Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Ọpụpụ 1:1-40:38
  • Ọpụpụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọpụpụ
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọpụpụ

ỌPỤPỤ

1 Ihe a bụ aha ụmụ nwoke Izrel mụrụ, ya bụ, ndị so ya* bịa n’Ijipt, onye ọ bụla n’ime ha kpọ ezinụlọ ya bịa:+ 2 Ruben, Simiọn, Livaị, na Juda;+ 3 Ịsaka, Zebulọn, na Benjamin; 4 Dan na Naftalaị; Gad na Asha.+ 5 Ndị* niile a mụụrụ Jekọb dị mmadụ* iri asaa. Ma Josef nọ anọ n’Ijipt.+ 6 Josef mechara nwụọ,+ ụmụnne ya niile na ọgbọ ahụ niile nwụkwara. 7 Ndị Izrel wee na-amụ ụmụ, malitekwa ịdị ọtụtụ. Ha nọkwa na-amụba n’ike n’ike ma na-esikwu nnọọ ike, nke mere na ha juru ebe niile n’ala ahụ.+

8 Ka oge na-aga, eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị Ijipt. 9 O wee gwa ndị obodo ya, sị: “Lee, ndị Izrel ka anyị dị ọtụtụ, ha dịkwa ike karịa anyị.+ 10 Ka anyị gosi ha na anyị ma ihe. Ma ọ́ bụghị ya, ha ga na-amụba. Ọ bụrụkwa na agha adaa, ha ga-esoro ndị iro anyị lụso anyị agha ma si n’obodo a laa.”

11 Ha họpụtaziri ndị isi ga na-amanye ha ịrụ ọrụ ike ma na-emegbu ha.+ Ha manyekwara ha ịrụrụ Fero obodo ndị a ga na-akwakọba ihe na ha, ya bụ, Paịtọm na Ramsis.+ 12 Ma ọ na-abụ ha na-emegbukwu ha, ha ana-amụbakwu ma na-agbasakwu n’ebe niile, nke mere na oké ụjọ jidere ha n’ihi ndị Izrel.+ 13 N’ihi ya, ndị Ijipt ji ndị Izrel mere ndị ohu, na-echikwa ha ọnụ n’ala.+ 14 Ha ji ọrụ ike ha na-amanye ha ịrụ mee ka ndụ kwụsị ịtọ ha ụtọ, na-amanye ha ịgwọ ájá ụrọ na ịkpụ brik, meekwa ka ha na-arụ ụdị ọrụ ike dị iche iche n’ubi. N’eziokwu, ha na-echi ha ọnụ n’ala ma na-eme ka ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ.+

15 Mgbe e mechara, eze Ijipt gwara ụmụ nwaanyị Hibru na-aghọ́ nwa okwu. Aha ha bụ Shifra na Pua. 16 Ọ gwara ha, sị: “Mgbe unu na-enyere ụmụ nwaanyị Hibru aka ịmụ nwa,+ leruonụ anya mgbe nwa ha na-apụta,* ọ bụrụ nwa nwoke, gbuonụ ya. Ma, ọ bụrụ nwa nwaanyị, hapụnụ ya ndụ.” 17 Ma, ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa na-atụ egwu ezi Chineke. Ha emeghị ihe eze Ijipt gwara ha. Kama, ha na-ahapụ ụmụ nwoke ndụ.+ 18 Ka oge na-aga, eze Ijipt kpọrọ ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa, sị ha: “Gịnị mere unu ji ahapụ ụmụ nwoke ndụ?” 19 Ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa gwara Fero, sị: “Ụmụ nwaanyị Hibru adịghị ka ụmụ nwaanyị Ijipt. Ha gbasiri ike. Ha na-amụcha nwa tupu nwaanyị na-aghọ́ nwa abịakwute ha.”

20 Chineke wee meere ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa ihe ọma. Ndị Izrel nọkwa na-amụba ma na-esikwu nnọọ ike. 21 Chineke mechara mee ka ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa nwee ezinụlọ nke ha n’ihi na ha na-atụ egwu ya. 22 N’ikpeazụ, Fero nyere ndị obodo ya niile iwu, sị: “Tụbanụ nwa nwoke ọ bụla ndị Hibru mụrụ ọhụrụ n’osimiri Naịl, ma hapụnụ nwa nwaanyị ọ bụla ndụ.”+

2 N’oge ahụ, otu nwoke nke si n’ezinụlọ Livaị lụrụ otu nwaanyị sikwa n’ezinụlọ Livaị.+ 2 Nwaanyị ahụ wee dị ime, mụọ nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ otú nwa ahụ si maa mma, o zoro ya ruo ọnwa atọ.+ 3 Mgbe ọ na-enweghịzi ike izo ya,+ o wetara nkata* e ji okporo papaịrọs kpaa, were bitumen na ihe yiri korota techie ya, nyiwe nwa ahụ n’ime ya ma dọsa ya n’ahịhịa amị ndị dị n’akụkụ Osimiri Naịl. 4 Ma nwanne ya nwaanyị+ guzo n’ebe dịtụ anya na-ele anya ka ọ mara ihe ga-eme ya.

5 Mgbe ada Fero gara ịsa ahụ́ n’Osimiri Naịl, ụmụ nwaanyị na-ejere ya ozi nọ na-agagharị n’akụkụ Osimiri Naịl. Ọ hụrụ nkata ahụ dị n’etiti ahịhịa amị. O wee dunye ohu ya nwaanyị ozugbo ka ọ gaa bute ya.+ 6 Mgbe o meghere ya, ọ hụrụ nwa ahụ, nwa ahụ nọkwa na-ebe ákwá. O meteere nwa ahụ ebere.* Ma ọ sịrị: “Nwa a bụ otu n’ime ụmụ ndị Hibru.” 7 Nwanne ya nwaanyị wee sị ada Fero: “Ọ̀ bụ m gaa kpọọ otu nwaanyị Hibru ka o nyere gị nwa a ara?” 8 Ada Fero sịrị ya: “Gawa!” Ozugbo ahụ, nwata nwaanyị ahụ gara kpọọ nne nwatakịrị ahụ.+ 9 Ada Fero sịrị ya: “Kuru nwa a nyewere m ya ara, m ga na-akwụ gị ụgwọ.” Nwaanyị ahụ wee kuru nwa ahụ na-enye ya ara. 10 Mgbe nwa ahụ tolitetụrụ, ọ kpọgaara ya ada Fero, ya abụrụ nwa ya.+ Ada Fero gụrụ ya Mosis* ma sị: “Ọ bụ maka na m si na mmiri kupụta ya.”+

11 N’oge ahụ, mgbe Mosis bụzi dimkpa,* ọ gakwuuru ụmụnne ya ka ọ hụ ọrụ ike ha na-arụ.+ Ọ hụrụ ka otu onye Ijipt na-eti onye Hibru, bụ́ otu n’ime ụmụnne ya, ihe. 12 Mosis legharịrị anya, ma e nweghị onye ọ hụrụ, ya egbuo onye Ijipt ahụ, zoo ya n’ime ájá.+

13 Ma mgbe ọ pụrụ n’echi ya, ọ hụrụ ụmụ nwoke abụọ bụ́ ndị Hibru ka ha na-alụ ọgụ. O wee gwa onye nke mejọrọ ibe ya, sị: “Gịnị mere i ji eti nwanne gị ihe?”+ 14 O wee sị: “Ònye mere gị onye na-achị anyị na onyeikpe anyị? Ị̀ chọrọ igbu m otú i gburu onye Ijipt?”+ Ụjọ jidere Mosis, ya asị: “N’eziokwu, a matala ihe a!”

15 Fero nụrụ ihe merenụ, ya agbalịa ka o gbuo Mosis. Ma, Mosis gbara ọsọ, gawa ka o biri na Midian.+ Ọ gara nọdụ ọdụ n’akụkụ otu olulu mmiri. 16 Onye nchụàjà Midian+ nwere ụmụ nwaanyị asaa. Ụmụ nwaanyị ahụ bịara isere mmiri ka ha gbajuo ihe anụmanụ ji aṅụ mmiri, ka ha wee nye ìgwè ewu na atụrụ nna ha mmiri. 17 Ma ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Ọ bụ ihe ha na-emekarị. Mosis wee bilie nyere ụmụ nwaanyị ahụ aka* ma nye ìgwè ewu na atụrụ ha mmiri. 18 Mgbe ha lọtara gakwuru Ruel* nna ha,+ o juru ya anya, ya asị ha: “Olee otú unu si mee lọta ngwa ngwa taa?” 19 Ha zara, sị: “Otu onye Ijipt+ napụtara anyị n’aka ndị ọzụzụ atụrụ. O sepụtadịịrị anyị mmiri ma nye ìgwè ewu na atụrụ anyị mmiri.” 20 Ọ sịrị ha: “Oleekwanụ ebe nwoke ahụ nọ? Gịnị mere unu ji hapụ ya? Gaanụ kpọọ ya, ka anyị na ya rie ihe.” 21 Mgbe e mechara, Mosis kwetara ibi na nke nwoke ahụ. Nwoke ahụ wee kpọnye Mosis Zipora nwa ya nwaanyị+ ka ọ lụwa. 22 Zipora mechara mụọ nwa nwoke, Mosis agụọ ya Geshọm,*+ maka na ọ sịrị: “Abụrụla m onye mbịarambịa n’ala ọzọ.”+

23 Mgbe ogologo oge* gachara, eze Ijipt nwụrụ.+ Ma ndị Izrel ka nọ na-asụ ude maka na e ji ha mere ndị ohu, ha na-ebekwa ákwá arịrị. Ha nọkwa na-ebesara ezi Chineke ákwá ka o nyere ha aka maka na e ji ha mere ndị ohu.+ 24 Ka oge na-aga, Chineke nụrụ ude ha na-asụ.+ Chineke chetara ọgbụgba ndụ ya na Ebreham, Aịzik, na Jekọb.+ 25 Chineke wee lebara ndị Izrel anya ma hụ ahụhụ ha na-ata.

3 Mosis bidoro ịzụrụ Jetro nna nwunye ya,+ bụ́ onye nchụàjà Midian, ìgwè ewu na atụrụ. Mgbe o du ìgwè ewu na atụrụ na-aga n’ebe ọdịda anyanwụ n’ala ịkpa, o rutere Horeb, bụ́ ugwu ezi Chineke.+ 2 Mmụọ ozi Jehova wee pụta n’ihu ya n’ọkụ na-enwu n’otu osisi ogwu.+ Ka ọ nọ na-ele anya, ọ hụrụ ọkụ na-enwu n’osisi ogwu ahụ. Ma ọkụ ahụ erepịaghị osisi ogwu ahụ. 3 Mosis wee sị: “Ka m gaa leruo ihe a dị ịtụnanya anya mara ihe mere na ọkụ anaghị erepịa osisi ogwu ahụ.” 4 Mgbe Jehova hụrụ na ọ gara ile ihe na-emenụ, o si n’osisi ogwu ahụ kpọọ ya òkù, sị: “Mosis! Mosis!” O wee sị: “Lee m.” 5 O wee sị Mosis: “Abịakwula nso. Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị, n’ihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.”

6 O kwukwara, sị: “Abụ m Chineke nke nna gị, Chineke Ebreham,+ Chineke Aịzik,+ na Chineke Jekọb.”+ Mosis wee kpuchie ihu ya, n’ihi na egwu na-atụ ya ile ezi Chineke anya. 7 Jehova kwukwara, sị: “N’eziokwu, ahụla m otú e si na-emekpa ndị m nọ n’Ijipt ahụ́, anụkwala m ákwá ha na-ebe n’ihi ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ. Ama m nnọọ ahụhụ ha na-ata.+ 8 M ga-aga ịnapụta ha n’aka ndị Ijipt+ na ịkpọpụta ha n’ala ahụ kpọga ha n’ala dị mma ma dị obosara, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,*+ bụ́ ala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọraịt, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus.+ 9 N’eziokwu, ákwá ndị Izrel na-ebe eruola m ntị, ahụkwala m otú ndị Ijipt si jiri aka ike na-emegbu ha.+ 10 Ugbu a, bịa ka m ziga gị ka ị gakwuru Fero, ị ga-akpọpụtakwa ndị m bụ́ ndị Izrel n’Ijipt.”+

11 Ma Mosis gwara ezi Chineke, sị: “Ònye ka m bụ na m ga-agakwuru Fero ma kpọpụta ndị Izrel n’Ijipt?” 12 O wee sị: “M ga-anọnyere gị.+ Ihe a ga-abụkwara gị ihe àmà na ọ bụ m zigara gị: Mgbe ị kpọpụtachara ndị m n’Ijipt, unu ga-efe ezi Chineke* n’ugwu a.”+

13 Ma Mosis gwara ezi Chineke, sị: “Ọ bụrụ na mụ agakwuru ndị Izrel sị ha, ‘Chineke nna nna unu hà zitere m ka m bịakwute unu,’ ha asị m, ‘Gịnị bụ aha ya?’+ Gịnị ka m ga-agwa ha?” 14 Chineke gwara Mosis, sị: “M Ga-abụ Ihe M Chọrọ* Ịbụ.”*+ Ọ sịkwara: “Ị ga-agwa ndị Izrel, sị, ‘M Ga-abụ zitere m ka m bịakwute unu.’”+ 15 Chineke wee gwa Mosis ọzọ, sị:

“Ị ga-agwa ndị Izrel, sị, ‘Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà, Chineke Ebreham,+ Chineke Aịzik,+ na Chineke Jekọb,+ zitere m ka m bịakwute unu.’ Ọ bụ ya bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi,+ ọ bụkwa ihe a ga-eji na-echeta m si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ. 16 Ugbu a gawa, kpọkọta ndị okenye Izrel ma gwa ha, sị: “Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà pụtara n’ihu m, Chineke Ebreham, Aịzik, na Jekọb. Ọ sịkwara: “N’eziokwu, ahụla m unu,+ hụkwa ihe a na-eme unu n’Ijipt. 17 N’ihi ya, ana m asị unu na m ga-anapụta unu n’aka ndị Ijipt na-emekpa unu ahụ́+ ma kpọga unu n’ala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọraịt,+ ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus,+ bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.”’*+

18 “Ha ga-ege gị ntị.+ Gị na ndị okenye Izrel ga-agakwuru eze Ijipt, unu ga-agwakwa ya, sị: ‘Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru+ gwara anyị okwu. N’ihi ya, biko, hapụ anyị ka anyị gaa n’ala ịkpa, n’ebe ga-ewe anyị ụbọchị atọ iru, ka anyị chụọrọ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà.’+ 19 Ma ama m na eze Ijipt agaghị ekwe ka unu gaa ọ gwụla ma è mere ya n’ike.+ 20 N’ihi ya, m ga-eweli aka m tie Ijipt ihe ma mee ihe niile dị ịtụnanya m ga-eme na ya. E mechaa, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa.+ 21 M ga-emekwa ka ihe ndị m masị ndị Ijipt, unu agaghịkwa agba aka mgbe unu na-ala.+ 22 Nwaanyị ọ bụla ga-arịọ onye agbata obi ya, rịọkwa nwaanyị bi n’ụlọ ya ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee nakwa ákwà. Unu ga-eyiwe ha ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị. Unu ga-agbawa ndị Ijipt aka.”+

4 Ma Mosis zara, sị: “Ọ bụrụkwanụ na ha ekwetaghị ihe m kwuru ma ghara ige m ntị?+ N’ihi na ha ga-asị, ‘Jehova apụtaghị n’ihu gị.’” 2 Jehova wee sị ya: “Gịnị bụ ihe ahụ i ji n’aka?” Ọ zara, sị: “Ọ bụ mkpara.” 3 Ọ sịrị: “Tụpụ ya n’ala.” O wee tụpụ ya n’ala, ya aghọọ agwọ.+ Mosis wee gbaara ya ọsọ. 4 Jehova gwara Mosis, sị: “Matịa aka gị jide ya n’ọdụ.” O wee matịa aka jide ya, ya aghọọ mkpara n’aka ya. 5 Chineke sịziri ya: “Ihe a ga-eme ka ha kwere na Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha, Chineke Ebreham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb,+ pụtara n’ihu gị.”+

6 Jehova gwara ya ọzọ, sị: “Biko, tinye aka gị n’ime uwe gị.” O tinyere aka ya n’uwe ya. Mgbe o wepụtara ya, ekpenta mere ya n’aka, aka ya ana-acha ezigbo ọcha.+ 7 O wee sị ya: “Tinyeghachi aka gị n’ime uwe gị.” O tinyeghachiri aka ya n’uwe ya. Mgbe o wepụtara ya n’uwe ya, ọ dịghachiri mma ka ebe ndị ọzọ n’ahụ́ ya. 8 Ọ sịrị Mosis: “Ọ bụrụ na ha ekwetaghị ihe i kwuru ma ọ bụ ghara ikweta ihe àmà mbụ ahụ, ha ga-ekweta ihe àmà+ nke abụọ. 9 Ma ọ bụrụ na ha ekwetaghị ihe àmà abụọ ndị a ma ghara ige gị ntị, ị ga-ekute mmiri n’Osimiri Naịl wụsa ya n’ala. Mmiri ahụ i kutere n’Osimiri Naịl ga-aghọ ọbara n’ala.”+

10 Mosis sịziri Jehova: “Biko, Jehova, e nweghị mgbe okwu na-aga m were were n’ọnụ, ma n’oge gara aga ma kemgbe ị gwara ohu gị okwu, n’ihi na ikwu okwu na-esiri m ike, ire na-anyịkwa m arọ.”+ 11 Jehova sịrị ya: “Ònye nyere ndị mmadụ ọnụ, ma ọ bụ ònye na-eme ka ha ghara ikwu okwu, ka ntị chie ha, ka ha na-ahụ ụzọ nke ọma, ma ọ bụ ka ha kpuo ìsì? Ọ́ bụghị mụnwa bụ́ Jehova? 12 N’ihi ya, gawa, m ga-anọnyere gị mgbe ị na-ekwu okwu, m ga-akụzikwara gị ihe ị ga-ekwu.”+ 13 Ma ọ sịrị: “Ewela iwe, Jehova, biko ziga onye ọ bụla ọzọ ị chọrọ iziga.” 14 Jehova wee wesa Mosis ezigbo iwe ma sị ya: “Oleekwanụ maka Erọn nwanne gị+ onye Livaị? Ama m na ọ na-ekwu okwu nke ọma. Ọ na-abịakwa izute gị. Mgbe ọ ga-ahụ gị, obi ga-adị ya ụtọ.+ 15 N’ihi ya, ị ga-agwa ya okwu ma tinye okwu ndị ahụ n’ọnụ ya.+ M ga-anọnyere gị na ya mgbe ị ga na-ekwu okwu,+ m ga-akụzikwara unu ihe unu ga-eme. 16 Ọ ga na-agwara gị ndị m okwu. Ọ ga-abụ ọnụ na-ekwuchitere gị. Ị ga-abụrụ ya Chineke.*+ 17 Ị ga-ejikwa mkpara a n’aka gị ka i jiri ya mee ihe àmà ndị ahụ.”+

18 Mosis wee gakwuru Jetro nna nwunye ya+ ma sị ya: “Biko, achọrọ m ịla, ka m lakwuru ụmụnne m ndị nọ n’Ijipt, ka m mara ma hà ka dịkwa ndụ.” Jetro sịrị Mosis: “Laa n’udo.” 19 Mgbe e mechara, Jehova gwara Mosis okwu na Midian, sị: “Gawa, laghachi n’Ijipt, n’ihi na ndị niile na-achọ igbu gị* anwụọla.”+

20 Mosis wee kpọrọ nwunye ya na ụmụ ya ma kukwasị ha n’elu jakị. O wee laghachiwa Ijipt. Mosis jikwa mkpara ezi Chineke n’aka ya. 21 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Ọrụ ebube niile m nyere gị ike ịrụ, hụ na ị rụrụ ha n’ihu Fero ma ị laghachi n’Ijipt.+ Ma m ga-ekwe ka obi ya kpọchie,+ ọ gaghịkwa ahapụ ndị m ka ha laa.+ 22 Gwa Fero, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Izrel bụ nwa m nwoke, ọkpara m.+ 23 Ana m asị gị, Hapụ nwa m nwoke ka ọ gaa fee m.* Ma ọ bụrụ na i kweghị ahapụ ya, m ga-egbu nwa gị nwoke, ọkpara gị.”’”+

24 Mgbe ha nọ n’ụzọ, n’ebe ha ga-arahụ, Jehova+ zutere ya ma chọwa igbu ya.+ 25 N’ikpeazụ, Zipora+ weere nkume dị nkọ bie nwa ya nwoke úgwù ma mee ka apị́ ya metụ n’ụkwụ ya wee sị: “Ọ bụ maka na ị bụụrụ m di ọbara.” 26 O wee hapụ ya. N’oge ahụ, Zipora sịrị, “di ọbara,” n’ihi úgwù ahụ o biri ya.

27 Jehova wee gwa Erọn, sị: “Gakwuru Mosis n’ala ịkpa.”+ O wee gaa zute ya n’ugwu ezi Chineke+ ma susuo ya ọnụ.* 28 Mosis gwara Erọn ihe niile Jehova, onye zitere ya, kwuru,+ gwakwa ya ihe àmà niile o nyere ya iwu ka o mee.+ 29 Mgbe e mechara, Mosis na Erọn gara kpọkọta ndị niile bụ́ ndị okenye Izrel.+ 30 Erọn gwara ha ihe niile Jehova gwara Mosis, o mekwara ihe àmà ndị ahụ+ n’ihu ha. 31 Ndị ahụ wee kwere.+ Mgbe ha nụrụ na Jehova echetala ndị Izrel+ nakwa na ọ hụla otú e si na-emekpa ha ahụ́,+ ha hulatara ala kpọọ isiala.

5 Mgbe e mechara, Mosis na Erọn gakwuuru Fero, sị ya: “Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m ememme n’ala ịkpa.’” 2 Ma Fero sịrị: “Ònye bụ Jehova,+ nke mere m ga-eji rubere ya isi wee hapụ ndị Izrel ka ha gawa?+ Amaghị m onye Jehova bụ, agaghịkwa m ahapụ ndị Izrel.”+ 3 Ma ha sịrị: “Chineke ndị Hibru gwara anyị okwu. Biko, anyị chọrọ ịga n’ala ịkpa, n’ebe ga-ewe anyị ụbọchị atọ iru, ka anyị chụọrọ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà.+ Ma ọ́ bụghị ya, ọ ga-eji ọrịa ma ọ bụ mma agha gbuo anyị.” 4 Eze Ijipt zara ha, sị: “Mosis na Erọn, gịnị mere unu ji na-akpọpụ ndị a n’ọrụ ha na-arụ? Gaghachinụ n’ọrụ unu!”+ 5 Fero sịkwara: “Lee otú ndị a si dị ọtụtụ n’ala a, unu abịa ịkpọpụ ha ka ha kwụsị ọrụ ha na-arụ.”

6 N’ụbọchị ahụ, Fero nyere ndị na-ekenye ndị Izrel ọrụ nakwa ndị isi ọrụ ha iwu, sị: 7 “Unu enyezila ndị Izrel ahịhịa ọka ha ji akpụ brik.+ Ha gawa kpokọtawara onwe ha ahịhịa ọka. 8 Ma, unu ka ga na-amanye ha ka ha na-akpụ brik ole ha na-akpụbu. Unu esepụrụla ha ihe ọ bụla na ya n’ihi na ha dị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-ebe ákwá, sị: ‘Anyị chọrọ ịla. Anyị chọrọ ịchụrụ Chineke anyị àjà!’ 9 Meenụ ka ha rụsikwuo ọrụ ike, ka ha na-arụ ọrụ mgbe niile, ka ha wee ghara ige okwu ụgha.”

10 Ndị na-ekenye ha ọrụ+ na ndị isi ọrụ ndị Izrel gaziri gwa ndị Izrel, sị: “Fero kwuru, sị, ‘Agaghịzi m enye unu ahịhịa ọka. 11 Gaanụ kpokọtawara onwe unu ahịhịa ọka n’ebe ọ bụla unu nwere ike ịchọta ya. Ma a gaghị ebelatara unu ọrụ unu na-arụ.’” 12 Ndị Izrel wee gaa ebe niile n’ala Ijipt ka ha kpokọta okporo ọka ha ga-eji emere ahịhịa ọka. 13 Ndị na-ekenye ha ọrụ nọkwa na-agwa ha, sị: “Onye ọ bụla n’ime unu ga-arụcharịrị ọrụ ya kwa ụbọchị, otú ọ na-arụ mgbe a na-enye ya ahịhịa ọka.” 14 Ndị Fero mere ndị isi ọrụ pịakwara ndị ha họpụtara ka ha bụrụ ndị isi ọrụ ndị Izrel ihe.+ Ha jụrụ ha, sị: “Gịnị mere na unu akpụzughị brik ole unu na-akpụbu? Unu akpụzughị ya ma ụnyaahụ ma taa.”

15 Ndị isi ndị Izrel wee gakwuru Fero, kpesara ya, sị: “Gịnị mere i ji emeso ndị ohu gị otú a? 16 A naghị enye ndị ohu gị ahịhịa ọka. Ma ha na-asị anyị, ‘Kpụọnụ brik!’ A na-apịa ndị ohu gị ihe. Ma, ọ bụ ndị obodo gị ka ụta dịịrị.” 17 Ma ọ sịrị: “Unu dị umengwụ! Unu dị umengwụ!+ Ọ bụ ya mere unu ji asị, ‘Anyị chọrọ ịla. Anyị chọrọ ịchụrụ Jehova àjà.’+ 18 Ngwa, gaanụ rụwa ọrụ! A gaghị enye unu ahịhịa ọka. Ma unu ka ga na-akpụ brik ole unu na-akpụbu.”

19 Ndị isi ọrụ ndị Izrel wee hụ na ha nọ ná nnukwu nsogbu n’ihi iwu ahụ e nyere, sị: “Unu esepụla ihe ọ bụla na brik ole unu na-akpụbu kwa ụbọchị.” 20 Mgbe e mechara, ha bịakwutere Mosis na Erọn, bụ́ ndị guzo n’ebe ahụ ka ha zute ha mgbe ha hụchara Fero na-apụta. 21 Ozugbo ahụ, ha sịrị ha: “Ka Jehova hụ ihe unu mere ma kpee unu ikpe, ebe ọ bụ na unu emeela ka Fero na ndị na-ejere ya ozi kpọọ anyị asị.* Unu enyekwala ha mma agha ka ha gbuo anyị.”+ 22 Mosis wee gwa Jehova, sị: “Jehova, gịnị mere i ji mekpaa ndị a ahụ́? Gịnị mere i ji zite m? 23 Malite n’oge m gara n’ihu Fero ịgwa ya okwu n’aha gị,+ o mesikwuola ndị a ike,+ ị napụtabeghịkwa ndị gị.”+

6 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero.+ M ga-eji aka m dị ike manye ya ka ọ hapụ ha ka ha laa, jirikwa aka m dị ike manye ya ka ọ chụpụ ha n’ala ya.”+

2 Chineke wee gwa Mosis, sị: “Abụ m Jehova. 3 M na-adị apụta n’ihu Ebreham, Aịzik, na Jekọb ka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ ma emeghị m ka ha matachaa aha m+ bụ́ Jehova.+ 4 Mụ na ha gbakwara ndụ na m ga-enye ha ala Kenan, bụ́ ala ha biri na ya ka ndị ọbịa.+ 5 Ugbu a, anụla m ude ndị Izrel na-asụ, bụ́ ndị ndị Ijipt ji mere ndị ohu, m na-echetakwa ọgbụgba ndụ m.+

6 “N’ihi ya, gwa ndị Izrel, sị: ‘Abụ m Jehova. M ga-akpọpụta unu n’aka ndị Ijipt ka unu kwụsị ịrụgbu onwe unu n’ọrụ, meekwa ka unu kwụsị ịgbara ha ohu.+ M ga-eji aka m siri ike napụta unu ma taa ndị Ijipt nnukwu ahụhụ.+ 7 M ga-akpọrọ unu ka unu bụrụ ndị m, m ga-abụkwa Chineke unu.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova bụ́ Chineke unu, onye na-akpọpụta unu n’Ijipt ka unu kwụsị ịrụgbu onwe unu n’ọrụ. 8 M ga-akpọbata unu n’ala m ṅụrụ iyi* na m ga-enye Ebreham, Aịzik, na Jekọb. M ga-enyekwa ya unu ka ọ bụrụ nke unu.+ Abụ m Jehova.’”+

9 Mosis mechara gwa ndị Izrel ihe ndị a. Ma ha egeghị Mosis ntị maka na obi dara ha mbà nakwa maka na e ji ha mere ndị ohu, na-echikwa ha ọnụ n’ala.+

10 Jehova wee gwa Mosis, sị: 11 “Gaa gwa Fero, eze Ijipt, ka ọ hapụ ndị Izrel ka ha si n’ala ya pụọ.” 12 Ma Mosis sịrị Jehova: “Leenụ, ndị Izrel egeghị m ntị.+ Olee otú Fero ga-esi gee m ntị, ebe ọ bụ na ọ na-esiri m ike ikwu okwu?”*+ 13 Ma Jehova gwara Mosis na Erọn ihe ha ga-agwa ndị Izrel nakwa Fero, eze Ijipt, ka e wee kpọpụta ndị Izrel n’Ijipt.

14 Ndị a bụ ndị isi ezinụlọ dị iche iche nke ndị Izrel: Ụmụ nwoke Ruben, ọkpara Izrel,+ mụrụ bụ Henọk, Palu, Hezrọn, na Kamaị.+ Ha bụ ndị ezinụlọ Ruben.

15 Ụmụ nwoke Simiọn mụrụ bụ Jemuel, Jemin, Ohad, Jekin, Zoha, nakwa Sheọl, onye nwaanyị Kenan mụrụ.+ Ha bụ ndị ezinụlọ Simiọn.

16 Ihe a bụ aha ụmụ nwoke Livaị mụrụ,+ n’ọnụmara n’ọnụmara: Geshọn, Kohat, na Meraraị.+ Livaị dịrị ndụ otu narị afọ na iri atọ na asaa (137).

17 Ụmụ nwoke Geshọn mụrụ bụ Libnaị na Shimiaị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+

18 Ụmụ nwoke Kohat mụrụ bụ Amram, Izha, Hebrọn, na Ọziel.+ Kohat dịrị ndụ otu narị afọ na iri atọ na atọ (133).

19 Ụmụ nwoke Meraraị mụrụ bụ Malaị na Mushaị.

Ha bụ ndị ezinụlọ ndị Livaị, n’ọnụmara n’ọnụmara.+

20 Amram lụrụ Jokebed, nwanne nna ya.+ Ọ mụụrụ ya Erọn na Mosis.+ Amram dịrị ndụ otu narị afọ na iri atọ na asaa (137).

21 Ụmụ nwoke Izha mụrụ bụ Kora,+ Nefeg, na Zikraị.

22 Ụmụ nwoke Ọziel mụrụ bụ Mishel, Elzefan,+ na Sitraị.

23 Erọn lụrụ Elaịsheba nwa Aminadab, nwanne nwaanyị Nashọn.+ Ọ mụụrụ ya Nedab, Abaịhu, Elieza, na Ịtama.+

24 Ụmụ nwoke Kora mụrụ bụ Asịa, Elkena, na Abayasaf.+ Ha bụ ezinụlọ ndị si n’ụlọ Kora.+

25 Elieza,+ nwa Erọn, lụrụ otu n’ime ụmụ nwaanyị Putiel mụrụ. Ọ mụụrụ ya Finihas.+

Ha bụ ndị isi ọnụmara Livaị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+

26 Ọ bụ ha bụ Erọn na Mosis ahụ Jehova gwara, sị: “Sinụ n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel, n’ìgwè n’ìgwè.”*+ 27 Ọ bụ ha gwara Fero, eze Ijipt, okwu ka e si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel. Ọ bụ ha bụ Mosis na Erọn.+

28 N’ụbọchị ahụ Jehova gwara Mosis okwu n’Ijipt, 29 Jehova gwara Mosis, sị: “Abụ m Jehova. Gwa Fero, eze Ijipt, ihe niile m na-agwa gị.” 30 Mosis wee kwuo n’ihu Jehova, sị: “Legodị, ọ na-esiri m ike ikwu okwu.* Olee otú Fero ga-esi gee m ntị?”+

7 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Lee, emeela m ka ị bụụrụ Fero Chineke, Erọn nwanne gị ga-abụkwa onye amụma gị.+ 2 Ị ga-ekwu ihe niile m ga-enye gị iwu ka i kwuo. Erọn nwanne gị ga-agwa Fero okwu, ọ ga-ahapụkwa ndị Izrel ka ha si n’ala ya pụọ. 3 Ma m ga-ekwe ka obi Fero kpọchie.+ M ga-eme ọtụtụ ihe àmà, rụọkwa ọtụtụ ọrụ ebube n’Ijipt.+ 4 Ma, Fero agaghị ege unu ntị. M ga-ebi Ijipt aka ma si n’Ijipt kpọpụta ndị m dị ọtụtụ,* bụ́ ndị Izrel, taakwa Ijipt nnukwu ahụhụ.+ 5 Ndị Ijipt ga-amarakwa na m bụ Jehova+ mgbe m ga-eweli aka m mee Ijipt ihe ma kpọpụta ndị Izrel n’obodo ha.” 6 Mosis na Erọn mere ihe Jehova nyere ha n’iwu. Ha mere nnọọ otú ahụ. 7 Mosis dị afọ iri asatọ, Erọn adịrị afọ iri asatọ na atọ mgbe ha gwara Fero okwu.+

8 Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị: 9 “Ọ bụrụ na Fero asị unu, ‘Rụọnụ ọrụ ebube,’ gwa Erọn, sị, ‘Were mkpara gị tụpụ n’ala n’ihu Fero.’ Ọ ga-aghọ nnukwu agwọ.”+ 10 Mosis na Erọn wee gakwuru Fero ma mee nnọọ ihe Jehova nyere ha n’iwu. Erọn tụpụrụ mkpara ya n’ala n’ihu Fero na ndị na-ejere ya ozi, ya aghọọ nnukwu agwọ. 11 Ma, Fero kpọkọtara ndị ma ihe na ndị dibịa afa. Ndị dibịa anwansi ndị a e nwere n’Ijipt+ jikwa anwansi* ha mee otu ihe ahụ.+ 12 Onye ọ bụla n’ime ha tụpụrụ mkpara ya n’ala, mkpara ya aghọọ nnukwu agwọ. Ma mkpara Erọn loro mkpara ha. 13 N’agbanyeghị ihe a, Fero kpọchiri obi ya,+ o geghịkwa ha ntị, otú Jehova kwuru.

14 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Obi Fero akpọchiela.+ Ọ jụla ịhapụ ha ka ha laa. 15 Gakwuru Fero n’ụtụtụ. Ọ ga-apụta ka ọ gaa na mmiri. Ị ga-anọrọ n’ọnụ ọnụ Osimiri Naịl ka i zute ya. Ị gawa, jiri mkpara ahụ n’aka, ya bụ, mkpara ahụ nke ghọrọ agwọ.+ 16 Ị ga-asị ya, ‘Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru zitere m ka m bịakwute gị.+ Ọ sịrị: “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m* n’ala ịkpa.” Ma i gebeghị ntị ruo ugbu a. 17 Jehova kwuru, sị: “Ị ga-eji ihe a mata na m bụ Jehova.+ M ga-akụ mkpara m ji n’aka na mmiri dị n’Osimiri Naịl, mmiri ahụ ga-aghọkwa ọbara. 18 Azụ̀ ndị dị n’Osimiri Naịl ga-anwụ. Osimiri Naịl ga na-esi ísì, mmiri Osimiri Naịl agaghịkwa ekwe ndị Ijipt ọṅụṅụ.”’”

19 Jehova sịziri Mosis: “Gwa Erọn, sị, ‘Were mkpara gị, setịa aka gị n’elu mmiri ndị dị n’Ijipt,+ n’elu osimiri ndị dị na ya, n’elu ọwa mmiri ya niile,* n’elu ọdọ mmiri ya niile,+ nakwa n’elu ebe niile mmiri na-asọba, ka ha ghọọ ọbara.’ Ọbara ga-adị n’ala Ijipt niile, ma n’arịa ndị e ji osisi mee ma n’arịa ndị e ji nkume mee.” 20 Ozugbo ahụ, Mosis na Erọn mere nnọọ otú Jehova nyere ha iwu. O weliri mkpara ahụ kụọ mmiri dị n’Osimiri Naịl n’ihu Fero na ndị na-ejere ya ozi, mmiri niile dị n’osimiri ahụ ghọziri ọbara.+ 21 Azụ̀ ndị dị n’osimiri ahụ nwụrụ.+ Osimiri ahụ malitere isi ísì, ndị Ijipt enweghịkwa ike ịṅụ mmiri si n’Osimiri Naịl.+ Ọbara wee ju ebe niile n’ala Ijipt.

22 Ma, ndị dibịa anwansi ndị Ijipt ji anwansi* ha mee otu ihe ahụ,+ nke mere ka obi Fero ka kpọchie akpọchie, o geghịkwa ha ntị, otú Jehova kwuru.+ 23 Fero wee laghachi n’ụlọ ya, ma o chebaraghị ihe a merenụ echiche. 24 Ndị Ijipt niile nọ na-egwu olulu gburugburu Osimiri Naịl ka ha nweta mmiri ha ga-aṅụ, n’ihi na ha enweghị ike ịṅụ mmiri ọ bụla si n’Osimiri Naịl. 25 Ụbọchị asaa gafere mgbe Jehova mechara ka mmiri dị n’Osimiri Naịl ghọọ ọbara.

8 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Gakwuru Fero, sị ya, ‘Jehova kwuru, sị: “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.*+ 2 Ọ bụrụ na ị ka na-ajụ ịhapụ ha, m ga-eme ka mbàrá ju n’ala gị niile.+ 3 Mbàrá ga-ejukwa n’Osimiri Naịl. Ha ga-apụtakwa banye n’ụlọ gị, n’ime ụlọ ị na-edina, n’elu àkwà* gị, n’ụlọ ndị na-ejere gị ozi nakwa n’ebe ndị obodo gị nọ, n’ime ekwú gị, nakwa n’ihe* i ji agwọ ntụ ọka.+ 4 Mbàrá ndị ahụ ga-amagoro n’ahụ́ gị, n’ahụ́ ndị obodo gị, nakwa n’ahụ́ ndị niile na-ejere gị ozi.”’”

5 Jehova mechara sị Mosis: “Gwa Erọn, sị, ‘Setịa mkpara i ji n’aka n’elu osimiri niile, n’elu ọwa mmiri niile si n’Osimiri Naịl, nakwa n’elu ọdọ mmiri niile, ka mbàrá wee ju n’Ijipt.’” 6 Erọn wee setịa aka ya n’elu mmiri ndị dị n’Ijipt, mbàrá malitere ịpụta ma ju n’Ijipt. 7 Ma, ndị dibịa anwansi ji anwansi* ha mee otu ihe ahụ, ha mekwara ka mbàrá pụta n’Ijipt.+ 8 Fero kpọziri Mosis na Erọn, sị ha: “Rịọrọnụ m Jehova arịrịọ ka o wepụrụ mụ na ndị obodo m mbàrá ndị a,+ n’ihi na m chọrọ ịhapụ ndị Izrel ka ha gaa chụọrọ Jehova àjà.” 9 Mosis wee sị Fero: “Jiri aka gị kwuo mgbe m ga-arịọrọ gị arịrịọ ka e wepụrụ gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị obodo gị mbàrá ndị ahụ, wepụkwa ha n’ụlọ gị niile. Naanị n’Osimiri Naịl ka ha ga-afọ.” 10 Fero sịrị: “Echi.” Mosis wee sị: “Ka ọ dị otú i kwuru, ka i wee mara na e nweghị onye ọzọ dị ka Jehova bụ́ Chineke anyị.+ 11 Mbàrá ndị ahụ ga-apụ n’ahụ́ gị, n’ụlọ gị, n’ahụ́ ndị na-ejere gị ozi, nakwa n’ahụ́ ndị obodo gị. Naanị n’Osimiri Naịl ka ha ga-afọ.”+

12 Mosis na Erọn wee hapụ Fero pụọ. Mosis rịọrọ Jehova arịrịọ maka mbàrá ndị ahụ o ji na-ata Fero ahụhụ.+ 13 Jehova wee mee ihe Mosis rịọrọ ya. Mbàrá ndị ahụ malitere ịnwụ n’ụlọ ha, n’ogige ụlọ ha, nakwa n’ala ha. 14 Ha nọ na-ekpokọta ha n’ikpo n’ikpo. Ala ahụ wee malite isi ísì. 15 Mgbe Fero hụrụ na ha enwerela onwe ha, ọ kpọchiri obi ya+ ma jụ ige ha ntị, otú Jehova kwuru.

16 Jehova wee sị Mosis: “Gwa Erọn, sị, ‘Setịa mkpara gị kụọ n’ájá dị n’ala. Ọ ga-aghọ anwụnta* n’Ijipt niile.’” 17 Ha wee mee ya. Erọn setịrị mkpara o ji n’aka kụọ n’ájá dị n’ala, anwụnta wee ju n’ahụ́ ndị mmadụ nakwa n’ahụ́ ụmụ anụmanụ. Ájá niile dị n’ala ghọrọ anwụnta n’Ijipt niile.+ 18 Ndị dibịa anwansi gbalịrị ka ha jiri anwansi* ha mee otu ihe ahụ, ka anwụnta pụta,+ ma ha emelighị ya. Anwụnta ndị ahụ wee ju n’ahụ́ ndị mmadụ nakwa n’ahụ́ ụmụ anụmanụ. 19 Ndị dibịa anwansi ahụ wee sị Fero: “Aka Chineke dị n’ihe a!”*+ Ma obi Fero ka kpọchiri akpọchi, o geghịkwa ha ntị, otú Jehova kwuru.

20 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Bilie n’isi ụtụtụ gaa guzo n’ihu Fero. Lee, ọ ga-apụta ka ọ gaa na mmiri. Ị ga-asị ya, ‘Jehova kwuru, sị: “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.* 21 Ma, ọ bụrụ na ị hapụghị ndị m, m ga-ezitere gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị obodo gị odudu,* zitekwa ya n’ụlọ gị niile. Odudu ga-eju n’ụlọ ndị Ijipt, kpuchiekwa ala niile ha* bi. 22 N’ụbọchị ahụ, m ga-eme ka Goshen, bụ́ ebe ndị m bi, dị iche. E nweghị odudu ga-adị na ya.+ Ị ga-ejikwa ya mata na mụnwa, bụ́ Jehova, nọ n’ala a.+ 23 M ga-emekwa ka ndị m dị iche ná ndị gị. Echi ka ihe àmà a ga-eme.”’”

24 Jehova wee mee ya. Odudu malitere ife n’ìgwè n’ìgwè na-efeba n’ụlọ Fero nakwa n’ụlọ ndị na-ejere ya ozi nakwa n’Ijipt niile.+ Odudu ndị ahụ bibiri ala ahụ.+ 25 N’ikpeazụ, Fero kpọrọ Mosis na Erọn, sị ha: “Gaanụ chụọrọ Chineke unu àjà n’ala a.” 26 Ma Mosis sịrị: “Ọ dịghị mma ime otú ahụ n’ihi na ihe anyị ga-eji achụrụ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà agaghị adị ndị Ijipt mma.+ Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe na-adịghị ndị Ijipt mma chụọ àjà n’ihu ha, ọ̀ bụ na ha agaghị atụ anyị nkume? 27 Anyị ga-aga n’ala ịkpa, n’ebe ga-ewe anyị ụbọchị atọ iru. Ọ bụ n’ebe ahụ ka anyị ga-achụrụ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà, otú ọ gwara anyị.”+

28 Fero wee sị: “M ga-ahapụ unu ka unu gaa chụọrọ Jehova bụ́ Chineke unu àjà n’ala ịkpa. Ma, unu agakwala ebe dị ezigbo anya. Rịọrọnụ m Chineke arịrịọ.”+ 29 Mosis wee sị: “Ahapụla m gị pụwa, m ga-arịọkwara gị Jehova arịrịọ. Echi, odudu ndị a ga-ahapụ Fero na ndị na-ejere ya ozi nakwa ndị obodo ya. Ma, ka Fero ghara ịghọ anyị aghụghọ* ọzọ, ghara ikwe ka ndị anyị gaa chụọrọ Jehova àjà.”+ 30 Mosis hapụziri Fero gaa rịọ Jehova arịrịọ.+ 31 Jehova wee mee ihe Mosis rịọrọ ya. Odudu ndị ahụ hapụrụ Fero na ndị na-ejere ya ozi nakwa ndị obodo ya. Otu afọghị. 32 Ma Fero kpọchiri obi ya ọzọ. Ọ hapụghị ndị Izrel ka ha gawa.

9 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Gakwuru Fero, sị ya, ‘Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru kwuru, sị: “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.*+ 2 Ma ọ bụrụ na ị jụ ịhapụ ha ma ka jichie ha, 3 Jehova ga-ebi anụ ụlọ gị ndị nọ n’ọhịa aka.+ Ọrịa ọjọọ ga-arịa ịnyịnya, jakị, kamel, ìgwè ehi, na ìgwè atụrụ.+ 4 Jehova ga-eme ka e nwee ihe dị iche n’anụ ụlọ ndị Izrel na anụ ụlọ ndị Ijipt. E nweghị ihe ọ bụla bụ́ nke ndị Izrel ga-anwụ.”’”+ 5 Jehova kwukwara oge ihe a ga-eme, sị: “Echi ka Jehova ga-eme ihe a n’ala a.”

6 Jehova mekwara ya n’echi ya. Ụdị anụ ụlọ ọ bụla dị n’Ijipt malitere ịnwụ,+ ma e nweghị anụ ụlọ ọ bụla bụ́ nke ndị Izrel nwụrụnụ. 7 Mgbe Fero jụrụ ajụjụ ihe merenụ, ọ nụrụ na e nweghịdị otu anụ ụlọ ndị Izrel nwụrụnụ. N’agbanyeghị ihe a, obi Fero ka kpọchiri akpọchi, ọ hapụghịkwa ndị Izrel.+

8 Jehova gwaziri Mosis na Erọn, sị: “Sinụ n’ekwú kporo ntụ kpojuo aka unu. Mosis ga-awụlikwa ya elu n’ihu Fero. 9 Ọ ga-aghọ uzuzu n’Ijipt niile, ọ ga-aghọkwa etuto ọjọọ n’ahụ́ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ.”

10 Ha wee si n’ekwú kporo ntụ gaa guzo n’ihu Fero. Mosis wụliri ya elu, ya aghọọ etuto ọjọọ n’ahụ́ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ. 11 Ndị dibịa anwansi ahụ enweghị ike iguzo n’ihu Mosis n’ihi etuto ahụ, n’ihi na etuto ahụ toro ndị dibịa anwansi ahụ, tookwa ndị Ijipt niile.+ 12 Ma Jehova kwere ka obi Fero kpọchie, o geghịkwa ha ntị, otú Jehova gwara Mosis.+

13 Jehova wee sị Mosis: “Bilie n’isi ụtụtụ gaa guzo n’ihu Fero ma sị ya, ‘Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru kwuru, sị: “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.* 14 N’ihi na ugbu a, ọ bụ gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị obodo gị ka m ga-ata ahụhụ, ka i wee mara na e nweghị onye dị ka m n’ụwa niile.+ 15 N’ihi na m gaarala eweli aka m kpatara gị na ndị obodo gị ọrịa ọjọọ, ka e wee kpochapụ gị n’ụwa. 16 Ma ihe mere m ji hapụ gị ndụ bụ ka m gosi gị ike m nakwa ka a kọsaa aha m n’ụwa niile.+ 17 Ị̀ ka na-ebuli onwe gị elu ma ghara ịhapụ ndị m ka ha gawa? 18 Lee, m ga-eme ka nnukwu akụ́ mmiri ígwé zoo ka mmiri n’ụdị oge a echi. Ọ ga-abụ ụdị nke na-ezotụbeghị n’Ijipt malite n’ụbọchị Ijipt bidoro ịdị ruo ugbu a. 19 N’ihi ya, zie ozi ka a chịlata anụ ụlọ gị niile na ihe gị niile ma kpọlata ndị gị niile nọ n’ọhịa. Akụ́ mmiri ígwé ga-adagbu mmadụ ọ bụla na anụmanụ ọ bụla a na-akpọbataghị n’ụlọ.”’”

20 Onye ọ bụla n’ime ndị na-ejere Fero ozi, bụ́ onye ihe Jehova kwuru tụrụ egwu, kpọbatara ndị na-ejere ya ozi na anụ ụlọ ya n’ime ụlọ ozugbo. 21 Ma onye ọ bụla na-ejighị ihe Jehova kwuru kpọrọ ihe hapụrụ ndị na-ejere ya ozi na anụ ụlọ ya n’ọhịa.

22 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Welie aka gị chee n’eluigwe, ka akụ́ mmiri ígwé daa n’Ijipt niile,+ dakwasị mmadụ na anụmanụ na ahịhịa ndụ niile dị n’ubi n’ala Ijipt.”+ 23 Mosis weliri mkpara ya chee n’eluigwe, Jehova wee mee ka égbè eluigwe na-agba nakwa ka akụ́ mmiri ígwé na-ada, meekwa ka ọkụ* na-ada n’ala. Jehova nọkwa na-eme ka akụ́ mmiri ígwé na-ezo ka mmiri n’Ijipt. 24 Ka akụ́ mmiri ígwé nọ na-ezo, ọkụ nọkwa na-enwu. Ọ nọ na-ezosi ike. E nwetụbeghị nke dị ka ya n’Ijipt, malite mgbe Ijipt ghọrọ mba.+ 25 Akụ́ mmiri ígwé ahụ dagburu ihe niile dị n’ubi n’ala Ijipt niile, ma mmadụ ma anụmanụ. O bibikwara ahịhịa ndụ niile, dajisie osisi niile dị n’ọhịa.+ 26 Ọ bụ naanị na Goshen, bụ́ ebe ndị Izrel bi, ka akụ́ mmiri ígwé na-adaghị.+

27 Fero wee zigara Mosis na Erọn ozi, sị ha: “Emehiela m na nke ugbu a. Jehova bụ onye ezi omume. Ọ bụ mụnwa na ndị obodo m mejọrọ. 28 Rịọnụ Jehova arịrịọ ka égbè eluigwe ya na akụ́ mmiri ígwé ya kwụsị. M ga-ahapụkwa unu ka unu gawa. Unu agaghịzi anọ ebe a.” 29 Mosis wee sị ya: “Ozugbo m si n’obodo a pụọ, m ga-agbasa aka m n’ihu Jehova rịọ ya arịrịọ. Égbè eluigwe a ga-akwụsị, akụ́ mmiri ígwé agaghịkwa ada ọzọ, ka i wee mara na ọ bụ Jehova nwe ụwa.+ 30 Ma ama m na gị na ndị na-ejere gị ozi agaghịdị atụ egwu Jehova Chineke.”

31 E bibiri osisi ogho na ọka bali n’ihi na ọka bali amịala oko, osisi ogho amaakwala ifuru. 32 Ma e bibighị ọka wit na ọka spelt, n’ihi na oge ha ji amị erubeghị. 33 Mosis hapụrụ Fero ma si n’obodo ahụ pụọ. Ọ gbasara aka ya n’ihu Jehova rịọ ya arịrịọ. Égbè eluigwe ahụ na akụ́ mmiri ígwé ahụ wee kwụsị, mmiri kwụsịkwara izo n’ala ahụ.+ 34 Mgbe Fero hụrụ na mmiri ahụ na akụ́ mmiri ígwé ahụ na égbè eluigwe ahụ akwụsịla, o mehiere ọzọ ma kpọchie obi ya,+ ya na ndị na-ejere ya ozi. 35 Obi Fero ka kpọchiri akpọchi, ọ hapụghịkwa ndị Izrel ka ha gawa, otú Jehova si n’ọnụ Mosis kwuo.+

10 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Gakwuru Fero n’ihi na m kwere ka obi ya na obi ndị na-ejere ya ozi kpọchie,+ ka m wee mee ihe àmà m ndị a n’ihu ya,+ 2 ka i wee kọọrọ ụmụ gị na ụmụ ụmụ gị otú m si mesie ndị Ijipt ike nakwa ihe àmà ndị m mere n’etiti ha.+ Unu ga-amatakwa na m bụ Jehova.”

3 Mosis na Erọn wee gakwuru Fero, sị ya: “Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru kwuru, sị, ‘Olee mgbe ị ga-akwụsị inupụrụ m isi?*+ Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.* 4 N’ihi na ọ bụrụ na ị ka na-ajụ ịhapụ ndị m, m ga-eme ka igurube bịa n’ala gị echi. 5 Ha ga-ekpuchi elu ala, a gaghịkwa enwe ike ịhụ ala anya. Ha ga-erichapụ ihe akụ́ mmiri ígwé mebifọọrọ unu, ha ga-erichapụkwa osisi unu niile na-etopụta n’ubi.+ 6 Ha ga-eju n’ụlọ gị, n’ụlọ ndị niile na-ejere gị ozi, nakwa n’ụlọ ndị Ijipt niile ruo otú nna gị hà na nna nna gị hà na-ahụtụbeghị ya malite n’ụbọchị ha dịwara ndụ n’ala a ruo taa.’”+ O wee tụgharịa, hapụ Fero pụọ.

7 Ndị na-ejere Fero ozi gwaziri Fero, sị: “Ruo ole mgbe ka nwoke a ga na-emesi anyị ike?* Hapụ ndị a ka ha gaa fee Jehova bụ́ Chineke ha.* Ọ̀ bụ na ị matabeghị na Ijipt alaala n’iyi?” 8 E wee kpọghachi Mosis na Erọn n’ihu Fero, ya asị ha: “Gaanụ fee Jehova bụ́ Chineke unu.* Ma, oleedị ndị ga-aga?” 9 Mosis sịrị: “Anyị na ụmụntakịrị anyị, ndị agadi anyị, ụmụ anyị ndị nwoke, ụmụ anyị ndị nwaanyị, atụrụ anyị, na ehi anyị ga-eso aga,+ n’ihi na e nwere ememme anyị ga-emere Jehova.”+ 10 Ọ sịrị ha: “M nwaa anwaa hapụ unu ka unu na ụmụntakịrị unu gawa, maranụ na Jehova nọnyeere unu n’eziokwu!+ O doro anya na unu bu ihe ọjọọ n’obi. 11 Mba! Naanị ụmụ nwoke unu nwere ike ịga fee Jehova,* n’ihi na ọ bụ ihe unu rịọrọ.” E wee chụpụ ha n’ihu Fero.

12 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Setịa aka gị n’ala Ijipt ka igurube bịa, ka ha bịa n’ala Ijipt richapụ ahịhịa ndụ niile dị na ya, ya bụ, ihe niile akụ́ mmiri ígwé mebifọrọ.” 13 Ozugbo ahụ, Mosis setịrị mkpara ya n’ala Ijipt, Jehova wee mee ka ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ fee n’ala ahụ n’ụbọchị ahụ niile nakwa n’abalị ahụ niile. Mgbe chi bọrọ, ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ butere igurube. 14 Igurube ndị ahụ febatara n’Ijipt niile ma ju ebe niile n’ala Ijipt.+ Ha karịrị akarị.+ E nwetụbeghị mgbe igurube juru eju otú a, e nweghịkwa mgbe a ga-enwe ya ọtụtụ otú a ọzọ. 15 Ha kpuchiri ala ahụ niile ma mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị. Ha richapụrụ ahịhịa ndụ niile dị n’ala ahụ na mkpụrụ niile dị n’osisi ndị akụ́ mmiri ígwé na-emebighị. E nweghị ihe ọ bụla na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ fọrọ n’elu osisi ma ọ bụ n’ahịhịa dị n’ọhịa n’Ijipt niile.

16 Fero wee kpọọ Mosis na Erọn ọsọ ọsọ, sị: “Emehiela m Jehova bụ́ Chineke unu, mehiekwa unu. 17 Ugbu a, biko, gbagharanụ m mmehie m naanị otu ugboro a ma rịọsierenụ m Jehova bụ́ Chineke unu arịrịọ ike ka ọ kwụsịrị m nsogbu ọjọọ a.” 18 O* wee hapụ Fero pụọ gaa rịọ Jehova arịrịọ.+ 19 Jehova meziri ka e nwee oké ifufe nke si n’ebe ọdịda anyanwụ. O wee buru igurube ndị ahụ buba n’Oké Osimiri Uhie. Otu mkpụrụ igurube afọghị n’ala Ijipt niile. 20 Ma, Jehova kwere ka obi Fero kpọchie,+ ọ hapụghịkwa ndị Izrel ka ha gawa.

21 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Welie aka gị chee n’eluigwe, ka oké ọchịchịrị gbaa n’Ijipt.” 22 Mosis weliri aka ya ozugbo chee n’eluigwe, oké ọchịchịrị wee gbaa n’Ijipt niile ruo ụbọchị atọ.+ 23 Ha ahụghị ibe ha anya, e nweghịkwa otu n’ime ha biliri n’ebe ọ nọ ruo ụbọchị atọ. Ma ìhè dị n’ebe ndị Izrel niile bi.+ 24 Fero kpọziri Mosis, sị: “Gaanụ fee Jehova.*+ Unu ga-ahapụ naanị atụrụ unu na ehi unu. Ụmụntakịrị unu nwekwara ike iso unu gaa.” 25 Ma Mosis sịrị: “Ị ga-enyekwa anyị* ihe ndị anyị ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ nakwa àjà ndị ọzọ. Anyị ga-eji ha chụọrọ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà.+ 26 Anyị ga-achịrịkwa anụ ụlọ anyị gaa. Anyị agaghị ahapụ anụmanụ ọ bụla, n’ihi na anyị ga-eji ụfọdụ n’ime ha fee Jehova bụ́ Chineke anyị. Anyị amaghịkwa ihe anyị ga-eji achụrụ Jehova àjà ruo mgbe anyị ruru n’ebe ahụ.” 27 Jehova wee kwe ka obi Fero kpọchie, o kweghịkwa ahapụ ha ka ha gawa.+ 28 Fero sịrị ya: “Si n’ihu m pụọ! Anwakwala anwa bịa n’ihu m ọzọ, n’ihi na n’ụbọchị ị hụrụ ihu m, ị ga-anwụ.” 29 Mosis wee sị: “Agaghị m anwa anwa bịa n’ihu gị ọzọ, otú i kwuru.”

11 Jehova wee sị Mosis: “M ga-ata Fero na Ijipt otu ahụhụ ọzọ. E mechaa, ọ ga-ahapụ unu ka unu gawa.+ Mgbe ọ ga-ahapụ unu, ọ ga na-achụ unu achụ ka unu si n’ebe a pụọ.+ 2 Gwa ụmụ nwoke niile na ụmụ nwaanyị niile ná ndị m ka ha rịọ ndị agbata obi ha ka ha nye ha ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee.”+ 3 Jehova mekwara ka ihe ndị Izrel masị ndị Ijipt. Ndị na-ejere Fero ozi na ndị Ijipt ndị ọzọ na-akwanyekwara Mosis ezigbo ùgwù n’Ijipt.

4 Mosis wee sị: “Jehova kwuru, sị, ‘N’ihe dị ka n’etiti abalị, m ga-abanye n’ime Ijipt.+ 5 Nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt ga-anwụ,+ malite na nwa mbụ Fero, onye nọ n’ocheeze, ruo na nwa mbụ nke nwaanyị na-eje ozi, bụ́ onye na-egwe ihe na nkume e ji egwe nri, nakwa nwa ọ bụla anụ ụlọ bu ụzọ mụọ.+ 6 N’Ijipt niile, a ga-ebe oké ákwá nke a na-ebetụbeghị ụdị ya, nke a na-agaghịkwa ebe ụdị ya ọzọ.+ 7 Ma, nkịta agaghịdị agbọ ndị Izrel ụja, ma ụmụ nwoke ha ma anụmanụ ha, ka unu wee mara na Jehova nwere ike ime ka e nwee ihe dị iche ná ndị Ijipt na ndị Izrel.’+ 8 Ndị niile na-ejere gị ozi ga-abịakwute m ma kpọọrọ m isiala, sị, ‘Gawa, gị na ndị niile na-eso gị.’+ E mechaa, m ga-agawa.” O wee jiri iwe hapụ Fero pụọ.

9 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Fero agaghị ege unu ntị,+ ka ọrụ ebube m wee dị ọtụtụ n’Ijipt.”+ 10 Mosis na Erọn rụrụ ọrụ ebube ndị a niile n’ihu Fero.+ Ma Jehova kwere ka obi Fero kpọchie, nke mere na ọ hapụghị ndị Izrel ka ha si n’ala ya pụọ.+

12 Jehova gwaziri Mosis na Erọn okwu n’Ijipt, sị: 2 “Ọnwa a ga-abụrụ unu mbido ọnwa. Ọ ga-abụrụ unu ọnwa mbụ n’afọ.+ 3 Gwanụ nzukọ Izrel niile, sị, ‘N’ụbọchị nke iri n’ọnwa a, ka onye ọ bụla n’ime ha were otu atụrụ*+ maka ụlọ nna ya, otu atụrụ maka otu ezinụlọ. 4 Ma, ọ bụrụ na ya na ndị ezinụlọ ya agaghị atachali otu atụrụ maka na ha adịghị ọtụtụ, ha na ndị agbata obi ha* ga-eke ya n’ụlọ ha. Chọpụtanụ anụ onye nke ọ bụla ga-atachali, unu ejiri ya gbakọọ mmadụ* ole unu ga-adị rie atụrụ ahụ. 5 Atụrụ* unu ga-ewere ga-abụ nke ahụ́ dị mma.+ Ọ ga-abụ oké gbara otu afọ. Unu nwere ike isi n’ụmụ ebule ma ọ bụ n’ụmụ ewu họrọ. 6 Unu ga na-elekọta ya ruo n’ụbọchị nke iri na anọ n’ọnwa a.+ Ezinụlọ ọ bụla so ná nzukọ Izrel ga-egbu ya ná mgbede.*+ 7 Ha ga-eweretụ ọbara ya fesa n’awara ụzọ ha abụọ nakwa n’elu ọnụ ụzọ ụlọ ebe ndị ha ga-anọ rie ya.+

8 “Ha ga-eri anụ ya n’abalị ahụ.+ Ha ga-ahụ ya n’ọkụ ma rie ya na achịcha na-ekoghị eko+ na akwụkwọ nri na-elu ilu.+ 9 Erila nke ọ bụla n’anụ ya ná ndụ. Ejikwala mmiri sie ya, kama hụọ ya n’ọkụ, ma isi ya ma ụkwụ ya ma ihe ndị dị n’afọ ya. 10 Unu ahapụkwala nke ọ bụla n’ime ya ruo ụtụtụ, kama unu ga-akpọ ihe ọ bụla dịruru ụtụtụ ọkụ.+ 11 Otú a ka unu ga-esi eri ya: unu ga-eke ájị̀ n’úkwù, yiri akpụkpọ ụkwụ, jirikwa mkpara n’aka. Unu ga-erikwa ya ọkụ ọkụ. Ọ bụ Ememme Ngabiga Jehova. 12 N’ihi na m ga-agafe n’Ijipt n’abalị ahụ gbuo nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ.+ M ga-ekpekwa chi niile nke Ijipt ikpe ma taa ha ahụhụ.+ Abụ m Jehova. 13 Ọbara ahụ ga-abụrụ unu ihe àmà n’ụlọ ebe ndị unu nọ. M ga-ahụ ọbara ahụ ma gafere unu. Agaghị m eme unu ihe ọ bụla mgbe m ga-ata Ijipt ahụhụ.+

14 “‘Unu ga na-echeta ụbọchị ahụ. Unu ga na-eme ememme na ya ka ọ bụrụ ememme a na-emere Jehova n’ọgbọ unu niile. Unu ga na-eme ya ka ọ bụrụ iwu unu ga na-edebe mgbe niile. 15 Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ụbọchị asaa.+ N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-ewepụ ihe na-eko achịcha n’ụlọ unu, n’ihi na onye ọ bụla nke riri ihe e tinyere ihe na-eko achịcha, malite n’ụbọchị nke mbụ ruo n’ụbọchị nke asaa, a ga-egbu ya.* 16 N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ, nweekwa mgbakọ dị nsọ ọzọ n’ụbọchị nke asaa. Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla n’ụbọchị ndị a.+ Ọ bụ naanị ihe onye* ọ bụla ga-eri ka e nwere ike ịkwadebe.

17 “‘Unu ga na-eme Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko+ n’ihi na ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka m ga-esi n’Ijipt kpọpụta ndị unu dị ọtụtụ.* Unu ga na-echeta ụbọchị ahụ n’ọgbọ unu niile ka ọ bụrụ iwu unu ga na-edebe mgbe niile. 18 N’ọnwa mbụ, n’ụbọchị nke iri na anọ ya, ná mgbede, unu ga na-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ná mgbede ụbọchị nke iri abụọ na otu n’ọnwa ahụ.+ 19 A gaghị ahụ ihe na-eko achịcha n’ụlọ unu ruo ụbọchị asaa, n’ihi na onye ọ bụla riri ihe e tinyere ihe na-eko achịcha, ma ọ̀ bụ onye mbịarambịa ma ọ̀ bụ nwa afọ,+ a ga-egbu ya.*+ 20 Unu erila ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha. Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko n’ụlọ unu niile.’”

21 Mosis kpọrọ ndị okenye niile nke Izrel ngwa ngwa,+ sị ha: “Onye ọ bụla gaa họrọ anụmanụ* maka ezinụlọ ya, gbuokwanụ anụmanụ ahụ maka Ememme Ngabiga. 22 Unu ga-ewere ùkwù ahịhịa hisop bịanye n’ọbara dị n’efere ma tee ọbara ahụ n’elu ọnụ ụzọ unu nakwa n’awara ya abụọ. E nweghịkwa onye ọ bụla n’ime unu ga-apụta n’ọnụ ụzọ ụlọ ya ruo n’ụtụtụ. 23 Mgbe Jehova ga-agafe ka ọ taa ndị Ijipt ahụhụ, wee hụ ọbara ahụ n’elu ọnụ ụzọ nakwa n’awara ya abụọ, Jehova ga-agafere ọnụ ụzọ ahụ. Ọ gaghị ekwe ka ahụhụ ahụ* gbuo onye ọ bụla n’ụlọ unu.+

24 “Unu ga na-eme ememme a ka ọ bụrụ iwu unu na ụmụ unu ga na-edebe mgbe niile.+ 25 Mgbe unu batara n’ala ahụ Jehova ga-enye unu otú o kwuru, unu ga na-eme ememme a.+ 26 Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu, ‘Gịnị ka ihe a unu na-eme pụtara?’+ 27 unu ga-asị, ‘Ọ bụ àjà Ememme Ngabiga a na-achụrụ Jehova, bụ́ onye gafere ụlọ ndị Izrel n’Ijipt mgbe ọ tara ndị Ijipt ahụhụ, ma ọ hapụrụ ụlọ anyị.’”

Ha* wee hulata kpọọ isiala. 28 Ndị Izrel wee gaa mee ihe Jehova nyere Mosis na Erọn n’iwu.+ Ha mere nnọọ otú ahụ.

29 N’etiti abalị, Jehova gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt,+ malite na nwa mbụ Fero, onye nọ n’ocheeze, ruo na nwa mbụ nke onye a dọtara n’agha nọ n’ụlọ mkpọrọ, nakwa nwa ọ bụla anụmanụ bu ụzọ mụọ.+ 30 Fero na ndị niile na-ejere ya ozi na ndị niile ọzọ bụ́ ndị Ijipt biliri n’abalị ahụ. Ndị Ijipt bekwara nnukwu ákwá n’ihi na e nweghị ụlọ mmadụ na-anwụghị na ya.+ 31 Fero kpọrọ Mosis na Erọn+ ozugbo n’abalị ahụ, sị: “Bilienụ, hapụnụ ndị obodo m pụọ, ma unu ma ndị Izrel ndị ọzọ. Gaanụ fee Jehova,* otú unu kwuru.+ 32 Chịrịkwanụ ìgwè ewu na atụrụ unu na ìgwè ehi unu pụwa, otú unu kwuru.+ Ma, unu ga-agọzikwa m.”

33 Ndị Ijipt wee malite ịgwa ndị Izrel ka ha pụwa ọsọ ọsọ+ n’ala ha, ha nọ na-asị, “n’ihi na anyị niile anwụọla anwụọ!”+ 34 Ndị Izrel wee jiri ákwà fụchie ihe* ha ji agwọ ntụ ọka ma buru ya n’ubu ha, ya na ntụ ọka ha gwọrọ agwọ nke ha na-etinyebeghị ihe na-eko achịcha. 35 Ndị Izrel mere ihe Mosis gwara ha. Ha rịọrọ ndị Ijipt ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee nakwa ákwà.+ 36 Jehova mere ka ihe ha masị ndị Ijipt, nke mere na ha nyere ha ihe ndị ha rịọrọ. Ha wee gbawa ndị Ijipt aka.+

37 Ndị Izrel wee si na Ramesis+ pụọ gawa Sọkọt.+ Ha dị narị puku ụmụ nwoke isii (600,000) ji ụkwụ aga, ma e wepụ ụmụntakịrị.+ 38 Ọtụtụ ndị dị iche iche*+ sokwa ha gawa. Ha chịkwa ìgwè atụrụ na ìgwè ehi dị nnọọ ọtụtụ. 39 Ha ji ntụ ọka ahụ a gwọrọ agwọ ha si n’Ijipt buru pụta mewe achịcha na-ekoghị eko dị okirikiri. Ha etinyeghị ya ihe na-eko achịcha n’ihi na a chụpụrụ ha n’Ijipt ọkụ ọkụ, nke mere na ha enweghị ike iweta ihe ndị ha ga-eri.+

40 Mgbe ndị Izrel hapụrụ Ijipt,+ ha ebiela narị afọ anọ na iri atọ (430)+ ka ndị mbịarambịa. 41 Mgbe narị afọ anọ na iri atọ (430) ahụ gwụrụ, ndị Jehova niile ndị dị ọtụtụ* si n’Ijipt pụọ. Ọ bụ nnọọ n’ụbọchị a ka ha pụrụ. 42 Ọ bụ abalị ha ga-emere Jehova ememme maka na ọ kpọpụtara ha n’Ijipt. Ndị Izrel niile ga na-echeta abalị a ka ọ bụrụ abalị a ga na-emere Jehova ememme n’ọgbọ ha niile.+

43 Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị: “Ihe a bụ iwu na-achị Ememme Ngabiga a: E nweghị onye mbịarambịa ga-eri ya.+ 44 Ma, ọ bụrụ na e nwere onye nwere ohu nwoke o ji ego zụta, a ga-ebi ya úgwù.+ Ọ bụzi mgbe ahụ ka o nwere ike iso rie ya. 45 Onye ọbịa na onye ọrụ e goro ego agaghị eri ya. 46 Ọ bụ n’otu ụlọ ka a ga-eri ya. Esila n’ụlọ were anụ ya ọ bụla pụọ n’èzí. Agbajikwala ọkpụkpụ ya ọ bụla.+ 47 Nzukọ Izrel niile ga-eme ememme a. 48 Ọ bụrụ na onye mbịarambịa bi n’ụlọ gị, ya achọọ imere Jehova Ememme Ngabiga, a ga-ebi ya na nwoke ọ bụla bi n’ụlọ ya úgwù. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ ga-eme ememme a, ọ ga-adịzi ka nwa afọ. Ma, e nweghị nwoke a na-ebighị úgwù ga-eri ya.+ 49 Otu iwu ga na-achị nwa afọ na onye mbịarambịa nke binyeere unu.”+

50 Ndị Izrel niile wee mee ihe Jehova nyere Mosis na Erọn n’iwu. Ha mere nnọọ otú ahụ. 51 Ọ bụ n’ụbọchị a ka Jehova si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel na ìgwè ha dị iche iche.*

13 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Dooro m nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Izrel nsọ.* Ọ bụ m nwe nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ na anụmanụ ọ bụla bụ́ oké e bu ụzọ mụọ.”+

3 Mosis wee gwa ndị Izrel, sị: “Na-echetanụ ụbọchị a unu si n’Ijipt bụ́ ebe unu nọ na-agba ohu* pụta,+ n’ihi na Jehova ji aka ya dị ike si ebe a kpọpụta unu.+ N’ihi ya, unu erila ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha. 4 Unu na-apụ taa, n’ọnwa Ebib.*+ 5 Mgbe Jehova ga-akpọbata unu n’ala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọraịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus,+ nke ọ ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye unu,+ bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,*+ unu ga-eme ememme a n’ọnwa a. 6 Ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ụbọchị asaa.+ N’ụbọchị nke asaa, a ga-emere Jehova ememme. 7 Ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko n’ụbọchị asaa ahụ.+ A gaghị ahụ ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha n’aka gị,+ a gaghịkwa ahụ ihe na-eko achịcha n’ebe niile unu bi. 8 Ị ga-agwakwa nwa gị n’ụbọchị ahụ, sị, ‘M na-eme ihe a n’ihi ihe Jehova meere m mgbe m si n’Ijipt pụta.’+ 9 Ihe a ga-abụrụ gị ihe àmà n’aka gị nakwa ihe ncheta n’egedege ihu gị,*+ ka iwu Jehova wee dịrị n’ọnụ gị, n’ihi na Jehova ji aka ya dị ike kpọpụta gị n’Ijipt. 10 Kwa afọ, ị ga na-edebe iwu a n’oge ya a kara aka.+

11 “Mgbe Jehova kpọbatara gị n’ala ndị Kenan, nke ọ ṅụụrụ gị na nna nna gị hà iyi na ọ ga-enye gị,+ 12 ị ga-ewepụtara Jehova nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ* iche nakwa anụmanụ ọ bụla bụ́ oké nke anụ ụlọ i nwetara bu ụzọ mụọ. Ọ bụ Jehova nwe ha.+ 13 Ị ga-eji atụrụ gbara jakị ọ bụla e bu ụzọ mụọ. Ma ọ bụrụ na ị gbaraghị ya, ị ga-akụji ya olu. Ị ga-agbarakwa nwa nwoke ọ bụla i bu ụzọ mụọ n’ụmụ gị ndị nwoke.+

14 “Ọ bụrụ na nwa gị emechaa jụọ gị, sị, ‘Gịnị ka ihe a pụtara?’ ị ga-asị ya, ‘Jehova ji aka ya dị ike kpọpụta anyị n’Ijipt, n’ebe anyị nọ na-agba ohu.*+ 15 Mgbe Fero siri ọnwụ na ya agaghị ahapụ anyị ka anyị gawa,+ Jehova gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt, malite na nwa mbụ mmadụ mụrụ ruo na nwa mbụ anụmanụ mụrụ.+ Ọ bụ ya mere m ji achụrụ Jehova oké ọ bụla e bu ụzọ mụọ* n’àjà, na-agbarakwa nwa nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ụmụ m ndị nwoke.’ 16 Ihe a ga-abụrụ gị ihe àmà n’aka gị nakwa ihe ị ga-ekegide n’egedege ihu gị,*+ n’ihi na Jehova ji aka ya dị ike kpọpụta anyị n’Ijipt.”

17 Mgbe Fero hapụrụ ndị Izrel ka ha gawa, Chineke edughị ha gaa n’ụzọ gawara n’ala ndị Filistia, n’agbanyeghị na ọ dị nso. N’ihi na Chineke sịrị: “Ọ bụrụ na a lụso ha agha, ha nwere ike ịgbanwe obi ha ma laghachi Ijipt.” 18 N’ihi ya, Chineke mere ka ndị Izrel si n’ụzọ ala ịkpa nke Oké Osimiri Uhie gaa gburugburu.+ Ma ndị Izrel haziri onwe ha ka ndị agha mgbe ha si n’Ijipt na-apụ. 19 Mosis chịkwaara ọkpụkpụ Josef n’ihi na Josef mere ka ndị Izrel ṅụọrọ ya iyi. Josef sịrị: “O doro anya na Chineke ga-agbatara unu ọsọ enyemaka, chịrịkwanụ ọkpụkpụ m pụọ n’ebe a.”+ 20 Ha si na Sọkọt pụọ, maa ụlọikwuu n’Itam, n’ebe ala ịkpa ahụ jedebere.

21 Jehova ji ogidi ígwé ojii na-ebutere ha ụzọ n’ehihie,+ jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị. O ji ogidi ndị a na-edu ha ka ha nwee ike ịna-aga ma n’ehihie ma n’abalị.+ 22 Ogidi ígwé ojii ahụ anaghị esi n’ihu ha apụ n’ehihie, ogidi ọkụ ahụ anaghịkwa apụ n’abalị.+

14 Jehova gwaziri Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel ka ha laghachi azụ maa ụlọikwuu n’ihu Paịhahaịrọt, n’agbata Migdọl na oké osimiri, n’ebe chere Bel-zifọn ihu.+ Unu ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ oké osimiri ahụ, chee Bel-zifọn ihu. 3 Fero ga-ekwu banyere ndị Izrel, sị, ‘Ha na-awagharị n’ala a n’amaghị ebe ha ga-aga aga. Ha atọla n’ala ịkpa.’ 4 M ga-ekwe ka obi Fero kpọchie,+ ọ ga-achụwakwa ha. M ga-emeri Fero na ìgwè ndị agha ya niile, ka m wee wetara onwe m otuto.+ Ndị Ijipt ga-amarakwa na m bụ Jehova.”+ Ha wee mee otú ahụ.

5 E mechara kọọrọ eze Ijipt na ndị Izrel agbaala ọsọ. Ozugbo ahụ, obi Fero na ndị na-ejere ya ozi gbanwere.+ Ha wee sị: “Gịnị mere anyị ji mee ihe a ma hapụ ndị Izrel ka ha kwụsị ịgbara anyị ohu?” 6 Fero wee kwadebe ụgbọ ịnyịnya agha ya, kpọrọkwa ndị agha ya.+ 7 O ji narị ụgbọ ịnyịnya isii (600) ndị kacha mma na ụgbọ ịnyịnya niile ndị ọzọ e nwere n’Ijipt, kpọrọkwa ndị agha ga-anọkwasị na nke ọ bụla n’ime ha. 8 Jehova si otú a kwe ka obi Fero, eze Ijipt, kpọchie. O wee chụwa ndị Izrel ka ndị Izrel ji obi ike na-apụ.*+ 9 Ndị Ijipt chụwara ha.+ Ụgbọ ịnyịnya Fero niile na ndị agha ịnyịnya ya nakwa ndị agha ya chụkwutewere ndị Izrel mgbe ha nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu n’akụkụ oké osimiri, n’akụkụ Paịhahaịrọt, chee Bel-zifọn ihu.

10 Mgbe Fero rutekwuru nso, ndị Izrel leliri anya hụ na ndị Ijipt na-achụ ha. Egwu tụrụ ndị Izrel, ha amalite ibesara Jehova ákwá.+ 11 Ha sịrị Mosis: “Ọ̀ bụ maka na e nweghị ebe a na-eli ozu n’Ijipt mere i ji kpọta anyị ebe a ka anyị nwụọ n’ala ịkpa?+ Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Gịnị mere i ji kpọpụta anyị n’Ijipt? 12 Ọ̀ bụ na anyị agwaghị gị agwa n’Ijipt, sị, ‘Hapụ anyị ka anyị jewere ndị Ijipt ozi’? N’ihi na ọ kaara anyị mma ijere ndị Ijipt ozi kama ịnwụ n’ala ịkpa.”+ 13 Mosis wee sị ndị Izrel: “Unu atụla egwu.+ Nweenụ obi ike ka unu hụ otú Jehova ga-esi zọpụta unu taa.+ N’ihi na ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụ ha ọzọ.+ 14 Ọ bụ Jehova ga-alụrụ unu agha,+ ma unu ga-agba nkịtị.”

15 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Gịnị mere i ji na-ebesara m ákwá? Gwa ndị Izrel ka ha kwalie. 16 Weliekwa mkpara gị, setịa aka gị n’elu oké osimiri ka o kewaa, ka ndị Izrel wee si n’etiti oké osimiri, n’ala nkịtị, gafere. 17 Ma m ga-ekwe ka obi ndị Ijipt kpọchie, ka ha wee chụrụ ha gawa. M ga-emeri Fero na ndị agha ya niile, ụgbọ ịnyịnya agha ya, na ndị agha ịnyịnya ya, ka m si otú a wetara onwe m otuto.+ 18 Ndị Ijipt ga-amarakwa na m bụ Jehova mgbe m ga-emeri Fero, ụgbọ ịnyịnya agha ya, na ndị agha ịnyịnya ya, wee wetara onwe m otuto.”+

19 Mmụọ ozi nke ezi Chineke,+ onye na-ebutere ndị Izrel ụzọ, pụrụ gaa n’azụ ha. Ogidi ígwé ojii ahụ nke dị n’ihu ha gara n’azụ wee guzoro n’azụ ha.+ 20 O wee dịrị n’agbata ndị agha ndị Ijipt na ndị Izrel.+ N’otu akụkụ, ígwé ojii ahụ gbara ọchịchịrị. N’akụkụ nke ọzọ, ọ na-enye ìhè n’abalị.+ N’ihi ya, ndị Ijipt abịarughị ndị Izrel nso n’abalị ahụ niile.

21 Mosis setịrị aka ya n’elu oké osimiri ahụ.+ Jehova wee jiri oké ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ mee ka oké osimiri ahụ laghachi azụ n’abalị ahụ niile, nke mere ka ala oké osimiri ahụ bụrụzie ala nkịtị.+ Mmiri ahụ wee kewaa.+ 22 Ndị Izrel wee si n’etiti oké osimiri ahụ, n’ala nkịtị, gafere.+ Mmiri ahụ dị ka mgbidi n’aka nri ha nakwa n’aka ekpe ha.+ 23 Ndị Ijipt chụwara ha. Ịnyịnya Fero niile, ụgbọ ịnyịnya agha ya, na ndị agha ịnyịnya ya chụụrụ ha banye n’etiti oké osimiri ahụ.+ 24 N’oge nche ụtụtụ,* Jehova si n’ogidi ọkụ na ígwé ojii ahụ+ lee ndị agha Ijipt anya, o wee tinye ndị agha Ijipt n’ọgba aghara. 25 Ọ nọkwa na-ahịọpụsị ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ha, nke mere ka o siere ha ike ịgba ha. Ndị Ijipt nọkwa na-asị: “Ka anyị si n’ebe ndị Izrel nọ gbapụ, n’ihi na Jehova na-agbachitere ha, na-alụso anyị bụ́ ndị Ijipt ọgụ.”+

26 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Setịa aka gị n’elu oké osimiri a ka mmiri ya lọghachi rikpuo ndị Ijipt, ụgbọ ịnyịnya agha ha, na ndị agha ịnyịnya ha.” 27 Ozugbo ahụ, Mosis setịrị aka ya n’elu oké osimiri ahụ. Mgbe chi bọwara, oké osimiri ahụ lọghachiri otú ọ dịbu. Mgbe ndị Ijipt nọ na-agbapụta, Jehova tụbara ndị Ijipt n’etiti oké osimiri ahụ.+ 28 Mmiri ahụ nke na-alọghachi kpuchiri ụgbọ ịnyịnya agha ndị ahụ na ndị agha ịnyịnya nakwa ndị agha Fero niile bụ́ ndị chụụrụ ha banye n’oké osimiri.+ E nweghị otu onye n’ime ha fọrọ ndụ.+

29 Ma ndị Izrel gara ije n’ala nkịtị, n’etiti ala oké osimiri ahụ.+ Mmiri ahụ dị ka mgbidi n’aka nri ha nakwa n’aka ekpe ha.+ 30 Jehova si otú a zọpụta ndị Izrel n’aka ndị Ijipt n’ụbọchị ahụ.+ Ndị Izrel wee hụ ka ndị Ijipt nwụrụ n’ụsọ oké osimiri. 31 Ndị Izrel hụkwara nnukwu ike Jehova kpara wee bibie ndị Ijipt. Ndị Izrel maliteziri ịtụ egwu Jehova na inwe okwukwe na Jehova nakwa na Mosis ohu ya.+

15 N’oge ahụ, Mosis na ndị Izrel bụụrụ Jehova abụ a:+

“Ka m bụkuo Jehova abụ n’ihi na o meela ihe a ga-eji na-akwanyere ya ezigbo ùgwù.+

Ọ tụbala ịnyịnya na onye na-agba ya n’oké osimiri.+

 2 Jaa* bụ ike m na ume m, n’ihi na ọ na-azọpụta m.+

Onye a bụ Chineke m. M ga-eto ya.+ Ọ bụ Chineke nke nna m,+ m ga-ajakwa ya mma.+

 3 Jehova bụ onye agha dị ike.+ Jehova bụ aha ya.+

 4 Ọ tụbala ụgbọ ịnyịnya Fero na ndị agha ya n’oké osimiri.+

Ndị agha ya kacha mma emikpuola n’Oké Osimiri Uhie.+

 5 Mmiri na-ekwo ekwo kpuchiri ha. Ha mikpuru na mmiri miri emi ka nkume.+

 6 Jehova, aka nri gị dị ezigbo ike,+

Jehova, aka nri gị na-akụri onye iro.

 7 I ji ike gị dị ukwuu akwatu ndị na-emegide gị.+

Iwe gị na-enwuru ka ọkụ, ọ na-erepịakwa ha ka ahịhịa ọka.

 8 Ume si n’oghere imi gị mere ka mmiri guzoro ka mgbidi.

O guzoro otu ebe, gbochie mmiri na-asọ asọ.

Mmiri na-ekwo ekwo kpụkọtara n’etiti oké osimiri.

 9 Onye iro sịrị: ‘M ga-achụwa ha! M ga-achụkwuru ha!

M ga na-eke ihe m kwatara n’agha ruo mgbe afọ juru m!*

M ga-amịpụta mma agha m! Aka m ga-emeri ha!’+

10 I kupụrụ ume gị, oké osimiri ekpuchie ha.+

Ha miri n’ime nnukwu mmiri ka nkume led.*

11 Jehova, ònye n’ime chi niile dị ka gị?+

Ònye dị ka gị, gị onye na-egosi na ị dị ezigbo nsọ?+

Onye a ga-eji abụ otuto sọpụrụ, Onye na-eme ihe ndị dị ịtụnanya.+

12 I setịrị aka nri gị, ala eloo ha.+

13 I jirila ịhụnanya gị* duo ndị ị napụtara.+

Ị ga-eji ike gị duru ha gaa n’ebe dị nsọ i bi.

14 Ndị dị iche iche ga-anụ ya.+ Ha ga-ama jijiji.

Ụjọ* ga-ejide ndị bi na Filistia.

15 N’oge ahụ, ndị isi Ịdọm ga-atụ egwu,

Ndị ọchịchị Moab, bụ́ ndị dị ike, ga-amakwa jijiji.+

Obi ga-awụnye ndị niile bi na Kenan n’afọ.+

16 Egwu na ụjọ ga-ejide ha.+

N’ihi otú ogwe aka gị si dị ike, ha ga-anọrọ ka nkume na-anaghị emegharị ahụ́

Ruo mgbe ndị gị gafere n’ala ha, Jehova,

Ruo mgbe ndị i kere+ gafere.+

17 Ị ga-akpọrọ ha ma kụọ ha ka osisi n’ugwu nke gị,+

Bụ́ ebe ị kwadebere ka i biri na ya, Jehova,

Ụlọ nsọ nke aka gị rụrụ, Jehova.

18 Jehova ga-achị ruo mgbe niile ebighị ebi.+

19 Mgbe ịnyịnya Fero na ụgbọ agha ya na ndị agha ịnyịnya ya banyere n’oké osimiri ahụ,+

Jehova mere ka mmiri oké osimiri ahụ lọghachi kpuchie ha.+

Ma ndị Izrel jere ije n’ala nkịtị, si n’etiti oké osimiri ahụ gafere.”+

20 Miriam onye amụma nwaanyị, nwanne Erọn, wee were obere ịgbà, ụmụ nwaanyị niile jikwa obere ịgbà soro ya na-agba egwú. 21 Miriam nọ na-ekwere ụmụ nwoke ahụ, sị:

“Bụkuonụ Jehova abụ n’ihi na o meela ihe a ga-eji na-akwanyere ya ezigbo ùgwù.+

Ọ tụbala ịnyịnya na onye na-agba ya n’oké osimiri.”+

22 Mosis mechara duru ndị Izrel si n’Oké Osimiri Uhie pụta. Ha wee banye n’ala ịkpa Shọọ. Ha gara ije ụbọchị atọ n’ala ịkpa ahụ, ma ha ahụghị mmiri. 23 Ha bịarutere Mera,*+ ma ha enweghị ike ịṅụ mmiri dị na Mera maka na ọ na-elu ilu. Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ya Mera. 24 Ha wee malite ịkatọ* Mosis,+ sị: “Gịnị ka anyị ga-aṅụ?” 25 Mosis rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka.+ Jehova wee gosi ya otu osisi. Mgbe ọ tụbara osisi ahụ n’ime mmiri ahụ, mmiri ahụ tọwara ụtọ.

Chineke nyere ha iwu n’ebe ahụ, gosikwa ha ihe ọ chọrọ ka ha na-eme. Ọ nwalekwara ha n’ebe ahụ.+ 26 Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ị ga-ege ntị nke ọma n’olu Jehova bụ́ Chineke gị wee mee ihe dị mma n’anya ya ma na-erube isi n’ihe o nyere n’iwu nakwa ná ntụziaka ya niile,+ agaghị m eme ka ị rịa otu n’ime ọrịa ndị ahụ m mere ka ndị Ijipt rịa,+ n’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova, na-agwọ gị.”+

27 Mgbe e mechara, ha bịarutere n’Ilim, bụ́ ebe e nwere isi iyi iri na abụọ na nkwụ iri asaa. Ha wee maa ụlọikwuu n’akụkụ mmiri.

16 Mgbe nzukọ Izrel niile si n’Ilim pụọ, ha mechara bịarute n’ala ịkpa Sin,+ nke dị n’agbata Ilim na Saịnaị, n’abalị iri na ise n’ọnwa nke abụọ ha pụtachara n’Ijipt.

2 Nzukọ Izrel niile wee malite ịkatọ* Mosis na Erọn n’ala ịkpa ahụ.+ 3 Ndị Izrel nọ na-asị ha: “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na Jehova ji aka ya gbuo anyị n’Ijipt mgbe anyị nọ ọdụ n’akụkụ ite anụ,+ mgbe anyị nọ na-eriju nri afọ. Ugbu a unu akpọpụtala anyị, kpọta anyị n’ala ịkpa a ka ụnwụ gbuo ọgbakọ a niile.”+

4 Jehova wee sị Mosis: “M ga-eme ka achịcha si n’eluigwe zooro unu ka mmiri.+ Kwa ụbọchị, onye ọ bụla n’ime ndị m ga-aga kporo nke ga-ezuru ya n’ụbọchị,+ ka m wee nwalee ha mara ma hà ga-erube isi n’iwu m ka ọ̀ bụ na ha agaghị erube isi.+ 5 Ma n’ụbọchị nke isii,+ ha ga-ekporo ihe ha na-ekporo n’ụbọchị ndị ọzọ okpukpu abụọ ma kwadebe ya.”+

6 Mosis na Erọn wee gwa ndị Izrel niile, sị: “Ná mgbede, unu ga-amara n’eziokwu na ọ bụ Jehova kpọpụtara unu n’Ijipt.+ 7 N’ụtụtụ, unu ga-ahụ ebube Jehova n’ihi na ọ nụla nkatọ unu na-akatọ* Jehova. Ole ndị ka anyị bụ mere unu ga-eji na-akatọ* anyị?” 8 Mosis kwukwara, sị: “Mgbe Jehova ga-enye unu anụ unu ga-eri ná mgbede, nyekwa unu achịcha n’ụtụtụ nyejuo unu afọ, unu ga-amata na Jehova anụla nkatọ unu na-akatọ ya.* Ma, ole ndị ka anyị bụ? Ọ bụghị anyịnwa ka unu na-akatọ, kama ọ bụ Jehova.”+

9 Mosis wee sị Erọn: “Gwa nzukọ Izrel niile, sị, ‘Bịanụ nso n’ihu Jehova n’ihi na ọ nụla ntamu unu na-atamu.’”+ 10 Ozugbo Erọn gwachara nzukọ Izrel niile okwu, ha tụgharịrị chee ihu n’ala ịkpa ahụ. Ma lee, ebube Jehova pụtara n’ígwé ojii.+

11 Jehova gwakwara Mosis, sị: 12 “Anụla m ntamu ndị Izrel na-atamu.+ Gwa ha, sị, ‘Ná mgbede,* unu ga-eri anụ. N’ụtụtụ, unu ga-erijukwa achịcha afọ.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova bụ́ Chineke unu.’”+

13 Ná mgbede ahụ, nnụnụ kwel fedatara ju n’ebe ha mara ụlọikwuu.+ N’ụtụtụ ya, igirigi dara kpuchie ebe niile ha mara ụlọikwuu. 14 Mgbe igirigi ahụ kọrọ, e nwere iberibe ihe dị mụrụmụrụ juru n’ala ịkpa ahụ.+ Ha dị mụrụmụrụ ka mkpụrụ mmiri n’ala. 15 Mgbe ndị Izrel hụrụ ya, ha malitere ịsị ibe ha, “Gịnị ka ọ bụ?” maka na ha amaghị ihe ọ bụ. Mosis sịrị ha: “Ọ bụ achịcha Jehova nyere unu ka unu na-eri.+ 16 Jehova nyere iwu, sị, ‘Onye ọ bụla ga-ekporo ole ọ ga-erichali. Unu ga-agbakọ mmadụ* ole unu dị n’ụlọikwuu unu, unu ga-ekporokwa otu oma*+ maka otu onye.’” 17 Ndị Izrel malitere ime otú ahụ. Ha kpooro ya. Ụfọdụ kpooro nnukwu, ụfọdụ ekporo ntakịrị. 18 Mgbe ha ji oma* tụọ ya, e nweghị ihe mafọọrọ onye kpooro nnukwu. Nke onye kpooro ntakịrị zukwaara ya.+ Onye ọ bụla n’ime ha kpooro ole ọ ga-erichali.

19 Mosis wee sị ha: “Onye ahapụla ihe ọ bụla n’ime ya ruo ụtụtụ.”+ 20 Ma ha egeghị Mosis ntị. Mgbe ụfọdụ ndị hapụrụ ụfọdụ n’ime ya ruo ụtụtụ, ọ gbara ikpuru ma siwe ísì. Mosis wee wesa ha iwe. 21 Ha na-ekporo ya kwa ụtụtụ. Onye ọ bụla na-ekporo ole ọ ga-erichali. Mgbe anyanwụ chasiwere ike, ọ na-agbaze.

22 N’ụbọchị nke isii, ha kpooro okpukpu abụọ nke ihe ha na-ekporobu,+ ya bụ, oma* abụọ maka otu onye. Ndị niile so ná ndị isi nzukọ Izrel bịara kọọrọ ya Mosis. 23 O wee sị ha: “Ọ bụ ihe Jehova kwuru. Echi, onye ọ bụla ga-ezu naanị ike.* Ọ bụ ụbọchị izu ike dị nsọ a ga-edebere Jehova.+ Nke unu chọrọ iji mee achịcha, jirinụ ya mee achịcha. Nke unu chọrọ isi esi, sienụ ya.+ Dowekwanụ nke ọ bụla fọrọ, dowenụ ya ruo ụtụtụ.” 24 Ha dowere ya ruo ụtụtụ, otú Mosis nyere n’iwu. O sighị ísì, ikpuru adịghịkwa na ya. 25 Mosis wee sị: “Rienụ ya taa, n’ihi na taa bụ ụbọchị izu ike a na-edebere Jehova. Unu agaghị ahụ ya n’ala taa. 26 Ụbọchị isii ka unu ga-ekporo ya. Ma n’ụbọchị nke asaa, bụ́ Ụbọchị Izu Ike,+ e nweghị nke ga-adị.” 27 Ma, ụfọdụ n’ime ha gara ka ha kporo ya n’ụbọchị nke asaa, ma e nweghị ihe ha hụrụ.

28 Jehova wee sị Mosis: “Ruo ole mgbe ka unu ga-ajụ ime ihe m kwuru na idebe iwu m?+ 29 Burunụ n’obi na Jehova enyela unu Ụbọchị Izu Ike.+ Ọ bụ ya mere o ji enye unu ihe unu ga-eri ụbọchị abụọ n’ụbọchị nke isii. Onye ọ bụla ga-anọ n’ebe o bi. Onye apụkwala apụ n’ụbọchị nke asaa.” 30 Ndị Izrel wee debe Ụbọchị Izu Ike* n’ụbọchị nke asaa.+

31 Ndị Izrel kpọrọ achịcha ahụ “mana.”* Ọ na-acha ọcha ka mkpụrụ kọrịanda, ọ na-atọkwa ka keeki dị mbadamba e ji mmanụ aṅụ mee.+ 32 Mosis wee sị: “Jehova nyere iwu, sị, ‘Kpopụta mana ga-eju otu oma* ka ọ bụrụ ihe a ga-edowe ruo ọgbọ unu niile,+ ka ha wee hụ achịcha m nyere unu ka unu rie n’ala ịkpa mgbe m si n’Ijipt na-akpọpụta unu.’” 33 Mosis wee sị Erọn: “Were otu ite kponye mana ga-eju otu oma* ma dowe ya n’ihu Jehova ka ọ bụrụ ihe a ga-edowe ruo ọgbọ unu niile.”+ 34 Erọn dowere ya n’ihu Ihe Àmà ahụ+ ka ọ dịgide n’ebe ahụ, otú Jehova nyere Mosis n’iwu. 35 Ndị Izrel riri mana ruo afọ iri anọ,+ ruo mgbe ha batara n’ala ebe ndị mmadụ bi.+ Ha riri mana ruo mgbe ha bịarutere n’ókè ala Kenan.+ 36 Otu oma* bụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa.*

17 Nzukọ Izrel niile si n’ala ịkpa Sin pụọ.+ Ọ na-abụ ha si otu ebe kwalie, ha agaa n’ebe ọzọ, otú Jehova nyere ha n’iwu.+ Ha wee maa ụlọikwuu na Refidim.+ Ma mmiri ha ga-aṅụ adịghị.

2 Ndị Izrel wee malite isesa Mosis okwu,+ sị: “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Ma Mosis sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-esesa m okwu? Gịnị mere unu ji na-anwa Jehova ọnwụnwa?”+ 3 Ma agụụ mmiri nọ na-agụsi ha ike n’ebe ahụ. Ha nọkwa na-akatọ* Mosis,+ sị: “Gịnị mere i ji kpọpụta anyị n’Ijipt ka agụụ mmiri gụgbuo anyị na ụmụ anyị na anụ ụlọ anyị?” 4 N’ikpeazụ, Mosis rịọrọ Jehova, sị: “Gịnị ka m ga-eme ndị a? Obere oge ugbu a, ha ga-atụ m nkume.”

5 Jehova wee sị Mosis: “Kpọrọ ụfọdụ ndị okenye Izrel ka gị na ha gafete n’ihu ndị Izrel, werekwa mkpara gị nke ị kụrụ n’Osimiri Naịl.+ Jiri ya n’aka gawa. 6 Lee, m ga-eguzo n’ihu gị n’ebe ahụ n’oké nkume dị na Horeb. Ị ga-akụ mkpara n’oké nkume ahụ. Mmiri ga-esi na ya gbapụtara ndị a, ha ga-aṅụkwa ya.”+ Mosis mere ihe a n’ihu ndị okenye Izrel. 7 O wee kpọọ ebe ahụ Masa*+ nakwa Meriba*+ n’ihi okwu ndị Izrel sesara Mosis nakwa n’ihi na ha nwara Jehova ọnwụnwa,+ sị: “Jehova ọ̀ nọnyeere anyị, ka ọ̀ bụ na ọ nọnyereghị anyị?”

8 Ndị Amalek+ bịara lụso ndị Izrel agha na Refidim.+ 9 Mosis wee gwa Joshụa, sị:+ “Họrọ ụmụ nwoke ụfọdụ gaa lụso ndị Amalek agha. Echi, m ga-eji mkpara ezi Chineke n’aka m guzoro n’elu ugwu.” 10 Joshụa mere nnọọ ihe Mosis gwara ya+ ma lụso ndị Amalek agha. Mosis, Erọn, na Họọ+ gbagokwara n’elu ugwu.

11 Ọ na-abụ Mosis welie aka ya, ndị Izrel emeriwe. Ma ozugbo o weturu aka ya, ndị Amalek emeriwe. 12 Mgbe aka Mosis nyịwara ya arọ, ha buteere ya nkume, ya anọrọ ọdụ na ya. Erọn na Họọ wee jide ya aka n’aka ya abụọ. Otu onye jidere ya n’otu aka, onye nke ọzọ ejide ya n’aka nke ọzọ, nke mere ka aka ya abụọ dịrị n’elu ruo mgbe anyanwụ dara. 13 Joshụa si otú a merie ndị Amalek na ndị so ha.+

14 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Dee ihe a n’akwụkwọ ka e wee na-echeta ya, kwughachikwa ya ka Joshụa nụ ya, ‘M ga-ehichapụ ihe niile e nwere ike iji cheta Amalek n’ụwa.’”*+ 15 Mosis wee rụọ ebe ịchụàjà ma kpọọ ya Jehova-nisi,* 16 sị: “Ebe ọ bụ na aka ndị Amalek na-emegide ocheeze Jaa,+ Jehova ga-alụso ha agha n’ọgbọ ha niile.”+

18 Jetro onye nchụàjà Midian, nna nwunye Mosis,+ nụrụ ihe niile Chineke meere Mosis na ndị ya Izrel, otú Jehova si kpọpụta ndị Izrel n’Ijipt.+ 2 Jetro, nna nwunye Mosis, lekọtawara Zipora, nwunye Mosis, mgbe a kpọlataara ya Zipora 3 na ụmụ ya ndị nwoke abụọ.+ Aha a gụrụ otu n’ime ha bụ Geshọm*+ maka na Mosis sịrị, “Abụrụla m onye mbịarambịa ná mba ọzọ.” 4 A gụrụ onye nke ọzọ Eliiza* maka na ọ sịrị “Chineke nke nna m bụ onye na-enyere m aka, onye napụtara m ka Fero ghara iji mma agha gbuo m.”+

5 Jetro, nna nwunye Mosis, na ụmụ Mosis na nwunye ya chọọrọ Mosis bịa n’ala ịkpa, n’ebe ọ mara ụlọikwuu n’ugwu ezi Chineke.+ 6 O wee zie Mosis ozi, sị: “Mụnwa bụ́ Jetro, nna nwunye gị,+ kpọ nwunye gị na ụmụ gị ndị nwoke abụọ chọrọ gị na-abịa.” 7 Ozugbo ahụ, Mosis pụwara ka ọ gaa hụ nna nwunye ya. Mosis daara ya n’ala, susuo ya ọnụ.* Ha jụrụ ibe ha otú ha mere, ha abanyezie n’ụlọikwuu.

8 Mosis kọọrọ nna nwunye ya ihe niile Jehova mere Fero na ndị Ijipt n’ihi ndị Izrel,+ nsogbu niile bịaara ha n’ụzọ,+ nakwa otú Jehova si napụta ha. 9 Jetro ṅụrịrị ọṅụ maka ihe ọma niile Jehova meere ndị Izrel, napụta ha n’Ijipt.* 10 Jetro sịziri: “Ka otuto dịrị Jehova, onye napụtara unu n’aka Fero nakwa n’Ijipt, onye napụtakwara ndị Izrel n’aka ndị Ijipt ndị na-echi ha ọnụ n’ala. 11 Ugbu a, amatala m na Jehova karịrị chi niile ọzọ+ n’ihi ihe o mere ndị mpako ndị ji obi ọjọọ mesie ndị ya ike.” 12 Jetro, nna nwunye Mosis, wee wetara Chineke àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ. Erọn na ndị okenye niile nke Izrel bịakwara soro nna nwunye Mosis rie ihe n’ihu ezi Chineke.

13 N’echi ya, Mosis nọdụrụ ala otú ọ na-eme ka o kpeere ndị Izrel ikpe. Ha guzokwa n’ihu Mosis malite n’ụtụtụ ruo ná mgbede. 14 Mgbe nna nwunye Mosis hụrụ ihe niile ọ nọ na-emere ha, ọ sịrị ya: “Gịnị bụ ihe a ị na-emere ndị a? Gịnị mere o ji bụrụ naanị gị nọ ọdụ n’ebe a, mmadụ niile eguzoro n’ihu gị malite n’ụtụtụ ruo ná mgbede?” 15 Mosis gwara nna nwunye ya, sị: “Ọ bụ maka na ha na-abịakwute m ka m jụọ Chineke ase. 16 Ha nwee ikpe, ha na-abịakwute m. M na-ekpere otu onye na ibe ya ikpe, m na-emekwa ka a mata ihe ezi Chineke kpebiri nakwa iwu ya.”+

17 Nna nwunye Mosis gwara ya, sị: “Ihe ị na-eme adịghị mma. 18 Ike ga-agwụ gị, gwụkwa ndị a gị na ha nọ, n’ihi na ọrụ a karịrị gị. Ị gaghị arụli ya naanị gị. 19 Ugbu a, gee m ntị. M ga-adụ gị ọdụ, Chineke ga-anọnyekwara gị.+ Ị ga na-anọchite anya ha n’ihu ezi Chineke,+ ị ga na-akọkwara ezi Chineke okwu ha ji bịa.+ 20 Ị ga na-akụziri ha ntụziaka na iwu dị iche iche,+ na-emekwa ka ha mara otú ha ga-esi na-ebi ndụ nakwa ihe ndị ha ga na-eme. 21 Ma, ị ga-esi ná ndị Izrel họpụta ụmụ nwoke ruru eru+ bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke, ndị a ga-atụkwasịli obi, ndị kpọrọ uru e ji aghụghọ erite asị.+ Ị ga-emekwa ha ndị isi otu puku otu puku mmadụ, ndị isi otu narị otu narị mmadụ, ndị isi mmadụ iri ise mmadụ iri ise, na ndị isi mmadụ iri mmadụ iri.+ 22 Ha ga na-ekpe ndị Izrel ikpe mgbe ọ bụla e nwere ikpe, ha ga na-ewetakwara gị ikpe ọ bụla siri ike.+ Ma ha ga-ekpebi ikpe ọ bụla na-esighị ike. Ị ga-eme ka ihe dịkwuoro gị mfe ma ọ bụrụ na i kwe ka ha soro gị na-arụ ọrụ a.+ 23 Ọ bụrụ na i mee ihe a, ọ bụrụkwa ihe Chineke nyere gị n’iwu, ị ga-arụli ọrụ a, onye ọ bụla ga-ejikwa obi ụtọ laa n’ụlọ ya.”

24 Mosis gere nna nwunye ya ntị ozugbo ma mee ihe niile o kwuru. 25 Mosis si ná ndị Izrel niile họpụta ụmụ nwoke ruru eru ma mee ha ndị isi ndị Izrel, ya bụ, ndị isi otu puku otu puku mmadụ, ndị isi otu narị otu narị mmadụ, ndị isi mmadụ iri ise mmadụ iri ise, na ndị isi mmadụ iri mmadụ iri. 26 Ha wee na-ekpe ndị Izrel ikpe mgbe ọ bụla e nwere ikpe. Ha na-ewetara Mosis ikpe siri ike,+ ma ha na-ekpe ikpe ọ bụla na-esighị ike. 27 Mgbe e mechara, Mosis dupụrụ nna nwunye ya,+ ya alawa n’ala ya.

19 N’ọnwa nke atọ mgbe ndị Izrel pụtachara n’Ijipt, n’otu ụbọchị ahụ, ha batara n’ala ịkpa Saịnaị. 2 Ha si na Refidim+ kwalie bata n’ala ịkpa Saịnaị ma maa ụlọikwuu n’ala ịkpa ahụ. Ndị Izrel mara ụlọikwuu n’ebe ahụ n’ihu Ugwu Saịnaị.+

3 Mosis wee gbagoro n’ugwu ahụ ka ọ gakwuru ezi Chineke. Jehova sikwa n’ugwu ahụ gwa ya,+ sị: “Ị ga-agwa ezinụlọ Jekọb, bụ́ ndị Izrel, sị, 4 ‘Unu ejirila anya unu hụ ihe m mere ndị Ijipt,+ ka m wee buru unu butere onwe m otú ugo si eji nku ya ebu ụmụ ya.+ 5 Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-erube isi n’ihe niile m kwuru ma ghara imebi ọgbụgba ndụ mụ na unu ga-agba, unu ga-abụrụ m ndị pụrụ iche n’ime ndị niile ọzọ,+ n’ihi na ọ bụ m nwe ụwa niile.+ 6 Unu ga-abụrụ m alaeze nke ndị nchụàjà na-achị na ya nakwa mba dị nsọ.’+ Ọ bụ ihe ndị a ka ị ga-agwa ndị Izrel.”

7 Mosis gara kpọọ ndị okenye ndị Izrel ma gwa ha ihe niile a Jehova nyere ya n’iwu.+ 8 Mgbe e mechara, ha niile ji otu olu zaa, sị: “Anyị ga-eme ihe niile Jehova kwuru.”+ Ozugbo ahụ, Mosis gaghachiri gwa Jehova ihe ha kwuru. 9 Jehova gwara Mosis, sị: “Lee, m ga-abịakwute gị n’ígwé ojii, ka ndị Izrel nụ mgbe m ga-agwa gị okwu, ka ha wee nwee okwukwe na gị mgbe niile.” Mosis wee gwa Jehova ihe ndị Izrel kwuru.

10 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Gakwuru ndị Izrel. Jiri taa na echi mee ka ha dị nsọ, ha ga-asakwa ákwà ha. 11 Ha ga-ejikere maka ụbọchị nke atọ, n’ihi na n’ụbọchị nke atọ, Jehova ga-agbadata n’Ugwu Saịnaị n’ihu ha niile. 12 Ị ga-akpara ndị Izrel ókè gburugburu ugwu a ma sị ha, “Lezienụ anya ka unu ghara ịgbago n’ugwu a, ka ahụ́ unu gharakwa imetụ n’akụkụ ya. Onye ọ bụla ahụ́ ya metụrụ n’ugwu a, a ga-egburịrị ya. 13 E nweghị onye ga-emetụ onye ahụ aka, kama a ga-atụ ya nkume ma ọ bụ jiri akụ́ gbagbuo ya.* Ọ gaghị adị ndụ, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụmanụ.’+ Ma ha nwere ike ịgbagote n’ugwu a mgbe a fụrụ opi.”*+

14 Mosis wee si n’ugwu ahụ gbadaa gakwuru ndị Izrel. Ọ malitere ime ka ha dị nsọ, ha sakwara ákwà ha.+ 15 Ọ gwara ha, sị: “Jikerenụ maka ụbọchị nke atọ. Unu na ndị nwunye unu enwekwala mmekọahụ.”*

16 N’ụtụtụ ụbọchị nke atọ, égbè eluigwe gbawara, àmụ̀mà ana-egbukwa, ígwé ojii+ kpuchikwara ugwu ahụ, a nụwakwara ụda opi na-adasi ike. Ndị Izrel niile nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu wee malite ịma jijiji.+ 17 Mosis sizi n’ebe ahụ ha mara ụlọikwuu kpọpụta ha ka ha bịakwute ezi Chineke. Ha wee guzoro n’ala ala ugwu ahụ. 18 Ugwu Saịnaị niile kwụrụ anwụrụ ọkụ n’ihi na Jehova ji ọkụ gbadata na ya.+ Anwụrụ ọkụ sikwa na ya na-akwụgo elu ka anwụrụ ọkụ si ná nnukwu ekwú, ugwu ahụ niile nọkwa na-amasi jijiji ike.+ 19 Mgbe opi ahụ dasiwekwuru ụda ike, Mosis kwuru okwu, olu ezi Chineke wee zaa ya.

20 Jehova wee gbadata n’Ugwu Saịnaị, n’elu ugwu ahụ. Jehova kpọrọ Mosis ka ọ bịa n’elu ugwu ahụ, Mosis agbagoro.+ 21 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Gbadaa, dọọ ha aka ná ntị ka ha ghara isi ọnwụ bịa ka ha lee Jehova anya, ma ọ́ bụghị ya, ọtụtụ n’ime ha ga-anwụ. 22 Ka ndị nchụàjà, bụ́ ndị na-abịa Jehova nso mgbe niile, doo onwe ha nsọ, ka Jehova ghara igbu ha.”+ 23 Mosis wee sị Jehova: “Ndị Izrel enweghị ike ịgbagote n’Ugwu Saịnaị maka na i burula ụzọ dọọ anyị aka ná ntị, sị, ‘Kpaa ókè gburugburu n’ugwu a, meekwa ka ọ dị nsọ.’”+ 24 Ma, Jehova sịrị ya: “Gawa, gbadaa, e mechaa gị na Erọn agbagote. Ma ekwela ka ndị nchụàjà na ndị ọzọ sie ọnwụ ka ha bịakwute Jehova, ka ọ ghara igbu ha.”+ 25 Mosis wee gbadaa gakwuru ndị Izrel ma gwa ha ihe Chineke kwuru.

20 Chineke wee kwuo ihe ndị a niile, sị:+

2 “Abụ m Jehova Chineke gị, onye kpọpụtara gị n’Ijipt, bụ́ ebe ị nọ na-agba ohu.*+ 3 Enwela chi ọ bụla ọzọ ma e wepụ m.+

4 “Emerela onwe gị arụsị a pịrị apị ma ọ bụ ihe yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ ihe dị n’ụwa ma ọ bụ ihe dị na mmiri ndị dị n’ụwa.+ 5 Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ka i fee ha ofufe,+ n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+ M na-ata ụmụ ndị kpọrọ m asị ahụhụ, na-atakwa ọgbọ ha nke atọ nakwa ọgbọ ha nke anọ ahụhụ n’ihi mmehie ndị nna ha. 6 Ma m na-egosi otu puku ọgbọ nke ndị hụrụ m n’anya ma na-edebe iwu m+ na m hụrụ ha n’anya.

7 “Ejila aha Jehova bụ́ Chineke gị eme ihe efu+ n’ihi na Jehova ga-ata onye ji aha ya eme ihe efu ahụhụ.+

8 “Cheta Ụbọchị Izu Ike ka i doo ya nsọ.+ 9 Ị ga-eji ụbọchị isii jee ozi ma rụọ ọrụ gị niile.+ 10 Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike a ga na-edebere Jehova bụ́ Chineke gị. Arụla ọrụ ọ bụla, ma gị ma nwa gị nwoke ma nwa gị nwaanyị ma ohu gị nwoke ma ohu gị nwaanyị ma anụ ụlọ gị ma onye mbịarambịa nọ n’ebe i bi.+ 11 N’ihi na Jehova ji ụbọchị isii kee eluigwe na ụwa, oké osimiri, na ihe niile dị n’ime ha. O wee malite izu ike n’ụbọchị nke asaa.+ Ọ bụ ya mere Jehova ji gọzie Ụbọchị Izu Ike ma mee ka ọ dị nsọ.

12 “Sọpụrụ nne gị na nna gị,+ ka i wee dị ogologo ndụ n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị ga-enye gị.+

13 “Egbula mmadụ.*+

14 “Akwala iko.+

15 “Ezula ohi.+

16 “Agbagidela mmadụ ibe gị akaebe ụgha.+

17 “Agụụ iweghara ụlọ mmadụ ibe gị agụla gị. Agụụ nwunye mmadụ ibe gị+ ma ọ bụ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ma ọ bụ ehi ya ma ọ bụ jakị ya ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ́ nke mmadụ ibe gị agụla gị.”+

18 Mmadụ niile nọ na-anụ ụda égbè eluigwe na ụda opi, na-ahụkwa àmụ̀mà na-egbunụ na ugwu ahụ na-akwụ anwụrụ. Ihe ndị a ha hụrụ ma nụ ụda ha mere ka ha maa jijiji ma guzoro n’ebe dị anya.+ 19 Ha wee sị Mosis: “Gwawa anyị okwu. Anyị ga-ege ntị. Ma ka Chineke ghara ịgwa anyị okwu, ka anyị ghara ịnwụ.”+ 20 Mosis wee sị ha: “Unu atụla egwu n’ihi na ezi Chineke bịara ịnwale unu,+ ka unu wee na-atụ egwu ya, ka unu ghara imehie.”+ 21 Ha wee guzoro n’ebe dị anya, ma Mosis gara nso n’ígwé ojii ahụ bụ́ ebe ezi Chineke nọ.+

22 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Unu ejirila anya unu hụ na m si n’eluigwe gwa unu okwu.+ 23 Unu emela chi ọlaọcha ma ọ bụ chi ọlaedo n’ihi na unu agaghị enwe chi ọ bụla ọzọ ma e wepụ m.+ 24 Unu ga-eji ájá rụọrọ m ebe ịchụàjà. Unu ga-achụkwa àjà unu a na-esu ọkụ na àjà udo unu nakwa atụrụ unu na ehi unu n’elu ya. M ga-abịakwute unu n’ebe ọ bụla m họọrọ ka a na-echeta aha m,*+ m ga-agọzikwa unu. 25 Ọ bụrụ na unu ga-eji nkume rụọrọ m ebe ịchụàjà, unu ejila nkume a wara awa rụọ ya.+ N’ihi na unu ga-emerụ ya ma ọ bụrụ na unu ejiri chịsụl waa ya. 26 Unu arụnyela steepụ n’ebe ịchụàjà m nke unu ga-esi na-agbago na ya, ka e wee ghara ikpughe ihe unu ji bụrụ nwoke* n’elu ya.’

21 “Ihe ndị a bụ ihe ndị m kpebiri ị ga-agwa ha:+

2 “Ọ bụrụ na ị zụta onye Hibru ka ọ bụrụ ohu gị,+ ọ ga-abụ ohu ruo afọ isii. Ma n’afọ nke asaa, ọ ga-enwere onwe ya n’akwụghị gị ụgwọ ọ bụla.+ 3 Ọ bụrụ na ọ bịara naanị ya, ọ bụ naanị ya ga-ala. Ọ bụrụ na ọ kpọ nwaanyị bịa, ya na nwunye ya ga-eso laa. 4 Ọ bụrụ na nna ya ukwu lụnyere ya nwaanyị, ya amụọrọ ya ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị, nwunye ya na ụmụ ya ga-abụ nke nna ya ukwu, naanị ya ga-ala.+ 5 Ma ọ bụrụ na ohu ahụ ekweghị ala, wee sị, ‘Ahụrụ m nna m ukwu na nwunye m na ụmụ m n’anya. Achọghị m inwere onwe m,’+ 6 nna ya ukwu ga-akpọta ya n’ihu ezi Chineke. Ọ ga-akpọrọ ya gaa n’ọnụ ụzọ ma ọ bụ n’awara ụzọ ma jiri ihe e ji akpọpu ntị kpọpuo ya ntị. Ọ ga-abụzi ohu ya ná ndụ ya niile.

7 “Ọ bụrụ na nwoke eree nwa ya nwaanyị ka ọ bụrụ ohu, ọ bụghị otú nwoke bụ́ ohu si ala ka ọ ga-esi ala ma o nwere onwe ya. 8 Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ adịghị nna ya ukwu mma, nna ya ukwu ejighịkwa ya mere iko nwaanyị, kama ya ekpebie iresị ya onye ọzọ,* ọ gaghị eresị ya ndị mba ọzọ n’ihi na ọ ghọrọ nwaanyị ahụ aghụghọ. 9 Ọ bụrụ na ọ kpọnye ya nwa ya nwoke, ọ ga-emere ya ihe mmadụ na-emere nwa ya nwaanyị. 10 Ọ bụrụ na ọ lụọ nwaanyị ọzọ, ọ ga na-enye nwunye mbụ ya ihe oriri, ákwà, na ihe ruuru ya*+ otú o kwesịrị. 11 Ọ bụrụ na ọ gaghị emere nwaanyị ahụ ihe atọ a, nwaanyị ahụ ga-ala n’akwụghị ya ego ọ bụla.

12 “A ga-egbu onye ọ bụla kụgburu mmadụ.+ 13 Ma ọ bụrụ na ọ maghị ụma gbuo onye ahụ, ezi Chineke ekwe ka ihe a mee, m ga-ahọpụtara unu ebe o nwere ike ịgbaga.+ 14 Ọ bụrụ na mmadụ ewesa mmadụ ibe ya oké iwe ma mara ụma gbuo ya,+ a ga-egbu ya. Ọ bụrụgodị na ọ gbagara n’ebe ịchụàjà m, unu ga-akpọpụta ya ma gbuo ya.+ 15 A ga-egbu onye tiri nne ya ma ọ bụ nna ya ihe.+

16 “Ọ bụrụ na mmadụ atọrọ mmadụ+ ree ma ọ bụ a chọta onye ahụ n’aka ya,+ a ga-egbu ya.+

17 “Onye ọ bụla kpọrọ nne ya ma ọ bụ nna ya iyi,* a ga-egbu ya.+

18 “Ihe a bụ ihe unu ga-eme ma ọ bụrụ na ụmụ nwoke na-ese okwu, otu atụọ ibe ya nkume ma ọ bụ kụọ ya ọkpọ* wee merụọ ya ahụ́, ma ọ nwụghị, kama ọ naghị ebiliteli n’àkwà* ya: 19 Ọ bụrụ na o bilie jiri mkpara gagharịwa n’èzí, a gaghị ata onye ahụ tụrụ ya nkume ma ọ bụ kụọ ya ọkpọ ahụhụ. Naanị na ọ ga-akwụ onye ahụ o merụrụ ahụ́ ụgwọ maka oge niile ọ na-arụghị ọrụ ruo mgbe ọ gbakechara.

20 “Ọ bụrụ na mmadụ akụọ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị osisi, kụgbuo ya, a ga-ata ya ahụhụ.+ 21 Ma ọ bụrụ na ohu ahụ anwụghị ruo otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ, a gaghị ata onye nwe ya ahụhụ n’ihi na ọ bụ ego ya ka o ji zụọ ya.

22 “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-alụ ọgụ, ha emerụọ nwaanyị dị ime ahụ́, ya amụọ nwa mgbe oge ya na-erubeghị,*+ ma e nweghị onye nwụrụ,* onye ahụ merụrụ nwaanyị ahụ ahụ́ ga-akwụ ihe ọ bụla di ya gwara ya kwụọ. Ọ ga-abụkwa ihe ndị ikpe kpebiri.+ 23 Ma ọ bụrụ na e nwee onye nwụrụ,* a ga-egbu onye ahụ gburu mmadụ.*+ 24 Onye kụkpọrọ mmadụ anya, a ga-akụkpọ ya anya. Onye kụpụrụ mmadụ ezé, a ga-akụpụ ya ezé. Onye gbajiri mmadụ aka, a ga-agbaji ya aka. Onye gbajiri mmadụ ụkwụ, a ga-agbaji ya ụkwụ.+ 25 Onye dara mmadụ ọkụ, a ga-ada ya ọkụ. Onye merụrụ mmadụ ahụ́, a ga-emerụ ya ahụ́. Onye kụrụ mmadụ ọkpọ, a ga-akụ ya ọkpọ.

26 “Ọ bụrụ na mmadụ akụọ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ihe n’anya, kụkpọọ ya anya, ọ ga-ahapụ ohu ya ahụ ka ọ lawa iji kwụọ ya ụgwọ maka anya ya.+ 27 Ọ bụrụ na ọ kụpụrụ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ezé, ọ ga-ahapụ ohu ya ahụ ka ọ lawa iji kwụọ ya ụgwọ maka ezé ya.

28 “Ọ bụrụ na ehi asọọ nwoke ma ọ bụ nwaanyị mpi, onye ahụ anwụọ, a ga-eji nkume tụgbuo ehi ahụ,+ a gaghịkwa eri anụ ya eri. Ma a gaghị ata onye nwe ehi ahụ ahụhụ. 29 Ma ọ bụrụ na ehi ahụ na-asọbu ndị mmadụ mpi, ya abụrụkwa na a dọọla onye nwe ya aka ná ntị, ma o jideghị ehi ahụ, ehi ahụ egbuo nwoke ma ọ bụ nwaanyị, a ga-eji nkume tụgbuo ehi ahụ, gbuokwa onye nwe ya. 30 Ọ bụrụ na a gwa ya ihe ọ ga-akwụ ka ọ gbara isi ya, ọ ga-akwụ ihe niile a gwara ya kwụọ ka ọ bụrụ ihe o ji gbapụta ndụ* ya. 31 Ma ọ̀ bụ nwa nwoke ma ọ̀ bụ nwa nwaanyị ka ehi ahụ sọrọ mpi, a ga-eme onye nwe ya ihe a m kpebiri. 32 Ọ bụrụ ohu nwoke ma ọ bụ ohu nwaanyị ka ehi ahụ sọrọ mpi, onye nwe ehi ahụ ga-akwụ nna ukwu ohu ahụ shekel* iri atọ. A ga-ejizi nkume tụgbuo ehi ahụ.

33 “Ọ bụrụ na mmadụ emeghee olulu ma ọ bụ gwuo olulu, ma o kpuchighị ya ihe, ehi ma ọ bụ jakị adaba n’ime ya, 34 onye nwe olulu ahụ ga-akwụ ụgwọ ya.+ Ọ ga-akwụ onye nwe anụ ahụ ego ole anụ ahụ ruru. Anụ ahụ nwụrụ anwụ ga-abụzi nke ya. 35 Ọ bụrụ na ehi mmadụ emerụọ ehi onye ọzọ ahụ́, ehi ahụ anwụọ, ha ga-ere ehi ahụ dị ndụ, kee ego e retere ya. Ha ga-ekekwa anụ ahụ nwụrụ anwụ. 36 Ma ọ bụ, ọ bụrụ na e nwere ehi a ma na ọ na-asọ anụmanụ ndị ọzọ mpi, ma onye nwe ya ejideghị ya, onye nwe ya ga-akwụ ụgwọ anụmanụ ọ sọgburu. Ọ ga-eji ehi kwụọ ụgwọ ehi. Nke ahụ nwụrụ anwụ ga-abụzi nke ya.

22 “Ọ bụrụ na mmadụ ezuo ehi ma ọ bụ atụrụ, wee gbuo ya ma ọ bụ ree ya, ọ ga-eji ehi ise kwụọ ụgwọ ehi ahụ, jirikwa atụrụ anọ kwụọ ụgwọ atụrụ ahụ.+

2 (“Ọ bụrụ na a hụ onye ohi+ ka ọ na-abanye n’ụlọ mmadụ n’abalị, a kụgbuo ya, ikpe ọbara amaghị onye gburu ya. 3 Ọ bụrụ na anyanwụ awaala mgbe onye ohi ahụ bịara, ikpe ọbara mara onye gburu ya.)

“Onye ohi ga-akwụ ụgwọ ihe o zuru. Ọ bụrụ na e nweghị ihe o nwere, a ga-ere ya kwụọ ụgwọ ihe o zuru. 4 Ọ bụrụ na a hụ ihe o zuru n’aka ya mgbe ihe ahụ ka dị ndụ, ọ ga-akwụ ụgwọ ya okpukpu abụọ, ma ọ̀ bụ ehi ma ọ̀ bụ jakị ma ọ̀ bụ atụrụ.

5 “Ọ bụrụ na mmadụ akpọpụ anụmanụ ya ka ha gaa taa nri n’ugbo ma ọ bụ n’ubi vaịn, ha ataa nri n’ugbo onye ọzọ, onye ahụ ga-eji ugbo ya kacha mma ma ọ bụ ubi vaịn ya kacha mma kwụọ ụgwọ ya.

6 “Ọ bụrụ na a mụnyere ọkụ, ya abanye n’osisi ogwu ma rechapụ ọka* ndị e kere n’ùkwù n’ùkwù ma ọ bụ ọka ndị kwụ ọtọ ma ọ bụ ubi, onye mụnyere ọkụ ahụ ga-akwụ ụgwọ ihe ọkụ ahụ mebiri.

7 “Ọ bụrụ na mmadụ enye mmadụ ibe ya ego ma ọ bụ ihe ọzọ ka o jidere ya, e wee zuru ya n’ụlọ onye ahụ, ọ bụrụ na a hụ onye zuru ya, ọ ga-akwụ ụgwọ ya okpukpu abụọ.+ 8 Ọ bụrụ na a hụghị onye zuru ya, a ga-akpọta onye nwe ụlọ ahụ n’ihu ezi Chineke+ ka a mara ma ọ̀ bụ ya weere ihe mmadụ ibe ya. 9 Mgbe ọ bụla mmadụ abụọ na-ese okwu n’ihi ehi, jakị, atụrụ, uwe, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ furu efu maka na otu onye sịrị, ‘Ọ bụ m nwe ihe a,’ ha abụọ ga-abịa n’ihu ezi Chineke.+ Onye ọ bụla Chineke kwuru na ọ bụ ya ka ikpe mara ga-akwụ onye nke ọzọ ụgwọ ihe ahụ okpukpu abụọ.+

10 “Ọ bụrụ na mmadụ kpụnyere mmadụ ibe ya jakị ma ọ bụ ehi ma ọ bụ atụrụ ma ọ bụ anụ ụlọ ọ bụla ọzọ ka o lekọtara ya, o wee nwụọ ma ọ bụ e merụọ ya ahụ́ ma ọ bụ a kpụrụ ya, ma e nweghị onye hụrụ ihe merenụ, 11 onye a kpụnyere anụ ahụ ga-aṅụ iyi n’ihu Jehova na ya emetụghị ihe mmadụ ibe ya aka. Onye nwe anụ ahụ ga-ekwere ihe o kwuru. Onye ahụ a kpụnyere ya agaghị akwụ ụgwọ ya.+ 12 Ma ọ bụrụ na e zuru anụ ahụ mgbe ọ ka nọ n’aka ya, ọ ga-akwụ onye nwe ya ụgwọ ya. 13 Ọ bụrụ na ọ bụ anụ ọhịa dọgburu ya, ọ ga-ebute ozu anụ ahụ ka ọ bụrụ ihe akaebe. Ọ gaghị akwụ ụgwọ anụ ọ bụla anụ ọhịa dọgburu.

14 “Ma ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụmanụ mmadụ ibe ya, anụmanụ ahụ emerụọ ahụ́ ma ọ bụ nwụọ mgbe ọ na-anọghị n’aka onye nwe ya, onye ahụ gbaziiri ya ga-akwụ ụgwọ ya. 15 Ọ bụrụ na ọ nọ n’aka onye nwe ya, ọ gaghị akwụ ụgwọ ya. Ọ bụrụ na a kwụrụ onye nwe ya ụgwọ gbaziri ya, ego ahụ a kwụrụ ga-abụzi ụgwọ anụ ahụ.

16 “Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-ekwebeghị nkwa ọlụlụ, ya na ya enwee mmekọahụ,* ọ ga-akwụ ụgwọ isi ya lụwa ya.+ 17 Ọ bụrụ na nna nwa agbọghọ ahụ ekweghị ka nwoke ahụ lụọ ya, ọ ga-akwụ ego ole a na-akwụ n’isi nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.

18 “Ahapụla nwaanyị na-agba afa ndụ.+

19 “A ga-egbu onye ọ bụla ya na anụmanụ nwere mmekọahụ.+

20 “Onye ọ bụla chụụrụ chi ọ bụla àjà ma e wepụ naanị Jehova, a ga-egbu ya.+

21 “Unu emesila onye mbịarambịa ike, unu emegbukwala ya,+ n’ihi na e nwere mgbe unu bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt.+

22 “Unu emegbula nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwa na-enweghị nna.*+ 23 E nwee ka unu si megbuo ya, ya ebesara m ákwá, m ga-anụ ákwá ya.+ 24 M ga-ewesa unu ezigbo iwe, m ga-ejikwa mma agha gbuo unu. Ndị nwunye unu ga-abụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ụmụ unu ga-abụkwa ụmụ na-enweghị nna.

25 “Ọ bụrụ na i binye onye ọ bụla bụ́ ogbenye n’ime ndị m gị na ya bi ego, emesola ya otú ndị na-anara ọmụrụ nwa ma ha binye mmadụ ego si eme. Anarala ya ọmụrụ nwa.+

26 “Ọ bụrụ na ị chịrị uwe mmadụ ibe gị ka ọ bụrụ ihe ibé mgbe i binyere ya ego,+ ị ga-achịghachiri ya uwe ya mgbe anyanwụ dara. 27 N’ihi na ọ bụ naanị ákwà o nwere o ji ekpuchi ahụ́ ya. Gịnịzi ka ọ ga-eji hie ụra?+ O besara m ákwá, m ga-anụ olu ya n’ihi na m na-eme ebere.*+

28 “Akpọla Chineke iyi.*+ Akpọkwala onye na-achị* ndị gị iyi.+

29 “Ejila obi abụọ enye m onyinye mgbe ubi gị mepụtara ihe n’ụba nakwa mgbe mmanya na mmanụ juru n’ebe a na-azọchapụtara gị mmanya na mmanụ.+ Ị ga-enye m nwa nwoke mbụ ị mụtara.+ 30 Ihe a ka ị ga-eme ehi gị na atụrụ gị:+ Ya na nne ya ga-anọ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, ị ga-enye m ya.+

31 “Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ.+ Unu erikwala anụ ọ bụla anụ ọhịa dọgburu n’ọhịa.+ Unu ga-atụpụrụ ya nkịta.

23 “Akọsala akụkọ na-abụghị eziokwu.+ Adụnyerela onye ajọ omume úkwù gaa gbaa akaebe ụgha ka i megide mmadụ.+ 2 Esorola ìgwè mmadụ mee ihe ọjọọ. Agbakwala akaebe ga-eme ka a ghara ikpe ikpe ziri ezi maka na ị chọrọ ime ihe ga-adị ìgwè mmadụ mma.* 3 Mgbe ị na-eleba anya n’okwu ogbenye, ejila maka na ọ bụ ogbenye kpelaara ya ikpe.+

4 “Ọ bụrụ na ị hụ ehi ma ọ bụ jakị onye iro gị ka ọ na-akpafu, kpụrụ ya kpụghachiri ya.+ 5 Ọ bụrụ na ị hụ jakị onye kpọrọ gị asị ka ọ dara makpuru n’ala n’ihi ibu o bu, ahapụla ya pụwa. Nyere onye ahụ aka tọtuo ibu anụ ahụ bu.+

6 “Ekpela ikpe na-ezighị ezi mgbe ị na-ekpe ikpe onye dara ogbenye.+

7 “Ya enwela ihe ga-ejikọ gị na ebubo* ụgha. Egbukwala onye aka ya dị ọcha na onye ezi omume, n’ihi na agaghị m akpọ onye ajọ omume onye ezi omume.*+

8 “Anala aka azụ* n’ihi na ịna aka azụ na-emegharị ndị ikpe anya.* O nwekwara ike ime ka ndị bụ́ ezigbo mmadụ gbanwee okwu ha.+

9 “Emegbula onye mbịarambịa. Unu ma otú ihe na-adịrị onye mbịarambịa n’ihi na e nwere mgbe unu bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt.+

10 “Afọ isii ka ị ga-agha mkpụrụ n’ala gị, ghọrọkwa mkpụrụ ya.+ 11 Ma n’afọ nke asaa, ị gaghị akọ ya ihe. Ị ga-ahapụ ya ka ọ tọgbọrọ nkịtị. Ndị dara ogbenye ga-eri ihe dị na ya, anụ ọhịa ga-erikwa ihe ha rifọrọ. Ọ bụ ihe ị ga-eme ubi vaịn gị na ubi oliv gị.

12 “Ụbọchị isii ka ị ga-arụ ọrụ gị. Ma n’ụbọchị nke asaa, arụla ọrụ, ka ehi gị na jakị gị zuo ike, nwa ohu gị nwaanyị na onye mbịarambịa ezuokwa ike.+

13 “Lezienụ anya mee ihe niile m gwara unu.+ Unu akpọkwala aha chi ọ bụla ọzọ. E kwesịghị ịnụ aha ha n’ọnụ unu.+

14 “Ugboro atọ n’afọ ka ị ga-emere m ememme.+ 15 Ị ga na-eme Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko.+ Ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ụbọchị asaa otú m nyere gị n’iwu, n’oge a kara aka n’ọnwa Ebib,*+ n’ihi na ọ bụ n’oge ahụ ka i si n’Ijipt pụta. E nweghị onye ga-agba aka bịa n’ihu m.+ 16 Ị ga-emekwa Ememme Owuwe Ihe Ubi* nke mkpụrụ mbụ kara aka ị rụtara ná mkpụrụ ị ghara n’ubi.+ Ị ga-emekwa Ememme Ịchịkọbata Ihe* ná ngwụcha afọ, mgbe i si n’ubi na-ewebata ihe ị rụtara.+ 17 Ugboro atọ n’afọ, ụmụ nwoke unu niile ga-abịa n’ihu ezi Onyenwe unu, bụ́ Jehova.+

18 “Mgbe i ji anụ na-achụrụ m àjà, achụkọtala ọbara ya na ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha. Abụba ọ bụla e ji chụọrọ m àjà n’oge ememme m ekwesịghị ịdị ruo ụtụtụ.

19 “Ị ga-eweta mkpụrụ kacha mma ná mkpụrụ mbụ kara aka ala gị mepụtara n’ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị.+

“Esila nwa ewu n’ime mmiri ara nne ya.+

20 “M na-ezipụ mmụọ ozi ka o butere unu ụzọ,+ ka o chebe unu n’ụzọ ma kpọbata unu n’ebe m kwadebere.+ 21 Geenụ ya ntị, rubekwanụ isi n’ihe o kwuru. Unu enupụrụla ya isi n’ihi na ọ gaghị agbaghara unu mmehie unu,+ maka na ọ ga-abịa n’aha m.* 22 Ma, ọ bụrụ na unu erube nnọọ isi n’ihe o kwuru ma mee ihe niile m kwuru, m ga-ewesa ndị iro unu iwe, mesiekwa ndị na-emesi unu ike ike. 23 N’ihi na mmụọ ozi m ga-ebutere unu ụzọ ma kpọbata unu n’ala ndị Amọraịt, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Kenan, ndị Haịvaịt, nakwa n’ala ndị Jebus. M ga-ekpochapụkwa ha.+ 24 Unu akpọrọla chi ha isiala. Unu ekwela ka a rata unu ife ha ofufe. Unu emekwala ihe ndị ha na-eme.+ Kama, unu ga-akwatu chi ha, kụrisịakwa ogidi arụsị ha.+ 25 Feenụ Jehova bụ́ Chineke unu,*+ ọ ga-agọzi nri unu na mmiri unu.+ M ga-ewepụrụ unu ọrịa.+ 26 Ime agaghị na-apụ ụmụ nwaanyị unu, unu agaghịkwa enwe ụmụ nwaanyị aga.+ M ga-eme ka unu dịtee ndụ aka.*

27 “M ga-eme ka ndị niile unu ga-ezute na-atụ m ụjọ tupu unu erute.+ M ga-etinye ha n’ọgba aghara. M ga-emekwa ka ndị iro unu niile gbaara unu ọsọ.*+ 28 Tupu unu erute, m ga-eme ka ụjọ jide ha.+ Ụjọ ga-emekwa ka ndị Haịvaịt, ndị Kenan, na ndị Het gbaara unu ọsọ.+ 29 Agaghị m achụpụrụ unu ha n’otu afọ, ka ala ahụ ghara ịtọgbọrọ nkịtị, anụ ọhịa ewee ju ebe niile tagbuwe unu.+ 30 M ga-eji nke nta nke nta chụpụrụ unu ha, ruo mgbe unu mụrụ ọmụmụ bichie ala ahụ.+

31 “M ga-eme ka ókè nke ala unu malite n’Oké Osimiri Uhie ruo n’oké osimiri ndị Filistia, malitekwa n’ala ịkpa ruo n’Osimiri Yufretis;+ n’ihi na m ga-enyefe ndị bi n’ala ahụ n’aka unu, unu ga-achụpụkwa ha.+ 32 Unu na ha ma ọ bụ chi ha agbala ndụ.+ 33 Ha ekwesịghị ibi n’ala unu, ka ha ghara ime ka unu mehie m. Ọ bụrụ na unu efee chi ha, ọ ga-abụrụ unu ọnyà.”+

24 O wee sị Mosis: “Gbagoo n’ugwu a gakwuru Jehova, gị na Erọn, Nedab na Abaịhu,+ na mmadụ iri asaa n’ime ndị okenye Izrel, nọrọkwanụ n’ebe dịtụ anya kpọọ isiala. 2 Naanị Mosis ga-abịa Jehova nso. Ma ndị ọzọ agaghị abịa nso, ndị Izrel ndị ọzọ agaghịkwa eso ya gbagoo.”+

3 Mosis wee bịa kọọrọ ndị Izrel ihe niile Jehova kwuru na ihe niile o kpebiri.+ Mmadụ niile wee jiri otu olu zaa, sị: “Anyị ga-eme ihe niile Jehova kwuru.”+ 4 Mosis deziri ihe niile Jehova kwuru ede.+ O bilikwara n’isi ụtụtụ rụọ ebe ịchụàjà n’ala ala ugwu ahụ, gwunyekwa ogidi iri na abụọ nke dabara n’ebo iri na abụọ e nwere n’Izrel. 5 Mgbe e mechara, o dunyere ụmụ okorobịa ndị Izrel, ha achụọ àjà a na-esu ọkụ, jirikwa oké ehi dị iche iche chụọrọ Jehova àjà udo.+ 6 Mosis buuru ọkara ọbara ehi ndị ahụ gbanye n’efere ole na ole, fesa ọkara ọbara nke ọzọ n’ebe ịchụàjà. 7 O wee were akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ gụpụtara ha ya.+ Ha wee sị: “Anyị ga-eme ihe niile Jehova kwuru, anyị ga-erubekwa isi.”+ 8 Mosis wee buru ọbara ahụ fesa ha+ ma sị: “Ihe a bụ ọbara ọgbụgba ndụ unu na Jehova gbara. Ihe ndị ha na ọgbụgba ndụ a so bụ ihe niile a unu nụrụ.”+

9 Mosis na Erọn, Nedab na Abaịhu, na mmadụ iri asaa n’ime ndị okenye Izrel gbagooro n’ugwu, 10 ha wee hụ Chineke Izrel.+ N’okpuru ụkwụ ya, e nwere ihe dị ka pevment e ji nkume safaya rụọ. Ọ na-enwu gbaa ka eluigwe.+ 11 Ma o meghị ụmụ nwoke ahụ na-anọchite anya ndị Izrel ihe ọ bụla,+ kama ha hụrụ ezi Chineke n’ọhụụ, ha rikwara nri ma ṅụọ mmanya.

12 Jehova wee sị Mosis: “Gbagote n’ugwu bịakwute m, nọrọkwa na ya. M ga-enye gị mbadamba nkume ndị m ga-edere ha iwu na ntụziaka m chọrọ ka ha na-eso.”+ 13 Mosis na Joshụa onye na-ejere ya ozi+ gawara, Mosis wee gbagoro n’ugwu ezi Chineke.+ 14 Ma ọ gwara ndị okenye ahụ, sị: “Cherenụ anyị n’ebe a ruo mgbe anyị ga-alọghachikwute unu.+ Unu na Erọn na Họọ+ nọ. Onye ọ bụla nwere okwu, ya gakwuru ha.”+ 15 Mosis wee gbagowe n’ugwu ahụ mgbe ígwé ojii na-ekpuchi ugwu ahụ.+

16 Ebube Jehova+ dịgidere n’Ugwu Saịnaị,+ ígwé ojii kpuchikwara ugwu ahụ ruo ụbọchị isii. N’ụbọchị nke asaa, Chineke si n’ígwé ojii kpọọ Mosis. 17 N’anya ndị Izrel ndị na-ele ihe na-emenụ, ebube Jehova dị ka nnukwu ọkụ n’elu ugwu ahụ. 18 Mosis wee banye n’ime ígwé ojii ahụ ma gbagoo n’ugwu ahụ.+ Mosis nọrọ n’ugwu ahụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.+

25 Jehova wee gwa Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel ka ha wetara m onyinye. Ọ bụ onye ọ bụla ji obi ya wetara m onyinye ka unu ga-anata onyinye m.+ 3 Ihe a bụ onyinye unu ga-anata ha: ọlaedo,+ ọlaọcha,+ ọla kọpa,+ 4 eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl,* eri na-acha uhie uhie, ezigbo eri linin, ajị ewu, 5 akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara, akpụkpọ anụ sil, osisi akeshịa,+ 6 mmanụ a ga na-agbanye n’ọkụ,*+ mmanụ balsam a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ+ ma jirikwa na-eme insens na-esi ísì ọma,+ 7 na nkume ọnịks na nkume ndị ọzọ a ga-akwụnye n’efọd+ nakwa ndị a ga-akwụnye n’akpa a na-anya n’obi.+ 8 Ha ga-arụrụ m ebe a ga-anọ na-efe m, m ga-ebinyekwara ha.+ 9 Ị ga-arụ ụlọikwuu ahụ na ihe niile ga-adị n’ime ya ka ha dị nnọọ ka ihe atụ m na-egosi gị.+

10 “Ha ga-eji osisi akeshịa rụọ igbe nke ga-adị kubit* abụọ na ọkara n’ogologo, otu kubit na ọkara n’obosara, nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu.+ 11 Ị ga-ejizi ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya.+ Ị ga-amachi ya ime na azụ, ị ga-ejikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya.+ 12 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe anọ dị okirikiri ga-adị na ya ma kwụnye ha n’elu ebe ụkwụ ya anọ ga-adị. Abụọ ga-adị n’otu akụkụ ya, abụọ adịrị n’akụkụ ya nke ọzọ. 13 Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ okporo osisi abụọ ma jiri ọlaedo machie ha.+ 14 Ị ga-etinye okporo osisi ndị ahụ n’ihe ndị ahụ dị okirikiri a kwụnyere n’akụkụ Igbe ahụ, ka e jiri ha na-ebu Igbe ahụ. 15 Okporo osisi ndị ahụ ga na-adị n’ihe ndị ahụ dị okirikiri a kwụnyere n’Igbe ahụ. A gaghị na-ewepụ ha ewepụ na ha.+ 16 Ị ga-etinye Ihe Àmà m ga-enye gị n’ime Igbe ahụ.+

17 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ okwuchi ya, nke ga-adị kubit abụọ na ọkara n’ogologo nakwa otu kubit na ọkara n’obosara.+ 18 Ị ga-eji ọlaedo rụọ cherob abụọ. Ị ga-eji hama kụọ ha. Ha ga-adị na nsọtụ abụọ nke okwuchi igbe ahụ.+ 19 Rụọ cherob ndị ahụ ka otu dịrị n’otu nsọtụ, otu adịrị na nsọtụ nke ọzọ n’elu okwuchi igbe ahụ. 20 Cherob ndị ahụ ga-achịli nku ha abụọ elu, sachie okwuchi igbe ahụ,+ ha ga-echekwa ibe ha ihu. Ihu cherob ndị ahụ ga-ekpudo n’okwuchi igbe ahụ. 21 Ị ga-eji okwuchi Igbe ahụ+ kwuchie ya, ị ga-etinyekwa Ihe Àmà m ga-enye gị n’ime Igbe ahụ. 22 M ga-apụta n’ihu gị n’ebe ahụ wee si n’elu okwuchi igbe ahụ+ gwa gị okwu. M ga-esi n’agbata cherob abụọ ahụ dị n’elu igbe ọgbụgba ndụ* ahụ mee ka ị mara ihe niile m ga-enye gị n’iwu ka ị gwa ndị Izrel.

23 “Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ otu tebụl+ nke ga-adị kubit abụọ n’ogologo, otu kubit n’obosara nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu.+ 24 Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya ma jiri ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya. 25 Ị ga-arụnye ihe obosara ya hà ka uhiè ọbụ aka mmadụ* gburugburu ọnụ tebụl ahụ, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ihe a ị ga-arụnye n’ọnụ ya. 26 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe anọ dị okirikiri ma kwụnye ha n’akụkụ anọ nke tebụl ahụ, n’ebe a ga-arụnye ụkwụ ya anọ. 27 Ihe ndị ahụ dị okirikiri ga-adị nso n’ihe ahụ a ga-arụnye n’ọnụ tebụl ahụ ka ọ bụrụ ebe a ga-etinye okporo osisi ndị a ga-eji na-ebu tebụl ahụ. 28 Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ okporo osisi ndị ahụ ma jiri ọlaedo machie ha. A ga-eji okporo osisi ndị ahụ na-ebu tebụl ahụ.

29 “Ị ga-akpụ efere ya, iko ya, nakwa ihe mmiri ya na ọkwá ya bụ́ ndị ha ga-eji na-awụsa àjà mmanya. Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa+ kpụọ ha. 30 Ị ga na-edosa achịcha a na-enye m n’elu tebụl ahụ mgbe niile.+

31 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe e ji adọsa ọkụ.*+ Ị ga-eji hama kụọ ihe a e ji adọsa ọkụ. Ọ ga-enwe ụkwụ n’ala ala ya, nwee okporo, alaka, iko, isi, na ifuru. Ha niile ga-abụ otu ihe e ji hama kụọ.+ 32 Ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* ga-enwe alaka isii n’akụkụ ya abụọ, alaka atọ ga-adị n’otu akụkụ ya, alaka atọ adịrị n’akụkụ ya nke ọzọ. 33 Iko atọ ndị yiri okooko almọnd ga-adị n’alaka nke ọ bụla dị n’otu akụkụ, otu isi na otu ifuru adịrị n’agbata otu iko na iko ibe ya. Iko atọ ndị yiri okooko almọnd ga-adịkwa n’alaka nke ọ bụla dị n’akụkụ ya nke ọzọ, otu isi na otu ifuru adịrịkwa n’agbata otu iko na iko ibe ya. Ọ bụ otú a ka a ga-esi rụọ alaka isii ahụ ka ha si n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* pụta. 34 A ga-enwe iko anọ yiri okooko almọnd n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ,* otu isi na otu ifuru ga-adịkwa n’agbata otu iko na iko ibe ya. 35 Otu isi ga-adị n’okpuru alaka abụọ mbụ ga-esi n’okporo ahụ apụta, otu isi ga-adịkwa n’okpuru alaka abụọ ọzọ na-eso ha, otu isi adịrịkwa n’okpuru alaka abụọ ọzọ na-eso ha, ya bụ, alaka isii ndị ga-esi n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* apụta. 36 Ọ bụ otu ọlaedo a na-agwaghị agwa ka a ga-eji rụọ isi ya niile na alaka ya niile na ihe niile ga-adị n’ihe ahụ e ji adọsa ọkụ.* Ha niile ga-abụ otu ihe e ji hama kụọ.+ 37 Ị ga-arụrụ ya ọkụ* asaa. A mụnye ha ọkụ, ha ga na-enye ìhè n’ihu ebe a dọsara ya.+ 38 A ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ mkpà ndị e ji ejide owu na ihe ndị a ga-eji na-agụnye owu a mụrụ amụ.+ 39 A ga-eji otu talent* ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* na arịa ndị a niile. 40 Hụ na ị rụrụ ha ka ha dị ka ihe ndị e gosiri gị n’ugwu.+

26 “Ị ga-eji ákwà ụlọikwuu iri rụọ ụlọikwuu+ ahụ. Ị ga-eji ezigbo eri linin a kpara akpa, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, na eri na-acha uhie uhie kpaa ha. Ị ga-akpa ndị cherob+ n’ákwà ndị ahụ.+ 2 Nke ọ bụla n’ime ákwà ụlọikwuu ndị ahụ ga-adị kubit* iri abụọ na asatọ n’ogologo na kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu niile ahụ ga-aha.+ 3 A ga-adụkọta ákwà ụlọikwuu ise ka ha bụrụ otu, dụkọtakwa ákwà ụlọikwuu ise nke ọzọ ka ha bụrụ otu. 4 Ị ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ dụnye oghere n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu ise a dụkọtara ọnụ, ị ga-emekwa otu ihe ahụ n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ a dụkọtara ọnụ, n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ. 5 Ị ga-adụnye oghere iri ise n’otu ákwà ụlọikwuu, dụnyekwa oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ ka ha chee ibe ha ihu n’ebe a ga-ejikọta ha. 6 Ị ga-eji ọlaedo rụọ nko iri ise ma jiri nko ndị ahụ jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ, ka ọ bụrụ otu ụlọikwuu.+

7 “Ị ga-ejikwa ajị ewu+ kpaa ákwà a ga-eji kpuchie ụlọikwuu ahụ. Ị ga-akpa ákwà ụlọikwuu iri na otu.+ 8 Nke ọ bụla n’ime ákwà ụlọikwuu ndị ahụ ga-adị kubit iri atọ n’ogologo na kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu iri na otu niile a ga-aha. 9 Ị ga-adụkọta ákwà ụlọikwuu ise ọnụ, dụkọtakwa ákwà ụlọikwuu isii nke ọzọ ọnụ ma pịajie ákwà ụlọikwuu nke isii abụọ n’ebe ihu ụlọikwuu ahụ. 10 Ị ga-adụnyekwa oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu ndị ahụ a dụkọtara ọnụ, n’ákwà nke ikpeazụ ya, dụnyekwa oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ. 11 Ị ga-eji ọla kọpa rụọ nko iri ise ma konye nko ndị ahụ n’oghere ndị ahụ ka ha jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ ọnụ, ha ga-abụkwa otu. 12 Ebe mafọrọ n’ákwà ụlọikwuu ahụ ga-awụdata awụdata. Ọkara ákwà ụlọikwuu ahụ mafọrọ amafọ ga-awụchi azụ ụlọikwuu ahụ. 13 Ákwà mafọrọ n’ogologo ákwà ụlọikwuu ahụ, ya bụ, otu kubit mafọrọ n’otu akụkụ na otu kubit mafọrọ n’akụkụ nke ọzọ, ga-awụdata n’akụkụ abụọ nke ụlọikwuu ahụ, kpuchie ya.

14 “Ị ga-ejikwa akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara mee ihe a ga-eji kpuchie ụlọikwuu ahụ, jirikwa akpụkpọ anụ sil mee ihe a ga-ekpukwasị n’elu ya.+

15 “Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ frem*+ ndị ị ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ. Frem ndị ahụ ga-akwụcha ọtọ.+ 16 Frem nke ọ bụla ga-adị kubit iri n’ogologo na otu kubit na ọkara n’obosara. 17 Frem nke ọ bụla ga-enwe ụkwụ abụọ nọkọtara ọnụ n’okpuru ya. Otú ahụ ka ị ga-esi rụọ frem niile a ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ. 18 Ị ga-arụ frem iri abụọ ndị ga-adị n’akụkụ ebe ndịda ụlọikwuu ahụ, chee ihu n’ebe ndịda.

19 “Ị ga-eji ọlaọcha rụọ ntọala iri anọ ndị nwere oghere+ a ga-akwụnye frem iri abụọ ahụ na ha. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, bụ́ ebe ụkwụ ya abụọ ga-abanye. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adịcha n’okpuru frem ndị ọzọ, bụ́ ebe ụkwụ ha abụọ abụọ ga-abanye.+ 20 Ị ga-arụ frem iri abụọ ndị ga-adị n’akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ, n’ebe ugwu, 21 jirikwa ọlaọcha rụọ ntọala iri anọ ha ndị nwere oghere. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, ntọala abụọ nwere oghere adịrịchaa n’okpuru frem ndị ọzọ. 22 Ị ga-arụ frem isii ga-adị n’ebe azụ ụlọikwuu ahụ, n’ebe ga-eche ihu n’ebe ọdịda anyanwụ.+ 23 Ị ga-arụ frem abụọ ka ha dịrị n’azụ ụlọikwuu ahụ n’isi ngwụcha ya abụọ. 24 Ha ga-agba mkpị si n’ala ruo n’elu, ruo n’ebe ihe nke mbụ dị okirikiri dị. Otú a ka a ga-esi rụọ ha abụọ, ha ga-adịkwa n’isi ngwụcha abụọ nke ụlọikwuu ahụ. 25 A ga-enwe frem asatọ nakwa ntọala iri na isii ha nwere oghere bụ́ ndị e ji ọlaọcha rụọ. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, ntọala abụọ nwere oghere adịrịchaa n’okpuru frem ndị ọzọ.

26 “Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ okporo osisi. Ị ga-arụ okporo osisi ise maka frem ndị ga-adị n’otu akụkụ ụlọikwuu ahụ,+ 27 rụọkwa okporo osisi ise maka frem ndị ga-adị n’akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ nakwa okporo osisi ise maka frem ndị ga-adị n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ ụlọikwuu ahụ, n’ebe azụ ya. 28 Okporo osisi nke ga-adị n’etiti frem ndị ahụ ga-esi n’otu isi ụlọikwuu ahụ ruo n’isi ya nke ọzọ.

29 “Ị ga-eji ọlaedo machie frem ndị ahụ,+ ị ga-ejikwa ọlaedo rụọ ihe ndị dị okirikiri ga-ejide okporo osisi ndị ahụ, jirikwa ọlaedo machie okporo osisi ndị ahụ. 30 Ị ga-ama ụlọikwuu ahụ ka ọ dị otú ahụ e gosiri gị ya n’ugwu.+

31 “Ị ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà mgbochi.+ A ga-akpa ndị cherob na ya. 32 Ị ga-ekonye ya n’ogidi anọ e ji osisi akeshịa rụọ bụ́ ndị e ji ọlaedo machie. A ga-eji ọlaedo rụọ ihe e ji ekonye ha. A ga-akwụnye ogidi ndị ahụ na ntọala anọ nwere oghere ndị e ji ọlaọcha rụọ. 33 Ị ga-ekonye ákwà mgbochi ahụ n’okpuru nko ndị ahụ ma bubata igbe ọgbụgba ndụ*+ ahụ n’ime ebe ahụ e ji ákwà mgbochi kochie. Ákwà mgbochi ahụ ga-ekebiri unu Ebe Nsọ+ na Ebe Kacha Nsọ.+ 34 Ị ga-eji okwuchi ahụ kwuchie igbe ọgbụgba ndụ* ahụ ga-adị n’Ebe Kacha Nsọ.

35 “Ị ga-adọsa tebụl ahụ tupu ebe ahụ e ji ákwà mgbochi gebichie, dọsakwa ihe ahụ e ji adọsa ọkụ*+ n’akụkụ ebe ndịda ụlọikwuu ahụ ka o chee tebụl ahụ ihu. Ma ị ga-adọsa tebụl ahụ n’akụkụ ebe ugwu. 36 Ị ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà ngebichi* ga-adị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ.+ 37 Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ ogidi ise maka ákwà ngebichi* ahụ ma jiri ọlaedo machie ha. Ị ga-eji ọlaedo rụọ ihe a ga-eji ekonye ihe na ha, jirikwa ọla kọpa kpụọ ntọala ise nwere oghere a ga-akwụnye ogidi ndị ahụ na ha.

27 “Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà.+ Ọ ga-adị kubit* ise n’ogologo na kubit ise n’obosara. Ebe ịchụàjà ahụ ga-enwe akụkụ anọ há nhata, ọ ga-adịkwa kubit atọ n’ịdị elu.+ 2 Ị ga-arụnye mpi+ n’akụkụ ya anọ. Ị ga-arụkọta mpi ndị ahụ na ebe ịchụàjà ahụ ka ha bụrụ otu, ị ga-ejikwa ọla kọpa machie ebe ịchụàjà ahụ.+ 3 Ị ga-arụ bọket a ga-eji na-ekpopụ ntụ ya,* rụọkwa shọvel, efere, ndụdụ, na ihe ndị e ji agụnye ọkụ. Ị ga-ejikwa ọla kọpa rụọ arịa ya niile.+ 4 Ị ga-eji ọla kọpa kpaa ihe a ga-etinye n’ime ebe ịchụàjà ahụ, jirikwa ọla kọpa kpụọ ihe anọ dị okirikiri ga-adị n’elu ihe ahụ a kpara akpa, n’akụkụ ya anọ. 5 Ị ga-etinye ihe ahụ a kpara akpa n’okpuru ọnụ ebe ịchụàjà ahụ. Ọ ga-adị n’ime ebe ịchụàjà ahụ, n’ebe etiti ya. 6 Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ okporo osisi maka ebe ịchụàjà ahụ, jirikwa ọla kọpa machie ha. 7 A ga-etinye okporo osisi ndị ahụ n’ihe ndị ahụ dị okirikiri, ka okporo osisi ndị ahụ wee dịrị n’akụkụ abụọ nke ebe ịchụàjà ahụ mgbe a na-ebu ya.+ 8 Ị ga-arụ ebe ịchụàjà ahụ ka ọ dị ka igbe osisi nwere oghere. Ị ga-arụ ya ka ọ dị nnọọ otú m gosiri gị n’ugwu.+

9 “Ị ga-agba ụlọikwuu ahụ ogige.+ N’akụkụ chere ihu n’ebe ndịda, ogige ya ga-enwe ákwà mgbochi ndị e ji ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa. Otu akụkụ ya ga-adị otu narị (100) kubit n’ogologo.+ 10 Ọ ga-enwe ogidi iri abụọ na ntọala iri abụọ nwere oghere ndị e ji ọla kọpa rụọ. Ị ga-eji ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. 11 Ákwà mgbochi ndị ga-adị n’akụkụ ebe ugwu ya ga-adịkwa otu narị (100) kubit n’ogologo. Ọ ga-enwekwa ogidi iri abụọ na ntọala iri abụọ nwere oghere e ji ọla kọpa rụọ na ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha, bụ́ ndị e jicha ọlaọcha rụọ. 12 A ga-enwe ákwà mgbochi ndị ga-adị n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ ogige ahụ. Ha ga-adị kubit iri ise n’obosara, nweekwa ogidi iri na ntọala iri ndị nwere oghere. 13 Akụkụ ogige ahụ nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-adị kubit iri ise n’obosara. 14 A ga-enwe ákwà mgbochi ndị dị kubit iri na ise n’otu akụkụ nakwa ogidi atọ na ntọala atọ ndị nwere oghere.+ 15 A ga-enwekwa ákwà mgbochi ndị dị kubit iri na ise n’akụkụ ya nke ọzọ nakwa ogidi atọ na ntọala atọ ndị nwere oghere.

16 “Ọnụ ụzọ ogige ahụ ga-enwe ákwà ngebichi* nke ga-adị kubit iri abụọ n’ogologo. A ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ya.+ Ọ ga-enwekwa ogidi anọ na ntọala anọ ndị nwere oghere.+ 17 Ogidi niile ndị ga-agba ogige ahụ gburugburu ga-enwe ihe ndị e ji ejikọ ihe na ha na ihe ndị e ji ekonye ihe, bụ́ ndị e jicha ọlaọcha rụọ. Ma, a ga-eji ọla kọpa rụọ ntọala ha ndị nwere oghere.+ 18 Ogige ahụ ga-adị otu narị (100) kubit n’ogologo,+ kubit iri ise n’obosara, na kubit ise n’ịdị elu. A ga-eji ezigbo ákwà linin a kpara akpa rụọ ya, ọ ga-enwekwa ntọala ndị nwere oghere e ji ọla kọpa rụọ. 19 A ga-eji ọla kọpa rụọ arịa niile a ga-eji na-eje ozi n’ụlọikwuu ahụ nakwa mkpọ́ ndị e ji ejide ụlọikwuu na mkpọ́ niile e ji ejide ogige ụlọikwuu ahụ.+

20 “Ị ga-enye ndị Izrel iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv a na-agwaghị agwa a ga-eji na-amụ ọkụ, ka ọkụ* ndị ahụ wee na-enwu mgbe niile.+ 21 N’ụlọikwuu nzute, tupu ebe ahụ e ji ákwà mgbochi gebichie, nke dị nso n’igbe ọgbụgba ndụ*+ ahụ, Erọn na ụmụ ya ga na-ahụ na ọkụ* ndị ahụ na-enwu malite ná mgbede ruo n’ụtụtụ n’ihu Jehova.+ Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ niile nke ndị Izrel ga na-edebe.+

28 “Ị ga-esi ná ndị Izrel kpọta Erọn nwanne gị, ya na ụmụ ya ndị nwoke, ka ha bụrụ ndị nchụàjà m,+ ya bụ, Erọn,+ ya na Nedab na Abaịhu,+ Elieza na Ịtama,+ bụ́ ụmụ Erọn.+ 2 Ị ga-akpara Erọn nwanne gị uwe nsọ ndị ga-achọ ya mma ma mee ka o nwee ùgwù.+ 3 Ị ga-agwa ndị niile nwere nkà,* ya bụ, ndị m nyere amamihe,*+ okwu. Ha ga-akpara Erọn uwe ndị ga-egosi na e doola ya nsọ, ka o wee bụrụ onye nchụàjà m.

4 “Ọ bụ uwe ndị a ka ha ga-akpa: akpa a na-anya n’obi,+ efọd,+ uwe na-enweghị aka,+ uwe mwụda a kpara n’ụdị pụrụ iche,* ákwà isi,+ na ákwà a na-eke n’úkwù.+ Ha ga-akpara Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị nwoke uwe nsọ ndị a, ka ha wee bụrụ ndị nchụàjà m. 5 Ndị ọrụ nwere nkà ga-eji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin kpaa ha.

6 “Ha ga-eji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa efọd ahụ, a ga-akpakwa ihe ịchọ mma na ya.+ 7 Ọ ga-enwe ubu ihu na azụ bụ́ ndị a ga-ejikọta n’ebe elu ya abụọ. 8 A ga-eji ihe ndị e ji kpaa efọd ahụ kpaa eriri*+ ga-adị na ya, nke a ga-eji na-ekegide ya, ya bụ, ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa.

9 “Ị ga-ewere nkume ọnịks+ abụọ ma denye aha ụmụ Izrel* na ha,+ 10 aha isii n’otu nkume nakwa aha isii fọrọ afọ na nkume nke ọzọ. Ị ga-edenye aha ha n’usoro e si mụọ ha. 11 Omenkà nke na-atụ́ ihe na nkume ga-edenye aha ụmụ Izrel* na nkume abụọ ahụ otú e si akanye akara na mgbaaka e ji aka ihe akara.+ Ị ga-akwụnyezi ha n’ihe mbadamba abụọ e ji ọlaedo kpụọ. 12 Ị ga-etinye nkume abụọ ahụ n’ubu efọd ahụ ka ha bụrụ nkume ncheta maka ndị Izrel.+ Erọn ga-ebu aha ha n’ihu Jehova n’ubu ya abụọ ka ọ bụrụ ihe ncheta. 13 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe mbadamba abụọ, 14 jirikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ụdọ ígwè abụọ a hịkọrọ ahịkọ ka eriri.+ Ị ga-ekegide ụdọ ígwè ndị ahụ n’ihe mbadamba abụọ ahụ.+

15 “Hụ na onye na-akpa ihe n’ákwà kpara akpa a na-anya n’obi nke e ji ekpe ikpe.+ A ga-eme ya ka ọ dị ka efọd ahụ. A ga-eji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ya.+ 16 Ọ ga-enwe akụkụ anọ há nhata ma a pịajie ya abụọ. Ọ ga-adịkwa otu ntụ ọbụ aka* n’ogologo na otu ntụ ọbụ aka n’obosara. 17 Ị ga-akwụnye nkume dị iche iche na ya. Ha ga-adị ahịrị nkume anọ. Ahịrị nke mbụ ga-abụ rubi, topaz, na emerad. 18 Ahịrị nke abụọ ga-abụ tọkwọiz, safaya, na jaspa. 19 Ahịrị nke atọ ga-abụ nkume leshem,* aget, na ametist. 20 Ahịrị nke anọ ga-abụ krisolaịt, ọnịks, na jed. A ga-akwụnye ha n’ihe mbadamba ndị a ga-eji ọlaedo rụọ. 21 Nkume ndị ahụ ga-adị ole aha ụmụ Izrel* dị, ya bụ, iri na abụọ. A ga-edenye aha nke ọ bụla otú e si akanye akara na mgbaaka e ji aka ihe akara. Aha nke ọ bụla ga-anọchi anya otu ebo n’ime ebo iri na abụọ ahụ.

22 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ụdọ ígwè a hịkọrọ ahịkọ ka eriri n’elu akpa ahụ a na-anya n’obi.+ 23 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe abụọ dị okirikiri n’akpa ahụ a na-anya n’obi ma tinye ihe abụọ ahụ dị okirikiri n’akpa ahụ a na-anya n’obi, n’isi isi ya abụọ. 24 Ị ga-aganye ụdọ ígwè abụọ ahụ e ji ọlaedo mee n’ihe abụọ ahụ dị okirikiri ga-adị n’akpa ahụ a na-anya n’obi, n’isi isi ya abụọ. 25 Ị ga-aganye isi abụọ nke ụdọ ígwè abụọ ahụ n’ihe mbadamba abụọ ahụ, ị ga-ekegidekwa ha n’ubu efọd ahụ, n’ebe ihu ya. 26 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe abụọ dị okirikiri ma kwụnye ha n’ime akpa ahụ a na-anya n’obi, n’isi isi ya abụọ, ka ha chee efọd ahụ ihu.+ 27 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe abụọ ọzọ dị okirikiri n’ihu efọd ahụ. Ọ ga-adị n’ebe mgbada efọd ahụ, n’akụkụ ebe a ga-ejikọta ya, n’elu ebe eriri* efọd ahụ ga-adị.+ 28 A ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ kekọta ihe ndị ahụ dị okirikiri ga-adị n’akpa ahụ a na-anya n’obi na ihe ndị ahụ dị okirikiri ga-adị n’efọd ahụ. Ọ ga-eme ka akpa ahụ a na-anya n’obi dịrị n’elu efọd ahụ, n’elu ebe eriri* efọd ahụ ga-adị.

29 “Mgbe Erọn na-abata n’Ebe Nsọ, ọ ga-ebu aha ụmụ Izrel* n’obi ya n’akpa ahụ a na-anya n’obi nke e ji ekpe ikpe, ka ọ bụrụ ihe ncheta mgbe niile n’ihu Jehova. 30 Ị ga-etinye Yurim na Tọmịm*+ n’akpa ahụ a na-anya n’obi nke e ji ekpe ikpe. Ha ga na-adị n’elu obi Erọn mgbe ọ na-abata n’ihu Jehova. Erọn ga-ebukwa ihe e ji ekpe ikpe gbasara ndị Izrel n’obi ya n’ihu Jehova mgbe niile.

31 “Ị ga-eji naanị eri na-acha anụnụ anụnụ kpaa uwe na-enweghị aka nke efọd ahụ ga-adị n’elu ya.+ 32 Ọ ga-enwe oghere n’etiti ebe elu ya.* Onye na-akpa ákwà ga-akpa ọnụ ọnụ oghere ya ahụ akpa gburugburu. Ọ ga-adị ka oghere na-adị n’uwe agha, ka ọ ghara ịdọka adọka. 33 Ị ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, na eri na-acha uhie uhie kpaa ihe yiri mkpụrụ osisi pomigranet gburugburu ọnụ ọnụ ala ya, tinyekwa mgbịrịgba ọlaedo n’agbata ihe ndị ahụ yiri mkpụrụ osisi pomigranet gbaa gburugburu. 34 I tinye otu mgbịrịgba ọlaedo, gị etinye otu ihe yiri mkpụrụ osisi pomigranet. I tinye otu mgbịrịgba ọlaedo ọzọ, gị etinyekwa otu ihe yiri mkpụrụ osisi pomigranet. Ị ga-eme ya otú ahụ gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe ahụ na-enweghị aka. 35 Erọn ga-eyi ya mgbe ọ na-eje ozi. A ga na-anụkwa ụda mgbịrịgba ndị ahụ mgbe ọ na-abanye n’ụlọikwuu n’ihu Jehova nakwa mgbe ọ na-apụta, ka ọ ghara ịnwụ.+

36 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ihe mbadamba na-egbuke egbuke ma dee ‘Jehova bụ Onye dị nsọ’ na ya. A ga-edenye ya otú e si akanye akara na mgbaaka e ji aka ihe akara.+ 37 Ị ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ kegide ya n’ákwà isi ahụ.+ Ọ ga-adị n’ihu ákwà isi ahụ. 38 Ọ ga-adị n’egedege ihu Erọn. Mgbe mmadụ mehiere n’ihe gbasara ihe ndị dị nsọ,+ ya bụ, ihe ndị Izrel mere ka ọ dị nsọ mgbe ha wetara ha ka ha bụrụ onyinye dị nsọ, mmehie ahụ ga-adị n’isi Erọn. Ihe mbadamba ahụ ga-adị n’egedege ihu ya mgbe niile, ka Jehova wee nabata ndị ya.

39 “Ị ga-eji ezigbo eri linin kpaa uwe mwụda ahụ pụrụ iche,* jiri ezigbo eri linin kpaa ákwà isi, kpaakwa ákwà a na-eke n’úkwù.+

40 “Ị ga-emere ụmụ Erọn ndị nwoke uwe mwụda, ákwà a na-eke n’úkwù, na ákwà isi,+ bụ́ ndị ga-achọ ha mma ma mee ka ha nwee ùgwù.+ 41 Ị ga-eyiwe Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị nwoke uwe ndị ahụ. Ị ga-ete ha mmanụ,+ mee ha ndị nchụàjà*+ ma doo ha nsọ, ha ga-abụkwa ndị nchụàjà m. 42 Ị ga-eji ákwà linin kpaara ha uwe úkwù* iji kpuchie ọtọ ha.+ Ọ ga-esi n’úkwù ruo n’apata ụkwụ. 43 Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-eyi ha mgbe ha na-abata n’ụlọikwuu nzute ma ọ bụ mgbe ha na-abịa n’ebe ịchụàjà ka ha jee ozi n’ebe nsọ, ka ikpe ghara ịma ha, ha ewee nwụọ. Ọ bụ iwu ya na ụmụ* ya ndị ga-anọchi ya ga na-edebe mgbe niile.

29 “Otú a ka ị ga-esi eme ka ha dị nsọ, ka ha wee bụrụ ndị nchụàjà m: Kpụrụ oké ehi, ebule abụọ ahụ́ dị mma,+ 2 werekwa achịcha na-ekoghị eko, ogbe achịcha ndị na-ekoghị eko dị okirikiri a gwara mmanụ, nakwa achịcha ndị na-ekoghị eko dị fere fere a wụrụ mmanụ.+ Ị ga-eji ntụ ọka wit e gwere nke ọma mee ha 3 ma chịnye ha na nkata. Jiri nkata ahụ butere m ha,+ kpụtakwa oké ehi ahụ na ebule abụọ ahụ.

4 “Ị ga-akpọta Erọn na ụmụ ya ndị nwoke n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute+ ma gwa ha ka ha jiri mmiri saa ahụ́.*+ 5 Ị ga-achịrịzi uwe ndị ahụ+ yiwe ha Erọn, ya bụ, uwe mwụda, uwe na-enweghị aka nke efọd ga-adị n’elu ya, efọd, na akpa a na-anya n’obi. Ị ga-ekekwa ya eriri* efọd ahụ gburugburu úkwù ya.+ 6 Ị ga-eke ya ákwà isi ma tinye ihe àmà ahụ dị nsọ* n’ákwà isi ahụ.+ 7 Werekwa mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ+ wụsa ya n’isi ma tee ya mmanụ.+

8 “Kpọtazie ụmụ ya ndị nwoke yiwe ha uwe mwụda ndị ahụ.+ 9 Ị ga-eke Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ákwà ndị ahụ a na-eke n’úkwù, keekwa ha ákwà isi ndị ahụ n’isi. Ọ bụ ha ga na-abụ ndị nchụàjà, ihe a bụkwa iwu ga-adịgide adịgide.+ Ọ bụ otú a ka ị ga-esi eme ka Erọn na ụmụ ya ndị nwoke bụrụ ndị nchụàjà.+

10 “Ị ga-akpụtazi oké ehi ahụ n’ihu ụlọikwuu nzute. Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-ebikwasị aka ha n’isi oké ehi ahụ.+ 11 Gbuo oké ehi ahụ n’ihu Jehova, n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.+ 12 Jiri mkpịsị aka gị rụrụ ọbara oké ehi ahụ tee na mpi ndị ahụ dị n’ebe ịchụàjà,+ wụsakwa ọbara niile fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà ahụ.+ 13 Werezie abụba niile+ kpuchiri eriri afọ ya, abụba kpuchiri imeju ya, na akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha ma suo ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà ahụ.+ 14 Ma ị ga-akpọ anụ oké ehi ahụ na akpụkpọ ya na nsị ya ọkụ n’ebe dị anya n’ebe unu mara ụlọikwuu. Ọ bụ àjà mmehie.

15 “Kpụtakwa otu n’ime ebule ndị ahụ. Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-ebikwasị aka ha n’isi ebule ahụ.+ 16 Gbuo ebule ahụ ma fesa ọbara ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.+ 17 Gburisịa ebule ahụ. Saa eriri afọ ya+ na ụkwụ ya ma dokọta ibé anụ ahụ niile na isi ya ọnụ. 18 Ị ga-esu ebule ahụ niile ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma*+ nke a na-esuru Jehova ọkụ. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ nke a na-achụrụ Jehova.

19 “Ị ga-akpụtazi ebule nke ọzọ. Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-ebikwasị aka ha n’isi ebule ahụ.+ 20 Gbuo ebule ahụ ma weretụ ọbara ya tee n’ọnụ ọnụ ntị aka nri Erọn nakwa n’ọnụ ọnụ ntị aka nri ụmụ ya ndị nwoke nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ha na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ha. Fesakwa ọbara ahụ n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà ahụ. 21 Weretụ ọbara ahụ dị n’ebe ịchụàjà na mmanụ ahụ e ji ete mmadụ mmanụ+ fesa n’ahụ́ Erọn nakwa n’uwe ya, fesakwa n’ahụ́ ụmụ ya ndị nwoke nakwa n’uwe ụmụ ya ndị nwoke, ka ya na uwe ya na ụmụ ya ndị nwoke na uwe ha wee dị nsọ.+

22 “Ị ga-ewerezi abụba ebule ahụ, ọdụ ya nke bụ́ abụba abụba, abụba nke kpuchiri eriri afọ ya, abụba kpuchiri imeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha,+ na ụkwụ aka nri ya, n’ihi na ọ bụ ebule e ji ahọpụta ndị nchụàjà.+ 23 Sikwa na nkata ahụ achịcha na-ekoghị eko dị na ya nke dị n’ihu Jehova were otu ogbe achịcha dị okirikiri na otu ogbe achịcha dị okirikiri a gwara mmanụ na otu achịcha dị fere fere. 24 Ị ga-achịkwasị ha niile n’ọbụ aka Erọn nakwa n’ọbụ aka ụmụ ya ndị nwoke. Ị ga-efegharịkwa ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. 25 Ị ga-achịrịzi ha n’aka ha ma suo ha ọkụ n’ebe ịchụàjà ahụ, n’elu àjà ahụ a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ọma* n’ihu Jehova. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ nke a na-achụrụ Jehova.

26 Werezie okpuru afọ* ebule ahụ e ji ahọpụta ndị nchụàjà,+ bụ́ nke a chụrụ n’àjà maka Erọn, ma fegharịa ya ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. Ọ ga-abụzi òkè gị. 27 Ị ga-eme ka okpuru afọ* anụ ahụ e ji chụọ àjà a na-efegharị efegharị dị nsọ, ya na ụkwụ anụ ahụ bụ́ òkè dị nsọ e fegharịrị efegharị nke si n’ebule e ji ahọpụta ndị nchụàjà,+ bụ́ nke a chụrụ n’àjà maka Erọn na ụmụ ya ndị nwoke. 28 Ọ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ iwu ndị Izrel ga na-edebe mgbe niile, n’ihi na ọ bụ òkè dị nsọ. Ọ ga-abụ òkè dị nsọ ndị Izrel ga na-enye.+ Ọ bụ òkè dị nsọ ha ga-esi n’àjà udo ha na-enye Jehova.+

29 “Uwe nsọ+ Erọn ga-abụ nke ụmụ ya+ ndị ga-anọchi ya mgbe e tere ha mmanụ ma họpụta ha ka ha bụrụ ndị nchụàjà. 30 Onye nchụàjà nke ga-esi n’ụmụ ya nọchie ya, bụ́ onye ga-abata n’ụlọikwuu nzute ka o jee ozi n’ebe nsọ, ga-eyi uwe ndị ahụ ruo ụbọchị asaa.+

31 “Ị ga-akpụrụ ebule ahụ e ji ahọpụta ndị nchụàjà ma sie anụ ya n’ebe dị nsọ.+ 32 Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-anọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute rie+ anụ ebule ahụ na achịcha ahụ dị na nkata. 33 Ha ga-eri ihe ndị ahụ e ji chụọ àjà ikpuchi mmehie, nke e ji mee ka ha bụrụ ndị nchụàjà ma mee ka ha dị nsọ. Ma onye na-abụghị onye nchụàjà* agaghị eri ihe ndị ahụ n’ihi na ha dị nsọ.+ 34 Ọ bụrụ na e nwee anụ fọrọ n’anụ àjà ahụ e ji họpụta ndị nchụàjà ma ọ bụ achịcha fọrọ n’achịcha ahụ ruo ụtụtụ, ị ga-akpọ ya ọkụ.+ A gaghị eri ya eri n’ihi na ọ bụ ihe dị nsọ.

35 “Ị ga-eme Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ihe a niile m nyere gị n’iwu. Ị ga-eji ụbọchị asaa mee ha ndị nchụàjà.+ 36 Kwa ụbọchị, ị ga-eji oké ehi chụọ àjà mmehie maka ikpuchi mmehie. Ị ga-emekwa ka ebe ịchụàjà ahụ dị nsọ. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịchụrụ ya àjà ikpuchi mmehie, ị ga-etekwa ya mmanụ ka i wee mee ka ọ dị nsọ.+ 37 Ị ga-eji ụbọchị asaa chụọ àjà ikpuchi mmehie maka ebe ịchụàjà ahụ. Ị ga-emekwa ka ọ dị nsọ ka o wee bụrụ ebe ịchụàjà kacha nsọ.+ Onye ọ bụla ga-eje ozi n’ebe ịchụàjà ahụ* kwesịrị ịbụ onye dị nsọ.

38 “Ihe ndị a ka ị ga-achụ n’àjà n’ebe ịchụàjà ahụ mgbe niile: ụmụ ebule abụọ ndị gbara otu afọ otu afọ kwa ụbọchị.+ 39 Chụọ otu ebule n’àjà n’ụtụtụ, chụọkwa ebule nke ọzọ n’àjà ná mgbede.*+ 40 Ihe ndị ị ga-eji chụọ ebule nke mbụ n’àjà bụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanụ oliv, nakwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin mmanya nke ga-abụ àjà mmanya. 41 Ị ga-achụ ebule nke abụọ n’àjà ná mgbede.* Ị ga-eji àjà ọka na àjà mmanya ga-adị ka nke ụtụtụ chụọ ya. Ị ga-achụ ya n’àjà ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ọma,* bụ́ àjà a na-esu ọkụ nke a na-achụrụ Jehova. 42 Ọ ga-abụ àjà a na-esu ọkụ mgbe niile n’ọgbọ unu niile, n’ihu Jehova, n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, bụ́ ebe m ga-apụta n’ihu unu gwa gị okwu.+

43 “M ga-apụta n’ebe ahụ n’ihu ndị Izrel, ebube m ga-emekwa ka ebe ahụ dị nsọ.+ 44 M ga-eme ka ụlọikwuu nzute nakwa ebe ịchụàjà dị nsọ, m ga-emekwa ka Erọn na ụmụ ya ndị nwoke dị nsọ,+ ka ha bụrụ ndị nchụàjà m. 45 M ga-ebinyere ndị Izrel, m ga-abụkwa Chineke ha.+ 46 Ha ga-amatakwa na m bụ Jehova bụ́ Chineke ha, onye kpọpụtara ha n’Ijipt ka m wee binyere ha.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke ha.

30 “Ị ga-arụ ebe ịchụàjà nke a ga na-amụ insens* na ya.+ Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ ya.+ 2 Ọ ga-enwe akụkụ anọ há nhata, dịrị otu kubit* n’ogologo, otu kubit n’obosara, na kubit abụọ n’ịdị elu. Ị ga-arụkọta ahụ́ ya na mpi ndị ga-adị na ya ka ha bụrụ otu.+ 3 Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya: ma elu ya ma akụkụ ya niile gbaa gburugburu ma mpi ndị ga-adị na ya. Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya. 4 Ị ga-ejikwa ọlaedo kpụọ ihe abụọ dị okirikiri n’otu akụkụ ya nakwa n’akụkụ ya nke ọzọ, n’okpuru ihe ịchọ mma a kpụrụ n’ọnụ ya. Ha ga na-ejide okporo osisi ndị a ga-eji na-ebu ya. 5 Jiri osisi akeshịa rụọ okporo osisi ndị ahụ ma jiri ọlaedo machie ha. 6 Ị ga-adọsa ya n’ihu ákwà mgbochi ahụ nke dị nso n’igbe ọgbụgba ndụ*+ ahụ. Ọ ga-adị tupu ebe a dọsara igbe ọgbụgba ndụ ahụ na okwuchi ya, bụ́ ebe m ga-apụta n’ihu gị.+

7 “Erọn+ ga na-amụ insens na-esi ísì ọma+ n’elu ya.+ Ọ ga-eme ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’oge ọ na-edozi ọkụ* ndị ahụ+ kwa ụtụtụ. 8 Erọn ga na-amụnyekwa insens* mgbe ọ na-amụnye ọkụ* ndị ahụ ná mgbede.* Ọ bụ àjà insens a ga na-achụ n’ihu Jehova n’ọgbọ unu niile. 9 Unu agaghị achụ àjà insens iwu na-akwadoghị+ ma ọ bụ chụọ àjà a na-esu ọkụ ma ọ bụ àjà ọka n’elu ya. Unu awụsakwala àjà mmanya n’elu ya. 10 Erọn ga-achụ àjà ikpuchi mmehie n’elu mpi ndị dị na ya otu ugboro n’afọ.+ Ọ ga na-eji ọbara anụ e ji achụ àjà mmehie achụ àjà ikpuchi mmehie maka ya+ otu ugboro n’afọ n’ọgbọ unu niile. Ọ* bụ ihe kacha nsọ n’anya Jehova.”

11 Jehova wee gwa Mosis, sị: 12 “Mgbe ọ bụla ị gụrụ ụmụ nwoke Izrel ọnụ ka ị mata ole ha dị,+ onye ọ bụla n’ime ha ga-enye Jehova ihe ọ ga-eji gbara ndụ* ya mgbe a na-agụ ha ọnụ, ka ihe ọjọọ ọ bụla ghara ime ha mgbe a na-edeba aha ha n’akwụkwọ. 13 Ihe a bụ ihe onye ọ bụla e debara aha ya n’akwụkwọ ga-enye: ọkara shekel* e ji shekel dị n’ebe nsọ*+ tụọ. Gira* iri abụọ bụ otu shekel. Ọ bụ ọkara shekel bụ onyinye a na-enye Jehova.+ 14 Onye ọ bụla e debara aha ya n’akwụkwọ, bụ́ onye dị afọ iri abụọ ma ọ bụ karịa, ga-enye Jehova onyinye.+ 15 Ọgaranya agaghị enye ihe karịrị ọkara shekel,* ogbenye agaghịkwa enye ihe dị ala karịa ọkara shekel ka ọ bụrụ onyinye ọ na-enye Jehova iji gbara ndụ* ya. 16 Ị ga-anata ndị Izrel ego ọlaọcha ahụ ha ji gbara ndụ ha, jiri ya kwado ọrụ a na-arụ n’ụlọikwuu nzute, ka o wee bụụrụ ụmụ Izrel ihe ncheta n’ihu Jehova, ka ọ bụrụ ihe unu ji agbara ndụ* unu.”

17 Jehova gwakwara Mosis, sị: 18 “Jiri ọla kọpa kpụọ nnukwu ite na ihe a ga-eji adọkwasị ya.+ Dọsa ya n’agbata ụlọikwuu nzute na ebe ịchụàjà ma gbanye ya mmiri.+ 19 Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga na-asa aka ha na ụkwụ ha n’ebe ahụ.+ 20 Mgbe ha na-abanye n’ụlọikwuu nzute ma ọ bụ mgbe ha bịara ebe ịchụàjà nso ka ha jee ozi nakwa ka ha chụọrọ Jehova àjà ma mee ka anwụrụ ọkụ ya kwụgoo elu, ha ga-eji mmiri sachaa onwe ha ka ha ghara ịnwụ. 21 Ha ga-asa aka ha na ụkwụ ha ka ha ghara ịnwụ. Ọ ga-abụkwara ha iwu ha ga na-edebe mgbe niile, ma yanwa ma ụmụ ya, n’ọgbọ ha niile.”+

22 Jehova wee gwa Mosis, sị: 23 “Weta ihe ndị a kacha mma na-esi ísì ọma: mea kpụkọrọ akpụkọ dị narị shekel* ise (500), na sinamọn na-esi ísì ọma nke bụ́ ọkara ya, ya bụ, narị shekel abụọ na iri ise (250), kalamọs na-esi ísì ọma nke dị narị shekel abụọ na iri ise (250), 24 nakwa kashịa dị narị shekel ise (500), nke e ji shekel dị n’ebe nsọ* tụọ,+ nakwa mmanụ oliv dị otu hin.* 25 Jiri ha mepụta mmanụ nsọ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ. A ga-agwakọta ha nke ọma.*+ Ọ ga-abụ mmanụ nsọ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ.

26 “Ị ga-eji ya tee ụlọikwuu nzute na igbe ọgbụgba ndụ* mmanụ,+ 27 teekwa tebụl ahụ na arịa ya niile, ihe e ji adọsa ọkụ* na arịa ya niile, ebe ịchụàjà insens ahụ, 28 ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ na arịa ya niile, na nnukwu ite ahụ na ihe a ga-eji adọkwasị ya. 29 Ị ga-eme ka ha dị nsọ ka ha wee bụrụ ihe ndị kacha nsọ.+ Onye ọ bụla nke ga-emetụ ha aka kwesịrị ịbụ onye dị nsọ.+ 30 Ị ga-etekwa Erọn+ na ụmụ ya ndị nwoke mmanụ+ ma mee ka ha dị nsọ, ka ha wee bụrụ ndị nchụàjà m.+

31 “Ị ga-agwa ndị Izrel, sị, ‘Mmanụ a ga-abụrụ m mmanụ nsọ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ n’ọgbọ unu niile.+ 32 A gaghị ete ya mmadụ n’ahụ́. Unu agaghịkwa eji ihe ndị e ji mee mmanụ a mepụta ihe ọ bụla. Ọ bụ ihe dị nsọ. Ọ ga na-abụrụ unu ihe dị nsọ. 33 Onye ọ bụla nke mere mmanụ otite dị ka ya ma tee ya onye na-abụghị onye nchụàjà,* a ga-egbu ya.’”*+

34 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Weta ihe ndị a na-esi ísì ọma:+ mmanụ stakti, ọnịka na-esi ísì ọma, galbanọm na-esi ísì ọma, na frankinsens a na-agwaghị agwa. Otú otu hà ka ibe ya ga-aha. 35 Jiri ha mee insens.*+ A ga-agwakọta ha nke ọma,* tinye ya nnu.+ A gaghị etinye ya ihe ọzọ, ọ ga-adịkwa nsọ. 36 Ị ga-asụ ụfọdụ n’ime ya nke ọma ka ọ dị ka ntụ ma dowe ụfọdụ n’ime ya n’ihu igbe ọgbụgba ndụ* ahụ dị n’ụlọikwuu nzute, bụ́ ebe m ga na-apụta n’ihu gị. Ọ ga-abụrụ unu ihe kacha nsọ. 37 Unu emerela onwe unu insens nke e ji ihe ndị a mee.+ Unu ga-ewere ya ka ihe dị nsọ n’anya Jehova. 38 Onye ọ bụla mere ihe ọ bụla dị ka ya ka ọ nụrụ ísì ọma ya, a ga-egbu ya.”*

31 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Lee, ahọrọla m Bezalel,*+ onye ebo Juda. Ọ bụ nwa Yuraị, nwa nwa Họọ.+ 3 M ga-eme ka mmụọ Chineke jupụta n’ime ya, ka o wee nwee amamihe na nghọta ma mara otú e si arụ ọrụ ọ bụla e ji nkà arụ, 4 ka o nwee ike ise otú ihe dị iche iche a ga-arụ arụ ga-adị, ka o nwee ike iji ọlaedo, ọlaọcha, na ọla kọpa arụ ọrụ, 5 ka o nwee ike ịwa nkume+ na ịkwụnye nkume n’ebe ha ga-adị, na ịrụ ụdị ihe ọ bụla e ji osisi arụ.+ 6 Ahọpụtakwala m Oholiab,+ nwa Ahisamak, onye ebo Dan ka o nyere ya aka. M ga-emekwa ka ndị niile nwere nkà* nwee amamihe, ka ha wee rụọ ihe niile m nyere gị n’iwu:+ 7 ụlọikwuu nzute,+ igbe ọgbụgba ndụ*+ na okwuchi ya+ nke ga-adị n’elu ya, arịa niile ga-adị n’ụlọikwuu ahụ, 8 tebụl+ na arịa ya, ihe e ji adọsa ọkụ* e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee na arịa ya niile,+ ebe ịchụàjà insens,+ 9 ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ+ na arịa ya niile, nnukwu ite na ihe a ga-eji adọkwasị ya,+ 10 uwe ndị a kpara nke ọma, uwe nsọ Erọn onye nchụàjà, uwe ụmụ ya ndị nwoke ga-eyi na-arụ ọrụ nchụàjà,+ 11 mmanụ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ, na insens na-esi ísì ọma maka ụlọikwuu ahụ.+ Ha ga-eme ihe niile m nyere gị n’iwu.”

12 Jehova gwakwuru Mosis, sị: 13 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Hụnụ na unu na-edebe ụbọchị izu ike m,+ n’ihi na ọ bụ ihe na-egosi na mụ na unu agbaala ndụ n’ọgbọ unu niile, ka unu wee mara na ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, na-eme ka unu dị nsọ. 14 Unu ga na-edebe Ụbọchị Izu Ike n’ihi na ọ bụụrụ unu ihe dị nsọ.+ A ga-egbu onye ọ bụla merụrụ ya. Onye* ọ bụla rụrụ ọrụ n’ụbọchị ahụ, a ga-egbu ya.*+ 15 E nwere ike ịrụ ọrụ ụbọchị isii, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike, nke a ga-ezu naanị ike na ya.+ Ọ bụ ihe dị nsọ n’anya Jehova. Onye ọ bụla rụrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike, a ga-egbu ya. 16 Ndị Izrel ga-edebe Ụbọchị Izu Ike. Ha ga-edebe Ụbọchị Izu Ike n’ọgbọ ha niile. Ọ bụ ọgbụgba ndụ ga-adịte aka. 17 Ọ bụ ihe àmà ga-adịgide adịgide nke na-egosi na mụ na ndị Izrel agbaala ndụ,+ n’ihi na Jehova ji ụbọchị isii kee eluigwe na ụwa, ma ọ rụghị ọrụ n’ụbọchị nke asaa, kama o zuru ike.’”+

18 Ozugbo ọ gwachara Mosis okwu n’Ugwu Saịnaị, o bunyere ya mbadamba nkume abụọ e dere Ihe Àmà ahụ.+ Ọ bụ mkpịsị aka Chineke dere ihe ná mbadamba nkume ndị ahụ.+

32 N’ime oge a, ndị Izrel hụrụ na Mosis anọteela aka n’ugwu ahụ, ọ gbadatabeghịkwa.+ Ha wee zukọta n’ebe Erọn nọ, sị ya: “Meere anyị chi ga na-edu anyị,+ n’ihi na anyị amaghị ihe mere Mosis a, onye si n’Ijipt dupụta anyị.” 2 Erọn wee sị ha: “Gbapụtanụ ọla ntị ọlaedo+ ndị nwunye unu gba nakwa nke ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị gba ma chịtaranụ m ha.” 3 Ha niile wee malite ịgbapụta ọla ntị ọlaedo ndị ha gba ma na-achịtara ha Erọn. 4 O wee nara ha ọlaedo ndị ahụ ha chịtara ma jiri ihe e ji atụ́ ihe rụọ ya, mepụta nwa ehi.*+ Ha malitere ịsị: “Ndị Izrel, ihe a bụ Chi anyị, onye dupụtara anyị n’Ijipt.”+

5 Mgbe Erọn hụrụ ihe a, ọ rụrụ ebe ịchụàjà n’ihu ya. Erọn wee kwuo n’olu dara ụda, sị: “E nwere ememme a ga-emere Jehova echi.” 6 N’echi ya, ha biliri n’isi ụtụtụ ma bido ịchụ àjà a na-esu ọkụ na àjà udo. Mgbe e mechara, ndị Izrel nọdụrụ ala riwe ihe ma ṅụwa mmanya. Ha biliziri kporiwe ndụ.+

7 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Gbadaa, n’ihi na ndị gị, bụ́ ndị i dupụtara n’Ijipt, emerụọla onwe ha.+ 8 N’egbughị oge, ha ahapụla iwu m nyere ha ka ha na-edebe.+ Ha emeerela onwe ha nwa ehi,* ha na-akpọkwara ya isiala ma na-achụrụ ya àjà, na-asị, ‘Ndị Izrel, ihe a bụ Chi anyị, onye dupụtara anyị n’Ijipt.’” 9 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Ahụla m na ndị a bụ ndị isi ike.*+ 10 Hapụ m ka m jiri oké iwe na-ewe m bibie ha, ka m mezie ka ị bụrụ mba dị ukwuu.”+

11 Mosis wee rịọ Jehova bụ́ Chineke ya arịrịọ,*+ sị: “Jehova, gịnị mere i ji ewesa ndị gị oké iwe, bụ́ ndị i ji ike gị dị ukwuu na aka gị dị ike kpọpụta n’Ijipt?+ 12 Gịnị mere ị ga-eji kwe ka ndị Ijipt sị, ‘O bu ihe ọjọọ n’obi kpọpụta ha maka na ọ chọrọ igbu ha n’ugwu ma kpochapụ ha n’ụwa’?+ Ka iwe gị dị ọkụ dajụọ. Biko, gbanwee obi gị* banyere ọdachi a i kpebiri na ị ga-eme ka ọ dakwasị ndị gị. 13 Cheta Ebreham, Aịzik, na Izrel bụ́ ndị ohu gị, ndị i ji onwe gị ṅụọrọ iyi, sị: ‘M ga-eme ka ụmụ* unu dị ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe.+ M ga-enyekwa ụmụ* unu ala a niile m doweere ha, ka ha wee nweta ya ka ọ bụrụ nke ha mgbe niile.’”+

14 Jehova wee malite ịgbanwe obi ya* banyere ọdachi ahụ o kwuru na ọ ga-ewetara ndị ya.+

15 Mosis tụgharịrị si n’ugwu ahụ gbadaa, o bukwa mbadamba nkume abụọ e dere Ihe Àmà ahụ+ n’aka ya.+ E dere ihe ná mbadamba nkume ndị ahụ n’ihu ya abụọ. E dere ya ma n’ihu ma n’azụ. 16 Ọ bụ Chineke mere mbadamba nkume ndị ahụ. Ọ bụkwa Chineke dere ihe ná mbadamba nkume ndị ahụ, ya bụ, ihe ndị e denyere na ha.+ 17 Mgbe Joshụa nụwara mkpọtụ ndị Izrel n’ihi mkpu ha na-eti, ọ sịrị Mosis: “Mkpu agha na-ada n’ebe anyị mara ụlọikwuu.” 18 Ma Mosis sịrị:

“Ọ naghị ada ka abụ ndị meriri emeri.

Ọ naghịkwa ada ka mkpu ákwá ndị e meriri emeri.

Ihe m na-anụ bụ ụdị abụ ọzọ.”

19 Ozugbo Mosis rutere nso n’ebe ha mara ụlọikwuu ma hụ nwa ehi+ ahụ na egwú ha na-agba, ezigbo iwe malitere iwe ya. O wee tụpụ mbadamba nkume ndị ahụ o bu n’aka ma kụrisịa ha n’ala ala ugwu ahụ.+ 20 O buuru nwa ehi ahụ ha mere, kpọọ ya ọkụ ma gwerie ya, ya adị ka ntụ.+ O fesasịkwara ya n’elu mmiri ma mee ka ndị Izrel ṅụọ ya.+ 21 Mosis jụrụ Erọn, sị: “Gịnị ka ndị a mere gị i ji mee ka ha mee mmehie ọjọọ a?” 22 Erọn zara, sị: “Onyenwe m, iwe gị adịla ọkụ. Ị ma nke ọma na ndị a na-achọkarị ime ihe ọjọọ.+ 23 Ha sịrị m, ‘Meere anyị chi ga na-edu anyị, n’ihi na anyị amaghị ihe mere Mosis a, onye si n’Ijipt dupụta anyị.’+ 24 N’ihi ya, m sịrị ha, ‘Ka onye ọ bụla nke nwere ọlaedo gbapụta ya ma nye m ya.’ M wee tụba ya n’ọkụ, nwa ehi a apụta.”

25 Mosis hụrụ na ndị Izrel ekweghị nchịkwa maka na Erọn hapụrụ ha ka ha na-eme otú masịrị ha. Ha wee menye onwe ha ihere n’ihu ndị iro ha. 26 Mosis wee guzoro n’ọnụ ụzọ ámá ebe ha mara ụlọikwuu, sị: “Ònye dịnyeere Jehova? Ya bịakwute m.”+ Ụmụ Livaị niile wee malite ịgbakọta n’ebe ọ nọ. 27 Ọ sịziri ha: “Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị, ‘Ka onye ọ bụla n’ime unu kee mma agha ya n’úkwù. Gagharịakwanụ n’ebe niile unu mara ụlọikwuu, si n’otu ọnụ ụzọ ámá ruo n’ọnụ ụzọ ámá ọzọ. Gbuonụ ụmụnne unu, ndị agbata obi unu, na ezigbo ndị enyi unu.’”+ 28 Ụmụ Livaị mere ihe Mosis kwuru. E wee gbuo ihe dị ka puku ụmụ nwoke ndị Izrel atọ (3,000) n’ụbọchị ahụ. 29 Mosis kwuziri, sị: “Wepụtanụ onwe unu iche taa ijere Jehova ozi, n’ihi na onye ọ bụla n’ime unu egbuola nwa ya nakwa nwanne ya.+ Ọ ga-agọzi unu taa.”+

30 N’echi ya, Mosis gwara ndị Izrel, sị: “Unu emeela mmehie dị oké njọ. Ma, m ga-agbago n’ugwu gakwuru Jehova ka m mara ma è nwere ihe m ga-eme ka ọ gbaghara unu mmehie unu.”+ 31 Mosis wee laghachikwuru Jehova, sị: “Ndị a emeela nnukwu mmehie. Ha meere onwe ha chi ọlaedo.+ 32 Ma ugbu a, ọ bụrụ na ị chọrọ, gbaghara ha mmehie ha.+ Ma ọ bụrụ na ị gaghị agbaghara ha, biko, hichapụ aha m n’aha ndị i dere n’akwụkwọ gị.”+ 33 Ma Jehova sịrị Mosis: “Ọ bụ onye ọ bụla mehiere m ka m ga-ehichapụ aha ya n’akwụkwọ m. 34 Gaa duru ndị a gawa n’ebe m gwara gị. Lee, mmụọ ozi m ga-ebutere gị ụzọ.+ M ga-atakwa ha ahụhụ maka mmehie ha n’ụbọchị m ga-eme ka ha zaa ajụjụ maka ya.” 35 Jehova wee malite ịta ha ahụhụ n’ihi nwa ehi ahụ ha mere, nke Erọn mere.

33 Jehova gwakwara Mosis, sị: “Si n’ebe a kwalie, gị na ndị a i dupụtara n’Ijipt. Gawanụ n’ala m ṅụụrụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb iyi, sị, ‘M ga-enye ya ụmụ* gị.’+ 2 M ga-edunye otu mmụọ ozi ka o butere gị ụzọ+ wee chụpụ ndị Kenan, ndị Amọraịt, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus.+ 3 Gawanụ n’ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ Ma agaghị m eso unu gaa n’ihi na unu bụ ndị isi ike,*+ m nwekwara ike ibibi unu n’ụzọ.”+

4 Mgbe ndị Izrel nụrụ okwu a na-agba agba ná ntị, ha malitere iru uju, e nweghịkwa onye ọ bụla n’ime ha yiiri ihe o ji achọ mma. 5 Jehova sịrị Mosis: “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Unu bụ ndị isi ike.*+ M nwere ike ịbịa n’ebe unu mara ụlọikwuu bibie unu n’otu ntabi anya.+ N’ihi ya, unu eyila ihe ndị unu ji achọ mma, ka m chegodị ihe m ga-eme unu.’” 6 Ndị Izrel eyighịzi* ihe ndị ha ji achọ mma malite mgbe ha nọ n’Ugwu Horeb gawa.

7 Mosis sizi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu foro ụlọikwuu ya wee maa ya n’ebe dịpụtụrụ adịpụ ma kpọọ ya ụlọikwuu nzute. Onye ọ bụla chọrọ ịjụ Jehova ase+ na-esi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu pụọ gaa n’ụlọikwuu nzute ahụ. 8 Ọ na-abụ Mosis gawa n’ụlọikwuu ahụ, mmadụ niile na-ebili guzoro n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ha. Ha na-elegidekwa Mosis anya ruo mgbe ọ banyere n’ụlọikwuu ahụ. 9 Ozugbo Mosis banyere n’ụlọikwuu ahụ, ogidi ígwé ojii+ na-agbadata kwụrụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ mgbe Chineke na Mosis na-ekwurịta okwu.+ 10 Mgbe ọ bụla ha niile hụrụ ka ogidi ígwé ojii ahụ kwụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, onye ọ bụla n’ime ha na-anọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya kpọọ isiala. 11 Jehova gwara Mosis okwu ihu na ihu+ otú mmadụ si agwa mmadụ ibe ya okwu. Mgbe ọ bụla Mosis gaghachiri n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, Joshụa+ nwa Nọn, bụ́ onye ozi ya na onye na-enyere ya aka,+ anaghị esi n’ụlọikwuu ahụ apụ.

12 Mosis gwara Jehova, sị: “Lee, ị na-asị m, ‘Duru ndị a gawa,’ ma i mebeghị ka m mara onye ị ga-edunye m ka mụ na ya soro. I kwuokwala, sị, ‘Ama m gị nke ọma,* ihe gị masịkwara m.’ 13 Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, biko, mee ka m mara ụzọ gị,+ ka m wee mara gị, ka ihe m na-adịkwa gị mma. Chetakwa na mba a bụ ndị gị.”+ 14 N’ihi ya, Chineke* sịrị: “Mụnwa* ga-eso gị aga.+ M ga-emekwa ka i zuru ike.”+ 15 Mosis wee sị ya: “Ọ bụrụ na gịnwa* agaghị eso anyị aga, edurula anyị pụọ ebe a. 16 Oleekwanụ otú a ga-esi amata na ihe mụ na ndị gị masịrị gị? Ọ́ bụghị ma i soro anyị gawa,+ ka mụ na ndị gị wee dị iche ná ndị niile ọzọ nọ n’ụwa?”+

17 Jehova wee gwa Mosis, sị: “M ga-emekwa ihe a ị rịọrọ n’ihi na ihe gị masịrị m, amakwa m gị nke ọma.”* 18 Mosis wee sị: “Biko, gosi m ebube gị.” 19 Ma ọ sịrị: “M ga-agafe n’ihu gị ma mee ka ị hụ otú m si dị mma. M ga-akọsakwa aha m bụ́ Jehova n’ihu gị.+ Onye m chọrọ imere amara ka m ga-emere amara. Onye m chọkwara imere ebere ka m ga-emere ebere.”+ 20 Ma ọ sịkwara: “I nweghị ike ịhụ ihu m, n’ihi na e nweghị mmadụ ga-ahụ ihu m ma dị ndụ.”

21 Jehova kwukwara, sị: “Ebe a dị nso n’ebe m nọ. Nọrọ n’oké nkume a. 22 Mgbe ebube m na-agafe, m ga-eme ka ị banye n’ọgba dị n’oké nkume a. M ga-ejikwa aka m kpuchie gị ruo mgbe m gafere. 23 M gafechaa, m ga-ewepụ aka m. Ị ga-ahụkwa azụ m, ma ị gaghị ahụ ihu m.”+

34 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Wapụtara onwe gị mbadamba nkume abụọ ndị dị ka ndị mbụ ahụ.+ M ga-edekwa okwu ndị dị ná mbadamba nkume ndị mbụ ahụ+ ị kụriri+ ná mbadamba nkume ndị a. 2 Jikere maka ụtụtụ, n’ihi na n’ụtụtụ, ị ga-agbago n’Ugwu Saịnaị kwụrụ n’ihu m n’ebe ahụ, n’elu ugwu ahụ.+ 3 Ma e nweghị onye ga-eso gị gbagoo. Ka a ghara ịhụ onye ọ bụla ọzọ n’ebe ọ bụla n’ugwu ahụ. Ka a gharadị inwe ìgwè atụrụ ma ọ bụ ìgwè ehi ga-ata ahịhịa n’ihu ugwu ahụ.”+

4 Mosis wee wapụta mbadamba nkume abụọ ndị dị ka ndị mbụ ahụ ma bilie n’isi ụtụtụ gbagoo n’Ugwu Saịnaị, otú Jehova nyere ya n’iwu. O bu mbadamba nkume abụọ ahụ n’aka ya. 5 Jehova gbadatara+ n’ígwé ojii ma kwụrụ n’ebe Mosis kwụ wee kọsaa aha Jehova.*+ 6 Jehova nọ na-agafe n’ihu ya ma na-ekwu, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nwere ọmịiko*+ ma na-eme ebere,+ onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye ịhụnanya ya*+ na eziokwu ya+ dị ukwuu, 7 onye na-egosi puku kwuru puku ọgbọ na ọ hụrụ ha n’anya,*+ onye na-agbaghara ajọ omume na mmebi iwu na mmehie.+ Ma e nweghị ihe ga-eme ka ọ hapụ ịta onye ikpe mara ahụhụ,+ kama ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ nakwa ọgbọ nke atọ na ọgbọ nke anọ ahụhụ n’ihi mmehie ndị nna ha mere.”+

8 Mosis mere ọsọ ọsọ hulata kpọọ isiala. 9 O wee sị: “Biko, Jehova, ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, Jehova, soro anyị gaa ma nọnyere anyị+ n’agbanyeghị na anyị bụ ndị isi ike,*+ gbagharakwa ajọ omume anyị na mmehie anyị+ ma were anyị ka ndị gị.” 10 Jehova wee sị: “Lee, mụ na unu na-agba ndụ: N’ihu ndị gị niile ka m ga-arụ ọrụ ndị dị ebube a na-arụtụbeghị n’ụwa niile ma ọ bụ na mba niile.+ Ndị niile unu na ha bi ga-ahụkwa ọrụ m, n’ihi na ọ bụ ihe dị ịtụnanya ka m ga-emere unu.+

11 “Gee ntị nke ọma n’iwu m na-enye gị taa.+ M na-achụpụrụ unu ndị Amọraịt, ndị Kenan, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus.+ 12 Kpachara anya ka gị na ndị bi n’ala ahụ ị na-aga ghara ịgba ndụ,+ ma ọ́ bụghị ya, ọ ga-abụrụ unu ọnyà.+ 13 Ma unu ga-akwatusị ebe ịchụàjà ha. Unu ga-akụrisị ogidi arụsị ha. Unu ga-egbutusịkwa ogwe osisi arụsị* ha.+ 14 Akpọrọla chi ọzọ isiala,+ n’ihi na ihe e ji mara Jehova bụ* na ọ chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.* N’eziokwu, ọ bụ Chineke onye chọrọ ka a na-efe naanị ya.+ 15 Kpachara anya ka gị na ndị bi n’ala ahụ ghara ịgba ndụ, n’ihi na mgbe ha ga-akpa àgwà ka ndị akwụna na-efe chi ha ma na-achụrụ chi ha àjà,+ ha ga-akpọ gị, ị ga-erikwa ihe ha ji chụọ àjà.+ 16 Ị ga-alụtakwara ụmụ gị ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị,+ ụmụ ha ndị nwaanyị ga-akpakwa àgwà ka ndị akwụna fee chi ha ma mee ka ụmụ gị ndị nwoke kpaa àgwà ka ndị akwụna gaa fewe chi ha.+

17 “Unu akpụla chi ọ bụla.+

18 “Ị ga na-eme Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko.+ Ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko otú m nyere gị n’iwu. Mee ya ụbọchị asaa n’oge a kara aka n’ọnwa Ebib,*+ n’ihi na ọ bụ n’ọnwa Ebib ka i si n’Ijipt pụta.

19 “Ọ bụ m nwe nwoke ọ bụla e bụ ụzọ mụọ+ nakwa anụmanụ ọ bụla bụ́ oké anụ ụlọ gị bu ụzọ mụọ,* ma ọ̀ bụ nke ehi mụrụ ma ọ̀ bụ nke atụrụ mụrụ.+ 20 Ị ga-eji atụrụ gbara jakị ọ bụla e bu ụzọ mụọ. Ma ọ bụrụ na ị gbaraghị ya, ị ga-akụji ya olu. Ị ga-agbara nwa nwoke ọ bụla i bu ụzọ mụọ n’ụmụ gị ndị nwoke.+ E nweghị onye ga-agba aka bịa n’ihu m.

21 “Ị ga-arụ ọrụ ụbọchị isii, ma n’ụbọchị nke asaa, ị ga-ezu ike.*+ Ị ga-ezu ike, ma n’oge a na-akọ ihe ma n’oge a na-ewe ihe ubi.

22 “Ị ga-eji ọka wit mbụ kara aka ị ghọtara n’ubi mee Ememme Izu. Ị ga-emekwa Ememme Ịchịkọbata Ihe* ná ngwụcha afọ.+

23 “Ugboro atọ n’afọ, ụmụ nwoke unu niile ga-abịa n’ihu ezi Onyenwe unu, bụ́ Jehova, Chineke Izrel.+ 24 N’ihi na m ga-achụpụrụ gị mba ndị ahụ,+ m ga-emekwa ka ala gị saa mbara. E nweghịkwa onye ga-achọ iwere ala gị mgbe ị na-aga n’ihu Jehova* bụ́ Chineke gị ugboro atọ n’afọ.

25 “Mgbe i ji anụ na-achụrụ m àjà, achụkọtala ọbara ya na ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha.+ E kwesịghị idosa anụ e ji chụọ àjà Ememme Ngabiga ruo ụtụtụ.+

26 “Mkpụrụ kacha mma ná mkpụrụ mbụ kara aka ala gị mepụtara ka ị ga-eweta n’ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị.+

“Esila nwa ewu n’ime mmiri ara nne ya.”+

27 Jehova gwakwara Mosis, sị: “Ị ga-ede okwu ndị a ede,+ n’ihi na mụ na gị na ndị Izrel ga-agbakwasị ụkwụ n’ihe ndị a m kwuru gbaa ndụ.”+ 28 Ya na Jehova nọgidere n’ebe ahụ ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. O righị nri ọ bụla, ọ ṅụghịkwa mmiri ọ bụla.+ O dekwara ihe ndị e kwuru n’ọgbụgba ndụ a, bụ́ Iwu Iri ahụ,* ná mbadamba nkume ndị ahụ.+

29 Mosis sizi n’Ugwu Saịnaị gbadata, o bukwa mbadamba nkume abụọ e dere Ihe Àmà ahụ n’aka ya.+ Mgbe Mosis si n’ugwu ahụ gbadata, ọ maghị na ihu ya na-enwu ka ìhè maka na ya na Chineke kwurịtara okwu. 30 Mgbe Erọn na ndị Izrel niile hụrụ Mosis, ha chọpụtara na ihu ya na-enwu ka ìhè, ụjọ ekweghịkwa ha gaa ya nso.+

31 Ma Mosis kpọrọ ha, Erọn na ndị niile so ná ndị isi nzukọ ahụ wee bịakwute ya, Mosis agwa ha okwu. 32 Mgbe e mechara, ndị Izrel niile bịara ya nso. O wee gwa ha ihe niile Jehova nyere ya n’iwu n’Ugwu Saịnaị.+ 33 Mgbe ọ bụla Mosis gwachara ha okwu, ọ na-eji ákwà kpuchie ihu ya.+ 34 Ma mgbe ọ bụla Mosis gara n’ihu Jehova ka ya na ya kwurịta okwu, ọ na-ewepụ ákwà ahụ ruo mgbe ọ pụtara.+ Ọ na-apụtazi gwa ndị Izrel ihe ndị e nyere ya n’iwu.+ 35 Ndị Izrel na-ahụ na ihu Mosis na-enwu ka ìhè. Mosis na-ewere ákwà ahụ kpuchighachi ihu ya ruo mgbe ọ gara ka ya na Chineke* kwuo okwu.+

35 Mosis mechara kpọkọta nzukọ Izrel niile wee sị ha: “Ihe ndị a ka Jehova nyere anyị iwu ka anyị mee:+ 2 E nwere ike ịrụ ọrụ ụbọchị isii, ma ụbọchị nke asaa ga-adịrị unu nsọ. Ọ bụ ụbọchị izu ike a ga-edebere Jehova, nke a ga-ezu naanị ike na ya.+ Onye ọ bụla rụrụ ọrụ n’ụbọchị ahụ, a ga-egbu ya.+ 3 Unu amụnyela ọkụ n’ebe ọ bụla unu bi n’Ụbọchị Izu Ike.”

4 Mosis gwaziri nzukọ Izrel niile, sị: “Jehova nyere iwu, sị, 5 ‘Sinụ n’ihe ndị unu nwere wetara Jehova onyinye.+ Ka onye ọ bụla nwere obi inye ihe+ wetara Jehova onyinye: ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa, 6 eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, ezigbo eri linin, ajị ewu,+ 7 akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara, akpụkpọ anụ sil, osisi akeshịa, 8 mmanụ a ga na-agbanye n’ọkụ,* mmanụ balsam a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ ma jirikwa na-eme insens na-esi ísì ọma,+ 9 nkume ọnịks, na nkume ndị ọzọ a ga-akwụnye n’efọd+ nakwa ndị a ga-akwụnye n’akpa a na-anya n’obi.+

10 “‘Ka ndị niile nwere nkà*+ n’ime unu bịa rụọ ihe niile Jehova nyere n’iwu, 11 ya bụ, ụlọikwuu ahụ na ákwà ya na ihe a ga-eji kpuchie ya, nko ya na frem ya, okporo osisi ya, ogidi ya, na ntọala ya ndị nwere oghere; 12 Igbe ahụ+ na okporo osisi ya,+ okwuchi ya,+ na ákwà mgbochi+ a ga-eji gechie ya; 13 tebụl+ na okporo osisi ya na arịa ya niile nakwa achịcha a na-enye Chineke;+ 14 ihe e ji adọsa ọkụ*+ nke ga na-enye ìhè na arịa ya na ọkụ* ya nakwa mmanụ a ga-eji na-amụ ọkụ;+ 15 ebe ịchụàjà insens+ na okporo osisi ya; mmanụ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ na insens na-esi ísì ọma;+ ákwà ngebichi* nke ga-adị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ; 16 ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ+ na ihe e ji ọla kọpa kpaa a ga-etinye n’ime ya, okporo osisi ya na arịa ya niile; nnukwu ite na ihe a ga-eji adọkwasị ya;+ 17 ákwà mgbochi ndị ga-adị n’ogige ụlọikwuu,+ ogidi ya na ntọala ya ndị nwere oghere; ákwà ngebichi* nke ga-adị n’ọnụ ụzọ ogige ahụ; 18 mkpọ́ ndị e ji ejide ụlọikwuu na mkpọ́ niile e ji ejide ogige ụlọikwuu ahụ na ụdọ ha;+ 19 uwe ndị a kpara nke ọma+ a ga-eyi na-eje ozi n’ụlọikwuu, uwe nsọ Erọn+ onye nchụàjà, na uwe ụmụ ya ndị nwoke ga-eyi na-arụ ọrụ nchụàjà.’”

20 Nzukọ Izrel niile wee si n’ihu Mosis pụọ. 21 Onye ọ bụla o metụrụ n’obi+ na onye ọ bụla ọ gụrụ agụụ* inye ihe bịara wetara Jehova onyinye a ga-eji arụ ụlọikwuu nzute, ihe ndị a ga-eji na-eje ozi na ya, nakwa ihe ndị a ga-eji mee uwe nsọ ndị ahụ. 22 Ha nọ na-abịa, ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị, onye ọ bụla nke nwere obi inye ihe. Ha nọ na-eweta ọla a na-etinye n’uwe, ọla ntị, mgbaaka, ihe ndị ọzọ e ji achọ mma, na ụdị ihe ọ bụla e ji ọlaedo mee. Ha niile wetaara Jehova àjà ọlaedo.*+ 23 Ndị niile nwere eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, ezigbo eri linin, ajị ewu, akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara, na akpụkpọ anụ sil wetara ha. 24 Ndị niile chọrọ inye onyinye ọlaọcha na ọla kọpa wetaara Jehova onyinye ha. Ndị niile nwekwara osisi akeshịa a ga-eji arụ nke ọ bụla n’ọrụ ahụ wetara ya.

25 Ụmụ nwaanyị niile ndị nwere nkà+ ji aka ha mee eri, ha wetakwara ihe ndị ha mere: eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin. 26 Ụmụ nwaanyị niile ndị nwere nkà bụ́ ndị o metụrụ n’obi ji ajị ewu mee eri.

27 Ndị isi wetara nkume ọnịks na nkume ndị ọzọ a ga-akwụnye n’efọd nakwa ndị a ga-akwụnye n’akpa a na-anya n’obi,+ 28 na mmanụ balsam na mmanụ a ga na-agbanye n’ọkụ* na mmanụ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ+ ma jirikwa na-eme insens na-esi ísì ọma.+ 29 Ụmụ nwoke niile na ụmụ nwaanyị niile o metụrụ n’obi wetara ihe maka ọrụ Jehova si n’ọnụ Mosis nye iwu ka a rụọ. Ndị Izrel wetara ha ka ha bụrụ onyinye si ha n’obi ha nyere Jehova.+

30 Mosis wee gwa ndị Izrel, sị: “Lee, Jehova ahọrọla Bezalel,* onye ebo Juda. Ọ bụ nwa Yuraị, nwa nwa Họọ.+ 31 Chineke emeela ka mmụọ ya jupụta n’ime ya, ka o wee nwee amamihe na nghọta ma mara otú e si arụ ọrụ ọ bụla e ji nkà arụ, 32 ka o nwee ike ise otú ihe dị iche iche a ga-arụ arụ ga-adị, ka o nwee ike iji ọlaedo, ọlaọcha, na ọla kọpa arụ ọrụ, 33 ka o nwee ike ịwa nkume na ịkwụnye nkume n’ebe ha ga-adị, na ịrụ ụdị ihe niile e ji osisi arụ. 34 O meela ka ya na Oholiab,+ nwa Ahisamak, onye ebo Dan, mara otú ha ga-esi akụziri ndị ọzọ ihe. 35 O meela ka ha bụrụ aka ochie*+ n’ịrụ ọrụ niile e ji nkà arụ, n’ọrụ ịkpa ihe n’ákwà, nakwa n’ọrụ iji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie na ezigbo ákwà linin akpa ihe, nakwa n’ọrụ ikwe ákwà. Ụmụ nwoke ndị a ga-arụ ụdị ọrụ ọ bụla, kwadebekwa otú ihe dị iche iche a ga-arụ ga-adị.

36 “Bezalel na Oholiab ga-arụkọ ọrụ, ha na nwoke ọ bụla nwere nkà,* bụ́ onye Jehova mere ka o nwee amamihe na nghọta ma mara otú e si arụ ọrụ niile gbasara ozi dị nsọ, otú Jehova nyere n’iwu.”+

2 Mosis wee kpọọ Bezalel na Oholiab na nwoke ọ bụla nwere nkà, bụ́ onye Jehova mere ka o nwee amamihe,+ onye ọ bụla o metụrụ n’obi iwepụta onwe ya ịrụ ọrụ ahụ.+ 3 Ha wee nara Mosis onyinye niile+ ndị Izrel wetara a ga-eji arụ ọrụ gbasara ozi dị nsọ. Ma, ndị Izrel ka nọ na-ewetara Mosis onyinye si ha n’obi kwa ụtụtụ.

4 Mgbe ha malitere ọrụ ahụ dị nsọ, ndị niile nwere nkà nọ na-abịa n’otu n’otu. 5 Ha nọkwa na-asị Mosis: “Ndị Izrel na-eweta ihe karịrị ihe a chọrọ maka ọrụ a Jehova nyere iwu ka a rụọ.” 6 Mosis nyeziri iwu ka a maa ọkwa n’ebe niile ha mara ụlọikwuu, sị: “Ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị, unu ewetazila onyinye maka ọrụ a dị nsọ.” N’ihi ya, e mere ka ha kwụsị iweta ihe ọ bụla ọzọ. 7 Ihe ndị e wetara zuru maka ọrụ niile a ga-arụ, ha karịdịrị akarị.

8 Ndị niile nwere nkà+ wee jiri ákwà ụlọikwuu iri rụọ ụlọikwuu ahụ.+ Ha ji ezigbo eri linin a kpara akpa, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, na eri na-acha uhie uhie, kpaa ákwà ụlọikwuu ndị ahụ. Ọ* kpara ndị cherob na ha.+ 9 Nke ọ bụla n’ime ákwà ụlọikwuu ndị ahụ dị kubit* iri abụọ na asatọ n’ogologo na kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu niile ahụ hà. 10 O wee dụkọta ákwà ụlọikwuu ise ọnụ, dụkọtakwa ákwà ụlọikwuu ise nke ọzọ ọnụ. 11 O jizi eri na-acha anụnụ anụnụ dụnye oghere n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu ise a dụkọtara ọnụ, n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ. O mere otu ihe ahụ n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ a dụkọtara ọnụ, n’ákwà ya nke ikpeazụ, n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ. 12 Ọ dụnyere oghere iri ise n’otu ákwà ụlọikwuu, dụnyekwa oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ n’ebe a ga-ejikọta ya na ákwà ụlọikwuu nke ọzọ, ka oghere ndị ahụ chee ibe ha ihu. 13 N’ikpeazụ, o ji ọlaedo rụọ nko iri ise ma jiri nko ndị ahụ jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ, ya abụrụ otu ụlọikwuu.

14 O wee jiri ajị ewu kpaa ákwà ụlọikwuu a ga-eji kpuchie ụlọikwuu ahụ. Ọ kpara ákwà ụlọikwuu iri na otu.+ 15 Nke ọ bụla n’ime ákwà ụlọikwuu ndị ahụ dị kubit iri atọ n’ogologo na kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu iri na otu ahụ hà. 16 O wee dụkọta ákwà ụlọikwuu ise ọnụ, dụkọtakwa ákwà ụlọikwuu isii nke ọzọ ọnụ. 17 Ọ dụnyeziri oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu ahụ a dụkọtara ọnụ, n’ákwà ya nke ikpeazụ, n’ebe a ga-ejikọta ya na ákwà ụlọikwuu nke ọzọ. Ọ dụnyekwara oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ a ga-ejikọta ya na ya. 18 O ji ọla kọpa rụọ nko iri ise a ga-eji jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ ka ha bụrụ otu.

19 O ji akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara mee ihe a ga-eji kpuchie ụlọikwuu ahụ, jirikwa akpụkpọ anụ sil mee ihe a ga-ekpukwasị n’elu ya.+

20 O jizi osisi akeshịa+ rụọ frem ndị kwụcha ọtọ a ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ.+ 21 Frem nke ọ bụla dị kubit iri n’ogologo na otu kubit na ọkara n’obosara. 22 Frem nke ọ bụla nwere ụkwụ abụọ nọkọtara ọnụ n’okpuru ya. Otú ahụ ka o si rụọ frem niile a ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ. 23 Ọ rụrụ frem ndị ga-adị n’akụkụ ebe ndịda ụlọikwuu ahụ. Ha dị frem iri abụọ ndị chere ihu n’ebe ndịda. 24 O wee jiri ọlaọcha rụọ ntọala iri anọ ndị nwere oghere a ga-akwụnye frem iri abụọ ahụ na ha. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, bụ́ ebe ụkwụ ya abụọ ga-abanye, ntọala abụọ nwere oghere adịrịchaa n’okpuru frem ndị ọzọ, bụ́ ebe ụkwụ ha abụọ abụọ ga-abanye.+ 25 Ọ rụkwara frem iri abụọ ndị ga-adị n’akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ, n’ebe ugwu, 26 jirikwa ọlaọcha rụọ ntọala iri anọ ha ndị nwere oghere. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, ntọala abụọ nwere oghere adịrịchaa n’okpuru frem ndị ọzọ.

27 Ọ rụrụ frem isii ndị ga-adị n’ebe azụ ụlọikwuu ahụ, n’ebe ga-eche ihu n’ebe ọdịda anyanwụ.+ 28 Ọ rụrụ frem abụọ ndị ga-adị n’azụ ụlọikwuu ahụ n’isi ngwụcha ya abụọ. 29 A rụrụ ha ka ha gbaa mkpị si n’ala ruo n’elu, ruo n’ebe ihe nke mbụ dị okirikiri dị. Otú ahụ ka o si rụọ frem ndị ga-adị n’isi ngwụcha abụọ nke ụlọikwuu ahụ. 30 Ha wee dịrị frem asatọ nakwa ntọala iri na isii ha nwere oghere bụ́ ndị e ji ọlaọcha rụọ. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru frem nke ọ bụla.

31 O ji osisi akeshịa rụọ okporo osisi, okporo osisi ise maka frem ndị ga-adị n’otu akụkụ ụlọikwuu ahụ.+ 32 Ọ rụkwara okporo osisi ise maka frem ndị ga-adị n’akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ nakwa okporo osisi ise maka frem ndị ga-adị n’akụkụ ebe azụ ụlọikwuu ahụ, n’ebe ọdịda anyanwụ. 33 Ọ rụrụ okporo osisi nke ga-adị n’etiti frem ndị ahụ ka o si n’otu isi ụlọikwuu ahụ ruo n’isi ya nke ọzọ. 34 O ji ọlaedo machie frem ndị ahụ. O jikwa ọlaedo rụọ ihe ndị dị okirikiri ga-ejide okporo osisi ndị ahụ, jirikwa ọlaedo machie okporo osisi ndị ahụ.+

35 O wee jiri eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà mgbochi.+ Ọ kpara ndị cherob na ya.+ 36 O jizi osisi akeshịa rụọrọ ya ogidi anọ ma were ọlaedo machie ha, jirikwa ọlaedo rụọ ihe e ji ekonye ha. O jikwa ọlaọcha rụọ ntọala anọ ndị nwere oghere a ga-akwụnye ogidi ndị ahụ na ha. 37 O wee jiri eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà ngebichi* ga-adị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ.+ 38 Ọ rụkwara ogidi ise ya na ihe a ga-eji ekonye ihe na ha. O ji ọlaedo machie elu ha nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. Ma, ọ bụ ọla kọpa ka e ji rụọ ntọala ise ha ndị nwere oghere.

37 Bezalel+ wee jiri osisi akeshịa rụọ Igbe ahụ.+ Ọ dị kubit* abụọ na ọkara n’ogologo, otu kubit na ọkara n’obosara, nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu.+ 2 O ji ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya ime na azụ, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya.+ 3 O jizi ọlaedo kpụọ ihe anọ dị okirikiri ndị a kwụnyere n’elu ebe ụkwụ ya anọ dị. Abụọ dị n’otu akụkụ ya, abụọ adịrị n’akụkụ ya nke ọzọ. 4 O ji osisi akeshịa rụọ okporo osisi abụọ ma jiri ọlaedo machie ha.+ 5 O wee tinye okporo osisi ndị ahụ n’ihe ndị ahụ dị okirikiri a kwụnyere n’akụkụ Igbe ahụ, ka e jiri ha na-ebu Igbe ahụ.+

6 O ji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ okwuchi ya.+ Ọ dị kubit abụọ na ọkara n’ogologo nakwa otu kubit na ọkara n’obosara.+ 7 O jikwa ọlaedo rụọ cherob abụọ.+ O ji hama kụọ ha. Ha dị na nsọtụ abụọ nke okwuchi igbe ahụ.+ 8 Otu cherob dị n’otu nsọtụ, cherob nke ọzọ adịrị na nsọtụ nke ọzọ. Ọ rụrụ cherob ndị ahụ na nsọtụ abụọ nke okwuchi igbe ahụ. 9 Cherob abụọ ndị ahụ chịliri nku ha abụọ elu, sachie okwuchi igbe ahụ.+ Ha chere ibe ha ihu, ihu ha kpudokwara n’okwuchi igbe ahụ.+

10 O jizi osisi akeshịa rụọ tebụl.+ Ọ dị kubit abụọ n’ogologo, otu kubit n’obosara, nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu.+ 11 O wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya. 12 Ọ rụnyere ihe obosara ya hà ka uhiè ọbụ aka mmadụ* gburugburu ọnụ ya ma jiri ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ihe ahụ ọ rụnyere n’ọnụ ya. 13 O jikwa ọlaedo kpụọ ihe anọ dị okirikiri ma kwụnye ha n’akụkụ anọ nke tebụl ahụ, n’ebe a rụnyere ụkwụ ya anọ. 14 Ihe ndị ahụ dị okirikiri dị nso n’ihe ahụ a rụnyere n’ọnụ tebụl ahụ ka ọ bụrụ ebe a ga-etinye okporo osisi ndị a ga-eji na-ebu tebụl ahụ. 15 O wee jiri osisi akeshịa rụọ okporo osisi ndị ahụ ma jiri ọlaedo machie ha ka e jiri ha na-ebu tebụl ahụ. 16 O jizi ọlaedo a na-agwaghị agwa kpụọ arịa ndị dị n’elu tebụl ahụ, ya bụ, efere ya, iko ya, nakwa ọkwá ya na ihe mmiri ya ndị a ga-eji na-awụsa àjà mmanya.+

17 O wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe e ji adọsa ọkụ.*+ O ji hama kụọ ihe a e ji adọsa ọkụ. Ụkwụ ya, okporo ya, alaka ya, iko ya, isi ya, na ifuru ya bụ otu ihe.+ 18 O nwere alaka isii n’akụkụ ya abụọ. Alaka atọ dị n’otu akụkụ ya, alaka atọ adịrị n’akụkụ ya nke ọzọ. 19 Iko atọ ndị yiri okooko almọnd dị n’alaka nke ọ bụla dị n’otu akụkụ, otu isi na otu ifuru adịrị n’agbata otu iko na iko ibe ya. Iko atọ ndị yiri okooko almọnd dịkwa n’alaka nke ọ bụla dị n’akụkụ ya nke ọzọ, otu isi na otu ifuru adịrịkwa n’agbata otu iko na iko ibe ya. Ọ bụ otú a ka e si rụọ alaka isii ahụ ka ha si n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* ahụ pụta. 20 E nwekwara iko anọ yiri okooko almọnd n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ.* Otu isi na otu ifuru dịkwa n’agbata otu iko na iko ibe ya. 21 Otu isi dị n’okpuru alaka abụọ mbụ si n’okporo ahụ pụta. Otu isi dịkwa n’okpuru alaka abụọ ọzọ na-eso ha. Otu isi dịkwa n’okpuru alaka abụọ ọzọ na-eso ha, ya bụ, alaka isii ndị si n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* pụta. 22 Ọ bụ otu ọlaedo a na-agwaghị agwa ka e ji rụọ isi ya niile na alaka ya niile na ihe niile dị n’ihe ahụ e ji adọsa ọkụ.* Ha niile bụ otu ihe e ji hama kụọ. 23 O jizi ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ọkụ* ya asaa+ na mkpà ndị e ji ejide owu ya na ihe ndị a ga-eji na-agụnye owu a mụrụ amụ. 24 O ji otu talent* ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe a e ji adọsa ọkụ* na arịa ya niile.

25 O wee jiri osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà insens.+ O nwere akụkụ anọ há nhata. Ọ dị otu kubit n’ogologo, otu kubit n’obosara, na kubit abụọ n’ịdị elu. A rụkọtara ahụ́ ya na mpi ndị dị na ya ka ha bụrụ otu.+ 26 O ji ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya, ma elu ya ma akụkụ ya niile gbaa gburugburu ma mpi ndị dị na ya. O jikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya. 27 O ji ọlaedo kpụọ ihe abụọ dị okirikiri n’otu akụkụ ya nakwa n’akụkụ ya nke ọzọ, n’okpuru ihe ịchọ mma a kpụrụ n’ọnụ ya. Ha ga na-ejide okporo osisi ndị a ga-eji na-ebu ya. 28 O jizi osisi akeshịa rụọ okporo osisi ndị ahụ ma jiri ọlaedo machie ha. 29 O mekwara mmanụ nsọ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ+ na insens na-esi ísì ọma a na-agwaghị ihe ọ bụla,+ nke a gwakọtara nke ọma.*

38 O ji osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ. O nwere akụkụ anọ há nhata. Ọ dị kubit* ise n’ogologo, kubit ise n’obosara, nakwa kubit atọ n’ịdị elu.+ 2 Ọ rụnyere mpi n’akụkụ ya anọ. Ọ rụkọtara mpi ndị ahụ na ebe ịchụàjà ahụ ka ha bụrụ otu. O jizi ọla kọpa machie ya.+ 3 O wee rụọ arịa niile bụ́ maka ebe ịchụàjà ahụ, bọket ya, shọvel ya, efere ya, ndụdụ ya, na ihe ndị e ji agụnye ọkụ. O ji ọla kọpa rụọ arịa ya niile. 4 O jikwa ọla kọpa kpaa ihe a ga-etinye n’ime ebe ịchụàjà ahụ, n’okpuru ọnụ ebe ịchụàjà ahụ, n’ebe etiti ya. 5 Ọ kpụrụ ihe anọ dị okirikiri n’elu ihe ahụ e ji ọla kọpa kpaa, n’akụkụ ya anọ, ka ọ bụrụ ebe a ga-etinye okporo osisi ya. 6 O jizi osisi akeshịa rụọ okporo osisi ma jiri ọla kọpa machie ha. 7 O tinyere okporo osisi ndị ahụ n’ihe ndị ahụ dị okirikiri dị n’akụkụ ebe ịchụàjà ahụ, ka e jiri ha na-ebu ya. Ọ rụrụ ebe ịchụàjà ahụ ka ọ dị ka igbe osisi nke nwere oghere.

8 O wee jiri ọla kọpa kpụọ nnukwu ite+ na ihe e ji adọkwasị ya. Ihe o ji kpụọ ha bụ enyo* a natara ụmụ nwaanyị ndị a haziri ka ha na-eje ozi n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.

9 O wee rụọ ihe a ga-eji gbaa ụlọikwuu ahụ ogige.+ O ji ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà mgbochi ndị ga-adị n’akụkụ chere ihu n’ebe ndịda. Ha dị otu narị (100) kubit.+ 10 E ji ọla kọpa rụọ ogidi iri abụọ na ntọala iri abụọ ndị nwere oghere, jirikwa ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. 11 Ákwà mgbochi ndị ga-adị n’akụkụ ebe ugwu ya dị otu narị (100) kubit. E ji ọla kọpa rụọ ogidi iri abụọ ha na ntọala iri abụọ ha ndị nwere oghere. E ji ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. 12 Ma ákwà mgbochi ndị ga-adị n’ebe ọdịda anyanwụ ya dị kubit iri ise. Ogidi ha dị iri. Ntọala ha ndị nwere oghere dịkwa iri. E jikwa ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. 13 Ma akụkụ ga-eche ebe ọwụwa anyanwụ ihu dị kubit iri ise. 14 Ákwà mgbochi ndị dị n’otu akụkụ ya dị kubit iri na ise. O nwere ogidi atọ na ntọala atọ ndị nwere oghere. 15 Ákwà mgbochi ndị dị n’akụkụ ya nke ọzọ, n’ebe a ga-enwe ọnụ ụzọ e si abata n’ogige ahụ, dị kubit iri na ise. O nwere ogidi atọ na ntọala atọ ndị nwere oghere. 16 E ji ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà mgbochi niile ga-adị gburugburu ogige ahụ. 17 E ji ọla kọpa rụọ ntọala ndị nwere oghere a ga-akwụnye ogidi ndị ahụ na ha. E ji ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ejikọ ihe* n’ogidi ndị ahụ na ihe ndị e ji ekonye ihe na ha, jirikwa ọlaọcha machie elu ya. Ogidi niile a ga-eji rụọ ogige ahụ nwere ihe ndị e ji ọlaọcha rụọ e ji ejikọ ihe na ha.+

18 E ji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà ngebichi* ga-adị n’ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ọ dị kubit iri abụọ n’ogologo, kubit ise n’ịdị elu, ya na ákwà mgbochi ndị ga-adị n’ogige ahụ hà.+ 19 E ji ọla kọpa rụọ ogidi anọ ha na ntọala anọ ha ndị nwere oghere. E ji ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha, jirikwa ọlaọcha machie elu ogidi ndị ahụ. 20 E ji ọla kọpa rụọ mkpọ́ niile e ji ejide ụlọikwuu ahụ nakwa ndị nke e ji ejide ogige ya gbaa gburugburu.+

21 Ihe ndị a bụ ihe ndị e ji rụọ ụlọikwuu ahụ, bụ́ ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya.*+ Mosis nyere iwu ka e depụta ihe ndị a n’akwụkwọ. Ọ bụ ndị Livaị ka e nyere ọrụ idepụta ha.+ Ọ bụkwa Ịtama+ nwa Erọn onye nchụàjà duziri ha. 22 Bezalel+ onye ebo Juda, nwa Yuraị, nwa nwa Họọ, mere ihe niile Jehova nyere Mosis n’iwu. 23 Oholiab+ nwa Ahisamak, onye ebo Dan, so ya rụọ ihe ndị ahụ. Ọ bụ aka ochie n’iji nkà arụ ọrụ na ịkpa ihe n’ákwà nakwa n’ọrụ iji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo ákwà linin akpa ihe.

24 Ọlaedo niile e ji rụọ ọrụ niile a rụrụ n’ebe nsọ ahụ bụ ọlaedo ndị e wetara ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị.+ Ha dị talent* iri abụọ na itoolu na narị shekel* asaa na iri atọ (730), ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya. 25 Ọlaọcha ụmụ nwoke ndị e debara aha ha n’akwụkwọ wetara dị otu narị (100) talent nakwa otu puku shekel, narị asaa na iri asaa na ise (1,775), ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya. 26 Nwoke ọ bụla e debara aha ya n’akwụkwọ, bụ́ onye dị afọ iri abụọ ma ọ bụ karịa, nyere ọkara shekel, nke bụ́ ọkara shekel ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya.+ Ụmụ nwoke ndị ahụ dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise (603,550).+

27 E ji otu narị (100) talent ọlaọcha kpụọ ntọala ndị nwere oghere maka ebe nsọ ahụ nakwa ntọala ndị nwere oghere maka ákwà mgbochi ya. E ji otu narị (100) talent kpụọ otu narị (100) ntọala ndị nwere oghere, otu talent maka otu ntọala nwere oghere.+ 28 O si na shekel ọlaọcha ahụ dị otu puku na narị asaa na iri asaa na ise (1,775) rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ, machie elu ha ma jikọta ha ọnụ.

29 Ọla kọpa ndị e wetara ka ha bụrụ àjà* dị talent iri asaa nakwa puku shekel abụọ na narị anọ (2,400). 30 O ji ha rụọ ntọala ndị nwere oghere maka ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa rụọ na ihe e ji ọla kọpa kpaa a ga-etinye n’ime ya, arịa niile nke ebe ịchụàjà ahụ, 31 ntọala ndị nwere oghere ga-adị gburugburu ogige ụlọikwuu ahụ, ntọala ndị nwere oghere ga-adị n’ọnụ ụzọ ogige ahụ, na mkpọ́ niile e ji ejide ụlọikwuu ahụ nakwa mkpọ́ niile e ji ejide ogige ụlọikwuu ahụ+ gbaa gburugburu.

39 Ha ji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, na eri na-acha uhie uhie+ kpaa uwe ndị a kpara nke ọma a ga-eyi na-eje ozi n’ebe nsọ. Ha kpara uwe nsọ Erọn,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

2 O ji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa efọd.+ 3 Ha ji hama kụọ mbadamba ọlaedo dị iche iche ka ha dị fere fere. O wee berisịa ha ka ha dị ka eriri, ka o wee jiri ha na eri ahụ na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ ahụ na-acha pọpụl, eri ahụ na-acha uhie uhie, na ezigbo ákwà linin ahụ kpaa efọd ahụ. A kpakwara ihe na ya iji chọọ ya mma. 4 Ha kpara ubu ya ihu na azụ bụ́ ndị e jikọtara ọnụ. E jikọtara ha n’ebe elu ya abụọ. 5 E jikwa ihe ndị e ji kpaa efọd ahụ, ya bụ, ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin, kpanye eriri* n’efọd ahụ nke a ga-eji na-ekegide ya,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

6 Ha wee kwụnye nkume ọnịks n’ihe mbadamba abụọ e ji ọlaedo kpụọ, ha denyekwara aha ụmụ Izrel* na ha otú e si akanye akara na mgbaaka e ji aka ihe akara.+ 7 O tinyere ha n’ubu efọd ahụ ka ha bụrụ nkume ncheta maka ndị Izrel,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu. 8 O wee kpaa akpa a na-anya n’obi.+ Ọ bụ onye na-akpa ihe n’ákwà kpara ya otú ahụ e si kpaa efọd ahụ. E ji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ya.+ 9 O nwere akụkụ anọ há nhata mgbe a pịajiri ya abụọ. Ha kpara akpa ahụ a na-anya n’obi ya adị otu ntụ ọbụ aka* n’ogologo nakwa n’obosara mgbe a pịajiri ya abụọ. 10 Ha tinyere ahịrị nkume anọ na ya. Ahịrị nke mbụ bụ rubi, topaz, na emerad. 11 Ahịrị nke abụọ bụ tọkwọiz, safaya, na jaspa. 12 Ahịrị nke atọ bụ nkume leshem,* aget, na ametist. 13 Ahịrị nke anọ bụ krisolaịt, ọnịks, na jed. A kwụnyere ha n’ihe mbadamba ndị e ji ọlaedo rụọ. 14 Nkume ndị ahụ dị ole aha ụmụ Izrel* dị, ya bụ, iri na abụọ. E denyere aha ha otú e si akanye akara na mgbaaka e ji aka ihe akara. Aha nke ọ bụla nọchikwara anya otu ebo n’ime ebo iri na abụọ ahụ.

15 Ha wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ụdọ ígwè a hịkọrọ ahịkọ ka eriri n’elu akpa ahụ a na-anya n’obi.+ 16 Ha wee jiri ọlaedo kpụọ ihe mbadamba abụọ na ihe abụọ dị okirikiri ma tinye ihe abụọ ahụ dị okirikiri n’akpa ahụ a na-anya n’obi, n’isi isi ya abụọ. 17 Ha ganyeziri ụdọ ígwè abụọ ahụ e ji ọlaedo mee n’ihe abụọ ahụ dị okirikiri dị n’akpa ahụ a na-anya n’obi, n’isi isi ya abụọ. 18 Ha wee ganye isi abụọ nke ụdọ ígwè abụọ ahụ n’ihe mbadamba abụọ ahụ ma kegide ha n’ubu efọd ahụ, n’ebe ihu ya. 19 Ha jizi ọlaedo kpụọ ihe abụọ dị okirikiri ma kwụnye ha n’ime akpa ahụ a na-anya n’obi, n’isi isi ya abụọ, ka ha chee efọd ahụ ihu.+ 20 Ha wee jiri ọlaedo kpụọ ihe abụọ ọzọ dị okirikiri ma kwụnye ha n’ihu efọd ahụ, n’ebe mgbada efọd ahụ, n’akụkụ ebe e jikọtara ya, n’elu ebe eriri* efọd ahụ dị. 21 N’ikpeazụ, ha ji eriri na-acha anụnụ anụnụ kekọta ihe abụọ ahụ dị okirikiri dị n’akpa ahụ a na-anya n’obi na ihe abụọ dị okirikiri dị n’efọd ahụ, ka akpa ahụ a na-anya n’obi dịrị n’elu efọd ahụ, n’elu ebe eriri* efọd ahụ dị, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

22 O wee kpaa uwe na-enweghị aka nke efọd ahụ ga-adị n’elu ya. Ọ bụ onye na-akpa ákwà ji naanị eri na-acha anụnụ anụnụ kpaa ya.+ 23 Uwe ahụ na-enweghị aka nwere oghere n’etiti ebe elu ya. Ọ dị ka oghere na-adị n’uwe agha. A kpara ọnụ ọnụ oghere ya ahụ akpa gburugburu ka ọ ghara ịdọka adọka. 24 Ha jizi eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, na eri na-acha uhie uhie a kpakọtara ọnụ kpaa ihe yiri mkpụrụ osisi pomigranet gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe ahụ na-enweghị aka. 25 Ha jikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa kpụọ mgbịrịgba ma tinye ha n’agbata ihe ndị ahụ yiri mkpụrụ osisi pomigranet gbaa gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe ahụ na-enweghị aka, n’agbata ihe ndị ahụ yiri mkpụrụ osisi pomigranet. 26 Ha tinye otu ihe yiri mkpụrụ osisi pomigranet, ha etinye otu mgbịrịgba, ha tinyekwa otu ihe yiri mkpụrụ osisi pomigranet, ha etinye otu mgbịrịgba ọzọ, gbaa gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe ahụ na-enweghị aka e ji eje ozi, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

27 Ha wee jiri ezigbo eri linin kpaara Erọn na ụmụ ya ndị nwoke uwe mwụda dị iche iche.+ Ọ bụ onye na-akpa ákwà kpara ha. 28 Ha jikwa ezigbo eri linin kpaa ákwà isi+ na ákwà ịchọ mma ụmụ Erọn ga na-eke n’isi,+ jiri ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa uwe úkwù.*+ 29 Ha jikwa ezigbo eri linin a kpara akpa, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, na eri na-acha uhie uhie a kpakọtara ọnụ kpaa ákwà a na-eke n’úkwù, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

30 N’ikpeazụ, ha ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ihe mbadamba na-egbuke egbuke, bụ́ ihe àmà dị nsọ,* ma dee “Jehova bụ Onye dị nsọ” na ya, otú e si akanye akara na mgbaaka e ji aka ihe akara.+ 31 Ha ganyere ya eriri na-acha anụnụ anụnụ a ga-eji kegide ya n’ákwà isi ahụ, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

32 E wee rụchaa ọrụ niile a rụrụ maka ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu nzute. Ndị Izrel mere ihe niile Jehova nyere Mosis n’iwu.+ Ha mere nnọọ otú ahụ.

33 Ha buteziiri Mosis ihe niile a ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ,+ ha na ákwà ụlọikwuu ahụ+ na ihe ndị ga-adị na ya: nko ya,+ frem ya,+ okporo osisi ya+ na ogidi ya na ntọala ya ndị nwere oghere;+ 34 ihe a ga-eji kpuchie ya e ji akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara mee,+ ihe a ga-eji kpuchie ya e ji akpụkpọ anụ sil mee, ákwà mgbochi a ga-eji gechie ya;+ 35 igbe ọgbụgba ndụ* ahụ na okporo osisi ya+ na okwuchi ya;+ 36 tebụl ahụ, arịa ya niile na achịcha a na-enye Chineke;+ 37 ihe e ji adọsa ọkụ* e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ, ọkụ* ya+ ndị kwụ n’ahịrị, na arịa ya niile+ na mmanụ a ga-eji na-amụ ọkụ;+ 38 ebe ịchụàjà+ e ji ọlaedo rụọ, mmanụ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ,+ insens na-esi ísì ọma,+ ákwà ngebichi*+ nke ga-adị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ; 39 ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa rụọ+ na ihe e ji ọla kọpa kpaa a ga-etinye n’ime ya, okporo osisi ya,+ arịa ya niile,+ nnukwu ite na ihe a ga-eji adọkwasị ya;+ 40 ákwà mgbochi ndị ga-adị n’ogige ụlọikwuu ahụ, ogidi ya na ntọala ya ndị nwere oghere,+ ákwà ngebichi*+ nke ga-adị n’ọnụ ụzọ ogige ahụ, ụdọ ndị a ga-eji jide ákwà ogige ụlọikwuu ahụ na mkpọ́ ndị a ga-eji jide ákwà ogige ya+ na arịa niile a ga-eji na-eje ozi n’ụlọikwuu, ya bụ, ụlọikwuu nzute; 41 uwe ndị a kpara nke ọma a ga-eyi na-eje ozi n’ụlọikwuu ahụ, uwe nsọ Erọn onye nchụàjà,+ nakwa uwe ụmụ ya ndị nwoke ga-eyi na-arụ ọrụ nchụàjà.

42 Ndị Izrel rụrụ ọrụ niile ahụ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.+ 43 Mgbe Mosis leruru ihe niile ha rụrụ anya, ọ hụrụ na ha rụrụ ha otú Jehova nyere n’iwu. Mosis wee gọzie ha.

40 Jehova gwaziri Mosis, sị: 2 “N’abalị mbụ n’ọnwa mbụ, ị ga-ama ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu nzute.+ 3 Dọsa igbe ọgbụgba ndụ* ahụ n’ime ya,+ jirikwa ákwà mgbochi gechie Igbe ahụ.+ 4 Ị ga-ebubata tebụl ahụ+ ma dowe ihe ndị ga-adị na ya otú ha kwesịrị ịdị. Ị ga-ebubatakwa ihe e ji adọsa ọkụ*+ ma mụnye ọkụ* ndị dị na ya.+ 5 Dọsa ebe ịchụàjà insens+ ahụ e ji ọlaedo rụọ tupu ebe ahụ a dọsara igbe ọgbụgba ndụ* ahụ, konyekwa ákwà ngebichi* ahụ ga-adị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ.+

6 “Ị ga-adọsa ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ+ ná mpụga ihu ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu nzute. 7 Ị ga-adọsakwa nnukwu ite ahụ n’agbata ụlọikwuu nzute ahụ na ebe ịchụàjà ahụ ma gbanye ya mmiri.+ 8 Gbaa ogige+ gburugburu ụlọikwuu ahụ ma konye ákwà ngebichi*+ n’ọnụ ụzọ ogige ahụ. 9 Ị ga-ewerezi mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ+ tee ụlọikwuu ahụ na ihe niile dị n’ime ya mmanụ+ ma mee ka ya na arịa ya niile dị nsọ, ka ọ bụrụ ihe dị nsọ. 10 Ị ga-ete ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ na arịa ya niile mmanụ ma mee ka ebe ịchụàjà ahụ dị nsọ, ka o wee bụrụ ebe ịchụàjà kacha nsọ.+ 11 Ị ga-etekwa nnukwu ite ahụ na ihe e ji dọkwasị ya mmanụ ma mee ka ha dị nsọ.

12 “Kpọtazie Erọn na ụmụ ya ndị nwoke n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ma gwa ha ka ha jiri mmiri saa ahụ́.*+ 13 Ị ga-eyiwe Erọn uwe nsọ ndị ahụ,+ tee ya mmanụ+ ma mee ka ọ dị nsọ. Ọ ga-abụzi onye nchụàjà m. 14 Ị ga-akpọtazi ụmụ ya ndị nwoke ma yiwe ha uwe mwụda.+ 15 Ị ga-ete ha mmanụ otú i tere nna ha mmanụ,+ ka ha wee bụrụ ndị nchụàjà m. Mmanụ ị ga-ete ha ga-eme ka ha bụrụ ndị nchụàjà ga na-ejere m ozi mgbe niile n’ọgbọ ha niile.”+

16 Mosis mere ihe niile Jehova nyere ya n’iwu.+ O mere nnọọ otú ahụ.

17 N’abalị mbụ n’ọnwa mbụ, n’afọ nke abụọ, a mara ụlọikwuu ahụ.+ 18 Mgbe Mosis na-ama ụlọikwuu ahụ, o dosara ntọala ya ndị nwere oghere+ n’ala, kwụnyechaa frem ya,+ tinyechaa okporo osisi ya,+ kwụwakwa ogidi ya niile. 19 Mosis gbasara ákwà ụlọikwuu ahụ+ n’elu frem ụlọikwuu ahụ ma were ákwà a ga-eji kpuchie+ ụlọikwuu ahụ kpuchie ya, otú Jehova nyere ya n’iwu.

20 Mosis wee were Ihe Àmà+ ahụ tinye n’Igbe ahụ,+ tinyekwa okporo osisi ndị ahụ+ n’Igbe ahụ ma were okwuchi Igbe ahụ kwuchie ya.+ 21 O bubatara Igbe ahụ n’ụlọikwuu ahụ ma konye ákwà mgbochi ahụ,+ jiri ya gechie igbe ọgbụgba ndụ* ahụ,+ otú Jehova nyere ya n’iwu.

22 Mosis dọsaziri tebụl ahụ+ n’ụlọikwuu nzute, n’akụkụ ebe ugwu ụlọikwuu ahụ, tupu ebe ahụ e ji ákwà mgbochi gebichie. 23 O dosakwara achịcha+ n’usoro n’elu ya n’ihu Jehova, otú Jehova nyere ya n’iwu.

24 Mosis dọsara ihe e ji adọsa ọkụ*+ n’ụlọikwuu nzute, n’ihu tebụl ahụ, n’akụkụ ebe ndịda ụlọikwuu ahụ. 25 Ọ mụnyere ọkụ*+ ndị ahụ n’ihu Jehova, otú Jehova nyere ya n’iwu.

26 Mosis dọsaziri ebe ịchụàjà+ ahụ e ji ọlaedo rụọ n’ụlọikwuu nzute n’ihu ákwà mgbochi ahụ, 27 ka e wee na-amụ insens na-esi ísì ọma+ na ya,+ otú Jehova nyere ya n’iwu.

28 O wee konye ákwà ngebichi*+ n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ.

29 Mosis dọsara ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ+ n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu nzute, ka o wee na-achụ àjà a na-esu ọkụ+ na àjà ọka na ya, otú Jehova nyere ya n’iwu.

30 O wee dọsa nnukwu ite ahụ n’agbata ụlọikwuu nzute na ebe ịchụàjà ahụ ma gbanye ya mmiri.+ 31 Mosis na Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ji mmiri si na ya saa aka ha na ụkwụ ha. 32 Mgbe ọ bụla ha na-abanye n’ụlọikwuu nzute ma ọ bụ mgbe ha bịara ebe ịchụàjà nso, ha na-asacha onwe ha,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

33 N’ikpeazụ, Mosis gbara ụlọikwuu ahụ na ebe ịchụàjà ahụ ogige+ gburugburu ma konye ákwà ngebichi* n’ọnụ ụzọ ogige ahụ.+

Mosis wee rụchaa ọrụ ahụ. 34 Ígwé ojii malitere ikpuchi ụlọikwuu nzute ahụ. Ebube Jehova wee ju n’ụlọikwuu ahụ.+ 35 Mosis enweghị ike ịbanye n’ụlọikwuu nzute ahụ n’ihi na ígwé ojii kwụ n’elu ya, ebube Jehova jukwara n’ụlọikwuu ahụ.+

36 Mgbe ọ bụla ígwé ojii ahụ si n’ụlọikwuu ahụ pụọ, ndị Izrel na-akwali. Ha mere otú ahụ n’oge niile ha si n’otu ebe kwaga ebe ọzọ n’ala ịkpa.+ 37 Ma, ọ bụrụ na ígwé ojii ahụ apụghị, ha anaghị akwali ruo ụbọchị ọ pụrụ.+ 38 N’ihi na ígwé ojii Jehova na-adị n’elu ụlọikwuu ahụ n’ehihie, ọkụ na-adịkwa n’elu ya n’abalị. Ndị Izrel niile na-ahụ ya n’oge niile ha si n’otu ebe kwaga ebe ọzọ.+

Na Hibru, “Jekọb.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “unu ahụ ha n’oche a na-anọ amụ nwa.”

Ma ọ bụ “igbe.”

Ma ọ bụ “nweere ya ọmịiko.”

Mosis pụtara “Onye E Kupụtara Ekupụta,” ya bụ, onye a gụpụtara na mmiri.

Ma ọ bụ “mgbe Mosis siwere ike.”

Ma ọ bụ “gbachitere ha.”

Ya bụ, Jetro.

Geshọm pụtara “Onye Mbịarambịa n’Ebe Ahụ.”

Na Hibru, “ọtụtụ ụbọchị.”

Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.

Na Hibru, “ga-ejere ezi Chineke ozi.”

Ma ọ bụ “Họọrọ.”

Gụọ A4.

Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.

Ma ọ bụ “Ị ga-anọchite anya Chineke.”

Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi gị.”

Na Hibru, “jeere m ozi.”

Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.

Ma ọ bụ “unu emeela ka anyị siwe Fero na ndị na-ejere ya ozi ísì ọjọọ.”

Na Hibru, “m weliri aka m.”

Na Hibru, “e bighị m úgwù n’egbugbere ọnụ.”

Na Hibru, “n’ụsụụ ndị agha ha dị iche iche.”

Na Hibru, “e bighị m úgwù n’egbugbere ọnụ.”

Na Hibru, “ndị agha m, ndị m.”

Ma ọ bụ “majik.”

Na Hibru, “jeere m ozi.”

Ya bụ, ọwa mmiri ndị si n’Osimiri Naịl.

Ma ọ bụ “majik.”

Na Hibru, “jeere m ozi.”

Ma ọ bụ “ihe ndina.”

Ma ọ bụ “n’efere.”

Ma ọ bụ “majik.”

Ihe a bụ ụdị obere ahụhụ na-adị n’Ijipt nke yiri anwụnta.

Ma ọ bụ “majik.”

Na Hibru, “Ọ bụ mkpịsị aka Chineke!”

Na Hibru, “jeere m ozi.”

Ọ bụ ụdị ijiji na-ata ata.

Ya bụ, ndị Ijipt.

Ma ọ bụ “iji anyị gwuo egwu.”

Na Hibru, “jeere m ozi.”

Na Hibru, “jeere m ozi.”

Ọkụ a nwere ike ịbụ àmụ̀mà nke na-egbusi ike.

Ma ọ bụ “ga-akwụsị ịjụ ido onwe gị n’okpuru m?”

Na Hibru, “jeere m ozi.”

Na Hibru, “ga-abụrụ anyị ọnyà?”

Na Hibru, “jeere Jehova bụ́ Chineke ha ozi.”

Na Hibru, “jeere Jehova bụ́ Chineke unu ozi.”

Na Hibru, “jeere Jehova ozi.”

Ọ ga-abụ Mosis.

Na Hibru, “jeere Jehova ozi.”

Ma ọ bụ “ga-ekwe ka anyị were.”

Ya bụ, atụrụ ma ọ bụ ewu.

Na Hibru, “ya na onye agbata obi ya.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ya bụ, atụrụ ma ọ bụ ewu.

O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.

Na Hibru, “a ga-egbupụ mkpụrụ obi ahụ n’Izrel.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “ndị agha unu.”

Na Hibru, “a ga-esi ná nzukọ Izrel gbupụ mkpụrụ obi ahụ.”

Ya bụ, atụrụ ma ọ bụ ewu.

Na Hibru, “mbibi ahụ.”

O nwere ike ịbụ ndị okenye Izrel.

Na Hibru, “jeere Jehova ozi.”

Ma ọ bụ “efere.”

Ya bụ, ndị dị iche iche na-abụghị ndị Izrel. Ndị Ijipt sokwa na ha.

Na Hibru, “ndị agha niile.”

Na Hibru, “ndị agha ha.”

Na Hibru, “Wepụtara m nwa mbụ ọ bụla meghere akpa nwa n’Izrel.”

Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”

Gụọ B15.

Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.

Na Hibru, “n’agbata anya gị abụọ.”

Na Hibru, “onye ọ bụla meghere akpa nwa.”

Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”

Na Hibru, “ihe ọ bụla meghere akpa nwa.”

Na Hibru, “n’agbata anya gị abụọ.”

Na Hibru, “ndị Izrel weliri aka elu na-apụ.”

Ya bụ, n’ihe dị ka elekere abụọ n’ime abalị ruo n’elekere isii ụtụtụ.

“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”

Ma ọ bụ “opu.”

Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”

Na Hibru, “Ihe mgbu nwaanyị na-amụ nwa na-enwe.”

Mera pụtara “Ihe Ilu.”

Ma ọ bụ “ịtamu ntamu n’ihi.”

Ma ọ bụ “ịtamu ntamu n’ihi.”

Ma ọ bụ “ntamu unu na-atamu n’ihi.”

Ma ọ bụ “na-atamu ntamu n’ihi.”

Ma ọ bụ “ntamu unu na-atamu n’ihi ya.”

O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Oma bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu oma bụ lita 2.2. Gụọ B14.

Oma bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu oma bụ lita 2.2. Gụọ B14.

Oma bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu oma bụ lita 2.2. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “ga-edebe ụbọchị izu ike.”

Ma ọ bụ “wee zuo ike.”

O nwere ike ịbụ na e si n’okwu Hibru pụtara “Gịnị ka ọ bụ?” nweta aha a.

Oma bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu oma bụ lita 2.2. Gụọ B14.

Oma bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu oma bụ lita 2.2. Gụọ B14.

Oma bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu oma bụ lita 2.2. Gụọ B14.

Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu efa bụ lita 22. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “na-atamu ntamu n’ihi.”

Masa pụtara “Ọnwụnwa.”

Meriba pụtara “Esemokwu.”

Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”

Jehova-nisi pụtara “Jehova Bụ Osisi Mgbaàmà M.”

Geshọm pụtara “Onye Mbịarambịa n’Ebe Ahụ.”

Eliiza pụtara “Chineke M Na-enye Aka.”

Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.

Na Hibru, “n’aka Ijipt.”

O nwere ike ịbụ, “jiri ube magbuo ya.”

Na Hibru, “opi e ji mpi ebule mee.”

Na Hibru, “Unu agala nwaanyị nso.”

Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”

Ma ọ bụ “Egbula ọchụ.”

Ma ọ bụ “m họọrọ ka a nọrọ na-efe m.”

Na Hibru, “ọtọ unu.”

Na Hibru, “ka a gbara ya.”

Ya bụ, mmekọahụ.

Ma ọ bụ “bụrụ nne ya ma ọ bụ nna ya ọnụ.”

O nwere ike ịbụ, “kụọ ya ihe e ji arụ ọrụ.”

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

Na Hibru, “ụmụ ya apụta.”

Ma ọ bụ “merụrụ nnukwu ahụ́.”

Ya bụ, nwaanyị ahụ ma ọ bụ nwa ya.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ga-alara mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Na Hibru, “edinaa.”

Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”

Ma ọ bụ “na-eme amara.”

Ma ọ bụ “Ekwujọla Chineke.”

Ma ọ bụ “onyeisi.”

Ma ọ bụ “ga-adị ọtụtụ ndị mma.”

Na Hibru, “okwu.”

Ma ọ bụ “agaghị m ahapụ onye ajọ omume.”

Ma ọ bụ “Erila ngarị.”

Na Hibru, “na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ nke ọma kpuo ìsì.”

Gụọ B15.

A na-akpọkwa ya Ememme Izu ma ọ bụ Pentikọst.

A na-akpọkwa ya Ememme Ụlọ Ndò (Ụlọikwuu).

Na Hibru, “aha m dị n’ime ya.”

Hibru, “Jeerenụ Jehova bụ́ Chineke unu ozi.”

Ma ọ bụ “ụbọchị unu zuo ezuo.”

Ma ọ bụ “tụgharịara unu azụ ha.”

Ma ọ bụ “ajị anụ e sijiri ka ọ chawa pọpụl.”

Ma ọ bụ “n’oriọna.”

Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.

Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”

Ihe dị ka sentimita 7.4 (inch 2.9). Gụọ B14.

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.

Ya bụ, ibé osisi ndị a kụkọtara ọnụ ha eyie frem windo ma ọ bụ nke ọnụ ụzọ.

Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”

Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.

Ma ọ bụ “ntụ ya na abụba gwakọtara,” ya bụ, abụba si n’àjà ndị a chụrụ.

Ma ọ bụ “ihe ndị dị okirikiri” e ji ejikọta ihe.

Ma ọ bụ “ihe ndị dị okirikiri” e ji ejikọta ihe.

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Na Hibru, “n’Ihe Àmà.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Na Hibru, “ndị niile obi ha ma ihe.”

Na Hibru, “mmụọ amamihe.”

Ya bụ, uwe chek. Gụọ B5.

Ma ọ bụ “ájị̀.”

Ya bụ, ụmụ Jekọb.

Ya bụ, ụmụ Jekọb.

Ya bụ, malite ná mkpịsị aka ukwu ruo na nke nta ma a gbasaa aka, ihe dị ka sentimita 22.2 (inch 8.75). Gụọ B14.

Ọ bụ nkume dị oké ọnụ. A maghị nkume nke ọ bụ abụ. O nwere ike ịbụ amba, hayasịnt, opal, ma ọ bụ tọmalin.

Ya bụ, ụmụ Jekọb.

Ma ọ bụ “ájị̀.”

Ma ọ bụ “ájị̀.”

Ya bụ, ụmụ Jekọb.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “ebe a ga-esi na-etife isi.”

Ya bụ, uwe chek. Gụọ B5.

Ma ọ bụ “nye ha ikike.”

Ma ọ bụ “uwe ime.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “ma jiri mmiri saa ha ahụ́.”

Ma ọ bụ “ájị̀.”

Ma ọ bụ “ihe àmà na-egosi na e nyefeela Erọn n’aka Chineke; okpu dị nsọ.”

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “ihe ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”

Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”

Na Hibru, “onye mbịarambịa,” ya bụ, nwoke na-esighị n’ezinụlọ Erọn.

Na Hibru, “ga-emetụ ebe ịchụàjà ahụ aka.”

O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.

Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu efa bụ lita 22. Gụọ B14.

Hin bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu hin bụ lita 3.67. Gụọ B14.

O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.

Ma ọ bụ “ihe ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Ihe dị ka sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.

Na Hibru, “n’igbe Ihe Àmà.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.

Ya bụ, ebe ịchụàjà insens ahụ.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

O nwere ike ịbụ ọlaọcha. Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “e ji shekel dị nsọ.”

Otu gira bụ gram 0.57. Gụọ B14.

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “e ji shekel dị nsọ.”

Hin bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu hin bụ lita 3.67. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “Ọ ga-adị ka nke onye na-eme mmanụ otite mere.”

Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Na Hibru, “tee ya onye mbịarambịa,” ya bụ, nwoke na-esighị n’ezinụlọ Erọn.

Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Ma ọ bụ “Ọ ga-adị ka nke onye na-eme mmanụ otite mere.”

Na Hibru, “Ihe Àmà.”

Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”

Na Hibru, “akpọọla m Bezalel aha.”

Na Hibru, “ndị niile obi ha ma ihe.”

Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”

Ma ọ bụ “nwa ehi a kpụrụ akpụ.”

Ma ọ bụ “nwa ehi a kpụrụ akpụ.”

Na Hibru, “ndị na-ekwesi olu ike.”

Ma ọ bụ “mee ka obi Chineke jụrụ.”

Ma ọ bụ “nwee mwute.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “inwe mwute.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.

Na Hibru, “ndị na-ekwesi olu ike.”

Na Hibru, “ndị na-ekwesi olu ike.”

Na Hibru, “yipụrụ.”

Na Hibru, “Ama m gị n’aha.”

Na Hibru, “Ọ.”

Na Hibru, “Ihu m.”

Na Hibru, “ihu gị.”

Na Hibru, “ama m gị n’aha.”

Ya bụ, gwa ya ụdị onye ọ bụ.

Ma ọ bụ “na-eme amara.”

Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”

Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”

Na Hibru, “ndị na-ekwesi olu ike.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “Jehova, aha ya bụ.”

Ma ọ bụ “ọ chọghị onye ga na-ama ya aka.”

Gụọ B15.

Na Hibru, “ihe ọ bụla meghere akpa nwa.”

Ma ọ bụ “ga-edebe ụbọchị izu ike.”

A na-akpọkwa ya Ememme Ụlọ Ndò (Ụlọikwuu).

Na Hibru, “na-aga ịhụ ihu Jehova.”

Na Hibru, “Okwu Iri.”

Na Hibru, “ya.”

Ma ọ bụ “n’oriọna.”

Na Hibru, “ndị niile obi ha ma ihe.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

Ma ọ bụ “onye ọ bụla mmụọ ya kpaliri.”

Ma ọ bụ “àjà a na-efegharị efegharị.”

Ma ọ bụ “n’oriọna.”

Na Hibru, “akpọọla Bezalel aha.”

Na Hibru, “ka obi ha mara ihe.”

Na Hibru, “onye ọ bụla obi ya ma ihe.”

O nwere ike ịbụ Bezalel.

Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

Ma ọ bụ “ihe ndị dị okirikiri” e ji ejikọta ihe.

Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.

Ihe dị ka sentimita 7.4 (inch 2.9). Gụọ B14.

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “nke dị ka nke onye na-eme mmanụ otite mere.”

Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.

Ya bụ, ọla kọpa a kwọchara nke ọma e ji mere enyo.

Ma ọ bụ “ihe ndị dị okirikiri” e ji ejikọta ihe.

Ma ọ bụ “ihe ndị dị okirikiri” e ji ejikọta ihe.

Ma ọ bụ “ihe ndị dị okirikiri” e ji ejikọta ihe.

Ma ọ bụ “ihe ndị dị okirikiri” e ji ejikọta ihe.

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

Ma ọ bụ “ihe ndị dị okirikiri” e ji ejikọta ihe.

Na Hibru, “ụlọikwuu Ihe Àmà.”

Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “e jiri shekel dị nsọ.”

Ma ọ bụ “e jiri shekel dị nsọ.”

Ma ọ bụ “e jiri shekel dị nsọ.”

Ma ọ bụ “àjà a na-efegharị efegharị.”

Ma ọ bụ “ájị̀.”

Ya bụ, ụmụ Jekọb.

Ya bụ, malite ná mkpịsị aka ukwu ruo na nke nta ma a gbasaa aka, ihe dị ka sentimita 22.2 (inch 8.75). Gụọ B14.

Ọ bụ nkume dị oké ọnụ. A maghị nkume nke ọ bụ abụ. O nwere ike ịbụ amba, hayasịnt, opal, ma ọ bụ tọmalin.

Ya bụ, ụmụ Jekọb.

Ma ọ bụ “ájị̀.”

Ma ọ bụ “ájị̀.”

Ma ọ bụ “uwe ime.”

Ma ọ bụ “ihe àmà na-egosi na e nyefeela Erọn n’aka Chineke; okpu dị nsọ.”

Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

Na Hibru, “ma jiri mmiri saa ha ahụ́.”

Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya