ọsọ ọsọ.+

10 Asịla, “Gịnị mere oge gara aga ji ka oge a mma?” n’ihi na ị jụọ ajụjụ a, ị naghị egosi na ị ma ihe.+

11 Ọ bụrụ na onye ma ihe eketa akụnụba, ọ bụ ihe dị mma, ọ bakwaara ndị dị ndụ uru. 12 N’ihi na amamihe na-echebe mmadụ,+ ego na-echebekwa mmadụ.+ Ma uru mmadụ ịma ihe bara bụ na amamihe na-echebe onye nwere ya ndụ.+

13 Chebara ihe ezi Chineke na-arụ echiche, n’ihi na ònye nwere ike ịgbatị ihe o mere ka ọ gbagọọ agbagọọ?+ 14 N’ụbọchị ihe ọma mere, chebara ihe ọma merenụ echiche.+ Ma n’ụbọchị ihe ọjọọ mere,* cheta na ọ bụ Chineke kwere ka e nwee ụbọchị ọma na ụbọchị ọjọọ,+ ka ndị mmadụ wee ghara ịmata ihe ga-eme ha n’ọdịnihu.+

15 Ná ndụ a na-enweghị isi m dị,+ ahụla m ihe niile, ma onye ezi omume nke na-ala n’iyi maka na ọ na-eme ezi omume+ ma onye ajọ omume nke na-adịte ndụ aka n’agbanyeghị na ọ na-eme ajọ omume.+

16 Abụla onye oké ezi omume,+ abụkwala onye oké amamihe.+ Gịnị mere ị ga-eji laa onwe gị n’iyi?+ 17 Abụla onye ajọ omume gafee ókè, abụkwala onye nzuzu.+ Gịnị mere ị ga-eji nwụchuo ọnwụ?+ 18 Ọ kacha mma ka ị nabata ndụmọdụ abụọ a. Ajụla nke ọ bụla n’ime ha;+ n’ihi na onye na-atụ egwu Chineke ga-anabata ha abụọ.

19 Amamihe na-eme ka onye ma ihe sie ike karịa ụmụ nwoke iri siri ike e nwere n’obodo.+ 20 N’ihi na e nweghị onye ezi omume nọ n’ụwa nke na-eme naanị ihe dị mma, nke na-anaghịkwa emehie.+

21 Etinyekwala obi gị n’ihe niile ndị mmadụ na-ekwu;+ ma ọ́ bụghị ya, i nwere ike ịnụ ka onye na-ejere gị ozi na-akpọ gị iyi;* 22 n’ihi na ị ma n’ime obi gị na gịnwa akpọọla ndị ọzọ iyi ọtụtụ ugboro.+

23 M ji amamihe m nwere chebara ihe a niile echiche. M wee sị: “M ga-ama ihe.” Ma ọ karịrị m. 24 Ihe ndị merela ekweghị anyị nghọta, ha dịkwa nnọọ omimi. Ònye ga-aghọtali ha?+ 25 M kpebiri ịmata na inyocha na ịchọpụta ihe bụ́ amamihe nakwa ihe mere ihe dị iche iche ji eme. M kpebikwara ịghọta àgwà ọjọọ ndị nzuzu na-akpa na àgwà iberiibe ndị na-eme ara ara na-akpa.+ 26 M chọpụtaziri ihe a: Nwaanyị nke dị ka ọnyà,* nke obi ya dị ka ụgbụ azụ̀, nke aka ya dịkwa ka ịga a na-atụ ndị mkpọrọ, ka ọnwụ njọ.* Onye na-eme ihe dị ezi Chineke mma agaghị adaba n’aka nwaanyị ahụ,+ ma nwaanyị ahụ ga-ejide onye mmehie.+

27 Onye mkpọkọta kwuru, sị: “Lekwa ihe m chọpụtara.+ M chebaara ihe dị iche iche echiche tupu mụ ekwuwe ihe a, 28 ma achọtabeghị m ihe m nọ na-achọ. N’ime otu puku mmadụ, m chọtara naanị otu nwoke bụ́ onye ezi omume, ma achọtaghị m otu nwaanyị n’ime ha. 29 Naanị otu ihe a ka m chọpụtara: Ezi Chineke kere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ezi omume,+ ma ha echepụtala ihe dị iche iche.”+

8 Ònye ka a ga-eji tụnyere onye ma ihe? Ònye ma otú e si edozi nsogbu? Amamihe na-eme ka mmadụ na-agbasapụ ihu, ọ na-emekwa ka onye ahụ ghara ịna-agbarụ ihu.

2 M sịrị: “Debe iwu eze+ n’ihi iyi ị ṅụrụ n’ihu Chineke.+ 3 Emela ọsọ ọsọ ka i si n’ihu ya pụọ.+ Etinyela aka n’ihe ọjọọ;+ n’ihi na o nwere ike ime ihe ọ bụla masịrị ya, 4 maka na a naghị agbagha okwu eze agbagha.+ Ònye nwere ike ịsị ya: ‘Gịnị ka ị na-eme?’”

5 E nweghị ihe ọjọọ ga-eme onye na-edebe iwu.+ Onye ma ihe ga-amakwa oge ọ ga-eji eme ihe ọ bụla nakwa otú ọ ga-esi eme ya.+ 6 Ihe ọ bụla nwere oge nakwa otú e si eme ya,+ n’ihi na nsogbu ndị na-abịara ndị mmadụ karịrị akarị. 7 Ebe ọ bụ na e nweghị onye ma ihe ga-eme, ònye nwere ike ikwu otú ihe ga-esi eme?

8 Otú ahụ a na-enweghị mmadụ ume ndụ* dị n’aka, ka a na-enweghị mmadụ ụbọchị ọnwụ dị n’aka.+ Otú ahụ a na-enweghị onye agha a na-ekwe ka ọ laa n’oge agha, ka ajọ omume na-anaghị ekwe ka ndị na-eme ihe ọjọọ gbanahụ ihe ha metara.

9 M hụrụ ihe a niile, m wee jiri obi m niile chebara ọrụ niile a rụrụla n’ụwa* echiche, n’oge mmadụ nọ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.+ 10 M wee hụ ka a na-eli ndị ajọ omume, ndị na-abanyebu n’ebe dị nsọ ma na-apụta. Ma, e chefuru ha ọsọ ọsọ n’obodo ebe ha nọ na-eme ajọ omume.+ Ihe a bụkwa ihe efu.

11 Obi na-esi ndị mmadụ ike ime ihe ọjọọ+ maka na a naghị eme ndị mere ihe ọjọọ ihe e kwesịrị ime ha ozugbo.+ 12 Ọ bụ eziokwu na onye mmehie nwere ike ime ihe ọjọọ otu narị ugboro, dịteekwa ndụ aka, ma ama m na ihe ga-agaziri ndị na-atụ egwu ezi Chineke maka na ha na-atụ egwu ya.+ 13 Ma ihe agaghị agaziri onye ajọ omume,+ ọ gaghịkwa emeli ka ụbọchị ndụ ya, nke na-agafe ngwa ngwa ka onyinyo, dị ogologo,+ maka na ọ naghị atụ egwu Chineke.

14 E nwere ihe efu* na-eme n’ụwa: E nwere ndị ezi omume a na-emeso ka à ga-asị na ha mere ihe ọjọọ,+ e nwekwara ndị ajọ omume a na-emeso ka à ga-asị na ha mere ihe dị mma.+ Ana m asị na ihe a bụkwa ihe efu.

15 N’ihi ya, ana m asị na inwe obi ụtọ dị mma,+ n’ihi na e nweghị ihe dị mma mmadụ ga-eme n’ụwa karịa iri ihe na ịṅụ mmanya na inwe obi ụtọ. O kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ mgbe ọ na-arụsi ọrụ ike n’oge niile+ ezi Chineke mere ka ọ dịrị ndụ n’ụwa.*

16 M gbalịrị ka m mara ihe nakwa ka m hụ ihe niile a na-eme* n’ụwa.+ Anaghịdị m ehi ụra* ma n’ehihie ma n’abalị. 17 M wee chebara ọrụ niile ezi Chineke na-arụ echiche ma chọpụta na ndị mmadụ enweghị ike ịghọta ihe na-eme n’ụwa.*+ Otú ọ sọkwara ha gbalịa, ha enweghị ike ịghọta ya. Ọ bụrụgodị na ha na-asị na ha ma ihe, ha enweghị ike ịghọta ya n’eziokwu.+

9 M chebaara ihe a niile echiche wee kwuo na ndị ezi omume na ndị ma ihe nakwa ọrụ ha na-arụ dị n’aka ezi Chineke.+ Ndị mmadụ amaghị otú ndị dịrị ndụ tupu hanwa hụruru ibe ha n’anya nakwa otú ha kpọruru ibe ha asị. 2 Ọ bụ otu ihe na-eme* mmadụ niile,+ ma onye ezi omume ma onye ajọ omume,+ ma ezigbo mmadụ ma onye dị nsọ ma onye na-adịghị nsọ, ma ndị na-achụ àjà ma ndị na-anaghị achụ àjà. Otú ọ dị ezigbo mmadụ ka ọ dị onye mmehie. Otú ọ dị onye na-aṅụ iyi ka ọ dịkwa onye na-anaghị achọ ịṅụ iyi. 3 Ihe a bụ ihe na-agbawa obi nke na-eme n’ụwa:* Ebe ọ bụ otu ihe na-eme* mmadụ niile,+ ihe juru n’obi ndị mmadụ bụ ihe ọjọọ. Ihe dị ha n’obi n’oge ha dị ndụ bụ nzuzu, ha na-emechakwa nwụọ.

4 Onye ọ bụla dị ndụ nwere olileanya, n’ihi na nkịta dị ndụ ka ọdụm nwụrụ anwụ mma.+ 5 N’ihi na ndị dị ndụ ma na ha ga-anwụ,+ ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla.+ E nweghị ụgwọ ọrụ ọzọ ha nwere, n’ihi na e chefuola ihe niile banyere ha.+ 6 Ha enweghịkwa ike ịhụ mmadụ n’anya ma ọ bụ ịkpọ mmadụ asị ma ọ bụ imere mmadụ anyaụfụ. E nweghịzi ihe a na-eme n’ụwa* ha so eme.+

7 Gaa jiri obi ụtọ rie nri gị, jirikwa obi ụtọ ṅụọ mmanya gị,+ maka na ọrụ gị dị ezi Chineke mma.+ 8 Ka uwe gị na-enwu gbaa* mgbe niile, ka mmanụ gharakwa ịkọ n’isi gị.+ 9 Ka gị na nwunye gị ị hụrụ n’anya+ kporie ndụ n’ụbọchị niile na-enweghị isi Chineke mere ka ị dị ndụ n’ụwa,* bụ́ ụbọchị niile na-enweghị isi ị dị ndụ, n’ihi na ọ bụ ihe i ketara ná ndụ, bụrụkwa ụgwọ ọrụ gị maka ọrụ ị na-arụsi ike n’ụwa.*+ 10 Ihe ọ bụla i nwere ike ime, jiri ike gị niile mee ya, n’ihi na i nweghị ike ịrụ ọrụ ma ọ bụ ime atụmatụ ma ọ bụ ịmụta ihe ma ọ bụ ịma ihe n’ili,*+ bụ́ ebe ị na-aga.

11 Ihe ọzọ m hụrụ nke na-eme n’ụwa* bụ na ọ bụghị mgbe niile ka ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ. Ọ bụghị mgbe niile ka ndị dike na-emeri n’agha.+ Ọ bụghị mgbe niile ka ndị ma ihe na-enweta ihe oriri. Ọ bụghị mgbe niile ka ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ na-akpata akụnụba.+ Ọ bụghịkwa ndị mụtara ihe ka ihe na-agaziri mgbe niile,+ n’ihi na ọdachi* na-abịara ha niile n’oge a na-atụghị anya ya. 12 N’ihi na mmadụ amaghị oge ihe ọjọọ ga-abịara ya.+ Otú ahụ ụgbụ si ejide azụ̀, ọnyà ana-amakwa nnụnụ, ka mmadụ si abanye ná nsogbu n’oge ọdachi dakwasịrị ya, mgbe ọ dakwasịrị ya na mberede.

13 E nwekwara ihe m hụrụ n’ụwa* gbasara amamihe. Ihe a masịrị m: 14 E nwere otu obere obodo mmadụ ole na ole bi na ya. Otu eze siri ike bịara iluso obodo a ọgụ. Ọ gbara ya gburugburu ma rụọ mgbidi dị elu ọ ga-eji nọchibido ya. 15 E nwere otu nwoke ma ihe bi n’obodo a, ma ọ bụ ogbenye. O ji amamihe o nwere napụta obodo a. Ma e nweghị onye chetara ogbenye a.+ 16 M gwaziri onwe m, sị: ‘Mmadụ ịma ihe dị mma karịa mmadụ isi ike.+ Ma a naghị eji amamihe ogbenye akpọrọ ihe, a naghịkwa eme ihe o kwuru.’+

17 Ọ ka mma mmadụ ime ihe onye ma ihe weturu obi kwuo kama ime ihe onye na-achị ndị nzuzu tiri ná mkpu.

18 Amamihe ka ngwá agha mma, ma naanị otu onye mmehie nwere ike imebi ọtụtụ ihe ọma.+

10 Otú ahụ ijiji nwụrụ anwụ si emebi mmanụ na-esi ísì ọma, ya esiwezie ísì ọjọọ, ka obere nzuzu mmadụ zuzuru si eme ka e werezie ya ka onye na-amaghị ihe, meekwa ka a kwụsị ịkwanyere ya ùgwù.+

2 Obi onye ma ihe na-eduga ya n’ezigbo ụzọ,* ma obi onye nzuzu na-eduga ya n’ụzọ ọjọọ.*+ 3 Ebe ọ sọkwara onye nzuzu ya gaa, ọ naghị enwe uche.+ Ọ na-emekwa ka mmadụ niile mata na ọ bụ onye nzuzu.+

4 Ọ bụrụ na onye na-achị achị ewesa gị iwe ọkụ, esila n’ebe ị nọ pụọ,+ n’ihi na ịnọ nwayọọ na-eme ka mmehie e mere ghara ịdị oké njọ.+

5 E nwere ihe na-ewute ewute m hụrụla n’ụwa,* ihe na-adịghị mma ndị na-achị achị na-eme:+ 6 A na-ebugo ndị nzuzu n’ọkwá, ma a na-ahapụ ndị ọgaranya* n’ọkwá dị ala.

7 Ahụla m ka ndị ohu nọ n’elu ịnyịnya, ma ndị isi ejiri ụkwụ na-aga ka ndị ohu.+

8 Onye na-egwu olulu nwere ike ịdaba n’ime ya.+ Agwọ nwekwara ike ịta onye na-akụpu mgbidi e ji nkume rụọ.

9 Nkume nwere ike imerụ onye na-awa nkume ahụ́. Nkụ nwekwara ike imerụ onye na-awa nkụ ahụ́.*

10 Ọ bụrụ na ngwá ọrụ anyụọ nkọ, ma onye ji ya arụ ọrụ amụghị ya, ọ ga-arụgbu onwe ya n’ọrụ. Ma, amamihe na-enyere mmadụ aka ka ihe gaziere ya.

11 Ọ bụrụ na agwọ ataala mmadụ tupu e jiri ọgwụ rata agwọ ahụ, e nweghịzi uru onye ji ọgwụ arata agwọ bara.

12 Ihe onye ma ihe ji ọnụ ya ekwu na-eme ka ihe ya masị ndị mmadụ,+ ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya ala onwe ya n’iyi.+ 13 Okwu mbụ na-esi ya n’ọnụ apụta bụ okwu nzuzu,+ okwu ikpeazụ na-esi ya n’ọnụ apụta bụ okwu onye ara, nke na-akpata nsogbu. 14 Okwu na-adị onye nzuzu n’ọnụ mgbe niile.+

Mmadụ anaghị ama ihe ga-emenụ. Ònye ga-akọrọ ya ihe ga-eme mgbe ọ na-anọghịzi?+

15 Ọrụ onye nzuzu na-arụsi ike na-eme ka ike gwụ ya, n’ihi na ọ maghịdị otú ọ ga-esi achọta ụzọ ọ ga-esi aga n’obodo.

16 Ọ bụrụ na eze obodo bụ nwatakịrị,+ ndị isi obodo amalitekwa n’isi ụtụtụ na-eri oriri, nnukwu nsogbu ga-adị n’obodo ahụ. 17 Ndị obodo na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na eze ha bụ nwa ndị a ma ama, ndị isi obodo ana-erikwa nri n’oge kwesịrị ekwesị ka ha wee nweta ume, ọ bụghị ka ha ṅụfee mmanya ókè.+

18 Ọ bụrụ na mmadụ dị umengwụ, osisi ndị e ji kụọ elu ụlọ ya ga-adakasị, ụlọ ya ga na-ehikwa mmiri maka na ọ na-anọ nkịtị.+

19 Nri na-eme ka mmadụ na-achị ọchị, mmanya na-emekwa ka ndụ na-atọ mmadụ ụtọ.+ Ma ego na-egbo mkpa niile.+

20 Akpọla eze iyi,* akpọdịla ya iyi n’obi gị.*+ Anọkwala n’ime ụlọ gị kpọọ ọgaranya iyi; n’ihi na nnụnụ nwere ike ime ka a nụ ihe i kwuru, anụ na-efe efe nwekwara ike ikwughachi ihe i kwuru.

11 Tụpụ* achịcha gị n’elu mmiri,+ n’ihi na ị ga-ahụ ya ọzọ ma ọtụtụ ụbọchị gachaa.+ 2 Nye mmadụ asaa ma ọ bụ mmadụ asatọ ihe,+ n’ihi na ị maghị ọdachi ga-adakwasị ndị bi n’ụwa.

3 Ọ bụrụ na mmiri erujuo n’ígwé, ọ ga-ezosi ike n’ụwa. Ọ bụrụkwa na osisi adaa n’ebe ndịda ma ọ bụ n’ebe ugwu, osisi ahụ ga-atọgbọrọ n’ebe ọ dara.

4 Onye na-ele ifufe anya agaghị agha mkpụrụ, onye na-elekwa ígwé ojii anya agaghị ewe ihe ubi.+

5 Otú ahụ ị na-amaghị otú ume ndụ* si arụ ọrụ n’ọkpụkpụ nwa e bu n’afọ,+ ka ị na-amaghị ọrụ ezi Chineke, onye na-eme ihe niile, na-arụ.+

6 Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, akwụsịkwala ịrụ ọrụ* ruo ná mgbede;+ n’ihi na ị maghị nke ga-eme nke ọma, ma ọ̀ bụ nke a ma ọ̀ bụ nke ọzọ ma ọ̀ bụkwanụ ma ha abụọ hà ga-emecha nke ọma.

7 Ìhè amaka, mmadụ ịhụ anyanwụ dịkwa mma. 8 Ọ bụrụ na ọ dabaara mmadụ ịdịte ndụ aka, ya kporiwe ndụ n’ụbọchị niile ọ dị ndụ.+ Ma ya chetakwa na ụbọchị ọchịchịrị ga-agba nwere ike ịdị ọtụtụ. Ihe niile ga-emecha mee bụ ihe efu.+

9 Nwa okorobịa, ṅụrịa ọṅụ n’oge ị bụ okorobịa, nweekwa obi ụtọ n’oge ị na-eto eto. Mee ihe ndị dị gị n’obi, gaakwa ebe ọ bụla dị mma n’anya gị. Ma, mara na ezi Chineke ga-ekpe gị ikpe maka ihe niile a.+ 10 N’ihi ya, ihe ọ bụla ga-akpatara gị nsogbu, wepụ ya n’obi gị, wepụkwa ya n’ahụ́ gị, n’ihi na oge okorobịa na oge ike ka juru mmadụ n’ahụ́ bụ ihe efu.+

12 Cheta Onye Ukwu kere gị n’oge ị na-eto eto,+ tupu oge nsogbu eruo,+ tupu gị anọruo mgbe ị ga-asị: “Ndụ anaghị atọ m ụtọ”; 2 tupu anyanwụ na ìhè na ọnwa na kpakpando agbaa ọchịchịrị,+ mmiri erujuokwa ma zoo mgbe nnukwu mmiri ka zochara; 3 tupu ndị na-eche ụlọ nche amawa jijiji, ụmụ nwoke siri ike ehuru ehuru, ụmụ nwaanyị na-egwe nri akwụsị igwe nri maka na ha dịzi ole na ole, anya agbaakwa ụmụ nwaanyị ndị na-elepụ anya na windo ọchịchịrị;+ 4 tupu oge a ga-emechi ọnụ ụzọ e si abanye n’okporo ámá, mgbe nkume e ji egwe nri na-anaghịzi adapụta ụda nke ọma, mgbe ubé nnụnụ ga na-akpọte gị n’ụra, mgbe olu ụmụ nwaanyị niile na-abụ abụ na-anaghịzi adapụta ụda.+ 5 N’oge ahụ, ihe dị elu ga na-atụ gị egwu, ihe na-emenye ụjọ adịrịkwa n’okporo ámá. Osisi almọnd ga-ama ifuru,+ ụkpara adọkpụrụ onwe ya na-aga, mkpụrụ osisi kepa* agbawaakwa, n’ihi na mmadụ na-aga n’ụlọ ya nke ọ ga-ebite aka,+ ndị na-eru uju ana-agagharịkwa n’okporo ámá;+ 6 tupu e wepụ ụdọ ọlaọcha, tupu a kụrie efere ọlaedo, tupu a kụwaa ite dị n’isi mmiri, tupu e gwepịakwa ihe a rụnyere n’olulu mmiri e ji esepụta mmiri. 7 Ájá ewee laghachi n’ala,+ bụ́ ebe ọ dịbu, ume ndụ* alaghachikwuru ezi Chineke onye nyere ya mmadụ.+

8 Onye mkpọkọta+ kwuru, sị, “Ihe niile bụ nnọọ ihe efu! E nweghị ihe nwere isi.”+

9 Ọ bụghị naanị na onye mkpọkọta ma ihe, kama ọ na-akụzikwara ndị mmadụ ihe ọ ma n’oge niile.+ O chere echiche ma leba ihe dị iche iche anya nke ọma ka o wee dee* ọtụtụ ilu.+ 10 Onye mkpọkọta gbara mbọ chọta okwu ndị dị ụtọ+ ma dee okwu ndị e ji n’aka na ha bụ eziokwu.

11 Okwu ndị ma ihe dị ka ndụdụ e ji achị ehi,+ okwu ndị ha leziri anya kwuo dịkwa ka ntu a kụmiri akụmi. Okwu ndị ahụ si n’ọnụ otu onye na-azụ atụrụ. 12 Nwa m, m na-adọ gị aka ná ntị gbasara ihe ọ bụla na-esoghị n’ihe ndị a m kwuru: E nweghị mgbe ndị mmadụ ga-akwụsị ide ọtụtụ akwụkwọ ha na-ede, ike ga-agwụkwa ndị ji oge ha niile na-agụ ha niile.+

13 Ihe bụ́ isi n’ihe niile e kwuru bụ: Tụọ egwu ezi Chineke,+ debekwa iwu ya,+ n’ihi na ọ bụ ihe kacha mkpa mmadụ kwesịrị ime.+ 14 N’ihi na ezi Chineke ga-ekpe ndị mmadụ ikpe maka ihe niile ha na-eme, ma ihe ọ bụla zoro ezo, ka o wee kpebie ma ọ̀ bụ ihe ọma ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ.+

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ma ọ bụ “ṅụrịwa ọṅụ.”

Ma ọ bụ “ịṅụrị ọṅụ.”

Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”

Ma ọ bụ “ọhịa.”

Na Hibru, “obi m.”

Ma ọ bụ “òkè m.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ma ọ bụ “meghere emeghe.” Na Hibru, “dị ya n’isi.”

Ma ọ bụ “na-adabara.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ma ọ bụ “bụrụkwa nnukwu ọdachi.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”

Na Hibru, “ịwụli elu.”

Na Hibru, “O tinyedịrị mgbe ebighị ebi n’obi ha.”

Ma ọ bụ “ezi Chineke ga-achọ ihe a nọ na-achụ.” O nwere ike ịbụ, “ezi Chineke ga-achọ ihe ndị gaferela agafe.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwu.”

Ma ọ bụ “na-adabara.”

Ma ọ bụ “òkè ya.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “na-eri anụ onwe ya.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

O nwere ike ịbụ nwata ahụ ma ihe ka a na-ekwu.

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “ahụ́ gị.”

Ma ọ bụ “onye ozi.”

Ma ọ bụ “nnukwu ọdachi.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “na-agba ọtọ.”

Ma ọ bụ “bụkwa nnukwu ọdachi.”

Na Hibru, “ọ na-eri nri n’ọchịchịrị.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ma ọ bụ “òkè ya.”

Ma ọ bụ “òkè ya.”

Ma ọ bụ “echeta.”

Ma ọ bụ “ọdachi ọzọ.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “o nwere ezumike karịa onye nke ọzọ.”

O nwere ike ịbụ, “Inwekwu ọtụtụ ihe na-emekwu ka ndụ mmadụ bụrụ ihe efu.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ma ọ bụ “n’ebe a na-achị ọchị.”

Ma ọ bụ “ngarị.”

Ma ọ bụ “n’ụbọchị ọdachi.”

Na Hibru, “na-abụ gị ọnụ.”

Ma ọ bụ “ụgbụ e ji achụ nta.”

Na Hibru, “na-elu ilu karịa ọnwụ.”

Na Hibru, “mmụọ.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ma ọ bụ “ihe na-agbawa obi.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ma ọ bụ “ọrụ niile a na-arụ.”

O nwere ike ịbụ, “na ndị mmadụ anaghị ehi ụra.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ma ọ bụ “na-adabara.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ma ọ bụ “na-adabara.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ya bụ, uwe chapụrụ achapụ nke na-egosi na obi dị onye yi ya ụtọ, ọ bụghị uwe e ji eru uju.

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ma ọ bụ “ihe mberede.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Na Hibru, “dị n’aka nri ya.”

Na Hibru, “dị n’aka ekpe ya.”

Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”

Ma ọ bụ “ndị ruru eru.”

O nwere ike ịbụ, “Onye na-awa nkụ kwesịrị ịkpachapụ anya.”

Ma ọ bụ “Abụla eze ọnụ.”

O nwere ike ịbụ, “n’elu àkwà gị.”

Ma ọ bụ “Zipụ.”

O nwekwara ike ịbụ mmụọ Chineke ka a na-ekwu.

Na Hibru, “ekwekwala ka aka gị zuo ike.”

Mkpụrụ osisi a na-eme ka agụụ gụwa mmadụ.

Na Hibru, “mmụọ.”

Ma ọ bụ “hazie.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya